Nweta Abamuru nke Izi Ihe Chineke
“Mụ onwe m bụ Jehova, Chineke gị, Onye na-ezi gị ime ihe na-aba uru.”—AỊSAỊA 48:17.
1. Olee otú ihe ga-adịrị anyị ma anyị tinye izi ihe Chineke n’ọrụ ná ndụ anyị?
JEHOVA CHINEKE kasị mara ihe. Ọ dịghị onye karịrị ya n’echiche, okwu, ma ọ bụ omume. Dị ka Onye Okike anyị, ọ maara mkpa anyị, na-emejukwa ha n’ụba. Ọ maara n’ezie ụzọ isi nye anyị ntụziaka. Ọ bụrụkwa na anyị etinye izi ihe Chineke n’ọrụ, anyị na-eritere onwe anyị uru, na-enwekwa ezi obi ụtọ.
2, 3. (a) Olee otú ndị Chineke n’oge ochie gaara esiwo rite uru a sị na ha rubere isi n’ihe ndị o nyere n’iwu? (b) Gịnị ga-eme ma ọ bụrụ na anyị etinye izi ihe Chineke n’ọrụ ná ndụ anyị taa?
2 Izi ihe Chineke na-ekpughe ọchịchọ si n’ala ala obi Chineke ka ndị na-ejere ya ozi zere ọdachi ma nụ ụtọ ndụ site n’ime ihe kwekọrọ n’iwu na ụkpụrụ ya nile. Á sị na ndị Jehova n’oge ochie ṅara ya ntị, ha gaara enwetawo ngọzi bara ụba, n’ihi na ọ gwawo ha, sị: “Mụ onwe m bụ Jehova, Chineke gị, Onye na-ezi gị ime ihe na-aba uru, Onye na-eme ka ị zọọ ije n’ụzọ ị ga-ejeso. Ọ ga-adị m nnọọ mma ma a sị na ị ṅararị ntị n’ihe nile M nyere n’iwu! udo gị ewee dịworị ka osimiri, ezi omume gị adịkwa ka mmali mmiri nile nke oké osimiri.”—Aịsaịa 48:17, 18.
3 Ndị Chineke n’oge ochie gaara eriteworo onwe ha uru a sị na ha gere ntị n’ihe ndị o nyere n’iwu na ntụziaka ya nile. Kama ịta ahụhụ ọdachi n’aka ndị Babilọn, ha gaara enwewo udo na ọganihu juru eju, nke miri emi, ma na-adịgide adịgide dị ka oké osimiri. Ọzọkwa, ihe ezi omume ndị ha mere gaara adịwo ọtụtụ dị ka mmali mmiri nile nke oké osimiri. N’otu aka ahụ, ọ bụrụ na anyị etinye izi ihe Chineke n’ọrụ ná ndụ anyị, anyị pụrụ inweta ọtụtụ abamuru ya. Olee ụfọdụ n’ime ndị a?
Ọ Na-agbanwe Ndụ
4. Olee otú izi ihe Chineke siworo na-emetụta ndụ ọtụtụ mmadụ?
4 Izi ihe Chineke anọwo na-abara ọtụtụ mmadụ uru site n’ịgbanwe ndụ ha ka o wee ka mma. Ndị na-etinye ntụziaka Jehova n’ọrụ na-ahapụ “ọrụ nile nke anụ ahụ,” dị ka agụụ ịkwa iko, ikpere arụsị, ịgwọ nsí, esemokwu, na ekworo. Kama nke ahụ, ha na-egosipụta mkpụrụ mmụọ nsọ nke ịhụnanya, ọṅụ, udo, ogologo ntachi obi, obi ọma, ịdị mma, okwukwe, ịdị nwayọọ, na njide onwe onye. (Ndị Galetia 5:19-23) Ha na-egekwa ntị ná ndụmọdụ dị ná Ndị Efesọs 4:17-24, ebe Pọl na-agba ndị kwere ekwe ibe ya ume ka ha ghara ije ije dị ka ndị mba ọzọ na-ejegharị, n’ihe efu nke uche ha, n’ọchịchịrị nke echiche uche ha, bụrụ ndị ala ọzọ n’ebe ndụ nke Chineke dị. N’ịbụ ndị obi mere etili na-edugharị, ndị na-akpa àgwà ka Kraịst ‘na-atụpụ mmadụ ochie ha dị ka ibi obi ha na mbụ si dị wee bụrụ ndị e mere ka ha dị ọhụrụ na mmụọ nke uche ha.’ Ha ‘na-eyikwasị mmadụ ọhụrụ ahụ nke e kere dị ka Chineke chọrọ n’ime ezi omume na ịdị ọcha nke eziokwu.’
5. Olee otú izi ihe Chineke si emetụta ụzọ ndị mmadụ si ejegharị?
5 Otu ezigbo abamuru nke itinye izi ihe Chineke n’ọrụ bụ na ọ na-egosi anyị ụzọ isi soro Chineke na-ejegharị. Ọ bụrụ na anyị esoro Jehova jee ije, dị ka Noa mere, anyị na-agbaso ụzọ ndụ nke Onye Ozizi anyị Kasị Ukwuu tụpụtara. (Jenesis 6:9; Aịsaịa 30:20, 21) Ndị nke mba ọzọ ‘na-ejegharị n’ihe efu nke uche ha,’ dị ka Pọl onyeozi kwuru. Leekwa ka ụfọdụ ihe odide ndị sitere n’uche ndị ahụ pụrụ isi bụrụ ihe efu! N’ịrịba ama ihe odide dị iche iche nke ndị ọzọ n’otu mgbidi ájá dị na Pompeii, otu onye ji anya ya hụ kwuru, sị: “Ọ bụ ihe dị ịtụnanya, Gị mgbidi ájá, na ọtụtụ ihe odide na-enweghị isi emebeghị ka ị dakasịa.” Ma ọ dịghị ihe ọ bụla na-enweghị isi dị ‘n’ozizi nke Onyenwe anyị’ na n’ọrụ nkwusa Alaeze ahụ nke ọ na-eme ka o kwe mee. (Ọrụ 13:12) Site n’ọrụ ahụ, e nyeworo ndị hụrụ eziokwu n’anya aka ime omume n’ụzọ ezi uche dị na ya. A na-akụziri ha otú ha ga-esi kwụsị ije ije n’ụzọ mmehie ha, n’amaghị nzube nile nke Chineke. Ha anọkwaghị n’ọchịchịrị nke echiche, a dịkwaghị akpali ha site n’obi ndị mere etili bụ́ ndị na-achụso ihe mgbaru ọsọ ndị na-abaghị uru.
6. Olee ihe jikọrọ nrubeisi anyị nye izi ihe Jehova na obi ụtọ anyị?
6 Izi ihe Chineke na-abakwara anyị uru ebe ọ na-eme ka anyị mara Jehova na ihe ndị ọ na-eme. Ihe ọmụma dị otú ahụ na-eme ka anyị garukwuo Chineke nso, welitekwuo ịhụnanya anyị nwere n’ebe ọ nọ, meekwa ka ọchịchọ anyị irubere ya isi rịkwuo elu. 1 Jọn 5:3 na-asị: “N’ihi na nke a bụ ịhụnanya Chineke, ka anyị debe ihe nile O nyere n’iwu: ihe O nyere n’iwu adịghịkwa arọ.” Anyị na-emekwa ihe kwekọrọ n’iwu nile Jisọs nyere n’ihi na anyị maara na ozizi ya sitere n’aka Chineke. (Jọn 7:16-18) Nrubeisi dị otú ahụ na-echebe anyị pụọ ná mmerụ ahụ ime mmụọ ma na-akwalite obi ụtọ anyị.
Ezi Nzube ná Ndụ
7, 8. (a) Olee otú anyị ga-esi ghọta Abụ Ọma 90:12? (b) Olee otú anyị pụrụ isi webata obi amamihe?
7 Izi ihe Jehova bara uru n’igosi anyị ụzọ isi jiri ndụ anyị mee ihe n’ụzọ nzube dị na ya. N’ezie, izi ihe Chineke na-egosi anyị ụzọ isi gụkọọ ụbọchị anyị n’ụzọ pụrụ iche. Afọ ndụ nke 70 afọ na-ekwe nkwa ihe dị ka 25,550 ụbọchị. Onye gbara 50 afọ ebiworị 18,250 n’ime ha, 7,300 ụbọchị o nwere olileanya na ha fọdụụrụ ya yiri n’ezie ihe dị ole na ole. Ọ bụ karịsịa n’oge ahụ ka ọ pụrụ ịghọta n’ụzọ zuru ezu ihe mere onye amụma bụ Mosis ji kpegara Chineke ekpere n’Abụ Ọma 90:12 sị: “Mee ka anyị mara ịgụta ụbọchị anyị, ka anyị wee mee ka obi amamihe bịa.” Ma gịnị ka Mosis bu n’uche kwuo nke ahụ?
8 Mosis ebughị n’uche na Chineke ga-ekpughe kpọmkwem ọnụ ọgụgụ ụbọchị afọ ndụ onye Israel ọ bụla ga-abụ. Dị ka Abụ Ọma nke 90, amaokwu nke 9 na 10 na-ekwu, onye amụma ahụ bụ́ onye Hibru ghọtara na afọ ndụ mmadụ pụrụ ịbụ ihe dị ka 70 ma ọ bụ 80 afọ—nke dị mkpirikpi n’ezie. Ya mere, ihe àmà na-egosi na okwu ndị ahụ nke Abụ Ọma 90:12 gosipụtara ọchịchọ Mosis nke o kpere n’ekpere ka Jehova gosi ma ọ bụ zie ya na ndị Ya iji amamihe mee ihe n’iwere ‘ụbọchị afọ ha’ n’ihe bara uru na iji ha mee ihe n’ụzọ Chineke nwapụtara. Ọ dị mma, mgbe ahụ, gịnị banyere anyị? Ànyị na-enwe ekele maka ụbọchị nke ọ bụla dị oké ọnụ ahịa? Ànyị na-eme ka obi amamihe bịa site n’ịchọ iji ụbọchị nke ọ bụla mee ihe n’ụzọ bara uru maka otuto nke Onye Ozizi anyị Kasị Ukwu, Jehova Chineke? Izi ihe Chineke na-enyere anyị aka ime kpọmkwem nke ahụ.
9. Gịnị ka a pụrụ ịtụ anya ya ma anyị mụta ịgụkọ ụbọchị anyị maka otuto Jehova?
9 Ọ bụrụ na anyị amụta ịgụta ụbọchị anyị maka otuto nke Jehova, anyị pụrụ inwe ike ịnọgide na-agụkọ ya, n’ihi na izi ihe Chineke na-enye ihe ọmụma maka ndụ ebighị ebi. “Nke a bụ ndụ ebighị ebi ahụ,” ka Jisọs kwuru, “ka ha mara Gị, Nke nanị Gị bụ ezi Chineke, marakwa Onye I zitere, bụ́ Jisọs Kraịst.” (Jọn 17:3) Otú ọ dị, ọ bụrụ na anyị enweta ihe ọmụma nile dị adị nke ụwa, ọ gaghị ewetara anyị ndụ ebighị ebi. Ma ndụ ebighị ebi pụrụ ịbụ nke anyị ma ọ bụrụ na anyị enweta ma tinye ezi ihe ọmụma nke ndị abụọ kasị mkpa n’eluigwe na ala n’ọrụ ma gosipụta okwukwe n’ezie.
10. Gịnị ka otu akwụkwọ nkà ihe ọmụma kwuru banyere mmụta akwụkwọ, oleekwa otú nke a si atụnyere abamuru dị iche iche nke izi ihe Chineke?
10 N’agbanyeghị ogologo oge hà aṅaa anyị dịworo ndụ, ka anyị cheta abamuru nke a dị ịrịba ama nke izi ihe Chineke: Ọ na-enye ndị na-etinye ya n’ọrụ ezi nzube ná ndụ. Akwụkwọ The World Book Encyclopedia na-asị: “Mmụta akwụkwọ kwesịrị inyere ndị mmadụ aka ịghọta ndị òtù ọha mmadụ bara uru. O kwesịkwara inyere ha aka iwulite ekele maka ihe nketa ọdịbendị ha ma bie ndụ na-eju afọ karị.” Izi ihe Chineke n’ezie bara uru n’inyere anyị aka ịdị ndụ na-eju afọ. Ọ na-ewulite n’ime anyị ezi ekele maka ihe nketa ime mmụọ anyị dị ka ndị Chineke. Ọ na-emekwa anyị n’ezie ka anyị bụrụ ndị òtù bara uru n’etiti ọha na eze, n’ihi na ọ na-enyere anyị aka ịrụ ọrụ dị mkpa n’imeju mkpa nke ndị mmadụ gburugburu ụwa. Gịnị mere a pụrụ iji kwuo otú ahụ?
Usoro Izi Ihe Zuru Ụwa Ọnụ
11. Olee otú Thomas Jefferson si gosipụta mkpa maka mmụta akwụkwọ kwesịrị ekwesị?
11 N’adịghị ka usoro ọ bụla ọzọ nke inye ntụziaka, izi ihe Chineke na-emeju mkpa ndị mmadụ nwere maka ịmụta ihe. Thomas Jefferson, onye ghọrọ onye isi ala nke atọ nke mba United States, rịbara ama mkpa ọ dị izi ndị mmadụ ihe. N’otu akwụkwọ ozi o dere n’August 13, 1786, bụ́ nke o degaara George Wythe, bụ́ enyi ya na onye so bịanye aka n’akwụkwọ Mkpọsa Nnwere Onwe, Jefferson dere, sị: “M chere na iwu kasị mkpa n’ụzọ dị ukwuu n’ime usoro iwu anyị nile bụ nke ahụ maka ikesa ihe ọmụma n’etiti ndị mmadụ. Ọ dịghị ntọala ọzọ doro anya a pụrụ ịtụpụta maka ichekwa nnwere onwe na obi ụtọ. . . . Nnaa, kwado mkpọsa siri ike megide amaghị ihe; guzobe ma meziwanye iwu maka izi ndị nkịtị ihe. Ka ndị ala anyị mara . . . na ụtụ isi nke a ga-atụ maka nzube [nke mmụta akwụkwọ] akarịghị otu ụzọ n’ime otu puku nke ihe a ga-akwụ ndị eze, ndị ụkọchukwu, na ndị a ma ama bụ́ ndị ga-ebili n’etiti anyị ma ọ bụrụ na anyị ahapụ ndị mmadụ n’ọnọdụ amaghị ihe.”
12. N’ihi gịnị ka a ga-eji sị na izi ihe Chineke bụ usoro nkụzi zuru ụwa ọnụ nke kasị enwe ihe ịga nke ọma ma baa uru?
12 Kama ịhapụ ndị obi ha dị n’ime ezi omume ma ọlị n’amaghị ihe, izi ihe Jehova na-enye usoro ihe omume kasị mma maka nkụzi zuru ụwa ọnụ maka abamuru ha. Mgbe Agha Ụwa nke Abụọ ka kpụ ọkụ n’ọnụ 50 afọ gara aga, Kọmitii Nhazigharị nke Mmụta Akwụkwọ na United States hụrụ mkpa ọ dị ngwa ngwa maka “nkụzi zuru ụwa ọnụ.” Mkpa ahụ ka dị, ma izi ihe Chineke agwụla nanị usoro nkụzi zuru ụwa ọnụ nke na-enwe ihe ịga nke ọma e nwere. Ọ bụkwa nke kasị baa uru n’ihi na ọ na-ewepụ ndị mmadụ n’ọnọdụ nke enweghị olileanya, na-akwalite ha n’ụzọ omume na ime mmụọ, na-azọpụta ha site ná mpako na ịkpọasị nke ụwa, ma na-enye ha ihe ọmụma maka ndụ ebighị ebi. Karịsịa ihe nile, usoro ihe omume nke a na-abara ndị nọ n’ebe ọ bụla uru site n’ịkụziri ha ijere Jehova Chineke ozi.
13. Olee otú e si na-emezu Aịsaịa 2:2-4 taa?
13 Ọtụtụ ìgwè mmadụ ndị na-aghọ ndị na-ejere Chineke ozi ugbu a na-erite uru nke izi ihe Chineke. Ha maara mkpa na-akpa ha n’ime mụọ, ha makwaara nke ọma na ụbọchị Jehova dị nso. (Matiu 5:3; 1 Ndị Tesalọnaịka 5:1-6) Kpọmkwem ugbu a, “n’ikpeazụ nke ụbọchị ndị a,” mmadụ ndị a nke mba nile na-enubata n’ugwu Jehova, ofufe ya dị ọcha. E guzobesiri ya ike, e mekwara ka ọ dị elu karịa ofufe nile na-emegide uche Chineke. (Aịsaịa 2:2-4) Ọ bụrụ na ị bụ Onyeàmà raara onwe ya nye nke Jehova, ọ̀ bụ na obi adịghị gị ụtọ iso n’ime ìgwè ndị ahụ na-abawanye ụba na-efe ya ma na-erite uru site n’izi ihe Chineke? Lee ka o si bụrụ ihe dị ịtụnanya iso n’etiti ndị na-eti mkpu, sị: “Toonụ Ja.”—Abụ Ọma 150:6.
Mmetụta Bara Uru ná Mmụọ Anyị
14. Olee uru dị n’ịgbaso ndụmọdụ Pọl nke dị ná 1 Ndị Kọrint 14:20?
14 Mmetụta dị mma ọ pụrụ inwe n’echiche na mmụọ anyị so n’ọtụtụ abamuru nke izi ihe Chineke. Ọ na-akpali anyị iche echiche n’ihe ndị ziri ezi, dị ọcha, dị mma, kwesịkwa otuto. (Ndị Filipaị 4:8) Izi ihe Jehova na-enyere anyị aka ịgbaso ndụmọdụ Pọl: “Bụrụnụ ụmụ ọhụrụ n’obi ọjọọ, ma n’uche unu bụrụnụ ndị tozuru okè.” (1 Ndị Kọrint 14:20) Ọ bụrụ na anyị etinye okwu ntụziaka nke a n’ọrụ, anyị agaghị achọ inweta ihe ọmụma nke ajọ omume. Pọl dekwara: “Ka e wepụ ihe ilu na ọnụma na iwe na iti mkpu na nkwulu nile, ha na obi ọjọọ nile, n’etiti unu.” (Ndị Efesọs 4:31) Ige ntị ná ndụmọdụ dị otú ahụ ga-enyere anyị aka izere omume rụrụ arụ na ajọ mmehie ndị ọzọ. Ọ bụ ezie na nke a pụrụ ịba uru n’ụzọ anụ ahụ na n’uche, karịsịa ọ ga-ewetara anyị ọṅụ nke ịmara na anyị na-eme ihe na-atọ Chineke ụtọ.
15. Gịnị pụrụ inyere anyị aka ịnọgide na-adị mma n’echiche?
15 Ọ bụrụ na anyị ga-anọgide na-adị mma n’echiche, otu ihe enyemaka bụ izere “mkparịta nile ọjọọ na-emebi omume ọma.” (1 Ndị Kọrint 15:33) Dị ka ndị Kraịst, anyị agaghị eso ndị na-akwa iko, na ndị na-eme omume ọjọọ ndị ọzọ na-akpakọrịta. Mgbe ahụ, dị ka ihe ezi uche dị na ya, ọ dịghị ihe ga-eme ka anyị soro ndị dị otú ahụ na-akpakọrịta site n’ịgụ banyere ha iji nweta ụtọ anụ ahụ ma ọ bụ site n’ikiri ha na telivishọn ma ọ bụ na sinima. Obi dị aghụghọ, ọ dịịrị ya mfe ịnabata ọchịchọ maka ihe ndị dị njọ, a pụkwara ịnwa ya ime ha. (Jeremaịa 17:9) Ya mere ka anyị zere ọnwụnwa ndị dị otú ahụ site n’ịrapagidesi ike n’izi ihe Chineke. Ọ pụrụ imetụta echiche “ndị na-ahụ Jehova n’anya” n’ọ̀tụ̀tụ̀ bara uru nke ukwuu nke na ha ‘na-akpọ ihe ọjọọ asị.’—Abụ Ọma 97:10.
16. Olee otú izi ihe Chineke pụrụ isi metụta mmụọ anyị na-egosipụta?
16 Pọl gwara onye ọrụ ibe ya bụ́ Timoti, sị: “Ka Onyenwe anyị nọnyere mmụọ nke gị. Ka amara dịnyere unu.” (2 Timoti 4:22) Onyeozi ahụ chọrọ ka Chineke, site n’Onyenwe anyị Jisọs Kraịst, nwapụta ike na-arụ ọrụ nke na-akwali Timoti na ndị Kraịst ndị ọzọ. Izi ihe Chineke na-enyere anyị aka igosipụta mmụọ ịhụnanya, obi ọma, na nke dị nwayọọ. (Ndị Kọlọsi 3:9-14) Leekwa ka o si dị iche na nke ọtụtụ ndị na mgbe ikpeazụ ndị a! Ha bụ ndị a fụliworo elu, ghara inwe ekele, ihe mmadụ ibe ha adịghị atọ ha ụtọ, ghara ịdị na-ekwenye ekwenye, nwee isi ike, na-ahụ ihe ụtọ n’anya, nwee ụkọ nke ezi nsọpụrụ Chineke. (2 Timoti 3:1-5) Otú ọ dị, ka anyị nọgidere na-etinye abamuru dị iche iche nke izi ihe Chineke n’ọrụ ná ndụ anyị, anyị ga-egosipụta mmụọ nke na-eme ka Chineke na ụmụ mmadụ ibe anyị hụ anyị n’anya.
Ọ Bara Uru ná Mmekọrịta Ụmụ Mmadụ
17. N’ihi gịnị ka iji umeala n’obi na-emekọ ihe ọnụ ji dị mkpa?
17 Izi ihe Jehova na-enyere anyị aka ịhụ abamuru dị iche iche nke iji obi umeala soro ndị anyị na ha na-efekọ ofufe na-emekọ ihe. (Abụ Ọma 138:6) N’adịghị ka ọtụtụ ndị taa, anyị adịghị emebi ụkpụrụ ezi omume dị iche iche kama anyị na-ekwenyere ndị ọzọ. Dị ka ihe atụ, a na-arụpụta ihe ọma dị ukwuu n’ihi na ndị nlekọta a họpụtara ahọpụta na-ekwenyere ibe ha n’oge nzukọ ndị okenye. Ndị ikom ndị a pụrụ ikwu okwu n’ụzọ dị jụụ maka ọdịmma nke eziokwu, ma ghara ikwe ka mmetụta uche kpuchie ezi echiche ma ọ bụ kpata adịghị n’otu. Ndị òtù nile nke ọgbakọ ga-erite uru site ná mmụọ nke ịdị n’otu anyị na-enwe ma ọ bụrụ na anyị nile anọgide na-etinye izi ihe Chineke n’ọrụ.—Abụ Ọma 133:1-3.
18. Izi ihe Chineke na-enyere anyị aka ile ndị kwere ekwe ibe anyị anya n’ụzọ dị aṅaa?
18 Izi ihe Chineke bakwara uru n’inyere anyị aka inwe echiche kwesịrị ekwesị banyere ndị kwere ekwe ibe anyị. Jisọs sịrị: “Ọ dịghị onye ọ bụla pụrụ ịbịakwute m, ọ bụrụ na Nna Nke zitere m adọghị ya.” (Jọn 6:44) Eri 1919 karịsịa, Jehova emewo ka ndị na-ejere ya ozi kpọsaa ikpe ọmụma ya, e mewo ka usoro ụwa Setan mee mkpatụ, kwagharịakwa ya site n’ịdọ aka ná ntị nke a zuru ụwa ọnụ. N’otu oge ahụ, Chineke adọtawo ndị na-atụ egwu Chineke—“ihe a na-achọsi ike”—ka ha kewapụ onwe ha site ná mba nile ma soro ndị Kraịst e tere mmanụ kere òkè n’ime ka ụlọ ofufe Jehova jupụta n’ebube. (Hagaị 2:7) N’ezie, anyị kwesịrị ile ndị a na-achọsi ike dị otú ahụ anya bụ́ ndị Chineke dọrọwooro dị ka ndị mkpakọrịta a hụrụ n’anya.
19. Gịnị ka izi ihe Chineke na-ekpughe banyere idozi ihe isi ike onwe onye n’etiti anyị na ndị Kraịst ibe anyị?
19 N’ihi na anyị nile bụ ndị na-ezughị okè, n’ezie, ihe agaghị na-agazicha mgbe nile. Mgbe Pọl na-achọ ịmalite njem ozi ala ọzọ ya nke abụọ, Banabas kpebisiri ike ịkpọrọ Mak. Pọl ekweghị n’ihi na Mak “si na Pamfilia hapụ ha laghachi, ghara isokwa ha jee ọrụ ha.” Mgbe ahụ, “oké iwe” wee dapụta. Banabas kpọọrọ Mak gaa Saịprọs, ebe Pọl kwere ka Saịlas sonyere ya gabiga Siria na Silisia. (Ọrụ 15:36-41) E mesịa, ihe àmà gosiri na e doziri esemokwu a, n’ihi na Mak nọnyeere Pọl na Rom, onyeozi ahụ kwukwara ezi ihe banyere ya. (Ndị Kọlọsi 4:10) Otu abamuru nke izi ihe Chineke bụ na ọ na-egosi anyị ụzọ isi dozie ihe isi ike onwe onye n’etiti ndị Kraịst site n’ịgbaso ndụmọdụ dị ka nke Jisọs nyere na Matiu 5:23, 24 na Matiu 18:15-17.
Ọ Na-aba Uru, Na-enwekwa Mmeri Mgbe Nile
20, 21. Ntụle anyị nke izi ihe Chineke kwesịrị ịkwali anyị ime gịnị?
20 Ọbụna site ná ntụle anyị dị mkpirikpi nke abamuru na mmeri ụfọdụ nke izi ihe Chineke, ihe ịrụ ụka adịghị ya na anyị nile pụrụ ịhụ mkpa nke ịnọgidesi ike na-etinye ya n’ọrụ ná ndụ anyị. Mgbe ahụ, site ná mmụọ ikpe ekpere, ka anyị nọgide na-amụta ihe n’ọnụ Onye Ozizi anyị Kasị Ukwuu. N’oge na-adịghị anya, izi ihe Chineke ga-enwe mmeri dị ka ọ na-enwebeghị mgbe ọ bụla. Ọ ga-enwe mmeri mgbe ndị nwere ọgụgụ isi nke ụwa kuruwooro ume ikpeazụ ha. (Tụlee 1 Ndị Kọrint 1:19.) Ọzọkwa, ka ọtụtụ nde mmadụ na-amụta ma na-eme uche Chineke, ihe ọmụma Jehova ga-ejupụta ụwa dị ka mmiri si ekpuchi oké osimiri. (Aịsaịa 11:9) Lee ka nke a ga-esi baara ihe a kpọrọ mmadụ na-erube isi uru dị ukwuu ma wepụ Jehova n’ụta dị ka Ọkaaka Eluigwe na Ala!
21 Izi ihe nke Jehova ga na-aba uru, na-enwekwa mmeri mgbe nile. Ị̀ ga-anọgide na-erite uru site na ya dị ka nwa akwụkwọ na-amụsi Akwụkwọ Ọgụgụ ukwu nke Chineke ike? Ị̀ na-adị ndụ kwekọrọ na Bible ma soro ndị ọzọ na-ekerịta eziokwu ya nile? Ọ bụrụ otú ahụ, ị pụrụ ịtụ anya ịhụ mmeri zuru ezu nke izi ihe Chineke, maka otuto nke Onye Ozizi anyị Kasị Ukwuu, bụ́ Eze Onyenwe Anyị Jehova.
Gịnị ka Ị Mụtaworo?
◻ Olee mmetụta izi ihe Chineke pụrụ inwe ná ndụ anyị?
◻ Olee otú izi ihe Jehova si egbo mkpa mmụta akwụkwọ?
◻ Mmetụta dị aṅaa bara uru ka izi ihe Chineke pụrụ inwe n’echiche na àgwà anyị?
◻ Olee otú izi ihe Chineke si abụ ihe bara uru n’ihe banyere mmekọrịta ụmụ mmadụ?
[Foto dị na peeji nke 15]
Izi ihe Chineke na-egosi anyị ụzọ isi soro Chineke na-ejegharị, dị ka Noa mere
[Foto dị na peeji nke 17]
Ndị nke mba nile na-enubata n’ugwu Jehova