Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w90 11/1 p. 10-15
  • Ụzọ Onye Kraịst si Ele Ndị Na-achị Isi Anya

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ụzọ Onye Kraịst si Ele Ndị Na-achị Isi Anya
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ịmata Ndị Na-achị Isi
  • “Ndị Chineke Doworo”
  • “Chi nke Oge A”
  • Ndị Na-achị Isi Ndị Nwere Uche Ikpe Ziri Ezi
  • Ụzọ Ndị Kraịst Si Ele Ịbụ Isi Anya
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1994
  • Ịbụisi Ònye Ka I Kwesịrị Ịnakwere?
    Ihe Ọmụma nke Na-eduba ná Ndụ Ebighị Ebi
  • Chineke na Siza
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1996
  • Ịkwanyere Ịbụisi Ùgwù—N’ihi Gịnị Ka O Ji Dị Oké Mkpa?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2000
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
w90 11/1 p. 10-15

Ụzọ Onye Kraịst si Ele Ndị Na-achị Isi Anya

“Ka mkpụrụ obi ọ bụla doo onwe ya n’okpuru ndị na-achị isi n’elu ya: n’ihi na ọ dịghị onye ọ bụla na-achị isi ma ọ bụrụ na Chineke edoghị ya; ndị na-achị isi bụkwa ndị Chineke doworo.”—NDỊ ROM 13:1.

1, 2. (a) N’ihi gịnị ka Pọl ji bụrụ onye mkpọrọ na Rom? (b) Ajụjụ dịgasị aṅaa ka mkpọku Pọl kpọkuru Siza na-ewelite?

PỌL onyeozi degaara ndị Rom okwu ndị ahụ dị n’elu n’ihe dị ka afọ 56 nke Oge Anyị. Mgbe afọ ole na ole gasịrị, ọ hụrụ onwe ya na Rom dị ka onye mkpọrọ. N’ihi gịnị? Ìgwè ndị na-eme ihe ike wakwasịrị ya na Jerusalem, ndị agha Rom wee zọpụta ya. Mgbe a kpọjere ya Sizaria, o chere ebubo ụgha dị iche iche ihu, ma ọ gọpụrụ onwe ya n’ụzọ dị nnọọ mma n’ihu Filiks, bụ́ onye ọchịchị Rom. Filiks, n’ịtụ anya ihe ngó a ga-enye ya, jidere ya n’ụlọ mkpọrọ ruo afọ abụọ. N’ikpeazụ, Pọl gwara onye ọchịchị ọzọ bịaranụ, bụ́ Festọs, ka e weje okwu ya n’ihu Siza.—Ọrụ 21:27-32; 24:1-25:12.

2 Nke a bụ ihe ruuru ya dị ka nwa amaala Rom. Ma ò kwesịrị ekwesị ka Pọl kpọkuo onye ọchịchị ahụ ebe ọ bụ na Jisọs ezowo Setan aka dị ka onye bụ n’ezie “onye ọchịchị ụwa,” ebe Pọl n’onwe ya kpọkwara Setan “chi nke oge a”? (Jọn 14:30, NW; 2 Ndị Kọrint 4:4) Ka onye ọchịchị Rom ahụ ọ̀ nọ ‘n’ọnọdụ’ nke mere ka o kwesị ekwesị Pọl ilegara ịchịisi ahụ anya maka nchebe nke ihe ndị ruuru ya? N’eziokwu, okwu ndị ozi ahụ kwuru tupu mgbe ahụ, bụ́, “Anyị aghaghị ikwenyere Chineke [dị ka onye na-achị achị, NW] kari mmadụ,” ò nyere ohere ndị Kraịst irubere ndị ọchịchị bụ mmadụ isi mgbe ọ bụla ọ na-emetụtaghị inupụrụ Chineke isi?—Ọrụ 5:29.

3. Ụzọ ile ihe anya dị aṅaa nke gosiri ntozu okè ka Pọl kpughere, oleekwa otú nke a si metụta akọ na uche?

3 Pọl na-enyere anyị aka ịza ajụjụ ndị a n’akwụkwọ ozi o degaara ndị Rom, bụ́ ebe o nyeere anyị aka ile ịchịisi ụmụ mmadụ anya n’ụzọ na-egosi ntozu okè. Ná Ndị Rom 13:1-7, Pọl mere ka o doo anya ọrụ akọ na uche onye Kraịst na-aghaghị ịrụ n’ime nhazi n’etiti nrubeisi zuru ezu a ga-enye Onye Ọchịchị ahụ Kasị Elu, bụ́ Jehova Chineke, na nrubeisi a kpaara okè a ga-enye “ndị na-achị isi.”

Ịmata Ndị Na-achị Isi

4. Mgbanwe dị aṅaa n’ụzọ ile ihe anya ka e nwere na 1962, na-akpalite ajụjụ dịgasị aṅaa?

4 Ruo afọ ụfọdụ tupu 1962, Ndịàmà Jehova anọwo na-eche na ndị ahụ na-achị isi bụ Jehova Chineke na Kraịst Jisọs. Otú ọ dị, n’ikwekọ n’Ilu 4:18, ìhè mụbara, a gbanwekwara echiche nke a, nke pụrụ iwelite ajụjụ n’echiche ụfọdụ ndị. Ànyị ziri ezi ugbu a n’ikwu na ndị a na-achị isi bụ ndị eze, ndị isi ala, ndị praịm minista, ndị ọchịchị obodo ukwu, ndị ọkà ikpe, na ndị ọzọ ndị nwere ike ọchịchị nkịtị n’ime ụwa, na anyị jikwa ụgwọ ido onwe anyị n’okpuru ha n’ụzọ a kpaara ókè?

5. N’ụzọ dị aṅaa ka amaokwu ndị gbara Ndị Rom 13:1 gburugburu si enyere anyị aka ịmata ndị bụ ndị na-achị isi, oleekwa otụ́ nsụgharị Bible dị iche iche si kwadoo nkọwa nke a?

5 Irenaeus, bụ́ onye dere ihe n’ime narị afọ nke abụọ nke Oge Anyị, kwuru na dị ka ụfọdụ ndị si kwuo n’oge ya, Pọl na-ekwu okwu ná ndị Rom 13:1 “banyere ndị ọchịchị bụ ndị mmụọ ozi [ma ọ bụ] ndị ọchịchị a na-adịghị ahụ anya.” Ma Irenaeus n’onwe ya lere ndị ahụ na-achị isi anya dị ka “ndị ọchịchị bụ mmadụ n’ezie.” Ọnọdụ okwu Pọl ndị ahụ dị na ya na-egosi na ihe Irenaeus chere ziri ezi. N’amaokwu ndị ikpeazụ nke Ndị Rom isi 12, Pọl kọwara otú ndị Kraịst kwesịrị isi duzie onwe ha n’ihu “mmadụ nile,” na-emeso ọbụna ‘ndị iro’ omume n’ịhụnanya na ezi nlebara anya. (Ndị Rom 12:17-21) N’ụzọ doro anya, okwu ahụ bụ “mmadụ nile” metụtara ndị na-anọghị n’ime ọgbakọ ndị Kraịst. Ya mere, “ndị na-achị isi” ahụ, ndị Pọl gara n’ihu ikwu ihe metụtara ha, aghaghịkwa ịbụ ndị na-anọghị n’ọgbakọ ndị Kraịst. N’ikwekọ na nke a, rịba ama otú nsụgharị dị iche iche si dee akụkụ mbụ nke Ndị Rom 13:1: “Onye ọ bụla aghaghị irubere ndị ọchịchị obodo isi” (Today’s English Version); “onye ọ bụla aghaghị ido onwe ya n’okpuru ndị na-achị achị” (New International Version); “onye ọ bụla kwe-sịrị irubere ndị ọchịchị obodo isi.”—New Testament in Modern English nke Phillips.

6. Olee otú okwu Pọl kwuru banyere ịtụ ụtụ na ụtụ ahịa si gosi na ndị na-achị isi aghaghị ịbụ ndị ọchịchị nkịtị?

6 Pọl gara n’ihu ikwu na ndị ọchịchị ndị a na-achọ ka a tụọ ụtụ ma ọ bụ ụtụ ahịa. (Ndị Rom 13:6, 7) Ọgbakọ ndị Kraịst adịghị achọ ụtụ ma ọ bụ ụtụ ahịa n’aka ndị mmadụ; Jehova ma ọ bụ Jisọs Kraịst ma ọ bụ “ndị ọchịchị a na-adịghị ahụ anya” ọ bụla ọzọ adịghị achọkwa ha. (2 Ndị Kọrint 9:7) Ọ bụ nanị ndị ọchịchị nkịtị ka a na-atụrụ ụtụ. N’ikwekọ na nke a, okwu Grik maka “ụtụ” na “ụtụ ahịa” ndị Pọl jiri mee ihe ná Ndị Rom 13:7 na-ezo aka kpọmkwem n’ego a kwụrụ Obodo.a

7, 8. (a) Olee ụzọ akụkụ akwụkwọ nsọ dị iche iche si kwekọọ n’echiche ahụ nke bụ na ndị Kraịst kwesịrị ido onwe ha n’okpuru ndị na-achị achị nke ụwa nke a? (b) Òle mgbe nanị ka onye Kraịst na-agaghị ekwenyere ihe ‘ọchịchị’ nyere n’iwu?

7 N’ịga n’ihu, agbamume Pọl ka mmadụ doo onwe ya n’okpuru ndị na-achị isi kwekọrọ n’ihe ahụ Jisọs nyere n’iwu ịkwụghachi “Siza ihe nke Siza,” ebe “Siza” nọchiri anya ndị ọchịchị nkịtị. (Matiu 22:21) O kwekọkwara n’okwu Pọl mesịrị gwa Taịtọs: “Na-echetara ha ka ha na-edo onwe ha n’okpuru ndị isi, n’okpuru ndị nwere ike, ka ha na-ekwenye ekwenye, ka ha bụrụ ndị e doziworo ịrụ ezi ọrụ nile ọ bụla.” (Taịtọs 3:1) N’ihi ya, mgbe ndị ọchịchị nyere ndị Kraịst iwu ikere òkè n’ọrụ obodo, ha na-eme nnọọ nke a n’ụzọ kwesịrị ekwesị ma ọ bụrụhaala na ọrụ ndị ahụ apụtaghị ihe mebiri okwukwe ha nke ha na-eme n’ọnọdụ ije ozi ụfọdụ nke megidere akwụkwọ nsọ ma ọ bụ si n’ụzọ ọ bụla ọzọ mebie ụkpụrụ akwụkwọ nsọ, dị ka nke ahụ dị n’Aịsaịa 2:4.

8 Pita mesikwara ya ike na anyị kwesịrị ido onwe anyị n’okpuru ndị ọchịchị ụwa nke a mgbe ọ sịrị: “Doonụ onwe unu n’okpuru ịbụ isi ọ bụla mmadụ debere n’ihi Onyenwe anyị; ma ọ bụ eze, dị ka onye nọ n’ike n’elu unu; ma ọ bụ ndị isi, dị ka ndị a na-ezite site n’aka ya ka ha bọọ ọ̀bọ̀ n’ahụ ndị na-eme ihe ọjọọ, ka ha tookwa ndị na-eme ezi ihe.” (1 Pita 2:13, 14) N’ikwekọ na nke a, ndị Kraịst ga-agbasokwa ndụmọdụ ahụ Pọl nyere Timoti, sị: “Ya mere ihe mbụ m na-adụsi ọdụ ike bụ, ka a na-arịọ arịrịọ, kpeekwa ekpere, rịọkwa arịrịọ a na-arịọrọ ndị ọzọ, keleekwa ekele, n’ihi mmadụ nile; n’ihi ndị eze na ndị nile nọ n’ọnọdụ dị elu; ka anyị wee biri obi udo na nke dị nwayọọ n’ime nsọpụrụ Chineke nile na ikwesị nsọpụrụ nile.”b—1 Timoti 2:1, 2.

9. N’ihi gịnị ka o ji bụrụ na o wepụghị ihe ọ bụla site n’otuto Jehova izo aka n’ebe ndị ọchịchị bụ mmadụ nọ dị ka “ndị na-achị isi”?

9 N’ịkpọ ndị ọchịchị “ndị na-achị isi,” ọ̀ dị ụzọ ọ bụla anyị si na-ewepụ ihe site ná nkwanye ùgwù nke ruuru Jehova? Ee e, n’ihi na Jehova dị elu nke ukwuu karịa ịchịisi nkịtị. Ọ bụ “Eze Onyenwe anyị,” “Onye ahụ nke Kachasị Ihe Nile Elu.” (Abụ Ọma 73:28, NW; Daniel 7:18, 22, 25, 27; Mkpughe 4:11; 6:10) Ọ dịghị ụzọ ọ bụla ido onwe onye n’okpuru n’ụzọ kwesịrị ekwesị nye ndị ọchịchị bụ mmadụ si wepụ ihe ọ bụla site n’ofufe a na-enye Onye Ọchịchị Ahụ Kasị Elu, Eze Onyenwe anyị bụ́ Jehova. Ya mere, ruo ókè ha aṅaa ka ndị ọchịchị ndị a bụ ndị dị elu? Ọ bụ nanị n’ihe banyere mmadụ ndị ọzọ nakwa n’ọgbọ ihe omume nke ha onwe ha. Ọ bụ ibu ọrụ ha ịchị achị na ichebe ógbè dị iche iche nke ụmụ mmadụ, ijikwa wee mee nke a, ha na-enye iwu nduzi dị iche iche n’ihe banyere nduzi nke ihe omume ọha dị iche iche.

“Ndị Chineke Doworo”

10. (a) Okwu Pọl banyere ‘ido’ ndị na-achị isi n’ọnọdụ ha nwapụtara gịnị banyere ike ịchịisi nke Jehova n’onwe ya? (b) Gịnị ka Jehova kweworo ka o mee n’ihe metụtara ‘ido’ ndị ọchịchị ụfọdụ n’ọnọdụ ha, oleekwa ụzọ a na-esi jiri nke a na-anwale ndị ohu ya?

10 Ịdị elu nke Jehova Chineke ọbụna karịa ndị ọchịchị nkịtị bụ nke a na-ahụ n’eziokwu ahụ nke bụ na ndị ọchịchị ndị a “bụkwa ndị Chineke doworo.” Otú ọ dị, okwu nke a na-akpali otu ajụjụ. Afọ ole na ole mgbe Pọl desịrị okwu ndị a, onye ọchịchị alaeze Rom bụ Nero malitere oké mkpagbu megide ndị Kraịst. Ọ̀ bụ Chineke do-bere Nero n’onwe ya n’ọnọdụ ya? Ọ dịghị ma ọlị! Ọ bụghị na ọ bụ Chineke na-ahọpụta onye ọchịchị nke ọ bụla n’otu n’otu, wee debe ya n’ọkwá ‘site n’amara Chineke.’ Kama nke ahụ, mgbe ụfọdụ, Setan na-etinye ndị mmadụ obi tara mmiri n’ọkwá dị ka ndị ọchịchị, Jehova na-ekwekwa ka nke a mee, tinyekwara ule ndị ọchịchị dị otú ahụ ga-ewetara ndị ohu ya ndị na-eguzosi ike n’ezi ihe.—Tụlee Job 2:2-10.

11, 12. Ihe atụ dịgasị aṅaa ka e nwere ihe ndekọ ha, bụ́ mgbe Jehova n’onwe ya mere ihe itinye ma ọ bụ iwepụ ndị ọchịchị nkịtị n’ọkwá?

11 Otú ọ dị, Jehova etinyewo aka n’onwe ya n’ihe banyere ụfọdụ ndị na-achị achị ma ọ bụ ndị ọchịchị ka e wee mezuo nzube ya dị elu. Dị ka ihe atụ, n’oge Abraham, e kwere ka ndị Kenean nọgide n’ala Kenean. Ma mgbe e mesịrị, Jehova fopụrụ ha iji wee nye mkpụrụ Abraham ala ahụ. N’oge njem ndị Israel gara n’ọzara, Jehova ekweghị ka ha merie Edọm, Moab, na Ugwu Sia. Ma o nyere ha iwu ka ha bibie alaeze nile nke Saịhọn na Ọg.—Jenesis 15:18-21; 24:37; Ọpụpụ 34:11; Deuterọnọmi 2:4, 5, 9, 19, 24; 3:1, 2.

12 Mgbe Israel birisịrị na Kenean, Jehova nọgidere na-enwe mmasị kpọmkwem n’ọchịchị dị iche iche ndị metụtara ndị ya. Oge ụfọdụ, mgbe Israel mere mmehie, Jehova kwere ka ha bịa n’okpuru ọchịchị ndị na-ekpere arụsị. Mgbe ha chegharịrị, ọ na-ewepụkwa ọchịchị ahụ site n’ala ha. (Ndị Ikpe 2:11-23) N’ikpeazụ, o kwere ka Juda, tinyere ọtụtụ mba ndị ọzọ, bata n’okpuru ọchịchị nke Babilọn. (Aịsaịa 14:28-19:17; 23:1-12; 39:5-7) Mgbe Israel banyesịrị ná ndọta n’agha na Babilọn, Jehova buru amụma mbilite na ọdịda nke alaeze ụwa dị iche iche ndị ga-emetụta ndị ya site n’oge Babilọn gbadata ruo n’oge anyị a.—Daniel, isi 2, 7, 8, na Da 11.

13. (a) Dị ka abụ Mosis si kwuo, n’ihi gịnị ka Jehova ji nye iwu maka ókèala nke ndị dị iche iche? (b) N’ihi gịnị ka Chineke jiri mesịa weghachite Israel n’ala ya?

13 Mosis bụrụ abụ banyere Jehova, sị: “Mgbe Onye Kachasị Ihe Nile Elu mere ka mba nile keta ihe ha, mgbe o kesara ụmụ mmadụ, o guzoro ókè nile nke ndị nile dị ka ọnụ ọgụgụ ụmụ Israel si dị. N’ihi na òkè Jehova bụ ndị ya; Jekọb bụ akụkụ ihe nketa ya.” (Deuterọnọmi 32:8, 9; tụlee Ọrụ 17:26.) Ee, iji wee mezuo nzube ya nile, Chineke nyere iwu n’ebe ahụ banyere ọchịchị ndị ga-adịgide na ndị a ga-ebibi. N’ụzọ dị otú ahụ, o kenyere ụmụ Abraham ala ha ga-eketa, mesịakwa weghachite ha n’ala ahụ, ka Mkpụrụ ahụ e kwere ná nkwa wee mesịa site n’ebe ahụ pụta, dị nnọọ ka e buru n’amụma.—Daniel 9:25, 26; Maịka 5:2.

14. N’ụzọ bụ isi, n’echiche dị aṅaa ka Jehova na-etinye ndị ọchịchị bụ mmadụ n’ọnọdụ ha dị iche iche?

14 Otú ọ dị, n’ihe ka ọtụtụ n’ọnọdụ ndị e nwere, Jehova na-edo ndị na-achị isi n’ọnọdụ ha n’echiche nke bụ na ọ na-agbachi nkịtị ka ha were ọkwá ọchịchị n’ụzọ metụtara ibe ha, ma na-abụ nke dị ala mgbe nile n’ebe ya onwe ya nọ. Otú a, mgbe Jisọs guzoro n’ihu Pọntịọs Paịlat, ọ gwara onye ọchịchị ahụ, sị: “Ị gaghị enwe ike ọ bụla imegide m, ọ bụrụ na e sighị n’elu nye gị ya rịị.” (Jọn 19:11) Nke a apụtaghị na Chineke debere Paịlat n’onwe ya n’ọkwá ọchịchị, kama ọ pụtara na ike ahụ o nwere n’ebe ọnwụ na ndụ dị n’ihe banyere Jisọs bụ nanị n’ihi na Chineke kwere ka ọ dịrị otú ahụ.

“Chi nke Oge A”

15. N’ụzọ dị aṅaa ka Setan si jiri ike ọchịchị na-eme ihe n’ụwa nke a?

15 Ma, gịnị banyere ihe ahụ Bible kwuru na Setan bụ chi, ma ọ bụ onye ọchịchị nke ụwa nke a? (Jọn 12:31; 2 Ndị Kọrint 4:4) N’ezie, gịnị banyere ịnya isi ahụ Setan meere Jisọs mgbe o gosiri Jisọs alaeze nile nke ụwa wee sị: “Ike a nile, ... a rarawo ya nye n’aka m; onye ọ bụla m chọkwara inye ya m nye ya.” (Luk 4:6) Jisọs ekwughị ihe megidere ịnya isi Setan. Okwu Setan kwekọkwara n’ihe Pọl mesịrị degara ndị Efesọs: “Ịgba mgba anyị abụghị imegide anụ ahụ na ọbara, kama ọ bụ imegide ịbụ ndị isi nile, imegide ịchịisi nile, imegide ndị onwe ụwa nke ọchịchịrị a, imegide ndị agha mmụọ nke ajọ ihe n’ebe dị n’eluigwe.” (Ndị Efesọs 6:12) Ọzọkwa, akwụkwọ Mkpughe gosipụtara Setan dị ka oké dragọn nke na-enye onyinyo ahụ yiri anụ ọhịa nke usoro ọchịchị ụwa “ike ya, na ocheeze ya, na oké ịchịisi.”—Mkpughe 13:2.

16. (a) À pụrụ isi aṅaa hụ na ike ọchịchị Setan bụ nke a kpaara ókè? (b) N’ihi gịnị ka Jehova ji kwere ka Setan na-enwe ike ọchịchị n’etiti ihe a kpọrọ mmadụ?

16 Ma, rịba ama na okwu Setan gwara Jisọs, bụ́ “Ike a nile, . . . a rarawo ya nye n’aka m,” gosiri na ya onwe ya na-enwekwa ike ọchịchị nanị n’ihi na e kwere ka ọ dịrị otú ahụ. N’ihi gịnị ka Chineke ji kwere ka nke a dịrị? Ọrụ Setan dị ka onye ọchịchị ụwa malitere laa azụ n’Iden mgbe o boro Chineke ebubo n’ihu ọha na ọ bụ onye ụgha, na ọ na-ejikwa ịbụ ọkaaka Ya na-eme ihe n’ụzọ nke ikpe na-ezighị ezi. (Jenesis 3:1-6) Adam na Iv gbasoro Setan wee nupụrụ Jehova Chineke isi. Kpọmkwem n’oge ahụ, n’ụzọ kwekọrọ n’ikpe ziri ezi nile, Jehova pụrụ igbuworị Setan na mmadụ abụọ ọhụrụ ndị ahụ na-eso ya. (Jenesis 2:16, 17) Ma n’ezie, okwu Setan bụ ịma aka nye Jehova n’onwe ya. Ya mere, n’amamihe ya, Chineke kwere ka Setan dịrị ndụ ruo nwa oge, e kwekwara ka Adam na Iv mụọ ọtụtụ ụmụ tupu ha anwụọ. N’ụzọ dị otú a, Chineke nyere oge na ohere ka e gosipụta ịbụ ụgha nke ihe ịma aka Setan.—Jenesis 3:15-19.

17, 18. (a) N’ihi gịnị ka anyị pụrụ iji kwuo na Setan bụ chi nke ụwa nke a? (b) N’ụzọ dị anaa ka o si bụrụ na “ọ dịghị onye ọ bụla na-achị isi” n’ụwa nke a “ma ọ bụrụ na Chineke edoghị ya”?

17 Ihe ndị meworonụ kemgbe Iden egosiwo na ebubo nile Setan boro bụ okwu ụgha ndị a na-adịghị enyo enyo. Umụ Adam achọtabeghị obi ụtọ ma n’okpuru ọchịchị Setan ma n’okpuru ọchịchị mmadụ. (Eklisiastis 8:9) N’aka nke ọzọ, ụzọ Chineke si emeso ndị nke ya ihe egosiwo na ọchịchị Chineke dị mma karị. (Aịsaịa 33:22) Ma ebe ọ bụ na ihe ka ọtụtụ n’ụmụ Adam adịghị anakwere ịbụ ọkaaka nke Jehova, ma hà maara ma ọ bụ na ha amaghị, ha na-ejere Setan ozi dị ka chi ha.—Abụ Ọma 14:1; 1 Jọn 5:19.

18 N’oge na-adịghị anya, a gaje idozi ihe iseokwu ndị ahụ e welitere n’Iden. Alaeze Chineke ga-ewegharazu nduzi nke ihe omume nile nke ihe a kpọrọ mmadụ, a gatụbakwa Setan n’abyss. (Aịsaịa 11:1-5; Mkpughe 20:1-6) Ma, ka ọ dịgodị ugbu a, ọ dịwo mkpa inwe ụdị ndokwa, ma ọ bụ nhazi ụfọdụ n’etiti ihe a kpọrọ mmadụ ka e wee nwee ike ịdị ndụ n’ụzọ a haziri ahazi. Jehova “abụghị Chineke nke aghara, kama ọ bụ Chineke nke udo.” (1 Ndị Kọrint 14:33) N’ihi ya, o kwewo ka nhazi ịchịisi na-adị adị n’ógbè dị iche iche ndị biliteworo n’azụ Iden, o kwewokwa ka ụmụ mmadụ nwee ike ọchịchị ná ndokwa nke a. N’ụzọ dị otú a, “ọ dịghị onye ọ bụla na-achị isi ma ọ bụrụ na Chineke edoghị ya.”

Ndị Na-achị Isi Ndị Nwere Uche Ikpe Ziri Ezi

19. Onye ọchịchị ọ bụla bụ mmadụ ọ̀ nọ kpọmkwem n’okpuru nduzi Setan?

19 Kemgbe Iden, Setan enwerewo nnọọ onwe ya n’ụzọ sara mbara n’etiti ihe a kpọrọ mmadụ, o jiwokwa inwe onwe nke a mee ihe iduzi ihe ndị na-eme n’elu ala, n’ụzọ kwekọrọ n’isi ahụ ọ nyaara Jisọs. (Job 1:7; Matiu 4:1-10) Otú ọ dị, nke a apụtaghị na onye ọchịchị ọ bụla nọ n’ụwa na-edo onwe ya kpọmkwem n’okpuru nduzi nke Setan. Ụfọdụ—dị ka Nero n’ime narị afọ mbụ ahụ na Adolf Hitler n’ime narị afọ nke anyị—egosipụtawo mmụọ bụ nke Setan n’ezie. Ma ndị ọzọ emebeghị otú ahụ. Sajiọs Pọlọs, bụ́ onye isi nke Saịprọs, bụ “nwoke nwere nghọta,” onye ‘chọrọ ịnụ okwu Chineke.’ (Ọrụ 13:7) Galio, bụ́ onye isi nke Akaịa, jụrụ ịbụ onye ndị Juu na-ebo Pọl ebubo rụgidere ime ihe ọ na-achọghị ime. (Ọrụ 18:12-17) Ọtụtụ ndị ọchịchị ndị ọzọ ejiwo ezi akọ na uche jiri ike ịchịisi ha mee ihe n’ụzọ kwụ ọtọ.—Tụlee Ndị Rom 2:15.

20, 21. Ihe omume dịgasị aṅaa n’ime narị afọ nke iri abụọ nke a na-egosi na ọ bụghị mgbe dum ka ndị ọchịchị bụ mmadụ na-eme uche Setan?

20 Akwụkwọ Mkpughe buru amụma na n’ime “ụbọchị Onyenwe anyị” nke malitere na 1914, Jehova Chineke ga-eduzi ọbụna ndị ọchịchị bụ mmadụ imebi nzube Setan. Mkpughe kọwara otu ntiwapụ nke mkpagbu, nke Ekwensu wetara imegide ndị Kraịst e tere mmanụ, nke “ala” ga-eloda. (Mkpughe 1:10; 12:16) Ihe dị iche iche ndị dị ‘n’ala,’ bụ́ òtù ụmụ mmadụ nke dị adị ugbu a n’elu ala, ga-echebe ndị Jehova pụọ ná mkpagbu Setan.

21 Nke a ò mewo eme n’ezie? Ee. N’afọ ndị 1930 na 1940, dị ka ihe atụ, Ndịàmà Jehova nọ na United States batara n’okpuru oké nrụgide, na-ata ahụhụ n’aka ọha mmadụ ndị na-eme ihe ike ịwakwasị ha nakwa ijide ha ọtụtụ ugbo n’ụzọ iwu na-akwadoghị. Ha nwetara nnapụta mgbe Ụlọikpe Kasị Elu nke mba U.S. mere mkpebi ikpe ụfọdụ ndị nabatara nkwado iwu nke ọrụ ha nwere. N’ebe ndị ọzọkwa, ndị na-achị isi agbataworo ndị Chineke ọsọ enyemaka. N’ihe dị ka 40 afọ gara aga n’Ireland, otu ìgwè ndị Roman Katọlik wakwasịrị Ndịàmà abụọ n’obodo Cork. Otu onye uwe ojii nọ n’ebe ahụ bịara nyere Ndịàmà ahụ aka, òtù ụlọikpe nye-kwara ndị mwakwasị ahụ ahụhụ. N’afọ gara aga na Fiji, otu nzukọ ndị chiifu ukwu nụrụ otu atụmatụ a na-eme ịmachibido Ndịàmà Jehova iwu. Otu onye chiifu ji anya ike kwuo okwu n’ịkwado Ndịàmà ahụ, e wee merie atụmatụ ahụ n’ụzọ dị mfe.

22. Ajụjụ dịgasị aṅaa ka a gaje ịtụle?

22 Ee e, ọ bụghị mgbe nile ka ndị ọchịchị nkịtị na-eme ihe imezu nzube Setan. Ndị Kraịst pụrụ ido onwe ha n’okpuru ndị na-achị isi n’edoghị onwe ha n’okpuru Setan n’onwe ya. N’eziokwu, ha ga-anọgide na-anọ n’okpuru ndị a na-achị isi ruo ogologo oge Chineke kwere ka ndị ahụ na-achị isi dịgide. Ma, gịnị ka ido onwe onye n’okpuru n’ụzọ dị otú ahụ pụtara? Gịnịkwa ka ndị Kraịst pụrụ ịtụ anya inweta site n’aka ndị a na-achị isi? A ga-atụle ajụjụ ndị a n’isiokwu ndị ahụ dịịrị ọmụmụ ndị ga-amalite na peji 18 na 23 nke magazin nke a.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

a Dị ka ihe atụ, lee ojiji e jiri okwu ahụ bụ “ụtụ” (pho’ros) mee ihe na Luk 20:22. Leekwa ojiji e jiri okwu Grik ahụ bụ te’los mee ihe, bụ́ nke a sụgharịrị n’ebe a ịbụ “ụtụ ahia,” na Matiu 17:25, bụ́ ebe a sụgharịrị ya [ná nsụgharị NW] dị ka “ụtụ azụmahia.”

b Mkpọaha Grik ahụ a sụgharịrị ịbụ “ọnọdụ dị elu,” hy-pe-re’kho, metụtara ngwaa ahụ bụ hy-pe-re’kho. Okwu ahụ bụ “na-achị isi” nke dị ná “ndị na-achị isi” ka e nwetara site n’otu ngwaa Grik nke a, bụ́ nke na-atụkwasị ihe n’ihe àmà nke na-egosi na ndị na-achị isi a na-ekwu okwu ha n’ebe a bụ ndị ọchịchị nkịtị. Ụzọ e si dee Ndị Rom 13:1 ná nsụgharị The New English Bible bụ́, “Onye ọ bụla aghaghị ido onwe ya n’okpuru ndị na-achị isi kachasị elu,” ezighị ezi. Ụmụ mmadụ ndị nọ “n’ọnọdụ dị elu” abụghi ndị kachasị elu, ọ bụ ezie na ha pụrụ ịbụ ndị na-achị isi nye mmadụ ndị ọzọ.

Ị̀ Ga-esi Aṅaa Zaa?

◻ Òle ndị bụ ndị na-achị isi?

◻ Ànyị pụrụ isi aṅaa kwuo na “ọ dịghị onye ọ bụla na-achị isi ma ọ bụrụ na Chineke edoghị ya”?

◻ N’ihi gịnị ka Jehova ji na-ekwere ka ụwa nọgide n’okpuru ike ọchịchị Setan?

◻ N’ụzọ dị aṅaa ka o si bụrụ na Chineke na-edo ndị ọchịchị bụ mmadụ ‘n’ọnọdụ ha’?

[Foto dị na peeji nke 13]

Mgbe ọkụ gbasịrị Rom, Nero gosipụtara mmụọ bụ nke Setan n’ezie

[Foto dị na peeji nke 15]

Sajiọs Pọlọs, bụ́ onye isi Saịprọs, chọrọ ịnụ okwu Chineke

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya