IHE ỌMỤMỤ NKE 26
Ịkọwapụta Okwu n’Ụzọ Ezi Uche Dị na Ya
TUPU i nwee ike ịhazi okwu n’ụzọ ezi uche dị na ya, ọ dị gị mkpa inwe ihe i bu n’obi imezu. Ebumnobi gị ọ̀ bụ nanị ịgwa ndị ọzọ banyere otu isiokwu—nkwenkwe, omume, àgwà, otu ụdị akparamàgwà, ma ọ bụ ụzọ ndụ? Ị̀ na-atụ anya ịnwapụta ma ọ bụ ịgbagha otu echiche? Nzube gị ọ̀ bụ ime ka e jiri otu ihe kpọrọ ihe ka ọ bụ ịkpali ndị mmadụ ime ihe? Ma ọ̀ bụ otu onye ka ị ga-agwa okwu ma ọ bụ ìgwè buru ibu karị, iji gwa ha okwu n’ụzọ dị irè, ọ dị gị mkpa ịtụle ihe ha marawooro banyere isiokwu ahụ na ihe ha na-eche banyere ya. Mgbe i mesịworo nke a, hazie okwu gị n’ụzọ ga-enyere gị aka imezu ebumnobi gị.
Banyere ozi Sọl (Pọl) jere na Damaskọs, Ọrụ 9:22 na-akọ na ọ “na-etinye ndị Juu bi na Damaskọs ná mgbagwoju anya ka ọ na-egosi n’ụzọ ezi uche dị na ya na onye a bụ Kraịst ahụ.” Gịnị ka ihe àmà ahụ ezi uche dị na ya na-agụnye? Dị ka ihe ndekọ banyere ozi Pọl jere n’Antiọk nakwa na Tesalonaịka ka oge na-aga gosiri, o bu ụzọ kwuo okwu na-adabere n’eziokwu ahụ bụ́ na ndị Juu nakweere Akwụkwọ Nsọ Hibru nakwa na ha na-ekwu na ha kwenyere n’ihe ha na-ekwu banyere Mezaịa ahụ. Mgbe ahụzi, Pọl si n’Akwụkwọ Nsọ ndị ahụ họrọ akụkụ ndị kwuru banyere ndụ na ozi nke Mezaịa ahụ. O hotara ihe e kwuru n’ebe ndị a ma jiri ha tụnyere ihe mere n’ezie n’ihe banyere Jizọs. N’ikpeazụ, o ruru ná nkwubi okwu doro anya, nke bụ́ na Jizọs bụ Kraịst, ma ọ bụ Mezaịa ahụ. (Ọrụ 13:16-41; 17:2, 3) Ọ bụrụ na gị onwe gị kwa akọwaa eziokwu Bible n’ụzọ ezi uche dị na ya, ọ pụrụ ime ka ndị ọzọ kwenye.
Ịhazi Ụzọ A Ga-esi Kwuo Okwu Ahụ. A pụrụ ịhazi okwu n’ụzọ dịgasị iche iche ezi uche dị na ha. Ọ bụrụ na i chere na ọ bara uru, ị pụrụ iji ihe karịrị otu ụzọ mee ihe. Tụlee ụfọdụ n’ime ụzọ ndị ị pụrụ iji mee ihe.
Ịhazi okwu n’isiokwu n’isiokwu. Nke a na-agụnye ime ka okwu gị dịrị ná nkebi ná nkebi, nke nke ọ bụla n’ime ha na-atụnye ụtụ n’ebumnobi gị. Nkebi ndị ahụ pụrụ ịbụ isi ihe ndị dị mkpa iji ghọta isiokwu gị. Ha pụrụ ịbụ arụmụka ndị kwụụrụ onwe ha, ndị na-akwado ma ọ bụ na-agbagha otu ihe. A pụrụ iwebata ma ọ bụ iwepụ isi ihe ụfọdụ, ọ bụ ezie na ha metụtara isiokwu ahụ, na-adabere ná ndị na-ege gị ntị ma ọ bụkwanụ ebumnobi gị.
Lee ihe atụ nke ịhazi okwu n’isiokwu n’isiokwu. Okwu dị nkenke banyere aha Chineke pụrụ ịgụnye (1) ihe mere o ji dị mkpa ịmata aha Chineke, (2) ihe bụ́ aha Chineke, na (3) otú anyị pụrụ isi sọpụrụ aha ahụ.
A pụrụ ịmụta ọtụtụ ihe banyere ịhazi okwu n’isiokwu n’isiokwu site n’inyocha akwụkwọ ndị “ohu ahụ na-ekwesị ntụkwasị obi, nke nwekwara uche” na-ebipụta maka iji na-eduzi ọmụmụ Bible ebe obibi. (Mat. 24:45) Akwụkwọ ndị a na-enwekarị ọtụtụ isiokwu, bụ́ ndị pụrụ inyere ndị a na-amụrụ ihe aka ịghọta eziokwu Bible ndị bụ́ isi n’ozuzu ha. N’akwụkwọ ndị buru ibu karị, a na-ekewa isiakwụkwọ nke ọ bụla gaa n’isiokwu nta dị iche iche. Isiokwu nke ọ bụla na-akwadebe onye ahụ a na-amụrụ ihe maka ihe ọmụma ga-esochi ma na-atụnye ụtụ n’ịghọta ya n’ozuzu ya.
Ihe kpatara ihe na ihe ọ kpatara. Ịtụgharị uche n’ihe kpatara ihe na ihe ọ kpatara bụ ụzọ ọzọ nke isi wepụta ihe ọmụma n’ụzọ ezi uche dị na ya.
Ọ bụrụ na ọ bụ ìgwè mmadụ ma ọ bụ ndị mmadụ n’otu n’otu ka ị na-agwa okwu, bụ́ ndị ọ dị mkpa ka ha jirikwuo nlezianya chebara ihe ga-esi n’ihe ha na-eme ma ọ bụ ihe ha na-eme atụmatụ ime pụta, isi otú a eme ihe pụrụ ịdị irè. Ilu isi 7 na-enye ihe atụ magburu onwe ya banyere nke a. Ọ na-akọwa n’ụzọ doro anya otú nwa okorobịa na-enweghị uche, onye “obi amamihe kọrọ” (nke bụ́ ihe kpatara ihe) si gakwuru nwanyị na-akwa iko ma nweta ajọ ihe si na ya pụta (nke bụ́ ihe ọ kpatara).—Ilu 7:7.
Iji mesikwuo ihe ike, ị pụrụ iji ihe ọjọọ ndị na-adịghị eje ije n’ụzọ Jehova na-enweta tụnyere ihe ọma ndị na-ege Jehova ntị na-enweta. N’ịbụ onye mmụọ Jehova kpaliri, Mozis gosiri ọdịiche dị otú ahụ mgbe ọ gwara mba Izrel okwu tupu ha abanye n’Ala Nkwa ahụ.—Deut., isi 28.
Mgbe ụfọdụ, ọ na-aka mma ịmalite okwu gị site n’ime ka a mata otu ọnọdụ (nke bụ́ ihe ọ kpatara), mgbe ahụzi kwuo ihe àmà na-ezo aka n’ihe ndị tụnyere ụtụ na ya (nke bụ́ ihe kpatara ya). Nke a na-agụnyekarị usoro nke ikwu nsogbu na ngwọta ya.
Nsogbu na ngwọta ya. N’ozi ubi, mgbe ị tụlere nsogbu na-echegbu ndị mmadụ ma gosi na e nwere ngwọta na-enye afọ ojuju dịnụ, nke a pụrụ ịkpali mmadụ ige ntị. Nsogbu ahụ pụrụ ịbụ nke i welitere ma ọ bụ ihe onye nke ọzọ welitere.
Ụdị nsogbu ahụ pụrụ ịbụ eziokwu ahụ bụ́ na ndị mmadụ na-aka nká, na-anwụkwa anwụ, mgbasa mpụ gbasara ebe nile, ma ọ bụ ọdịdị ikpe na-ezighị ezi dị n’ebe nile. Ọ dịghị mkpa inwe nkwurịta okwu dị ogologo iji gosi na nsogbu dị otú ahụ dị adị, n’ihi na o doro anya. Malite nanị site n’izo aka ná nsogbu ahụ, mgbe ahụzi kwuo ngwọta ya e kwuru na Bible.
N’aka nke ọzọ, nsogbu ahụ pụrụ ịbụ nnọọ nsogbu nanị onye ahụ nwere, na-emetụta ihe ịma aka nke nne ma ọ bụ nna nanị ya na-azụ nwa na-eche ihu, nkụda obi n’ihi ọrịa siri ike, ma ọ bụ ihe isi ike mmadụ na-enwe n’ihi mmeso ọjọọ onye ọzọ na-emeso ya. Iji rụpụta ihe kasị mma, nke mbụ, ị ghaghị ịbụ onye na-ege ntị nke ọma. Bible na-enye ihe ọmụma bara uru ná nsogbu a nile. Ma ọ dị mkpa ka e jiri ya mee ihe n’ụzọ nghọta dị na ya. Ọ bụrụ na nkwurịta okwu unu ga-abara onye nke ọzọ uru n’ezie, ọ dị mkpa ka i kwuo ihe ga-ekwe omume. Mee ka o doo anya ma ị̀ na-atụle ihe ngwọta na-adịgide adịgide, ihe ga-ebelata ya ruo nwa oge, ma ọ bụ nanị ụzọ isi na-edi ọnọdụ na-agaghị agbanwe agbanwe n’usoro ihe a. N’ikwu ya n’ụzọ ọzọ, jide n’aka na isi ihe sitere n’Akwụkwọ Nsọ ndị ị na-ewepụta zuru ezu iji kwadoo nkwubi okwu ị na-eru. Ma ọ́ bụghị ya, ngwọta ahụ ị na-ezo aka na ya nwere ike ọ gaghị eyitụdị onye ahụ ihe ezi uche dị na ya.
Usoro oge ihe ji mee. Okwu ụfọdụ na-aka mma ikwu ya n’usoro oge ihe ji mee. Dị ka ihe atụ, n’akwụkwọ Ọpụpụ, e depụtara Ihe Otiti Iri ahụ n’usoro ha ji were ọnọdụ. Ná Ndị Hibru isi 11, Pọl onyeozi depụtara aha ndị ikom na ndị inyom nwere okwukwe kwesịrị nṅomi n’usoro oge mgbe ha dịrị ndụ.
Ọ bụrụ na ị kọọ ihe ndị mere n’oge gara aga n’usoro oge ha ji mee, nke a pụrụ inyere ndị na-ege gị ntị aka ịghọta otú ọnọdụ ụfọdụ si bilite. Nke a bụ otu ihe ahụ n’ihe banyere akụkọ ihe mere eme nke oge a nakwa ihe ndị mere n’oge Bible. N’ụzọ dị otú a, ị pụrụ ịdị na-ejikọta usoro oge ihe ji mee nakwa usoro ihe kpatara ihe na ihe ọ kpatara. Ọ bụrụ na ị na-eme atụmatụ ịkọwapụta ihe ndị Bible na-egosi ga-eme n’ọdịnihu, ikwu ya n’usoro oge ha ga-eji mee, ma eleghị anya ga-abụ ụzọ ga-akasị dịrị ndị na-ege gị ntị mfe ịghọta na icheta.
Iji usoro oge ihe ji mee eme ihe apụtaghị na ị ghaghị ịmalite n’isi mgbe nile. Mgbe ụfọdụ, ọ pụrụ ịdị irè karị ịkọ otu ihe nke merenụ, n’oge dabara nnọọ adaba mgbe ị na-akọ akụkọ ahụ. Dị ka ihe atụ, mgbe ị na-akọ ahụmahụ, ị pụrụ ikpebi ịkọ banyere otu oge mgbe e tinyere iguzosi ike n’ezi ihe mmadụ nye Chineke n’ule. Ebe i jiworo akụkụ ahụ mee ka e nwee mmasị n’akụkọ ahụ, ị pụrụ ikwu ihe ndị mere tupu mgbe ahụ n’usoro oge ha ji mee.
Iji Nanị Ihe Ndị Dabara Adaba Eme Ihe. N’agbanyeghị otú i si hazie okwu gị, hụ na i ji nanị ihe ndị dabara adaba mee ihe. E kwesịrị inwe njikọ n’agbata isiokwu gị na ihe ndị ị họọrọ. I kwesịkwara ichebara ndị so ná ndị na-ege gị ntị echiche. Otu isi ihe pụrụ ịdị mkpa nye otu ụdị ndị na-ege ntị, ebe ọ pụrụ ịbụ ihe na-adịghị mkpa nye ìgwè ọzọ. Ị ghaghịkwa ijide n’aka na okwu gị nile ga-atụnye ụtụ n’imezu ebumnobi gị. Ma ọ́ bụghị ya, okwu gị nwere ike ọ gakwaghị adịcha irè, ọ bụ ezie na ọ pụrụ ịdị ụtọ.
Mgbe ị na-eme nnyocha, i nwere ike ịhụ ọtụtụ ihe na-adọrọ mmasị ndị metụtara isiokwu gị. Ole n’ime ha ka ị ga-eji mee ihe? Ọ bụrụ na ị gwa ndị na-ege gị ntị ihe gabigara ókè, ị pụrụ imebi nzube gị. A ga-echeta isi ihe ole na ole a kọwapụtara nke ọma ngwa ngwa karịa ọtụtụ echiche okwu ndị e kwuru ọkụ ọkụ. Nke a apụtaghị na ọ dịtụghị mgbe e kwesịrị iwebata ihe ụfọdụ na-adọrọ mmasị. Ma ekwela ka ha mebie ebumnobi gị. Rịba ama otú e si jiri ezi uche gbakwụnye ụdị ihe ọmụma ntụkwasị dị otú ahụ n’ime Bible na Mak 7:3, 4 nakwa na Jọn 4:1-3, 7-9.
Ka i si n’otu isi ihe na-agafe n’ọzọ, lezie anya ka ị ghara ịgafere na ya oké ngwa ngwa nke na ndị na-ege gị ntị agakwaghị na-esonyere gị. Iji mee ka echiche okwu dị iche iche nwee njikọ dị irè, ọ pụrụ ịdị mkpa ka i kwuo okwu ga-ejikọta otu echiche na ọzọ. Okwu ahụ nke ga-ejikọta ya pụrụ ịbụ nkebi ahịrịokwu ma ọ bụ ahịrịokwu zuru ezu nke na-egosi njikọ dị n’echiche ndị ahụ. N’ọtụtụ asụsụ, a pụrụ iji okwu ma ọ bụ nkebi ahịrịokwu ndị dị mfe bụ́ ndị na-ejikọta okwu gosi ihe jikọrọ echiche ọhụrụ a na-ewepụta na nke bu ụzọ.
Iji nanị ihe ndị dị mkpa eme ihe na ịhazi ha n’ụzọ ezi uche dị na ya ga-enyere gị aka imezu ebumnobi gị.