Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • jy isi 15 p. 40-p. 41 para. 6
  • Jizọs Arụọ Ọrụ Ebube Mbụ Ya

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Jizọs Arụọ Ọrụ Ebube Mbụ Ya
  • Jizọs Bụ Ụzọ, Eziokwu, na Ndụ
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ọrụ Ebube Mbụ nke Jisọs
    Nwoke Kasị Ukwuu nke Dịworo Ndụ
  • Ọrụ Ebube nke Abụọ Jizọs Nọ na Kena Rụọ
    Jizọs Bụ Ụzọ, Eziokwu, na Ndụ
  • Ọrụ Ebube nke Abụọ na Kena
    Nwoke Kasị Ukwuu nke Dịworo Ndụ
  • Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2006
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Jizọs Bụ Ụzọ, Eziokwu, na Ndụ
jy isi 15 p. 40-p. 41 para. 6
Mgbe Jizọs na-agwa ndị na-eje ozi ka ha gbajuo mmiri n’ite mmiri n’oge a na-eme oriri agbamakwụkwọ na Kena

ISI NKE 15

Jizọs Arụọ Ọrụ Ebube Mbụ Ya

JỌN 2:1-12

  • AGBAMAKWỤKWỌ E MERE NA KENA

  • JIZỌS EMEE MMIRI YA AGHỌỌ MMANYA

O meela abalị atọ ugbu a kemgbe Nataniel ghọchara onye na-eso ụzọ Jizọs. O so ná ndị mbụ ghọrọ ndị na-eso ụzọ Jizọs. Jizọs na ụfọdụ n’ime ndị mbụ a ghọrọ ndị na-eso ụzọ ya gawara Galili nke dị n’ebe ugwu, bụ́ ebe ha niile si. Ha na-aga Kena, bụ́ obodo Nataniel si. Obodo Kena dị n’ebe ugwu Nazaret, ebe Jizọs nọ tolite. A kpọrọ ha oriri agbamakwụkwọ na Kena.

Meri nne Jizọs bịakwara agbamakwụkwọ ahụ. Ọ bụ enyi ndị ezinụlọ ahụ na-agba akwụkwọ. O yikwara ka ò so na-enyere ha aka ịhụ na e lekọtara ndị bịara agbamakwụkwọ ahụ. Ọ bụ ya mere o ji chọpụta ngwa ngwa na mmanya agwụwala ma gwa Jizọs, sị: “Ha enweghị mmanya.”—Jọn 2:3.

Ihe ọ pụtara bụ na Meri nọ na-agwa Jizọs ka o mee ihe banyere mmanya ahụ gwụwaralanụ. Jizọs gwara ya ihe gosiri na ya achọghị ka ọ bụrụ ya ga na-agwa ya ihe ọ ga-eme. Ọ sịrị ya: “Nwaanyị, gịnị jikọrọ mụ na gị?” (Jọn 2:4) Ebe ọ bụ na Jizọs bụ Eze Chineke họpụtara, ọ bụ Nna ya nke eluigwe kwesịrị ịna-agwa ya ihe ọ ga-eme, ọ bụghị ndị ezinụlọ ya ma ọ bụ ndị enyi ya. N’ihi ya, Meri mere ka nwaanyị ma ihe. Ọ hapụụrụ nwa ya nwoke okwu ahụ ma gwa ndị na-eke nri, sị: “Ihe ọ bụla ọ gwara unu, meenụ ya.”—Jọn 2:5.

E nwere ite mmiri isii dị ebe ahụ. Ite nke ọ bụla nwekwara ike ịba ihe karịrị lita mmiri iri anọ. Jizọs gwara ndị ahụ na-eke nri, sị: “Gbajuonụ mmiri n’ite mmiri ndị ahụ.” Mgbe ha gbajuchara ha, Jizọs sịrị ha: “Ugbu a, kutenụ ya bugaara onye nhazi oriri.”—Jọn 2:7, 8.

Mgbe onye nhazi oriri na-ekele nwoke ahụ na-alụ nwaanyị ọhụrụ maka mmanya dị mma e nwere n’oriri ya

Mmanya ahụ tọrọ onye na-ahazi oriri ahụ ezigbo ụtọ. Mana, ọ maghị na e si n’ụzọ ọrụ ebube mepụta ya. Ọ kpọrọ nwoke ahụ na-alụ nwaanyị ọhụrụ sị ya: “Ndị ọzọ na-ebu ụzọ ebupụta mmanya dị mma, mgbe mmanya gbuwere ndị mmadụ, a na-ebupụta nke na-adịchaghị mma. I debere mmanya dị mma ruo ugbu a.”—Jọn 2:10.

Ihe a bụ ọrụ ebube mbụ Jizọs rụrụ. Mgbe ndị mbụ a na-eso ụzọ ya hụrụ ọrụ ebube a, o mere ka okwukwe ha nwere n’ebe ọ nọ sikwuo ike. Jizọs na nne ya na ụmụnne ya ndị nwoke mechara gawa obodo Kapaniọm, nke dị n’ụsọ Oké Osimiri Galili.

  • N’oge ozi Jizọs, ole mgbe ka e nwere agbamakwụkwọ ahụ na Kena?

  • Olee otú Jizọs si zaghachi nne ya mgbe ọ gwara ya banyere mmanya?

  • Olee ọrụ ebube Jizọs rụrụ, oleekwa otú ọrụ ebube ahụ dị ndị ọzọ?

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya