Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w90 11/15 p. 10-15
  • “Nke Kachasị n’Ihe Ndị A Bụ Ịhụnanya”

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • “Nke Kachasị n’Ihe Ndị A Bụ Ịhụnanya”
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ụdị Ịhụnanya Anọ
  • N’ihi Gịnị Ka O Ji Dị Elu Karịa Okwukwe na Olileanya?
  • Ọ̀ Dị Elu Karịa Amamihe, Ikpe Ziri Ezi, na Ike?
  • Nke Kasị Elu ná Mkpụrụ Nile nke Mmụọ Nsọ
  • Ịhụnanya (Agape)—Ihe Ọ Na-abụghị na Ihe Ọ Bụ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1993
  • Hụ Chineke nke Hụrụ Gị n’Anya n’Anya
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2006
  • Bụrụ Onye Ịhụnanya Na-ewuli Elu
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2001
  • ‘Nọgidenụ Na-eje Ije n’Ịhụnanya’
    Bịaruo Jehova Nso
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
w90 11/15 p. 10-15

“Nke Kachasị n’Ihe Ndị A Bụ Ịhụnanya”

“Ma ugbu a ka okwukwe, olileanya, ịhụnanya, ihe atọ ndị a, na-anọgide; ma nke kachasị n’ihe ndị a bụ ịhụnanya.”—1 NDỊ KỌRINT 13:13.

1. Gịnị ka otu onye ọkà mmụta n’ihe banyere ụmụ mmadụ kwuworo banyere ịhụnanya?

OTU n’ime ndị ọkà mmụta n’ihe banyere ụmụ mmadụ a kasị mara amara n’ụwa kwuru n’otu mgbe gara aga, sị: “Anyị na-aghọta na nke mbụ ya n’akụkọ ihe mere eme nke ụdị anyị na nke kasị mkpa n’ihe ndị bụ isi dị echiche mmadụ mkpa bụ ịhụnanya. Ọ nọ n’etiti mkpa nile nke ụmụ mmadụ dị nnọọ ka anyanwụ anyị na-eguzo n’etiti usoro mbara igwe nke anyị, na-enwe ala mbara igwe dị iche iche ndị na-agba ya gburugburu. . . . Nwata nke a na-ahụghị n’anya dịwaga nnọọ iche n’ihe banyere usoro mmiri ọgwụ ndị dị ya n’ahụ, n’usoro ịrụ ọrụ nke anụ ahụ ya, nakwa n’usoro akparamagwa ya, n’ebe onye nke a hụworo n’anya dị. Ọbụna na onye nke mbụ ahụ na-eto uto n’ụzọ dị iche n’ebe onye nke abụọ dị. Ihe anyị maara ugbu a bu na a mụrụ mmadụ ịdị ndụ dị ka à ga-asị na ịdị ndụ na ịhụnanya bụ otu ihe. N’eziokwu, nke a abụghị ihe ọhụrụ. Nke a bụ nkwado nye Ozizi Elu Ugwu ahụ.”

2. (a) Olee ụzọ Pọl onyeozi si gosi ịdị mkpa nke ịhụnanya? (b) Ajụjụ ndị dị aṅaa kwesịrị ka a tụlee ha ugbu a?

2 Ee, dị ka nwoke nke a nke nwere amamihe ụwa kwetara, eziokwu nke a banyere ịdị mkpa nke ịhụnanya nye ọdịmma ụmụ mmadụ abụghị ihe ọhụrụ. Ọ pụrụ ịbụ na ọ bụ nanị ugbu a ka ndị nwere amamihe ụwa na-aghọta nke ahụ, ma a hụrụ ya n’ime Okwu Chineke ihe karịrị narị afọ 19 gara aga. Ọ bụ ya mere Pọl onyeozi ji nwee ike ide, sị: “Ma ugbu a ka okwukwe, olileanya, ịhụnanya, ihe atọ ndị a na-anọgide; ma nke kachasị n’ihe ndị a bụ ịhụnanya.” (1 Ndị Kọrint 13:13) Ị̀ maara ihe mere ịhụnanya ji dị elu karịa okwukwe na olileanya? N’ihi gịnị ka a pụrụ iji kwuo na ịhụnanya bụ nke kachasị elu n’àgwà nile nke Chineke nakwa ná mkpụrụ nke mmụọ ya?

Ụdị Ịhụnanya Anọ

3. Ihe nlereanya dịgasị aṅaa ka e nwere n’Akwụkwọ nsọ nke ịhụnanya n’etiti nwoke na nwanyị?

3 Ike mmadụ nwere igosi ịhụnanya bụ ngosipụta nke amamihe na nchegbu ịhụnanya Chineke nwere n’ebe ihe a kpọrọ mmadụ nọ. Ọ bụ ihe na-akpali mmasị ịhụ na ndị Grik oge ochie nwere okwu anọ dị iche iche maka “ịhụnanya.” Otu n’ime ha bụ e’ros, nke na-egosi ịhụnanya dị n’etiti nwoke na nwanyị nke e jikọtara ya na ndọrọ nke mmekọahụ. Ndị dere Akwụkwọ Nsọ Grik nke ndị Kraịst adịghị mgbe ọ bụla ha jiri e’ros mee ihe, ọ bụ ezie na nsụgharị Septuagint jiri ụdị ya ụfọdụ mee ihe n’Ilu 7:18 na 30:16, e nwekwara ebe ndị ọzọ e zoro aka n’ịhụnanya dị n’etiti nwoke na nwanyị n’Akwụkwọ Nsọ Hibru. Dị ka ihe atụ, anyị na-agụ na Aịsak ‘hụrụ Rebeka n’anya.’ (Jenesis 24:67) A na-ahụta otu ihe nlereanya pụtara ìhè nke ụdị ịhụnanya nke a n’ihe banyere Jekọb, onye ihe àmà gosiri na ọ malitere ịhụ ọmarịcha nwa agbọghọ ahụ bụ Rechel n’anya ozugbo ọ hụrụ ya nke mbụ. N’eziokwu, Jekọb ‘jere ozi n’ihi Rechel afọ asaa, ma n’anya ya ha dị ka ụbọchị ole na ole n’ihi ịhụnanya o ji hụ ya.’ (Jenesis 29:9-11, 17, 20) Akwụkwọ Abụ nke Abụ kọkwara banyere ịhụnanya nwoke na nwanyị nke dị n’etiti otu onye na-azụ atụrụ na otu nwa agbọghọ. Ma, ọ dịghị mgbe a pụrụ ịsị na e kwusibigawo okwu ike ókè na ụdị ịhụnanya nke a, nke pụrụ iweta afọ ojuju na ọṅụ dị ukwuu, kwesịrị ịbụ nke e gosipụtara nanị n’ụzọ kwekọrọ n’ụkpụrụ ezi omume nile nke Chineke. Bible na-agwa anyị na ọ bụ nanị n’ịhụnanya nke nwanyị nwoke lụrụ n’ụzọ iwu kwadoro ka ọ “ga na-awagharị mgbe nile.”—Ilu 5:15-20.

4. È si aṅaa mee ihe atụ nke ịhụnanya ezinụlọ n’ime Akwụkwọ nsọ?

4 Ọzọ, e nwere ịhụnanya ezinụlọ nke siri ike, ma ọ bụ mmetụta e bu pụta ụwa, nke dabeere ná mmekọrịta sitere n’ọbara, bụ́ nke ndị Grik na-akpọ stor.gé. Ọ bụ ya kpatara e ji nwee okwu ahụ bụ, “Ọbara siri ike.” Anyị nwere nnọọ ezi ihe nlereanya banyere nke a n’ịhụnanya ahụ ụmụnne ahụ bụ Meri na Mata nwere maka nwanne ha nwoke bụ Lazarọs. Eziokwu ahụ nke bụ na ha ji ya kpọrọ ihe nke ukwuu na-apụta ìhè n’ịhụ otú ha si ruo újú nke ukwuu mgbe ọ nwụrụ ọnwụ mberede. Leekwa nnọọ ka ha si ṅụrịa ọṅụ mgbe Jisọs kpọghachiri Lazarọs ha hụrụ n’anya ná ndụ! (Jọn 11:1-44) Ịhụnanya nke nne nwere n’ebe nwa ya nọ bụkwa ihe nlereanya ọzọ nke ụdị ịhụnanya nke a. (Tụlee 1 Ndị Tesalọnaịka 2:7.) Otú a, iji gosi ịdị ukwuu nke ịhụnanya ya n’ebe Zaịọn dị, Jehova kwuru na ọ dị ukwuu ọbụna karị nke nne na-enwe n’ebe nwa ya nọ.—Aịsaịa 49:15.

5. Olee ụzọ ụkọ mmetụta e bụ pụta ụwa si pụta ìhè taa?

5 Otu ihe na-egosi na anyị na-ebi n’ime “mgbe ikpeazụ” nke nwere “oge dị oké egwu” bụ ụkọ nke “mmetụta e bu pụta ụwa.” (2 Timoti 3:1, 3, NW) N’ihi na ịhụnanya ezinụlọ dị ụkọ, ụfọdụ ndị na-eto eto na-agbapụ site n’ụlọ ha, ụfọdụ ụmụ ndị toworo eto na-agbakụtakwa ndị mụrụ ha, bụ́ ndị meworo agadi, azụ. (Tụlee Ilu 23:22.) A na-ahụtakwa ụkọ nke mmetụta e bu pụta ụwa ná njupụta nke imekpọ ụmụntakịrị ọnụ—ụfọdụ ndị mụrụ ụmụ na-eti ụmụ ha ihe nke ukwuu nke na ọ na-adị mkpa ikpọje ha ụlọ ọgwụ. Ụkọ ịhụnanya nke ndị mụrụ ụmụ na-apụtakwa ìhè n’ọdịda nke ọtụtụ ndị mụrụ ụmụ n’inye ụmụ ha ọzụzụ. Ịgbachi ụmụntakịrị nkịtị ka ha mere ihe masịrị ha abụghị ihe àmà nke ịhụnanya, kama ọ pụtara ịgbaso ụzọ ebe ihe kasị dịrị mfe. Nna nke hụrụ ụmụ ya n’anya n’ezie ga-enye ha ahụhụ mgbe ọ bụla ọ dị mkpa.—Ilu 13:24; Ndị Hibru 12:5-11.

6. Nye ihe atụ ndị sitere n’Akwụkwọ nsọ nke ịhụnanya dị n’etiti ndị enyi.

6 E nwekwara okwu Grik ahụ bụ phili’a, nke na-egosi ịhụnanya (nke na-emetụtaghị mmekọahụ) n’etiti ndị enyi, dị ka n’etiti ndị nwoke ma ọ bụ ndị nwanyị abụọ tozuworo okè. Anyị nwere ezi ihe nlereanya banyere nke a n’ịhụnanya ahụ Devid na Jonatan nwerịtara n’ebe ibe ha nọ. Mgbe e gburu Jonatan n’agha, Devid ruuru ya újú, na-asị: “Anọ m ná mkpa n’ihi gị, nwanne m Jonatan: ị dị ụtọ nke ukwuu n’ebe m nọ: ịhụnanya gị nke ị hụrụ m dị ebube, karịa ịhụnanya ndị inyom.” (2 Samuel 1:26) Anyị na-amụtakwa na Kraịst nwere mmasị pụrụ iche n’ebe Jọn onyeozi nọ, bụ onye a maara dị ka onye ahụ na-eso ụzọ “onye Jisọs hụrụ n’anya.”—Jọn 20:2.

7. Gịnị bụ ọdịdị nke aga’pe, oleekwa ụzọ e siworo gosi ịhụnanya nke a?

7 Olee okwu Grik nke Pọl jiri mee ihe ná 1 Ndị Kọrint 13:13, ebe ọ kpọtụrụ okwukwe, olileanya, na ịhụnanya aha, wee sị na “nke kasị n’ihe ndị a bụ ịhụnanya”? N’ebe a, okwu e jiri mee ihe bụ aga’pe, bụ́ otu ụdị ahụ Jọn onyeozi jiri mee ihe mgbe ọ siri: “Chineke bụ ịhụnanya.” (1 Jọn 4:8, 16) Nke a bụ ịhụnanya nke ụkpụrụ na-eduzi ma ọ bụ na-achịkwa. Ọ pụrụ ịgụnye ma ọ bụ hapụ ịgụnye mmetụta ịhụnanya na inwe mmasị n’ebe mmadụ nọ, kama ọ bụ mkpali ma ọ bụ mmetụta nke na-adịghị achọ ọdịmma onwe onye nanị nke na-echegbu onwe ya banyere imere ndị ọzọ ihe ọma n’agụzighị iru eru nke onye na-anata ihe ọma ahụ ma ọ bụ abamuru ọ bụla ọ na-ewetara onye na-eme ya. Ụdị ịhụnanya nke a kpaliri Chineke inye ihe kasị dịrị oké ọnụ ahịa n’obi ya, Ọkpara ọ mụrụ nanị ya, bụ́ Jisọs Kraịst, “ka onye ọ bụla nke kweere na ya wee ghara ịla n’iyi, kama ka o nwee ndụ ebighị ebi.” (Jọn 3:16) Dị nnọọ ka Pọl chetaara anyị: “Ọ dị ike na otu onye ga-anwụ n’ihi onye ezi omume: n’ihi na ma eleghị anya otu onye ga-enwe anya ike ọbụna ịnwụ n’ihi ezi mmadụ. Ma Chineke na-eme ka ịhụnanya nke aka ya n’ebe anyị nọ pụta ìhè, n’ihi na, mgbe anyị nọ na-abụ ndị mmehie, Kraịst nwụrụ n’ihi anyị.” (Ndị Rom 5:7, 8) Ee, aga’pe na-emere ndị ọzọ ihe ọma n’agbanyeghị ọnọdụ ha ná ndụ ma ọ bụ ihe ọ ga-efu onye na-egosi ịhụnanya ahụ.

N’ihi Gịnị Ka O Ji Dị Elu Karịa Okwukwe na Olileanya?

8. N’ihi gịnị ka aga’pe ji dị elu karịa okwukwe?

8 Ma n’ihi gịnị ka Pọl ji kwuo na ụdị ịhụnanya nke a (aga’pe) dị elu karịa okwukwe? O dere ná 1 Ndị Kọrint 13:2, sị: “A sịkwa na enwere m onyinye ibu amụma, matakwa ihe omimi nile na ihe ọmụma nile; a sịkwa na enwere m okwukwe nile, nke mere [na] m ga-enwe ike ibubiga ugwu, ma enweghị m ịhụnanya, abụghị m ihe ọ bụla.” (Tụlee Matiu 17:20.) Ee, ọ bụrụ na anyị na-eme mgbalị anyị inweta ihe ọmụma na ito uto n’okwukwe ná nzube nke ịchọ ọdịmma onwe onye nanị, nke a agaghị ewetara anyị abamuru ọ bụla site n’aka Chineke. N’otu aka ahụ, Jisọs gosiri na ụfọdụ ndị ‘ga-ebu amụma n’aha ya, chụpụ ndị mmụọ ọjọọ n’aha ya, rụọkwa ọtụtụ ọrụ ndị dị ike n’aha ya’ ma ha agaghị enweta nkwado ya.—Matiu 7:22, 23.

9. N’ihi gịnị ka ịhụnanya ji di elu karịa olileanya?

9 N’ihi gịnị ka ụdị ịhụnanya nke aga’pe ji dịkwa elu karịa olileanya? N’ihi na olileanya pụrụ ịbụ nke na-achọ nanị ọdịmma onwe onye, na-eme ka mmadụ na-echegbu onwe ya karịsịa banyere abamuru ndị ga-abịara ya onwe ya, ebe ịhụnanya ‘na-adịghị achọ ihe nke aka ya.’ (1 Ndị Kọrint 13:4, 5) Karịsịa, olileanya—dị ka nke ịdị ndụ gabiga “mkpagbu ukwu” ahụ banye n’ime ụwa ọhụrụ—na-akwụsị mgbe e nwetara ihe a na-ele anya ya. (Matiu 24:21) Dị ka Pọl kwuru: “Ọ bụ n’olileanya ka a zọpụtara anyị: ma olileanya nke a na-ahụ anya abụghị olileanya: n’ihi na ihe mmadụ na-ahụ anya, gịnị mere o ji na-ele anya ya? Ma ọ bụrụ na anyị na-ele anya ihe anyị na-ahụghị anya, anyị ji ntachi obi na-echesi ya ike.” (Ndị Rom 8:24, 25) Ịhụnanya n’onwe ya na-atachi obi n’ihe nile, ọ dịghị adakwa ada. (1 Ndị Kọrint 13:7, 8) Otú a, ịhụnanya nke na-adịghị achọ ọdịmma onwe ya nanị (aga’pe) dị elu karịa ma okwukwe ma olileanya.

Ọ̀ Dị Elu Karịa Amamihe, Ikpe Ziri Ezi, na Ike?

10. N’ihi gịnị ka a pụrụ iji kwuo na ịhụnanya bụ nke kasị elu n’àgwà anọ ndị bụ isi nke Chineke?

10 Ugbu a, ka anyị tụlee àgwà anọ ndị bụ isi nke Jehova Chineke: amamihe, ikpe ziri ezi, ike, na ịhụnanya. À pụkwara ịsị na ịhụnanya bụ nke kasị ihe ndị a nile? N’eziokwu, a pụrụ ikwu otú ahụ. N’ihi gịnị? N’ihi na ịhụnanya bụ ike mkpali dị n’ihe nile Chineke na-eme. Ọ bụ ya mere Jọn onyeozi ji dee, sị: “Chineke bụ ịhụnanya.” Ee, Jehova bụ ihe atụ zuru okè nke ịhụnanya. (1 Jọn 4:8, 16) Ọ dịghị ebe ọ bụla anyị gụrụ n’ime Akwụkwọ nsọ na Jehova bụ amamihe, ikpe ziri ezi, ma ọ bụ ike. Kama nke ahụ, a na-agwa anyị na Jehova nwere àgwà ndị a. (Job 12:13; Abụ Ọma 147:5; Daniel 4:37) E mere ka àgwà anọ ndị a dabakọta n’ụzọ zuru okè n’ime ya. N’ịbụ onye ịhụnanya kpaliri, Jehova na-emezu nzube ya nile site n’iji àgwà atọ ndị ọzọ ahụ mee ihe ma ọ bụ n’ịgụnye ha.

11. Gịnị kpaliri Jehova ike eluigwe na ala nakwa ihe okike ndị bụ mmụọ na ndị bụ mmadụ?

11 Ya mere, gịnị kpaliri Jehova ike eluigwe na ala na ihe okike nwere ọgụgụ isi ndị bụ mmụọ na ndị bụ mmadụ? Ọ̀ bụ amamihe ka ọ̀ bụ ike? Ee e, n’ihi na ọ bụ nanị na Chineke ji amamihe na ike ya mee ihe n’ihe okike. Dị ka ihe atụ, anyị na-agụ, sị: “Jehova jiri amamihe tọọ ntọala ụwa.” (Ilu 3:19) Ọzọkwa, àgwà ya nke bụ ikpe ziri ezi emeghị ka ọ bụrụ ihe a chọrọ ya n’aka ike ndị nweere onwe ha ime nhọrọ. Ịhụnanya Chineke kpaliri ya isoro ndị ọzọ kerịta ọṅụ nile nke ịdị ndụ dị ka ndị nwere ọgụgụ isi. Ọ bụ ịhụnanya chọtara ụzọ a ga-esi wepụ amamikpe ahụ nke ikpe ziri ezi bokwasịrị ihe a kpọrọ mmadụ n’ihi mmehie Adam. (Jọn 3:16) Ee, ọ bụkwa ịhụnanya kpaliri Jehova izube na ihe a kpọrọ mmadụ na-erube isi kwesịrị ịdị ndụ n’ime Paradaịs elu ala nke na-abịanụ.—Luk 23:43.

12. Olee ụzọ anyị kwesịrị isi meghachi omume n’ihe banyere ike, ikpe ziri ezi, na ịhụnanya nke Chineke?

12 N’ihi ike pụrụ ime ihe nile nke Chineke, anyị agaghị anwa anwa ịkpasu ekworo ya. Pọl jụrụ, sị: “Ànyị na-akpasu Onyenwe anyị [Jehova, NW] ekworo? Ànyị ka ya ike?” (1 Ndị Kọrint 10:22) N’eziokwu, Jehova bụ “Chineke ekworo” ọ bụghị n’echiche dị njọ, kama n’ịbụ “onye na-achọ ka a rara ofufe nye nanị ya.” (Ọpụpụ 20:5; King James Version) Dị ka ndị Kraịst, ọtụtụ ngosipụta dị iche iche nke amamihe a na-apụghị ịchọpụta ntọala ya nke Chineke na-atụ anyị n’anya nke ukwuu. (Ndị Rom 11:33-35) Nsọpụrụ dị ukwuu anyị nwere maka ikpe ziri ezi ya kwesịrị ịkpali anyị izere ilezi anya mee mmehie. (Ndị Hibru 10:26-31) Ma n’enweghị ihe ịrụ ụka ọ bụla, ịhụnanya bụ nke kasị elu n’ime àgwà anọ ndị bụ isi nke Chineke. Ọ bụkwa ịhụnanya Jehova nke na-adịghị achọ ọdịmma onwe ya nanị na-adọta anyị n’ebe ọ nọ, na-emekwa ka anyị chọọ ime ihe na-atọ ya ụtọ, ife ya ofufe, nakwa ikere òkè n’ido aha nsọ ya nsọ.—Ilu 27:11.

Nke Kasị Elu ná Mkpụrụ Nile nke Mmụọ Nsọ

13. N’ọkwá dị aṅaa ka ịhụnanya nọ n’etiti mkpụrụ nile nke mmụọ Chineke?

13 N’ọkwá dị aṅaa ka ịhụnanya nọ n’etiti mkpụrụ itoolu nke mmụọ Chineke, ndị e hotara ná Ndị Galetia 5:22, 23? Ndị a bụ “ịhụnanya, ọṅụ, udo, ogologo ntachi obi, obi ọma, ịdị mma, ikwesị ntụkwasị obi [“okwukwe,” NW], ịdị nwayọọ, imeru ihe n’ókè.” E nwere ezi ihe kpatara Pọl ji buru ụzọ depụta ịhụnanya. Ịhụnanya ọ̀ dị elu karịa ọṅụ, bụ àgwà nke ọzọ ọ kpọtụrụ aha? Ee, ọ dị otú ahụ, n’ihi na a pụghị inwe ọṅụ ọ bụla na-adịgide adịgide n’enweghị ịhụnanya. N’eziokwu, ụwa nọ n’enweghị ọṅụ n’ihi ịchọ ọdịmma onwe onye nanị, ụkọ nke ịhụnanya. Ma Ndịàmà Jehova nwere ịhụnanya n’etiti onwe ha, ha nwekwara ịhụnanya maka Nna ha nke eluigwe. Ya mere, anyị kwesịrị ịtụ anya na ha ga-abụ ndị na-aṅụrị ọṅụ, e bukwara amụma na ha “ga-eti mkpu ọṅụ site n’obi dị mma.”—Aịsaịa 65:14.

14. N’ihi gịnị ka a pụrụ iji kwuo na ịhụnanya dị elu karịa mkpụrụ mmụọ nsọ nke bụ udo?

14 Ịhụnanya dịkwa elu karịa mkpụrụ mmụọ nsọ nke bụ udo. N’ihi enweghị ịhụnanya, ụwa jupụtara n’esemokwu na ọgba aghara. Ma ndị Jehova nọ n’udo n’etiti onwe ha na gburugburu ụwa. Okwu onye ọbụ abụ ahụ abụwo eziokwu n’ihe banyere ha: “Jehova ga-eji udo gọzie ndị ya.” (Abụ Ọma 29:11) Ha nwere udo nke a n’ihi na ha nwere akara ahụ e ji amata ha dị ka ezi ndị Kraịst, bụ́ ịhụnanya. (Jọn 13:35) Nanị ịhụnanya pụrụ imeri ihe nile na-akpata nkewa, ma hà bụ ihe metụtara agbụrụ, mba, ma ọ bụ omenala. Ọ bụ “ihe nkekọ zuru okè nke ịdị n’otu.”—Ndị Kọlọsi 3:14, NW.

15. Olee ụzọ e si ahụta ọkwá kasị elu ịhụnanya nọ na ya ma e jiri ya tụnyere mkpụrụ mmụọ nsọ nke bụ ogologo ntachi obi?

15 A na-ahụtakwa ọkwá kasị elu ịhụnanya nwere mgbe e ji ya tụnyere ogologo ntachi obi, bụ́ iji ndidi nọgide na-atachi obi ná mmejọ ma ọ bụ mkpasu iwe. Inwe ogologo ntachi obi pụtara inwe ndidi nakwa eweghị iwe ọsọ ọsọ. Gịnị na-eme ka ụmụ mmadụ ghara inwe ndidi ma ọ bụ ka ha na-ewe iwe ọsọ ọsọ? Ọ́ bụghị ụkọ nke ịhụnanya? Otú ọ dị, Nna anyị nke eluigwe nwere ogologo ntachi obi, ọ bụkwa “onye na-adịghị ewe iwe ọsọ ọsọ.” (Ọpụpụ 34:6; Luk 18:7) N’ihi gịnị? N’ihi na ọ hụrụ anyị n’anya, ‘o zubeghịkwa ka ndị ọ bụla laa n’iyi.’—2 Pita 3:9.

16. Olee otú ịhụnanya dị ma e jiri ya tụnyere obi ọma, ịdị mma, ịdị nwayọọ, na imeru ihe n’ókè?

16 Anyị ahụtaworị tupu ugbu a ihe mere ịhụnanya ji dị elu karịa okwukwe, ihe ndị ahụ e kwuru kpatara nke a metụtakwara mkpụrụ nke mmụọ nsọ ndị fọdụrụnụ, bụ́ obi ọma, ịdị mma, ịdị nwayọọ, na imeru ihe n’ókè. Ndị a nile bụcha àgwà ndị dị mkpa, ma ha agaghị abara anyị uru ọ bụla ma ọ bụrụ na anyị enweghị ịhụnanya, ọbụna dị ka Pọl mere ka ọ pụta ìhè ná 1 Ndị Kọrint 13:3, ebe o dere, sị: “A sịkwa na ewere m ihe nile m nwere zụọ ndị ogbenye, a sịkwa na arara m ahụ m nye ka e wee ree m ọkụ [“ka m wee nyaa isi,” NW], ma enweghị m ịhụnanya, ọ baghịrị m uru ọ bula.” N’aka nke ọzọ, ọ bụ ịhụnanya na-amịpụta mkpụrụ nke àgwà ndị dị ka obi ọma, ịdị mma, okwukwe, ịdị nwayọọ, na imeru ihe n’ókè. Otú a, Pọl gara n’ihu ikwu na ịhụnanya nwere obi ọma, na “ọ na-anagide ihe nile, na-ekwere ihe nile, na-ele anya ihe nile, na-enwe ntachi obi n’ihe nile.” Ee, “ịhụnanya adịghị ada mgbe ọ bụla.” (1 Ndị Kọrint 13:4, 7, 8) E kwuwo n’ụzọ ziri ezi na mkpụrụ ndị ọzọ nke mmụọ nsọ bụ ngosipụta ma ọ bụ akụkụ dị iche iche nke ịhụnanya, bụ́ nke ahụ e buru ụzọ kpọtụ aha. N’eziokwu, o kwere nnọọ nghọta na n’ime mkpụrụ itoolu nke mmụọ nsọ, ịhụnanya bụ n’ezie nke kasị elu.

17. Okwu dịgasị aṅaa dị n’Akwụkwọ nsọ na-akwado nkwubi okwu ahụ nke bụ na ịhụnanya bụ mkpụrụ kasị elu nke mmụọ nsọ?

17 N’ịkwado nkwubi okwu ahụ bụ na ịhụnanya bụ nke kasị elu ná mkpụrụ nile nke mmụọ Chineke, okwu Pọl sịrị: “Unu ejila onye ọ bụla ụgwọ ọ bụla, ma ọ bụghị ịhụrịta onwe unu n’anya: n’ihi na onye na-ahụ mmadụ ibe ya n’anya edebezuwo iwu. N’ihi na . . . a chịkọtara ya n’okwu a, bụ́, Hụ onye agbata obi gị n’anya dị ka onwe gị. Ịhụnanya adịghị arụ ọrụ ọjọọ n’ebe onye agbata obi ya nọ: ya mere ịhụnanya bụ idebezu iwu.” (Ndị Rom 13:8-10) N’ụzọ kwesịrị nnọọ ekwesị, Jemes onye na-eso ụzọ zoro aka n’iwu nke a nke mmadụ ịhụ onye agbata obi ya n’anya dị ka “iwu nke eze.”—Jemes 2:8.

18. Ihe àmà ndị ọzọ dị aṅaa ka e nwere iji gosi na ịhụnanya bụ àgwà nke kasị elu?

18 À ka nwere ihe àmà ndị ọzọ na-egosi na ịhụnanya bụ àgwà nke kasị elu? Ee, e nwere n’ezie. Tụlee ihe mere mgbe otu onye odeakwụkwọ jụrụ Jisọs, sị: “Olee nke bụ nke mbụ n’ihe nile e nyere n’iwu?” Ọ pụrụ ịtụworị anya ka Jisọs hota otu n’ime Iwu Iri ahụ. Ma Jisọs hotara okwu site na Deuterọnọmi 6:4, 5, wee sị: “Nke mbụ bụ, Nụrụ, Israel; Onyenwe anyị [“Jehova,” NW], bụ́ Chineke anyị, Onyenwe anyị [“Jehova,” NW] bụ otu: Ị ga-ahụkwa Onyenwe anyị [“Jehova,” NW], bụ́ Chineke gị, n’anya, site n’obi gị dum, sitekwa ná mkpụrụ obi gị dum, sitekwa n’uche gị dum, sitekwa n’ike gị dum.” Mgbe ahụ, Jisọs kwukwara, sị: “Nke abụọ bụ nke a, Ị ga-ahụ onye agbata obi gị n’anya dị ka onwe gị, ọ dịghị ihe ọzọ e nyere n’iwu nke dịkarịrị ndị a.”—Mak 12:28-31.

19. Gịnị bụ mkpụrụ ụfọdụ pụtara ìhè nke aga’pe?

19 N’eziokwu, Pọl ekwughị okwu karịa otú ọ dị n’ezie mgbe o hotara okwukwe, olileanya, na ịhụnanya, ma sị: “Nke kachasị n’ihe ndị a bụ ịhụnanya.” Igosipụta ịhụnanya na-arụpụta mmekọrịta dị mma n’etiti anyị na Nna anyị nke eluigwe nakwa n’etiti anyị na ndị ọzọ, gụnyere ndị ahụ nọ n’ime ọgbakọ na ndị nọ n’ime ezinụlọ anyị. Ịhụnanya nwere mmetụta nke na-ewuli anyị elu. Isiokwu na-esonụ ga-egosikwa kpọmkwem ụzọ ezi ịhụnanya pụrụ isi bụrụ ihe na-enyeghachi ụgwọ ọrụ.

Ị̀ Ga-esi Aṅaa Zaghachi?

◻ Olee ụzọ ịhụnanya si dị elu karịa okwukwe na olileanya?

◻ Gịnị bụ aga’pe, oleekwa ụzọ e si egosi ịhụnanya dị otú ahụ?

◻ N’ihi gịnị ka ịhụnanya ji bụrụ nke kasị elu n’àgwà Chineke ndị bụ isi?

◻ N’ụzọ dịgasị aṅaa ka ịhụnanya si dị elu karịa mkpụrụ ndị ọzọ nke mmụọ nsọ.

[Foto dị na peeji nke 13]

Ịhụnanya kpaliri Chineke ike ihe a kpọrọ mmadụ ka ha dịrị ndụ n’ime paradaịs elu ala. Ì nwere olileanya ịnọ n’ebe ahụ?

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya