Gịnị Ka Bible Na-ekwu Banyere Chineke na Jisọs?
Ọ BỤRỤ na ndị mmadụ ga-agụ Bible site ná mmalite ruo ngwụsị ya, na-ebughị ụzọ buru Atọ n’Ime Otu n’uche, hà ga-enwe echiche dị otú ahụ n’onwe ha? Ọ dịghị ma ọlị.
Ihe onye ji ezi obi na-agụ Bible ga-aghọta n’ụzọ doro anya bụ na Chineke nanị bụ Onye Kasị Ihe Nile Elu, Onye Okike, onye dị nnọọ iche n’ebe onye ọ bụla ọzọ nọ, nakwa na Jisọs, ọbụna n’ịdị adị ya tupu ọ ghọọ mmadụ, bụkwa onye dị iche, onye e kere eke, onye dị ala n’ebe Chineke nọ.
Chineke Dị Otu, Ọ Bụghị Atọ
OZIZI Bible ahụ nke bụ na Chineke dị otu bụ nke a kpọrọ ozizi nke otu Chineke. L. L. Paine, bụ́ onye prọfesọ n’akụkọ ihe mere eme nke okpukpe, na-egosikwa na ozizi nke otu Chineke, n’ụdị ya kasị zie ezi adịghị enye ohere maka Atọ n’Ime Otu: “Agba Ochie na-ezi kpọmkwem na Chineke dị otu. Chineke bụ otu onye nke dịrị onwe ya. Echiche nke bụ na a ga-enweta Atọ n’Ime Otu n’ebe ahụ . . . enweghị ntọala ọ bụla ma ọlị.”
È nwere mgbanwe ọ bụla pụọ n’ozizi nke otu Chineke mgbe Jisọs bịasịrị n’ụwa? Paine na-aza, sị: “N’ọnọdụ nke a, e nweghị nkwụsịtụ ọ bụla n’etiti Agba Ochie na nke Ọhụrụ. Omenala ozizi nke otu Chineke dịgidekwara. Jisọs bụ onye Juu, onye nne na nna ya bụ ndị Juu ji akwụkwọ nsọ Agba Ochie zụlite. Ozizi ya bụ kpam kpam ozizi ndị Juu; ọ bụ ozi ọma ọhụrụ, ma ọ bụghị ọkà mmụta okpukpe nke dị ọhụrụ. . . . Ọ nabatakwara oké ihe odide ndị Juu nke ozizi otu Chineke dị ka ihe o kwere na ya: ‘Nụrụ, Oo Israel, Onyenwe anyị Chineke bụ otu Chineke.’”
A na-ahụ okwu ndị ahụ na Deuterọnọmi 6:4. N’ebe a, New Jerusalem Bible (NJB) nke ndị Katọlik na-agụ, sị: “Nụrụ, Israel: Yahweh Chineke anyị bụ onye ahụ, nanị ya bụ Yahweh dịnụ.”a N’ụtọ asụsụ nke dị n’amaokwu ahụ, okwu ahụ bụ “onye” enweghị ihe ndị e ji egosipụta ihe karịrị otu ihe iji nye echiche nke na ọ pụtara ihe ọ bụla ma ọ bụghị otu onye.
Onye Kraịst bụ Pọl onyeozi egosighịkwa mgbanwe ọ bụla n’ọdịdị nke Chineke, ọbụna mgbe Jisọs bịasịrị n’ụwa. O dere, sị: “Chineke bụ otu onye.”—Ndị Galetia 3:20; leekwa 1 Ndị Kọrint 8:4-6.
Ọtụtụ puku ugboro na Bible, e kwuru okwu banyere Chineke dị ka otu onye. Mgbe ọ na-ekwu okwu, ọ na-ekwu dị ka otu onye a na-ekewaghị ekewa. Bible na-ekwu nnọọ ihe doro anya banyere nke a. Dị ka Chineke na-ekwu, sị: “Mụ onwe m bụ Jehova; nke ahụ bụ aha m: m gaghị enyekwa onye ọzọ nsọpụrụ m.” (Aịsaịa 42:8) “Abụ m Yahweh Chineke gị . . . Unu agaghị enwe chi ọzọ ma e wezụga m.” (Ọ bụ anyị dere okwu ụfọdụ n’ụdị dị iche.)—Ọpụpụ 20:2, 3, JB.
N’ihi gịnị ka ndị nile Chineke ji ike mmụọ nsọ mee ka ha dee Bible ga-eji kwuo banyere Chineke dị ka otu onye ma ọ bụrụ na ọ dị atọ n’ezie? Gịnị ka nke ahụ ga-arụpụta ma ọ bụghị iduhie ndị mmadụ? N’ezie, ọ bụrụ na ọ bụ ndị atọ mejupụtara Chineke, ọ gaara eme ka ndị deere ya Bible mee ka o doo anya nke ọma ka a ghara inwe ihe ịrụ ụka ọ bụla banyere ya. Ma ọ dịghị ihe ọzọ, ndị ahụ dere akụkụ Akwụkwọ nsọ Grik nke ndị Kraịst, bụ́ ndị sooro Ọkpara Chineke n’onwe ya nwee mmekọrịta, gaara eme otú ahụ. Ma ha emeghị otú ahụ.
Kama nke ahụ, ihe ndị dere Bible mere ka ọ pụta ìhè nke ọma bụ na Chineke bụ otu Onye—onye dị iche, nke a na-ekewaghị ekewa, nke na-enweghị onye ya na ya hà nhata: “Mụ onwe m bụ Jehova, ọ dịghịkwa onye ọzọ dị; e wezụga nanị m ọ dịghị Chineke ọ bụla dị.” (Aịsaịa 45:5) “Gị onwe gị, onye aha gị bụ Jehova, nanị gị, bụ Onye kachasị ihe nile elu n’elu ụwa nile.”—Abụ Ọma 83:18.
Ọ Bụghị Chineke nke Karịrị Otu
JISỌS kpọrọ Chineke “onye nanị gị bụ ezi Chineke.” (Jọn 17:3) Ọ dịghị mgbe ọ bụla o zoro aka n’ebe Chineke nọ dị ka chi nke karịrị otu onye. Ọ bụ ya mere na ọ dịghị ebe ọ bụla na Bible a kpọrọ onye ọ bụla Onye Pụrụ Ime Ihe Nile, ma ọ bụghị Jehova. Ma ọ dịghị otú ahụ, ọ na-eme ka okwu ahụ bụ “onye pụrụ ime ihe nile” bụrụ nke na-abaghị n’ihe. Ma Jisọs ma mmụọ nsọ adịbeghị nke ọ bụla a kpọrọ aha ahụ, n’ihi na nanị Jehova bụ onye kasị elu. Na Jenesis 17:1 o kwupụtara, sị: “Mụ onwe m bụ Chineke nke pụrụ ime ihe nile.” Ọpụpụ 18:11 na-asịkwa: “Jehova dị ukwuu karịa chi nile.”
N’akụkụ Akwụkwọ nsọ Hibru, okwu ahụ bụ ʼelohʹah (chi) nwere ụdịdị abụọ ya na-egosi ihe karịrị otu, ya bụ, ʼelo·himʹ (chi dị iche iche) na ʼelo·hehʹ (chi dị iche iche nke). Ụdịdị ndị a na-egosi ihe karịrị otu na-ezocha aka n’ebe Jehova nọ, n’ihi nke ahụ ka e ji sụgharịa ha n’igosipụta ịdị otu, dị ka “Chineke.” Ụdịdị ndị a na-egosi ihe karịrị otu hà na-egosipụta Atọ n’Ime Otu? Ee e, ha adịghị egosi. N’akwụkwọ bụ A Dictionary of the Bible, William Smith na-asị: “Echiche ahụ mara mma nke bụ na [ʼelo·himʹ] na-ezo aka n’atọ n’ime otu nke ndị dị n’ime Chiatọ ahụ adịghị enwetakarị onye na-akwado ya n’etiti ndị mmụta ugbu a. Eleghị anya ọ bụ ihe ndị na-amụ ihe banyere ụtọ asụsụ kpọrọ ihe karịrị otu nke e ji akọwa onye dị ebube, ma ọ bụ ọ bụrụ na ọ na-egosi izu ezu nke ike Chineke, njikọta nke ikike nile Chineke gosipụtara.”
Akwụkwọ bụ The American Journal of Semitic Languages and Literatures na-ekwu banyere ʼelo·himʹ, sị: “A na-ejikarị ngwaa nkọwa nke na-egosi ihe dị otu kọwaa ya mgbe nile, ọ na-ewerekwa ụdịdị nke okwu nkọwa nke na-egosi ihe dị otu.” Iji kọwaa nke a, utu aha ahụ bụ ʼelo·himʹ na-apụta 35 ugboro n’onwe ya n’ihe ndekọ nke okike, mgbe ọ bụla ọ pụtakwara, ngwaa nke na-akọwa ihe Chineke kwuru ma mee na-egosi otu onye. (Jenesis 1:1–2:4) Otú a, akwụkwọ ahụ kwubiri, sị: “A ghaghị ịkọwa [ʼelo·himʹ] dị ka okwu na-egosi ihe karịrị otu n’ọ̀tụ̀tụ̀ dịkarịsị ukwuu, na-egosi ịdị ukwuu na ịdị ebube.”
ʼElo·himʹ pụtara “ọtụtụ chi” ọ bụghị “ndị.” Ya mere ndị na-arụ ụka na okwu nke a na-egosi Atọ n’Ime Otu na-eme onwe ha ndị kwere n’ọtụtụ chi, bụ́ ndị na-efe ihe karịrị otu Chineke. N’ihi gịnị? N’ihi na ọ ga-apụta na e nwere chi atọ ndị dị n’Atọ n’Ime Otu. Ma ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ndị nile na-akwado Atọ n’Ime Otu na-ajụ echiche nke na ọ bụ chi atọ dị iche iche mejupụtara Atọ n’Ime Otu.
Bible na-ejikwa okwu ahụ bụ ʼelo·himʹ na ʼelo·hehʹ eme ihe mgbe ọ na-ezo aka n’ebe chi ụgha ụfọdụ nọ. (Ọpụpụ 12:12; 20:23) Ma n’oge ndị ọzọ, ọ pụrụ izo aka na nanị otu chi ụgha, dị ka mgbe ndị Filistia zoro aka n’ebe “Degon, bụ́ chi ha [ʼelo·hehʹ]” nọ. (Ndị Ikpe 16:23, 24) A kpọrọ Beal “chi [ʼelo·himʹ].” (1 Ndị Eze 18:27) Ọzọkwa, e ji okwu ahụ eme ihe banyere ndị mmadụ. (Abụ Ọma 82:1, 6) A gwara Moses na ọ ga-abụrụ Erọn na Fero “Chineke” [ʼelo·himʹ].—Ọpụpụ 4:16; 7:1.
O doro anya, na iji utu aha ahụ bụ ʼelo·himʹ na ʼelo·hehʹ mee ihe maka chi ụgha dị iche iche, na ọbụna ụmụ mmadụ, adịghị egosi na nke ọ bụla n’ime ha bụ ọtụtụ chi; otú ahụkwa, iji ʼelo·himʹ ma ọ bụ ʼelo·hehʹ mee ihe n’ebe Jehova nọ apụtaghị na ọ karịrị otu onye, karịsịa mgbe anyị tụlere ihe àmà akụkụ ndị ọzọ nke Bible na-agba n’isiokwu a.
Jisọs Bụ Onye E Kere Eke nke Dị Iche
MGBE ọ nọ n’ụwa, Jisọs bụ mmadụ, ọ bụ eziokwu na ọ bụ onye zuru okè n’ihi na ọ bụ Chineke tinyere ike ndụ nke Jisọs n’ime akpa nwa Meri. (Matiu 1:18-25) Ma ọ bụghị otú ahụ ka o si malite. Ya onwe ya kwupụtara na ya “siri n’eluigwe rịdata.” (Jọn 3:13) Ya mere ọ bụ nnọọ ihe kwesịrị ekwesi na o mesịrị gwa ndị na-eso ụzọ ya sị: “Olee ma ọ bụrụ na unu ahụ Nwa nke mmadụ [Jisọs] ka ọ na-arịgoghachi n’ebe ọ nọ na mbụ?”—Jọn 6:62, NJB.
Otú a, Jisọs adịwo adị n’eluigwe tupu ọ bịa n’ụwa. Ma ọ̀ bụ dị ka onye nke so na Chineke nke ndị atọ pụrụ ime ihe nile ma na-adịru ebighị ebi? Ee e, n’ihi na Bible na-ekwu n’ụzọ doro anya na n’ịdị adị ya tupu ọ ghọọ mmadụ, Jisọs bụ mmụọ e kere eke, dị nnọọ ka ndị mmụọ ozi bụ ndị mmụọ Chineke kere eke. Ma ndị mmụọ ozi ma Jisọs adịghị nke ọ bụla dịrị adị tupu okike ha.
Ná ndụ ọ dịrị tupu ọ ghọọ mmadụ, Jisọs bụ “onye e buru ụzọ mụọ n’ihe nile e kere eke.” (Ndị Kọlọsị 1:15, NJB) Ọ bụ “mmalite nke ihe Chineke kere eke.” (Mkpughe 3:14, RS, mbipụta nke ndị Katọlik) “Mmalite” [Grik, ar·kheʹ] abụghị nke a pụrụ ịsụgharị n’ụzọ ziri ezi na Jisọs bụ ‘onye malitere’ ihe Chineke kere eke. N’ihe odide Bible ya, Jọn ji ụdị dị iche iche nke okwu Grik ahụ bụ ar·kheʹ mee ihe n’ihe karịrị 20 ugboro, mgbe nile, ndị a pụtara otu ihe ahụ, nke bụ “mmalite.” Ee, Chineke kere Jisọs dị ka mmalite nke ihe nile Chineke kere eke ndị a na-adịghị ahụ anya.
Rịba ama otú ihe ndị ahụ e zoro aka na ha banyere mmalite Jisọs si kwekọọ n’ụzọ chiri anya n’okwu ndị ahụ “Amamihe” nke ihe atụ ahụ kwuru n’akwụkwọ Bible nke Ilu, sị: “Yahweh kere m, mkpụrụ mbụ nke aka ọrụ ya, tupu nke kasị mee ochie n’ọrụ ya nile. Tupu e mee oké ugwu nile, tupu ugwu nta, a mụwo m; tupu o mee ụwa, ime obodo na ihe mbụ ndị dị n’ụwa.” (Ilu 8:12, 22, 25, 26, NJB) Ebe ọ bụ eziokwu na e ji okwu ahụ bụ “Amamihe” mee ihe iji nọchite anya onye ahụ Chineke kere eke, ọtụtụ ndị mmụta kwere na n’ezie ọ bụ okwu ihe atụ nke e ji mee ihe maka Jisọs dị ka mmụọ e kere eke tupu ịdị adị ya dị ka mmadụ.
Dị ka “Amamihe” n’ịdị adị ya tupu ọ ghọọ mmadụ, Jisọs gara n’ihu ikwu na ya nọ “n’akụkụ [Chineke], bụrụ onye ọkà.” (Ilu 8:30, JB) N’ikwekọ n’ọrụ ya dị ka onye ọkà, Ndị Kọlọsị 1:16 na-ekwu banyere Jisọs na “site na ya Chineke kere ihe nile dị n’eluigwe na n’ụwa.”—Today’s English Version (TEV).
Ya mere, ọ bụ site n’onye ọkà nke a, onye ọrụ ibe ya nke nọ ya n’okpuru, dị ka a pụrụ isi kwuo ya, ka Chineke Onye Pụrụ Ime Ihe Nile kere ihe ndị ọzọ nile. Bible chịkọtara okwu ahụ n’ụzo dị otú a: “Nye anyị, e nwere otu Chineke, bụ́ nna, onye ihe nile sitere n’aka ya . . . na otu Onyenwe anyị, bụ́ Jisọs Kraịst, onye e sitere n’aka ya mee ihe nile.” (Ọ bụ anyị dere okwu ụfọdụ n’ụdị dị iche.)—1 Ndị Kọrint 8:6, RS, mbipụta nke ndị Katọlik.
Ihe ịrụ ụka adịghị ya na ọ bụ onye ọkà nke a ka Chineke gwara, sị: “Ka anyị kpụọ mmadụ n’onyinyo anyị.” (Jenesis 1:26) Ụfọdụ asịwo na “anyị” nke e ji mee ihe ebe a na-egosi Atọ n’Ime Otu. Ma ọ bụrụ na i kwuo ‘Ka anyị meere onwe anyi ihe,’ ọ dịghị onye ọ bụla ga-eche echiche nke ọma wee ghọta nke a ịbụ na e jikọtara mmadụ ole na ole dị ka otu n’ime gị. Nanị ihe i bu n’uche bụ na mmadụ abụọ ma ọ bụ karị ga-arụkọ ọrụ ọnụ imepụta otu ihe. Ya mere, mgbe Chineke ji “anyị” mee ihe, nanị ihe ọ na-eme bụkwa ịgwa onye ọzọ okwu, bụ́ mmụọ mbụ o kere eke, onye ọkà, onye ahụ dịbu adị tupu ọ ghọọ mmadụ, bụ́ Jisọs.
À Pụrụ Ịnwa Chineke?
NA MATIU 4:1, e kwuru okwu banyere Jisọs dị ka onye ‘Ekwensu nwara.’ Mgbe o gosisịrị Jisọs “alaeze nile nke ụwa, na ebube ha,” Setan kwuru, sị: “Ihe ndị a nile ka m ga-enye gị, ọ bụrụ na ị ga-ada n’ala kpọọ isiala nye m.” (Matiu 4:8, 9) Setan na-anwa ime ka Jisọs ghara ijigide nguzosi ike ya n’ebe Chineke nọ.
Ma ọ bụ ọnwụnwa nke iguzosi ike n’ihe dị aṅaa ka nke ahụ gaara abụ ma ọ bụrụ na Jisọs bụ Chineke? Chineke ọ̀ ga-enupụrụ onwe ya isi? Ee e, kama ndị mmụọ ozi na ụmụ mmadụ pụrụ inupu isi megide Chineke, ha mekwara nke ahụ. Ọnwụnwa nke a a nwara Jisọs ga-ekwe nghọta nanị ma ọ bụrụ na ọ bụghị Chineke, kama onye dị iche, onye nweere onwe ya ime ihe ọ chọrọ, onye gaara ahapụworị nguzosi ike ya ma ọ bụrụ na ọ họọrọ ime otú ahụ, dị ka mmụọ ozi ma ọ bụ mmadụ.
N’aka nke ọzọ, ọ bụ ihe a na-apụghị iche n’echiche na Chineke ga-emehie ma nupụrụ onwe ya isi. “Ihe zuru okè ka ọrụ ya bụ . . . Chineke nke kwesịrị ntụkwasị obi, . . . onye ezi omume na onye ziri ezi ka ọ bụ.” (Deuterọnọmi 32:4) Ya mere, a sị na Jisọs bụ Chineke, a garaghị anwa ya ọnwụnwa.—Jemes 1:13.
N’ihi na ọ bụghị Chineke, Jisọs gaara ahapụ iguzosi ike ya. Ma ọ nọgidere na-ekwesi ntụkwasị obi, na-asị: “Laba, Setan: n’ihi na e dewo ya n’akwụkwọ nsọ, sị, [“Jehova,” NW] Chineke gị ka ị ga-akpọ isiala nye, ọ bụkwa nanị ya ka ị ga-ekpere.”—Matiu 4:10.
Gịnị Bụ Ọnụ Ahịa nke Ihe Mgbapụta ahụ?
OTU n’ime isi ihe ndị mere Jisọs ji bịa n’ụwa metụtakwara Atọ n’Ime Otu kpọmkwem. Bible na-ekwu, sị: “Otu Chineke dị, otu onye ogbugbo dịkwa n’agbata Chineke na mmadụ, onye ya onwe ya bụ mmadụ, bụ́ Kraịst Jisọs, onye nyere onwe ya ka ọ bụrụ ihe mgbapụta n’ihi mmadụ nile.”—1 Timoti 2:5, 6.
Jisọs, onye bụ kpọmkwem mmadụ zuru okè, ghọrọ ihe mgbapụta iji kwụọ ụgwọ maka otu ihe ahụ nke Adam tụfuru—iru eru iji nweta ndụ mmadụ zuru okè n’elu ụwa. Ya mere, ọ bụ ihe ziri ezi na a kpọrọ Jisọs “Adam ikpeazụ” site n’ọnụ Pọl onyeozi, bụ́ onye kwuru na gburugburu otu ebe ahụ, sị: “Dị ka ọnwụ dịịrị mmadụ nile n’ime Adam, ọ bụkwa otú a ka a ga-eme ka mmadụ nile dị ndụ n’ime Kraịst ahụ.” (1 Ndị Kọrint 15:22, 45) Ndụ mmadụ zuru okè nke Jisọs bụ “ihe mgbapụta n’ihi mmadụ nile” bụ́ nke ikpe ziri ezi Chineke chọrọ—a tụkwasịghị ya ihe ọ bụla, e wepụghịkwa ihe ọ bụla na ya. Otu ụkpụrụ bụ isi, ọbụna n’usoro ikpe ziri ezi nke mmadụ bụ na ụgwọ a kwụrụ kwesịrị ikwekọ ná mmehie e mere.
Otú ọ dị, a sị na Jisọs bụ otu akụkụ nke Chiatọ ahụ, ihe mgbapụta ahụ gaara adị elu nke ukwuu karịa ihe Iwu Chineke chọrọ. (Ọpụpụ 21:23-25; Levitikọs 24:19-21) Ọ bụ nanị mmadụ zuru okè, bụ́ Adam, bụ onye mehiere n’Iden, ọ bụghị Chineke. Ya mere ka mgbapụta ahụ wee kwekọọ n’ezie n’ikpe ziri ezi chineke, ọ ghaghị ịbụ ihe ya na ya hà—mmadụ zuru okè, bụ́ “Adam ikpeazụ.” Otú a, mgbe Chineke zitere Jisọs n’ụwa dị ka ihe mgbapụta, o mere ka Jisọs bụrụ ihe ga-emejụ ikpe ziri ezi, ọ bụghị mmụọ dị n’ụdị mmadụ, ọ bụghị mmadụ nke bụ chi, kama mmadụ zuru okè, ‘onye dị ala karịa ndị mmụọ ozi.’ (Ndị Hibru 2:9; tụlee Abụ Ọma 8:5, 6.) Olee otú akụkụ ọ bụla nke Chiatọ nke pụrụ ime ihe nile—Nna, Ọkpara, ma ọ bụ mmụọ nsọ—pụrụ isi dị ala karịa ndị mmụọ ozi mgbe ọ bụla?
Ò Si Aṅaa Bụrụ “Nwa Nwoke A Mụrụ Nanị Ya”?
BIBLE na-akpọ Jisọs Kraịst “Nwa nwoke a mụrụ nanị ya” nke Chineke. (Jọn 1:14; 3:16, 18; 1 Jọn 4:9) Ndị na-akwado Atọ n’Ime Otu na-asị na ebe ọ bụ na Chineke enweghị mmalite, otú ahụ, Ọkpara nke Chineke enweghị mmalite. Ma olee otú mmadụ pụrụ isi bụrụ ọkpara ma bụrụkwa ọgbọ nke nna ya n’otu mgbe ahụ?
Ndị na-akwado Atọ n’Ime Otu na-asị na n’ọnọdụ Jisọs, “nwa nwoke a mụrụ nanị ya” abụghị otu ihe ahụ dị ka nkọwa nke akwụkwọ ọkọwa okwu nyere “ịmụ nwa,” nke bụ “ịmụta nwa dị ka nna.” (Webster’s Ninth New Collegiate Dictionary) Ha na-asị na n’ọnọdụ nke Jisọs, ọ pụtara “echiche nke mmekọrịta na-enweghị mmalite,” ụdị nke mmekọrịta nke onye nanị ya bụ nwa nke a na-amụghị amụ. (Vine’s Expository Dictionary of Old and New Testament Words) Nke ahụ ò yiri ihe ezi uche dị na ya nye gị? Nwoke ọ̀ pụrụ ịbụ nna mmadụ n’amụghị ya amụ?
Ọzọkwa, n’ihi gịnị ka Bible ji jiri otu okwu Grik ahụ e nwere maka onye “a mụrụ nanị ya” mee ihe (dị ka Vine kwetara n’enyeghị nkọwa ọ bụla) n’ịkọwa mmekọrịta dị n’etiti Aịsak na Abraham? Ndị Hibru 11:17 na-ekwu banyere Aịsak dị ka ‘nwa nwoke Abraham mụrụ nanị ya.’ A pụghị inwe ihe ịrụ ụka ọ bụla n’ọnọdụ nke Aịsak, ọ bụ onye a mụrụ nanị ya n’ezie, ọ bụghị onye ya na nna ya hà nhata n’afọ ndụ ma ọ bụ n’ọnọdụ.
Okwu Grik bụ isi maka onye “a mụrụ nanị ya” nke e ji mee ihe n’ọnọdụ Jisọs na Aịsak bụ mo·no·ge·nesʹ, nke sitere na moʹnos, nke pụtara “nanị” na giʹno·mai, bụ́ mkpọrọgwụ okwu nke pụtara “ịmụta nwa,” “ịghọ onye (ịmalite ịdị adị),” ka akwụkwọ Strong bụ Exhaustive Concordance na-ekwu. N’ihi nke a, mo·no·ge·nesʹ bụ nke a kọwara dị ka: “Onye a mụrụ nanị ya, ya bụ, otu mkpụrụ nwa.”—A Greek and English Lexicon of the New Testament, nke E. Robinson dere.
Akwụkwọ bụ Theological Dictionary of the New Testament, nke Gerhard Kittel haziri mbipụta ya, na-asị: “[Mo·no·ge·nesʹ] pụtara ‘onye a mụrụ nanị ya,’ ya bụ, onye na-enweghị ụmụnne ndị ikom ma ọ bụ ndị inyom.” Akwụkwọ a kwukwara na na Jọn 1:18; 3:16, 18; na 1 Jọn 4:9, “ọnọdụ Jisọs abụghị nanị nke e ji tụnyere otu mkpụrụ nwa nna ya mụrụ. Ọ bụ mmekọrịta nke onye Nna ya mụrụ nanị ya.”
Ya mere Jisọs, bụ́ Ọkpara a mụrụ nanị ya, nwere mmalite ná ndụ ya. N’ụzọ ziri ezi a pụkwara ịkpọ Chineke Onye pụrụ ime ihe nile, Onye Mụrụ ya, ma ọ bụ Nna ya, n’otu echiche ahụ nna nke elu ala, dị ka Abraham na-amụta ọkpara. (Ndị Hibru 11:17) Ya mere, mgbe Bible na-ekwu okwu banyere Chineke dị ka “Nna” nke Jisọs, o ji ihe ọ na-ekwu kpọrọ ihe—na ha bụ ndị abụọ dị iche. Chineke bụ onye nke okenye. Jisọs bụ onye dị nta—n’afọ ndụ, ọnọdụ, ike, na ihe ọmụma.
Mgbe mmadụ tụlere na ọ bụghị nanị Jisọs bụ mmụọ e kere eke nke bụ nwa nwoke nke Chineke n’eluigwe, ọ na-edo anya ihe mere e ji jiri okwu ahụ bụ “Nwa nwoke a mụrụ nanị ya” mee ihe n’ọnọdụ nke ya. A kpọkwara ọtụtụ ndị bụ mmụọ e kere eke, bụ́ ndị mmụọ ozi a na-apụghị ịgụta ọnụ, “ụmụ Chineke,” n’otu echiche ahụ e jikwa kpọọ Adam, n’ihi na ike ndụ ha sitere n’aka Jehova Chineke, bụ́ Isi Iyi nke ndụ. (Job 38:7; Abụ Ọma 36:9; Luk 3:38) Ma e kere ndị a nile site n’aka onye ahụ bụ “Nwa nwoke a mụrụ nanị ya,” bụ́ nanị onye Chineke mụrụ n’onwe ya.—Ndị Kọlọsị 1:15-17.
È Lere Jisọs Anya Dị Ka Chineke?
EBE ọ bụrịị eziokwu na a kpọrọ Jisọs Ọkpara nke Chineke na Bible mgbe mgbe, ọ dighị onye ọ bụla na narị afọ mbụ nke chere echiche banyere ya mgbe ọ bụla dị ka Chineke Ọkpara. Ọbụna ndị mmụọ ọjọọ, bụ́ ndị “kwere na Chineke bụ otu,” maara site n’ahụmahụ ha nwere n’ebe obibi nke ndị bụ mmụọ na Jisọs abụghị Chineke. Ya mere, n’ụzọ ziri ezi, ha gwara Jisọs okwu dị ka “Ọkpara Chineke” nke dị iche. (Jemes 2:19; Matiu 8:29) Mgbe Jisọs nwụkwara, ndị agha Rom ahụ na-ekpere arụsị, bụ́ ndị guzo n’akụkụ maara ihe zuru ezu iji kwuo na ihe ha nụworo n’ọnụ ndị na-eso ụzọ ya bụ eziokwu, ọ bụghị na Jisọs bụ Chineke, kama na “n’ezie nwoke a bụ Ọkpara Chineke.”—Matiu 27:54.
Otú a, okwu ahụ bụ “Ọkpara Chineke” na-ezo aka n’ebe Jisọs nọ dị ka onye dị iche e kere eke, ọ bụghị dị ka akụkụ nke Atọ n’Ime Otu. Dị ka Ọkpara Chineke, ọ pụghị ịbụworị Chineke n’onwe ya, n’ihi na Jọn 1:18 na-asị: “Ọ dịtụbeghị onye ọ bụla hụrụ Chineke.”—RS, mbipụta nke ndị Katọlik.
Ndị na-eso ụzọ ya lere Jisọs anya dị ka ‘otu onye ogbugbo nke dị n’etiti Chineke na mmadụ,’ ọ bụghị dị ka Chineke n’onwe ya. (1 Timoti 2:5) Ebe ọ bụ na ná nkọwa ya, onye ogbugbo bụ onye dị iche pụọ na ndị ahụ chọrọ onye ogbugbo, ọ ga-abụ ihe na-emegide nkọwa ahụ bụ́ Jisọs isoro nke ọ bụla n’ime ndị ahụ ọ na-agbalị idoziri okwu bụrụ otu akụkụ. Nke ahụ ga-abụ ime ka a ga-asị na ọ bụ ihe ọ na-abụghị.
Bible na-ekwu ihe doro anya ma nwee nkwekọ n’ebe nile banyere mmekọrita nke Chineke na Jisọs. Nanị Jehova Chineke bụ Onye Pụrụ Ime Ihe Nile. O ji aka ya kee onye ahụ dịrị ndụ tupu ọ ghọọ mmadụ, bụ́ Jisọs. Otú a, Jisọs nwere mmalite, ọ dịghịkwa mgbe ọ bụla ya na Chineke ga-aha nhata n’ike na n’ịdịru ebighị ebi.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a E dere aha Chineke ịbụ “Yahweh” ná nsụgharị ụfọdụ, “Jehova” ná ndị ọzọ.
[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 14]
Ebe ọ bụ onye Chineke kere eke, Jisọs nọ n’ọnọdụ nke abụọ n’ihe banyere afọ ndụ, ike na ihe ọmụma
[Foto dị na peeji nke 15]
Jisọs sịrị na ya dịrị adi tupu ọ ghọọ mmadụ, ebe ọ bụ onye Chineke kere dị ka mmalite nke ihe nile Chineke kere eke ndị a na-adịghị ahụ anya