Olee Ebe Ndị Nwụrụ Anwụ Nọ?
“ỤWA bụ ahịa; eluigwe bụ ụlọ anyị,” ka ndị Yoruba nke Ebe Ọdịda Anyanwụ Africa na-ekwu. A na-ekwupụta echiche nke a n’ọtụtụ okpukpe. Ọ na-enye echiche nke na ụwa bụ ọma ahịa nke anyị na-eleta ruo nwa oge wee laa. Dị ka nkwenkwe a na-egosi, n’ọnwụ anyị na-aga eluigwe, ebe obibi anyị n’eziokwu.
Bible na-akụzi na ụfọdụ ga-aga eluigwe. Jisọs Kraịst gwara ndị ozi ya kwesịrị ntụkwasị obi, sị: “N’ụlọ Nna m ọtụtụ ebe obibi dị; . . . ana m aga idoziri unu ebe. Ọ bụrụkwa na Mụ agaa idoziri unu ebe, agaje m ịbịa ọzọ, M ga-anarakwa unu nye Onwe m; ka unu onwe unu wee nọọkwa ebe Mụ onwe m nọ.”—Jọn 14:2, 3.
Okwu Jisọs apụtaghị na ndị ọma nile na-aga eluigwe ma ọ bụ na eluigwe bụ ebe obibi nke ihe a kpọrọ mmadụ. A kpọọrọ ụfọdụ gaa eluigwe n’ihe banyere ịchịisi n’elu ụwa. Jehova Chineke maara na ọ dịghị mgbe gọọmenti ụmụ mmadụ ga-enwe ihe ịga nke ọma n’ilekọta ihe ndị a na-eme n’ụwa. Ya mere, o dokwara maka gọọmenti eluigwe, ma ọ bụ Alaeze, nke ga-emesị weghara nlekọta nke ụwa ma gbanwee ya ịghọ Paradaịs nke o zubere ka ọ bụrụ ná mmalite. (Matiu 6:9, 10) Jisọs ga-abụ Eze nke Alaeze Chineke. (Daniel 7:13, 14) A ga-ahọta ndị ọzọ iso ya chịa n’etiti ụmụ mmadụ. Bible buru amụma na ndị e weere gaa eluigwe ga-abụ “alaeze na ndị nchụàjà nye Chineke anyị” nakwa na ha ‘ga-abụkwa eze n’elu ụwa.’—Mkpughe 5:10.
Olè Ndị Ga-aga Eluigwe?
N’iburu n’uche oké ibu ọrụ ndị ọchịchị eluigwe ndị a ga-enwe, ọ bụghị ihe ijuanya na ha ga-emezu iru eru ndị siri ike. Ndị ga-aga eluigwe aghaghị inwe ezi ihe ọmụma nke Jehova, ha aghaghịkwa irubere ya isi. (Jọn 17:3; Ndị Rom 6:17, 18) A chọrọ ka ha gosipụta okwukwe n’àjà mgbapụta Jisọs Kraịst. (Jọn 3:16) Ma, ọ gụnyere ihe kanụ. Ha aghaghị ịbụ ndị Chineke kpọrọ ma họrọ site n’aka Ọkpara ya. (2 Timoti 1:9, 10; 1 Pita 2:9) Ọzọkwa, ha aghaghị ịbụ ndị Kraịst e mere baptism ndị a “mụrụ ọzọ,” bụrụ ndị e ji mmụọ nsọ Chineke mụọ. (Jọn 1:12, 13; 3:3-6) Ọ dịkwa ha mkpa ịnọgide n’iguzosi ike n’ezi ihe nye Chineke ruo ọnwụ.—2 Timoti 2:11-13; Mkpughe 2:10.
Ọtụtụ nde mmadụ biworo ndụ ma nwụọ erughị ihe ndị a a chọrọ. Ọtụtụ enwewo ohere dị nta ịmụta banyere ezi Chineke ahụ. Ndị ọzọ enwebeghị mgbe ha gụrụ Bible, ha makwaara ihe dị nta ma ọ bụ ghara ịma ma ọlị banyere Jisọs Kraịst. Ọbụna n’etiti ezi ndị Kraịst n’ụwa taa, ole na ole abụwo ndị Chineke họọrọ maka ndụ eluigwe.
N’ihi ya, ọnụ ọgụgụ ndị ga-aga eluigwe ga-adị nnọọ nta. Jisọs zoro aka n’ebe ndị dị otú ahụ nọ dị ka “ìgwè atụrụ nta.” (Luk 12:32) E mesịa, e kpugheere Jọn onyeozi na ndị “a gbatararịị n’ụwa” iso Kraịst chịa n’eluigwe ga-adị nanị 144,000 n’ọnụ ọgụgụ. (Mkpughe 14:1, 3; 20:6) Mgbe e ji ọtụtụ ijeri mmadụ biworo ndụ n’ụwa tụnyere ya, nke ahụ bụ ọnụ ọgụgụ dị nta n’ezie.
Ndị Na-agaghị Aga Eluigwe
Gịnị ga-eme ndị na-agaghị aga eluigwe? Hà na-ata ahụhụ n’ebe ahụhụ ebighị ebi, dị ka okpukpe ụfọdụ na-akụzi? Ọ dịghị ma ọlị, n’ihi na Jehova bụ Chineke nke ịhụnanya. Ndị nne na nna na-ahụ n’anya adịghị atụba ụmụ ha n’ọkụ, Jehova adịghịkwa emekpọ ụmụ mmadụ ọnụ n’ụzọ dị otú ahụ.—1 Jọn 4:8.
Olileanya maka ihe ka ukwuu n’ime ndị nwụworo bụ mbilite n’ọnwụ gaa n’ụwa paradaịs. Bible na-asị na Jehova kere ụwa “ka e wee biri n’ime ya.” (Aịsaịa 45:18) Ọbụ abụ ahụ kwupụtara, sị: “Eluigwe bụ eluigwe Jehova nwere; ma ụwa ka O nyeworo ụmụ mmadụ.” (Abụ Ọma 115:16) Ọ bụ ụwa, ọ bụghị eluigwe, ga-abụ ebe obibi na-adịgide adịgide nke ihe a kpọrọ mmadụ.
Jisọs buru amụma, sị: “Oge hour na-abịa mgbe ndị nile dị n’ili ga-anụ olu Ya [nke Jisọs, “Nwa nke mmadụ”], ha ga-apụtakwa.” (Jọn 5:27-29) Onye Kraịst bụ́ Pọl onyeozi mesiri ya ike: “Enwere m olileanya n’ebe Chineke nọ . . . na mbilite n’ọnwụ nke ndị ezi omume na nke ndị ajọ omume kwa gaje ịdị.” (Ọrụ 24:15) N’elu osisi ịta ahụhụ, Jisọs kwere onye ajọ omume chegharịrịnụ nkwa ndụ site ná mbilite n’ọnwụ baa n’ime ụwa paradaịs.—Luk 23:43.
Ma, gịnị bụ ugbu a ọnọdụ ndị nwụrụ anwụ a ga-akpọlite baa ná ndụ n’elu ụwa? Otu ihe mere n’oge ozi Jisọs na-enye aka ịza ajụjụ a. Enyi ya bụ́ Lazarọs anwụwo. Tupu Jisọs agaa ịkpọlite ya n’ọnwụ, Ọ gwara ndị na-eso ụzọ Ya, sị: “Enyi anyị Lazarọs adawo n’ụra; ma ana m aga, ka M wee kpọtee ya n’ụra.” (Jọn 11:11) Otú a Jisọs ji ọnwụ tụnyere ụra, ụra miri emi n’arọghị nrọ.
Ịnọ n’Ụra n’Ọnwụ
Akụkụ akwụkwọ nsọ ndị ọzọ kwekọrọ n’echiche nke a nke ịnọ n’ụra n’ọnwụ. Ha adịghị akụzi na mmadụ nwere mkpụrụ obi na-adịghị anwụ anwụ nke na-agafere n’ógbè ndị bụ mmụọ n’ọnwụ. Kama nke ahụ, Bible na-asị: “Ndị nwụrụ anwụ adịghị ama ihe ọ bụla . . . Ịhụnanya ha, ma ịkpọasị ha, ma ekworo ha, na mgbe dị anya gara aga ka ọ laworo n’iyi . . . Ọ dịghị ọrụ, ma ọ bụ iche echiche, ma ọ bụ ihe ọmụma, ma ọ bụ amamihe, dị [na Sheol, NW, (ili)], ebe gị onwe gị na-aga.” (Eklisiastis 9:5, 6, 10) Ọzọkwa, ọbụ abụ ahụ kwupụtara na mmadụ ‘na-alaghachi n’ala o si pụta; n’ụbọchị ahụ echiche ya nile alaa n’iyi.’—Abụ Ọma 146:4
Akụkụ akwụkwọ nsọ ndị a na-eme ka o doo anya na ndị nọ n’ụra n’ọnwụ apụghị ịhụ anyị ma ọ bụ nụ ihe anyị na-ekwu. Ha enweghị ike iweta ngọzi ma ọ bụ ọdachi. Ha anọghị n’eluigwe, ha ebighịkwa n’ógbè nke ndị nna ochie ha. Ha adịghị ndụ, ha adịghị adị.
N’oge nke Chineke, a ga-akpọte ndị nọ n’ụra ugbu a n’ọnwụ bụkwa ndị nọ ná ncheta ya baa ná ndụ n’ime ụwa paradaịs. Ọ ga-abụ ụwa nke e mere ka ọ dị ọcha pụọ ná mmetọ, nsogbu, na ihe isi ike dị iche iche ihe a kpọrọ mmadụ na-enwe ugbu a. Lee oge ọṅụ nke ahụ ga-abụ! N’ime Paradaịs ahụ ha ga-enwe olileanya nke ịdị ndụ ruo mgbe ebighị ebi, n’ihi na Abụ Ọma 37:29 na-ekwe anyị nkwa sị: “Ndị ezi omume ga-enweta ala, birikwa n’elu ya ruo mgbe ebighị ebi.”
[Igbe dị na peeji nke 6, 7]
M KWỤSỊRỊ IFE NDỊ NWỤRỤ ANWỤ OFUFE
“Mgbe m bụ nwatakịrị, m na-enyere nna m aka n’oge ịchụ àjà ndị ọ na-achụrụ nna ya nwụrụ anwụ mgbe mgbe. N’otu oge mgbe nna m na-agbake site n’otu ajọ ọrịa, dibịa arụsị gwara ya na iji nye ekele maka mgbake ya o kwesịrị ịchụ otu ewu, ji, ọjị, na mmanya n’àjà nye nna ya nwụrụ anwụ. A gwakwara nna m ka ọ rịọ ndị nna ya ochie nwụrụ anwụ ka ha gbochiere ya ọrịa na ọdachi ndị ọzọ.
“Nne m zụtara ihe ndị a chọrọ maka àjà ahụ, bụ́ nke a ga-achụ n’akụkụ ili nna m ochie. Ili ahụ dị kpọmkwem n’akụkụ ụlọ anyị, n’ikwekọ n’omenala obodo anyị.
“A kpọrọ ndị enyi, ndị ikwu, na ndị agbata obi ịbịa kirie ọchụchụ àjà ahụ. Nna m, onye kere ekike ndị ukwu iji kwekọọ n’ememe ahụ, nọdụrụ n’oche chere ọgba arụsị ahụ ihu ebe ọtụtụ okpokoro isi ewu ndị e jiburu chụọ àjà dị n’ahịrị. Ọrụ m bụ isi n’otu ololo wụnye mmanya n’otu obere iko nkụwa, bụ́ nke m bunyere nna m. N’aka nke ya, ọ wụsara ya n’ala iji chụọ àjà. Nna m kpọkuru aha nna ya ugboro atọ ma kpegara ya ekpere maka mgbapụta site n’ihe ọdachi n’ọdịnihu.
“E chere ọjị, gbuo otu mkpi, sie ya, mmadụ nile nọkwa ya erie ya. Ekeere m òkè n’iri ya ma tee egwú a na-agụ na ịgba a na-eti. Nna m tere egwú n’ụzọ mara mma na n’ike n’ike, ọ bụ ezie na nká amalitela iru ya ahụ. Site n’oge ruo n’oge, o kpere ekpere ka ndị nna ya ochie gọzie ndị nile nọ n’ebe ahụ, ebe ndị mmadụ, gụnyere mụ onwe m, na-aza Ise, nke pụtara ‘Ka ọ dị otú ahụ.’ M ji oké mmasị na obi ụtọ kirie nna m, ọ gụọkwa m agụụ maka ụbọchị m ga-etoru etoru ịchụrụ ndị nna ochie nwụrụ anwụ àjà.
“N’agbanyeghị ọtụtụ àjà a chụrụ, udo nọgidere na-efunarị ezinụlọ anyị. Ọ bụ ezie na e nwere ụmụ ndị ikom atọ nke nne m nọ ndụ, ọ dịghị nke ọ bụla n’ime ụmụ ndị nwanyị atọ ọ mụrụ nke dịtere ndụ aka; ha nile nwụrụ na nwata. Mgbe nne m tụụrụ ime ọzọ, nna m chụrụ àjà ndị dị ukwuu ka a mụọ nwa ahụ n’enweghị nsogbu.
“Nne m mụrụ nwa nwanyị ọzọ. Afọ abụọ n’ihu nwa ahụ dara ọrịa ma nwụọ. Nna m jekwuuru arụsị ahụ, nke sịrị na ọ bụ otu onye iro kpatara ọnwụ ahụ. Arụsị ahụ sịrị na ka ‘mkpụrụ obi’ nwata ahụ wee megwara, a chọrọ mkpirisi osisi a mụnyere ọkụ, otu ololo mmanya, na otu nwa nkịta maka ịchụ àjà. A gaje idebe osisi ahụ a mụnyere ọkụ n’elu ili ahụ, a ga-efesasị mmanya ahụ n’elu ili ahụ, a gajekwa ili nwa nkịta ahụ ná ndụ ná nso ili ahụ. A sịrị na nke a ga-akpọte mkpụrụ obi nwa nwanyị ahụ nwụrụ anwụ ịbọ ọbọ ọnwụ ya.
“M bugara ololo mmanya na osisi ahụ a mụnyere ọkụ n’ili ahụ, nna m kutekwara nwa nkịta ahụ, bụ́ nke o liri dị ka ntụziaka arụsị ahụ si dị. Anyị nile kwenyere na n’ime ụbọchị asaa mkpụrụ obi nwa nwanyị ahụ nwụrụ anwụ ga-ebibi onye ahụ kpatara ọnwụ ya na-erughị eru. Ọnwa abụọ gafere, ọ dịghịkwa onye a kọrọ na ọ nwụrụ na gburugburu ụlọ anyị. Enwere m nkụda mmụọ.
“Adị m afọ 18 mgbe ahụ. Ngwa ngwa nke a gasịrị ezutere m Ndịàmà Jehova, bụ́ ndị gosiri m site n’Akwụkwọ Nsọ na ndị nwụrụ anwụ apụghị imere ndị dị ndụ ihe ọma ma ọ bụ ihe ọjọọ. Ka ihe ọmụma nke Okwu Chineke na-agba mkpọrọgwụ n’ime obi m, agwara m nna m na apụkwaghị m isonyere ya n’ịchụrụ ndị nwụrụ anwụ àjà. Na mbụ o wesoro m iwe n’ihi ịgbahapụ ya, dị ka o si kwuo ya. Ma mgbe ọ hụrụ na mụ adịghị njikere ịhapụ okwukwe ọhụrụ m, o megideghị ofufe m na-efe Jehova.
“N’April 18, 1948, egosipụtara m nraranye m site na baptism ime mmiri. Eri mgbe ahụ, anọgidewo m na-ejere Jehova ozi site n’ọṅụ dị ukwuu na afọ ojuju, na-enyere ndị ọzọ aka inwere onwe ha pụọ n’ofufe ndị nna ochie nwụrụ anwụ, bụ́ ndị na-apụghị inyere anyị aka ma ọ bụ imerụ anyị ahụ.”—J. B. Omiegbe, Benin City, Nigeria, dere ya.
[Foto dị na peeji nke 7]
A ga-enwe ọṅụ dị ukwuu mgbe a kpọlitere ndị nwụrụ anwụ n’elu ụwa paradaịs