Ihe Ndị A Hụrụ n’Ala Nkwa Ahụ
Geraịzim—‘N’elu Ugwu A Ka Anyị Fere Ofufe’
NWANYỊ Sameria ahụ nọ n’ọdọ mmiri. Ọ̀ bụ na ndebiri ahịrịokwu ahụ adịghị echetara gị ihe ndekọ ahụ na-emetụ n’obi nke Jisọs ịgbara otu nwanyị àmà ná mberede ‘n’isi iyi Jekọb’ dị na Saịka, otu obodo nke ndị Sameria? Ị̀ ga-achọ ka echiche gị banyere ihe ahụ merenụ nke nwere nzube dokwuo gị anya?—Jọn 4:5-14.
Rịba ugwu abụọ ahụ dị n’elu ama, ndị dị ihe dị ka 50 kilomita n’ebe ugwu Jerusalem.a N’akụkụ aka ekpe (n’ebe ndịda) e nwere Geraịzim osisi kpuchitere; ọtụtụ mmiri iyi so na-eme ka ala ya na-eme nri nke ọma na ịma mma ya. N’aka nri (n’ebe ugwu) e nwere Ebal, dịtụ elu karị ma bụrụ ala nkume, gharakwa ịdị na-eme nri.
N’agbata ha ka e nwere ndagwurugwu Shekem ahụ na-eme nri. Cheta na mgbe enyi Chineke bụ Abram (onye e mesịrị kpọọ Abraham) mere njem gabiga Ala Nkwa ahụ, ọ kwụsịtụrụ na Shekem. N’ebe a o wuuru Jehova ebe ịchụàjà, bụ́ onye ka gosichara ya onwe ya ma kwee nkwa inye mkpụrụ ya ala a. (Jenesis 12:5-7) Lee ebe kwesịrị ekwesị nke a bụ ikwe nkwa dị otú a, n’etiti ala ahụ! Site n’ọnụ ọnụ Geraịzim ma ọ bụ Ebal, nna ochie ahụ pụrụ ikiri akụkụ dị ukwuu nke Ala Nkwa ahụ. Obodo Shekem (Nablus oge ugbu a) bụ ebe na-ekwo ekwo, ebe ọ nọ n’ụzọ si ebe ugwu gaa ebe ndịda bụ́ nke dị nso n’ụzọ si ebe ọwụwa anyanwụ gaa ebe ọdịda anyanwụ n’agbata ụsọ osimiri na Ndagwurugwu Jọdan.
Ebe ịchụàjà Abraham bụ nanị otu ihe okpukpe e nwere n’ebe a. E mesịa Jekọb zụụrụ ala n’ógbè a ma jiri ezi ofufe gaa n’ihu. O gwukwara ma ọ bụ kwụọ ụgwọ maka ogwugwu nke otu olulu mmiri dị omimi, nso ala ala Geraịzim. Mgbe ọtụtụ narị afọ gafesịrị nwanyị Sameria ahụ gwara Jisọs: “Nna anyị Jekọb . . . onye nyere anyị olulu mmiri a . . . ṅụkwara n’ime ya.” Ọ pụrụ ịbụwo na ọ bụ site na mmiri si n’otu ọgba ná nkume ka o si enweta mmiri bụ́ nke pụrụ ịbụ ihe mere Jọn onyeozi pụrụ iji kpọọ ya “isi iyi Jekọb.”
Ihota ezi ofufe n’ihe banyere Geraịzim na Ebal pụkwara ichetara gị na Joshua kpọtara Israel n’ebe a, dị ka Mosis nyere iwu. Joshua wuru ebe ịchụàjà n’Ebal. Cheedị echiche ọkara ndị ahụ ịnọ n’ihu Geraịzim na ndị ọzọ ịnọ n’ihu Ebal ka Joshua na-agụ “iwu ahụ, ngọzi ma nkọcha.” (Joshua 8:30-35; Deuterọnọmi 11:29) N’ọtụtụ afọ n’ihu, Joshua lọghachitere, n’okwu ndụmọdụ ikpeazụkwa ọ sịrị: “Ma mụ onwe m na ezinụlọ m, anyị ga-efe Jehova.” Ndị ahụ gbara ndụ imekwa otú ahụ. (Joshua 24:1, 15-18, 25) Ma hà ga-eme otú ahụ n’ezie?
Azịza ya pụrụ inyere gị aka ịghọta mkparịta ụka nke Jisọs na nwanyị Sameria ahụ. Ị ma na ezi ofufe nke Abraham, Jekọb, na Joshua gbasoro anọgideghị na-aga n’ihu n’ebe a na Sameria.
Mgbe ebo iri ahụ dị n’ebe ugwu kewapụsịrị, ha chigharịkwuuru ofufe nwa ehi. Ya mere Jehova kwere ka ndị Asiria merie akụkụ a na 740 T.O.A. Ha buuru ihe dị nnọọ ukwuu ná ndị bi na ya laa, na-akpọbata ndị ala ọzọ si ebe ọzọ n’Alaeze Ukwu Asiria, bụ́ ndị na-efe chi ala ọzọ, dị ka ndị nnọchi. O yiri ka ụfọdụ ndị ahụ na-ekpere arụsị na ndị Israel hà lụkọrịtara nwanyị, ha mụtakwara nkụzi ụfọdụ nke ezi ofufe, dị ka ibe úgwù. Ma ụdị ofufe ndị Sameria nke sitere na ya adịghị nnọọ atọ Chineke ụtọ n’ụzọ zuru ezu.—2 Ndị Eze 17:7-33.
N’ofufe ha a gwagburu agwagbu, ndị Sameria nakweere dị ka Akwụkwọ Nsọ nanị akwụkwọ ise mbụ nke Mosis, bụ́ Pentateuch ahụ, N’ihe dị ka na narị afọ nke anọ T.O.A., ha guzobere otu ụlọ nsọ n’Ugwu Geraịzim, iji maa ụlọ nsọ Chineke dị na Jerusalem aka. Mgbe oge na-aga a raara ụlọ nsọ Geraịzim ahụ nye Zeus (ma ọ bụ Jupita), e mesịkwara bibie ya. Ma, ofufe ndị Sameria nọgidere na-elekwasị anya na Geraịzim.
Ruo taa, ndị Sameria na-enwe Ememe Ngabiga kwa afọ n’elu Geraịzim. A na-egbu ọnụ ọgụgụ dị ukwuu nke atụrụ. A na-asụnye ozu ha ná nnukwute drọn ndị mmiri ọkụ na-asụ asụ juru na ha ka e wee nwee ike ikwochapụta ajị ha, e wee sie anụ ahụ n’ọkụ a mụnyere n’olulu ruo ọtụtụ hour. N’ime abalị, ọtụtụ narị ndị Sameria, ọtụtụ site na Jerusalem, na-eri anụ ngabiga ha. N’aka ekpe, ị pụrụ ịhụ onye isi nchụàjà Sameria, e kpuchiri isi ya, ka ọ na-eduzi otu Ememe Ngabiga n’elu Ugwu Geraịzim.
Cheta ihe nwanyị Sameria ahụ gwara Jisọs: “Nna anyị ha nile kpọrọ isiala nye Chineke n’ugwu a.” Jisọs gbaziri ya, gbaziekwa anyị onwe anyị, olu: “Oge hour na-abịa, mgbe unu na-agaghị akpọ isiala nye Nna m, ma ọ bụ n’ugwu a, ma ọ bụ na Jerusalem. . . . Ma oge hour na-abịa, ugbu a ka ọ dịkwa, mgbe ndị na-akpọ isiala n’ezie ga-akpọ isiala nye Nna m n’ime mmụọ na eziokwu: n’ihi na ndị dị otú ahụ ka Nna m na-achọkwa ka ha bụrụ ndị na-akpọ isiala nye ya. Chineke bụ mmụọ: ndị na-akpọkwa isiala nye ya aghaghị ịkpọ isiala n’ime mmụọ na eziokwu.”—Jọn 4:20-24.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a I nwere ike inyocha foto a n’ụdị buru ibu karị na 1993 Calendar of Jehovah’s Witnesses.
[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 24]
Pictorial Archive (Near Eastern History) Est.
[Ebe E Si Nweta Foto Ndi Dị na peeji 25]
Garo Nalbandian
Garo Nalbandian