Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • ijwbq isiokwu 147
  • Olee Otú Ị Ga-esi Adị Ndụ Ebighi Ebi?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Olee Otú Ị Ga-esi Adị Ndụ Ebighi Ebi?
  • Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ihe Baịbụl kwuru
  • Echiche Na-ezighị Ezi Ndị E Nwere Banyere Ịdị Ndụ Ebighi Ebi
  • Anyị Ga-adịli Ndụ Ebighị Ebi
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2022
  • Mmadụ Ò Nwere Ike Ịdị Ndụ Ruo Mgbe Ebighị Ebi?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2012
  • Ụwa Ọhụrụ Chineke nke Udo Ga-adị na Ya—Ị Pụrụ Ibi na Ya
    Mụta Ihe Site n’Aka Onye Ozizi Ukwu Ahụ
  • Ndụ Ebighị Ebi Ọ̀ Ga-ekwe Omume n’Ezie?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1999
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara
ijwbq isiokwu 147
Nwoke nke si na nwa ọhụrụ too ghọọ dimkpa

Olee Otú Ị Ga-esi Adị Ndụ Ebighi Ebi?

Ihe Baịbụl kwuru

Baịbụl kwere nkwa, sị: “Onye na-eme uche Chineke ga-anọgide ruo mgbe ebighị ebi.” (1 Jọn 2:17) Gịnị ka Chineke chọrọ ka i mee?

  • Mụọ gbasara Chineke na Ọkpara ya, bụ́ Jizọs. Jizọs kpere ekpere, sị: “Iji nweta ndụ ebighị ebi, ọ dị ha mkpa ịmata gị nke ọma, onye naanị ya bụ ezi Chineke, matakwa onye i zitere, bụ́ Jizọs Kraịst.” (Jọn 17:3) Olee ihe dị ‘n’ịmata Chineke na Jizọs nke ọma?’ Otú anyị ga-esi amata ha bụ ịmụ Baịbụl nakwa ime ihe ndị anyị na-amụta.a Baịbụl kwuru otú Onye kere anyị na Onye na-enye anyị ndụ, bụ́ Jehova Chineke, si eche echiche. (Ọrụ Ndịozi 17:24, 25) Baịbụl gwakwara anyị gbasara Ọkpara ya, bụ́ Jizọs, bụ́ onye kụziiri anyị “okwu nke ndụ ebighị ebi.”—Jọn 6:67-69.

  • Nwee okwukwe n’àjà Jizọs ji ndụ ya chụọ. Jizọs bịara n’ụwa “ka o jee ozi, ka o nyekwa mkpụrụ obi ya ka ọ bụrụ ihe mgbapụta.” (Matiu 20:28) Àjà Jizọs ji ndụ ya chụọ mere ka ụmụ mmadụ nwee ike ịdị ndụ ebighi ebi na paradaịs n’ụwa.b (Abụ Ọma 37:29) Jizọs kwuru, sị: “Chineke hụrụ ụwa n’anya nke ukwuu nke na o nyere Ọkpara ọ mụrụ naanị ya, ka e wee ghara ibibi onye ọ bụla nke nwere okwukwe na ya, kama ka o nwee ndụ ebighị ebi.” (Jọn 3:16) Ihe e kwuru ebe a gosiri na a chọrọ ihe karịrị naanị ikwere na Jizọs. Anyị kwesịrị ‘inwe okwukwe na ya,’ kpebiekwa ime ihe ọ kụziri na ime uche Nna ya.—Matiu 7:21; Jems 2:17.

  • Mee ka gị na Chineke bụrụ ezigbo enyi. Chineke chọrọ ka ị bịaruo ya nso ma bụrụ enyi ya. (Jems 2:23; 4:8) Chineke na-adịru ebighi ebi. Ọ gaghị anwụ anwụ. Ọ chọkwara ka ndị enyi ya dịkwa ndụ ebighi ebi. Chineke si n’Okwu ya bụ́ Baịbụl gwa anyị ihe ọ chọrọ ka ndị na-achọ ya nweta. Ọ sịrị: “Ka obi unu dị ndụ ruo mgbe ebighị ebi.”—Abụ Ọma 22:26.

Echiche Na-ezighị Ezi Ndị E Nwere Banyere Ịdị Ndụ Ebighi Ebi

Ụgha: Ndị mmadụ nwere ike iji aka ha eme ka a dịwa ndụ ebighị ebi.

Eziokwu: Ọ bụ eziokwu na ọganihu ndị e nwerela n’ihe banyere ahụ́ ike na-eme ka ọ dị ka ndụ mmadụ ọ̀ na-agbatịkwu, ọ gaghị emeli ka ndị mmadụ dị ndụ ebighi ebi. Ọ bụ naanị Chineke ga-emeli ka anyị dị ndụ ebighi ebi, n’ihi na ọ bụ ya bụ “isi iyi nke ndụ.” (Abụ Ọma 36:9) O kwere nkwa na ya “ga-eloda ọnwụ ruo mgbe ebighị ebi,” ma mee ka ndị niile kwesịrị ntụkwasị obi dị ndụ ebighi ebi.—Aịzaya 25:8; 1 Jọn 2:25.

Ụgha: E nwere agbụrụ ọ bụ naanị ha nwere ike ịdị ndụ ebighị ebi.

Eziokwu: Chineke anaghị ele mmadụ anya n’ihu. Kama, “ná mba ọ bụla, onye na-atụ egwu ya ma na-eme ezi omume bụ onye ọ na-anabata nke ọma.” (Ọrụ Ndịozi 10:34, 35) Ụdị mmadụ ọ bụla si n’agbụrụ dị iche iche ga-adị ndụ ebighị ma ọ bụrụhaala na onye ahụ na-erubere Chineke isi.

Ụgha: Ndụ ebighi ebi ga na-agwụ ike.

Eziokwu: Ọ bụ Chineke, bụ́ onye hụrụ anyị n’anya ma chọọ ka anyị na-enwe obi ụtọ, kwere nkwa ime ka anyị dị ndụ ebighi ebi. (Jems 1:17; 1 Jọn 4:8) Chineke maara na anyị kwesịrị inwe ihe bara uru anyị na-arụ ka anyị nwee ike inwe obi ụtọ. (Ekliziastis 3:12) Chineke kwere ndị niile ga-adị ndụ ebighi ebi n’ụwa a nkwa na ha ga-enwe ọrụ bara uru ha ga na-arụ ga na-eme ha obi ụtọ. Ọrụ a ga-abara ma hanwa ma ndị ha hụrụ n’anya uru.—Aịzaya 65:22, 23.

Ihe ọzọkwa bụ na ndị ga-adị ndụ ebighi ebi ga-anọgide na-amụta ihe ọhụrụ gbasara Onye kere ha nakwa gbasara ihe ndị ọzọ o kere. O kere ụmụ mmadụ otú ha ga na-achọ ịdị ndụ ebighi ebi na-achọkwa ịmata onye ọ bụ. Ma, ha agaghị ‘achọpụta ọrụ ezi Chineke rụrụ site ná mmalite ruo ná ngwụsị.’ (Ekliziastis 3:10, 11) Ma, ndị ahụ ga-adị ndụ ebighi ebi ga na-enwe ọtụtụ ihe ndị magburu onwe ha ha ga na-amụta nakwa ihe ndị ha ga na-eme.

a Ndịàmà Jehova na-amụrụ ndị mmadụ Baịbụl n’anaghị ha ego. Ị chọọ ịmatakwu gbasara nke a, lee vidio aha ya bụ Olee Otú Anyị na Ndị Mmadụ Si Amụ Baịbụl?

b Gụọ isiokwu bụ́ “Olee Otú Jizọs Si Azọpụta?”

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya