Ha Mere Uche Jehova
Onye Sameria Abụrụ Ezi Onye Agbata Obi
N’OGE Jisọs, e nwere ibu iro pụtara ìhè n’etiti ndị Juu na ndị Jentaịl. Ka oge na-aga, Mishna ndị Juu ọbụna gbakwụnyere iwu nke machibidoro ndị inyom Israel inyere ndị na-abụghị ndị Juu aka mgbe ha na-amụ nwa, ebe nke a ga-enye nnọọ aka ịkpọbata onye Jentaịl ọzọ n’ime ụwa.—Abodah Zarah 2:1.
Ndị Sameria nwere mmekọ chiri anya n’ebe ndị Juu nọ karịa otú ndị Jentaịl nwere, ma n’ụzọ okpukpe ma n’ụzọ agbụrụ. N’agbanyeghị nke ahụ, e wekwaara ha dị ka ụmụ osu. “Ndị Juu na ndị Sameria adịghị emekọ ihe,” ka Jọn onyeozi dere. (Jọn 4:9) N’ezie, Talmud kụziri na “achịcha nke onye Sameria nyere bụ ihe rụrụ arụ karịa anụ ezi.” Ọbụna ụfọdụ ndị Juu ji okwu ahụ bụ “onye Sameria” mee ihe dị ka okwu nlelị na nkọcha.—Jọn 8:48.
N’ihi ọnọdụ a, okwu Jisọs gwara otu nwoke onye maara iwu ndị Juu nke ọma na-akụzi nnọọ ihe. Nwoke ahụ bịakwutere Jisọs ma jụọ, sị: “Onye ozizi, ọ̀ bụ gịnị ka m ga-eme ka m wee keta ndụ ebighị ebi?” Ná nzaghachi, Jisọs dọọrọ uche ya gaa n’iwu Mosis, nke nyere iwu ‘ịhụ Jehova n’anya site n’obi gị dum, mkpụrụ obi gị dum, ike gị dum, na uche gị dum,’ na ‘ịhụ onye agbata obi gị n’anya dị ka onwe gị.’ Ọkàiwu ahụ jụziri Jisọs, sị: “Ònye bụkwa onye agbata obi m?” (Luk 10:25-29; Levitikọs 19:18; Deuterọnọmi 6:5) Dị ka ndị Farisii si kwuo, okwu ahụ bụ́ “onye agbata obi” metụtara nanị ndị ahụ na-edebe ọdịnala ndị Juu—o metụtaghị ndị Jentaịl ma ọ bụ ndị Sameria ma ọlị. Ọ bụrụ na ọkàiwu a nke chọrọ ịmata ihe chere na Jisọs ga-akwado echiche ahụ, ihe ọ ga-anụ ga-eju ya anya.
Onye Sameria nke Nwere Ọmịiko
Jisọs zara ajụjụ nwoke ahụ site n’ịtụ otu ilu.a “Otu nwoke,” ka ọ sịrị, “si na Jerusalem na-arịda ịga Jeriko.” Ịdị anya Jerusalem site na Jeriko dị ihe dị ka kilomita 23. Okporo ụzọ nke jikọtara obodo abụọ a nwere mgbagọ na oké nkume ndị gbalitere elu, na-eme ka ọ dịrị ndị ohi mfe izo, ịwakpo, na ịgbalaga. Dị ka o si dapụta, onye njem nke ilu Jisọs ‘dabara n’etiti ndị na-apụnara mmadụ ihe, ndị gbara ya ọtọ, tiekwa ya ihe otiti, wee laa, hapụ ya nwụnye ọrụ.’—Luk 10:30.
“N’otu mgbe ahụ,” ka Jisọs gara n’ihu na-ekwu, “otu onye nchụàjà na-arịda n’ụzọ ahụ: mgbe ọ hụrụ ya, o wee si n’akụkụ ụzọ ọzọ gabiga. Otú ahụ onye Livaị, mgbe ọ bịaruru ebe ahụ, hụkwa ya, o wee sikwa n’akụkụ ụzọ ọzọ gabiga.” (Luk 10:31, 32) Ndị nchụàjà na ndị Livaị bụ ndị na-akụzi Iwu ahụ—gụnyere iwu nke ịhụnanya onye agbata obi. (Levitikọs 10:8-11; Deuterọnọmi 33:1, 10) N’ezie, karịa mmadụ ọ bụla ọzọ, ha kwesịrị ịbụ ndị a rụgidere inyere onye ije ahụ e merụrụ ahụ aka.
Jisọs gara n’ihu na-asị: “Otu onye Sameria, mgbe ọ nọ n’ije, ọ bịaruo n’ebe ọ nọ.” Ihe ịrụ ụka adịghị ya na mkpọtụ a kpọtụrụ onye Sameria aha mere ka ọchịchọ ịmata ihe nke ọkàiwu ahụ rịkwuo elu. Jisọs ọ̀ ga-akwado echiche na-ezighị ezi e nwere banyere agbụrụ a? N’ụzọ megidere nke ahụ, mgbe ọ hụrụ onye njem ahụ ihe ọjọọ dakwasịrị, onye Sameria ahụ “wee nwee ọmịiko n’ahụ ya.” Jisọs sịrị: “O wee bịakwute ya, kee ọnyá nile ya, wụkwasị ha mmanụ na mmanya vine; o wee tụkwasị ya n’anụ ụlọ nke aka ya, dubata ya n’ụlọ ndị ọbịa, wee lee ya anya nke ọma.b N’echi ya o wee tụpụta shilling abụọ, nye onye nwe ụlọ ndị ọbịa ahụ, sị, Lee ya anya nke ọma; ihe ọ bụla i mefukwara karịa, mụ onwe m, mgbe m lọtara, m ga-akwụghachi gị.”—Luk 10:33-35.
Jisọs jụziri onye ahụ na-ajụ ya ajụjụ, sị: “Ọ̀ bụ onye n’ime mmadụ atọ a, ka i chere, gosiri onwe ya [dị] ka onye agbata obi nke onye ahụ dabara n’etiti ndị ahụ na-apụnara mmadụ ihe?” Ọkàiwu ahụ maara azịza ya, ma o nweghị mmasị ịsị “onye Sameria ahụ.” Kama nke ahụ, nanị ihe ọ zaghachiri bụ: “Onye ahụ nke meere ya ebere.” Mgbe ahụ Jisọs sịrị: “Gaa, gị onwe gị meekwa otú ahụ.”—Luk 10:36, 37.
Ihe Mmụta Maka Anyị
Nwoke ahụ jụrụ Jisọs ajụjụ mere nke ahụ ná mgbalị “ịgụ onwe ya n’onye ezi omume.” (Luk 10:29) Ma eleghị anya o chere na Jisọs ga-eto nrapara ọ na-arapara n’Iwu Mosis n’ụzọ gabigara ókè. Ma ọ dị onye a na-anya isi mkpa ịmụta eziokwu nke ilu Bible ahụ bụ́: “Ụzọ ọ bụla nke onye ọ bụla ziri ezi n’anya ya abụọ: ma onye na-atụzi obi nile ka Jehova bụ.”—Ilu 21:2.
Ilu Jisọs na-egosi na onye ụzọ ya ziri ezi n’ezie abụghị nanị onye na-erube isi n’iwu Chineke kamakwa onye na-eṅomi àgwà ya. (Ndị Efesọs 5:1) Dị ka ihe atụ, Bible na-agwa anyị na “Chineke abụghị onye na-ele mmadụ anya n’ihu.” (Ọrụ 10:34) Ànyị na-eṅomi Chineke n’akụkụ a? Ilu na-akpali akpali nke Jisọs gosiri na omume anyị nke ezi onye agbata obi kwesịrị ịgafe ihe mgbochi nke mba, ọdịbendị, na okpukpe. N’ezie, a tụziiri ndị Kraịst ‘ịrụ ezi ihe n’ebe mmadụ nile nọ’—ọ bụghị nanị nye ndị ha na ha nọ n’otu ọkwá ọha na eze, agbụrụ, ma ọ bụ mba, ọ bụghịkwa nanị nye ndị kwere ekwe ibe ha.—Ndị Galetia 6:10.
Ndịàmà Jehova na-agbalịsi ike ịgbaso ndụmọdụ a nke Akwụkwọ Nsọ. Dị ka ihe atụ, mgbe e nwere ọdachi ndị na-emere onwe ha, ha na-agbasaru enyemaka ịkwalite ọdịmma ndị mmadụ nye ndị kwere ekwe ibe ha nakwa ndị na-abụghị Ndịàmà.c Tụkwasịkwa, ha na-ejikọta aka ọnụ na-etinye ihe karịrị otu ijeri hour kwa afọ na-enyere ndị mmadụ aka ịbịaru ihe ọmụma ka mma nke Bible. Ha na-agbalịsi ike iji ozi Alaeze ahụ ruo onye ọ bụla, n’ihi na ihe Chineke na-achọ bụ ka “a zọpụta mmadụ nile, ka ha bịaruokwa mmazu nke eziokwu.”—1 Timoti 2:4; Ọrụ 10:35.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a Ilu bụ akụkọ dị nkenke, nke a na-echepụtakarị echepụta bụ́ nke e si enweta eziokwu omume ọma ma ọ bụ nke ime mmụọ.
b Ihe àmà na-egosi na ụfọdụ ụlọ ndị obịa n’oge Jisọs abụghị nanị ebe a ga-ehi ụra ka ha na-enye kamakwa ihe oriri na ozi ndị ọzọ. Nke a pụrụ ịbụ ụdị ebe obibi Jisọs bu n’obi, n’ihi na okwu Grik e ji mee ihe n’ebe a dị iche na nke ahụ a sụgharịrị ịbụ ‘ụlọ ndị ije’ na Luk 2:7.
c Maka ihe atụ dị iche iche, lee Ụlọ Nche, December 1, 1996, peji nke 3-8, na January 15, 1998, peji nke 3-7.