Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w99 2/15 p. 26-29
  • Saịlas—Onye Na-enye Agbamume

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Saịlas—Onye Na-enye Agbamume
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1999
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Okwu Banyere Ibi Úgwù
  • Njem Ya na Pọl
  • Ndị E Tiri Ihe ma Tụọ Mkpọrọ
  • Site na Masedonia Gaa Babilọn
  • Ihe Nlereanya A Ga-eṅomi
  • “Bịa na Masedonia Nyere Anyị Aka”
    ‘Ịgba Àmà nke Ọma Banyere Alaeze Chineke’
  • Onye Na-elekọta Ụlọ Mkpọrọ Ghọrọ Onye Kraịst
    Ihe Ị Ga-amụta n’Akụkọ Baịbụl
  • Timoti​—⁠Onye Inyeaka Ọhụrụ nke Pọl
    Akwụkwọ M nke Akụkọ Bible
  • “Udo nke Chineke . . . Karịrị Echiche Niile”
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2017
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1999
w99 2/15 p. 26-29

Saịlas—Onye Na-enye Agbamume

SITE ná mmalite nke akụkọ ihe mere ndị Kraịst, ọrụ ndị nlekọta na-ejegharị ejegharị kwesịrị ntụkwasị obi na-arụ dị mkpa ma n’ịgba ọgbakọ ndị Chineke ume ma n’ịgbasa ozi ọma ahụ ruo n’ebe ụwa sọtụrụ. Otu n’ime ndị nlekọta mbụ a họpụtara bụ Saịlas, bụ́ onye amụma na otu onye a ma ama so n’ọgbakọ Jerusalem. O keere òkè pụtara ìhè n’ihe omume ndị dị mkpa n’ọrụ ime nkwusa, ọ bụkwa otu n’ime ndị ozi ala ọzọ bu ụzọ zisaa ozi ọma n’ókèala Europe. Gịnị kpọmkwem mere ka Saịlas ruo eruo ime ihe ndị a nile? Àgwà ndị dịkwa aṅaa e ji mara ya ka anyị ga-eme nke ọma iṅomi?

Okwu Banyere Ibi Úgwù

Mgbe okwu pụrụ ịkpata nkewa nke metụtara ibi úgwù bilitere n’ihe dị ka na 49 O.A., ọ dị òtù na-achị isi nọ na Jerusalem mkpa izigara ndị Kraịst ntụziaka doro anya iji dozie okwu ahụ. N’ọnọdụ ndị a, Saịlas, onye a na-akpọkwa Silvenọs, pụtara n’ihe ndekọ Bible. Ọ pụrụ ịbụworị otu n’ime ndị na-eme mkpebi, bụ́ onye a họpụtara n’oge ahụ dị ka onye ozi nke ‘ndị ozi na ndị okenye,’ ije gwa ‘ụmụnna ndị bi n’Antiọk na Siria na Silisia’ ihe ha kpebiri. N’Antiọk, Saịlas na Judas (Basabas), tinyere Banabas na Pọl, ziri ozi ahụ ha ji bịa, ihe àmà na-egosi na ha ji okwu ọnụ kọọ ihe ndị mere ná nzukọ ahụ e nwere na Jerusalem, mkpebi ndị e mere, na ihe ndị dị n’akwụkwọ ozi ahụ. Ha jikwa “ọtụtụ okwu kasie ụmụnna ahụ obi, meekwa ka obi ha guzosie ike.” Ihe na-enye obi ụtọ si na ya pụta bụ na ndị Kraịst ahụ nọ n’Antiọk ‘ṅụrịrị ọṅụ.’—Ọrụ 15:1-32.

Saịlas si otú a kere òkè dị ịrịba ama n’idozi okwu a gbara ọkpụrụkpụ. Ma ọrụ ya adịghị mfe. Ọ dịghị ụzọ a ga-esi mata otú ọgbakọ Antiọk ga-esi meghachi omume n’ihe e kpebiworo. N’ihi ya, “ọ chọrọ onye nwere oké amamihe ma dị akọ iji kọwaa ihe ndị ozi dere n’akwụkwọ ozi ha,” ka otu onye na-enye nkọwa na-ekwu. Nhọrọ a họọrọ Saịlas ịrụ ọrụ a chọrọ akọ na-agwa anyị banyere ụdị mmadụ ọ na-aghaghị ịbụworị. A pụrụ ịtụkwasị ya obi na ọ ga-eji ikwesị ntụkwasị obi kwuo ntụzi ndị sitere n’aka òtù na-achị isi. Ọ ghaghịkwa ịbụworị onye nlekọta nwere amamihe bụ́ onye pụrụ idozi okwu mgbe esemokwu bilitere n’ọgbakọ.

Njem Ya na Pọl

E jighị n’aka ma Saịlas ọ lọtara na Jerusalem mgbe ọ gasịrị ozi ahụ ma ọ bụ na ọ lọtaghị. Otú o sina dị, mgbe Banabas na Pọl nwesịrị esemokwu n’ihi Jọn Mak, Pọl họọrọ Saịlas, bụ́ onye nọ n’Antiọk n’oge ahụ, maka njem ọhụrụ nke e zubere ime iji letaghachi obodo ebe ndị Pọl mere nkwusa na ha n’oge njem ozi ala ọzọ mbụ ya.—Ọrụ 15:36-41.

Ọ pụrụ ịbụ na a họọrọ Saịlas n’ihi àgwà ziri ezi o nwere n’ebe ozi ahụ nke ịgakwuru ndị Jentaịl dị, na n’ihi mmetụta ọ pụrụ inwe dị ka onye amụma na ọnụ na-ekwuru òtù na-achị isi n’ịgwa ndị kwere ekwe nọ na Siria na Silisia mkpebi ha. Ihe ndị ọ rụpụtara magburu onwe ha. Akwụkwọ Ọrụ Ndị Ozi na-akọ, sị: “Mgbe ha na-agabiga n’obodo nile, ha wee na-enye n’aka ha iwu ahụ idebe, bụ́ nke ndị ozi na ndị okenye nọ na Jerusalem nyererị. Ya mere a na-enye nzukọ Kraịst ike n’okwukwe anyị, ọnụ ọgụgụ ha na-ababigakwa ụba ókè kwa ụbọchị.”—Ọrụ 16:4, 5.

Ka ndị ozi ala ọzọ ahụ nọ na-eme njem, mmụọ nsọ mere ka ha si n’ụzọ ha chọrọ iso gaa n’ọzọ ugboro abụọ. (Ọrụ 16:6, 7) Ka ha na-aga Timoti sonyeere ha na Listra, mgbe e busịrị “amụma” ndị a na-akọwaghị banyere ya. (1 Timoti 1:18; 4:14) Site n’ọhụụ e nyere Pọl, bụ́ onye nwekwara onyinye nke ibu amụma, a tụziiri ndị ahụ ha na ya so eme njem iji ụgbọ mmiri gaa Masedonia, nke dị na Europe.—Ọrụ 16:9, 10.

Ndị E Tiri Ihe ma Tụọ Mkpọrọ

Na Filipaị, nke bụ́ “obodo mbụ nke akụkụ ahụ,” Saịlas nwere ahụmahụ ọjọọ a na-agaghị echezọ echezọ. Mgbe Pọl chụpụsịrị otu mmụọ nke ịjụ ase n’ahụ otu nwa agbọghọ, n’ịhụ na a napụwo ha ebe ha si enweta ego, ndị nwe ya kpụụrụ Pọl na Saịlas gakwuru ndị majie obodo ahụ. N’ihi ya, mmadụ abụọ ahụ natara mkparị nke ịbụ ndị a kpọpụtara n’ihu ọha dị ka ndị mmebi iwu, dọwapụ uwe mgbokwasị ha, pịakwa ha ụtarị n’ọmà ahịa.—Ọrụ 16:12, 16-22.

Ọ bụghị nanị na ọpịpịa ụtarị dị otú ahụ bụ ntaramahụhụ dị egwu, nke na-eme ka o siere mmadụ ike inwe ntachi obi, ma n’ọnọdụ Pọl na Saịlas, ha bụkwa ihe iwu na-akwadoghị. N’ihi gịnị? Iwu Rom kwuru ka a ghara ịpịa nwa amaala Rom ọ bụla ihe. Pọl bụ nwa amaala Rom, o yikwara ka Saịlas ọ̀ bụ. Mgbe e tisịrị ha “ọtụtụ ihe otiti,” a tụbara Pọl na Saịlas n’ụlọ mkpọrọ bụ́ ebe a kpọrọ ha ọtọsị n’ụkwụ. Ndị a bụ “ihe jọgburu onwe ha,” ka Gustav Stählin na-akọwa, “bụ́ ebe a pụrụ ịgbasa ụkwụ ndị mkpọrọ ruo ókè a chọrọ, ka e wee kwụsị ha ịrahụ ụra.” Ma, n’etiti abalị, n’ịbụ ndị obi abụọ na-adịghị ya na azụ ha jupụtara n’ọnyá ndị na-afụ ụfụ, “Pọl na Saịlas na-ekpe ekpere na-abụkukwa Chineke abụ.”—Ọrụ 16:23-25.

Nke a na-agwa anyị ihe ọzọ banyere ụdị onye Saịlas bụ. Ọ ṅụrịrị ọṅụ na ha na-ata ahụhụ maka aha Kraịst. (Matiu 5:11, 12; 24:9) Ihe àmà na-egosi na nke ahụ bụ otu mmụọ ahụ nyewooro Saịlas na ndị ibe ya aka ịdị irè mgbe ha gara ozi na mbụ n’Antiọk ịgba ọgbakọ ahụ ume na iwusi ya ike, na-eme ka ndị Kraịst ibe ha ṅụrịa ọṅụ. Obi ụtọ Pọl na Saịlas aghaghị ịmụbaworị mgbe ala ọma jijiji tọhapụrụ ha n’ụlọ mkpọrọ n’ụzọ ọrụ ebube ha wee nwee ike inyere onye nche ụlọ mkpọrọ ahụ chọrọ igbu onwe ya na ezinụlọ ya aka inwe okwukwe n’ebe Chineke nọ.—Ọrụ 16:26-34.

Ịpịa ụtarị na ịtụ mkpọrọ ahụ emenyeghị Pọl ma ọ bụ Saịlas ụjọ. Mgbe e zitere ozi ka a tọhapụ ha, ha jụrụ iji ihere gbepụ na Filipaị, otú ndị majie ahụ tụrụ anya ya. Ha nọgidesiri ike ma mee ka ọnọdụ gbanwee imegide ndị ọrụ ahụ dị mpako ma dị aka ike. “Ha pịara anyị ihe n’ihu ọha mmadụ, n’amaghị anyị ikpe, ọ bụ ezie na anyị bụ ndị Rom, ha wee tụba anyị n’ụlọ mkpọrọ; hà na-achụpụkwa anyị ugbu a na nzuzo?” ka Pọl jụrụ. “Ha agaghị eme ya ma ọlị; kama ka ha onwe ha bịa dupụta anyị.” N’ịtụ egwu banyere ihe ndị ga-esi na ya pụta, ndị majie ahụ hụrụ onwe ha ịbụ ndị iwu ji ịrịọ mmadụ abụọ ahụ ka ha si n’obodo ahụ pụọ.—Ọrụ 16:35-39.

Mgbe ha si otú a mesịa ka ndị isi mara ikike ndị ha nwere dị ka ndị Rom, Pọl na Saịlas mere ihe ndị majie ahụ rịọrọ ha—ma ọ bụghị tupu ha agwa ndị enyi ha ka e mesịa. N’ikwekọ n’ihe bụ ugbu a njimara nke njem nkwusa ahụ dum, Saịlas na onye òtù ya ‘kasiri ụmụnna ahụ obi’ wee pụwa.—Ọrụ 16:40.

Site na Masedonia Gaa Babilọn

N’abụghị ndị ihe gaara abụ ahụmahụ ọjọọ kụdara mmụọ, Pọl, Saịlas, na ndị ibe ha gawara n’ubi ozi ala ọzọ ndị ọhụrụ. Ha chere ihe isi ike ihu ọzọ na Tesalọnaịka. N’ihi ihe ịga nke ọma Pọl nwere n’ozi ya n’ime oge karịrị Ụbọchị Izu Ike atọ, ndị mmegide na-ekwo ekworo kpaliri otu ìgwè na-eme ihe ike, na-eme ka ọ bụrụ ihe amamihe dị na ya ka ndị ozi ala ọzọ ahụ hapụ obodo ahụ n’abalị. Ha gawara Beria. Mgbe ha nụrụ ihe Pọl na ndị ibe ya na-arụzu n’obodo ahụ, ndị mmegide ahụ si Tesalọnaịka bịa. Nanị Pọl gawara n’ihu, ebe Saịlas na Timoti nọdụrụ na Beria iji lekọta ìgwè ndị ọhụrụ ahụ nwere mmasị. (Ọrụ 17:1-15) Saịlas na Timoti sonyeghachiri Pọl na Kọrint, na-eji akụkọ ọma na ikekwe onyinye sitere n’aka ndị enyi ya kwesịrị ntụkwasị obi nọ na Masedonia. Nke a aghaghị inyeworo onyeozi ahụ nọ ná mkpa aka ịkwụsi ọrụ ego, bụ́ nke ọ maliteworo ka ọ dị mgbe ahụ, ma jiri ume ya nile maliteghachi ime nkwusa oge nile. (Ọrụ 18:1-5; 2 Ndị Kọrint 11:9) Na Kọrint, a na-ezokwa aka n’ebe Saịlas na Timoti nọ dị ka ndị na-ezisa ozi ọma nakwa dị ka ndị ibe Pọl. Ya mere ihe àmà na-egosi na ọrụ ha akwụsịlatatụghị n’obodo ahụ.—2 Ndị Kọrint 1:19.

E chewo na ojiji e ji nnọchiaha ahụ bụ́ “anyị” mee ihe n’akwụkwọ ozi ahụ dum e degaara ndị Tesalọnaịka—ndị a nọcha na Kọrint dee n’oge a—na-apụta na Saịlas na Timoti tụnyere ụtụ n’odide ya. Otú ọ dị, echiche bụ́ na Saịlas rụrụ ọrụ odeakwụkwọ dabeere n’ụzọ bụ́ isi n’ihe Pita kwuru banyere otu n’ime akwụkwọ ozi nke ya. Pita kwuru na ya dere akwụkwọ ozi ya nke mbụ site na Babilọn “site n’aka Silvenọs, nwanna anyị kwesịrị ntụkwasị obi.” (1 Pita 5:12, 13) Ọ bụ ezie na nke a pụrụ nanị ịpụta na ọ bụ Silvenọs wegara ya, ọdịiche dị n’ụdị e ji dee akwụkwọ ozi abụọ Pita dere pụrụ igosi na o ji Saịlas mee ihe dị ka onye odeakwụkwọ iji dee akwụkwọ ozi ya nke mbụ ma ọ bụghị nke abụọ. Ya mere, ọzọ n’ime ọtụtụ onyinye na ihe ùgwù ọchịchị Chineke Saịlas nwere bụ ma eleghị anya ịbụ onye odeakwụkwọ.

Ihe Nlereanya A Ga-eṅomi

Mgbe anyị leghachiri anya azụ n’ihe ndị anyị maara na Saịlas mere, ihe ndị ọ rụzuru buru ibu. Ọ bụ ihe nlereanya mara nnọọ mma nye ndị ozi ala ọzọ na ndị nlekọta na-ejegharị ejegharị nke oge a. Ọ gara ebe ndị dị oké anya ná mfu dị ukwuu nye onwe ya n’achọghị ọdịmma onwe onye nanị, ọ bụghị iji nweta ihe onwunwe ma ọ bụ ùgwù, kama ọ bụ iji nyere ndị ọzọ aka. Ebumnobi ya bụ iji ndụmọdụ amamihe dị na ya, nke e ji akọ nye, okwu ndị na-ekpo ọkụ a kwadebere nke ọma, tinyere ịnụ ọkụ n’obi ya maka ozi ubi, gbaa ha ume. N’agbanyeghị ihe ị na-arụ n’etiti ndị Jehova a haziri ahazi, ọ bụrụ na ị na-agbalị n’otu aka ahụ inwe àgwà ziri ezi—ọbụna n’agbanyeghị ahụhụ—gị onwe gị kwa ga-abụ onye na-enye ndị kwere ekwe ibe gị agbamume.

[Map dị na peeji 29]

(Ị chọọ ịhụ ebe e sere map a, gaa n’akwụkwọ a nke e biri ebi)

Njem Ozi Ala Ọzọ nke Abụọ nke Pọl

Oké Osimiri Ahụ

Antiọk

Dabe

Listra

Aịkonịọm

Troas

Filipaị

Amfipọlis

Tesalọnaịka

Beria

Atens

Kọrint

Efesọs

Jerusalem

Sisarịa

[Ebe E Si Nweta Foto]

Mountain High Maps® Copyright © 1997 Digital Wisdom, Inc.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya