E Nyeghachiri Ha Ụgwọ Ọrụ n’Ihi Ijegharị n’Ụzọ Ụta Na-adịghị Ya
JEHOVA na-agọzi ma na-enyeghachi ndị na-ejere ya ozi n’ikwesị ntụkwasị obi ụgwọ ọrụ. Ọ pụrụ ịdị ha mkpa ichere ruo oge ụfọdụ iji hụ mmezu nke nzube dị iche iche nke Chineke, ma lee ihe obi ụtọ ọ bụ mgbe a na-enwe ahụmahụ nke ngọzi ya!
E mere ihe atụ ọma banyere nke a ihe dị ka puku afọ abụọ gara aga n’ọnọdụ nke onye nchụàjà bụ́ onye Juu bụ́ Zakaraịas na nwunye ya, bụ́ Elizabet, ha abụọ sitere n’ezinụlọ Erọn. Chineke ekwewo nkwa iji ụmụ gọzie ndị Israel ma ọ bụrụ na ha ejeere ya ozi n’ikwesị ntụkwasị obi. Ọ sịrị na ụmụ bụ ụgwọ ọrụ. (Levitikọs 26:9; Abụ Ọma 127:3) Otú ọ dị, Zakaraịas na Elizabet enweghị nwa, ha emewokwa agadi.—Luk 1:1-7.
Akwụkwọ Nsọ sịrị na Zakaraịas na Elizabet “ha abụọ bụ ndị ezi omume n’ihu Chineke, na-aga n’ihe nile Onyenwe anyị nyere n’iwu n’ihe nile Ọ gụrụ n’ihe ziri ezi na-adịghị ịta ụta.” (Luk 1:6) Ha hụrụ Chineke n’anya nke ukwuu nke na ọ bụghịrị ha ibu arọ ịgbaso ụzọ ezi omume na idebe ihe nile o nyere n’iwu.—1 Jọn 5:3.
Ngọzi Ndị A Na-atụghị Anya Ha
Ka anyị laghachi azụ ná ngwụsị oge udu mmiri ma ọ bụ ná mmalite ọkọchị nke afọ 3 T.O.A. Herọd Onye Ukwu na-achị dị ka eze na Judia. Otu ụbọchị, Zakaraịas onye nchụàjà abata n’Ebe Nsọ nke ụlọ nsọ dị na Jerusalem. Ka ndị mmadụ gbakọrọ na-ekpe ekpere ná mpụga ụlọ nsọ ahụ, o surere ihe nsure ọkụ na-esi ísì ụtọ n’ebe ịchụàjà ọlaedo ahụ. Ma eleghị anya ọ bụ nke a na-ele anya dị ka nke kasị dị ùgwù n’ozi ndị a na-eje kwa ụbọchị, a na-eme nke a mgbe a chụsịrị àjà. Onye nchụàjà pụrụ inwewo ihe ùgwù nke a nanị otu ugbo ná ndụ ya.
Ihe Zakaraịas hụrụ riri ya ọnụ. Lee, mmụọ ozi Jehova na-eguzo n’akụkụ aka nri nke ebe nsure ọkụ ahụ na-esi ísì ụtọ! Obi lọrọ onye nchụàjà ahụ meworo agadi mmiri, egwu tụọkwa ya. Ma mmụọ ozi ahụ sịrị: “Atụla egwu, Zakaraịas: n’ihi na a nụrụ arịrịọ gị, nwunye gị Elizabet ga-amụkwara gị nwa nwoke, ị ga-akpọkwa aha ya Jọn.” Ee, Jehova anụwo ekpere sitere n’ala ala obi nke Elizabet na Zakaraịas.—Luk 1:8-13.
Mmụọ ozi ahụ kwukwasịrị: “Ị ga-enwekwa ọṅụ na obi ụtọ; ọtụtụ mmadụ ga-aṅụrịkwa ọṅụ n’ọmụmụ ya. N’ihi na ọ ga-abụ onye ukwu n’anya Onyenwe anyị, ọ gaghị aṅụkwa mmanya vine na ihe ọṅụṅụ na-aba n’anya ma ọlị; a ga-emekwa ka o jupụta ná Mmụọ Nsọ, ọbụna site n’afọ nne ya.” Jọn ga-abụ onye Naziraịt nke jupụtara ná mmụọ nsọ Chineke ná ndụ ya nile. Mmụọ ozi ahụ gara n’ihu, sị: “Ọtụtụ mmadụ n’ime ụmụ Israel ka ọ ga-emekwa ka ha chigharịkwute Onyenwe anyị Chineke ha. Ya onwe ya ga-agakwa n’ihu Ya n’ime mmụọ na ike Elaịja, ime ka obi ndị bụ nna chigharịkwute ụmụ ha, imekwa ka ndị na-anụghị ihe chigharịa ịga n’uche ndị ezi omume; idozi nye Onyenwe anyị otu ndị nke a kwadebewooro Ya.”—Luk 1:14-17.
Zakaraịas ajụọ, sị: “Olee ihe m ga-eji mara nke a? n’ihi na mụ onwe m bụ agadi, nwunye m aghọwokwa agadi.” Mmụọ ozi ahụ zaghachiri: “Mụ onwe m bụ Gebriel, onye na-eguzo n’ihu Chineke; e zitekwara m ịgwa gị okwu, na izi gị ozi ọma ndị a. Leekwa, ị ga-ekpuchi ọnụ, ị gaghị apụkwa ikwu okwu, ruo ụbọchị ahụ mgbe ihe ndị a ga-eme, n’ihi na i kweghị okwu m ndị a, nke ga-emezu n’oge ha.” Mgbe Zakaraịas si n’ụlọ nsọ ahụ pụta, ọ pụghị ikwu okwu, ndị mmadụ ghọtakwara na ọ hụwo ihe karịrị ike mmadụ. Nanị ihe ọ pụrụ ime bụ ịdị na-emegharị ahụ, na-eji mmegharị aka na-akọwapụta echiche ya. Mgbe o jesịrị ozi ihu ọha ya, ọ laghachiri n’ụlọ ya.—Luk 1:18-23.
Ihe Ọṅụ
Dị ka e kwere ná nkwa ahụ, n’isi nso Elizabet nwere ihe mere ọ ga-eji ṅụrịa. Ọ tụụrụ ime, na-ewepụ ihe nkọcha nke ịbụ àgà. Onye ikwu ya bụ́ Meri nwekwara ọṅụ, n’ihi na otu mmụọ ozi ahụ, bụ́ Gebriel, gwara ya, sị: “Leekwa, ị ga-atụrụ ime, mụta Nwa nwoke, kpọọ aha Ya Jisọs. Nwa nwoke ahụ ga-abụ onye ukwu, a ga-akpọkwa Ya Ọkpara nke Onye kachasị ihe nile elu: Onyenwe anyị Chineke ga-enyekwa Ya ocheeze nna Ya Devid.” Meri dị njikere ịrụ ọrụ dị ka “ohu nwanyị nke Onyenwe anyị.”—Luk 1:24-38.
Meri ji ọsọ gbaga n’ụlọ Zakaraịas na Elizabet n’obodo Judia ahụ bụ ugwu ugwu. Ka ọ nụrụ ụda nke ekele Meri, nwa ọhụrụ nọ n’akpa nwa Elizabet maliri elu. N’okpuru ike mmụọ nsọ Chineke, Elizabet tiri mkpu sị: “Gị onwe gị bụ onye a gọziri agọzi n’etiti ndị inyom, ọ bụkwa onye a gọziri agọzi ka mkpụrụ nke afọ gị dị. Olee ebe ka nke a sikwa ruo m, na nne Onyenwe m ga-abịakwute m? N’ihi na lee, mgbe olu ekele gị ruru ná ntị m, nwa m wuliri n’afọ m n’obi ụtọ. Ngọzi na-adịkwara nwanyị ahụ nke kwere na ihe ndị a ga-emezu, bụ́ nke a gwaworo ya site n’ọnụ Onyenwe anyị.” Meri ji ọṅụ dị ukwuu zaghachi. Ọnụnọ ya na Elizabet dịruru ihe dị ka ọnwa atọ.—Luk 1:39-56.
A Mụọ Jọn
Mgbe oge ruru Elizabet na Zakaraịas meworo agadi mụtara otu nwa nwoke. N’ụbọchị nke asatọ, e biri nwa ọhụrụ ahụ úgwù. Ndị ikwu chọrọ ịgụ nwa ahụ Zakaraịas, ma Elizabet sịrị: “Ee e; kama a ga-akpọ ya Jọn.” Di ya ka dara ogbi ò kwenyere? N’elu mbadamba nkume, o dere, sị: “Aha ya bụ Jọn.” Ozugbo ahụ, a tọpere ire Zakaraịas, o wee malite ikwu okwu, na-agọzi Jehova.—Luk 1:57-66.
N’ịbụ onye jupụtara ná mmụọ nsọ, onye nchụàjà ahụ na-enwe ọṅụ buru amụma. O kwuru okwu ka a ga-asị na e weliteworị Onye Mgbapụta ahụ e kwere ná nkwa—‘mpi nke nzọpụta n’ụlọ Devid’—n’ikwekọ n’ọgbụgba ndụ Abraham banyere Mkpụrụ nke ngọzi nye mba nile. (Jenesis 22:15-18) Dị ka onye na-ebutere Mesaịa ahụ ụzọ, nwa nwoke Zakaraịas nke a mụrụ site n’ọrụ ebube ‘ga-aga n’ihu Jehova ime ka ndị mmadụ mara banyere nzọpụta.’ Ka ọtụtụ afọ na-agafe, Jọn nọgidere na-eto ma na-esiwanye ike ná mmụọ.—Luk 1:67-80.
E Nyeghachiri Ha Ụgwọ Ọrụ n’Ụba
Zakaraịas na Elizabet bụ ezi ihe atụ nke okwukwe na ndidi. Ha nọgidere na-ejere Jehova ozi ọ bụ ezie na ọ dị mkpa ka ha chere Chineke, ngọzi ha ndị kasị ukwuu bịara nanị mgbe ha meworo nnọọ agadi.
Ma, lee aha ọtụtụ ngọzi Elizabet na Zakaraịas nwetara! N’okpuru ike mmụọ Chineke, ha abụọ buru amụma. Ha nwere ihe ùgwù nke ịghọ ndị mụrụ na ndị ozizi nke onye butere Mesaịa ahụ ụzọ, bụ́ Jọn Onye Na-eme Baptism. Ọzọkwa, Chineke lere ha anya dị ka ndị ezi omume. N’otu aka ahụ, ndị na-agbaso ụzọ nsọpụrụ Chineke taa pụrụ inwe nguzo ezi omume n’ebe Chineke nọ ma nata ọtụtụ ụgwọ ọrụ a gọziri agọzi n’ihi ijegharị n’enweghị ịta ụta n’ihe nile Jehova nyere n’iwu.