Ònye Ka “A Ga-eme Ka O Wepụga Onwe Ya”?
“Onye ọ bụla nke ga-akpọku aha Onyenwe anyị, a ga-azọpụta ya.”—ỌRỤ 2:21.
1. N’ihi gịnị ka Pentikọst 33 O.A. ji bụrụ ụbọchị dị oké mkpa n’akụkọ ihe mere eme nke ụwa?
PENTIKỌST 33 O.A. bụ ụbọchị dị oké mkpa n’akụkọ ihe mere eme ụwa. N’ihi gịnị? N’ihi na n’ụbọchị ahụ a mụrụ mba ọhụrụ. Na mbụ, ọ bụghị mba buru nnọọ ibu—nanị mmadụ 120 na-eso ụzọ Jisọs gbakọtara n’ọnụ ụlọ dị n’ụlọ elu na Jerusalem. Ma taa, mgbe e chezọworo ọtụtụ mba ndị dịrị n’oge ahụ, anyị na mba ahụ a mụrụ n’ọnụ ụlọ ahụ dị n’ụlọ elu ka nọ. Eziokwu a dị oké mkpa nye anyị nile, ebe nke a bụ mba nke Chineke họpụtara ịbụ onyeàmà ya n’ihu ihe a kpọrọ mmadụ.
2. Ihe omume ọrụ ebube dịgasị aṅaa kara ọmụmụ nke mba ọhụrụ ahụ akara?
2 Mgbe mba ọhụrụ ahụ malitere ịdị, ihe omume ndị dị mkpa mezuru okwu amụma Joel weere ọnọdụ. Anyị na-agụ banyere ihe omume ndị a n’Ọrụ 2:2-4: “Na mberede ụzụ, dị ka nke oké ifufe nke na-efesi ike, wee site n’eluigwe, o wee jupụta ụlọ ahụ dum ebe ha na-anọdụ ala. E wee mee ka ha hụ ire, dị ka nke ọkụ, na-ekesa onwe ha; o wee nọkwasị ha nile n’otu n’otu. Ha nile wee jupụta na Mmụọ Nsọ, ha wee malite ikwu okwu n’asụsụ dị iche, dị ka Mmụọ ahụ na-enye ha ike ikwuwa okwu.” N’ụzọ dị otú a ndị ikom na ndị inyom 120 ahụ kwesịrị ntụkwasị obi ghọrọ mba ime mmụọ, ndị òtù mbụ nke ihe Pọl onyeozi mesịrị kpọọ “Israel nke Chineke.”—Ndị Galetia 6:16.
3. Olee amụma Joel e mezuru na Pentikọst 33 O.A.?
3 Ìgwè mmadụ gbakọrọ ịchọpụta ihe “oké ifufe nke na-efesi ike” ahụ bụ, Pita onyeozi kọwakwaara ha na a na-emezu otu n’ime amụma Joel. Amụma ole nke? Ọ dị mma, ṅaa ntị n’ihe o kwuru: “Ọ ga-erukwa na mgbe ikpeazụ, ka Chineke kwuru, M ga-awụsa ụfọdụ n’ime Mmụọ m n’ahụ anụ ahụ nile, bụ́ mmadụ: ụmụ unu ndị ikom na ụmụ unu ndị inyom ga-ebukwa amụma, ụmụ okorobịa unu ga-ahụkwa ọhụụ, ndị okenye unu ga-arọkwa nrọ: ee, n’ahụ ndị ohu m ndị ikom na n’ahụ ndị ohu m ndị inyom ka M ga-awụsa ụfọdụ n’ime Mmụọ nke m na mgbe ahụ; ha ga-ebukwa amụma. M ga-enyekwa ọrụ ebube n’eluigwe dị n’elu, na ihe ịrịba ama n’elu ala dị n’okpuru ya; ọbara, na ọkụ, na aluluu anwụrụ ọkụ: anyanwụ ga-agbanwe ghọọ ọchịchịrị, ọnwa ga-agbanwekwa ghọọ ọbara, tupu ụbọchị Onyenwe anyị abịa, bụ́ oké ụbọchị ahụ nke na-apụta ìhè: ọ ga-erukwa, na onye ọ bụla nke ga-akpọku aha Onyenwe anyị, a ga-azọpụta ya.” (Ọrụ 2:17-21) A na-achọta okwu ndị ahụ Pita hotara na Joel 2:28-32, mmezu ha pụtakwara na oge na-agwụnarị mba ndị Juu. ‘Oké ụbọchị Jehova nke na-apụta ìhè,’ bụ́ oge ime mpịazi nye Israel na-ekwesịghị ntụkwasị obi, dị nso. Ma ònye ka a ga-azọpụta, ma ọ bụ ga-ewepụga onwe ya? Gịnịkwa ka nke a sere onyinyo ya?
Mmezu Abụọ nke Amụma
4, 5. N’ihi ihe ndị na-aga ime, olee ndụmọdụ Pita nyere, n’ihi gịnịkwa ka ndụmọdụ ahụ ji kwesị ekwesị gabiga ụbọchị ya?
4 N’afọ ndị sochiri 33 O.A., Israel ime mmụọ nke Chineke nwere ọganihu, ma mba Israel anụ ahụ enweghị. Na 66 O.A., Israel anụ ahụ na Rom na-eburịta agha. Na 70 O.A., ọ fọrọ nke nta ka Israel kwụsị ịdị adị, a gbapịakwara Jerusalem na ụlọ nsọ ya ọkụ. Na Pentikọst 33 O.A., Pita nyere ndụmọdụ dị mma n’ihi ọdachi ahụ na-abịanụ. Ọzọkwa n’ihota Joel, ọ sịrị: “Onye ọ bụla nke ga-akpọku aha Onyenwe anyị, a ga-azọpụta ya.” Onye Juu ọ bụla aghaghị ime mkpebi onwe onye ịkpọku aha Jehova. Nke a gụnyere ịṅa ntị ná ntụziaka ọzọ Pita nyere: “Chegharịanụ, ka e meekwa unu nile baptism n’otu n’otu n’aha Jisọs Kraịst ka e wee gbaghara mmehie nile unu.” (Ọrụ 2:38) Ndị na-ege Pita ntị aghaghị ịnakwere Jisọs dị ka Mesaịa ahụ, onye Israel dị ka otu mba jụworo.
5 Okwu amụma ndị ahụ nke Joel nwere mmetụta dị ukwuu n’ahụ ndị obi umeala na narị afọ mbụ. Otú ọ dị, ha nwere ọbụna mmetụta ka ukwuu taa n’ihi na, dị ka ihe ndị na-eme na narị afọ nke 20 nke a na-egosi, e nwewo mmezu nke abụọ nke amụma Joel. Ka anyị lee otú o si mee.
6. Olee otú e si malite ime ka ihe e ji amata Israel nke Chineke doo anya ka 1914 na-eru nso?
6 Mgbe ọnwụ ndị ozi gasịrị, Israel nke Chineke ghọrọ nke ata Iso Ụzọ Kraịst ụgha kpuchiri. Ma, n’ime oge ọgwụgwụ ahụ, nke malitere na 1914, ihe e ji amata mba ime mmụọ a dokwara anya ọzọ. Ihe a dum bụ ná mmezu nke ilu Jisọs nke ọka na ata. (Matiu 13:24-30, 36-43) Ka 1914 na-akpụdewe, ndị Kraịst e tere mmanụ malitere ikewapụ onwe ha site na Krisendọm na-adịghị ekwesị ntụkwasị obi, jiri obi ike na-ajụ ozizi ụgha ya ma na-ekwusa ọgwụgwụ na-abịanụ nke “oge nke mba ọzọ.” (Luk 21:24) Ma Agha Ụwa Mbụ, nke tiwapụrụ na 1914, welitere okwu ndị ha na-adịghị nkwadebe maka ha. N’okpuru ajọ nrụgide, ọtụtụ kwụsịlatara, ụfọdụ mebikwara okwukwe ha. Ka ọ na-erule 1918 ọ fọrọ nke nta ka ọrụ nkwusa ha kwụsịchaa.
7. (a) Olee ihe omume yiri ihe mere na Pentikọst 33 O.A. mere na 1919? (b) Malite na 1919, olee mmetụta mwụpụ nke mmụọ Chineke nwere n’ahụ ndị ohu Jehova?
7 Ma, nke ahụ adịteghị anya. Na-amalite na 1919, Jehova malitere ịwụkwasị ndị ya mmụọ ya n’ụzọ mere ka e cheta Pentikọst 33 O.A. Otú ọ dị, na 1919 e nweghị ịsụ asụsụ dị iche iche na oké ifufe na-efesi ike. Anyị na-aghọta site n’okwu Pọl e dekọrọ ná 1 Ndị Kọrint 13:8 na oge ọrụ ebube agafewo eri oge. Ka o sina dị, mmụọ Chineke pụtara nnọọ ìhè na 1919 mgbe, n’otu mgbakọ na Cedar Point, Ohio, U.S.A., e nyeghachiri ndị Kraịst na-ekwesị ntụkwasị obi ume, ha maliteghachikwa ọrụ nkwusa ozi ọma Alaeze. Na 1922 ha gaghachiri Cedar Point, e wee jiri òkù bụ́ “Kpọsaanụ, kpọsaanụ, kpọsaanụ Eze ahụ na alaeze ya” kpalie ha. Dị ka o meworo na narị afọ mbụ, a manyere ụwa ịmata mmetụta nke mwụpụ nke mmụọ Chineke. Onye Kraịst ọ bụla raara onwe ya nye—nwoke na nwanyị, agadi na nwatakịrị—malitere ‘ibu amụma,’ ya bụ, ịkpọsa “oké ọrụ nile nke Chineke.” (Ọrụ 2:11) Dị ka Pita, ha gbara ndị dị nwayọọ n’obi ume, sị: “Zọpụtanụ onwe unu n’ọgbọ a dị mgbagọ.” (Ọrụ 2:40) Olee otú ndị na-anakwere ihe pụrụ isi mee nke ahụ? Site n’ịṅa ntị n’okwu Joel ndị dị na Joel 2:32: “Onye ọ bụla nke ga-akpọku aha Jehova, a ga-eme ka o wepụga onwe ya.”
8. Olee otú ihe siworo gaara Israel nke Chineke eri 1919?
8 Eri afọ ndị mbụ ahụ, ihe omume nke Israel nke Chineke agawo n’ihu. Ịka ndị e tere mmanụ akara yiri ka ọ gamiwo, eri afọ ndị 1930 kwa oké ìgwè mmadụ nke ndị dị nwayọọ n’obi ndị nwere olileanya elu ụwa apụtawo. (Mkpughe 7:3, 9) Ha nile nwere echiche nke ịdị ngwa, n’ihi na mmezu nke abụọ nke Joel 2:28, 29 na-egosi na anyị nọ nso n’ụbọchị ka ọbụna ukwuu dịkwa egwu nke Jehova, mgbe a ga-ebibi usoro ihe nke okpukpe, ndọrọ ndọrọ ọchịchị, na azụmahịa zuru ụwa ọnụ. Anyị nwere nnọọ ihe mere anyị ga-eji ‘kpọkuo aha Jehova’ n’okwukwe zuru ezu na ọ ga-agbapụta anyị!
Olee Otú Anyị Si Akpọku Aha Jehova?
9. Olee ihe ụfọdụ ịkpọku aha Jehova gụnyere?
9 Gịnị ka ịkpọku aha Jehova gụnyere? Okwu gbara Joel 2:28, 29 gburugburu na-enyere anyị aka ịza ajụjụ ahụ. Dị ka ihe atụ, Jehova adịghị ege ndị nile na-akpọku ya ntị. Site n’ọnụ onye amụma ọzọ, bụ́ Aịsaịa, Jehova gwara Israel, sị: “Mgbe unu na-agbasa ọbụ aka unu abụọ, M ga-ezonarị unu anya m abụọ: ọbụna mgbe unu na-ekpe ọtụtụ ekpere, M gaghị adị na-anụ.” N’ihi gịnị ka Jehova ji jụ ige mba nke ya ntị? Ya onwe ya na-akọwa: “Aka unu jupụtara n’ọbara.” (Aịsaịa 1:15) Jehova agaghị anụ olu onye ọ bụla ikpe ọbara mara ma ọ bụ nke na-eme mmehie. Ọ bụ ya mere Pita ji gwa ndị Juu na Pentikọst ka ha chegharịa. N’okwu gbara Joel 2:28, 29 gburugburu, anyị na-ahụ na Joel kwusikwara okwu ike banyere nchegharị. Dị ka ihe atụ, na Joel 2:12, 13, anyị na-agụ: “Ma ọbụna ugbu a, (ọ bụ ihe si n’ọnụ Jehova pụta), werenụ obi unu nile, werekwa obubu ọnụ, werekwa ịkwa ákwá, werekwa iti aka n’obi, chigharịkwute m: dọwaakwanụ obi unu, adọwakwala uwe unu, chigharịkwute Jehova, bụ́ Chineke unu: n’ihi na Onye amara na Onye obi ebere ka Ọ bụ, Onye na-adịghị ewe iwe ọsọ ọsọ, Nke na-abakwa ụba n’ebere.” Malite na 1919, ndị Kraịst e tere mmanụ mere ihe kwekọrọ n’okwu ndị a. Ha siri n’ọdịda ha nile chegharịa ma kpebisie ike na ha agaghị emebi okwukwe ha ọzọ ma ọ bụ kwụsịlata. Nke a meghere ụzọ ka a wụpụ mmụọ Chineke. Onye ọ bụla chọrọ ịkpọku aha Jehova e wee nụ olu ya aghaghị ịgbaso otu ụzọ ahụ.
10. (a) Gịnị bụ ezi nchegharị? (b) Olee otú Jehova si emeghachi omume n’ebe ezi nchegharị dị?
10 Cheta, ezi nchegharị karịrị nanị ịsị, “O wutere m.” Ndị Israel na-adọwabu uwe elu ha iji gosi ịdị omimi nke mmetụta ha. Ma Jehova na-asị: “Dọwaakwanụ obi unu, adọwakwala uwe unu.” Ezi nchegharị na-esite n’obi, site n’ala ala mmetụta anyị. Ọ na-agụnye anyị ịgbakụta ihe ọjọọ azụ, ọbụna dị ka anyị na-agụ n’Aịsaịa 55:7: “Onye na-emebi iwu, ya hapụ ụzọ ya, onye na-eme ajọ ihe, ya hapụ echiche ya nile: ya laghachikwutekwa Jehova.” Ọ na-agụnye ịkpọ mmehie asị, dị nnọọ ka Jisọs mere. (Ndị Hibru 1:9) Mgbe ahụ, anyị na-atụkwasị Jehova obi ịgbaghara anyị ná ndabere nke àjà mgbapụta ahụ n’ihi na “Onye amara na Onye obi ebere ka [Jehova] bụ, Onye na-adịghị ewe iwe ọsọ ọsọ, Nke na-abakwa ụba n’ebere.” Ọ ga-anakwere ofufe anyị, onyinye ịnata ihu ọma na àjà ihe ọṅụṅụ ime mmụọ anyị. Ọ ga-ege ntị mgbe anyị kpọkuru aha ya.—Joel 2:14.
11. Olee ọnọdụ ezi ofufe kwesịrị inwe ná ndụ anyị?
11 N’Ozizi Elu Ugwu ahụ, Jisọs nyere anyị ihe ọzọ anyị ga-eburu n’uche, mgbe ọ sịrị: “Burunụ ụzọ chọọ alaeze Ya, na ezi omume Ya.” (Matiu 6:33) A gajeghị ile ofufe anyị anya dị ka ihe na-adịghị mkpa, ihe anyị na-eme n’ụzọ mmeju iwu iji mee ka akọ na uche anyị jụrụ. Ijere Chineke ozi kwesịrị inwe ọnọdụ mbụ ná ndụ anyị. N’ihi ya, site n’ọnụ Joel, Jehova gara n’ihu ikwu, sị: “Fụọnụ opi ike n’ime Zaịọn . . . meenụ ka ndị Israel zukọta, doonụ mkpọkọta Israel nsọ, chịkọtanụ ndị okenye, meenụ ka ụmụntakịrị na ndị na-aṅụ ara zukọta: ka onye na-alụ nwunye ọhụrụ si n’ime ụlọ ya pụta, ka nwunye ọhụrụ sikwa n’ụlọ ndina ya pụta.” (Joel 2:15, 16) Ọ bụ nnọọ otú ọ na-adị na ndị gbara akwụkwọ ọhụrụ na-enwe ndọpụ uche, na-eche nanị banyere ibe ha. Ma ọbụna nye ha, ijere Jehova ozi aghaghị ibute ụzọ. Ọ dịghị ihe kwesịrị ibute anyị ịbụ ndị a chịkọtaara Chineke anyị ụzọ, na-akpọku aha ya.
12. Olee ohere e nwere maka uto nke a na-ahụ n’akụkọ Ememe Ncheta maka afọ gara aga?
12 N’iburu nke a n’uche, ka anyị tụlee otu ihe ihe ndekọ nke Akụkọ Afọ Ije Ozi 1997 nke Ndịàmà Jehova kpughere. N’afọ gara aga e nwere ọnụ ọgụgụ kasị elu nke ndị nkwusa Alaeze bụ́ 5,599,931—n’ezie oké ìgwè ndị na-enye otuto! Ndị bịara Ememe Ncheta bụ 14,322,226—ihe ji ihe dị ka nde asatọ na ọkara karịa ọnụ ọgụgụ ndị nkwusa. Ọnụ ọgụgụ ahụ na-egosi ohere dị ukwuu maka uto. Ọtụtụ n’ime nde mmadụ asatọ na ọkara ahụ esoroworị Ndịàmà Jehova na-amụ Bible dị ka ndị nwere mmasị ma ọ bụ dị ka ụmụ nke ndị nne na nna e mere baptism. Ọ bụ nnọọ nke mbụ ọnụ ọgụgụ buru ibu n’ime ha na-aga nzukọ. Ha ịnọ ya nyere Ndịàmà Jehova ohere dị mma ịmatakwu ha na ịchọ inyere ha aka inwekwu ọganihu. Mgbe ahụ, e nwere ndị na-abịa Ememe Ncheta kwa afọ na ikekwe nzukọ ole na ole ndị ọzọ, ma ha adịghị enwe ọganihu ọzọ. N’ezie, anyị na-anabata ndị dị otú ahụ iso anyị zukọọ. Ma anyị na-agba ha ume ịtụgharị uche nke ọma n’okwu amụma Joel ma tụlee nzọụkwụ ndị ọzọ ha na-aghaghị iwere iji jide n’aka na Jehova ga-anụ olu ha mgbe ha kpọkuru aha ya.
13. Ọ bụrụ na anyị akpọkuwalarị aha Jehova, olee ọrụ dịịrị anyị n’ebe ndị ọzọ nọ?
13 Pọl onyeozi mesiri akụkụ ọzọ nke ịkpọku aha Chineke ike. N’akwụkwọ ozi o degaara ndị Rom, o hotara okwu amụma Joel: “Onye ọ bụla nke ga-akpọku aha Onyenwe anyị, a ga-azọpụta ya.” Mgbe ahụ, ọ tụgharịrị uche, sị: “Hà ga-esikwa aṅaa kpọkuo Onye ahụ ha aka-ekweghị na Ya? ma hà ga-esi aṅaa kwere n’Onye ahụ ha aka-anụghị okwu Ya? ma hà ga-esi aṅaa nụ ma onye na-ekwusa anọghị?” (Ndị Rom 10:13, 14) Ee, ọ dị ọtụtụ ndị ọzọ bụ́ ndị na-amatabeghị Jehova ruo ugbu a mkpa ịkpọku aha ya. Ndị mawoororị Jehova nwere ibu ọrụ ọ bụghị nanị ime nkwusa kamakwa iwepụta onwe ha ma nyere ha aka.
Paradaịs Ime Mmụọ
14, 15. Ngọzi dịgasị aṅaa nke paradaịs ka ndị Jehova na-anụ ụtọ ha n’ihi na ha na-akpọku aha ya n’ụzọ na-atọ ya ụtọ?
14 Ọ bụ otú ahụ ka ma ndị e tere mmanụ ma atụrụ ọzọ ahụ si ele ihe anya, n’ihi ya kwa, Jehova na-agọzi ha. “Jehova wee kwoo ekworo ala Ya, nwee ọmịiko n’ahụ ndị Ya.” (Joel 2:18) Na 1919, Jehova kworo ekworo, nweekwa ọmịiko maka ndị ya mgbe o weghachiri ha ma kpọbata ha n’ihe omume ime mmụọ ya. Nke a bụ n’ezie paradaịs ime mmụọ, nke Joel kọwara nke ọma n’okwu ndị a: “Atụla egwu, gị ala, tee egwú ọṅụ, ṅụrịakwa; n’ihi na Jehova emewo Onwe ya ukwuu n’ime ihe. Unu atụla egwu, unu anụ ọhịa; n’ihi na ebe ịta nri nile nke ọzara na-epupụta ahịhịa ndụ, n’ihi na osisi na-amị mkpụrụ ya, osisi fig na osisi vine na-amị mkpụrụ ka ike ha hà. Ụmụ Zaịọn, tegharịakwanụ egwú ọṅụ, ṅụrịakwa na Jehova, bụ́ Chineke unu: n’ihi na Ọ na-enye unu mmiri ozuzo mbụ ka ezi omume Ya si dị, meekwa ka oké mmiri ozuzo zodatara unu, bụ́ mmiri ozuzo mbụ na mmiri ozuzo ikpeazụ, n’ọnwa mbụ. Ebe nzọcha ọka nile ga-ejupụtakwa n’ọka wheat, ebe ịnara mmanya vine na mmanụ ga-erubigakwa ná mmanya vine ọhụrụ na mmanụ ọhụrụ.”—Joel 2:21-24.
15 Lee onyinyo mara mma ọ bụ! Ụba nke ihe atọ kasị mkpa ná ndụ n’Israel—mkpụrụ osisi, mmanụ olive, na mmanya—tinyere ìgwè anụ bara ụba. N’ụbọchị anyị a na-emezu okwu amụma ndị ahụ n’ezie n’ụzọ ime mmụọ. Jehova na-enye anyị nri ime mmụọ nile dị anyị mkpa. Ịba ụba dị otú ahụ Chineke na-enye ọ́ dịghị eme anyị nile obi ụtọ? N’ezie, dị ka Malakaị buru n’amụma, Chineke anyị ‘emeghepụwo window nile nke eluigwe, wụsa anyị ngọzi, ruo mgbe ọnọdụ na-ezughị ịnagide ya.’—Malakaị 3:10.
Njedebe nke Otu Usoro Ihe
16. (a) Gịnị ka mwụpụ nke mmụọ Jehova na-egosi maka oge anyị? (b) Gịnị ka ọdịnihu ga-abụ?
16 Ọ bụ mgbe o kwusịrị banyere ọnọdụ yiri paradaịs nke ndị Chineke nọ na ya ka Joel buru amụma banyere mwụpụ nke mmụọ Jehova. Mgbe Pita hotara amụma a na Pentikọst, o kwuru na e mezuru ya “na mgbe ikpeazụ.” (Ọrụ 2:17) Mwụpụ nke mmụọ Chineke laa azụ mgbe ahụ pụtara na mgbe ikpeazụ amalitewo maka usoro ihe ndị Juu. Mwụpụ nke mmụọ Chineke n’isi Israel nke Chineke na narị afọ nke 20 pụtara na anyị na-ebi na mgbe ikpeazụ nke usoro ihe zuru ụwa ọnụ. N’ihi nke a, gịnị ka ọdịnihu ga-abụ? Amụma Joel na-aga n’ihu ịgwa anyị: “M ga-enyekwa ihe ebube dị iche iche n’eluigwe na n’ụwa: ọbara, na ọkụ, na ogidi nke anwụrụ ọkụ. Anyanwụ ga-agbanwe ghọọ ọchịchịrị, ọnwa ga-agbanwekwa ghọọ ọbara, tupu ụbọchị Jehova abịa, bụ́ ụbọchị ahụ dị ukwuu dịkwa egwu.”—Joel 2:30, 31.
17, 18. (a) Olee ụbọchị Jehova nke dị egwu nke bịakwasịrị Jerusalem? (b) Ụbọchị Jehova nke dị egwu nke dị n’ihu ịbụ ihe e ji n’aka na-akwali anyị ime gịnị?
17 Na 66 O.A., okwu amụma ndị a malitere imezu na Judia ka ihe omume dị iche iche na-eme n’enweghị mgbochi iru ọ̀tụ̀tụ̀ kasị elu nke ụbọchị Jehova nke dị egwu na 70 O.A. Lee ka o si dị ụjọ n’oge ahụ ịnọ n’etiti ndị na-adịghị ebuli aha Jehova elu! Taa, ihe omume ndị dị nnọọ ụjọ otú ahụ dị n’ihu, mgbe Jehova ga-ebibi usoro ihe ụwa a dum. Ma, mgbapụ ga-ekwe omume. Amụma ahụ na-aga n’ihu ikwu, sị: “Ọ ga-erukwa, na onye ọ bụla nke ga-akpọku aha Jehova, a ga-eme ka o wepụga onwe ya: n’ihi na n’ugwu Zaịọn na n’ime Jerusalem ka ụfọdụ ndị gbapụrụ agbapụ ga-adị, dị ka Jehova sịworo, na n’etiti ndị fọdụrụ afọdụ ka ndị Jehova na-akpọ ga-adị.” (Joel 2:32) Ndịàmà Jehova nwere obi ekele n’ezie maka ịma aha Jehova, ha nwekwara ntụkwasị obi zuru ezu na ọ ga-azọpụta ha mgbe ha kpọkuru ya.
18 Ma, gịnị ga-eme mgbe oké ụbọchị ahụ nke na-apụta ìhè nke Jehova bịakwasịrị ụwa a n’uju ya? A ga-atụle nke ahụ n’isiokwu ikpeazụ dịịrị ọmụmụ.
Ị̀ Na-echeta?
◻ Olee mgbe mbụ Jehova wụpụrụ mmụọ ya n’isi ndị ya?
◻ Olee ihe ụfọdụ ịkpọku aha Jehova gụnyere?
◻ Olee mgbe oké ụbọchị Jehova nke na-apụta ìhè bịakwasịrị Israel anụ ahụ?
◻ Olee otú Jehova si agọzi ndị na-akpọku aha ya taa?
[Foto dị na peeji nke 15]
A mụrụ mba ọhụrụ na Pentikọst 33 O.A.
[Foto dị na peeji nke 16, 17]
Ná mmalite narị afọ a, Jehova wụpụrụ mmụọ ya ọzọ n’isi ndị ya ná mmezu nke Joel 2:28, 29
[Foto ndị dị na peeji nke 18]
A ghaghị inyere ndị mmadụ aka ịkpọku aha Jehova