Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • cf isi 7 p. 66-75
  • Chesie Echiche Ike Banyere Onye Ahụ nke Tachiri Obi

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Chesie Echiche Ike Banyere Onye Ahụ nke Tachiri Obi
  • ‘Bịa Bụrụ Onye Na-eso Ụzọ M’
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Gịnị Bụ Ntachi Obi?
  • Ihe Jizọs Diri
  • Ihe Mere Jizọs Ji Tachie Obi
  • “Sochie Nzọụkwụ Ya Anya”
  • Ntachi Obi—Dị Ndị Kraịst Oké Mkpa
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1993
  • “Ka Ntachi Obi Rụzuo Ọrụ Ya”
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2016
  • Na-anọ Nzukọ Jehova Nso
    Ndị A Haziri Ime Uche Jehova
  • Ntachi Obi nke Na-eweta Mmeri
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1991
Lee Ihe Ndị Ọzọ
‘Bịa Bụrụ Onye Na-eso Ụzọ M’
cf isi 7 p. 66-75

ISI NKE ASAA

Chesie Echiche Ike Banyere Onye Ahụ nke Tachiri Obi

1-3. (a) Olee otú Jizọs nweruru obi erughị ala n’ogige Getsemeni, gịnịkwa kpatara ya? (b) Gịnị ka a pụrụ ikwu banyere ihe nlereanya Jizọs setịpụrụ n’ịtachi obi, oleekwa ajụjụ ndị e kwesịrị ịza?

JIZỌS ahụsiela anya. O nwetụbeghị ụdị nchegbu na obi erughị ala ọ na-enwe ugbu a. Ọ nọ n’awa ndị ikpeazụ ná ndụ ya n’ụwa. Ya na ndịozi ya bịarutere n’otu ebe ha maara nke ọma, ya bụ, ogige Getsemeni. Ya na ha esorola bịa ebe a ugboro ugboro. Otú ọ dị, n’abalị a, ọ chọrọ ịnọ naanị ya. Ọ hapụrụ ndịozi ya, banyekwuo n’ime ogige ahụ, gbuo ikpere n’ala wee malite ikpe ekpere. O kpesiri ekpere ike, nweekwa obi erughị ala nke na ‘ọsụsọ ya dị ka ọbara nke na-atapụsị n’ala.’—Luk 22:39-44.

2 Gịnị mere Jizọs ji na-echegbu onwe ya otú a? N’ezie, ọ maara na ya na-aga ịta ahụhụ dị ukwuu n’oge na-adịghị anya, ma ọ bụghị ihe mere o ji na-echegbu onwe ya. Ihe mere o ji na-echegbu onwe ya karịrị nnọọ nke ahụ. Ọ na-echegbu onwe ya nke ukwuu banyere aha Nna ya. Ọ ghọtakwara na ọdịnihu mmadụ niile dabeere n’ikwesi ntụkwasị obi ya. Jizọs maara otú o si dị mkpa ka ya die ahụhụ ahụ. Ọ bụrụ na o dighị ya, ọ ga-ewetara aha Jehova nkọcha dị ukwuu. Ma, Jizọs diri ya. Mgbe e mesịrị n’otu ụbọchị ahụ, tupu nwoke ahụ nke setịpụụrụ anyị ihe nlereanya kasị mma n’ịtachi obi n’ụwa ekubie ume, o tiri mkpu mmeri, sị: “E mechawo ya!”—Jọn 19:30.

3 Baịbụl na-agba anyị ume ka anyị ‘chesie echiche ike’ banyere onye ahụ nke tachiri obi, ya bụ, Jizọs. (Ndị Hibru 12:3) Nke a mere ka e nwee ajụjụ ndị a dị mkpa: Olee ụfọdụ ọnwụnwa Jizọs diri? Gịnị nyeere ya aka ịtachi obi? Olee otú anyị pụrụ isi soro ihe nlereanya ya? Ma, tupu anyị azaa ajụjụ ndị a, ka anyị tụlee ihe ntachi obi pụtara.

Gịnị Bụ Ntachi Obi?

4, 5. (a) Gịnị ka “ntachi obi” pụtara? (b) Olee ihe atụ na-egosi na ntachi obi abụghị naanị na ihe isi ike nke mmadụ na-apụghị ịgbanahụ agbanahụ bịaara ya?

4 Mgbe ụfọdụ, anyị niile ‘na-enwe mwute site n’ọnwụnwa dị iche iche.’ (1 Pita 1:6) Ọnwụnwa ịdakwasị anyị ọ̀ bụ ihe na-egosi na anyị na-atachi obi n’ọnwụnwa? Ee e. Okwu Grik a sụgharịrị “ntachi obi” pụtara “ikike idi ihe ma ọ bụ iguzosi ike n’agbanyeghị nsogbu.” Otu ọkà mmụta kọwara ụdị ntachi obi nke ndị so dee Baịbụl kwuru okwu banyere ya, sị: “Ọ bụ àgwà nke pụrụ idi ihe, ọ bụghị naanị iwere ihe otú ọ bụla a hụrụ ya, kama, ọ bụ iji olileanya siri ike die ihe . . . Ọ bụ àgwà nke na-eme ka mmadụ guzosie ike n’agbanyeghị nsogbu. Ọ bụ àgwà ọma nke pụrụ ime ka ọnwụnwa nke kasị taa akpụ ghọọ ebube n’ihi na ọ na-ahụ ihe ọ ga-enweta mgbe ihe mgbu ahụ gasịrị.”

5 Ya mere, ịtachi obi abụghị naanị na ihe isi ike nke mmadụ na-apụghị ịgbanahụ agbanahụ bịaara ya. Na Baịbụl, ntachi obi pụtara mmadụ iguzosi ike, ile ihe anya n’ụzọ ziri ezi na inwe olileanya magburu onwe ya mgbe ọnwụnwa bịaara ya. Tụlee otu ihe atụ: A tụrụ mmadụ abụọ mkpọrọ n’otu ebe. Ma, ihe mere e ji tụọ ha mkpọrọ dị iche iche. Otu onye bụ onye omekome. O bu iwe n’obi, gbarụọkwa ihu nọrọ n’ụlọ mkpọrọ n’ihi na o weere ihe otú ọ bụla ọ hụrụ ya. Onye nke ọzọ bụ ezi Onye Kraịst nke a tụrụ mkpọrọ n’ihi ikwesị ntụkwasị obi ya. O guzosiri ike, na-elekwa ihe anya n’ụzọ ziri ezi n’ihi na ọ na-ele ọnọdụ ya anya dị ka ohere ọ ga-eji gosi okwukwe ya. A pụghị iwere onye omekome ahụ na ọ bụ ihe nlereanya n’ịtachi obi. Ma, Onye Kraịst ahụ nke guzosiri ike bụ ihe nlereanya n’inwe àgwà a magburu onwe ya.—Jems 1:2-4.

6. Olee otú anyị ga-esi mụta ntachi obi?

6 Ntachi obi dị anyị mkpa ma ọ bụrụ na anyị ga-enweta nzọpụta. (Matiu 24:13) Otú ọ dị, anyị adịghị aṅụta àgwà a dị mkpa n’ara. Mmadụ aghaghị ịmụta ntachi obi amụta. Olee otú a ga-esi mụta ya? Ndị Rom 5:3 kwuru, sị: “Mkpagbu na-arụpụta ntachi obi.” Ee, ọ bụrụ na anyị chọrọ ịmụta ntachi obi n’ezie, anyị agaghị eji ụjọ gbaara ihe niile pụrụ ịnwale okwukwe anyị ọsọ. Kama ịgba ọsọ, anyị aghaghị ichebiri ha. Anyị na-amụta ntachi obi mgbe ọnwụnwa dị iche iche na-abịara anyị kwa ụbọchị, anyị emerie ha. Ọnwụnwa ọ bụla anyị meriri na-eme ka anyị nwee ike anyị ga-eji merie ọnwụnwa ọzọ pụrụ ịbịa. N’ezie, anyị adịghị amụta ntachi obi n’onwe anyị. Anyị ‘na-adabere n’ike nke Chineke na-enye.’ (1 Pita 4:11) Iji nyere anyị aka iguzosi ike, Jehova enyewo anyị ihe kasị mma nke pụrụ inyere anyị aka, ya bụ, ihe nlereanya nke Ọkpara ya. Ka anyị tụlee nke ọma ihe nlereanya na-enweghị ntụpọ nke Jizọs setịpụrụ n’ịtachi obi.

Ihe Jizọs Diri

7, 8. Gịnị ka Jizọs diri mgbe ọ fọrọ ntakịrị ka ndụ ya n’ụwa gwụ?

7 Mgbe ọ fọrọ ntakịrị ka ndụ Jizọs n’ụwa gwụ, o diri mmekpọ ọnụ dị iche iche. E wezụga nchegbu gabigara okè o nwere n’abalị ikpeazụ ya, chee echiche banyere ihu e mechuru ya na mkparị a kparịrị ya. Onye ya na ya kpachiri anya raara ya nye, ezigbo ndị enyi ya gbahapụrụ ya, e kpeekwa ya ikpe na-ezighị ezi, ndị na-ekpe ikpe n’ụlọikpe kasị elu nke okpukpe obodo ahụ wee kwaa ya emo, gbụọ ya ọnụ mmiri, suokwa ya ọkpọ. Ma, o ji nkwanye ùgwù na obi ike die ha niile.—Matiu 26:46-49, 56, 59-68.

8 N’awa ndị ikpeazụ ná ndụ Jizọs, o diri ahụhụ na-enweghị atụ a tara ya. A pịara ya ihe, otú e si pịasie ya ihe ike mere ka o nwee “ọnyá dị ukwuu ndị e ji dee ya uri n’ahụ́, meekwa ka ọbara gbaa ya nke ukwuu,” dị ka otu akwụkwọ ahụ́ ike a ma ama kwuru. A kpọgidere ya n’osisi, ya bụ, otú e si gbuo ya mere ka ọ “nọrọ n’oké ihe mgbu ma tagide ahụhụ wee jiri nwayọọ nwayọọ nwụọ.” Chee echiche banyere otú o si na-afụ ya ụfụ nke ukwuu mgbe ha na-akụnye nnukwu ntu ndị ahụ n’aka ya nakwa n’ụkwụ ya, wee kpọgide ya n’osisi. (Jọn 19:1, 16-18) Chegodị echiche banyere otú o si na-afụ ya ụfụ nke ukwuu mgbe e buliri osisi ahụ elu, ya abụrụ naanị ebe ahụ a kụnyere ya ntu bu ahụ́ ya dum, osisi ahụ ana-echi ya n’azụ ya ahụ e ji ụtarị pịarichaa. O diri oké ahụhụ a a tara ya, n’agbanyeghị ihe ahụ mere o ji na-echegbu onwe ya, nke a kọwara ná mmalite Isi nke Asaa a.

9. Gịnị ka iburu “osisi ịta ahụhụ” anyị na isoro Jizọs pụtara?

9 Ebe anyị bụ ndị na-eso ụzọ Kraịst, gịnị ka anyị pụrụ idi? Jizọs sịrị: “Ọ bụrụ na onye ọ bụla chọrọ iso m n’azụ, ya . . . bulie osisi ịta ahụhụ ya, na-eso m mgbe niile.” (Matiu 16:24) N’ebe a, e ji okwu ahụ bụ́ “osisi ịta ahụhụ” mee ihe atụ ịta ahụhụ, mmechuihu, ma ọ bụ ọbụna ọnwụ. Iso Kraịst abụghị ihe dị mfe. Ụkpụrụ anyị na-agbaso dị ka Ndị Kraịst mere ka anyị dị iche. Ụwa kpọrọ anyị asị n’ihi na anyị abụghị nke ya. (Jọn 15:18-20; 1 Pita 4:4) Otú ọ dị, anyị dị njikere ibuli osisi ịta ahụhụ anyị—ee, anyị ejikerela ịta ahụhụ, ọbụna ịnwụ, kama ịkwụsị iso Onye Nlereanya anyị.—2 Timoti 3:12.

10-12. (a) Gịnị mere ezughị okè nke ndị gbara Jizọs gburugburu ji ghọọrọ ya ọnwụnwa nke nwalere ntachi obi ya? (b) Olee ụfọdụ n’ime ọnwụnwa ndị Jizọs diri?

10 Mgbe Jizọs nọ na-eje ozi, ezughị okè nke ndị gbara ya gburugburu mere ka ọnwụnwa ndị ọzọ bịara ya. Cheta na ọ bụ “onye ọkà ọrụ,” onye Jehova si n’aka ya kee ụwa na ihe niile dị ndụ n’ime ya. (Ilu 8:22-31) Ya mere, Jizọs maara ihe Jehova zubere maka ụmụ mmadụ. O zubere ka ha na-egosi àgwà ndị yiri nke Ya, dịkwa ndụ obi ụtọ ma nwee ahụ́ ike zuru okè. (Jenesis 1:26-28) Mgbe Jizọs nọ n’ụwa, ọ hụrụ nsogbu dị iche iche mmehie kpatara n’ụzọ dị iche—ya onwe ya bụ mmadụ, hụ otú ọ na-adị ndị mmadụ, nweekwa mmetụta ndị mmadụ na-enwe. Ọ ghaghị ịbụ na o wutere ya nke ukwuu iji anya ya hụ otú ụmụ mmadụ si bụrụ ndị na-erukwaghị izu okè ahụ Adam na Iv nwere ná mmalite. Ya mere, ihe bịaara Jizọs bụ ọnwụnwa nke ga-anwale ntachi obi ya. Ọ̀ ga-enwe nkụda aka wee daa mbà, na-ele ụmụ mmadụ na-eme mmehie anya dị ka ndị na-enwekwaghị mmekwata? Ka anyị hụ.

11 Otú obi si kpọọ ndị Juu nkụ wutere Jizọs nke na o bere ákwá n’ihu ọha. Ò kwere ka enweghị mmasị ha mee ka ịnụ ọkụ n’obi ya jụọ oyi, ma ọ bụ mee ka ọ kwụsị ikwusa ozi ọma? Kama ime otú ahụ, ọ ‘malitere izi ihe kwa ụbọchị n’ụlọ nsọ.’ (Luk 19:41-44, 47) “O wutere ya nke ukwuu” na ndị Farisii bụ ndị ihe na-adịghị emetụ n’obi, bụ́ ndị legidesiri ya anya ike ka ha hụ ma ọ̀ ga-agwọ otu nwoke n’ụbọchị izu ike. Ò kwere ka ndị ahụ bụ́ ndị ezi omume n’anya onwe ha menye ya ụjọ? Mbanụ! O guzosiri ike wee gwọọ nwoke ahụ—kpọmkwem n’etiti ụlọ nzukọ ahụ!—Mak 3:1-5.

12 Ọ dị ihe ọzọ na-aghaghị ịbụrụ Jizọs ihe ịma aka. Ọ bụ adịghị ike nke ndị na-eso ụzọ ya ha na ya kasị kpachie anya. Dị ka anyị mụtara n’Isi nke Atọ, ha gosiri na ịbụ ndị a ma ama gụrụ ha agụụ ugboro ugboro. (Matiu 20:20-24; Luk 9:46) Jizọs dụrụ ha ọdụ ihe karịrị otu ugboro banyere otú ịdị umeala n’obi si dị mkpa. (Matiu 18:1-6; 20:25-28) Ma, ha amụtaghị ya ngwa ngwa. Leenụ, n’abalị ikpeazụ ya na ha nọrọ, ha ‘sere okwu kpụ ọkụ n’ọnụ’ banyere onye bụ́ onye kasị ukwuu n’ime ha! (Luk 22:24) Ike ha ọ̀ gwụrụ Jizọs, ya echee na ha enwekwaghị mmekwata? Ee e. O nwere ndidi mgbe niile. Obi siri ya ike, o nwekwara olileanya na ha ga-agbanwe. Ọ nọkwa na-ahụ àgwà ọma ha nwere. Ọ maara na ha ji obi ha hụ Jehova n’anya, chọọkwa n’ezie ime uche Ya.—Luk 22:25-27.

Ihe Osise dị na peeji nke 70

Ànyị ga-ekwe ka mmegide mee ka anyị daa mbà, ka ànyị ga-eji ịnụ ọkụ n’obi nọgide na-ekwusa ozi ọma?

13. Olee ọnwụnwa ndị pụrụ ịbịara anyị ndị yiri ndị ahụ Jizọs diri?

13 Ụdị ọnwụnwa ndị ahụ Jizọs diri nwere ike ịbịara anyị. Dị ka ihe atụ, anyị pụrụ izute ndị na-adịghị anabata ozi Alaeze anyị na-ezisa, ma ọ bụ ndị na-emegide ya. Ànyị ga-ekwe ka enweghị mmasị dị otú ahụ mee ka anyị daa mbà, ka ànyị ga-eji ịnụ ọkụ n’obi nọgide na-ekwusa ya? (Taịtọs 2:14) Ezughị okè nke ụmụnna anyị pụrụ ịbụrụ anyị ọnwụnwa. Okwu a gwara anyị n’echeghị echiche, ma ọ bụ ihe ọjọọ e mere anyị, pụrụ iwute anyị. (Ilu 12:18) Ànyị ga-ekwe ka adịghị ike nke ndị kwere ekwe ibe anyị mee ka ike ha gwụ anyị, ka ànyị ga na-edi mmejọ ha, na-agbalị ịhụ àgwà ọma ndị ha nwere?—Ndị Kọlọsi 3:13.

Ihe Mere Jizọs Ji Tachie Obi

14. Olee ihe abụọ nyeere Jizọs aka iguzosi ike?

14 Gịnị nyeere Jizọs aka iguzosi ike wee kwesị ntụkwasị obi n’agbanyeghị mkparị niile a kparịrị ya na ihu niile e mechuru ya na ahụhụ niile ọ tara? E nwere ihe abụọ pụrụ iche nyeere Jizọs aka. Nke mbụ bụ na o lere anya n’eluigwe, rịọ “Chineke onye na-enye ntachi obi” ka o nyere ya aka. (Ndị Rom 15:5) Nke abụọ bụ na Jizọs lepụrụ anya n’ihu, lekwasị anya n’ihe ntachi obi ya ga-arụpụta. Ka anyị tụlee ihe abụọ a n’otu n’otu.

15, 16. (a) Gịnị gosiri na Jizọs adabereghị n’ike nke onwe ya iji tachie obi? (b) Olee ihe obi siri Jizọs ike na Nna ya ga-eme, n’ihi gịnịkwa?

15 Ọ bụ ezie na Jizọs bụ Ọkpara Chineke nke zuru okè, ọ dabereghị n’ike nke onwe ya iji tachie obi. Kama nke ahụ, ọ gakwuuru Nna ya nke eluigwe, kpee ekpere ka o si n’elu nyere ya aka. Pọl onyeozi dere, sị: “Kraịst . . . ji ibesi ákwá ike na anya mmiri kpesie ekpere ike ma rịọ Onye ahụ nke nwere ike ịzọpụta ya n’ọnwụ arịrịọ.” (Ndị Hibru 5:7) Rịba ama na ọ bụghị naanị na Jizọs ‘rịọrọ arịrịọ,’ kama, o kpesikwara ekpere ike. Okwu ahụ bụ́ ‘ikpesi ekpere ike’ pụtara mmadụ iji obi ya rịọsie Chineke arịrịọ ike—ee, rịọ arịrịọ ka e nyere ya aka. Okwu Grik a sụgharịrị “kpesie ekpere ike” gosiri na Jizọs rịọrọ Jehova arịrịọ ihe karịrị otu ugboro. N’ezie, n’ogige Getsemeni, Jizọs kpere ekpere ugboro ugboro, kpesiekwa ya ike.—Matiu 26:36-44.

16 Obi siri Jizọs ike nke ukwuu na Jehova ga-aza ekpere o kpesiri ike, n’ihi na ọ maara na Nna ya bụ “Onye na-anụ ekpere.” (Abụ Ọma 65:2) Tupu Ọkpara ahụ a mụrụ naanị ya aghọọ mmadụ, ọ hụwo otú Nna ya na-esi aza ekpere ndị ohu ya, bụ́ ndị guzosiri ike n’ebe ọ nọ. Dị ka ihe atụ, Ọkpara ahụ nọ n’eluigwe wee jiri anya ya hụ mgbe Jehova zipụrụ otu mmụọ ozi ka ọ gaa za ekpere nke Daniel onye amụma ji obi ya kpee—ọbụna tupu Daniel ekpechaa ekpere ahụ. (Daniel 9:20, 21) Ya mere, gịnị ga-eme ka Nna ya ghara ịza mgbe Ọkpara ọ mụrụ naanị ya “ji ibesi ákwá ike na anya mmiri” wụpụ obi ya dị ka mmiri? Jehova zara arịrịọ Ọkpara ya rịọrọ, wee zipụ otu mmụọ ozi ka ọ gaa mee ka ọ dị ike, ka o nwee ike ịtachi obi n’ihe isi ike ahụ.—Luk 22:43.

17. Iji tachie obi, gịnị mere anyị ji kwesị ile anya n’eluigwe, oleekwa otú anyị pụrụ isi mee otú ahụ?

17 Iji tachie obi, anyị onwe anyị aghaghị ile anya n’eluigwe, ya bụ, ilekwasị Chineke anya, bụ́ “onye na-enye ike.” (Ndị Filipaị 4:13) Ọ bụrụ na Ọkpara Chineke nke zuru okè hụrụ na ya kwesịrị ikpesi ekpere ike ka Jehova nyere ya aka, anyị kwesịrị ime otú ahụ ọbụna karị. Dị ka Jizọs, ọ pụrụ ịdị mkpa ka anyị rịọ Jehova arịrịọ ugboro ugboro. (Matiu 7:7) Ọ bụ ezie na anyị adịghị atụ anya ka e zitere anyị mmụọ ozi, ihe anyị pụrụ ijide n’aka bụ: Chineke anyị nke nwere ịhụnanya ga-aza arịrịọ Onye Kraịst nke guzosiri ike n’ebe ọ nọ, bụ́ onye “na-arịọsikwa arịrịọ ike ma na-ekpe ekpere abalị na ehihie.” (1 Timoti 5:5) N’agbanyeghị ụdị ọnwụnwa ndị pụrụ ịbịara anyị—ma ọ̀ bụ ọrịa, ọnwụ nke onye anyị hụrụ n’anya, ma ọ bụ mkpagbu nke ndị mmegide na-akpagbu anyị—Jehova ga-aza ekpere anyị na-ekpesi ike ka o nye anyị amamihe na obi ike na ike anyị ga-eji tachie obi.—2 Ndị Kọrịnt 4:7-11; Jems 1:5.

Ihe Osise dị na peeji nke 73

Jehova ga-aza ekpere anyị na-ekpesi ike ka o nyere anyị aka ịtachi obi

18. Olee otú Jizọs si lepụ anya hụ ihe na-echere ya, ọ bụghị naanị ahụhụ ahụ ọ na-ata?

18 Ihe nke abụọ nyeere Jizọs aka ịtachi obi bụ na o lepụrụ anya n’ihu wee hụ ihe na-echere ya, ọ bụghị naanị ahụhụ ahụ ọ na-ata. Baịbụl kwuru banyere Jizọs, sị: “N’ihi ọṅụ e debere n’ihu ya, o diri osisi ịta ahụhụ.” (Ndị Hibru 12:2) Ihe nlereanya Jizọs na-egosi otú olileanya, ọṅụ, na ntachi obi si arụkọ ọrụ. A pụrụ ikwu nke a ná nkenke, sị: Olileanya na-arụpụta ọṅụ, ọṅụ arụpụta ntachi obi. (Ndị Rom 15:13; Ndị Kọlọsi 1:11) Jizọs nwere olileanya dị ebube. Ọ maara na ikwesị ntụkwasị obi ya ga-enye aka igosi na ọ bụ Nna ya ka o ruuru ịchị achị, meekwa ka o nwee ike ịgbapụta ezinụlọ ụmụ mmadụ ná mmehie na ọnwụ. Jizọs nwekwara olileanya ịchị dị ka Eze, na ije ozi dị ka Nnukwu Onye Nchụàjà, ka o wee wetara ụmụ mmadụ na-erube isi ngọzi ndị ọzọ. (Matiu 20:28; Ndị Hibru 7:23-26) Site n’ilekwasị anya n’ihe na-echere ya n’ọdịnihu nakwa n’ihe ọ na-ele anya ya, Jizọs nwetara ọṅụ na-enweghị atụ. Ọṅụ ahụ nyekwaara ya aka ịtachi obi.

19. Mgbe ọnwụnwa ndị na-anwale okwukwe anyị bịaara anyị, olee otú anyị pụrụ isi kwe ka olileanya, ọṅụ, na ntachi obi nyere anyị aka?

19 Dị ka Jizọs, anyị kwesịrị ikwe ka olileanya, ọṅụ, na ntachi obi nyere anyị aka. Pọl onyeozi kwuru, sị: “Na-aṅụrịnụ ọṅụ n’olileanya ahụ.” O kwukwara, sị: “Na-atachinụ obi n’ime mkpagbu.” (Ndị Rom 12:12) Ihe bịaara gị ugbu a ọ̀ bụ ọnwụnwa siri ike nke na-anwale okwukwe gị? Ya bụrụ otú ahụ, gbalịsie ike ilepụ anya n’ihu. Echefula na ntachi obi gị ga-ewetara aha Jehova otuto. Lekwasị anya kpọmkwem n’ihe dị oké ọnụ ahịa anyị na-ele anya ya n’Alaeze Chineke. Jiri anya nke uche gị hụ onwe gị n’ụwa ọhụrụ ahụ na-abịa abịa, hụkwa onwe gị ebe ị na-ekpori ndụ n’ime Paradaịs. Ịtụ anya mgbe ihe niile dị ebube Jehova kwere ná nkwa ga-emezu—tinyere igosi na ọ bụ ya ka o ruuru ịchị achị, iwepụ ajọ omume n’ụwa, na iwepụ ọrịa na ọnwụ—ga-eme ka ọṅụ ju gị obi. Ọṅụ ahụ ga-enyekwara gị aka ịtachi obi n’agbanyeghị ọnwụnwa ndị pụrụ ịbịara gị. Ahụhụ ọ bụla anyị na-ata n’usoro ihe dị ugbu a “na-adịru nwa oge, dịkwa mfe,” ma e were ya tụnyere ihe anyị na-ele anya ya n’Alaeze Chineke.—2 Ndị Kọrịnt 4:17.

“Sochie Nzọụkwụ Ya Anya”

20, 21. N’ihe banyere ntachi obi, gịnị ka Jehova na-atụ anya ka anyị mee, gịnịkwa ka anyị kwesịrị ikpebisi ike ime?

20 Jizọs maara na ịbụ onye na-eso ụzọ ya ga-abụ ihe ịma aka, ihe chọrọ ntachi obi. (Jọn 15:20) O jikeere ibute ụzọ, ebe ọ maara na ihe nlereanya ya ga-eme ka ndị ọzọ nwee obi ike. (Jọn 16:33) N’ezie, Jizọs setịpụrụ ihe nlereanya zuru okè n’ịtachi obi, ma anyị ezughị okè ma ọlị. Gịnị ka Jehova na-atụ anya ka anyị mee? Pita kọwara ya, sị: “Kraịst tara ahụhụ n’ihi unu, wee hapụrụ unu ihe nlereanya ka unu wee sochie nzọụkwụ ya anya.” (1 Pita 2:21) N’otú Jizọs si die ọnwụnwa, ọ hapụụrụ anyị “ihe nlereanya,” ya bụ, ụkpụrụ anyị ga-eṅomi.a A pụrụ iji ihe nlereanya o setịpụrụ n’ịtachi obi tụnyere “nzọụkwụ.” Anyị apụghị iso nzọụkwụ ndị ahụ n’ụzọ zuru okè, ma anyị pụrụ ‘isochi ha anya.’

21 Ya mere, ka anyị kpebisie ike iji ike anyị dum soro ihe nlereanya Jizọs. Ka anyị ghara ichefu mgbe ọ bụla na ọ bụrụ na anyị esochikwuo nzọụkwụ Jizọs anya, ọ ga-eme ka anyị dịkwuo njikere ịtachi obi “ruo ọgwụgwụ,” ya bụ, ọgwụgwụ nke usoro ihe ochie a, ma ọ bụ ọgwụgwụ nke ndụ anyị dị ugbu a. Anyị amaghị nke ga-ebu ụzọ bịa, ma ihe doro anyị anya bụ: Ruo mgbe niile ebighị ebi, Jehova ga-akwụ anyị ụgwọ maka ntachi obi anyị.—Matiu 24:13.

a Otú e si dee okwu Grik ahụ a sụgharịrị ịbụ “ihe nlereanya” bụ “ihe e dere n’okpuru.” N’ime ndị so dee Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst, ọ bụ naanị Pita onyeozi dere okwu a n’akwụkwọ o dere. A sịrị na okwu a pụtara “‘ihe nwatakịrị na-elere anya’ nke dị n’akwụkwọ o ji ede ihe, ihe nlereanya e dere ede nke zuru okè, nke nwatakịrị ga-eṅomi kpọmkwem ruo otú ike ya hà.”

Olee Otú Ị Pụrụ Isi Soro Jizọs?

  • Olee otú anyị kwesịrị isi lee ahụhụ ọ bụla anyị pụrụ ịta n’ihi ịbụ ndị na-eso ụzọ Kraịst anya?—Matiu 5:10-12.

  • Gịnị ka Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya ka ha tụọ anya ya, oleekwa otú anyị pụrụ isi soro ndụmọdụ o nyere?—Matiu 10:16-22.

  • Mgbe mmegide ma ọ bụ mkpagbu bịaara anyị, olee otú anyị pụrụ isi soro ihe nlereanya Jizọs?—1 Pita 2:18-25.

  • Gịnị ka iji ikwesị ntụkwasị obi na-atachi obi mgbe anyị na-ata ahụhụ na-egosi?—1 Pita 4:12-14.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya