AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | JỌN 18-19
Jizọs Gbaara Eziokwu Ahụ Àmà
Jizọs gbaara eziokwu gbasara nzube Chineke àmà
N’OKWU ỌNỤ: O ji ịnụ ọkụ n’obi kwusaa ozi ọma banyere Alaeze Chineke
N’OMUME: Otú o si bie ndụ mezuru amụma ndị Chineke bụrụ
Ebe anyị bụ ndị na-eso ụzọ Jizọs, anyị na-agbakwara eziokwu ahụ àmà
N’OKWU ỌNỤ: Anyị na-eji ịnụ ọkụ n’obi ekwusa ozi ọma banyere Alaeze Chineke nke Kraịst bụ eze ya n’agbanyeghị emo a na-akwa anyị
N’OMUME: Anyị na-anọpụ iche n’ụwa, na-akpakwa àgwà ndị gosiri na anyị bụ ndị Chineke, si otú ahụ na-akwado ọchịchị Jizọs