Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w91 4/15 p. 8-9
  • N’akụkụ Osimiri Galili

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • N’akụkụ Osimiri Galili
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1991
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • N’Osimiri Galili
    Nwoke Kasị Ukwuu nke Dịworo Ndụ
  • Mgbe Jizọs Nọ n’Akụkụ Oké Osimiri Galili
    Jizọs Bụ Ụzọ, Eziokwu, na Ndụ
  • Jizọs Pụtara n’Ihu Ndị Gara Igbu Azụ̀
    Ihe Ị Ga-amụta n’Akụkọ Baịbụl
  • O Kweghị Ka Ụjọ na Obi Abụọ Mee Ka Ọ Kwụsị Iso Kraịst
    Ṅomie Okwukwe Ha
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1991
w91 4/15 p. 8-9

Ndụ na Ije Ozi Jisọs

N’akụkụ Osimiri Galili

NDỊ ozi ahụ lọghachiri na Galili ugbu a, dị ka Jisọs buwororịị ụzọ gwa ha ka ha mee. Ma ha ejighị n’aka ihe ha gaje ime n’ebe ahụ. Mgbe nwa oge nta gasịrị, Pita gwara Tọmas, Nataniel, Jemes na nwanne ya nwoke bụ Jọn, na ndị ozi abụọ ndị ọzọ, sị: “Ana m aga igbu azụ.”

Mmadụ isii ahụ zaghachiri, sị, “Anyị onwe anyị ga-esokwa gị jee.”

N’ime ogologo abalị ahụ dum, ha egbuteghị azụ ọ bụla. Otú ọ dị, mgbe chi na-amalite ịbọ, Jisọs pụtara n’akụkụ osimiri ahụ, ma ndị ozi ahụ amataghị na ọ bụ Jisọs. O tiri mkpu, sị: “Ụmụntakịrị, ùnu ji ihe oriri ọ bụla?”

Ha si n’ófè ọzọ nke mmiri ahụ tie mkpu zaghachi ya, sị, “Ee e.”

Ọ sịrị, “Wụnyenụ ihe unu ji egbu azụ n’akụkụ aka nri nke ụgbọ, unu ga-ahụkwa.” Mgbe ha mekwara nke a, ha enweghị ike ịdọgota ụgbụ ha n’ihi azụ nile dị n’ime ya. Jọn tiri mkpu, sị, “Ọ bụ Onyenwe anyị.” Pita yikwasịrị uwe elu ya, maba n’ime osimiri ahụ, wee gwuo mmiri ihe dị ka 90 mita ruo ụsọ osimiri ahụ. Ndị ozi ndị ọzọ ahụ ji ụgbọ nta ahụ sochie ya, dọkpụrụ ụgbụ ahụ nke jupụtara n’azụ na-aga.

Mgbe ha rutere n’akụkụ osimiri ahụ, ha hụrụ ọkụ icheku nke a tụkwasịrị azụ n’elu ya, achịcha dịkwa n’ebe ahụ. Jisọs sịrị, “Wetanụ ụfọdụ n’ime azụ unu gburu ugbu a.” Pita gara n’ụgbọ ahụ wee dọgota ụgbụ ahụ n’elu ala. O nwere 153 azụ ndị buru ibu n’ime ya!

Jisọs kpọrọ ha òkù, sị, “Bịanụ, rie nri ụtụtụ.”

Ọ dịghị nke ọ bụla n’ime ha obi siri ike ịjụ, sị, “Gị onwe gị bụ ònye?” n’ihi na ha matara na ọ bụ Jisọs. Nke a bụ mpụta nke ugbo asaa ọ pụtara kemgbe o bilitesịrị n’ọnwụ, ọ bụkwa nke ugbo atọ ndị ozi ahụ hụrụ ya anya dị ka otu ìgwè. O wee nye ha nri ụtụtụ ugbu a, na-enye nke ọ bụla n’ime ha achịcha na azụ.

Mgbe ha risịrị nri, ma eleghị anya Jisọs felara isi ya n’ebe nnukwute azụ ahụ ha gbutere dị wee jụọ Pita, sị: “Saịmọn, nwa Jọn, ị̀ hụrụ m n’anya karị ndị a?” Ma eleghị anya ihe o kwuru pụtara, Ì nwere mmasị n’ebe ọrụ igbu azụ dị karịa ka i nwere n’ọrụ ahụ nke m kwadebeworo gị ịrụ?

Pita zaghachiri, sị, “Gị onwe gị matara na ị bụ enyi m.”

Jisọs zaghachiri, sị, “Na-enye ụmụ atụrụ m nri.”

Ọzọ, nke ugbo abụọ, ọ jụrụ, sị: “Saịmọn, nwa Jọn, ị̀ hụrụ m n’anya?”

Pita zara, sị, “Ee, Onyenwe anyị; gị onwe gị matara na ị bụ enyi m.”

Jisọs nyekwara iwu ọzọ, sị, “Na-azụ atụrụ m.”

Mgbe ahụ, na nke ugbo atọ, ọ jụrụ, sị: “Saịmọn, nwa Jọn, àbụ m enyi gị?”

Ugbu a, iwe amalitewo iwe Pita. Ọ pụrụ iche ma Jisọs ọ̀ na-arụ ụka ma yà bụkwa onye na-anọgidesi ike n’ihe. E kwuwerị, n’oge na-adịghị anya gara aga mgbe a na-ekpe Jisọs ikpe igbu ya, Pita gọpụrụ ugbo atọ na ya amaghị onye ọ bụ. Ya mere Pita sịrị: “Onyenwe anyị, gị onwe gị matara ihe nile; gị onwe gị maara na ị bụ enyi m.”

Jisọs nyere ya iwu nke ugbo atọ, sị, “Na-enye atụrụ m nri.”

Jisọs si otú a jiri Pita mee ihe dị ka ihe nlereanya iji mee ka ndị ọzọ ghọta ịdị mkpa nke ọrụ ahụ ọ chọrọ ka ha rụọ. N’oge na-adịghị anya ọ gaje ịhapụ ụwa, ọ chọkwara ka ha na-edu ndú n’ilekọta ndị ahụ a gaje ịdọrọ bata n’ime ogige atụrụ Chineke.

Dị nnọọ ka e kere Jisọs agbụ ma gbuo ya n’ihi na ọ rụrụ ọrụ ahụ Chineke nyere ya ịrụ, ọ na-ekpughe ugbu a na Pita gaje ịta ahụhụ otu ụdị ahụmahụ ahụ. Jisọs gwara ya, sị, “Mgbe ị dị n’okorobịa, ị na-eke onwe gị ihe okike n’úkwù, na-ejegharịkwa ebe ị na-achọ: ma mgbe ị ga-eme agadi, ị ga-esetị aka gị abụọ, onye ọzọ ga-eke gị ihe okike n’úkwù, burukwa gị gaa ebe ị na-achọghị.” N’agbanyeghị ọnwụ Pita gaje ịnwụ n’ihi okwukwe ya, Jisọs gbara ya ume, sị: ‘Nọgide na-eso m.’

Mgbe o chigharịrị, Pita hụrụ Jọn wee jụọ, sị: “Onyenwe anyị, ma onye a, gịnị ga-eme ya?”

Jisọs zara, sị, “Ọ bụrụ na ana m achọ ka ọ nọgide ruo mgbe m ga-abịa, ọ̀ bụ gịnị n’ebe ị nọ? Gị onwe gị soo m.”

Ọtụtụ n’ime ndị na-eso ụzọ ghọtara okwu Jisọs nke a ịbụ na Jọn onyeozi agaghị anwụ anwụ mgbe ọ bụla. Otú ọ dị, dị ka Jọn onyeozi mesịrị kọwaa, Jisọs ekwughị na ya agajeghị ịnwụ anwụ, ma ihe Jisọs kwuru bụ nanị: “Ọ bụrụ na ana m achọ ka ọ nọgide ruo mgbe m ga-abịa, ọ̀ bụ gịnị n’ebe ị nọ?” Jọn 21:1-25; Matiu 26:32; 28:7, 10.

◆ Gịnị na-egosi na ndị ozi ahụ ejighị n’aka ihe ha gaje ime na Galili?

◆ Olee otú ndị ozi ahụ si mata onye Jisọs bụ n’akụkụ Osimiri Galili?

◆ Ugbo ole ka Jisọs meworo ka a hụ ya anya ugbu a kemgbe o bilitesịrị n’ọnwụ?

◆ Olee ụzọ Jisọs si mesie ike ihe ọ chọrọ ka ndị ozi ahụ mee?

◆ Olee ụzọ Jisọs si gosi ụzọ Pita ga-esi nwụọ?

◆ Okwu dị aṅaa Jisọs kwuru banyere Jọn ka ọtụtụ n’ime ndị ahụ na-eso ụzọ ghọtahiere?

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya