Ụwa Mmehie Na-adịghị na Ya—n’Ụzọ Dị Aṅaa?
OKÉ iti mkpu ákwá na-agbawa obi maka enyemaka tisasịrị ọnọdụ dị jụụ nke hour ndị mbụ n’otu ụtụtụ n’oge oyi n’ógbè dị n’udo na Tokyo. Site na minit ise ruo iri, ọtụtụ mmadụ nụrụ ákwá ịchọ enyemaka ngwa ngwa nke otu nwanyị na-ekesa akwụkwọ akụkọ tiri, bụ́ onye a na-achụgharị site mgbe a nọ na-ama ya mma. Ọ dịghị onye o metụrụ n’ahụ ruo ókè ịga mara ihe na-eme. Ọ nwụrụ n’ihi ịgba oké ọbara. “À sị na otu n’ime ndị a kọsawooro ndị uwe ojii ihe merenụ ngwa ngwa ha nụrụ ákwá ya,” ka otu onye na-eme nchọpụta kwuru, “a pụrụ ịzọpụtawo ndụ ya.”
Ọ bụ ezie na ndị nụrụ ákwá nwanyị ahụ na-anwụ anwụ emeghị ihe ọ bụla karịrị ileghara ya anya, ha pụrụ ime nzọrọ n’ụzọ ziri ezi na ikpe amaghị ha? “Akọ na uche m tiri m ihe otiti na Friday dum mgbe m matara banyere ogbugbu e gburu nwanyị ahụ,” ka otu nwoke nụrụ ákwá ya kwuru. Nke a na-eme ka anyị jụọ sị, Gịnị n’ezie bụ mmehie?
Gịnị Bụ Mmehie?
Ka ọ na-ezo aka n’ịnakwere mmehie, Hideo Odagiri, onye nkatọ nke ihe odide na prọfesọ kwụsịworo ọrụ na Hosei University dị na Tokyo, Japan, kwuru, dị ka e hotara ya n’akwụkwọ akụkọ bụ́ Asahi Shimbun, sị: “Apụghị m ihichapụ ncheta nile doro anya m nwere nke ịmata banyere mmehie, dị ka ajọ otito efu dị n’ime nwata, ntaji anya na-eme ihere, ikwugide mmadụ n’azụ ya. A kụnyere mmata nke a n’uche m mgbe m nọ n’ụlọ akwụkwọ praịmarị, ọ ka na-etikwa m ihe otiti.” Ọ̀ dịwo mgbe i nwere mmetụta ndị dị otú a? Ì nwere olu nke dị n’ime nke na-ama gị ikpe ma i mee ihe ị maara na ọ dị njọ? Ma eleghị anya ọ dịbeghị mpụ e mere, ma mmetụta ahụ erughị ala na-anọgide ma na-anyịgbu gị n’uche. Nke a bụ akọ na uche gị na-arụ ọrụ, Bible na-ezokwa aka n’ebe ọ nọ n’akụkụ ihe odide nke naesonụ: “Mgbe ọ bụla ndị mba ọzọ ndị na-enweghị iwu na-eme ihe nile dị n’iwu site ka e si mụọ ha, ndị ahụ, ọ bụ ezie na ha enweghị iwu, ma ha onwe ha bụ iwu e nyere onwe ha; n’ihi na ha na-egosi ọrụ iwu na e dewo ya n’obi ha, akọ na uche ha na-esokwa ya na-agba àmà, ihe ha na-atụle n’obi ha n’etiti onwe ha na-ebokwa ha ebubo ma ọ bụ ma eleghị anya na-agọpụ ha.” (Ndị Rom 2:14, 15) Ee, site n’okike, ihe omume ndị dị ka ịkwa iko ndị lụworo di ma ọ bụ nwunye, izu ohi, na ịgha ụgha na-enye ihe ka n’ọnụ ọgụgụ nke ụmụ mmadụ nsogbu n’uche. Akọ na uche ha na-agba akaebe maka mmehie.
Otú ọ dị, mgbe e leghaara olu nke akọ na uche anya ugboro ugboro, ọ dịghị arụkwa ọrụ dị ka ihe nduzi na-adịghị ize ndụ. Ọ pụrụ ịbụ nke e mere ka ọ ghara ịdị na-anata mmetụta na nke e merụrụ. (Taịtọs 1:15) Inwe mmetụta banyere ihe dị njọ adịkwaghị. N’ezie, akọ na uche nke ihe ka n’ọnụ ọgụgụ ụmụ mmadụ taa nwụrụ anwụ ma a bịa n’ihe banyere mmehie.
Ọ̀ bụ nanị akọ na uche bụ ihe ọ̀tụ̀tụ̀ e nwere maka mmehie, ka è nwere ihe pụrụ ije ozi dị ka ụkpụrụ zuru okè banyere ihe bụ mmehie na ihe na-abụghị? Ihe karịrị 3,000 afọ gara aga, Chineke nyere ndị ya ọ họpụtara ụkpụrụ iwu, sitekwa n’Iwu a, e mere ka ‘a mata mmehie dị ka mmehie.’ (Ndị Rom 7:13, New International Version) Ọbụna àgwà a na-anakwerebu n’ụzọ ụfọdụ ka e kpughere ugbu a dị ka ihe ọ bụ—mmehie. E kpughere ndị Chineke ọ họpụtara, bụ́ ndị Israel, dị ka ndị mmehie, n’ihi ya kwa ha nọ n’okpuru ọmụma ikpe.
Gịnị bụ mmehie ndị a akọ na uche anyị na-eme ka anyị mara na ndị Iwu Mosis kọwapụtara ma depụta? N’otú Bible si eji okwu ahụ eme ihe, mmehie pụtara erughị ọ̀tụ̀tụ̀ n’ihe metụtara Onye Okike. Ihe ọ bụla na-ekwekọghị n’ọdịdị ya, ụkpụrụ ya, ụzọ ya, na uche ya bụ mmehie. Ọ pụghị ikwe ka ihe ọ bụla e kere eke nke na-erughị ọ̀tụ̀tụ̀ o guzobeworo nọgide na-adị adị. N’ihi ya otu ọkachamara n’iwu na narị afọ mbụ dọrọ ndị Hibru bụ́ ndị Kraịst aka ná ntị, sị: “Lezienụ anya, ụmụnna m, ka ajọ obi nke ekweghị ekwe ghara ịdị n’ime onye ọ bụla n’etiti unu ma eleghị anya, n’iwezụga onwe ya n’ebe Chineke dị ndụ nọ.” (Ndị Hibru 3:12) Ee, enweghị okwukwe n’Onye Okike ahụ bụ mmehie dị oké njọ. Otú a, ihe mmehie gụnyere dị ka a kọwara na Bible sara mbara nke ukwuu karịa ihe a na-ewerekarị dị ka mmehie. Bible gara nnọọ n’ihu ikwu, sị: “Mmadụ nile emehiewo, ha adịghị erukwa otuto Chineke.”—Ndị Rom 3:23.
Mmalite nke Mmehie
Nke ahụ ọ̀ pụtara na e kere mmadụ dị ka onye mmehie? Ee e, Jehova Chineke, Onye Malitere ndụ mmadụ, mere nwoke mbụ ahụ ịbụ ihe e kere eke zuru okè. (Jenesis 1:26, 27; Deuterọnọmi 32:4) Otú ọ dị, mmadụ abụọ mbụ dapụrụ n’ihe ọ̀tụ̀tụ̀ ahụ mgbe ha mebiri nanị otu mmachibido iwu Chineke guzobeworo, mgbe ha riri site “n’osisi ịma ezi ihe na ihe ọjọọ” nke a machibidoro iwu. (Jenesis 2:17) Ọ bụ ezie na e kere ha n’izu okè, ugbu a ha erukwaghị ọ̀tụ̀tụ̀ nke nrubeisi zuru ezu nye Nna ha, ha ghọrọ ndị mmehie, e wee si otú a maa ha ikpe ịnwụ anwụ.
Gịnị jikọrọ akụkọ mgbe ochie nke a na mmehie taa? Bible na-akọwa, sị: “Mmehie si n’aka otu mmadụ baa n’ụwa, dị ka ọnwụ si n’aka mmehie baakwa; ọnwụ wee si otú a gabiga ruo mmadụ nile, n’ihi na mmadụ nile mehiere.” (Ndị Rom 5:12) N’enweghị onye a gụpụrụ, anyị nile bụ ndị mmehie site ná nketa; n’ihi ya, anyị abịawo n’okpuru ikpe ọmụma nke ọnwụ.—Eklisiastis 7:20.
Mgbalị Ụmụ Mmadụ Iji Hichapụ Mmehie
Adam bufeere ụmụ ya mmehie, ma o bufekwaara ha ikike akọ na uche nke Chineke na-enye. Mmehie pụrụ ịkpata ahụ erughị ala. Dị ka e kwuru na mbụ, ụmụ mmadụ atụpụtawo ụzọ dị iche iche isi bịadaa mmetụta ndị dị otú ahụ. Ma, hà dị irè n’ezie?
Ma n’Ebe Ọwụwa Anyanwụ ma n’Ebe Ọdịda Anyanwụ, ndị mmadụ anwawo iche mmetụta nke mmehie ihu site n’ịgbanwe ụkpụrụ ha dị iche iche ma ọ bụ site n’ịgọnahụ ịdị adị nke mmehie. (1 Timoti 4:1, 2) A pụrụ iji ọnọdụ mmehie nke mmadụ ụmụ tụnyere nke onye ọrịa nwere ahụ ọkụ. A pụrụ iji mmehie tụnyere nje na-akpata ihe mgbaama ọrịa ahụ, ebe a pụrụ iji akọ na uche ahụ nwere nsogbu tụnyere ahụ ọkụ ahụ na-akpata ahụ erughị ala. Ịgbaji ihe e ji amata ọ̀tụ̀tụ̀ ịdị ọkụ ma ọ bụ ịjụ oyi adịghị agbanwe eziokwu ahụ bụ na onye ọrịa ahụ nwere oké ahụ ọkụ. Ịtụfu ụkpụrụ omume ọma dị iche iche, dị ka ọtụtụ n’ime Krisendọm meworo, na ileghara akaebe nke akọ na uche mmadụ na-agba anya abụghị ihe enyemaka ọ bụla n’ihichapụ mmehie ahụ n’onwe ya.
Mmadụ pụrụ iji ákwà bịa onwe ya mmiri oyi n’ahụ iji kwụsị ahụ ọkụ ya. Nke ahụ yiri ka ịnwa ịkwụsị nsogbu mberede ndị akọ na uche na-enye ya site n’ịgabiga ememe okpukpe ndị Shinto maka ime ka a dị ọcha. Ịbịa mmiri oyi n’ahụ pụrụ ime ka ahụ jụrụtụ onye ahụ nwere ahụ ọkụ oyi ruo nwa oge, ma ọ dịghị ewepụ ihe na-akpata ahụ ọkụ ahụ. Ndị nchụàjà na ndị amụma n’ụbọchị Jeremaịa nwara ọgwụgwọ yiri nke ahụ maka ndị Israel nke oge ahụ. Ha gwọrọ ọnyá ime mmụọ na ndị nke omume nke ndị ahụ “na-akpọghị ya ihe,” na-asị, “Nsogbu adịghị, nsogbu adịghị.” (Jeremaịa 6:14; 8:11, An American Translation) Nanị ịgabiga usoro okpukpe na ịgụ ihe dị ka “nsogbu adịghị” ka egwú agwọghị ndakpọ omume ọma nke ndị Chineke, ememe okpukpe maka ime ka a dị ọcha adịghịkwa agbanwe àgwà ndị mmadụ taa.
Site n’ịṅụ ọgwụ ndị na-ebelata ahụ ọkụ, mmadụ pụrụ ime ka ahụ ọkụ ya dajụọ, ma nje ahụ ka dịkwa n’ime ahụ ya. Otú ahụ ka ọ dịkwa banyere ụzọ okpukpe Confucius si eche ihe ọjọọ ihu site n’inye ọzụzụ. N’elu n’elu, ọ pụrụ inyere ndị mmadụ aka isi n’ime ihe ọjọọ chigharịa, ma nanị ihe ime li na-arụzu bụ ịbịada àgwà mmehie, ọ dịghị ewepụkwara mmadụ ọchịchọ ime mmehie a mụnyere n’ime ya, bụ́ mkpọrọgwụ nke na-akpata àgwà ọjọọ.—Jenesis 8:21.
Gịnị banyere ozizi okpukpe Buddha nke ịbanye Nirvana iji wepụ n’ime onwe onye ọchịchọ nile nke ime mmehie? Ọnọdụ nke Nirvana, nke a sịrị na ọ pụtara “ịfụnyụ,” ka a chọrọ ka ọ bụrụ ihe a na-apụghị ịkọwa akọwa, mfụnyụ nke oké mmetụta na ọchịchọ nile. Ụfọdụ na-azọrọ na ọ bụ nkwụsị nke ịdị adị dị ka onye. Nke ahụ ọ̀ dịghị ada ka ịgwa onye ahụ ọkụ na-eme ka ọ nwụọ iji nwere onwe ya? E wezụga nke ahụ, a na-ewere iru ọnọdụ Nirvana anya dị ka ihe siri oké ike, ọbụna ihe a na-apụghị ime eme. Ozizi nke a ọ̀ na-ada ná ntị dị ka ihe enyemaka maka onye akọ na uche ya na-enye nsogbu?
Mgbapụta Site ná Mmehie
O doro anya na nkà ihe ọmụma nile nke mmadụ banyere ndụ na ọnọdụ ime mmehie pụrụ, ma ọ dịkarịsịa mma, nanị ịdajụ akọ na uche mmadụ. Ha adịghị ewepụ ọnọdụ mmehie ahụ. (1 Timoti 6:20) Ọ̀ dị ụzọ ọ bụla dịnụ isi mee nke a? Na Bible, akwụkwọ oge ochie e dere na Nso Ebe Ọwụwa Anyanwụ Ụwa, anyị na-achọta ụzọ mgbapụta site ná mmehie. “Ọ bụrụ na mmehie unu adị ka uwe uhie, ọ bụ dị ka snow ka ha ga-adị ọcha; . . . ọ bụrụ na unu ekwe, wee nụ, ezi ihe nke ala unu ka unu ga-eri.” (Aịsaịa 1:18, 19) N’ebe a Jehova na-agwa ụmụ Israel okwu, bụ́ ndị, ọ bụ ezie na ha bụ ndị ya ọ họpụtara, erukwaghị ọ̀tụ̀tụ̀ nke iguzosi ike n’ebe ọ nọ. Otú ọ dị, otu ụkpụrụ ahụ dịkwaara ihe a kpọrọ mmadụ n’ozuzu ya. Igosi ịdị njikere ịṅa ntị n’okwu Onye Okike ahụ bụ ụzọ isi hichapụ mmehie mmadụ, sachapụ ya, dị ka a pụrụ isi kwuo ya.
Gịnị ka Okwu Chineke na-agwa anyị banyere ịsachapụ mmehie nke ihe a kpọrọ mmadụ? Dị nnọọ ka ọ bụ site ná mmehie nke otu mmadụ ka ihe nile a kpọrọ mmadụ ghọrọ ndị mmehie, site ná nrubeisi zuru okè nke otu mmadụ nye Chineke, a ga-atọhapụ ihe a kpọrọ mmadụ na-erube isi site ná nhụjuanya ha, ka Bible na-ekwu. (Ndị Rom 5:18, 19) N’ụzọ dị aṅaa? “Chineke na-eme ka ịhụnanya nke aka ya n’ebe anyị nọ pụta ìhè, n’ihi na, mgbe anyị nọ na-abụ ndị mmehie, Kraịst nwụrụ n’ihi anyị.” (Ndị Rom 5:8) Jisọs Kraịst, onye a mụrụ dị ka nwoke zuru okè nke na-enweghị mmehie, onye ya na Adam mbụ tupu o mee mmehie hà nhata, nọ n’ọnọdụ ibupụ mmehie nile nke ihe a kpọrọ mmadụ. (Aịsaịa 53:12; Jọn 1:14; 1 Pita 2:24) Site n’ime ka ọ nwụọ n’elu osisi ịta ahụ dị ka a ga-asị na ọ bụ omempụ, Jisọs tọhapụrụ ihe a kpọrọ mmadụ site n’agbụ mmehie na ọnwụ. “N’ihi na,” ka Pọl kọwaara ndị Kraịst nọ na Rom, “mgbe anyị nọ n’adịghị ike, mgbe oge ya ruru Kraịst nwụrụ n’ihi ndị na-adịghị asọpụrụ Chineke. . . . Dị ka mmehie si bụrụ eze n’ọnwụ, ka amara wee bụrụkwa eze otú a site n’ezi omume ruo ndụ ebighị ebi site n’aka Jisọs Kraịst Onyenwe anyị.”—Ndị Rom 5:6, 21.
Kraịst ịnwụ maka ihe dum a kpọrọ mmadụ na ime ka ihe ọ̀tụ̀tụ̀ ahụ Adam mere ka ọ ghara iguzozi guzozie ka a na-akpọ ndokwa “mgbapụta.” (Matiu 20:28) A pụrụ iji ya tụnyere ọgwụ na-arụ ọrụ megide nje na-akpata ahụ ọkụ. Site n’iji uru mgbapụta Jisọs mee ihe maka ihe a kpọrọ mmadụ, ọnọdụ ọrịa nke ihe a kpọrọ mmadụ nke mmehie kpatara—tinyere ọnwụ n’onwe ya—pụrụ ịbụ nke a gwọtara. A kọwara usoro ịgwọ ọrịa nke a n’ụzọ ihe atụ n’akwụkwọ ikpeazụ nke Bible: “N’akụkụ a na n’akụkụ nke ọzọ nke osimiri ahụ ka osisi nke ndụ dịkwa, na-amị ụzọ mkpụrụ iri na abụọ, na-enye mkpụrụ ya n’ọnwa n’ọnwa: akwụkwọ osisi ahụ bụ ihe ime ka ahụ dị mba nile ike.” (Mkpughe 22:2) Leenụ! Osimiri ihe atụ nke mmiri nke ndụ na-eru n’etiti osisi nke ndụ na akwụkwọ ha, ha nile maka ọgwụgwọ nke ihe a kpọrọ mmadụ. Ihe atụ ndị a e ji ike mmụọ buo amụma ha na-anọchite anya ndokwa Chineke maka iweghachi ihe a kpọrọ mmadụ n’izu okè n’ihe ndabere nke àjà mgbapụta Jisọs.
Ọhụụ amụma nile nke akwụkwọ Mkpughe ga-emezu n’isi nso. (Mkpughe 22:6, 7) Mgbe ahụ, site n’itinye uru nke àjà mgbapụta Jisọs n’ọrụ n’ụzọ zuru ezu n’isi ihe a kpọrọ mmadụ, ndị nile nwere obi ziri ezi ga-ezu okè, ‘meekwa ka ha nwere onwe ha pụọ n’ịbụ ohu mmebi baa n’ọnọdụ inwe onwe ha nke ebube nke ụmụ Chineke.’ (Ndị Rom 8:21) Mmezu nke amụma dị iche iche nke Bible na-egosi na ntọhapụ nke a dị ebube dị nso. (Mkpughe 6:1-8) N’isi nso, Chineke ga-ekpochapụ ná mbara ụwa mmebi iwu, ụmụ mmadụ ga-anụkwa ụtọ nke ndụ agwụghị agwụ n’elu ụwa paradaịs. (Jọn 3:16) Nke ahụ ga-abụ n’ezie ụwa nke mmehie na-adịghị na ya!
[Foto dị na peeji nke 7]
Àjà mgbapụta Jisọs ga-enyere ezinụlọ ndị dị ka nke a aka ịnụ ụtọ obi ụtọ na-adịghị agwụ agwụ