Betlehem—Ọ̀ Bụ Ihe Àmà nke Ịdị n’Otu na Ịhụnanya Ndị Kraịst?
“BETLEHEM . . . bụ ihe àmà nke ịhụnanya na-adịghị agwụ agwụ, ọ bụ ihe mmụta n’inwe obi umeala.”—Maria Teresa Petrozzi, bụ́ onye dere akwụkwọ bụ Bethlehem.
Betlehem ọ̀ pụtara ihe dị otú ahụ nye gị? Ma eleghị anya ọ dị otú ahụ, ebe ọ bụ na ọtụtụ narị nde ụmụ mmadụ ndị nwere obi eziokwu, ndị hụrụ udo n’anya gburugburu ụwa ji oké nsọpụrụ na-elekwasị Betlehem anya, karịsịa n’oge Krismas. Ha bu n’uche na obodo nta nke a nke dị n’Etiti Ebe Ọwụwa Anyanwụ Ụwa bụ ebe a nọ mụọ “Onye isi Udo” ahụ bụ Jisọs Kraịst. Ruo ọtụtụ narị afọ, ndị njem okpukpe abịakọtawo n’ebe a ije leta otu n’ime ebe ndị kasị nsọ nke Krisendọm, ma eleghịkwa anya, ije nye ya ofufe. Ebe ahụ bụ Ọ́gbà nke Ọmụmụ Nwa ahụ, bụ́ ebe a maara n’omenala dị ka ebe a nọrọ mụọ Jisọs Kraịst. Ọ dị n’ime nnukwute ihe owuwu ahụ a ma ama n’akụkọ ihe mere eme, nke a na-akpọ Chọọchị nke Omụmụ Nwa ahụ.—Aịsaịa 9:6; Matiu 2:1.
Otú ọ dị, n’ihe mere eme n’ezie, ebe ndị a a ma ama n’omenala dị ka ebe ndị dị nsọ hà ejewo ozi dị ka ebe ndị bụ isi maka ịdị n’otu, ịhụnanya, na inwe obi umeala nke ndị Kraịst? Gịnị ka ị na-ekwubi site n’ihe ndị a sonị?
Onye edemede bụ onye Katọlik, bụ́ Maria Teresa Petrozzi dere n’akwụkwọ bụ Bethlehem, sị: “Malite na narị afọ nke 16, [Betlehem] ghọrọ ebe a lụrụ agha ndị ahụ a wụfuru ọbara dị ukwuu n’ime ha n’etiti ndị Latin [ndị Roman Katọlik] na ndị Grik [ndị kweere n’okpukpe Grik Orthodox] maka ịbụ ndị ga-achị chọọchị nke Ọmụmụ Nwa ahụ.” ‘Agha mwụfu ọbara’ ndị a a lụrụ ugboro ugboro maka ike ọchịchị na-elekwasịkarị anya na kpakpando ahụ e ji ọlaọcha mee nke dị n’ime Ọ́gbà nke Ọmụmụ Nwa ahụ, bụ́ nke dị n’okpuru ala, n’okpuru Chọọchị nke Ọmụmụ Nwa ahụ. E kwuru na kpakpando nke a kara akara kpọmkwem ebe a nọrọ mụọ Kraịst. R. W. Hamilton kọrọ n’akwụkwọ ya bụ The Church of the Nativity, Bethlehem, sị: “Ọ bụ ihe a maara nke ọma na abụọ n’ime ajụjụ ndị dị n’esemokwu ahụ dịrị n’etiti France na Russia, bụ́ nke dujere n’agha Crimea ahụ metụtara nzọrọ ahụ òtù dị iche iche na-azọrọ na ọ bụ ha ji mkpịsị ugodi nke ọnụ ụzọ ndị bụ isi nke ụlọ ukwu ahụ na nke ọ́gbà okpuru ala ahụ [Ọ́gbà nke Ọmụmụ Nwa ahụ], nakwa nzuru a na-apụghị ịkọwa akọwa e zuuru kpakpando ọlaọcha ahụ n’otu anyasị na 1847, bụ́ nke e ji asụsụ Latin dekwasị ihe n’elu ya, nke e tinyekwara n’ime otu ibe marble nke dị n’okpuru ọlta nke Ebe Ọmụmụ Nwa ahụ.”
N’ihi esemokwu okpukpe dị iche iche nọgidere na-eserịta n’ime narị afọ nile banyere ikike ha nwere n’ebe ndị a, “ugbu a, e jiwo nlezianya kọwaa ikike òtù nke ọ bụla nwere. Dị ka ihe atụ, n’ime 53 oriọna dị n’ime ọ́gbà ahụ, e kwere ka ndị òtù Francis nwere 19. Ọ bụ ndị Grik nwe Ọlta nke Ebe Ọmụmụ Nwa ahụ, a naghị ekwekwa ka ndị Latin nwee ofufe nrù ha n’ebe ahụ.”—Historical Sites in Israel.
N’oge Krismas, ọ bụrụ na ọnọdụ ndọrọ ndọrọ ọchịchị enye ohere, òtù okpukpe Krisendọm nke ọ bụla nọ n’ebe ahụ na-edo Mas Krismas nke ya, na-akwụkwa n’ahịrị gabiga Betlehem. Na December 24 na 25, ndị Latin na-akwụ n’ahịrị, dookwa Mas etiti abali n’ime Chọọchị Senti Catherine, bụ́ nke dị n’akụkụ Chọọchị Ọmụmụ Nwa ahụ, bụ́ nke ndị chọọchị Orthodox nke Grik na nke Armenia na-ekerịta ugbu a. Na January 6, chọọchị Orthodox nke ndị Grik, ndị Siria, na nke ndị Copt, na-edo Mas Krismas nke ha. Na January 18, a na-edo Mas Krismas nke Orthodox nke ndị Armenia, ha na-akwụ n’ahịrị nke ha na January 19.
Ihe ndị a hà na-egosi na ebe ndị ahụ omenala were dị ka ebe dị nsọ na Betlehem bụ ‘ihe àmà nke ịhụnanya na-adịghị agwụ agwụ, ihe mmụta n’inwe obi umeala’? Ọzọkwa, ọ̀ na-egosipụta eziokwu banyere ọnọdụ ndị metụtara ọmụmụ Jisọs? Dị ka ihe atụ, olee mgbe a mụrụ ya? Ọ̀ bụ n’ezie n’ime ihe ahụ bụ Ọ́gbà Ọmụmụ Nwa ugbu a ka nọrọ mụọ ya? Ma gị ma onye ọ bụla ọzọ, ùnu kwesịkwara ife ebe a nọrọ mụọ ya ofufe?
[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji nke 3]
Pictorial Archive (Near Eastern History) Est.