“Jisọs Kraịst Bụ Onyenwe Anyị”—N’ụzọ Dị Aṅaa, Olè Mgbe Kwa?
“ONYENWE ANYỊ wee sị Onyenwe m, Nọdụ ala n’aka nri m, ruo mgbe m ga-edo ndị iro gị ka ihe mgbakwasị ụkwụ dịịrị ụkwụ gị abụọ.” Nke a bụ nsụgharị nke Abụ Ọma 110:1 dị ka King James Version si sụgharịa ya. Ònye bụ “ONYENWE ANYỊ” n’ebe a, ònye kwa ka ọ na-agwa?
Nsụgharị ka zie ezie nke ihe odide Hibru ahụ na-aza ụjụjụ nke mbụ ahụ ngwa ngwa. “Okwu Jehova gwara Onyenwe m bụ: . . . ” Otú a, “ONYENWE ANYỊ” nke e dere ná mkpụrụ akwụkwọ gbara okpotokpo na-ezo aka n’ebe Chineke ahụ pụrụ ime ihe nile, bụ́ Jehova n’onwe ya nọ. Ọ bụ ezie na King James Version nakweere aha Chineke site n’iji “ONYENWE ANYỊ” mee ihe kama iji “Onyenwe anyị,” ọ bụghị ya bụ nke mbụ jigharịrị ùtú aha ndị a, n’ihi na Septuagint Grik ochie ahụ, nke asụgharịtara site na Hibru, jiri “Onyenwe anyị” mee ihe iji dochie anya Jehova ná mbipụta ya ndị mesịrị pụta. N’ihi gịnị? N’ihi na e ji ùtú aha ahụ bụ́ “Onyenwe anyị” dochie aha Chineke ahụ, bụ́ Tetragrammaton ahụ (יהוה). “Iji ùtú aha ahụ bụ Onyenwe anyị [kyʹri·os] na-eme ihe bụ nke e nwere ike ịkọwa nakwa n’ụzọ kachasị mfe site n’ojiji e ji ùtú aha ahụ na-eme ihe n’ụlọ nzukọ ndị Juu kama aha ahụ e ji gbaa ọgbụgba ndụ nke bụ Yahveh [Jehova], mgbe a na-agụ Akwụkwọ Nsọ,” ka onye ọkà mmụta bụ́ A. E. Garvie na-ekwu.
Bible na-eme ka a mata Jehova dị ka “Onyenwe Anyị.” (Jenesis 15:2, 8; Ọrụ 4:24; Mkpughe 6:10) A na-akpọkwa ya “ezi Onyenwenụ” (NW) nakwa “Onyenwe ụwa nile.” (Ọpụpụ 23:17; Joshua 3:13; Mkpughe 11:4) Mgbe ahụ, ònye bụ “Onyenwe anyị” nke ọzọ ahụ nke Abụ Ọma 110:1, ò sikwa aṅaa ghọọ onye Jehova matara dị ka “Onyenwe anyị”?
Jisọs Kraịst Di ka “Onyenwe anyị”
A na-akpọ Jisọs “Onyenwe anyị” n’Oziọma anọ ahụ karịsịa na Luk na Jọn. Na narị afọ mbụ O.A., ùtú aha ahụ bụ nke nkwanye ùgwù na nke àgwà ọma, nke ya na “Ọga,” ha nhata. (Jọn 12:21; 20:15, Kingdom Interlinear) N’Oziọma Mak, okwu ahụ bụ́ “Onye ozizi,” ma ọ bụ Rab·boʹni, bụ nke e ji mee ihe ọtụtụ ụgboro karị n’izo aka n’ebe Jisọs nọ. (Jiri Mak 10:51 tụnyere Luk 18:41.) Ọbụna ajụjụ Sọl mgbe ọ nọ n’ụzọ na-aga Damaskọs, “Ị̀ bụ onye, Onyenwe anyị?” nwere otu echiche a nke iji nkwanye ùgwù na-achọ ịmata ihe. (Ọrụ 9:5) Ma ka ndị na-eso ụzọ Jisọs bịara mata Onyenwe ha, o doro anya na ojiji ha na-eji ùtú aha ahụ bụ́ “Onyenwe anyị” eme ihe nwere ihe ndị ọzọ o kwupụtara karị nanị nkwanye ùgwù.
Ka ọnwụ na mbilite n’ọnwụ ya gasịrị ma tupu o rigoro n’eluigwe, Jisọs gosiri ndị na-eso ụzọ ya onwe ya ma mee nkwupụta okwu a dị ịtụnanya: “E werewo ike nile dị n’eluigwe na n’elu ụwa nye m.” (Matiu 28:18) E mesịa, n’ụbọchị Pentikọst, n’okpuru ike nke mmụọ nsọ ahụ a wụkwasịrị ha, Pita zoro aka n’Abụ Ọma 110:1 wee sị: “Ya mere ka ụlọ Israel nile mazuo, na Chineke mere Ya ka Ọ bụrụ Onyenwe anyị na Kraịst anyị, bụ́ Jisọs ahụ Onye unu onwe unu kpọgidere n’elu [osisi ịta ahụhụ, NW].” (Ọrụ 2:34-36) N’ihi ịkwesi ntụkwasị obi ya ruo n’ọnụ ọnwụ ihere n’elu osisi ịta ahụhụ, e mere ka Jisọs si n’ọnwụ bilie ma nye ya nkwụghachi ụgwọ kachasịnụ. Mgbe ahụ ọ malitere ịbụ onyenwenụ n’eluigwe.
Onyeozi bụ Pọl mesịrị okwu Pita ike dị ka eziokwu mgbe o dere, sị na Chineke ‘mere ka ọ [Kraịst] nọdụ n’aka nri ya n’ebe dị n’eluigwe, kachasị ha nile elu, bụ ịbụ onyeisi, na ịchịisi, na ike, na ịbụ onyenwe mmadụ, na aha ọ bụla a na-akpọ ya aha, ọ bụghị nanị n’oge a, kama ọ bụkwa n’oge nke gaje ịbịa.’ (Ndị Efesọs 1:20, 21) Ịbụ onyenwenụ nke Jisọs Kraịst karịrị ịbụ ndị nwenụ nile, ọ ga-adịgidekwa banye n’ime ụwa ọhụrụ. (1 Timoti 6:15) E buliwo “elu nke ukwuu” ma nye ya “aha ahụ nke karịrị aha nile ọ bụla elu” ka onye ọ bụla wee mata “na Jisọs Kraịst bụ Onyenwe anyị, ka e wee nye Chineke, bụ Nna, otuto.” (Ndị Filipai 2:9-11) Akụkụ mbụ nke Abụ Ọma 110:1 si otú ahụ mezuo, “e dowokwa ndị mmụọ ozi na ndị na-achị isi na ndị dị ike” n’okpuru ịbụ onyenwenụ Jisọs.—1 Pita 3:22; Ndị Hibru 8:1.
N’Akwụkwọ Nsọ Hibru, okwu ahụ bụ́ “Onyenwenụ kachasị ndị nwenụ nile” dịịrị nanị Jehova. (Deuterọnọmi 10:17; Abụ Ọma 136:2, 3) Ma n’okpuru ike nke mmụọ nsọ Pita kwuru banyere Kraịst Jisọs, sị: “Onye ahụ bụ Onyenwe mmadụ nile, [ma ọ bụ, “Onyenwenụ anyị nile,” Goodspeed].” (Ọrụ 10:36) Ọ bụ n’ezie “Onyenwe ma ndị nwụrụ anwụ ma ndị dị ndụ.” (Ndị Rom 14:8, 9) Ndị Kraịst na-amata Jisọs Kraịst ngwa ngwa dị ka Onyenwe ha na Di Nwenụ ha ma jiri ọchịchọ obi ha na-egosi ya nrubeisi dị ka ndị ọ na-achị, ndị o ji ọbara ya dị oké ọnụ ahịa zụta. Jisọs Kraịst achịwokwa achị dị ka Eze kachasị ndị eze nile na Onyenwenụ kachasị ndị nwenụ nile n’elu nzukọ ya kemgbe Pentikọst 33 O.A. Ma ugbu a, kemgbe 1914, e nyewo ya ike ọchịchị dị ka eze ịchị n’ọkwá ahụ ebe e doworo ndị iro ya dị ka ‘ihe mgbakwasị ụkwụ dịịrị ụkwụ ya abụọ.’ Oge eruwokwa ugbu a maka ya ‘inwe ike n’ahụ mmadụ n’etiti ndị iro ya,’ ha nile ná mmezu nke Abụ Ọma 110:1, 2.—Ndị Hibru 2:5-8; Mkpughe 17:14; 19:16.
Mgbe ahụ, olee otú a ga-esi ghọta okwu Jisoṣ bụ “Nna m raara ihe nile nye m n’aka,” nke o kwuru tupu ọnwụ na mbilite n’ọnwụ ya? (Matiu 11:25-27; Luk 10:21, 22) Nke a abụghị okwu sara mbara dị ka ndị ahụ a tụleworo. Ma na Matiu ma na Luk, nghọta dị okwu ahụ gburugburu na-ekpughe na Jisọs na-ekwu banyere ihe ọmụma e zopuru n’anya ndị maara ihe n’ụzọ ụwa ma bụrụ nke e kpughere site na ya n’ihi na ọ “mazuru” Nna ahụ. Mgbe e mere ya baptism n’ime mmiri, mụọkwa ya dị ka Ọkpara ime mmụọ nke Chineke, Jisọs nwere ike ichetaghachi ọdịdị ya mbụ n’eluigwe tupu ọ ghọọ mmadụ na ihe ọmụma nile ndị so ya, ma nke a dị iche n’ịbụ onyenwe mmadụ nke o mesịrị bụrụ.—Jọn 3:34, 35.
Ịsetịpụ Jisọs Kraịst Iche Dị ka Onyenwenụ
Ụfọdụ nsụgharị nke Akwụkwọ Nsọ Grik nke ndị Kraịst na-akpata otu nsogbu mgbe ha na-asụgharị nhota ndị sitere n’Akwụkwọ Hibru ndị zoro aka n’ebe “ONYENWE ANYỊ,” Jehova Chineke nọ n’ụzọ doro anya. Dị ka ihe atụ, jiri Luk 4:19 tụnyere Aịsaịa 61:2 na nke ọ bụla n’ime King James Version ma ọ bụ The New Jerusalem Bible. Ụfọdụ na-ekwusi ike na Jisọs weghaara ùtú aha bụ́ “Onyenwe anyị” site n’aka Jehova nakwa na Jisọs mgbe ọ nọ n’anụ ahụ bụ n’ezie Jehova, ma nke a bụ ịrụ ụka nke na-enweghị ihe nkwado ọ bụla n’Akwụkwọ Nsọ. Jehova Chineke na Ọkpara ya, Jisọs Kraịst bụ ndị e ji nlezianya mee ka ha dị iche n’ebe ibe ha nọ n’Akwụkwọ Nsọ. Jisos mere ka a mata aha Nna ya ma nọchite anya ya.—Jọn 5:36, 37.
N’ihe atụ ndị na-esonụ, rịba ama nhota ndị sitere n’Akwụkwọ Nsọ Hibru ka ha si pụta n’Akwụkwọ Nsọ Grik. E hotachara ma Jehova Chineke ma Onye ya E Tere Mmanụ, ma ọ bụ Mesaịa n’Ọrụ Ndị Ozi 4:24-27, nke na-ehota okwu site n’Abụ Ọma 2:1, 2. Nghọta dị gburugburu Ndị Rom 11:33, 34 na-ezo aka n’ụzọ doro anya n’ebe Chineke nọ, bụ́ Isi Iyi nke amamihe na ihe ọmụma nile, ya na nhota sitere n’Aịsaịa 40:13, 14. Ka ọ na-edegara ọgbakọ Kọrint akwụkwọ, Pọl hotaghachiri okwu ahụ, sị, “Ònye maara uche Onyenwe anyị?” wee kwuokwa, sị: “Ma anyị onwe anyị nwere uche nke Kraịst.” Onyenwe anyị Jisọs kpugheere ndị na-eso ụzọ ya uche Jehova n’ọtụtụ ihe ndị dị mkpa.—1 Ndị Kọrint 2:16.
Mgbe ụfọdụ otu ihe odide n’Akwụkwọ Nsọ Hibru na-ezo aka n’ebe Jehova nọ, ma n’ihi Ya inyefe ikike na ịchịisi, ọ na-emezu n’ebe Jisọs Kraịst nọ. Dị ka ihe atụ, Abụ Ọma 34:8, na-akpọ anyị òkù ‘idetụ ire, hụ na Jehova dị mma.’ Ma Pita ji nke a mee ihe banyere Onyenwe anyi Jisọs Kraịst mgbe ọ na-asị: “Ọ bụrụ na unu detụrụ n’ire na Onyenwe anyị bụ onye nwere obi ọma.” (1 Pita 2:3) Pita weere otu ụkpụrụ ma gosi otu o sikwa bụrụ eziokwu banyere Jisọs Kraịst. Site n’ịnara ihe ọmụma banyere Jehova Chineke na Jisọs Kraịst na iji ha mee ihe, ndị Kraịst pụrụ ịnụ ụtọ ngọzi ukwuu site n’aka ma Nna ahụ ma Ọkpara ya. (Jọn 17:3) Ojiji Pita ji ya mee ihe adịghị eme ka Ọkaaka Onyenwe anyị Jehova na Onyenwe anyị Jisọs Kraịst bụrụ otu onye.—Lee ntụaka ala ala peji nke 1 Pita 2:3, NW.
Ọkwá dịrịta iche iche nke Jehova Chineke na Ọkpara ya, Jisọs Kraịst, bụ nke Pọl onyeozi mere ka o doo anya mgbe ọ sịrị: “N’ebe anyị nọ otu Chineke dị, bụ́ Nna, Onye ihe nile sitere na Ya, Onye anyị onwe anyị dịkwaara Ya; otu Onyenwe anyị dịkwa, bụ Jisọs Kraịst, Onye ihe nile sitere n’aka ya, anyị onwe anyị sitekwara n’aka Ya.” (1 Ndị Kọrint 8:6; 12:5, 6) N’idegara ọgbakọ ndị Kraịst dị n’Efesọs akwụkwọ, Pọl mere ka a mata “otu Onyenwe anyị” ahụ, Jisọs Kraịst, dị ka onye dị nnọọ iche site n’ebe “otu Chineke na Nna nke anyị nile.”—Ndị Efesọs 4:5, 6.
Jehova Kasị Ihe Nile Elu
Kemgbe afọ 1914, okwu ndị ahụ nke Mkpughe 11:15 abụwo eziokwu: “Alaeze nke ụwa aghọwo alaeze nke Onyenwe anyị [Jehova Chineke], na nke Kraịst Ya: Ọ ga-abụkwa eze ruo mgbe nile ebighị ebi.” The New International Dictionary of New Testament Theology (Mpịakọta nke 2, peji nke 514) na-asị: “Mgbe Kraịst meriworo ike nile (1 Kọr. 15:25), ọ ga-ewere onwe ya nyefee Chineke bụ́ Nna. Otú ahụ, ịbụ onyenwenụ nke Jisọs ga-emezuworị nzube ya, Chineke ga-abụkwa ihe nile n’elu ihe nile (1 Kọr. 15:28).” Ná ngwụsị nke Ọchịchị Narị Afọ Iri ya, Kraịst Jisọs ga-enyefe Nna ya, Chineke Onye Pụru Ime Ihe Nile ike na ịchịisi e nyeburu ya. N’ihi ya, a ga-enye Jehova otuto na ofufe nile n’ụzọ ziri ezi, “Chineke nke Onyenwe anyị Jisọs Kraịst.”—Ndị Efesọs 1:17.
Ọ bụ ezie na Jisọs bụ ugbu a Onyenwenụ kachasị ndị nwenụ nile, ọ dịghị mgbe a kpọrọ ya Chineke kachasị chineke nile. Jehova ka nọgide na-abụ onye kasị ihe nile elu. N’ụzọ dị otú a, Jehova ga-abụ “ihe nile n’ime ihe nile.” (1 Ndị Kọrint 15:28) Ịbụ onyenwenụ nke Jisọs na-enye ya ọnọdụ kwesịrị ekwesi dị ka Isi nke nzukọ ndị Kraịst. Ọ bụ ezie na anyị pụrụ ịhụ ọtụtụ “ndị nwenụ” dị ike n’ebe nile dị elu nke ụwa nke a, anyị na-etinye obi ike anyị n’onye ahụ bụ Onyenwenụ kachasị ndị nwenụ nile. Ma, Jisọs Kraịst n’ọkwá ya e buliri elu, ka nọgidere na-anọ n’okpuru Nna ya, “ka Chineke wee na-achị ihe nile.” (1 Ndị Kọrint 15:28, The Translator’s New Testament) Lee aha ihe nlereanya ọma nke ịdị umeala n’obi Jisọs setipụụrụ ndị na-eso ụzọ ya ịgbaso, ọbụna ka ha na-amata ya dị ka Onyenwe ha!
[Igbe dị na peeji nke 30]
“Mgbe ndị dere Agba Ọhụrụ na-ekwu okwu banyere Chineke, ha bu Chineke na Nna nke Onyenwe anyị Jisọs Kraịst n’uche. Mgbe ha na-ekwu okwu banyere Jisọs Kraịst, ha adịghị ekwu, ma ọ bụkwanụ na-eche banyere ya dị ka Chineke. Ọ bụ Kraịst nke Chineke, Ọkpara Chineke, Amamihe Chineke, Okwu Chineke. A ghaghị ịgụ ọbụna Okwu Mmeghe nke St. John, nke yitewere Nkwenkwe Nicaea, na-eburu n’uche nkuzi ịnọ n’okpuru pụtara ìhè nke Oziọma ahụ n’ozuzu ya; Okwu Mmeghe ahụ edochaghị anya n’asụsụ Grik n’ihe banyere okwu ahụ na-enweghị okwu na-ezo aka n’ihe bụ́ [the·osʹ] dị ka o si doo na Bekee.”—“The Divinity of Jesus Christ,” nke John Martin Creed dere.