Gịnị Bụ Eziokwu Banyere Betlehem Na Krismas?
“MGBE anyị chere echiche banyere Ihe Omimi nke Betlehem, anyị apụghị igbochi ajụjụ na ihe ịrụ ụka dị iche iche ibilite n’ime uche anyị.”—Bethlehem, nke Maria Teresa Petrozzi dere.
Ị pụrụ ịjụ, sị, ‘N’ihi gịnị ka ajụjụ na ihe ịrụ ụka ga-eji bilite?’ E kwuwerị, nkwenkwe dị iche iche metụtara Krismas, na ebe ndị ahụ e jikọtara ha na nkwenkwe ndị a dabeere n’ihe mere eme. Ka hà dabeere n’ihe mere eme n’ezie?
Olee Mgbe A Mụrụ Ya?
N’ihe banyere ụbọchị a mụrụ Jisọs, Maria Teresa Petrozzi jụrụ, sị: “Òle mgbe kpọmkwem ka a mụrụ Onye Mgbapụta ahụ? Ọ ga-amasị anyị ịmara, ọ bụghị nanị afọ ahụ, kamakwa ọnwa, ụbọchị, na oge hour a mụrụ ya. Anyị enweghị ike ikwu ihe ọ bụla kpọmkwem.” Akwụkwọ bụ New Catholic Encyclopedia na-akwado nke a, sị: “A pụrụ ịgbakọta ụbọchị ọmụmụ Jisọs Kraịst nanị site n’ịgụkọ oge ndị dịdebere nso mgbe o mere.” O kwuru banyere ụbọchị ahụ a na-ekwu na a mụrụ kraịst, sị: “Ụbọchị ahụ bụ December 25 ekwekọghị n’ọmụmụ Kraịst, kama o kwekọrọ n’oge oriri nke Natalis Solis Invicti, bụ́ ememe ndị Rom ahụ e ji efe anyanwụ ofufe nke a na-eme n’oge ahụ ehihie kasị dịrị mkpirikpi.”
Ya mere, ị pụrụ ịjụ, sị ‘Ọ bụrụ na a mụghị Jisọs na December 25, olee mgbe a mụrụ ya?’ Site na Matiu isi 26 na 27, anyị na-aghọta na Jisọs nwụrụ n’oge Ememe Ngabiga ndị Juu, nke malitere n’April 1, 33 O.A. Ọzọkwa, Luk 3: 21-23 na-eme ka anyị mara na Jisọs dị ihe dị ka 30 afọ mgbe ọ malitere ije ozi ya. Ebe ọ bụ na ije ozi elu ala ya dịruru afọ atọ na ọkara, ọ dị ihe dị ka 33 1/2 afọ n’oge ọnwụ ya. Kraịst gaara agbaworị 34 afọ zuru ezu n’ọnwa isii ọzọ, nke ga-abụworị n’ihe dị ka October 1. Ọ bụrụ na anyị agụghachi azụ iji mata mgbe a mụrụ Jisọs, anyị na-eru, ọ bụghị December 25 ma ọ bụ January 6, kama ọ bụ ihe dị ka October 1 nke afọ 2 T.O.A.
O kwesịkwara ịrịba ama na n’oge ọnwa December, a na-enwe oké oyi, mmiri ozuzo ndị jụrụ oyi nke ukwuu, na mgbe ụfọdụkwa snow, na Betlehem na gburugburu ya. A dịghị ahụ ndị na-azụ atụrụ ka ha chị ìgwè ewu na atụrụ ha nọrọ n’èzí n’anyasị n’oge ahụ. Ihu eluigwe amaliteghị ọhụrụ ịdị otú ahụ. Akwụkwọ nsọ na-akọwa na eze Judia bụ Jehoịakim “na-anọdụ n’ụlọ mgbe oyi n’ọnwa nke iteghete [Kislev, bụ́ nke kwekọrọ na November-December]: ọkụ na-enwukwa n’ite ọkụ nke dị n’ihu ya.” (Jeremaịa 36:22) Ọ dị ya mkpa inweta okpomọkụ ahụ ka ahụ wee dị ya ọkụ. Ọzọkwa, n’Ezra 10: 9, 13, anyị na-ahụ ihe àmà doro anya nke na-egosi na ọnwa Kislev bụ ‘mgbe oké mmiri ozuzo, o kweghịkwa omume iguzo n’èzí.’ Ihe a nile na-egosi na ọnọdụ ihu igwe dị na Betlehem n’oge December ekwekọghị ná nkọwa Bible nyere banyere ihe omume ndị e jikọtara ha na ọmụmụ Jisọs Kraịst.—Luk 2:8-11.
Ọ̀ Bụ n’Òle Ebe?
Olee ụzọ kwesịrị ekwesị a ga-esi lee ebe ahụ nke so kpalie agha Crimea ahụ (1853-1856) anya, bụ́ ‘agha mwụfu ọbara’ nke riri isi ihe karịrị otu narị puku ndị agha France? Ebe ahụ ọ̀ bụ n’ezie ebe a nọrọ mụọ Jisọs?
Iji malite, Bible n’onwe ya ekwughị kpọmkwem ebe a nọrọ mụọ Jisọs. Matiu na Luk kwadoro na ọmụmụ Jisọs mezuru amụma ahụ metụtara Mesaịa nke dị na Maịka 5:2, nke buworo ụzọ kwuo na ‘onye ahụ nke ga-abụ onye na-achị achị n’Israel, onye ọpụpụ ya nile sitere na mgbe ochie,’ ga-abịa site na Betlehem. (Matiu 2:1, 5; Luk 2:4) Ihe ndekọ Oziọma ndị ahụ kwuru nanị ihe ndị dị mkpa, nke bụ na a mụrụ Jisọs na Betlehem, dịkwa ka Luk kwuru, na e ji ákwà okike fụchie ya, nyibe ya n’ihe a na-etinye nri anụ ụlọ.—Luk 2:1.
N’ihi gịnị ka ndị dere Oziọma ndị ahụ na-enyeghị nkọwa ndị ọzọ? Maria Teresa Petrozzi kwuru, sị: “Ndị Oziọma ndị ahụ lefuuru nkọwa ndị a anya, nke ihe àmà gosiri na ọ bụ n’ihi na ha lere ha anya dị ka ihe ndị na-abaghị uru.” N’eziokwu, ọ pụtara ìhè na Jisọs n’onwe ya eleghị nkọwa ndị a metụtara ọmụmụ ya anya dị ka ihe bara uru n’ụzọ pụrụ iche, n’ihi na ọ dịghị mgbe ọ bụla e hotara na ọ kpọtụrụ ụbọchị ọmụmụ ma ọ bụ kpọmkwem ebe a nọrọ mụọ ya aha. Ọ bụ ezie na a mụrụ ya na Betlehem, Jisọs eleghị ebe ahụ anya dị ka obodo ya, ma e zoro aka n’ógbè nke Galili dị ka “ala nke aka ya.”—Mak 6:1, 3, 4; Matiu 2:4, 5; 13:54.
Ịgụ Jọn 7:40-42 na-egosi na ụmụ mmadụ n’ozuzu ha amaghị ebe a mụrụ ya, na-eche na a mụrụ ya na Galili: “Ụfọdụ na-asị, Gịnị, ọ̀ ga-abụ na Galili ka Kraịst anyị si bịa?” N’ịdabere n’ihe e dere na Jọn 7:41, akwụkwọ bụ The Church of the Nativity, Bethlehem kwubiri, sị: “Eziokwu ahụ n’onwe ya nke bụ na mkparịta ụka ndị dị otú ahụ bilitere adịghị akagbu eziokwu ahụ nke bụ na a mụrụ Kraịst na Betlehem; ma ọ dịghị ihe ọzọ, ọ na-egosi na ọtụtụ n’ime ndị ya na ha kpakọrịtara amaghị ihe ọ bụla banyere ya.”
O doro anya na n’oge Jisọs nọ ndụ n’elu ala, ọ kpọsaghị nkọwa dị iche iche banyere ọmụmụ ya. E kwusighị okwu ike banyere ebe a nọrọ mụọ ya. Ya mere, gịnị bụ ihe ndabere nke ikwere na Ọ́gbà Ọmụmụ Nwa ahụ bụ kpọmkwem ebe Josef kpọtara Meri ka ọ nọrọ mụọ nwa?
Petrozzi kwetara n’eziokwu, sị: “O kweghị omume ịmara kpọmkwem ma ọ́gbà ahụ ọ̀ bụ otu n’ime ọtụtụ ọ́gbà ndị a na-ejighị aka mee ndị dị na gburugburu Betlehem, ma ọ bụ na ọ bụ ọ́gbà buru ibu nke e ji mee ihe dị ka ebe a na-edebe anụ ụlọ ma ọ bụ ụlọ ndị ije. Otú ọ dị, omenala nke malitere laa azụ n’ọkara mbụ nke narị afọ nke abụọ, pụtara nnọọ ìhè; ọ bụ ọ́gbà ebe a na-edebe anụ ụlọ.”—Ọ bụ anyị dere okwu ahụ n’ụdị dị iche.
Omenala Efu
Maria Teresa Petrozzi na R. W. Hamilton, tinyere ọtụtụ ndị mmụta ndị ọzọ nke akụkọ ihe mere eme banyere Betlehem, na-egosi na Justin Martyr, nke narị afọ nke abụọ O.A., bụ onye mbụ kwuru na a nọrọ n’ime ọ́gbà wee mụọ Jisọs, n’ekwughị nke ọ bụ kpọmkwem. Hamilton kwubiri banyere okwu Justin Martyr, sị: “Nke a bụ nhota nkịtị, ichekwa na St. Justin bu otu ọ́gbà nke ọ bụla n’uche kpọmkwem, karịsịakwa, na ọ na-ezo aka na nke ahụ e weere ugbu a dị ka Ọ́gbà nke Ọmụmụ Nwa ahụ, ga-abụ isetịbiga ihe àmà nke dị n’otu mkpụrụ okwu ókè.”
N’otu nkọwa ala ala peji, Hamilton dere, sị: “Otu ihe ndekọ banyere Ọmụmụ Nwa ahụ nke dị n’akwụkwọ apocrypha ahụ bụ ‘Book of James’ ma ọ bụ ‘Protevangelium’, bụ́ nke e dere n’otu oge ahụ, na-ewebatakwa okwu banyere otu ọ́gbà, ma ọ kọwara na ọ dị n’etiti ụzọ ahụ na-eduje Betlehem. Ruo ókè o nwere abamuru ọ bụla n’akụkọ ihe mere eme, akụkọ ahụ na-ezo aka na e jikọbeghị omenala ahụ n’ebe otu ebe ọ bụla dị, o dokwara anya na ọ bụghị n’Ọ́gbà nke Ọmụmụ Nwa ahụ.”
Ndị ahụ na-ede ihe banyere okpukpe n’ime narị afọ nke atọ, bụ́ Origen na Eusebius jikọrọ omenala ahụ dị ka a maara ya n’oge ahụ, na otu ebe kpọmkwem. Hamilton tụgharịrị uche, sị: “Ozugbo e jikọrọ akụkọ ahụ na otu ebe, o yiri ka ọ gaghị ahapụ ebe ahụ ọzọ; ọ pụkwara izi ezi ikwubi na ọ́gbà ahụ nke a na-egosi ndị jere ileta ebe ahụ n’oge na-adịghị anya mgbe afọ A.D. 200 gasịrị yiri nke ahụ dị ugbu a n’Ọ̀gbà nke Ọmụmụ Nwa ahụ.”
W. H. Bartlett, n’akwụkwọ ya bụ Walks About the City and Environs of Jerusalem (1842), kwuru echiche ya banyere ọ́gbà nke a, sị: “Ọ bụ ezie na omenala ahụ nke na-ekwu na ebe a bụ ebe a nọrọ mụọ Onye Nzọpụta anyị, bụ nke dịworo nnọọ eri ogologo oge, na-abụ nke St. Jerome hotara, bụ́ onye dịrị ndụ ma nwụọkwa n’otu ọnụ ụlọ nke dị ebe ahụ nso, ebe ahụ dị iche n’ihe a pụrụ ịsị na o mere, dịkwa ka ọ pụrụ ime mgbe ụfọdụ na a na-eji ọ́gbà ukwu dị iche iche eme ihe dị ka ebe a na-edebe anụ ụlọ na Palestine, nke a dị omimi nke ukwuu n’okpuru ala karịa ka ọ ga-esi kwe omume iji ya mee ihe maka nzube ahụ; tụkwasị na nke a, mgbe anyị tụlere àgwà ndị mọnk nke ikwu na ọ bụ n’ọ́gbà dị iche iche ka ihe ndị pụtara ìhè n’akwụkwọ nsọ nọrọ mee, ma eleghị anya n’ihi na ebe ndị ahụ na-akpali akpali n’ile ha anya, o yiri nnọọ ka obi abụọ a na-enwe banyere ebe ahụ ọ̀ bụ nke ihe ịrụ ụka ọ bụla ọzọ na-adịghị ya.”
Gịnị ka anyị pụrụ ikwubi site n’ihe àmà sitere n’akụkọ ihe mere eme e nwere, karịsịakwa, site n’eziokwu Akwụkwọ nsọ ahụ nke bụ na ma Jisọs ma ndị na-eso ụzọ ya adịghị ụzọ ọ bụla ha si gosi na ebe a mụrụ ya bụ ihe dị mkpa? Ọ pụtara ìhè na mgbe Eze Nwanyị bụ Helena, bụ́ nne nke Constantine Onye Ukwu ahụ, kwuru ebe a ga-ewu Chọọchị nke Ọmụmụ Nwa ahụ n’afọ 326 O.A., o mere nke ahụ ná ndabere nke ihe Hamilton zoro aka na ya dị ka ‘njikọ nke sitere n’omenala dịworo ogologo oge.’ Ọ bụghị n’ihe ndabere nke ihe àmà akụkọ ihe mere eme ma ọ bụ nke Bible.
Nke a na-eduje ná nkwubi okwu ahụ nke bụ na a maghị kpọmkwem ebe a nọrọ mụọ Kraịst. N’ihi ya, ọ̀ bụ ihe ezi uche dị n’ime ya na ndị kwere ekwe ga na-aga njem ofufe n’ebe ndị dị ka Ọ́gbà nke Ọmụmụ Nwa ahụ ma na-enye ha ofufe? N’ezie, ọ bụrụ na a chọrọ ihe dị otú ahụ n’aka ndị Kraịst, ọ̀ ga-abụ na Jisọs n’onwe ya agaraghị agwa ndị na-eso ụzọ ya banyere ibu ọrụ ahụ ma ọ bụ ọbụna ụdị ọchịchọ ahụ nke o nwere? Ọ̀ bụ na a garaghị edekọ ya n’ime Okwu Chineke, bụ́ Bible, ka ụwa nke ihe a kpọrọ mmadụ wee gụọ? Ebe ọ bụ na ihe àmà ndị dị otú ahụ adịghị ma ọlị n’ime Akwụkwọ Nsọ, anyị ga-eme nke ọma ịjụta ihe Jisọs gụrụ n’ihe ruru eru ime ememe ncheta banyere ya.
N’agbanyeghị otú anyị chọruru, nanị ihe omume anyị ga-ahụ nke a chọrọ ka ndị na-eso ụzọ Jisọs na-eme ememe ya n’ime ọgbọ nile gaworo aga bụ ọnwụ ọchụchụ àjà ya. Ọ nwụrụ n’oge opupu ihe ubi, nwa mgbe nta mgbe o nwesịrị oriri Ememe Ngabiga ikpeazụ nke ya na ndị na-eso ụzọ ya so nwee. N’oge ahụ, ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya kwesịrị ntụkwasị obi ka ha rie nri nke bụ ihe nnọchianya, na-eji achịcha na-ekoghị eko, nke yiri matzoth, na mmanya na-acha uhie uhie, mee ihe. N’ihe banyere obere ememe nke a, nke e mere nke mbụ ya n’April 1, 33 O.A., o nyere iwu, sị: “Na-emenụ nke a ka unu wee na-echeta m.”—Luk 22:19, 20.
N’irube isi n’iwu Akwụkwọ nsọ nke a, nke Jisọs Kraịst n’onwe ya nyere, Ndịàmà Jehova gburugburu ụwa na-eme Ememe Ncheta nke ọnwụ ọchụchụ àjà Kraịst kwa afọ. Ha adịghị enwe nnọkọ ndị Kraịst nke a n’otu ebe pụrụ iche n’otu ọnụ ụlọ dị n’ụlọ elu na Jerusalem, n’ihi na Jisọs ekwughị na a ghaghị ime nke ahụ. Ma, gburugburu ụwa, ha na-ezukọ n’Ụlọ Nzukọ Alaeze ha dị iche iche na n’ebe nzukọ ndị ọzọ kwesịrị ekwesị dị n’ógbè ha. Mgbe ọzọ a ga-eme ememe ahụ ga-abụ na March 30, 1991, mgbe anyanwụ dasịrị. A na-akpọ gị òkù ịbịa n’Ụlọ Nzukọ Alaeze Ndịàmà Jehova nke kasị dịrị ebe obibi gị nso.
Iji wee bịa maka ememe nke a dị mkpa n’irubere ihe Jisọs nyere n’iwu isi, ọ dịghị mkpa na ị ga-aga njem ijeru Jerusalem ma ọ bụ na Betlehem. Ma Jisọs ma ndị na-eso ụzọ ya adịghị nke were ebe dị iche iche dị ka ebe ndị dị mkpa a ga-elekwasị anya maka ofufe ndị Kraịst. N’ụzọ megidere nke ahụ, Jisọs gwara otu nwanyị onye Sameria, onye ebe bụ isi ọ na-efe ofufe bụ na Geraịzim, bụ́ otu ugwu dị na Sameria, n’ebe ugwu Jerusalem, sị: “Nwanyị, kwere m, oge hour na-abịa, mgbe unu na-agaghị akpọ isiala nye Nna m, ma ọ bụ n’ugwu a, ma ọ bụ na Jerusalem. Ma oge hour na-abịa, ugbu a ka ọ dịkwa, mgbe ndị na-akpọ isiala n’ezie ga-akpọ isiala nye Nna m n’ime mmụọ na eziokwu: n’ihi na ndị dị otú ahụ ka Nna m na-achọkwa ka ha bụrụ ndị na-akpọ isiala nye ya.”—Jọn 4:21, 23.
Ndị na-efe Nna ahụ n’ime mmụọ na eziokwu adịghị elekwasị ebe ndị pụrụ iche anya, dị ka Betlehem, ma ọ bụ n’ihe dị iche iche, dị ka ihe oyiyi, n’ofufe ha. Pọl onyeozi sịrị: “Mgbe anyị nọ n’ụlọ n’ahụ anyị, anyị anọghị n’ụlọ n’ebe Onyenwe anyị nọ: n’ihi na anyị sitere n’okwukwe na-ejegharị, ọ bụghị n’ọhụhụ ụzọ.”—2 Ndị Kọrint 5:6, 7.
Otú ọ dị, ị ka pụrụ ịtụgharị uche, sị, olee otú mmadụ pụrụ isi fee Chineke n’ụzọ ọ na-anara nke ọma? Mgbe ọzọ otu n’ime Ndịàmà Jehova bịara n’ụlọ gị, biko jụọ ya.
[Foto dị na peeji nke 5]
N’oge oyi, snow pụrụ ikpuchi elu ala ebe dị nso Betlehem. Ndị na-azụ atụrụ na ìgwè atụrụ ha hà ga-ehi n’èzí n’oge ahụ?
[Ebe E Si Nweta Foto]
Pictorial Archive (Near Eastern History) Est.
[Foto ndị dị na peeji nke 7]
Chọọchị nke Ọmụmụ Nwa ahụ na Betlehem na ọ́gbà ya nke dị n’okpuru ala
[Ebe E Si Nweta Foto]
Pictorial Archive (Near Eastern History) Est.
[Ebe E Si Nweta Foto]
Garo Nalbandian