Ihe Ndị Mere n’Oge Baịbụl—Onye Ọrụ Ubi
“[Jizọs] sịrị ndị na-eso ụzọ ya: ‘Ee, ihe ubi hiri nne, ma ndị ọrụ dị ole na ole. Ya mere, na-arịọnụ Onye nwe owuwe ihe ubi ahụ ka o ziga ndị ọrụ n’owuwe ihe ubi ya.’” —MATIU 9:37, 38.
N’ỌTỤTỤ ihe atụ Jizọs mere na Baịbụl, o ji ụzọ dị iche iche e si akọ ubi na ihe e ji akọ ubi kụzie ihe ndị dị mkpa. (Matiu 11:28-30; Mak 4:3-9; Luk 13:6-9) Gịnị mere Jizọs ji jiri ihe ndị ahụ mee ihe atụ? Ọ bụ maka na ndị mmadụ n’oge ahụ na-akọ ubi. Ọtụtụ ndị ọ gwara okwu na-arụ ọrụ ubi otú ndị nna nna ha si rụọ. Ha ghọtara ihe ọ na-ekwu mgbe o ji ihe ndị ha na-arụ kwa ụbọchị maa atụ. Jizọs maruru ndị obodo ya ala, ihe ọ kụziiri ha rukwara ha n’obi.—Matiu 7: 28.
Ọ bụrụ na anyị aghọtatụ otú onye ọrụ ubi n’oge Jizọs nọ n’ụwa si kọọ ubi ya, mkpụrụ ndị ọ kụrụ, ihe ndị o ji kọọ ubi na nsogbu ndị o nwere, ọ ga-enyere anyị aka ịghọtakwu ihe atụ ndị Jizọs mere banyere ọrụ ubi nakwa ihe ndị ọzọ a kọrọ na Baịbụl.
Ka anyị tụlee otú onye ọrụ ubi si arụ ọrụ n’oge Baịbụl. Gụọ amaokwu Akwụkwọ Nsọ ndị dị n’isiokwu a, leekwa ma è nwere ihe ị ga-amụta na ha.
Oge Ịkụ Ihe
Tupu onye ọrụ ubi amalite ọrụ, ọ na-echere ka mmiri zoo ma dee ala n’ihi na ala kpọrọ nkụ. Mmiri zoo, ọ pụtara na oge ịkụ ihe eruola. Ọ na-ekorozi ọ́gụ̀ osisi ya n’ubu gawa ọrụ.
Onye ọrụ ubi ruo n’ubi ya, ọ na-akpụpụta oké ehi abụọ na-adọkpụ ọ́gụ̀ e ji akọ ala, konye ha yok n’olu ma jiri ndụdụ e ji achị anụ mee ka ha rụwa ọrụ. Ọnụ ọ́gụ̀ ahụ bụ́ ígwè ígwè na-akọ ala bụ́ okwute okwute ka ehi ndị ahụ na-adọkpụ ya. Ọ́gụ̀ ahụ ehi ndị ahụ na-adọkpụ na-akọ ala elu elu (1). Onye ọrụ ubi na-eduzi ehi ndị ahụ ka ha na-akọ ala n’ahịrị n’ahịrị. Ọ naghị ele anya n’azụ mgbe ehi ndị ahụ na-akọ ala. O lee anya n’azụ, ọ́gụ̀ ahụ agaghịzi na-akọ ala n’ahịrị n’ahịrị. (Luk 9:62) Onye ọrụ ubi na-akọ naanị obere ala e nyere ya, ọ naghị agafe ya.
Ugbu a a kọchara ala ahụ n’ahịrị n’ahịrị, ọ na-amalite ịgha mkpụrụ. Ọ na-eburu akpa ọka bali n’otu aka ma jiri aka nke ọzọ na-aghasasị ha n’ala ahụ a kọrọ akọ (2). Mgbe ahụ a na-akọ ala, onye ọrụ ubi ahụ na-azọ ụkwụ n’ebe ụfọdụ mgbe ọ na-eduzi ehi ndị ahụ na-akọ ala. Ebe ndị ahụ ọ zọrọ ụkwụ na-esikwa ezigbo ike. Mgbe ọ na-agha mkpụrụ, ọ na-elezi anya ka mkpụrụ ndị ahụ daba “n’ezi ala,” kama ịdaba n’ebe ndị ahụ ọ zọrọ ụkwụ.—Luk 8:5, 8.
Onye ọrụ ubi ghachaa mkpụrụ, ọ na-eji ájá kpochie ya. Ọ na-aga n’ọhịa, gbute alaka osisi bụ́ ogwu ogwu, mee ka oké ehi ya buru ha gaa n’ubi ya. Ọ na-atụsasị alaka osisi ndị ahụ n’ebe ahụ ọ ghara mkpụrụ. Tupu ya ekpochichaa ájá n’ebe ndị ahụ ọ kọrọ ihe, ọtụtụ nnụnụ na-abịa atụrụ ụfọdụ mkpụrụ ndị ọ ghara. Mgbe oge ụfọdụ gachara, onye ọrụ ubi na-abịa n’ubi ahụ jiri ọ́gụ̀ (3) gwupụ ahịhịa ndị nwere ike igbu mkpụrụ ndị ahụ ọ ghara tupu ha achaa.—Matiu 13:7.
Oge Iwe Ihe Ubi
Mgbe ọnwa ole na ole gachara, mmiri ezookwa ọtụtụ ugboro, ọka bali ndị ahụ na-acha. Oge eruola ka ọ ghọọ ha.—Jọn 4:35.
Mgbe a na-aghọ ọka bali, onye ọrụ ubi na ndị ezinụlọ ya anaghị ezu ike. Onye na-ewe ihe ubi na-eji aka ekpe ya jide ọka chara acha, ma were aka nri ya jiri mma e ji ewe ihe ubi na-achabi ọka ndị ahụ (4). Ọ na-abụ ya na-achabi ọka, ndị ọzọ ana-achịkọta ha, na-eke ha n’ùkwù n’ùkwù (5), ma tụkwasị ha n’elu ịnyịnya ibu ma ọ bụ trọk (6) ga-ebuga ha n’ebe ndị obodo ha na-azọcha ọka.
Tupu ezinụlọ ahụ emechaa ihe ndị ahụ, anwụ achasiwala ike. Ha na-aga zuru ike n’okpuru osisi fig. Ha na-anọ ebe ahụ akọrị ma na-achị, ka ha na-ata ọka a mịrị amị, mkpụrụ oliv, mkpụrụ fig a mịrị amị na mkpụrụ vaịn a mịrị amị. Ha tachaa, ha aṅụọ mmiri ha kutere n’iyi.—Diuterọnọmi 8:7.
Ndị na-atụtụkọta ọka e wefọrọ ewefọ na-aga n’ubi dị ha nso ewere ọka ndị e wefọrọ ewefọ (7). Ụfọdụ n’ime ha bụ ndị ogbenye, ha enweghịkwa ala ebe ha na-akọ ihe.—Diuterọnọmi 24:19-21.
E mechaa, onye ọrụ ubi ahụ na-aghasasị ùkwù ọka n’ebe ndị obodo ha na-azọcha ọka. A rụliri ebe ahụ elu, o sikwara ezigbo ike. Ehi abụọ ndị na-adọkpụrụ ihe dị arọ e ji azọcha mkpụrụ ma rịa ùkwù ọka ndị ahụ elu ugboro ugboro (8). (Diuterọnọmi 25:4) Nkume ndị ọnụ ha pịrị apị na obere ígwè ndị dị n’okpuru ihe ahụ e ji etichapụta ọka na-etichapụta ọka ndị ahụ.
Ugbu a e tichara ọka ndị ahụ, onye ọrụ ubi na-echere ka mgbede ruo, ka ikuku malite iku. (Rut 3:2) Ọ na-ejizi ogologo fọk ma ọ bụ ‘shovel e ji afụcha ihe’ (9) na-ekuli ọka ndị ahụ e tichara eticha elu. (Matiu 3:12) Ndị bụ́ mkpụrụ ọka na-ada n’ala, ebe ikuku na-ebufu igbogbo ọka ahụ. Ọ na-eji fọk ahụ e ji afụcha ihe na-ekuli ọka ndị ahụ e tichara eticha elu ruo mgbe ọ fụchara ọka ahụ niile.
N’isi ụtụtụ, nwunye onye ọrụ ubi na ụmụ ya ndị nwaanyị na-ayọcha ọka bali ahụ (10). Mgbe ha na-ayọcha ya, mkpụrụ ya na-adanye n’ime nkata, ha na-etufu ihe ndị na-adịghị mma ha yọchapụtara. Ha na-awụnye ụfọdụ n’udu (11), wụnyezie ndị ọzọ n’ebe ha na-echekwa ọka bali. N’eziokwu, ọka bali mịịrị ha nke ọma n’afọ ahụ.
Ka onye ọrụ ubi ahụ nọ n’ebe ahụ a na-azọcha mkpụrụ, ọ na-agbatị onwe ya n’ihi na ezigbo ike agwụla ya. Ọ na-elegharịkwa anya n’ubi ndị ọzọ dị n’obodo ahụ. Obi na-atọ ya ụtọ ugbu a n’ihi na ọ bụzi naanị okporo ọka fọdụrụ n’ubi ahụ. Nke a gosiri na ọ rụsịrị ọrụ ike. Ọ na-anọ ebe ahụ ele ndị na-arụ ọrụ n’ubi oliv ha, n’ubi pọmigranet ha nakwa n’ubi fig ha. Onye agbata obi ya efeere ya aka mgbe onye agbata obi ya ahụ na-egwu ala n’obere ala ebe ọ ga-akọ ihe. Ọ ga-akọ kukumba, àgwà, yabasị na ụmụ ihe ndị ọzọ ọ chọrọ ịkọ n’ala ahụ. Ugbu a onye ọrụ ubi arụchaala ọrụ ya. Ya ekelee Chineke maka ihe ọma ndị ọ na-emere ụmụ mmadụ.—Abụ Ọma 65:9-11.
[Foto ndị dị na peeji nke 28-30]
(Lee ebe e sere ya n’akwụkwọ a)