Ekpere Òle Ndị Ka A Na-aza?
“A NA-EJI ekpere arụzu ọtụtụ ihe karịa ka ụmụ mmadụ chetụworo n’echiche.” Otú ahụ ka onye England ahụ na-ede abụ na narị afọ nke iri na itoolu bụ́ Alfred Tennyson kwuru. Ma ọtụtụ ndị ekpewo ekpere n’anataghị azịza ya maka ahụ ike, obi ụtọ, udo, na inwe akụ na ụba. N’eziokwu, ụfọdụ ndị na-eche na Chineke adịghị ege ntị n’ezie n’ebe ekpere dị. Ma Bible na-akpọ ya “Onye na-anụ ekpere.”—Abụ Ọma 65:2.
Nke a pụrụ nnọọ ime ka ị jụọ, sị: ‘Ònye bụ “Onye na-anụ ekpere” nke a? Ọ̀ dị ihe ndị pụrụ iche anyị na-aghaghị imezu ka e wee nụ ekpere anyị? Olee ụzọ anyị kwesịrị isi kpee ekpere? Ọ̀ bụkwa ekpere òle ndị ka a na-aza?’
A Nụrụ Ekpere Ha
Ekpere amaliteworị ịdị adị eri mgbe mmadụ malitere ịdị. Tụlee ihe banyere Ebel, bụ nwa nke nne na nna mbụ anyị, bụ́ Adam na Iv. Mgbe o chere àjà a naara nke ọma n’ihu Chineke, ihe ịrụ ụka adịghị ya na okwu arịrịọ na inye otuto so ya jee.—Jenesis 4:1-5.
Na narị afọ nke itoolu Oge Anyị, onye amụma Chineke bụ́ Jona ‘si n’afọ azụ ahụ nke a họpụtaworo ilo ya kpeere Jehova, bụ́ Chineke ya, ekpere.’ Ekpere ahụ ọ̀ dịrị irè? Ee, n’ihi na mgbe oge ụfọdụ gasịrị “Jehova wee gwa azụ ahụ okwu, o wee gbọpụta Jona n’ala akọrọ.” Mgbe ahụ, Jona gara n’ihu ịrụzu ọrụ ahụ Chineke nyere ya, bụ́ ije Nineve.—Jona 1:17; 2:1, 10; 3:1-5.
Mgbe ndị iro Devid nke Israel oge ochie nọchibidoro ya, o tiri mkpu, sị: “Jehova, nụrụ ekpere m; ṅaa ntị n’arịrịọ amara m nile: n’ikwesị ntụkwasị obi gị zaa m, na n’ezi omume gị.” (Abụ Ọma 143:1) A zara ekpere ndị ahụ Devid kpere maka nnapụta, ebe ọ bụ na ọ dịghị mgbe ọ bụla ndị iro ya nwere ihe ịga nke ọma n’igbu ya. N’ihi ya, ọ pụrụ ikwu, sị: “Jehova dị nso ndị nile na-akpọku ya, bụ́ ndị nile na-akpọku ya n’eziokwu.”—Abụ Ọma 145:18.
Imezu Ihe Ndị Bụ Isi A Chọrọ
Ya mere, o doro anya na a zara ekpere nke ndị ohu Chineke oge ochie. N’eziokwu, ha ekpeghị ekpere dị ka ihe omume nkịtị a na-emere Chineke nke na-enweghị aha. Ha ji okwukwe kpekuo Jehova ekpere, bụ́ “onye kachasị ihe nile elu n’elu ụwa nile.” (Abụ Ọma 83:18) Ya mere, ka ekpere anyị wee bụrụ ihe dị irè, isi ihe dịgasị aṅaa ka anyị na-aghaghị imezu?
Kpekuo nanị Jehova ekpere. Ọ bụ ihe na-abaghị uru—n’eziokwu, ihe megidere Akwụkwọ nsọ—ikpeku chi ụgha dị iche iche ekpere, ndị ihe oyiyi ha dị iche iche ndị na-adịghị ndụ nwere ọnụ ndị a na-ejighị ekwu okwu, ntị ndị na-adịghị anụ ihe, aka ndị na-adịghị enwe mmetụta, ụkwụ ndị na-adịghị emegharị emegharị, na akpịrị ndị na-enweghị ụda olu. (Abụ Ọma 115:5-7; 1 Jọn 5:21) N’ụzọ na-eyighị chi ndị ahụ na-abaghị n’ihe, Jehova na-emere ndị ahụ hụrụ ya n’anya, na-ejekwara ya ozi, ihe. Dị ka ihe atụ, n’ọtụtụ narị afọ gara, ndị amụma nke chi ụgha ahụ bụ́ Beal kpọrọ ya òkù ka o si n’eluigwe zidata ọkụ. Ọ bụ ezie na ha kpere ekpere site n’ụtụtụ ruo uhuruchi, Beal apụghị ịza ha. Mgbe ahụ, Elaịja kpọkuru Jehova, bụ́ onye zara site n’izidata ọkụ nke rechapụrụ ihe àjà e dokwasịrị n’ebe ịchụ àjà.—1 Ndị Eze, isi 18.
Na-abịakwute Chineke site nanị n’aha Jisọs Kraịst. Jehova Chineke zitere Ọkpara ọ mụrụ nanị ya, bụ́ Jisọs Kraịst n’ụwa ka o jee ozi dị ka ihe mgbapụta iji napụta ụmụ mmadụ site ná mmehie na ọnwụ. (Jọn 3:16, 36; Ndị Rom 5:12; 6:23) Ya mere, nye ndị ji onyinye nke a na-eme ihe, Chineke meghere ụzọ ọhụrụ a ga-esi na-abịakwute ya site n’ekpere. Ndị ohu Jehova tupu mgbe ahụ, dị ka onye ọbụ abụ bụ́ Devid, kpekuru Jehova ekpere n’ejighị aha onye ọ bụla. (Abụ Ọma 4:1; 17:1; 55:1; 102:1) Ma ụzọ ọhụrụ ahụ e si abịakwute ya bụ site n’aha jisọs, onye kwuru, sị: “Ọ dịghị onye ọ bụla na-abịakwute Nna m, ma ọ bụghị site na mụ. Ọ bụrụ na unu [ga-arịọ, NW] ihe ọ bụla n’aha m, nke ahụ ka m ga-eme.” (Jọn 14:6, 14) Ọ dịghị ebe ọ bụla Akwụkwọ nsọ tụrụ aro na e kwesịrị ikpeku Chineke ekpere site n’onye ọ bụla ọzọ.
Ya mere, ozugbo anyị mụtaworo na anyị kwesịrị ikpeku Chineke ekpere site n’aha Jisọs, a gaghị aza ekpere anyị ma ọ bụrụ na anyị ekpekughị nanị Jehova ekpere site n’Ọkpara ya. Ma e nwekwara ihe ndị ọzọ kpatara Jehova adịghị aza ihe ka ọtụtụ n’ekpere ndị a na-ekpe.
Ihe Mere Chineke Adịghị Aza
Chineke agaghị aza ekpere anyị nanị n’ihi na anyị weere ọnọdụ pụrụ iche mgbe a na-ekpe ekpere. Akwụkwọ nsọ ekwughị na anyị aghaghị idebe ahụ anyị n’otu ọnọdụ pụrụ iche mgbe anyị na-ekpe ekpere. N’eziokwu, igbunye ikpere n’ala pụrụ igosi inwe obi umeala n’ihu Chineke. Ma ọ bụkwa ihe a na-anara nke ọma ikpe ekpere mgbe a na-eguzo ọtọ, mgbe a na-anọdụ ala iri nri, mgbe a na-ezuru ike n’elu àkwà, ma ọ bụ mgbe a na-eme ihe ndị a na-eme n’ụbọchị. (Daniel 6:10, 11; Mak 11:25) Ee, Jehova na-aza ọbụna ekpere ndị a na-ekwupụtaghị ekwupụta! Tupu ọ gwa eze Peasia na ya chọrọ ije wughachi mgbidi Jerusalem ndị dakpọsịrị adakpọsị, Nehemaịa “kpeere Chineke nke eluigwe” ekpere, Jehova zakwara ekpere ahụ. (Nehemịa 2:1-6) Ya mere, ọ bụrụ na ọnọdụ ahụ abụghị ihe dị mkpa, gịnị mere Chineke adịghị aza ọtụtụ ekpere?
Ekpere ndị ajọ omume adịghị amasị Jehova. Ee, “onye na-ewezuga ntị ya n’ịnụ iwu, ọbụna ekpere ya bụ ihe arụ” (Ilu 28:9) Site n’ọnụ Aịsaịa onye amụma, Chineke gwara ndị Ya na-agahie agahie, sị: “Mgbe unu na-agbasa ọbụ aka unu abụọ, m ga-ezonarị unu anya m abụọ: ọbụna mgbe unu na-ekpe ọtụtụ ekpere, m gaghị adị na-anụ: aka unu jupụtara n’ọbara.” (Aịsaịa 1:15) N’ụzọ kwere nnọọ nghọta, a dịghị aza ekpere ndị ajọ omume ọbụna ma a sị na ha kpegaara ya Chineke site na Kraịst.
Chineke adịghị aza ekpere ndị ihu abụọ. “Mgbe ọ bụla unu na-ekpekwa ekpere,” ka Jisọs sịrị, “unu agaghị adị ka ndị ihu abụọ ahụ: n’ihi na ọ na-atọ ha ụtọ iguzo n’ụlọ nzukọ unu na nkuku ámá unu ikpe ekpere, ka ha wee were onwe ha gosi mmadụ. N’ezie asị m unu, ha na-enwezu ụgwọ ọrụ ha.” Jisọs kwukwara, sị: “Ma gị onwe gị, mgbe ọ bụla ị na ekpe ekpere, baa n’ime ụlọ nta gị, mgbe i mechisikwara ụzọ gị, kpeere Nna gị nke dị na nzuzo, Nna gị nke na-ahụ ihe na nzuzo ga-enyeghachikwa gị.” (Matiu 6:5, 6) Site n’ikwu nke a, Jisọs amachibidoghị ekpere ihu ọha nile iwu, n’ihi na ya onwe ya kpere ekpere ebe a ga-anụ ya anụ n’ihu ndị ọzọ. (Matiu 14:19) Ma Kraịst na-egosi na ọ dị njọ ikpe ekpere n’ihu ọha nanị ka ndị ọzọ wee hụ, nụkwa, ka e wee natakwa otuto nke ndị mmadụ.
Jehova adịghị aza ekpere ndị a na-ejighị ezi obi kpee, ndị bụkwa okwu nkwughachi efu. Jisọs sịrị: “Ma mgbe unu na-ekpe ekpere, unu ekwula okwu nkwukwasị efu, dị ka ndị mba ọzọ na-eme: n’ihi na ha na-eche na a ga-anụ olu ha n’ọtụtụ okwu ha na-ekwu. Ya mere, unu eyila ha: n’ihi na Nna unu matara ihe nile dị unu mkpa, mgbe unu akarịọghị ya.” (Matiu 6:7, 8) Ọtụtụ ndị bi n’ala ebe Ọwụwa Anyanwụ na-eche na mgbe ọ bụla ha fegharịrị wiilu ekpere (bụ́ drọnụ ebe a chịnyejuru ekpere ndị e dere ede), na a na-arịọghachi arịrịọ ha. Ọtụtụ nde ndị ọzọ na-eji chapleti eme ihe ma ọ bụ na-agụghachi ekpere site n’akwụkwọ ekpere dị iche iche. Ma ndị na-achọ ka Chineke nụ ekpere ha na-ezere ekpere bụ okwu nkwughachi efu, ha ga-etinyekwa uche ná ntụziaka ndị ọzọ Jisọs nyere.
“Kpeenụ Ekpere Otú A”
Ihe ọzọ Jisọs mere bụ ikwupụta ihe ọtụtụ ndị na-akpọ ekpere nlereanya. (Matiu 6:9-13) Ọ sịrị: “Ya mere, kpeenụ ekpere otú a: Nna anyị nke bi n’eluigwe, ka e doo aha gị nsọ.” Ịkpọ Chineke “Nna anyị” na-egosi na ndị ọzọ sokwa ya nwee mmekọrịta chiri anya dị ka akụkụ nke ezinụlọ ndị na-efe ya ofufe. Ido aha Chineke, bụ́ Jehova, nsọ bụ ihe kachasị mkpa, ma olee otú ọ ga-esi doo ya nsọ? Site n’iwepụ ndị ajọ omume, ọ ga-ewezụga n’aha ahụ nkọcha nile e bokwasịworo ya.—Ezikiel 38:23.
“Ka alaeze gị bịa. Ka e mee ihe ị na-achọ, dị ka e sị eme ya n’eluigwe, ka e meekwa otú ahụ n’ụwa,” ka Jisọs kwukwara. Ọchịchị Chineke, dị ka e gosipụtara ya site n’Alaeze Mesaịa nke dị n’aka Ọkpara ya n’eluigwe, ga-abịa n’oge na-adịghị anya imegide ndị nile na-emegide ọchịchị Chineke, na-ewepụ ha site n’elu ala. (Daniel 2:44) Ma gịnị ka ọ pụtara mgbe anyị na-arịọ ka e mee ihe Chineke na-achọ n’ụwa dị ka e si eme ya n’eluigwe? Nke a bụ arịrịọ ka Jehova mezuo nzube ya nile n’ihe banyere elu ala, gụnyere iwepụ ndị na-emegide ya.—Mkpughe 16:14-16; 19:11-21.
Ebe o tinyeworo Chineke, ido Ya nsọ, na nzube Ya nile n’ọkwa mbụ n’ekpere nlereanya ahụ, Jisọs gara n’ihu ikwu, sị: “Nye anyị nri taa nke ga-ezuru anyị n’ụbọchị taa.” Ịrịọ Jehova ka o nye ihe ndị dị mkpa “n’ụbọchị taa” na-akwalite okwukwe n’ikike o nwere ilekọta mkpa ndị na-efe ofufe nwere kwa ụbọchị. Nke a abụghị arịrịọ na-achọ ọdịmma onwe onye nanị maka inwebiga ihe ókè.
Jisọs kwukwara, sị: “Gbagharakwa anyị ụgwọ nile anyị ji, dị ka anyị onwe anyị gbagharawokwara ndị ji anyị ụgwọ.” (Luk 11:4 na-egosi na “ụgwọ” ndị a bụ “mmehie” dị iche iche.) Anyị pụrụ ịnata mgbaghara n’aka Chineke nanị ma ọ bụrụ na anyị agbagharawo ndị ahụ na-emehie megide anyị. (Matiu 6:14, 15) Ya mere, n’ụzọ kwesịrị nnọọ ekwesị, Pọl onyeozi kwuru, sị: “Ọbụna dị ka [Jehova, NW] weere amara gbaghara unu, unu onwe unu meekwa otú a.”—Ndị Kọlọsi 3:13.
N’imechi ekpere nlereanya ahụ, Jisọs sịrị: “Ewebala anyị n’ime ọnwụnwa, kama dọpụta anyị n’aka ajọ onye ahụ.” Ọ dịghị mgbe Jehova ‘na-eji ihe ọjọọ’ na-anwa ndị mmadụ. (Jemes 1:13) Ọnwụnwa na-abịa site n’aka ajọ onye ahụ, Setan bụ Ekwensu, ma mgbe ụfọdụ, Bible na-ekwu na Chineke ikwere ka ihe ụfọdụ na-eme pụtara na ọ bụ ya na-eme ha. (Rut 1:20, 21; Eklisiastis 7:13) N’ịzaghachi arịrịọ ahụ bụ́, “ewebala anyị n’ime ọnwụnwa,” Jehova adịghị agbakụta ndị ohu ya kwesịrị ntụkwasị obi azụ, ọ bụ ezie na ọ na-ekwere ka a nwaa ha. N’eziokwu, “Chineke kwesịrị ntụkwasị obi, onye na-agaghị ekwe ka a nwaa unu karị nke unu pụrụ ịnagide; kama n’oge ọnwụnwa ahụ ọ ga-emekwa ụzọ mgbapụ, ka unu wee nwee ike ịnagide ya.”—1 Ndị Kọrint 10:13.
Mgbe anyị na-arịọ nnapụta site n’aka ajọ onye ahụ, ihe anyị na-arịọ bụ ka a ghara ikwe ka Ekwensu merie anyị dị ka ndị ji ikwesi ntụkwasị obi na-efe Jehova ofufe. Ọ bụrụ na anyị bụ ndị ohu Chineke kwesịrị ntụkwasị obi, anyị pụrụ inwe obi ike na ọ ga-za arịrịọ dị otú ahụ, ebe Pita onyeozi dere, sị: [Jehova, NW] matara ịdọpụta ha n’ọnwụnwa, bụ́ ndị na-asọpụrụ Chineke.” (2 Pita 2:9) Leekwa nnọọ ka akụkụ nke a nke ekpere nlereanya ahụ si dị mkpa, n’ihi na Setan bụ Ekwensu, “dị ka ọdụm na-agbọ ụja, ọ na-ejegharị, na-achọ onye ọ ga-elomi”!—1 Pita 5:8.
Ihe Mere E Ji Na-aza Ekpere Ha
Chineke na-aza ekpere nke ndị ji ikwesị ntụkwasị obi na-efe ya ofufe. Ọ̀ bụ n’ihi gịnị? N’otu akụkụ, Jehova na-eme nke a n’ihi na ha na-ekpeku nanị ya ekpere, na-abịakwute ya site na Jisọs Kraịst. Ha na-ezere ajọ omume, zerekwa ekpere ihu abụọ ndị bụ okwu nkwughachi efu. Kama ikwughachi ekpere nlereanya ahụ dị ka ihe e buru n’isi, Ndịàmà Jehova na-eji nduzi ya mara mma mee ihe n’ikwupụta mmetụta ndị sitere n’ala ala obi ha n’ebe Chineke nọ. Ma e nwekwara ihe ndị ọzọ mere e ji na-aza ekpere ha.
Ndị ahụ a na-aza ekpere ha emezuwo ihe ndị bụ isi. N’ihota ndị a, Pọl dere, sị: “Onye na-abịakwute Chineke aghaghị ikwe na ọ dị, na ọ na-egosikwa onwe ya onye na-enyeghachi ndị na-achọ ya ụgwọ ọrụ.” (Ndị Hibru 11:6) Rịba ama isi ihe abụọ ndị a: Jehova na-aza ekpere nke (1) ndị ahụ kwere na Chineke dị, na (2) ndị ahụ “na-achọ ya.”
Otu n’ime ndị dị otú ahụ na narị afọ mbụ bụ onye Jentaịl ahụ ji ofufe kpọrọ ihe bụ́ Kọniliọs. O kwere na Chineke dị, ọ na-achọsikwa ya ike. Gịnị ka Kọniliọs mere ozugbo o nwetara ezi ihe ọmụma? Ee, o ji obi ya nile rara onwe ya nye Jehova Chineke, e mekwara ya baptism iji gosipụta nraranye ahụ. Mgbe nke a gasịrị, ihe àmà gosiri na Kọniliọs soro Chineke nwee ezi mmekọrịta, nke a ga-enwewokwarị mmetụta dị mma n’ebe ekpere ya nile dị.—Ọrụ 10:1-44.
Mgbe a na-emebeghị Kọniliọs baptism, ekpere ya nile ‘rịgoro nanị ịbụ ihe ncheta n’ihu Chineke.’ (Ọrụ 10:4) Otú ọ dị, site n’ịrara onwe ya nye Chineke n’ihe ndabere nke okwukwe o nwere n’àjà mgbapụta Jisọs, ịbụkwa onye e mere baptism, Kọniliọs nyere Jehova onwe ya kpam kpam. Nke a guzobere mmekọrịta chiri anya n’ụzọ dị ebube n’etiti Chineke na nwoke nke a ji ofufe kpọrọ ihe nke ukwuu—bụ́ mmekọrịta nke nyere Kọniliọs ihe ùgwù a na-akparaghị ókè nke ikpe ekpere. (Jemes 4:8) Ọ pụrụ ijekwuru Nna ya nke eluigwe site na Kraịst Jisọs, na-atụ anya na a ga-anụ ekpere ya. Nke a bụ ihe na-eme ndị nile raara onwe ha nye Chineke site na Kraịst, bụrụkwa ndị e mere baptism. Ha onwe ha na-enwetakwa ihe ùgwù a na-akparaghị ókè nke ikpe ekpere.
N’ezie, ọ na-agụ gị agụụ ka a zaa ekpere gị nile. Ya mere, ọ bụrụ na ị dịghị ejere Jehova ozi ugbu a dị ka otu n’ime ndị raara onwe ha nye na-efe ya ofufe, lee ka o si bụrụ ihe amamihe ịchọsi ya ike! Gbasoo ụzọ yiri nke ahụ Kọniliọs gbasoro, Chineke ga-azakwa ekpere gị nile.
[Ihe e dere n’ala ala peeji 6]
Olee ụzọ nrara ọ raara onwe ya nye Chineke na baptism ya si metụta ekpere nile nke Kọniliọs?