Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • bt isi 3 p. 20-27
  • ‘Ha Wee Jupụta na Mmụọ Nsọ’

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • ‘Ha Wee Jupụta na Mmụọ Nsọ’
  • ‘Ịgba Àmà nke Ọma Banyere Alaeze Chineke’
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • “Ndị Niile Na-eso Ụzọ Jizọs Zukọrọ Otu Ebe” (Ọrụ 2:1-4)
  • ‘Onye Ọ Bụla Nụrụ Ka A Na-ekwu Okwu n’Asụsụ nke Ya’ (Ọrụ 2:5-13)
  • ‘Pita Biliri Ọtọ’ (Ọrụ 2:14-37)
  • “Ka Onye Ọ Bụla n’Ime Unu Meekwa Baptizim” (Ọrụ 2:38-47)
  • Pita Emee Nkwusa na Pentikọst
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1996
  • Iso Ụzọ Kraịst Agbasaa n’Etiti Ndị Juu Narị Afọ Mbụ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2005
  • Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2003
  • Ndị ‘Si n’Asụsụ Nile’ Na-anụ Ozi Ọma
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2005
Lee Ihe Ndị Ọzọ
‘Ịgba Àmà nke Ọma Banyere Alaeze Chineke’
bt isi 3 p. 20-27

ISI NKE 3

‘Ha Wee Jupụta na Mmụọ Nsọ’

Ihe mmụọ nsọ a wụkwasịrị ha na Pentikọst mere ka ha mee

O Si n’Ọrụ Ndịozi 2:1-47

1. Kọwaa otú ihe na-adị n’ụbọchị Ememme Pentikọst.

MKPỌTỤ nọ na-eme n’okporo ámá ndị dị na Jeruselem. Obi dị mmadụ niile ụtọ.a Anwụrụ ọkụ si n’ebe ịchụàjà dị n’ụlọ nsọ na-akwụgo elu ka ndị Livaị na-abụ abụ Halel (ya bụ, Abụ Ọma 113 ruo 118), nke ndị Izrel ji eto Jaa n’oge ememme. Ọ ga-abụ na otú ha si na-abụ ya bụ ụfọdụ ndị bụọ, ndị ọzọ ekweere ha. Ndị si ebe dị iche iche dị ezigbo anya juru okporo ámá niile. Ha si ebe ndị dị ka Ịlam, Mesopotemia, Kapadoshia, Pọntọs, Ijipt, na Rom.b Gịnị ka ha bịara ime? Ọ bụ Ememme Pentikọst. A na-akpọkwa ya ‘ụbọchị ememme mkpụrụ mbụ kara aka.’ (Ọnụ Ọgụ. 28:26) A na-eme ememme a kwa afọ iji gosi na oge ịghọ ọka bali agwụla nakwa na a malitela ịghọ ọka wit. Ọ na-abụ ụbọchị ọṅụ.

Map na-egosi ebe ndị ahụ nụrụ ozi ọma na Pentikọst nke afọ 33 O.N.K. si. 1. Ógbè Ndị Ha Si: Libia, Ijipt, Etiopia, Bitinia, Pọntọs, Kapadoshia, Judia, Mesopotemia, Babịlonia, Ịlam, Midia, na Patia. 2. Obodo Ndị Ha Si: Rom, Alegzandria, Memfis, Antiọk (nke Siria), Jeruselem, na Babịlọn. 3. Mmiri Dị Iche Iche: Oké Osimiri Mediterenian, Oké Osimiri Ojii, Oké Osimiri Uhie, Oké Osimiri Kaspian, na Alaka Oké Osimiri Peshia.

JERUSELEM BỤ EBE ISI OKPUKPE NDỊ JUU DỊ

Ọtụtụ n’ime ihe ndị merenụ e dere ná mbido akwụkwọ Ọrụ Ndịozi mere na Jeruselem. Obodo a dị n’etiti ugwu ndị dị na Judia. Ọ dị n’ebe dị ihe dị ka kilomita iri ise na ise ma e si n’Oké Osimiri Mediterenian gawa n’ebe ọwụwa anyanwụ. N’afọ 1070 T.O.N.K., Eze Devid meriri ebe a rụsiri ike nke dị n’elu Ugwu Zayọn. Ọ bụ n’ebe a ka a rụrụ obodo mechara bụrụ isi obodo mba Izrel oge ochie.

Ugwu Moraya dị n’akụkụ Ugwu Zayọn. Ndị Juu oge ochie kweere na ọ bụ n’ugwu a ka Ebreham chọrọ iji Aịzik chụọ àjà n’ihe dị ka otu puku na narị afọ itoolu (1,900) tupu ihe ndị ahụ a kọrọ n’Ọrụ Ndịozi emee. Ugwu Moraya sozi n’ebe a na-akpọ Jeruselem mgbe Solomọn rụụrụ Jehova ụlọ nsọ mbụ n’elu ya. Nnukwu ụlọ nsọ ahụ ghọziri ebe ndị Juu na-anọ efe Chineke nakwa ebe ha na-anọ eme ọtụtụ ihe ndị ọzọ.

Ndị Juu niile ndị na-efe Chineke na-esi n’ebe niile n’ụwa ezukọta n’ụlọ nsọ Jehova mgbe niile maka ịchụ àjà, ife Chineke, na ime ememme ndị ha na-eme kwa afọ. Ha na-eme ya iji rube isi n’iwu Chineke nyere ha. Ọ sịrị ha: “Ugboro atọ n’afọ ka ụmụ nwoke unu niile ga-abịa n’ihu Jehova bụ́ Chineke unu n’ebe ọ ga-ahọrọ.” (Diut. 16:16) Ọ bụkwa na Jeruselem ka e nwere Sanhedrin Ukwu, ya bụ, ụlọikpe ndị Juu kacha elu nakwa ndị na-achị obodo ha.

2. Olee ihe dị egwu mere na Pentikọst afọ 33 O.N.K.?

2 N’ihe dị ka elekere itoolu n’ụtụtụ ụbọchị ahụ, n’oge opupu ihe ubi nke afọ 33 O.N.K., e nwere ihe merenụ nke a ga na-echeta ruo ọtụtụ narị afọ na-abịanụ. Na mberede, a nụrụ “ụzụ si n’eluigwe nke dị ka ụzụ oké ifufe.” (Ọrụ 2:2) A nụrụ ụzụ a n’ebe niile n’ụlọ ahụ ndị na-eso ụzọ Jizọs dị ihe dị ka otu narị mmadụ na iri abụọ (120) zukọtara. Ihe dị egwu meziri. A hụrụ ihe ndị dị ka ire ọkụ, otu dịkwa n’isi onye nke ọ bụla n’ime ndị na-eso ụzọ Jizọs.c ‘Ha wee jupụta na mmụọ nsọ.’ Ha malitekwara ikwu okwu n’asụsụ dị iche iche ndị mba ọzọ na-asụ. Mgbe ndị na-eso ụzọ Jizọs si n’ụlọ ahụ pụta, o juru ndị ahụ si esi bịa nọ n’okporo ámá Jeruselem anya, n’ihi na ndị na-eso ụzọ Jizọs nọ na-agwa ha okwu. N’eziokwu, onye ọ bụla n’ime ha na-anụ ka ha “na-ekwu okwu n’asụsụ nke ya.”​—Ọrụ 2:1-6.

3. (a) Gịnị mere Pentikọst nke afọ 33 O.N.K. ji bụrụ ụbọchị dị ezigbo mkpa n’ezigbo ofufe? (b) Olee otú Pita si jiri otu n’ime “mkpịsị ugodi Alaeze” rụọ ọrụ n’okwu o kwuru na Pentikọst nke afọ 33 O.N.K.?

3 Akụkọ a na-emetụ n’ahụ́ gosiri na e nwere ihe gbara ọkpụrụkpụ mere n’ezigbo ofufe, ya bụ, na e nweela “Izrel nke Chineke,” bụ́ ọgbakọ Ndị Kraịst e tere mmanụ. (Gal. 6:16) Ma e nwekwara ihe ndị ọzọ dị mkpa merenụ. Mgbe Pita na-agwa ìgwè mmadụ okwu n’ụbọchị ahụ, o ji otu n’ime ‘mkpịsị ugodi atọ nke alaeze’ rụọ ọrụ. E nwere ndị mkpịsị ugodi nke ọ bụla ga-eme ka ha nweta ngọzi pụrụ iche. (Mat. 16:18, 19) Mkpịsị ugodi nke mbụ a mere ka ndị Juu na ndị mba ọzọ na-ekpe okpukpe ndị Juu nabata ozi ọma, e jirikwa mmụọ nsọ Chineke tee ha mmanụ.d N’ihi ya, ha ga-eso n’Izrel nke Chineke, nweekwa olileanya ịbụ ndị eze na ndị nchụàjà ga-achị n’Alaeze Mezaya. (Mkpu. 5:9, 10) Ka oge na-aga, ndị Sameria na ndị Jentaịl ga-enwetakwa ihe ùgwù a. Gịnị ka Ndị Kraịst taa ga-amụta n’ihe ndị ahụ dị mkpa mere na Pentikọst nke afọ 33 O.N.K.?

“Ndị Niile Na-eso Ụzọ Jizọs Zukọrọ Otu Ebe” (Ọrụ 2:1-4)

4. Olee otú ọgbakọ Ndị Kraịst nke oge a si na-arụ ọrụ ọgbakọ Ndị Kraịst nke malitere n’afọ 33 O.N.K. rụrụ?

4 Mgbe ọgbakọ Ndị Kraịst malitere, ndị na-eso ụzọ Jizọs dị ihe dị ka otu narị mmadụ na iri abụọ (120). Ha ‘niile zukọrọ otu ebe,’ n’ọnụ ụlọ dị n’elu. E jikwa mmụọ nsọ tee ha mmanụ. (Ọrụ 2:1) Tupu chi ejie n’ụbọchị ahụ, e mere ọtụtụ puku mmadụ baptizim n’ọgbakọ ahụ. Ọ bụ otú a ka nzukọ a si malite ịmụba n’ike n’ike ruo taa. N’eziokwu, ọ bụ ụmụ nwoke na ụmụ nwaanyị na-atụ egwu Chineke, ya bụ, ọgbakọ Ndị Kraịst nke oge a, na-ekwusa “ozi ọma Alaeze Chineke n’ebe niile n’ụwa ka ọ bụụrụ mba niile àmà” tupu ọgwụgwụ abịa.​—Mat. 24:14.

5. Ọ bụrụ na mmadụ nọ n’ọgbakọ Ndị Kraịst n’oge ndịozi ma ọ bụkwanụ n’oge a, olee ngọzi ọ ga-enweta?

5 Ọgbakọ Ndị Kraịst ga na-enyekwara ndị nọ na ya aka ma na-eme ka okwukwe ha sie ike, ma ndị e tere mmanụ ma ndị ga-emecha bụrụ “atụrụ ọzọ.” (Jọn 10:16) Mgbe Pọl na-edegara Ndị Kraịst nọ na Rom akwụkwọ ozi, o gosiri na obi dị ya ụtọ maka otú ha si enyere ibe ha aka. O dere, sị: “Ọ na-agụsi m agụụ ike ịhụ unu, ka m nye unu onyinye si n’aka Chineke ka unu wee guzosie ike, ma ọ bụ, e kwuo ya otú ọzọ, ka unu jiri okwukwe unu gbaa m ume, mụnwa ejirikwa okwukwe nke m gbaa unu ume.”​—Rom 1:11, 12.

ROM BỤ ISI OBODO ALAEZE UKWU

N’oge ihe ndị a kọrọ n’akwụkwọ Ọrụ Ndịozi nọ na-eme, Rom bụ obodo kacha buo ibu nakwa nke a kacha anụ aha ya n’ụwa. Ọ bụ isi obodo otu alaeze ukwu nke chịrị mba dị iche iche malite na Briten ruo n’Ebe Ugwu Afrịka, malitekwa n’Oké Osimiri Atlantik ruo n’Alaka Oké Osimiri Peshia n’oge alaeze a na-akpa ike n’ụwa.

Ndị bi na Rom bụ ndị si n’agbụrụ dị iche iche, ndị na-eme omenala dị iche iche, na-asụ asụsụ dị iche iche, kwerekwa ụdị ihe dị iche iche. E nwere ọtụtụ okporo ụzọ a rụrụ nke ọma n’alaeze a. N’ihi ya, ndị mmadụ na-esi ebe dị iche iche abịa na Rom, ha na-ebubatakwa ngwá ahịa n’obodo a. Ọtụtụ ụgbọ mmiri na-esi n’ọdụ ụgbọ mmiri a na-akpọ Ostia, nke dị nso na Rom, ebubatara ndị bi na Rom ihe oriri na ngwá ahịa ndị dị oké ọnụ.

N’oge ndịozi Jizọs, ihe karịrị otu nde (1,000,000) mmadụ bi na Rom. Ọ ga-abụ na ọkara ndị bi na Rom bụ ndị ohu, ya bụ, ndị omekome a mara ikpe ọnwụ, ụmụaka nne na nna ha rere ma ọ bụ hapụ, nakwa ndị mkpọrọ ndị agha Rom jidere n’agha. Ụfọdụ n’ime ndị ohu ahụ bụ ndị Juu e si na Jeruselem dọrọ n’agha mgbe ọchịagha ndị Rom bụ́ Pọmpee meriri Jeruselem n’afọ 63 T.O.N.K.

Ọtụtụ n’ime ndị na-abụghị ndị ohu bi na Rom bụ ndị ogbenye ọnụ ntụ, ndị bi n’ụlọ elu ọtụtụ ndị bijuru. Naanị ihe oriri na ego ha na-enweta bụ nke ndị ọchịchị Rom na-enye ha. Ma, ndị eze ukwu chịrị Rom rụụrụ ọhaneze nnukwu ụlọ ndị a chọrọ ezigbo mma n’isi obodo ahụ. Ụfọdụ n’ime ụlọ ndị ahụ bụ ebe a na-eme ihe nkiri nakwa ámá egwuregwu ndị buru ibu, bụ́ ebe ndị mmadụ na-aga ele ndị na-eme ihe nkiri, ebe ndị mmadụ na anụmanụ na-alụ ọgụ ruo mgbe otu n’ime ha gburu ibe ya, nakwa ebe ndị mmadụ na-eji ụgbọ ịnyịnya agba ọsọ. Ndị mmadụ anaghị akwụ ụgwọ iji lee ihe ndị ahụ.

6, 7. Olee otú ọgbakọ Ndị Kraịst taa si na-arụ ọrụ Jizọs nyere ka e kwusaara ndị mba niile ozi ọma?

6 Ọgbakọ Ndị Kraịst n’oge a na-arụ otu ọrụ ahụ e nyere ọgbakọ Ndị Kraịst n’oge ndịozi. Jizọs nyere ndị na-eso ụzọ ya ọrụ tara akpụ ha ga-arụ. Ma, ọrụ a na-eme obi ụtọ. Ọ gwara ha, sị: ‘Meenụ ndị mba niile ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ m. Na-eme ha baptizim n’aha Nna na nke Ọkpara na nke mmụọ nsọ. Na-ezi ha ka ha debe ihe niile m nyere unu n’iwu.’​—Mat. 28:19, 20.

7 Chineke ji ọgbakọ Ndịàmà Jehova na-arụ ọrụ a taa. N’eziokwu, ikwusara ndị na-asụ asụsụ dị iche iche ozi ọma adịghị mfe. Ma, Ndịàmà Jehova ebipụtala akwụkwọ ndị e ji amụ Baịbụl n’ihe karịrị otu puku (1,000) asụsụ. Ọ bụrụ na ị na-agachi ọmụmụ ihe Ndị Kraịst anya, na-ekwusa ozi ọma Alaeze ma na-eme ndị na-eso ụzọ, obi kwesịrị ịna-atọ gị ụtọ. I so na mmadụ ole na ole nọ n’ụwa taa ndị nwere ihe ùgwù ịgbara aha Jehova àmà nke ọma.

8. Olee otú e si gọzie onye ọ bụla nọ n’ọgbakọ?

8 Jehova Chineke nyere gị ụmụnna ndị nọ n’ebe niile n’ụwa iji nyere gị aka iji ọṅụ na-atachi obi n’oge a dị oké egwu. Pọl degaara Ndị Kraịst bụ́ Ndị Hibru akwụkwọ ozi, sị: ‘Ka anyị na-echebara ibe anyị echiche n’ihi na ọ ga-eme ka anyị na-ahụrịta ibe anyị n’anya ma na-arụ ezigbo ọrụ. Ka anyị ghara ịhapụ nzukọ anyị otú ụfọdụ ndị na-emekarị, kama ka anyị na-agbarịta ibe anyị ume ma na-emekwu ihe ndị a ebe anyị na-ahụ ụbọchị ahụ ka ọ na-eru nso.’ (Hib. 10:24, 25) Ọgbakọ Ndị Kraịst bụ onyinye Jehova nyere gị ka i nwee ike ịna-agba ndị ọzọ ume, ha ana-agbakwa gị ume. Nọrọ ụmụnna gị nso. Ahapụkwala ịga ọmụmụ ihe Ndị Kraịst.

‘Onye Ọ Bụla Nụrụ Ka A Na-ekwu Okwu n’Asụsụ nke Ya’ (Ọrụ 2:5-13)

Ebe ndị na-eso ụzọ Jizọs na-ezi ndị Juu na ndị mba ọzọ na-ekpe okpukpe ndị Juu ozi ọma n’okporo ámá ndị mmadụ juru.

“Anyị na-anụ ka ha na-ekwu okwu n’asụsụ anyị banyere ihe ndị dị ebube nke Chineke.”—Ọrụ 2:11

9, 10. Olee otú ụfọdụ ndị sirila wepụta onwe ha ikwusara ndị na-asụ asụsụ ọzọ ozi ọma?

9 Chegodị otú obi si tọọ ndị Juu na ndị mba ọzọ na-ekpe okpukpe ndị Juu ụtọ na Pentikọst nke afọ 33 O.N.K. Ọ ga-abụ na e nwere otu asụsụ ọtụtụ n’ime ndị ahụ bịara ememme ahụ na-asụ. O nwere ike ịbụ Grik ma ọ bụ Hibru. Ma ugbu a, “onye ọ bụla nụrụ ka ndị na-eso ụzọ Jizọs na-ekwu okwu n’asụsụ nke ya.” (Ọrụ 2:6) Ọ ga-abụrịrị na ozi ọma ahụ ha nụrụ n’asụsụ obodo ha ruru ha n’obi. Ọ bụ eziokwu na e nyeghị Ndị Kraịst nke oge a onyinye isi n’ụzọ ọrụ ebube na-asụ asụsụ ndị obodo ọzọ, ma ọtụtụ n’ime ha ewepụtala onwe ha ikwusara ndị mba niile ozi ọma Alaeze Chineke. Olee otú ha si eme ya? Ụfọdụ amụọla asụsụ ọzọ ka ha nwee ike ije ozi n’ọgbakọ dị nso nke na-amụ ihe n’asụsụ obodo ọzọ. Ụfọdụ akwagadịla ná mba ọzọ. Ọtụtụ n’ime ha achọpụtala na mbọ ha na-agba na-amasị ndị ha na-ezi ozi ọma.

10 Dị ka ihe atụ, otu nwanna nwaanyị aha ya bụ Christine na ụmụnna asaa ndị ọzọ malitere ịmụ asụsụ Gujerati. Mgbe ọ hụrụ otu nwa agbọghọ ya na ya na-arụkọ ọrụ, onye na-asụ asụsụ Gujerati, o kelere ya n’asụsụ ha. Obi tọrọ nwa agbọghọ ahụ ụtọ, ya achọọkwa ịma ihe mere Christine ji na-agbalị ịmụta asụsụ Gujerati. Christine ziri ya ozi ọma nke ọma. Ọ gwara Christine, sị: “O nweghị okpukpe ọzọ ga-agwali ndị òtù ya ka ha mụọ asụsụ a tara akpụ. A ga-enwerịrị ihe dị mkpa ị chọrọ ikwu.”

11. Olee otú anyị ga-esi jikere ejikere izisara ndị na-asụ asụsụ ọzọ ozi ọma Alaeze Chineke?

11 N’eziokwu, ọ bụghị anyị niile ga-amụli asụsụ ọzọ. Ma, anyị nwere ike jikere ejikere izisara ndị na-asụ asụsụ ọzọ ozi ọma Alaeze Chineke. Olee otú anyị ga-esi ejikere? Otu ụzọ bụ iji ihe a na-akpọ JW Language® app mụta otú e si ekele ekele n’asụsụ a na-asụkarị n’ebe anyị bi. I nwere ike ịmụta okwu ole na ole n’asụsụ ahụ bụ́ ndị nwere ike ime ka ndị mmadụ nwee mmasị ịmụ banyere Chineke. Gwa ha banyere jw.org. I nwekwara ike igosi ha vidio na akwụkwọ dị iche iche e nwere n’asụsụ ha. Ọ bụrụ na anyị ejiri ihe ndị a na-enyere ndị mmadụ aka n’ozi ọma, anyị nwere ike inwe ụdị ọṅụ ahụ ụmụnna anyị dịrị ndụ n’oge ndịozi nwere mgbe o juru ndị si mba ndị ọzọ anya ka a na-ezi “onye ọ bụla” n’ime ha ozi ọma “n’asụsụ nke ya.”

IHE A KỌRỌ GBASARA NDỊ JUU BI NA MESOPOTEMIA NAKWA N’IJIPT

Otu akwụkwọ nke kọrọ gbasara ndị Juu, ndị dịrị ndụ n’oge Jizọs Kraịst nọ n’ụwa, sịrị: “Ndị si n’alaeze ebo iri [nke Izrel] nakwa n’alaeze Juda biri na Mesopotemia, Midia na Babịlọn. Ọ bụ ndị Asiria na ndị Babịlọn dọọrọ ha n’agha laa ebe ndị ahụ.” Ezra 2:64 kwuru na ọ bụ naanị ndị Izrel dị “puku mmadụ iri anọ na abụọ, narị atọ na iri isii (42,360) si n’ebe a dọọrọ ha n’agha na Babịlọn lọta. Ha lọtara na 537 T.O.N.K. Fleviọs Josifọs kwuru na ndị Juu “bi na Babịlonia” n’oge ndịozi Jizọs ruru ọtụtụ iri puku. N’agbata otu puku afọ na narị afọ asaa gara aga na otu puku afọ na narị afọ ise gara aga, ndị Juu bi n’ebe ndị ahụ dere iwu niile na-achị ndị Juu n’akwukwọ ma kpọọ ya Talmud nke Babịlọn.

E nwere ihe ndị e dere ede gosiri na ndị Juu biri n’Ijipt n’ihe dị ka puku afọ abụọ na narị afọ isii gara aga, ọ ga-abụkwa na ha amalitela ibi n’ebe ahụ tupu mgbe ahụ. N’oge ahụ, Jeremaya ziri ndị Juu bi na Memfis nakwa n’obodo ndị ọzọ dị n’Ijipt ozi Jehova ziri ha. (Jere. 44:1, na ihe e dere n’ala ala peeji ya.) O nwere ike ịbụ na ọtụtụ ndị Juu kwagara Ijipt n’agbata afọ 323 na afọ 30 T.O.N.K. mgbe ndị Gris na-achị. Josifọs kwuru na ndị Juu so ná ndị mbụ gara biri n’Alegzandria. Ka oge na-aga, e nyeziri ha otu mpaghara n’obodo ahụ. N’oge ndịozi Jizọs, onye Juu na-ede akụkọ aha ya bụ Filo kwuru na otu nde mmadụ bụ́ ndị Juu ibe ya bi n’ebe niile n’Ijipt, malite “n’akụkụ Libia ruo n’ókè Ijipt na Etiopia.”

‘Pita Biliri Ọtọ’ (Ọrụ 2:14-37)

12. (a) Olee amụma Joel buru nke ihe ebube ahụ mere na Pentikọst afọ 33 O.N.K. mezuru? (b) Gịnị mere ndị na-ezo ụzọ Jizọs ji tụọ anya na amụma Joel buru ga-emezu n’oge ndịozi?

12 ‘Pita biliri ọtọ’ ịgwa ìgwè mmadụ ahụ si mba dị iche iche okwu. (Ọrụ 2:14) Ọ kọwaara ndị niile chọrọ ige ntị na ọ bụ Chineke rụrụ ọrụ ebube mere ka ha sụọ asụsụ dị iche iche iji mezuo amụma Joel buru, sị: “M ga-awụkwasị mmụọ m n’ahụ́ ụdị mmadụ ọ bụla.” (Joel 2:28) Tupu Jizọs alaghachi n’eluigwe, ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: “M ga-arịọkwa Nna m, ọ ga-enye unu ihe inyeaka ọzọ.” Jizọs kwuru na ihe inyeaka ahụ bụ ‘mmụọ nsọ.’​—Jọn 14:16, 17.

13, 14. Olee otú Pita si mee ka okwu ya ruo ndị ọ gwara okwu n’obi, oleekwa otú anyị nwere ike isi na-eme ka ya?

13 Pita gwaziri ìgwè mmadụ ahụ hoo haa, sị: “Ka ndị Izrel niile mara n’eziokwu na Chineke mere ka Jizọs a unu kpọgidere n’osisi bụrụ Onyenwe anyị na Kraịst.” (Ọrụ 2:36) N’eziokwu, ọtụtụ n’ime ndị ahụ Pita gwara okwu anọghị mgbe a kpọgburu Jizọs n’osisi ịta ahụhụ. Mana, ebe ọ bụ na ha so ná mba Izrel, mmehie ahụ dị ha n’isi. Ị̀ hụrụ na Pita kwanyeere ndị Juu ibe ya ùgwù mgbe ọ na-agwa ha okwu, kwuokwa okwu ahụ otú ruru ha n’obi? Ihe Pita bu n’obi bụ ime ka ndị na-ege ya ntị chegharịa, ọ bụghị ịma ha ikpe. Ihe ahụ Pita kwuru ò were ìgwè mmadụ ahụ iwe? Mbanụ! Kama, “o wutere ha nnọọ.” Ha ajụọ, sị: “Gịnị ka anyị kwesịrị ime?” O nwere ike ịbụ na otú ahụ Pita si kwanyere ha ùgwù mgbe ọ na-agwa ha okwu mere ka ihe ọ na-ekwu ruo ọtụtụ n’ime ha n’obi, ha echegharịa.​—Ọrụ 2:37.

14 Anyị nwere ike ịna-ekwu okwu na-eru ndị mmadụ n’obi ka Pita. Mgbe anyị na-ezi ndị mmadụ ozi ọma, anyị ekwesịghị ikwu okwu n’ihe niile na-abụghị eziokwu onyenwe ụlọ kwuru. Kama, ọ ka mma ikwu okwu n’ihe anyị na ya nwere otu olu na ya. Ọ bụrụ na anyị emee otú ahụ, anyị nweziri ike iji akọ mee ka ha ghọta Okwu Chineke. Ọtụtụ mgbe, ọ bụrụ na anyị esi otú ahụ na-akọwa eziokwu ndị dị na Baịbụl, ọ ga-aka adịrị ndị nwere ezi obi mfe ikwere ihe anyị kwuru.

OTÚ E SI NWEE NDỊ NA-ESO ỤZỌ KRAỊST NA PỌNTỌS

Ndị so nụ ihe Pita kwuru n’ụbọchị Pentikọst nke afọ 33 O.N.K. bụ ndị Juu si Pọntọs. Pọntọs dị n’ebe ugwu Eshia Maịnọ. (Ọrụ 2:9) O doro anya na mgbe ụfọdụ n’ime ha laghachiri n’obodo ha, ha ziri ndị obodo ha ozi ọma ha nụrụ na Jeruselem. Ihe mere anyị ji kwuo otú ahụ bụ na ndị so ná ndị Pita degaara akwụkwọ ozi mbụ ya bụ ndị na-eso ụzọ Jizọs “bi ebe dị iche iche,” nke Pọntọs so na ha.g (1 Pita 1:1) Ihe o dere gosiri na Ndị Kraịst ahụ “ataala ahụhụ . . . n’ihi ọnwụnwa dị iche iche” bịaara ha maka na ha nwere okwukwe. (1 Pita 1:6) O nwere ike ịbụ na ụfọdụ ọnwụnwa bịaara ha bụ mmegide na mkpagbu.

E kwukwara banyere ọnwụnwa ndị ọzọ bịaara Ndị Kraịst bi na Pọntọs n’akwụkwọ ozi Plini nke Nta, bụ́ gọvanọ chịrị ógbè ndị Rom bụ́ Bitinia na Pọntọs, degaara Eze Ukwu bụ́ Trajan. N’akwụkwọ ozi Plini nọ na Pọntọs dee n’ihe dị ka afọ 112 O.N.K., o kwuru na okpukpe ndị na-eso ụzọ Kraịst yiri ọrịa nke chọrọ ife mmadụ niile, ma nwoke ma nwaanyị, ma dimkpa ma nwata, ma ndị nwere ego ma ndị ogbenye. Plini gwara ndị ahụ e kwuru na ha bụ Ndị Kraịst ka ha kwuo na ha abụghịzi Ndị Kraịst. O gburu ndị na-ekweghị ekwu otú ahụ. Ọ hapụrụ onye ọ bụla bụrụ Kraịst ọnụ ma ọ bụ kpeere chi ha dị iche iche ma ọ bụ Eze Trajan a kpụrụ akpụ ekpere. Plini kwetara na a gaghị amanyeli “ndị bụ́ ezigbo Ndị Kraịst ime ihe ndị a.”

g Okwu a sụgharịrị “bi ebe dị iche iche” si n’okwu Grik na-ekwu maka ndị Juu “bi n’obodo ndị ọzọ.” O gosiri na ọtụtụ n’ime ndị mbụ ghọrọ Ndị Kraịst bụ ndị Juu.

“Ka Onye Ọ Bụla n’Ime Unu Meekwa Baptizim” (Ọrụ 2:38-47)

15. (a) Olee ihe Pita kwuru, oleekwa ihe mere mgbe o kwuchara ihe ahụ? (b) Gịnị mere ọtụtụ puku mmadụ e ziri ozi ọma na Pentikọst ji ruo eruo ka e mee ha baptizim n’otu ụbọchị ahụ?

15 N’ụbọchị ahụ pụrụ iche bụ́ Pentikọst nke afọ 33 O.N.K., Pita gwara ndị ahụ gere ya ntị, ya bụ, ndị Juu na ndị mba ọzọ na-ekpe okpukpe ndị Juu, sị: “Chegharịanụ, ka onye ọ bụla n’ime unu meekwa baptizim.” (Ọrụ 2:38) N’ihi ya, e mere ihe dị ka puku mmadụ atọ (3,000) baptizim.e Ọ ga-abụ n’ọdọ mmiri ndị dị na Jeruselem ma ọ bụ n’ebe dị nso na Jeruselem ka e mere ha baptizim. È mere ha baptizim ahụ oké ngwa ngwa? Akụkọ a ò kwesịrị ime ka ndị a na-amụrụ Baịbụl na ụmụaka nne na nna ha bụ Ndị Kraịst chọwa ka e mee ha baptizim mgbe ha na-erubeghị eru? Mba. Cheta na ndị Juu ahụ na ndị mba ọzọ ahụ na-ekpe okpukpe ndị Juu e mere baptizim n’ụbọchị Pentikọst nke afọ 33 O.N.K. na-amụchi Okwu Chineke anya, ha sokwa ná mba nyefere Jehova onwe ha. Ihe ọzọ bụ na ihe gbasara ofufe Chineke na-anụ ha ọkụ n’obi. Ụfọdụ n’ime ha na-aga njem dị ezigbo anya ka ha nwee ike iso mee ememme a a na-eme kwa afọ. Mgbe ha nabatachara eziokwu ndị dị mkpa banyere ọrụ Jizọs Kraịst na-arụ n’imezu uche Chineke, ha dị njikere ịnọgide na-efe Chineke. Ugbu a, ha bụzi ndị na-eso ụzọ Kraịst e mere baptizim.

OLE NDỊ BỤ NDỊ MBA ỌZỌ NA-EKPE OKPUKPE NDỊ JUU?

“Ma ndị Juu ma ndị mba ọzọ na-ekpe okpukpe ndị Juu” nụrụ ozi ọma Pita kwusara na Pentikọst nke afọ 33 O.N.K.​—Ọrụ 2:10.

Nikọleọs, onye a kpọrọ “onye Antiọk na-ekpebu okpukpe ndị Juu,” so n’ụmụ nwoke ruru eru a họpụtara ka ha na-ahụ maka ‘ọrụ dị mkpa,’ ya bụ, nri a na-eke kwa ụbọchị. (Ọrụ 6:3-5) Ndị mba ọzọ na-ekpe okpukpe ndị Juu bụ ndị Jentaịl, ya bụ, ha abụghị ndị Juu mana ha nabatara okpukpe ndị Juu. A na-ewere ha ka ndị Juu ebe ọ bụ na ha na-efe Chineke ndị Izrel ma na-edebe Iwu ya. Ha hapụkwara chi niile ọzọ, e bie ndị nwoke ha úgwù, ha esorozie mba Izrel.

Mgbe ndị Juu si na Babịlọn, bụ́ ebe a dọọrọ ha n’agha, lọta n’afọ 537 T.O.N.K., ọtụtụ n’ime ha gara biri n’ebe ndị dị anya n’Izrel. Ma, ha nọ na-ekpe okpukpe ndị Juu n’ebe ndị ahụ. N’ihi ya, ndị bi gburugburu Izrel nakwa ebe ndị ọzọ dị anya mụtara otú ndị Juu si ekpe okpukpe ha. Ndị dere akwụkwọ n’oge ochie, dị ka Hores na Seneka, kwuru na ọtụtụ ndị bi n’ebe dị iche iche ndị Juu bi nwere mmasị n’ebe ndị Juu nọ nakwa n’okpukpe ha. Ha sooro ha ma bụrụzie ndị na-ekpe okpukpe ndị Juu.

16. Olee otú Ndị Kraịst oge mbụ si jiri ihe ha nwere nyere ibe ha aka?

16 O doro anya na Jehova gọziri ìgwè mmadụ ahụ. Baịbụl sịrị: “Ndị niile ghọrọ ndị na-eso ụzọ Jizọs na-anọkọ, na-ekerịtakwa ihe niile ha nwere. Ha na-erekwa ala na ihe ndị ha nwere ma na-ekere mmadụ niile ego ha retere, onye ọ bụla enweta ego ọ ga-eji gboo mkpa ya.”f (Ọrụ 2:44, 45) N’eziokwu, ezigbo Ndị Kraịst niile kwesịrị iṅomi ụdị ịhụnanya ahụ na otú ahụ ha si jiri ihe ha nwere nyere ibe ha aka.

17. Gịnị na gịnị ka mmadụ kwesịrị ime tupu e mee ya baptizim?

17 Akwụkwọ Nsọ gosiri na e nwere ọtụtụ ihe mmadụ ga-eme tupu ya enyefee Chineke onwe ya, e meekwa ya baptizim. Onye ahụ ga-amụrịrị Okwu Chineke. (Jọn 17:3) O kwesịrị igosi na o nwere okwukwe, chegharịa n’ihe ọjọọ ọ na-emebu, gosikwa na ihe ahụ wutere ya. (Ọrụ 3:19) Ọ ga-agbanwezi ma ọ bụ tụgharịa, malitezie ime ihe Chineke chọrọ ka ọ na-eme. (Rom 12:2; Efe. 4:23, 24) Ihe ọzọ ọ ga-eme bụ ikpe ekpere nyefee Chineke onwe ya, e mezie ya baptizim.​—Mat. 16:24; 1 Pita 3:21.

18. Olee ihe ùgwù ndị na-eso ụzọ Kraịst e mere baptizim nwere?

18 Ị̀ bụ onye na-eso ụzọ Jizọs Kraịst nyeferela Chineke onwe ya, meekwa baptizim? Ya bụrụ otú ahụ, ka obi dị gị ụtọ maka ihe ùgwù i nwere. Jehova nwere ike iji gị gbaara ndị mmadụ àmà nke ọma, meekwa ka ị na-eme uche ya, otú ahụ ndị na-eso ụzọ Jizọs ndị jupụtara ná mmụọ nsọ mere.

a Gụọ igbe bụ́ “Jeruselem Bụ Ebe Isi Okpukpe Ndị Juu Dị.”

b Gụọ igbe bụ́ “Rom Bụ Isi Obodo Alaeze Ukwu,” na nke dị na peeji nke 25 bụ́ “Ihe A Kọrọ Gbasara Ndị Juu Bi na Mesopotemia Nakwa n’Ijipt,” nakwa nke bụ́ “Otú E Si Nwee Ndị Na-eso Ụzọ Kraịst na Pọntọs.”

c ‘Ihe ndị ahụ dị ka ire ọkụ’ abụghị ọkụ nkịtị, kama ha “dị ka ire ọkụ.” Ọ ga-abụ na ihe a na-egosi na ihe a hụrụ n’isi onye ọ bụla n’ime ndị na-eso ụzọ Jizọs yiri ọkụ, na-egbukekwa egbuke ka ọkụ.

d Gụọ igbe bụ́ “Ole Ndị Bụ Ndị Mba Ọzọ Na-ekpe Okpukpe Ndị Juu?”

e Ihe a abụghị mmadụ ole kachanụ e metụrụla baptizim. N’Ọgọst 7, 1993, ná mgbakọ mba niile Ndịàmà Jehova mere na Kiev, Yukren, e mere puku mmadụ asaa na narị anọ na abụọ (7,402) baptizim. O were awa abụọ na nkeji iri na ise iji mechaa ha niile baptizim.

f Ihe a bụ ndokwa na-adịteghị aka e mere iji gbooro ndị ahụ si ebe ndị dị anya bịa Jeruselem mkpa ha maka na ha nọtụkwuru ka ha mụtakwuo banyere otú ọhụrụ a e si efe Chineke. Ụmụnna ndị ahụ ji obi ha nye ndị ọzọ ihe ha nwere. E kwesịghị iche na ihe onye nke ọ bụla nwere bụzi nke mmadụ niile otú a na-eme n’ọchịchị ndị Kọmunist.​—Ọrụ 5:1-4.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya