Echiche nke Bible
“Esiteghị n’Ụwa” Gịnị Ka Ọ Pụtara?
NA NARỊ afọ nke anọ O.A., ọtụtụ puku ndị kpọrọ onwe ha ndị Kraịst gbahapụrụ ihe onwunwe, ndị ikwu, na ụzọ ndụ ha iji biri nanị ha n’ime ọzara nke Ijipt. Ha ewee bụrụ ndị a maara dị ka ndị bipụrụ iche, bụ́ nke sitere n’okwu Grik bụ́ a·na·kho·reʹo, nke pụtara “ewezụga m onwe m.” Otu ọkọ akụkọ ihe mere eme kọwara ha dị ka ndị na-anọpụ iche site n’ebe ndị ha na ha biri ndụ n’otu oge nọ. Ndị bipụrụ iche chere na site n’iwezụga onwe ha pụọ n’ebe ọha mmadụ nọ, ha na-erube isi n’ihe a chọrọ ndị Kraịst n’aka ịbụ ndị ‘na-esiteghị n’ụwa.’—Jọn 15:19.
Bible na-adụ ndị Kraịst ọdụ idebe onwe ha “n’enweghị ntụpọ site n’ụwa.” (Jemes 1:27) Akwụkwọ Nsọ na-adọ aka ná ntị n’ụzọ doro anya, sị: “Unu ndị na-akwa iko, unu amataghị na ịbụ enyi nke ụwa bụ ịbụ onye iro nke Chineke? Ya mere, onye ọ bụla nke zubere ịbụ enyi nke ụwa na-edo onwe ya onye iro nke Chineke.” (Jemes 4:4) Otú ọ dị, nke a ọ̀ pụtara na a chọrọ ka ndị Kraịst ghọọ ndị bipụrụ iche, na-ewezụga onwe ha n’ebe ndị ọzọ nọ n’ụzọ nkịtị? Hà kwesịrị ịkpapụ iche site n’ebe ndị na-ekwenyeghị ná nkweta okpukpe ha nọ?
Ndị Kraịst Adịghị Emegide Ọha Mmadụ
A tụlere echiche nke abụghị akụkụ nke ụwa n’ọtụtụ ihe ndekọ Bible nke mesiri mkpa ọ dị ike ka ndị Kraịst debe onwe ha iche pụọ n’ìgwè ọha mmadụ ndị e mere ka ha bụrụ ndị ala ọzọ n’ebe Chineke nọ. (Tụlee 2 Ndị Kọrint 6:14-17; Ndị Efesọs 4:18; 2 Pita 2:20.) Ya mere, ezi ndị Kraịst na-eji amamihe ezere omume, okwu na ibi obi ndị megidere ụkpụrụ ezi omume Jehova, dị ka nchụso ike ike nke akụ̀ na ụba nke ụwa, ịbụ onye a ma ama, na inwebiga ihe ụtọ ókè. (1 Jọn 2:15-17) Ha na-eguzopụkwa iche n’ụwa, site n’ịnọpụ iche n’ihe banyere agha na ndọrọ ndọrọ ọchịchị.
Jisọs Kraịst kwuru na ndị na-eso ụzọ ya “esiteghị n’ụwa.” Ma o kpegakwaara Chineke ekpere, sị: “Ekpeghị m ekpere ka I wepụ ha n’ụwa, kama ka I debe ha ka ha pụọ n’aka ajọ onye ahụ.” (Jọn 17:14-16) N’ụzọ doro anya, Jisọs achọghị ka ndị na-eso ụzọ ya ghọọ ndị na-emegide ọha mmadụ, na-ezere mmekọrịta nile nke ha na ndị na-abụghị ndị Kraịst. N’ezie, mmadụ ikewapụ onwe ya na-egbochi onye Kraịst imezu iwu nke ime nkwusa na izi ihe “n’ihu ọha mmadụ, n’ụlọ nke aka unu kwa n’otu n’otu.”—Ọrụ 20:20; Matiu 5:16; 1 Ndị Kọrint 5:9, 10.
Ndụmọdụ nke ịnọ n’enweghị ntụpọ site n’ụwa enyeghị ndị Kraịst ihe ndabere nke iwere onwe ha dị ka ndị ka ndị ọzọ elu. Ndị na-atụ egwu Jehova na-akpọ “mpako” asị. (Ilu 8:13) Ndị Galetia 6:3 na-ekwu na “a sị na mmadụ na-eche na ya bụ ihe, mgbe ọ na-abụghị ihe ọ bụla, ọ na-aghọ onwe ya aghụghọ n’obi.” Ndị na-ewere onwe ha dị ka ndị ka ndị ọzọ elu na-aghọgbu onwe ha n’ihi na “mmadụ nile emehiewo, ha adịghị erukwa otuto Chineke.”—Ndị Rom 3:23.
“Ghara Ikwulu Onye Ọ Bụla”
N’ụbọchị Jisọs, e nwere ndị lelịrị ndị nile na-esoghị n’òtù okpukpe ha kpọmkwem anya. N’ime ndị a bụ ndị Farisii. Ha maara ma Iwu Mosis ma ụmụ irighiri ọdịnala ndị Juu nke ọma. (Matiu 15:1, 2; 23:2) Ha na-eji nganga akpachara anya na-agbaso ọtụtụ omenala okpukpe. Ndị Farisii kpara àgwà ka a ga-asị na ha ka ndị ọzọ elu nanị n’ihi ihe ndị ha ji ọgụgụ isi ha mezuo na ọkwá okpukpe ha. Ha kwupụtara omume ihu abụọ na nke nlelị ha site n’ikwu, sị: “Ìgwè mmadụ a nke na-amaghị iwu anyị bụ ndị a na-abụ ọnụ.”—Jọn 7:49.
Ndị Farisii ọbụna nwere okwu mkparị maka ndị na-abụghị ndị Farisii. E ji okwu Hibru ahụ bụ́ ʽam ha·ʼaʹrets mee ihe na mbụ n’ụzọ dị mma iji mara ụmụ amaala. Ma ka oge na-aga, ndị ndú okpukpe dị mpako nke Juda gbanwere echiche nke ʽam ha·ʼaʹrets ịbụ nke nleda anya. Òtù ndị ọzọ, gụnyere ndị kpọrọ onwe ha ndị Kraịst, ejiwo okwu ndị dị ka “onye na-ekpere arụsị” na “onye ọgọ mmụọ” mee ihe n’ụzọ mkparị iji kọwaa ndị nwere nkweta okpukpe dị iche.
Otú ọ dị, olee otú ndị Kraịst si ele ndị na-anabatabeghị Iso Ụzọ Kraịst anya? A dụrụ ndị na-eso ụzọ Jisọs ọdụ iji “ịdị nwayọọ” na “egwu” na-emeso ndị na-ekweghị ekwe ihe. (2 Timoti 2:25; 1 Pita 3:15) Pọl onyeozi gosiri ezi ihe nlereanya n’ihe banyere nke a. Ọ bụ onye a pụrụ ịgakwuru, ọ dịghị mpako. Kama ibuli onwe ha elu karịa ndị ọzọ, ọ dị umeala n’obi, na-ewulikwa elu. (1 Ndị Kọrint 9:22, 23) N’akwụkwọ ozi ya sitere n’ike mmụọ nsọ nke o degaara Taịtọs, Pọl na-enye ndụmọdụ ka anyị “ghara ikwulu onye ọ bụla, ghara ịbụ ndị na-alụ ọgụ, ka [anyị] nwee obiọma, na-egosi ịdị nwayọọ nile n’ebe mmadụ nile nọ.”—Taịtọs 3:2.
N’ime Bible a na-eji okwu ahụ bụ́ “onye na-ekweghị ekwe” mgbe ụfọdụ akọwa ndị na-abụghị ndị Kraịst. Otú ọ dị, e nweghị ihe àmà ọ bụla na e jiri okwu ahụ bụ́ “onye na-ekweghị ekwe” mee ihe dị ka nkọwa ma ọ bụ aha ọha mmadụ. N’ezie, e jighị ya mee ihe iji wetuo ndị na-abụghị ndị Kraist ala, ebe nke a ga-emegide ụkpụrụ Bible. (Ilu 24:9) Ndịàmà Jehova taa na-ezere ịdị obi ọjọọ ma ọ bụ ịdị mpako n’ebe ndị na-ekweghị ekwe nọ. Ha na-ewere ya dị ka enweghị nsọpụrụ, ịkpọ ndị ikwu ma ọ bụ ndị agbata obi ndị na-abụghị Ndịàmà aha mkparị. Ha na-agbaso ndụmọdụ Bible nke na-ekwu, sị: “Ohu nke Onyenwe anyị aghaghị . . . ịdị nwayọọ n’ebe mmadụ nile nọ.”—2 Timoti 2:24.
“Na-arụ Ezi Ihe n’Ebe Mmadụ Nile Nọ”
Ọ dị mkpa ịmara ihe ize ndụ dị n’iso ụwa na-enwe mmekọrịta chiri anya, karịsịa iso ndị na-egosi enweghị nsọpụrụ dị oké njọ maka ụzọ Chineke si eme ihe. (Tụlee 1 Ndị Kọrint 15:33.) Ma, mgbe Bible na-adụ ọdụ ka anyị “na-arụ ezi ihe n’ebe mmadụ nile nọ,” okwu ahụ bụ “mmadụ nile” na-agụnye ndị na-ekwenyeghị ná nkweta ndị Kraịst. (Ndị Galetia 6:10) Dị ka ihe àmà na-egosi, ndị Kraịst nke narị afọ mbụ sooro ndị na-ekweghị ekwe rikọọ nri, n’okpuru ọnọdụ ụfọdụ. (1 Ndị Kọrint 10:27) Ya mere, taa ndị Kraịst na-emeso ndị na-ekweghị ekwe ihe n’ụzọ guzoziri eguzozi, na-ewere ha dị ka mmadụ ibe ha.—Matiu 22:39.
Ọ ga-adị njọ iwere ya na mmadụ nwere àgwà na-adịchaghị mma ma ọ bụ na-eme omume rụrụ arụ nanị n’ihi na ọ maghị eziokwu nile nke Bible. Ọnọdụ na mmadụ na-adịrịta iche. Ya mere, onye Kraịst ọ bụla aghaghị ikpebi ókè ọ ga-enwedebe mmekọrịta nke ya na ndị na-ekweghị ekwe. Otú ọ dị, ọ ga-abụ ihe na-adịghị mkpa na ihe Akwụkwọ Nsọ na-akwadoghị onye Kraịst ikewapụ onwe ya n’ụzọ nkịtị dị ka ndị bipụrụ iche mere ma ọ bụ chee na ọ ka ndị ọzọ elu dị ka ndị Farisii mere.