-
Jisọs Ezipụ Ndị Na-eso Ụzọ 70Ụlọ Nche—1998 | Mach 1
-
-
Jisọs nyekwuru ndị na-eso ụzọ ya ntụziaka, sị: “Unu ewela akpa ego, ma ọ bụ akpa ije, ma ọ bụ akpụkpọ ụkwụ: unu ekelekwala onye ọ bụla n’ụzọ.” (Luk 10:4) Ọ bụ omenala onye njem iwere ọ bụghị nanị akpa ije na ihe oriri kamakwa akpụkpọ ụkwụ ọzọ, n’ihi na ike akpụkpọ ụkwụ pụrụ iricha, eriri ha pụkwara ịdọbi. Ma ndị na-eso ụzọ Jisọs agajeghị ichegbuwa onwe ha banyere ihe ndị dị otú ahụ. Kama nke ahụ, ha gaje ịtụkwasị obi na Jehova ga-elekọta ha site n’aka ndị Israel ibe ha, bụ́ ndị ile ọbịa bụ omenala ha.
Ma n’ihi gịnị ka Jisọs ji gwa ndị na-eso ụzọ ya ka ha ghara ikele onye ọ bụla? Hà gaje ịbụ ndị na-adịghị emesapụ ihu, ọbụna ghara igosi àgwà ọma? Ọ dịghị ma ọlị! Okwu Grik bụ́ a·spaʹzo·mai, nke pụtara ibi ọma ekele, pụrụ ịpụta ihe karịrị ịsị “ndewo” ma ọ bụ “daalụ” nke omume ọma. Ọ pụkwara ịgụnye omenala nke isusu ọnụ, ibi ọma, na ogologo mkparịta ụka nke ga-ebilite mgbe mmadụ abụọ maara onwe ha zutere. Otu onye na-enye nkọwa na-ekwu, sị: “Ikele ekele n’etiti ndị Ọwụwa Anyanwụ abụghị, dị ka anyị na-eme, ihulatatụ isi, ma ọ bụ ikwe n’aka, kama e mere ya site n’ọtụtụ ibi ọma, na ihuru ehuru, na ọbụna ịkpọ isi ala. Ihe a nile chọrọ oge dị ukwuu.” (Tụlee 2 Ndị Eze 4:29.) Jisọs si otú a nyere ụmụazụ ya aka izere ndọpụ uche ndị na-adịghị mkpa, ọ bụ ezie na ha bụ omenala.
-
-
Jisọs Ezipụ Ndị Na-eso Ụzọ 70Ụlọ Nche—1998 | Mach 1
-
-
Ọrụ ikwusa ozi ọma Alaeze Chineke na ime ndị na-eso ụzọ bụ nke ihe karịrị nnọọ Ndịàmà Jehova 5,000,000 na-arụzu ugbu a gburugburu ụwa. (Matiu 24:14; 28:19, 20) Ha na-aghọta na ozi ha dị ngwa. Ya mere, ha na-eji oge ha eme ihe n’ụzọ kasị mma, na-ezere ndọpụ uche ndị ga-egbochi ha inye ọrụ ha dị mkpa ntụkwasị uche zuru ezu.
Ndịàmà Jehova na-agba mbọ igosi ndị nile ha na-ezute omume enyi. Otú o sina dị, ha adịghị nnọọ etinye ọnụ ná nkata na-enweghị isi, ha adịghịkwa ekere òkè n’arụmụka banyere okwu ọha na eze ma ọ bụ mgbalị ndị na-akụ afọ n’ala nke ụwa a ịgwọta ikpe na-ezighị ezi. (Jọn 17:16) Kama nke ahụ, nkwurịta okwu ha na-elekwasị anya na nanị ihe ngwọta na-adịte aka nke nsogbu mmadụ—Alaeze Chineke.
-