Ozizi Assumption Ọ Bụ Nkwenkwe nke Chineke Kpughere?
OZIZI Assumption—ozizi nke na Meri, nne Jisọs, gbagoro n’eluigwe n’anụ ahụ—na-emetụ ọtụtụ nde ndị Roman Katọlik n’obi. Ọkọ akụkọ ihe mere eme bụ́ George William Douglas na-asị: “Ozizi Assumption, ma ọ bụ mbugo n’eluigwe, nke Nwa Agbọghọ Na-amaghị Nwoke bụ́ Meri abụwo nke e doro nso [eri ogologo oge] dị ka ememe ya nke kasị ukwuu na otu n’ime ememe ndị bụ isi nke Chọọchị kwa afọ.”
Otú ọ dị, ndị ọkà mmụta okpukpe ndị Katọlik na-ekweta na Bible adịghị ekwu banyere Meri dị ka onye gbagoro eluigwe n’ụzọ dị otú ahụ. N’ezie, ole na ole ndị Katọlik matara na ozizi nke a hụrụ n’anya abụwo isiokwu nke esemokwu na arụmụka dị ilu ruo ọtụtụ narị afọ. Ya mere olee nnọọ otú chọọchị si bịa nakwere Assumption Meri dị ka nkwenkwe?a È nwere ihe mere a ga-eji lee ya anya dị ka nke Chineke kpughere? Azịza nye ajụjụ ndị a abụghị nanị ihe okwu ọnụ efu. Ha nwere ihe dị ukwuu ha metụtara maka ndị ọ bụla hụrụ eziokwu n’anya.
Nchepụta nke Nkwenkwe
Ọ pụrụ iju gị anya ịmata na n’ime narị afọ ndị mbụ mgbe Jisọs nwụsịrị, echiche nke Assumption Meri gaa n’eluigwe bụ ihe na-adịtụghị n’echiche ndị Kraịst ma ọlị. Ọkà mmụta okpukpe ndị Katọlik bụ́ Jean Galot na-ede n’akwụkwọ bụ́ L’Osservatore Romano, sị: “Ná mmalite, ọ dịghị ncheta nke ọnwụ Meri e jikọrọ ya na ìgwè ndị Kraịst.”
Ma, mgbe nkụzi Atọ n’Ime Otu ghọrọ ozizi chọọchị nakweere, a malitere ikenye Meri òkè na-akawanye mkpa. A malitere iji okwu ndị na-akpali akpali, dị ka “Nne nke Chukwu,” “a tụụrụ ime ya n’enweghị mmehie,” “Onye Ogbugbo,” na “Eze Nwanyị nke Eluigwe,” na-eme ihe banyere ya. Mgbe oge na-aga, ka ọkà mmụta okpukpe bụ́ Galot na-eche, “mgbachi nkịtị nke ọdịnala banyere ọnwụ Meri apụkwaghị iju ndị Kraịst kwetara n’izu okè nke Meri ma chọọ inye ya ofufe afọ. Otú a, nkọwa dị iche iche nke Assumption, bụ́ nke sitere ná nchepụta nke ihe ka n’ọnụ ọgụgụ ụmụ mmadụ, weere ọnọdụ.”
N’ihe dị ka na narị afọ nke anọ O.A., akwụkwọ a kpọrọ apọkrịfa nke ozizi Assumption malitere ịgbasa. Ihe odide ndị a kọrọ akụkọ ndị na-atọ ntị ụtọ banyere otú a sịrị na Meri si gbagoo n’eluigwe. Were, dị ka ihe atụ, ihe odide nke a kpọrọ “Ịda n’Ụra nke Nne nke Chukwu Dị Nsọ.” E kwuwo na ọ dịghị onye ọzọ dere ya ma ọ bụghị Jọn onyeozi, ma o yikarịrị ka e chepụtara ya n’ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ 400 afọ mgbe Jọn nwụsịrị. Dị ka akụkọ nke a na-abụghị eziokwu na-ekwu, n’ụzọ ọrụ ebube e mere ka ndị ozi Kraịst zukọọ gburugburu Meri, ebe ha hụrụ ka ọ gwọrọ ndị kpuru ìsì, ndị ntị chiri, na ndị ngwụrọ. N’ikpeazụ, dị ka e mere nzọrọ ya n’ebe a, ndị ozi ahụ nụrụ ka Onyenwe anyị gwara Meri, sị: “Lee, ugbu a ka a ga-ewere anụ ahụ gị dị oké ọnụ ahịa gaa na paradaịs, na mkpụrụ obi gị dị nsọ ga-anọkwa n’eluigwe n’ebe nkwakọba akụ̀ nke Nna m n’ìhè nke na-egbukepụ egbukepụ gabiga ókè, ebe e nwere udo na ite egwú ọṅụ nke ndị mmụọ ozi dị nsọ, ị ga-anọgidekwa ebe ahụ.”
Olee otú ndị kwere ekwe si meghachi omume banyere ihe odide ndị dị otú ahụ? Onye ọkà ná mmụta banyere Meri bụ́ René Laurentin na-akọwa, sị: “Mmeghachi omume ndị e nwere dịgasị iche iche. A ghọgburu ndị kasị na-ekwere ihe n’ajụghị ajụjụ, n’egbughị oge ma ọlị, site n’ịtọ ụtọ nke akụkọ ụtọ ahụ. Ndị ọzọ, katọrọ akụkọ ndị a na-adịghị ekwu otu ihe, bụ́ ndị na-emegiderịkarị onwe ha, n’enweghịkwa ihe mgbakwasị ụkwụ.” Otú a, a gbara mgba maka iji mee ka chọọchị nakwere nchepụta Assumption. Eziokwu bụ na a na-anọ na-efe ihe oyiyi ndị a sị na ọ bụ ahụ Meri ofufe n’ebe ụfọdụ so tinye ihe n’ọgba aghara ahụ. Nke a siri ike ijikọ ya na nkwenye nke na e werewo anụ ahụ ya gaa n’eluigwe.
Na narị afọ nke 13, Thomas Aquinas, dị ka ọtụtụ ndị ọkà mmụta okpukpe ndị ọzọ, nọgidere na-ekwu na a pụghị ịkọwa Assumption dị ka nkwenkwe, ebe ọ bụ na “Akwụkwọ Nsọ akụzighị ya.” Ka o sina dị, nkwenye ahụ nọgidere na-eto eto n’iwu ewu ya, ihe osise ndị nke ihe a sịrị na ọ bụ mbugo ahụ Meri site n’aka ndị na-ese ihe a ma ama dị ka Raphael, Correggio, Titian, Carracci, na Rubens mụbara.
Okwu ahụ nọgidere bụrụ nke a na-edozighị ruo nnọọ n’oge na-adịbeghị anya gara aga. Dị ka onye Jesuit bụ́ Giuseppe Filograssi kwuru, ọbụna ná nkera mbụ nke narị afọ anyị, ndị mmụta bụ́ ndị Katọlik nọgidere na-ebipụta “ihe ọmụmụ na ntụle ndị na-adịchaghị akwado” nchepụta Assumption. Ọbụna ndị popu, dị ka Leo nke Iri na Atọ, Pius nke Iri, na Benedict nke Iri na Ise, “ekwughị nnọọ ihe ọ bụla n’okwu ahụ.” Ma na November 1, 1950, chọọchị mesịrị were nguzo doro anya. Pope Pius nke Iri na Abụọ mara ọkwa, sị: “Anyị na-akọwa ya ịbụ nkwenkwe nke Chineke kpughere na Nne nke Chukwu nke Na-enweghị Mmehie, Meri n’Amaghị Nwoke mgbe nile, mgbe oge ndụ ya n’elu ala gwụsịrị, bụ onye e weere n’anụ ahụ na mkpụrụ obi gaa n’ebube nke eluigwe.”—Munificentissimus Deus.
Nkwenye ná njem Meri n’anụ ahụ gaa n’eluigwe abụkwaghị ihe onye ọ masịrị ya ekwere n’etiti ndị Katọlik—ọ bụ ugbu a nkwenkwe nke Chọọchị. Pope Pius nke Iri na Abụọ kwupụtara na “ọ bụrụ na onye ọ bụla . . . anwaa anwa ịgọnahụ ya ma ọ bụ jiri aka ya weta ịrụ ụka n’ihe Anyị kọwaworo, o kwesịrị ịmara na ọ dawo ada n’Okwukwe Chineke na nke Katọlik.”
Ihe Akwụkwọ Nsọ Na-ekwu n’Ezie
Ma ọ bụ n’ihe ndabere dị aṅaa ka chọọchị weere nguzo anyaike nke a? Pope Pius nke Iri na Abụọ mere nzọrọ na nkwenkwe Assumption nwere “ntọala ya bụ isi n’Akwụkwọ Dị Asọ.” N’etiti akụkụ ihe odide ndị a na-ezokarị aka na ya dị ka ihe nnwapụta nke mbugo ahụ Meri bụ Luk 1:28, 42. Amaokwu ndị a na-ekwu banyere Meri, sị: “Ekele, onye jupụtara n’ebere, Onyenwe anyị nọnyeere gị: ị dị ngọzi n’etiti ikporo nile . . . , ngọzi dịkwaara mkpụrụ nke akpa nwa gị.” (Douay) Ndị Assumption na-eche na n’ihi na Meri “jupụtara n’ebere,” ọ dịghị mgbe ọnwụ gaara emeriwo ya. Ebe ọ dịkwa “ngọzi” dị ka ‘mkpụrụ nke akpa nwa ya,’ ọ ghaghị inwe ihe ùgwù ndị hà ka ndị nke Jisọs—gụnyere mgbago n’eluigwe Jisọs. Ì chere na nke a bụ echiche ziri ezi?
Otu ihe bụ na ndị mmụta asụsụ na-asị na okwu ahụ bụ́ “jupụtara n’ebere” bụ nsụgharị na-ezighị ezi nakwa na okwu Grik mbụ Luk jiri mee ihe bụ nke a ga-asụgharị n’ụzọ ziri ezi karị ịbụ “ihe kwesịrị ịnata ihu ọma Chineke.” Jerusalem Bible nke ndị Katọlik na-ede Luk 1:28 otú a: “Tegharịa egwú ọṅụ, gị onye a hụrụ ihu ọma dị ukwuu!” Ọ dịghị ihe mere a ga-eji kwubie na e bugara Meri n’eluigwe n’anụ ahụ nanị n’ihi na Chineke ‘hụrụ ya ihu ọma nke ukwuu.’ Onye Kraịst mbụ nwụrụ n’ihi okwukwe ya bụ́ Stifen, bụkwa onye e kwuru banyere ya na Bible Douay nke Katọlik dị ka onye a hụrụ ihu ọma dị ukwuu, ma ọ bụ onye “jupụtara n’ebere”—a sịbeghịkwa na a kpọlitere ya n’anụ ahụ.—Ọrụ 6:8.
Ma, ọ̀ bụ na a gọzighị Meri ma ọ bụ hụ ya ihu ọma? Ee, ma n’ụzọ na-akpali mmasị, e lere nwanyị ahụ bụ Jael laa azụ n’ụbọchị ndị ikpe Israel anya dị ka onye dị “ngọzi n’etiti ikporo nile.” (Ndị Ikpe 5:24, Dy) N’ezie ọ dịghị onye ga-arụ ụka na e werekwaara Jael gaa n’eluigwe n’anụ ahụ. E wezụga nke ahụ, echiche dum nke Assumption dabeere ná nkweta nke na Jisọs n’onwe ya rịgooro n’eluigwe n’anụ ahụ. Otú ọ dị, Bible na-asị na e mere ka Jisọs “dị ndụ,” ma ọ bụ kpọlite ya n’ọnwụ, “ná mmụọ.” (1 Pita 3:18, Dy; tụlee 1 Ndị Kọrint 15:45.) Pọl onyeozi na-ekwukwa na “anụ ahụ na ọbara apụghị iketa alaeze Chineke.”—1 Ndị Kọrint 15:42-50, Dy.
N’eziokwu, Bible kwuru banyere mbilite n’ọnwụ gaa n’eluigwe maka ndị Kraịst kwesịrị ntụkwasị obi e ji mmụọ nsọ tee mmanụ. Otú ọ dị, 1 Ndị Tesalọnaịka 4:13-17 na-eme ka o doo anya na mbilite n’ọnwụ nke a agaghị amalite ruo “ọnụnọ nke Onyenwe anyị,” n’oge mgbe ikpeazụ nke ọgbọ ọjọọ nke a. Ruo mgbe ahụ, Meri ga-anọ n’ụra ọnwụ, ya na ọtụtụ puku ndị Kraịst ndị ọzọ kwesịrị ntụkwasị obi.—1 Ndị Kọrint 15:51, 52.
Meri—Nwanyị nke Okwukwe
Ka o doo gị anya na ikwu ihe ndị dị n’elu abụghị na anyị adịghị akwanyere Meri ùgwù ma ọlị. N’ụzọ ihe ịrụ ụka na-adịghị ya, Meri bụ nwanyị bụ ezi ihe nlereanya—onye okwukwe ya kwesịrị nṅomi. Ọ nakweere ozugbo ibu ọrụ bụ́ ihe ùgwù nke ịghọ nne Jisọs, ya na ule na àjà nile nke ahụ ga-achọ. (Luk 1:38; 2:34, 35) Ya na Josef zụlitere Jisọs n’amamihe Chineke. (Luk 2:51, 52) Ọ nọnyeere Jisọs mgbe ọ na-ata ahụhụ n’elu osisi. (Jọn 19:25-27) Dịkwa ka onye na-eso ụzọ nke kwesịrị ntụkwasị obi, o ji nrubeisi nọgide na Jerusalem ma nwee ahụmahụ nke mwụpụ mmụọ Chineke na Pentikọst.—Ọrụ 1:13, 14; 2:1-4.
Echiche gbagọrọ agbagọ nke Meri adịghị asọpụrụ ma Onye Okike ahụ ma Meri. Nkwenkwe Assumption na-enye aka iji mesiwanye nzọrọ na-enweghị ihe mgbakwasị ụkwụ nke na Meri na-arịọchitere ndị ọzọ arịrịọ n’ihu Chineke ike. Ma Jisọs Kraịst ò nwere mgbe o nyere nkwado maka nkụzi dị otú ahụ? N’ụzọ megidere nke ahụ, ọ sịrị: “Mụ onwe m bụ ụzọ, na eziokwu, na ndụ: ọ dịghị onye ọ bụla na-abịakwute Nna m, ma ọ bụghị site na Mụ. Ọ bụrụ na unu ga-arịọ m ihe ọ bụla n’aha m, nke ahụ ka M ga-eme.” (Jọn 14:6, 14; tụlee Ọrụ 4:12.) Ee, nanị Jisọs Kraịst, ọ bụghị Meri, na-arịọrọ ndị ọzọ arịrịọ n’ihu Onye Okike ahụ. Ọ bụ site na Jisọs—ọ bụghị Meri—ka anyị kwesịrị ijekwuru Onye Na-enye anyị Ndụ maka “enyemaka n’oge mkpa.”—Ndị Hibru 4:16, Revised Standard Version, Mbipụta Katọlik.
Ịnakwere eziokwu banyere Meri pụrụ ịbụrụ ụfọdụ ihe mwute. Ma ọ dịghị nnọọ ihe ọzọ, ọ pụrụ ịpụta ịgbahapụ nkwenkwe ụfọdụ a nọworo na-enwe ruo ogologo oge na echiche ndị e nwere oké mmasị na ha. Otú ọ dị, ọ bụ ezie na ọ pụrụ ịbụ ihe mwute mgbe ụfọdụ, eziokwu na-emesịa ‘mee ka mmadụ pụọ n’ohu.’ (Jọn 8:32) Jisọsọ sịrị na Nna ya na-achọ ndị ga-efe ya ofufe “n’ime mmụọ na eziokwu.” (Jọn 4:24, Dy) Nye ndị Katọlik nwere obi eziokwu, okwu ndị a na-anọ dị ka ihe ịma aka.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a N’okpukpe Katọlik nkwenkwe, n’adịghị ka nkwenye nkịtị, bụ nke a sịrị na ọ bụ eziokwu nke kansụl njikọ okpukpe ma ọ bụ “ike nkụzi chọọchị na-apụghị ihie ụzọ” nke popu hiwere bn’ụzọ dị nsọ. N’ime ozizi ndị Chọọchị Katọlik kọwara n’ụzọ dị otú ahụ, nke kasị ọhụrụ bụ Assumption nke Meri.
[Igbe dị na peeji nke 27]
MERI Ọ̀ NWỤRỤ?
Meri ò nwụrụ n’ezie tupu nrịgo e chere na o rịgoro n’eluigwe? Ndị ọkà mmụta okpukpe Katọlik na-achọta onwe ha n’ihe isi ike nkà mmụta okpukpe a na-amaghị ka a ga-eme ya n’okwu a. Akwụkwọ bụ́ Nuovo dizionario di teologia na-egosipụta na “ọ ga-esi ike ikwu na Meri nwere ihe ùgwù ịbụ onye nwere nchebe pụọ n’ọnwụ, nke ọbụna Kraịst na-enweghị.” N’aka nke ọzọ, ikwu na Meri nwụrụ anwụ na-ewelitekwa okwu siri ike n’otu aka ahụ. Ọkà mmụta okpukpe bụ́ Kari Børresen rịbara ama na “ọnwụ bụ ahụhụ maka mmehie mbụ ahụ, nke, dị ka [ozizi “Ntụrụ Ime n’Enweghị Mmehie”] si dị, emetụtaghị Meri.” Mgbe ahụ, n’ihe ndabere dị aṅaa ka ọ ga-eji wee nwụọ? Ka a sịkwa ihe mere Pope Pius nke Iri na Abụọ ji jiri nlezianya zere okwu ahụ dum nke ọnwụ Meri mgbe ọ na-akọwa nkwenkwe Assumption.
Ọ dị mma na nkụzi Bible enweghị mgbagwoju anya dị otú ahụ. Ọ dịghị ebe ọ kụziri—ma ọ bụ ọbụna nyetụ echiche—nke na Meri sitere ná “ntụrụ ime n’enweghị mmehie.” N’ụzọ megidere nke ahụ, ọ na-egosi na Meri bụ mmadụ na-ezughị okè nke nwere mkpa mgbapụta. N’ihi nke a, mgbe a mụsịrị Jisọs, ọ gara n’ụlọ nsọ iji chụọrọ Chineke àjà mmehie. (Levitikọs 12:1-8; Luk 2:22-24) Dị ka mmadụ nile ọzọ na-ezughị okè, Meri mesịrị nwụọ.—Ndị Rom 3:23; 6:23.
Eziokwu a dị mfe dị nnọọ iche pụọ n’ajụjụ ndị a na-apụghị ịza aza nke nkwenkwe Assumption na-ewelite.
[Foto dị na peeji nke 26]
‘Mbugo n’Eluigwe nke Nwa Agbọghọ ahụ Na-amaghị Nwoke,’ nke Titian sere (ihe dị ka afọ 1488-1576)
[Ebe e si nweta foto]
Giraudon/Art Resource, N.Y.
[Foto dị na peeji nke 28]
Site n’iweta àjà mmehie n’ụlọ nsọ ahụ mgbe ọ mụsịrị Jisọs, Meri kwupụtara na ya bụ onye mmehie nke nwere mkpa mgbapụta