Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w90 11/1 p. 4-7
  • Ịgbanwe Ọdịdị Mmadụ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ịgbanwe Ọdịdị Mmadụ
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Mkpọrọgwụ nke Nsogbu ahụ
  • A Gbanwere Ọdịdị Mmadụ!
  • “Ekwensu nke Akwụkwọ Nsọ”
  • Mweghachi
  • “Okwu Chineke Dị Ndụ, Na-arụsikwa Ọrụ Ike”
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
  • N’ihi Gịnị Ka Anyị Ji Aka Nká, Na-anwụkwa Anwụ?
    Ihe Ọmụma nke Na-eduba ná Ndụ Ebighị Ebi
  • Ndị Ọchịchị n’Ógbè Ndị Bụ Mmụọ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1995
  • Olee Otú Chineke Dị?
    Teta!—2008
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
w90 11/1 p. 4-7

Ịgbanwe Ọdịdị Mmadụ

ONYE ọkà ihe ọmụma bụ Sir Isaiah Berlin kwuru, sị, “Ụmụ mmadụ adị-ghị adị ndụ nanị site n’ịlụso ihe ọjọọ ọgụ. Ha na-adị ndụ site n’inwe ezi ihe mgbaru ọsọ, n’otu n’otu na n’ozuzu ha.” Ma ọ̀ bụ mmadụ ole pụrụ ịchọta “ezi ihe mgbaru ọsọ” ndị dị otú ahụ? Ọtụtụ mgbe, ọdịdị mmadụ na-adalaga n’ihe ndị dị njọ, na-ebibikwa ebibi.

Dị ka ihe atụ, na Britain, imempụ nke ime ihe ike jiri 11 pasenti rịa elu n’oge na-adịghị anya gara aga. Onye praịm minista Britain sịrị, “Ọrụ anyị bụ ịgbalị ịchọta ihe njibido dị iche iche ka oké mmepeanya wee nwee ike ịga n’ihu.” Ma, iwu na nrụgide ndọrọ ndọrọ ọchị-chị, n’agbanyeghị otú e si buru ezi ihe n’uche wee mee ha, hà pụrụ ịgbanwe ọchịchọ ụmụ mmadụ ime ihe ọjọọ? Eziokwu ahụ nke bụ na mmebi iwu dị adị, na-amụbakwa n’agbanyeghị iwu nile a na-eme, ọbụna n’agbanyeghị ihe ndị siri ike a na-eme iji hụ na e debere iwu, na-agbara onwe ya àmà. A chọrọ ihe dị mkpa karịa ime iwu mgbochi. Ọdịdị ụmụ mmadụ n’onwe ya aghaghị ịgbanwe.

N’iji obi eziokwu leruo ndụ anya nke ọma, Bible kọwara ihe ndị dị njọ e ji mara mmadụ. Dị ka ihe atụ, Pọl onyeozi degaara ndị Kraịst ibe ya nọ na Galetia akwụkwọ banyere “omume rụrụ arụ, ruru unyi, na ndị na-adịghị ọcha . . . Ụmụ mmadụ na-abụ ndị iro ibe ha, na-alụrịta-kwa ọgụ; ha na-ekwo ekworo, na-ewe iwe, . . . na-enwekwa anyaukwu, na-aṅụbiga mmanya ókè, na-eme oké ememe ihe arụ, na-emekwa ihe ndị ọzọ yiri ndị a.” Dị ka ọ dị ná nsụgharị Today’s English Version nke e hotara okwu n’ebe a site na ya, àgwà ndị a nile na-eweda n’ala bụ “ihe ọdịdị mmadụ na-eme.”—Ndị Galetia 5:19-21.

Mkpọrọgwụ nke Nsogbu ahụ

Otú ọ dị, nsụgharị Today’s English Version, bụ nsụgharị nke na-adabereghị n’ihe ọ bụla ọzọ, okwu ahụ bụ “ihe ọdịdị mmadụ na-eme” bụkwa nkọwa nke ihe Pọl kwuru n’ezie. Okwu Grik nke Pọl ji mee ihe, bụ́ sarx, pụtara “anụ ahụ,” ọ bụghị “ọdịdị mmadụ.” N’ihi nke a, nsụgharị ndị e mere dị ka okwu dị na ha si dị na-ekwu okwu n’ebe a banyere “ọrụ nile nke anụ ahụ” iji kọwaa ihe Pọl kwuru n’ụzọ ziri ezi n’asụsụ anyị nke oge a.a

Ihe ndekọ Bible nke otú mmehie si bata n’etiti ụmụ mmadụ doro anya, dịkwa mfe—n’ezie, ọ dị mfe nke ukwuu nke na ọtụtụ ndị na-ahọrọ na ha agaghị ekwere ya. Nke a bụ otú Pọl si kọwaa ya: “Mmehie si n’aka otu mmadụ baa n’ụwa, dị ka ọnwụ si n’aka mmehie baakwa; ọnwụ wee si otú a gabiga ruo mmadụ nile, n’ihi na mmadụ nile mehiere.” (Ndị Rom 5:12) N’ebe a, Pọl na-ezo aka na Jenesis, bụ́ akwụkwọ mbụ nke Bible, nakwa n’okike nke mmadụ mbụ, bụ́ Adam, na nwunye ya bụ Iv. Nnupụisi ha leziri anya nupụ bụ ihe a maara nke ọma. N’ihi ya, a mara ha ikpe ọnwụ. Ụmụ ha nile ketara ezughị okè ha nile wee sikwa otu a na-anwụ anwụ. Ya mere, “mmadụ nile emehiewo, ha adịghị erukwa otuto Chineke.” N’ihi ihe nke a bụ isi, ọdịdị mmadụ taa, a sị nnọọ na ọ magbuole onwe ya, bụ ngosipụta e metọrọ emetọ nke ihe ọ bụ mgbe mbụ Chineke kere mmadụ n’izu okè.—Ndị Rom 3:23; Jenesis, isi 2 na 3.

A Gbanwere Ọdịdị Mmadụ!

Otú ọ dị, o kwere omume imeri ọtụtụ n’ime ihe ndị kasị njọ e ji mara ọdịdị mmadụ. N’eziokwu, Bible na-ekwu na anyị pụrụ ịgbanwe ọdịdị anyị n’echiche nke ịgbanwe ụdị mmadụ anyị bụ. N’ụzọ dị aṅaa? Site n’enyemaka nke mmụọ nsọ Chineke.—Ndị Rom 8:9.

N’akwụkwọ ozi o degaara ndị Kraịst ibe ya nọ na Kọlọsi, Pọl kwuru ya n’ụzọ dị otú a: “[Yipụchasịanụ, NW] mmadụ ochie ahụ, ya na omume ya nile, yikwasịkwa mmadụ ọhụrụ ahụ, nke a na-eme ya ka ọ dị ọhụrụ ruo ná mmazu dị ka onyinyo nke Onye kere ya si dị.” N’idepụtasị omume nile nke mmadụ ochie ahụ, ọ gụnyere ụfọdụ n’ime àgwà ndị na-akpali ụmụ mmadụ ime ihe na-ebibi ebibi: ọchịchọ ọjọọ, iwe, ọnụma, na obi ọjọọ.—Ndị Kọlọsi 3:5-10.

N’idegakwara ndị Kraịst nọ n’Efesọs ihe yiri nke ahụ, Pọl kpọtụkwara uche ọzọ ná mkpa ọ dị iyikwasị “mmadụ ọhụrụ” ahụ, bụ́ nke ọ gwara ha na ọ bụ “nke e kere dị ka Chineke chọrọ n’ime ezi omume na ịdị ọcha nke eziokwu ahụ.” Ọ gbasawanyere nkọwa ọ na-enye site n’ịsị: “Ka e wepụ ihe ilu na ọnụma na iwe na iti mkpu na nkwulu nile, ha na obi ọjọọ nile, n’etiti unu: nwerịtanụ obi ọma n’ahụ ibe unu, nweenụ obi ọmịiko.”—Ndị Efesọs 4:24, 31, 32.

Okwu Pọl ndị ahụ hà bụ ihe a pụrụ ime eme? Ndị mmadụ hà pụrụ ịgbanwe ụdị mmadụ ha bụ n’ezie? Ee, ihe àmà gosiri na ndị Kraịst oge mbụ ahụ mere oké mgbanwe dị iche iche ná ndụ ha. Dị ka otu ìgwè ndị mmadụ, ha guzopụrụ iche n’ụwa nke ha bi n’ime ya. Justin Martyr, bụ́ onye ọkọ akụkọ ihe mere eme n’oge ndị Kraịst mbụ dere, sị: “Anyị, bụ́ ndị kpọrọ ibe anyị asị, na-ebibiritakwa ibe anyị, n’ihi ndịrịta iche nke omume, na-ajụkwa iso ndị si n’agbụrụ ọzọ bikọọ, ugbu a, eri mgbe Kraịst pụtara, na-ebikọzi ọnụ n’ezi mmekọrịta nke anyị na ha, na-ekpekwara ndị iro anyị ekpere, na-agbalịkwa ịgba ndị ahụ kpọrọ anyị asị n’enweghị ezi ihe kpatara ya ume ibi ndụ dị mma dị ka ụkpụrụ nile zuru okè nke Kraịst si dị.”

Gịnị banyere taa? Ò kwere omume ime oké mgbanwe ndị dị otú ahụ n’ọdịdị mmadụ? Ee! Ọtụtụ iri puku ihe nlereanya dị iche iche na-egosi na a ka na-enwe oké mgbanwe ndị na-ewere ọnọdụ ugbu a. Ihe na-esonụ bụ nanị otu n’ime ha.

Stephen bụ onye a zụlitere n’otu n’ime obodo ebe ndị e nwere nnukwute ụlọ ọrụ dị iche iche n’England. Nna ya bụ onye na-ekweghị na Chineke dị. Mgbe ọ dị afọ 12, a mara Stephen ikpe ịnọ afọ atọ n’ụlọ akwụkwọ ebe a na-azụ ndị isi ike. O kwupụtawo na ya agawo ohi ngwupu ụlọ 64 ugbo dị iche iche! N’oge na-adịghị anya ọ kwụsịrị inwe nsọpụrụ maka ụdị ịchịisi ọ bụla, mgbe ọ na-etolitekwa, mpụ ndị ọ na-eme na-adịwanye njọ. Ha gunyere igwu wayo, ịṅụbiga mmanya ókè, ịkpata ọgba aghara na ịwakwasi ndị uwe ojii, bụ́ nke a tụrụ Stephen mkpọrọ n’ihi ihe ọjọọ nke ikpeazụ ahụ o mere. Ọdịdị ya ghọrọ nke ime ihe ike nke ukwuu. Ọ sịrị, “Ọ dịghị ụdị mpụ onye na-enweghị nsọpụrụ Chineke na-agaghị eme ma ọ bụrụ na mkpa ya dị ukwuu ruo otú ahụ.”

Gịnị pụrụ ịgbanwe onye omempụ obi tara mmiri otú a? Stephen mesịrị nakwere enyemaka site n’aka nwanne ya nwoke, onye ghọworo otu n’ime Ndịàmà Jehova. Mgbe ọ mụsịworo Bible ruo ogologo oge nta, Stephen malitere iyikwasị “mmadụ ọhụrụ” ahụ. Mgbanwe ndị o mere dị ukwuu n’ezie. Ugbu a, mgbe afọ ise gasịworo, ọ nọ n’alụmdi na nwunye obi ụtọ, bụrụkwa onye a na-asọpụrụ nke nọ n’ọgbakọ Ndịàmà Jehova, nke ọ na-eje ozi n’ime ya dị ka ohu na-eje ozi.

Ya mere, a pụrụ ịgbanwe ọdịdị mmadụ n’ọnọdụ ndị mmadụ n’otu n’otu. Ma adịghị ike nke ụmụ mmadụ ọ̀ bụ nanị ihe kpatara ‘mweda n’ala nke mmepeanya’ taa?

“Ekwensu nke Akwụkwọ Nsọ”

Pọl onyeozi dere amụma kwesịrị ịrịba ama banyere “mgbe ikpeazụ” ndị a. E depụtara okwu ya n’igbe nke dị n’elu ebe a. Rịba ama na ọ̀tụ̀tụ̀ ịdị elu nke ime ihe ike na ihe ọjọọ na-eweta “oge dị oké egwu.” Ọ̀ bụ ọdịdị mmadụ kpatara ihe a nile?—2 Timoti 3:1.

Ee e, e nwere ihe ọzọ, bụ́ ike dị oké njọ nke na-akwalite ihe ọjọọ, nke ji adịghị ike nile nke ụmụ mmadụ na-eme ihe. Dị nnọọ ka ọ na-esiri ndị mmadụ ike ikwere na mmadụ ketara mmehie eketa, ha na-ahụkwa ya dị ka ihe siri ike ịnakwere na e nwere ike nke dị elu karịa mmadụ nke na-achọ iji ya eme ihe. Ma Bible na-asị na ike dị otú ahụ dị adị n’ezie: Setan bụ Ekwensu.

Okwu ahụ bụ “Ekwensu” (nke pụtara “onye nkwutọ”) pụtara 33 ugbo n’ime Bible, “Setan” (nke pụtara “onye nguzogide”) pụtakwara 52 ugbo. Ihe ka ọtụtụ n’izo aka ndị ahụ metụtachara otu ajọ onye ahụ bụ mmụọ. Ma, ụfọdụ ndị na-agọpụ ịdị adị nke Setan nke bụ onye, na-ahọrọ ikwu, sị: “Ọ bụ ọdịdị mmadụ, tinyere mkpali ya nile ime mmehie bụ Ekwensu nke Akwụkwọ Nsọ.”b Ma, ọ bụ ihe na-akpali mmasị ịhụ na n’ihe ndekọ banyere ohu Jehova kwesịrị ntụkwasị obi, bụ́ Job, ihe odide Hibru ahụ jiri okwu bụ has.Satan’, bụ́ Setan ahụ mee ihe, na Luk 4:2 [NW], anyị na-agụkwa na ọ bụ Ekwe­nsu ahụ (Grik, ho dị.a’bo.los) nwara Jisọs ọnwụnwa. (Job 1:6) N’ọnọdụ abụọ ndị ahụ, ụtọ asụsụ e ji mee ihe gosiri na ọ dị onye a na-ezo aka na ya kpọmkwem. O metụtaghị ọdịdị mmadụ.

N’idegara ndị Efesọs akwụkwọ, Pọl onyeozi tụkwasịrị ihe ná nghọta anyị nke otú Setan dịruru n’ike mgbe o kwuru okwu banyere “ndị onwe ụwa nke ọchịchị a, . . . ndị agha mmụọ nke ajọ ihe n’ebe dị n’eluigwe.” (Ndị Efesọs 6:12) Gụnyere Setan bụ Ekwensu, “ndị onwe ụwa” ndị ahụ bụ ndị mmụọ ọjọọ, ajọ ndị mmụọ e kere eke a na-adịghị ahụ anya. Ha “na-eduhie ụwa nile mmadụ bi,” na-eji ọnọdụ mmadụ nke dara ada na-eme ihe ruo n’ókè kasị ukwuu ha pụrụ iji ya mee ihe. (Mkpughe 12:9) Ọ bụ n’ihi nke a ka Pọl ji gbasie onye Kraịst ọ bụla ume ike “iguzogide ihe nile Ekwensu na-ezupụta.” Ọ bụ otu ihe bụ isi nke na-akpata ndakpọ nke ihe a kpọrọ mmadụ ndị anyị na-ahụ gburugburu anyị.—Ndị Efesọs 6:11.

Mweghachi

Pita, bụ́ onye nọrọ n’otu oge ahụ Pọl dịrị ndụ, na-emesi anyị obi ike na Setan na ndị mmụọ ọjọọ ya agaghị adịgide ruo mgbe ebighị ebi ịdị na-emesi ihe a kpọrọ mmadụ ike. Ọ sịrị: “Ma dị ka nkwa ya si dị, anyị na-ele anya eluigwe ọhụrụ na ụwa ọhụrụ, nke ezi omume bi n’ime ha.” (2 Pita 3:13) N’eziokwu, n’oge na-adịghị anya ugbu a, ụdị ngosipụta nile nke ihe ọjọọ agaghị abụkwa akụkụ nke ihe a na-ahụ n’etiti ụmụ mmadụ. A ga-ebibi Setan na ndị mmụọ ọjọọ ya. (Ndị Rom 16:20; Mkpughe 20:l-3) Mgbe ahụ, n’ezie, ọdịdị mmadụ ga-egosipụta “otuto Chineke,” na-enwe ndụ ebighị ebi dị ka olileanya e ji n’aka nye ezinụlọ ihe a kpọrọ mmadụ.—Ndị Rom 3:23.

Onye isi ala America bụ Thomas Jefferson kwuru, sị, “Anọwo m mgbe nile na-ekwu, aga m anọgidekwa na-ekwu, na ịmụsi Mpịakọta Nsọ ahụ ike ga-eme ka ndị mmadụ bụrụ ụmụ amaala dị mma karị . . . Bible na-azụpụta ndị kachasị mma n’elu ụwa.” Dị ka anyị hụworo, a pụrụ ịgbanwe ọdịdị mmadụ anyị ma ọ bụrụ na anyị enye ozi siri ike dị na Bible ohere imetụta ndụ anyị. (Ndị Rom 12:2) Anyị pụrụ ịhọrọ ime mgbalị ịnakwere ihe dị mma na ihe na-egosi nsọpụrụ Chineke. Ijikwa wusie anyị ike ná mgbalị anyị na-eme imeziwanye ọnọdụ anyị, anyị pụrụ ịhọrọ isoro ndị ahụ ji obi eziokwu na-achọ ime otu ihe ahụ na-akpakọrịta. (Ndị Hibru 10:24, 25) Ndịàmà Jehova dị njikere inyere gị aka n’ụzọ ọ bụla ọ pụrụ ikwe mee. Gịnị mere i meghị ka gị na ha zute ugbu a!

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

a Tụlee: Nsụgharị New World Translation of the Holy Scriptures; The Holy Bible, nke Robert Young; The Emphasised Bible, nke Joseph B. Rotherham; The Holy Bible in Modern English, nke Ferrar Fenton; The Modern Reader’s Bible, nke Richard G. Moulton.

b Nkwupụta nkwenkwe nke ndị òtù Christadelphian, bụ́ otu ịrọ òtù nke Krisendọm.

[Foto dị na peeji nke 6]

“MGBE IKPEAZU”​—Nkọwa Bible Nyere Ya

“Ma mara nke a, na oge dị oké egwu ga-abịa na mgbe ikpeazụ. N’ihi na mmadụ ga-abụ ndị na-ahụ nanị onwe ha n’anya, ndị na-ahụ ego n’anya, ndị na-anya isi, ndị mpako, ndị nkwulu, ndị na-ekwenyeghị ndị mụrụ ha, ndị na-enweghị ekele, ndị na-adịghị ọcha n’obi, ndị ihe mmadụ ibe ha na-adịghị atọ ụtọ, ndị na-adịghị agba ndụ, ndị na-ebo ebubo ụgha, ndị na-adịghị ejide onwe ha, ndị dị ka anụ ọhịa, ndị na-adịghị ahụ ezi ihe n’anya, ndị na-arara mmadụ nye n’aka ndị iro ha, ndị isi ike, ndị a fụliworo elu, ndị na-ahụ ihe ụtọ n’anya kama ịhụ Chineke n’anya; ndị na-enwe ụdị nke nsọpụrụ Chineke, ma ha agọwo ike ya: gị gbakụtakwa ndị a azụ.”—2 Timoti 3:1-5.

[Foto dị na peeji nke 7]

N’oge na-adịghị anya, ọdịdị mmadụ ga-egosipụta otuto Chineke n’ụzọ zuru ezu

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya