Ha Mere Uche Jehova
Nwoke Kasị Ukwuu Ejee Ozi Dị Ala
JISỌS maara na awa ikpeazụ ya na ndị na-eso ụzọ ya ga-anọkọ ga-adị oké ọnụ ahịa. N’oge na-adịghị anya, a ga-ejide ya, a ga-elekwa okwukwe ya ule karịa mgbe ọ bụla ọzọ. Jisọs makwaara na ngọzi dị ukwuu dị n’ihu. N’oge na-adịghị anya a ga-eweli ya elu ịnọ n’aka nri Chineke ma nye ya “aha ahụ nke karịrị aha nile ọ bụla elu; ka ọ ga-abụ n’aha Jisọs ka ikpere nile wee gbuo n’ala, nke ihe nile dị n’eluigwe na ihe nile dị n’elu ụwa na ihe nile dị n’okpuru ala.”—Ndị Filipaị 2:9, 10.
Ma, nchegbu n’ihi ọnwụ ya dị nso ma ọ bụ ọchịchọ siri ike maka ụgwọ ọrụ e kwere ya ná nkwa adọpụghị uche Jisọs n’ebe mkpa nke ndị ozi ya dị. Ọ “hụrụ ha n’anya ruo ọgwụgwụ,” ka Jọn mesịrị dee n’Oziọma ya. (Jọn 13:1) N’awa ikpeazụ ndị a kwa dị mkpa ná ndụ ya dị ka mmadụ zuru okè, Jisọs kụziere ndị ozi ya otu ihe dị mkpa.
Ihe Mmụta n’Ịdị Umeala n’Obi
Ndị ozi ahụ so Jisọs nọrọ n’ọnụ ụlọ dị n’ụlọ elu na Jerusalem iji mee Ememe Ngabiga. Na mbụ, Jisọs anụwo ka ha na-arụrịta ụka banyere onye kasị ukwuu n’etiti ha. (Matiu 18:1; Mak 9:33, 34) O soworo ha kwurịta okwu a ma gbalịa ịgbazi echiche ha. (Luk 9:46) Otú ọ dị, ugbu a, Jisọs mesiri ihe mmụta ndị ahụ ike na-eji ụzọ ọzọ eme ihe. Ọ họọrọ ọ bụghị nanị ịgwa ha okwu banyere ịdị umeala n’obi kama igosipụta ya.
Jisọs “[biliri] ná nri anyasị, wụsa uwe Ya,” ka Jọn na-ede. “Chịrị ákwà a na-eji [ehicha] ahụ, wee kee Onwe ya n’úkwù. Mgbe ahụ O tinye mmiri n’ihe a na-eji [asa] ahụ, wee malite ịsa ụkwụ ndị na-eso ụzọ Ya, na iji ákwà a na-eji [ehicha] ahụ nke O kererịị n’úkwù hichaa ụkwụ ha.”—Jọn 13:4, 5.
N’ọnọdụ ihu igwe na-ekpo ọkụ nke Etiti Ebe Ọwụwa Anyanwụ Ụwa n’oge ochie, ndị mmadụ na-eyikarị akpụkpọ ụkwụ elu ha ghere oghe ka ha na-aga n’ụzọ úzúzù jupụtara. Ozugbo ha banyere n’ụlọ onye ogbenye, onye nwe ụlọ ga-ekele ha, bụ́ onye ga-ebute efere na mmiri ka ha wee nwee ike ịsa ụkwụ ha. N’ụlọ ndị bara ọgaranya karị, ohu ga-asa ha ụkwụ.—Ndị Ikpe 19:21; 1 Samuel 25:40-42.
N’ọnụ ụlọ dị n’ụlọ elu ahụ, Jisọs na ndị ozi ya abụghị ndị ọbịa n’ụlọ mmadụ. Ọ dịghị onye nwe ụlọ nọ ya ga-ebute efere, ọ dịghịkwa ndị ohu nọ ya ịsa ha ụkwụ. Mgbe Jisọs malitere ịsa ha ụkwụ, ihere mere ndị ozi ahụ. N’ebe a Onye kasị ukwuu n’etiti ha rụrụ ọrụ kasị ala!
Na mbụ, Pita ekweghị ka Jisọs saa ụkwụ ya. Ma Jisọs gwara ya, sị: “Ọ bụrụ na asaghị m gị, Mụ na gị enweghị òkè ọ bụla.” Mgbe Jisọs sasịrị ụkwụ ndị ozi ahụ nile, o kwuru, sị: “Ùnu maara ihe M mewooro unu? Unu onwe unu na-akpọ m, Onye ozizi, na, Onyenwe anyị: unu na-ekwukwa nke ọma; n’ihi na ọ bụ otú M dị. Ya mere, ọ bụrụ na Mụ onwe m, bụ́ Onyenwe unu na Onye ozizi unu, sara ụkwụ unu, unu onwe unu na-ejikwa ụgwọ ịsarịta ụkwụ ibe unu. N’ihi na enyewo m unu ihe nṅomi, ka unu onwe unu wee na-emekwa dị ka Mụ onwe m meere unu.”—Jọn 13:6-15.
Jisọs adịghị eguzobe usoro ịsa ụkwụ. Kama nke ahụ, ọ na-enyere ndị ozi ya aka inwe àgwà ọhụrụ—nke ịdị umeala n’obi na ịdị njikere ịrụrụ ụmụnna ha ọrụ ndị kasị ala. Dị ka ihe àmà na-egosi, ha ghọtara isi ihe ahụ. Tụlee ihe mere ọtụtụ afọ n’ihu mgbe okwu obibi úgwù bilitere. Ọ bụ ezie na e nwere “oké nrụrịta ụka” (NW), ndị nọ n’ebe ahụ mere ihe n’usoro dị mma, jirikwa nkwanye ùgwù gee ntị n’echiche ibe ha. Ọzọkwa, o yiri ka ọ bụ Jemes onye na-eso ụzọ nọ n’isi oche ná nzukọ ahụ—ọ bụghị otu n’ime ndị ozi, dị ka anyị pụrụ ịtụwo anya ya ebe ọ bụ na ha nọ ya. Nkọwa a sakwuru mbara dị n’ihe ndekọ Ọrụ Ndị Ozi na-egosi na ndị ozi ahụ enwewo ọganihu dị ukwuu n’igosipụta ịdị umeala n’obi.—Ọrụ 15:6-29.
Ihe Mmụta Nye Anyị
Site n’ịsa ụkwụ ndị na-eso ụzọ ya, Jisọs kụziri ezi ihe mmụta n’ịdị umeala n’obi. N’ezie, ndị Kraịst ekwesịghị iche na ha dị oké mkpa nke na ndị ọzọ kwesịrị ịdị na-ejere ha ozi mgbe nile, ha ekwesịghịkwa ịchọ ịnọ n’ọkwá nsọpụrụ na nke okomoko. Kama nke ahụ, ha kwesịrị ịgbaso ihe nlereanya Jisọs setịpụrụ, bụ́ onye ‘na-abịaghị ka e jeere Ya ozi, kama ka O jee ozi, ka O werekwa ndụ Ya nye ka ọ bụrụ ihe mgbapụta n’ọnọdụ ọtụtụ mmadụ.’ (Matiu 20:28) Ee, ụmụazụ Jisọs kwesịrị ịdị njikere ijere ibe ha ozi ndị kasị ala.
N’inwe ezi ihe kpatara ya Pita dere, sị: “Were obi dị umeala kee onwe unu dị ka ákwà, [ijerịtara] ibe unu ozi: n’ihi na Chineke na-edo Onwe ya imegide ndị mpako, ma Ọ na-enye ndị dị umeala n’obi amara.” (1 Pita 5:5) E wetara okwu Grik maka “kee dị ka ákwà” site n’okwu pụtara “ákwà mgbochi obi nke onye odibo,” bụ́ nke a na-ekenye ákwà a na-ekesighị ike n’okpuru ya. Ọ̀ pụrụ ịbụ na Pita na-ezo aka n’okike Jisọs kere onwe ya ákwà e ji ehicha ahụ ma saa ụkwụ ndị ozi ya? A pụghị ikwu nke a hoo haa. Ka o sina dị, ozi dị ala Jisọs jere ruru Pita n’obi n’ụzọ ọ na-agaghị echezọ echezọ, dị ka o kwesịrị ịdị n’obi ndị nile ga-abụ ụmụazụ Kraịst.—Ndị Kọlọsi 3:12-14.