Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • bt isi 4 p. 28-35
  • “Ha Bụ Ndị Nkịtị Na-agụghị Akwụkwọ”

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • “Ha Bụ Ndị Nkịtị Na-agụghị Akwụkwọ”
  • ‘Ịgba Àmà nke Ọma Banyere Alaeze Chineke’
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ọ Bụghị “Ike Anyị” (Ọrụ 3:11-26)
  • ‘Anyị Enweghị Ike Ịkwụsị Ikwu Okwu’ (Ọrụ 4:1-22)
  • “Ha Ji Olu Dara Ụda Gwa Chineke . . . , Sị” (Ọrụ 4:23-31)
  • ‘Ọ Bụ Chineke Ka Ha Ghaara Ụgha, Ọ Bụghị Mmadụ’ (Ọrụ 4:32–5:11)
  • Jizọs Kụziiri Ya Ihe Bụ́ Ịgbaghara Mmadụ Mmehie
    Ṅomie Okwukwe Ha
  • Ọ Mụtara Mgbaghara n’Aka Nna Ya Ukwu
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2010
  • O Kweghị Ka Ụjọ na Obi Abụọ Mee Ka Ọ Kwụsị Iso Kraịst
    Ṅomie Okwukwe Ha
  • Ọ Kwụsiri Ike Mgbe Ọnwụnwa Bịaara Ya
    Ṅomie Okwukwe Ha
Lee Ihe Ndị Ọzọ
‘Ịgba Àmà nke Ọma Banyere Alaeze Chineke’
bt isi 4 p. 28-35

ISI NKE 4

“Ha Bụ Ndị Nkịtị Na-agụghị Akwụkwọ”

Ndịozi Jizọs katara obi, Jehova agọzie ha

O Si n’Ọrụ Ndịozi 3:1–5:11

1, 2. Olee ọrụ ebube Pita na Jọn rụrụ mgbe ha rutewere n’ọnụ ụzọ ámá dị n’ụlọ nsọ?

ÌGWÈ mmadụ nọ na-agagharị ka anwụ na-achasi ike n’ehihie. Ndị Juu bụ́ ndị ji obi ha niile na-efe Chineke nakwa ndị na-eso ụzọ Kraịst na-abanye n’ogige ụlọ nsọ. Ọ fọrọ obere ka ‘oge e ji ekpe ekpere’ ruo.a (Ọrụ 2:46; 3:1) Pita na Jọn so n’ìgwè mmadụ ahụ. Ha gawara n’ọnụ ụzọ ámá ụlọ nsọ a na-akpọ Ọnụ Ụzọ Mara Mma. N’agbanyeghị ụzụ ndị mmadụ na-eme nakwa mkpọtụ ụkwụ ndị na-agafe agafe na-eme, otu onye arịrịọ karịrịla afọ iri anọ, onye dara ngwọrọ kemgbe a mụrụ ya, nọ ebe ahụ na-arịọ ndị mmadụ ego.​—Ọrụ 3:2; 4:22.

2 Ka Pita na Jọn na-abịaru nso, onye arịrịọ ahụ malitere ịrịọ ha ego otú o si arịọ ndị na-agafe ebe ahụ. Ndịozi ahụ kwụsịrị, ya elegide ha anya, chee na ha ga-enye ya ego. Pita gwara ya, sị: “Enweghị m ọlaọcha na ọlaedo. Ihe m nwere ka m ga-enye gị. N’aha Jizọs Kraịst onye Nazaret, jewe ije!” Chegodị ụdị akpata oyi wụrụ ìgwè mmadụ ahụ n’ahụ́ mgbe Pita jidere onye ngwọrọ ahụ n’aka, ya eguzoro ọtọ nke mbụ ná ndụ ya. (Ọrụ 3:6, 7) Weregodị ya na ị na-ahụ ka nwoke ahụ na-ele ụkwụ ya anya mgbe a gwọrọ ya, ya ejiri nwayọọ na-agbalị ịga ije nke mbụ ya. Ka a sịkwa ihe mere o ji na-amali elu ma na-etosi Chineke ike.

3. Olee onyinye na-enweghị atụ nwoke ahụ bụ́bu onye ngwọrọ na ìgwè mmadụ ahụ nwere ohere inweta?

3 Ìgwè mmadụ ahụ obi dị ụtọ gbaara ọsọ gaa n’ebe Pita na Jọn nọ na Varanda Solomọn. E nwere mgbe Jizọs nọ n’ebe a kụziere ndị mmadụ ihe. Pita gwara ìgwè mmadụ ahụ ihe mere ha ji nwee ike ịrụ ọrụ ebube ahụ. (Jọn 10:23) O nyere ìgwè mmadụ ahụ na nwoke ahụ bụ́bu onye ngwọrọ onyinye karịrị ọlaọcha ma ọ bụ ọlaedo. Onyinye a abụghị naanị ịgwọ mmadụ ọrịa. Ọ bụ ohere e nyere ha ka ha chegharịa, ka e hichapụ mmehie ha, nakwa ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ Jizọs Kraịst, bụ́ “Nnukwu Onye Ndú” Jehova “họpụtara ka o nye ndị mmadụ ndụ.”​—Ọrụ 3:15.

4. (a) Gịnị ka ọrụ ebube Pita na Jọn rụrụ ga-akpata? (b) Olee ajụjụ abụọ anyị ga-aza?

4 Ụbọchị ahụ pụrụ ezigbo iche. A gwọrọ onye ngwọrọ, ya ejewe ije. E nyekwara ọtụtụ puku mmadụ ohere ịghọta uche Chineke ka ha nwee ike ịna-eme ihe otú ndị na-efe Chineke kwesịrị ịna-eme. (Kọl. 1:9, 10) Ihe ndị mere n’ụbọchị ahụ ga-emekwa ka ndị ọchịchị chọọ imechi ndị ji obi ha niile na-eso ụzọ Kraịst ọnụ ka ha ghara irube isi n’iwu Jizọs nyere ha, nke bụ́ ikwusa ozi ọma Alaeze Chineke. (Ọrụ 1:8) Ma, olee ihe ndị anyị nwere ike ịmụta n’otú Pita na Jọn si zie ìgwè mmadụ ahụ ozi ọma nakwa n’otú ha si kpaa àgwà n’agbanyeghị na ha bụ “ndị nkịtị na-agụghị akwụkwọ”?b (Ọrụ 4:13) Oleekwa otú anyị ga-esi eme ihe Pita na Jọn na ndị na-eso ụzọ Jizọs ndị ọzọ mere mgbe a na-emegide ha?

Ọ Bụghị “Ike Anyị” (Ọrụ 3:11-26)

5. Olee ihe anyị na-amụta n’otú Pita si gwa ìgwè mmadụ ahụ okwu?

5 Pita na Jọn guzo n’ihu ìgwè mmadụ ahụ. Ha ma na ọ ga-abụ na ụfọdụ ndị nọ ebe ahụ so ná ndị ji iwe kwuo ka a kpọgbuo Jizọs izu ole na ole gara aga. (Mak 15:8-15; Ọrụ 3:13-15) O doro anya na Pita nwere obi ike. Ọ bụ ya mere o ji kata obi kwuo na ọ bụ aha Jizọs ka ha ji gwọọ onye ngwọrọ ahụ. Pita amaghị ọnụ jijiji mgbe ọ na-agwa ha eziokwu a. O kwuru hoo haa na ìgwè mmadụ ahụ so ná ndị gburu Kraịst. Ma Pita eburughị ha iwe n’obi, n’ihi na ha ‘mere ihe ha mere n’amaghị ụma.’ (Ọrụ 3:17) Ọ kpọrọ ha ụmụnna ya ma kwusie okwu ike gbasara uru ozi ọma Alaeze Chineke ga-abara ha. Ọ bụrụ na ha echegharịa ma nwee okwukwe na Kraịst, Jehova ga-eme ‘ka obi ruo ha ala.’ (Ọrụ 3:19) Anyị kwesịkwara ikwu okwu n’atụghị egwu mgbe anyị na-agwa ndị mmadụ banyere ikpe Chineke ga-ekpe ndị mmadụ. Ma, anyị ekwesịghị ịgba ndị mmadụ ka akpị, iji ọnụ ọjọọ na-ezi ha ozi ọma, ma ọ bụkwanụ ịma ha ikpe. Kama, anyị kwesịrị iwere ndị anyị na-ezi ozi ọma ka ndị nwere ike ịbụ ụmụnna anyị. Ihe anyị kwesịrị ilekwasị anya bụ uru ozi Alaeze Chineke ga-abara ndị mmadụ, otú ahụ Pita mere.

6. Olee otú Pita na Jọn si gosi na ha dị umeala n’obi, marakwa ebe ike ha ruru?

6 Ndịozi Jizọs dị umeala n’obi. Ha ekwughị na ha ji ike ha rụọ ọrụ ebube ahụ. Pita gwara ìgwè mmadụ ahụ, sị: “Gịnịkwa mere unu ji na-ele anyị ka à ga-asị na ọ bụ ike anyị ma ọ bụ maka na anyị na-efesi Chineke ike mere anyị ji mee ka nwoke a jewe ije?” (Ọrụ 3:12) Pita na ndịozi ndị ọzọ ma na ihe ọma ọ bụla ha rụrụ n’ozi ha si n’ike Chineke, ọ bụghị n’ike ha. N’ihi ya, ebe ha ma ebe ike ha ruru, ha nyere Jehova na Jizọs otuto niile maka ihe ndị ha rụrụ n’ozi ha.

7, 8. (a) Olee onyinye anyị nwere ike inye ndị mmadụ? (b) Olee otú nkwa e kwere na a “ga-eme ka ihe niile dị ọhụrụ” si emezu taa?

7 Anyị kwesịkwara ịdị umeala n’obi mgbe anyị na-ezisa ozi ọma Alaeze. N’eziokwu, mmụọ Chineke anaghị enye Ndị Kraịst n’oge anyị a ike ịgwọ ọrịa. N’agbanyeghị ya, anyị nwere ike inyere ndị mmadụ aka ka ha nwee okwukwe na Chineke nakwa na Kraịst. Anyị nwekwara ike ime ka ha nweta onyinye Pita nyere ìgwè mmadụ ahụ, ya bụ, ime ka ha chegharịa, Jehova agbaghara ha mmehie ha, obi eruokwa ha ala. Kwa afọ, ọtụtụ narị puku mmadụ na-anabata onyinye a ma bụrụ ndị na-eso ụzọ Kraịst e mere baptizim.

8 N’eziokwu, anyị bi n’oge Pita kpọrọ oge a “ga-eme ka ihe niile dị ọhụrụ.” Alaeze Chineke malitere ịchị n’eluigwe n’afọ 1914. Ihe a mezuru ihe “Chineke si n’ọnụ ndị amụma ya dị nsọ kwe nkwa” n’oge ochie na ya ga-eme. (Ọrụ 3:21; Ọma 110:1-3; Dan. 4:16, 17) Obere oge alaeze ahụ malitere ịchị, Kraịst mere ka a malite ife Chineke ezigbo ofufe n’ụwa. N’ihi ya, e meela ka ọtụtụ nde mmadụ bụrụ ndị Alaeze Chineke na-achị, ha na-efekwa Jehova ugbu a, ha na ụmụnna ha adịrịkwa n’otu. Ha eyipụla àgwà ochie ha nke rụrụ arụ ma ‘yiri àgwà ọhụrụ nke Chineke chọrọ.’ (Efe. 4:22-24) Otú ahụ o si bụrụ mmụọ Chineke ka e ji gwọọ onye ngwọrọ ahụ ka o sikwa bụrụ mmụọ nsọ Chineke na-eme ka ndị mmadụ gbanwee ma fewe Chineke, ọ bụghị ike mmadụ. Anyị kwesịrị iji Okwu Chineke na-akụziri ndị mmadụ ihe nke ọma n’atụghị egwu, otú Pita mere. Ọ bụ ike Chineke ka anyị ji enyere ndị mmadụ aka ịghọ ndị na-eso ụzọ Kraịst, ọ bụghị ike anyị.

‘Anyị Enweghị Ike Ịkwụsị Ikwu Okwu’ (Ọrụ 4:1-22)

9-11. (a) Olee ihe ndị isi ndị Juu mere mgbe ha nụrụ ihe Pita na Jọn nọ na-akụzi? (b) Gịnị ka ndịozi ahụ kpebiri ime?

9 Ihe ahụ Pita kwuru nakwa otú nwoke ahụ bụ́bu onye ngwọrọ si na-amali elu ma na-aṅụrị ọṅụ mere ka ìgwè mmadụ ahụ na-enwe obi ụtọ ma na-eme mkpọtụ. N’ihi ya, onyeisi ndị nche ụlọ nsọ, onye a họpụtara ka ọ hụ na e nweghị nsogbu n’ụlọ nsọ, nakwa ndị isi nchụàjà gbaara ọsọ gaa ka ha mata ihe na-emenụ. Ọ ga-abụ na ha bụ ndị Sadusii. Ndị Sadusii bụ ndị aka ji akụ̀ nakwa ndị ndọrọ ndọrọ ọchịchị ọnụ na-eru n’okwu, ndị na-ahụ na udo dị n’etiti ndị Juu na ndị Rom. Ha ekweghị n’iwu ndị Juu e nyere n’ọnụ, mana ndị Farisii ejighị iwu ndị ahụ egwu egwu. Ndị Sadusii ekweghịkwa ná mbilite n’ọnwụ.c Iwe juru ha obi mgbe ha hụrụ na Pita na Jọn katara obi nọrọ n’ụlọ nsọ na-akụzi na Jizọs esila n’ọnwụ bilie.

10 Ndị mmegide ahụ iwe juru obi tụbara Pita na Jọn n’ụlọ mkpọrọ ma kpụpụta ha n’ihu nnukwu ụlọikpe ndị Juu n’echi ya. Ndị isi ahụ lere Pita na Jọn anya ka “ndị nkịtị na-agụghị akwụkwọ,” ndị na-erughị eru ịkụzi ihe n’ụlọ nsọ. Ha agụghị akwụkwọ n’ụlọ akwụkwọ okpukpe ọ bụla a ma ama. N’agbanyeghị ya, nkwuwa okwu ha na obi ike ha juru ndị nọ n’ụlọikpe ahụ anya. Gịnị mere Pita na Jọn ji na-akụzi ihe nke ọma? Otu ihe kpatara ya bụ na “ha na Jizọs na-anọbu.” (Ọrụ 4:13) Nna ha ukwu kụziri ihe dị ka onye nwere ikike, ọ bụghị dị ka ndị odeakwụkwọ.​—Mat. 7:28, 29.

11 Ndị nọ n’ụlọikpe ahụ nyere ndịozi Jizọs iwu ka ha kwụsị izisa ozi ọma. N’obodo ndị Juu, a naghị arụ ụlọikpe ahụ ụka. N’izu ole na ole gara aga mgbe Jizọs bịara n’ihu ụlọikpe ahụ, ọ bụ ndị nọ n’ụlọikpe ahụ kwubiri, sị: “O kwesịrị ịnwụ.” (Mat. 26:59-66) Ma, ụjọ atụghị Pita na Jọn. Ha nọ n’ihu ndị ahụ bụ́ ndị aka ji akụ̀ a ma ama, ndị gụkwara ezigbo akwụkwọ, kwuo okwu n’atụghị egwu. Ha kwanyekwaara ha ùgwù mgbe ha na-agwa ha okwu. Ha sịrị ha: “Chegodịnụ ma ọ̀ ga-adị Chineke mma ka e gee unu ntị kama ige yanwa ntị. Ma, anyịnwa enweghị ike ịkwụsị ikwu gbasara ihe anyị ji anya anyị hụ na ihe anyị ji ntị anyị nụ.”​—Ọrụ 4:19, 20.

NNUKWU ONYE NCHỤÀJÀ NA NDỊ ISI NCHỤÀJÀ

Nnukwu onye nchụàjà na-anọchi anya ndị Izrel n’ihu Chineke. N’oge ndịozi, ọ bụkwa ya bụ onyeisi ndị Sanhedrin. Ya na ndị isi nchụàjà, ndị bụ́ ndị isi ndị Juu, na-arụkọ ọrụ. Ndị so ná ndị isi nchụàjà bụ ndị bụ́bu nnukwu ndị nchụàjà, dị ka Anas, na ndị okenye ndị ọzọ si n’ezinụlọ ndị e si ahọpụta nnukwu ndị nchụàjà. O nwere ike ịbụ naanị ezinụlọ anọ ma ọ bụ ise ka e si ahọpụta ha. Otu ọkachamara aha ya bụ Emil Schürer dere, sị: “Ọ bụrụ na mmadụ si n’ezinụlọ ndị ahụ e si ahọpụta nnukwu ndị nchụàjà, a na-akwanyere ya ùgwù” karịa ndị nchụàjà ndị ọzọ.

Ihe Akwụkwọ Nsọ kwuru gosiri na nnukwu ndị nchụàjà na-abụ nnukwu ndị nchụàjà ruo mgbe ha nwụrụ. (Ọnụ Ọgụ. 35:25) Ma n’oge ihe ndị e dere n’akwụkwọ Ọrụ Ndịozi mere, ndị gọvanọ na ndị eze, bụ́ ndị ọchịchị Rom họpụtara, na-ahọpụta nnukwu ndị nchụàjà ma na-ewepụ ha mgbe ọ bụla ha chọrọ. Ma, ọ ga-abụ na ndị ọchịchị ndị ahụ na-esi n’ezinụlọ Erọn ahọpụta nnukwu ndị nchụàjà.

12. Olee ihe ga-enyere anyị aka ka eziokwu ndị dị na Baịbụl dokwuo anyị anya, obi esikwuo anyị ike?

12 Ị̀ na-enwe obi ike otú Pita na Jọn nwere? Olee otú obi na-adị gị ma ohere dapụta ka i zie ndị aka ji akụ̀, ndị gụrụ ezigbo akwụkwọ, ma ọ bụ ndị a ma ama n’ebe i bi ozi ọma? Gịnị ka ị ga-eme ma ọ bụrụ na ndị ezinụlọ unu, ụmụ akwụkwọ ibe gị, ma ọ bụ ndị gị na ha na-arụkọ ọrụ ana-achị gị ọchị n’ihi ihe ndị i kweere? Ị̀ ga-atụ ụjọ? Ọ bụrụ otú ahụ, i nwere ike ịkwụsị ịtụ ụjọ. Mgbe Jizọs nọ n’ụwa, ọ kụziiri ndịozi ya otú ha ga-esi jiri obi ike na-agwa ndị mmadụ ihe ha kweere, na-akwanyekwara ha ùgwù mgbe ha na-agwa ha okwu. (Mat. 10:11-18) Mgbe Jizọs si n’ọnwụ bilie, o kwere ndị na-eso ụzọ ya nkwa, sị: “M nọnyekwaara unu ụbọchị niile ruo ọgwụgwụ oge a.” (Mat. 28:20) Taa, Jizọs si n’aka “ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi, onye nwekwara uche” akụziri anyị otú anyị ga-esi na-agwa ndị mmadụ ihe ndị anyị kweere. (Mat. 24:45-47; 1 Pita 3:15) Ohu a na-akụziri anyị ihe ndị a n’ọmụmụ ihe anyị dị iche iche, dị ka Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ. Ha na-esikwa n’akwụkwọ ndị e ji amụ Baịbụl akụziri anyị ha, dị ka isiokwu ndị na-agba n’Ịntanet na jw.org, bụ́ “Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara.” Ị̀ na-agachi ọmụmụ ihe anya ma na-agụ akwụkwọ ndị ahụ mgbe niile? Ọ bụrụ na ị na-eme otú ahụ, eziokwu ndị dị na Baịbụl ga-edokwu gị anya, ị ga-enwekwu obi ike. Ị ga-emekwa ka ndịozi Jizọs, ị gaghị ekwe ka ihe ọ bụla gbochie gị ịgwa ndị mmadụ eziokwu ndị magburu onwe ha ị mụtara na Baịbụl.

Ebe nwanna nwaanyị na-ezi onye ya na ya na-arụkọ ọrụ ozi ọma n’oge ha na-aṅụrụtụ kọfị mgbe ha na-ezu ike n’ebe ha na-arụ ọrụ.

Ekwela ka ihe ọ bụla gbochie gị ịgwa ndị mmadụ eziokwu ndị magburu onwe ha ị mụtara na Baịbụl

“Ha Ji Olu Dara Ụda Gwa Chineke . . . , Sị” (Ọrụ 4:23-31)

13, 14. Olee ihe anyị kwesịrị ime mgbe a na-emegide anyị, n’ihi gịnịkwa?

13 Ozugbo a kpọpụtara Pita na Jọn n’ụlọ mkpọrọ, ha na ndị ọzọ nọ n’ọgbakọ zukọtara. Ha niile “ji olu dara ụda gwa Chineke” okwu ma rịọ ya ka o mee ka ha kata obi, ka ha nwee ike ịnọgide na-ekwusa ozi ọma. (Ọrụ 4:24) O doro Pita anya na mmadụ ịtụkwasị ike ya obi mgbe ọ chọrọ ime uche Chineke bụ ime iberiibe. N’izu ole na ole gara aga, Pita tụkwasịrị onwe ya obi. Ọ bụ ya mere o ji gwa Jizọs, sị: “Ọ bụrụgodị na ndị ọzọ niile ahapụ gị, o nweghị ihe ga-eme ka m hapụ gị.” Ma, dị ka Jizọs gwara Pita, egwu mmadụ mere ka Pita gọnahụ enyi ya na onye ozizi ya. Ma, Pita mụtara ihe n’ihe o mejọrọ.​—Mat. 26:33, 34, 69-75.

14 Ọ bụghị naanị ikpebi na ị ga-abụ onyeàmà Kraịst ga-eme ka i jezuo ozi gị. Ọ bụrụ na ndị mmegide agbalịa ime ka ị kwụsị ife Jehova ma ọ bụ ka ị kwụsị ikwusa ozi ọma, mee ihe ahụ Pita na Jọn mere. Kpee ekpere gwa Jehova ka o nye gị ume. Gwa ụmụnna nọ n’ọgbakọ ka ha nyere gị aka. Gwa ndị okenye na ndị ọzọ ma nke a na-akọ n’ọgbakọ nsogbu ndị ị na-enwe. Ekpere ndị ọzọ ga-ekpere gị nwere ike ime ka i nweta ume ị ga-eji na-efe Chineke.​—Efe. 6:18; Jems 5:16.

15. Gịnị mere ndị kwụsịtụrụ ikwusa ozi ọma na-ekwesịghị ịda mbà?

15 Ọ bụrụ na e nwee mgbe mmegide mere ka ị kwụsịtụ ikwusa ozi ọma, adala mbà. Cheta na ndịozi Jizọs niile kwụsịtụrụ ikwusa ozi ọma mgbe Jizọs nwụchara, ma ha mechara malitekwa. (Mat. 26:56; 28:10, 16-20) Kama ikwe ka ihe ndị i mejọrọ n’oge gara aga mee ka ị daa mbà, jiri ihe ndị ị mụtara na ha mee ka okwukwe ndị ọzọ sie ike.

16, 17. Olee ihe anyị nwere ike ịmụta n’ekpere ndị na-eso ụzọ Kraịst nọ na Jeruselem kpere?

16 Ọ bụrụ na ndị ọchịchị na-emegide anyị, olee ihe anyị kwesịrị ịgwa Chineke n’ekpere ka o meere anyị? Biko, cheta na ndị na-eso ụzọ Jizọs arịọghị Chineke ka o mee ka ọnwụnwa ghara ịbịara ha. Ha chetara nke ọma na Jizọs gwara ha, sị: “Ọ bụrụ na ha kpagburu m, ha ga-akpagbukwa unu.” (Jọn 15:20) Kama, ha rịọrọ Jehova ka o “leba anya” ná mmaja ndị na-emegide ha na-amaja ha. (Ọrụ 4:29) Ndị ahụ ji obi ha niile na-eso ụzọ Jizọs ghọtara na ihe kacha mkpa bụ ka uche Chineke mezuo. Ha ghọtara na mkpagbu a na-akpagbu ha na-emezu amụma. Ha ma na n’agbanyeghị ihe ụmụ mmadụ nkịtị bụ́ ndị ọchịchị nwere ike ikwu, ‘uche Chineke ga-eme n’ụwa’ otú Jizọs kụziiri ha ka ha na-ekpe n’ekpere.​—Mat. 6:9, 10.

17 Ebe ọ bụ na ndị na-eso ụzọ Jizọs chọrọ ime uche Jehova, ha rịọrọ ya n’ekpere, sị: ‘Nye anyị bụ́ ndị ohu gị ike ka anyị na-ekwu okwu gị n’atụghị egwu ọ bụla.’ Olee ihe Jehova mere ozugbo? “Ebe ahụ ha zukọtara mara jijiji. Ha niile wee jupụta na mmụọ nsọ, na-ekwukwa okwu Chineke n’atụghị egwu.” (Ọrụ 4:29-31) O nweghị ihe ga-eme ka uche Chineke ghara imezu. (Aịza. 55:11) N’agbanyeghị otú nsogbu anyị ma ọ bụ ndị na-emegide anyị siruru n’ike, ọ bụrụ na anyị arịọ Chineke arịrịọ n’ekpere, obi kwesịrị isi anyị ike na ọ ga-enye anyị ike anyị ga-eji nọgide na-ekwusa okwu ya n’atụghị egwu.

‘Ọ Bụ Chineke Ka Ha Ghaara Ụgha, Ọ Bụghị Mmadụ’ (Ọrụ 4:32–5:11)

18. Gịnị ka ndị nọ n’ọgbakọ dị na Jeruselem meere ibe ha?

18 Ọ dịghị anya, ọgbakọ ọhụrụ a dị na Jeruselem mụbara karịa puku mmadụ ise (5,000).d N’agbanyeghị na ndị na-eso ụzọ Jizọs si ebe dị iche iche, ha “nwere otu obi.” Ihe ha niile na-eche bụ otu. (Ọrụ 4:32; 1 Kọr. 1:10) Ihe ndị na-eso ụzọ Jizọs mere abụghị naanị ikpe ikpere ka Jehova gọzie mbọ ha na-agba. Ha mere ka okwukwe ibe ha sie ike, jirikwa ihe ha nwere nyere ibe ha aka mgbe ha kwesịrị ime otú ahụ. (1 Jọn 3:16-18) Dị ka ihe atụ, onye na-eso ụzọ Jizọs aha ya bụ Josef, onye ndịozi kpọrọ Banabas, rere ala ya ma weta ego niile o retara ka e were ya nyere ndị si ebe dị anya bịa aka ka ha nọtụkwuo na Jeruselem ma mụtakwuo ihe banyere otú ọhụrụ ha ga na-esi efe Chineke.

19. Gịnị mere Jehova ji gbuo Ananayas na Safaịra?

19 Otu di na nwunye aha ha bụ Ananayas na Safaịra rekwara ala ha ma wetara ndịozi ego ala ahụ. Ha mere ka à ga-asị na ha wetara ego niile ha retara, ma ha “zoro ụfọdụ” n’ime ha. (Ọrụ 5:2) Jehova gburu di na nwunye a, ọ bụghị n’ihi na ego ha nyere ebughị ibu, kama n’ihi na ha bu ihe ọjọọ n’obi nye ego ahụ, ghọọkwa aghụghọ n’elu ya. ‘Ọ bụ Chineke ka ha ghaara ụgha, ọ bụghị mmadụ.’ (Ọrụ 5:4) Ananayas na Safaịra kpara àgwà ka ndị ihu abụọ Jizọs katọrọ. Ihe bụ́ mkpa ha bụ ka ndị mmadụ too ha, ọ bụghị ka ha mee ihe dị Chineke mma.​—Mat. 6:1-3.

20. Olee ihe ndị anyị mụtara banyere inye Jehova onyinye?

20 Ọtụtụ nde Ndịàmà Jehova taa na-emesapụ aka ka ezigbo ndị na-eso ụzọ Jizọs nọ na Jeruselem n’oge ndịozi. Ha na-eji obi ha niile enye onyinye iji kwadoo ọrụ ikwusa ozi ọma a na-arụ n’ụwa niile. E nweghị onye a na-amanye ka o nye ego ma ọ bụ oge ya iji kwadoo ọrụ a. N’eziokwu, Jehova achọghị ka anyị ghara isi n’obi anyị na-ejere ya ozi ma ọ bụ na-eje ya ka à manyere anyị amanye. (2 Kọr. 9:7) Ihe dị Jehova mkpa mgbe anyị na-enye onyinye abụghị ego ole anyị nyere, kama ọ bụ ihe anyị bu n’obi nye ya. (Mak 12:41-44) Anyị ekwesịghị ịdị ka Ananayas na Safaịra. Ihe mere anyị ji ejere Chineke ozi ekwesịghị ịbụ maka na anyị na-achọ ihe ga-abara naanị anyị uru ma ọ bụ na anyị na-achọ ka ndị ọzọ too anyị. Kama, ka anyị mee ka Pita, Jọn, na Banabas. N’oge niile, ka ọ bụrụ maka na anyị hụrụ Chineke na mmadụ ibe anyị n’anya mere anyị ji ejere Jehova ozi.​—Mat. 22:37-40.

PITA BỤ ONYE ỌKỤ AZỤ̀ NKE GHỌRỌ ONYEOZI NA-ANỤ ỌKỤ N’OBI

E nwere aha ise a kpọrọ Pita n’Akwụkwọ Nsọ. A kpọrọ ya Simiọn n’asụsụ Hibru, kpọọkwa ya Saịmọn n’asụsụ Grik. A kpọrọ ya Pita, kpọọkwa ya Sifas n’asụsụ Arameik. A kpọkwara onyeozi Jizọs a Saịmọn Pita, bụ́ aha ya abụọ a na-akpọkọta ọnụ.​—Mat. 10:2; Jọn 1:42; Ọrụ 15:14.

Ebe Pita onyeozi bu nkata azụ̀ juru

Pita lụrụ nwaanyị. Ya na ọgọ ya nwaanyị na nwanne ya nwoke bụ́ Andru bi n’ụlọ ya. (Mak 1:29-31) Ọ bụ onye ọkụ azụ̀ si n’obodo a na-akpọ Betsaịda, nke dị n’ebe ugwu Oké Osimiri Galili. (Jọn 1:44) O mechara biri na Kapaniọm, bụ́ obodo dị nso na Betsaịda. (Luk 4:31, 38) Ọ bụ n’ụgbọ Pita ka Jizọs nọ ọdụ mgbe ọ na-akụziri ìgwè mmadụ gbakọtara n’akụkụ Oké Osimiri Galili ihe. Ozugbo Jizọs kụzichaara ha ihe, ọ gwara Pita ka ha wụnye ụgbụ ha ná mmiri. Ha wụnyere ya, Jizọs arụọ ọrụ ebube, ha egbute ọtụtụ azụ̀. Egwu jidere Pita, ya adaa n’ala n’ụkwụ Jizọs. Ma Jizọs gwara ya, sị: “Kwụsị ịtụ egwu. Si ugbu a gawa, ị ga na-akụta ndị mmadụ ná ndụ.” (Luk 5:1-11) Pita na nwanne ya Andru nakwa Jems na Jọn so na-egbukọ azụ̀ ọnụ. Ha anọ hapụrụ ọrụ igbu azụ̀ ha ma za òkù Jizọs kpọrọ ha ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ ya. (Mat. 4:18-22; Mak 1:16-18) Mgbe ihe dị ka otu afọ gachara, Pita so na mmadụ iri na abụọ Jizọs họọrọ ka ha bụrụ “ndịozi” ya.​—Mak 3:13-16.

Jizọs na-akpọrọ Pita, Jems, na Jọn ka ha soro ya mgbe ọ chọrọ ime ihe ụfọdụ pụrụ iche. Ha hụrụ mgbe Jizọs nwoghara, hụ mgbe ọ kpọlitere ada Jaịrọs n’ọnwụ, hụkwa mgbe ọ nọ ná mwute n’ogige Getsemeni. (Mat. 17:1, 2; 26:36-46; Mak 5:22-24, 35-42; Luk 22:39-46) Ọ bụkwa mmadụ atọ a na Andru jụrụ Jizọs ihe àmà ga-egosi mgbe oge ọnụnọ ya ga-abụ.​—Mak 13:1-4.

Pita anaghị ezo ọnụ, ume juru ya obi, ọ naghịkwa eche echiche ekwu okwu mgbe ụfọdụ. O yiri ka ọ̀ na-ebukarị ndị ibe ya ụzọ ekwu okwu. A gụkọta okwu niile ndịozi iri na otu ndị ọzọ kwuru n’Oziọma Matiu, Mak, Luk na Jọn, nke Pita kwuru karịrị nke ha niile kwuru. Pita jụrụ ọtụtụ ajụjụ mgbe ndị ọzọ gbara nkịtị. (Mat. 15:15; 18:21; 19:27-29; Luk 12:41; Jọn 13:36-38) Ọ bụ ya bụ onye na-ekweghị ka Jizọs saa ya ụkwụ. Ma mgbe Jizọs baara ya mba, ọ gwaziri Jizọs ka ọ saa ya ma aka ma isi.​—Jọn 13:5-10.

Ebe ọ bụ na Pita hụrụ Jizọs n’anya, ọ gbalịrị ime ka Jizọs kweta na ọ gaghị ata ahụhụ nakwa na a gaghị egbu ya. Jizọs baara ya ezigbo mba n’ihi na ihe ọ na-eche adịghị mma. (Mat. 16:21-23) N’abalị ikpeazụ Jizọs nọrọ n’ụwa, Pita kwuru na ọ bụrụgodị na ndị ọzọ niile ahapụ Jizọs, na ya agaghị ahapụ ya. Mgbe ndị iro Jizọs jidere ya, Pita ji obi ike mịrị mma agha ya lụchitere Jizọs ọgụ. O mechara soro Jizọs banye na mbara èzí nnukwu onye nchụàjà. Ma n’otu abalị ahụ, Pita gọnahụrụ Nna ya ukwu ugboro atọ. Mgbe ọ ghọtara ihe o mere, o bere ezigbo ákwá.​—Mat. 26:31-35, 51, 52, 69-75.

Obere oge tupu Jizọs apụta nke mbụ ya n’ihu ndịozi ya na Galili, Pita kwuru na ya na-aga igbu azụ̀, ndịozi ndị ọzọ esoro ya. Mgbe Pita matara na ọ bụ Jizọs nọ n’akụkụ osimiri ebe ha nọ na-egbu azụ̀, ọ mabara n’ime mmiri ma gwuru gaa n’akụkụ osimiri ahụ. Mgbe ndịozi ahụ nọ na-eri nri ụtụtụ, ya bụ, azụ̀ Jizọs hụụrụ ha, ọ jụrụ Pita ma ọ̀ hụrụ ya n’anya karịa “ihe ndị a,” ya bụ, karịa azụ̀ ndị ahụ ha gbutere. Ihe Jizọs na-eme bụ ịgba Pita ume ka o were oge ya niile na-eso ya, kama iji oge ya na-arụ ọrụ ego, dị ka ọrụ ịkụ azụ̀.​—Jọn 21:1-22.

N’ihe dị ka afọ 62-64 O.N.K., Pita kwusara ozi ọma na Babịlọn, nke dị n’Ịrak ugbu a. Ọtụtụ ndị Juu bi na Babịlọn n’oge ahụ. (1 Pita 5:13) Ọ bụ na Babịlọn ka Pita si n’ike mmụọ nsọ dee akwụkwọ ozi mbụ ya a na-akpọ Pita nke Mbụ. O nwekwara ike ịbụ ebe ahụ ka ọ nọ dee akwụkwọ ozi ya a na-akpọ Pita nke Abụọ. Jizọs “mere ka Pita bụrụ onyeozi ndị e biri úgwù.” (Gal. 2:8, 9) Pita rụchara ọrụ e nyere ya n’ihi na o nwere ọmịiko, na-anụkwa ọkụ n’obi.

JỌN BỤ ONYE NA-ESO ỤZỌ JIZỌS

Jọn onyeozi bụ nwa Zebedi, bụrụkwa nwanne Jems onyeozi. Ọ ga-abụ na aha mama ya bụ Salomi. O nwere ike ịbụ na Salomi bụ nwanne Meri nne Jizọs. (Mat. 10:2; 27:55, 56; Mak 15:40; Luk 5:9, 10) N’ihi ya, ọ ga-abụ na Jọn bụ nwa nwanne nne Jizọs. O yiri ka ezinụlọ Jọn hà bara ọgaranya. Ọrụ ịkụ azụ̀ Zebedi buru ezigbo ibu. Ọ bụ ya mere o ji goo ndị ọrụ. (Mak 1:20) Salomi so Jizọs mgbe ọ na-eje ozi ya. O jeere Jizọs ozi mgbe Jizọs nọ na Galili, mechaakwa weta mmanụ na-esi ísì ọma ọ chọrọ ka e jiri kwadebe ozu Jizọs maka olili. (Mak 16:1; Jọn 19:40) O nwere ike ịbụ na Jọn nwere ụlọ nke ya.​—Jọn 19:26, 27.

Ebe Jọn onyeozi ji akwụkwọ mpịakọta n’aka.

Ọ ga-abụ Jọn bụ onye ahụ na-eso ụzọ Jọn Onye Na-eme Baptizim nke ya na Andru guzo mgbe Jọn Onye Na-eme Baptizim hụrụ Jizọs ma kwuo, sị: “Lee Nwa Atụrụ Chineke.” (Jọn 1:35, 36, 40) Mgbe Jọn Onye Na-eme Baptizim kwuchara ihe a, ọ ga-abụ na Jọn nwa Zebedi sooro Jizọs gaa Kena ma hụ ọrụ ebube mbụ Jizọs rụrụ. (Jọn 2:1-11) Otú Jọn si kọọ ihe dị iche iche Jizọs kwuru ma mee mgbe Jizọs gara kwusaa ozi ọma na Jeruselem, Sameria, nakwa na Galili gosiri na ọ ga-abụ na o ji anya ya hụ mgbe ihe ndị ahụ mere. Anyị ma na Jọn nwere okwukwe n’ihi na ozugbo Jizọs kpọrọ ya ka ọ bụrụ onye na-eso ụzọ ya, ọ hapụrụ ụgbụ azụ̀ ya, ụgbọ mmiri ya, na ọrụ ndị ezinụlọ ya ji akpa afọ ha soro Jizọs, otú Jems, Pita, na Andru mere.​—Mat. 4:18-22.

Oziọma Matiu, Mak, Luk, na Jọn ekwughị ọtụtụ ihe gbasara Jọn otú ha kwuru gbasara Pita. Ma, Jọn na-anụkwa ọkụ n’obi ka Pita. Ọ bụ ya mere Jizọs ji gụọ ya na nwanne ya Jems Boanajis, nke pụtara “Ụmụ Égbè Eluigwe.” (Mak 3:17) Ná mmalite, Jọn nọ na-achọsi ike ka ọ bụrụ onye a ma ama. Ọ bụ ya mere ya na nwanne ya nwoke ji dunye nne ha ka ọ gaa gwa Jizọs ka o nye ha ezigbo ọkwá n’Alaeze ya. Ọ bụ eziokwu na ha nọ na-achọ ihe ga-abara naanị ha uru, ma ihe ahụ ha rịọrọ gosiri na ha kweere na Alaeze Chineke dị adị. Oké ọchịchọ ha mere ka Jizọs jiri ohere ahụ dụọ ndịozi ya niile ọdụ ma gwa ha na ha kwesịrị ịdị umeala n’obi.​—Mat. 20:20-28.

Jọn gosiri na ọ na-anụ ọkụ n’obi mgbe ọ gbalịrị igbochi otu nwoke na-abụghị onye na-eso ụzọ Jizọs iji aha Jizọs achụpụ ndị mmụọ ọjọọ. N’oge ọzọ, Jọn chọrọ ịgwa ọkụ ka o si n’eluigwe daa regbuo ndị bi n’otu obodo dị na Sameria maka na ha anabataghị ndị ozi Jizọs zipụrụ ka ha gaa kwadebere ya ihe ụfọdụ. Jizọs baara Jọn mba n’ihi ihe ndị ahụ o mere. O doro anya na Jọn mechara mụta ijide onwe ya na ime ebere, bụ́ àgwà ndị ọ ga-abụ na o nwechaghị ná mmalite. (Luk 9:49-56) N’agbanyeghị na Jọn nwere ihe ndị o mejọrọ, ọ bụ ‘onye na-eso ụzọ Jizọs, onye Jizọs hụrụ n’anya.’ N’ihi ya, mgbe ọ fọrọ obere ka Jizọs nwụọ, ọ gwara Jọn ka ọ lekọtawa nne ya bụ́ Meri.​—Jọn 19:26, 27; 21:7, 20, 24.

Jọn dịrị ogologo ndụ karịa ndịozi ndị ọzọ otú Jizọs buru n’amụma. (Jọn 21:20-22) Jọn ji obi ya niile jeere Jehova ozi ihe dị ka afọ iri asaa. Mgbe Jọn merela agadi, a tụrụ ya mkpọrọ n’agwaetiti Patmọs ‘n’ihi na ọ na-ekwu gbasara Chineke, na-agbakwa àmà banyere Jizọs.’ Ihe a mere n’oge eze ukwu bụ́ Dọmịshian na-achị Rom. Ọ bụ n’ebe ahụ ka Jọn nọ hụ ọhụụ ndị o dere n’akwụkwọ Mkpughe n’ihe dị ka afọ 96 O.N.K. (Mkpu. 1:1, 2, 9) Ọtụtụ ndị kweere na mgbe Jọn si n’ụlọ mkpọrọ pụta, ọ gara Efesọs. Ọ nọ ebe ahụ dee Oziọma Jọn nakwa akwụkwọ ozi ndị a na-akpọ Jọn nke Mbụ, Jọn nke Abụọ, na Jọn nke Atọ. E kwukwara na ọ nwụrụ n’Efesọs n’ihe dị ka afọ 100 O.N.K.

a A na-ekpe ekpere n’ụlọ nsọ mgbe a na-achụ àjà ụtụtụ na nke mgbede. A na-achụ àjà mgbede “n’awa nke itoolu,” ma ọ bụ n’ihe dị ka elekere atọ nke ehihie.

b Gụọ igbe bụ́ “Pita Bụ Onye Ọkụ Azụ̀ nke Ghọrọ Onyeozi Na-anụ Ọkụ n’Obi,” na nke bụ́ “Jọn Bụ Onye Na-eso Ụzọ Jizọs, Onye Jizọs Hụrụ n’Anya.”

c Gụọ igbe bụ́ “Nnukwu Onye Nchụàjà na Ndị Isi Nchụàjà.”

d O nwere ike ịbụ na ndị Farisii e nwere na Jeruselem n’afọ 33 O.N.K. dị naanị ihe dị ka puku mmadụ isii (6,000), ma ndị Sadusii erughị mmadụ ole ahụ. O nwere ike iso n’ihe mere ha na-achọghị ka ndịozi Jizọs na-akụzi banyere Jizọs.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya