Inyeghachi Siza Ihe nke Siza
“Na-akwụghachinụ mmadụ nile ihe nile unu ji ha n’ụgwọ.”—NDỊ ROM 13:7.
1, 2. (a) Dị ka Jisọs kwuru, olee otú ndị Kraịst kwesịrị isi hazie ibu ọrụ ha nye Chineke na nye Siza? (b) Gịnị bụ nchegbu mbụ nke Ndịàmà Jehova?
DỊ KA Jisọs si kwuo, e nwere ihe ndị anyị ji Chineke ụgwọ ya na ihe ndị anyị ji Siza, ma ọ bụ Ọchịchị, ụgwọ ya. Jisọs kwuru, sị: “Nyeghachinụ Siza ihe nke Siza, nyeghachikwanụ Chineke ihe nke Chineke.” N’okwu ole na ole ndị a, o mere ka ndị iro ya nwee mgbagwoju anya ma chịkọta nke ọma àgwà ziri ezi anyị na-aghaghị inwe ná mmekọrịta anyị na Chineke na ná mmekọrịta anyị na Ọchịchị. Ka a sịkwa ihe mere ndị na-ege ya ntị ji nwee ihe ‘ijuanya nke ukwuu banyere Ya’!—Mak 12:17.
2 Otú ọ dị, ihe mbụ na-echegbu ndị ohu Jehova bụ na ha na-enyeghachi Chineke ihe nke Chineke. (Abụ Ọma 116:12-14) Otú ọ dị, n’ime nke ahụ ha adịghị echezọ na Jisọs kwuru na ha aghaghị inye Siza ihe ụfọdụ. Akọ na uche ha e ji Bible zụọ na-achọ ka ha jiri ekpere tụlee ókè ha aṅaa ha pụrụ inyeghachi ihe Siza chọrọ. (Ndị Rom 13:7) N’oge ndị a, ọtụtụ ndị ọkàiwu aghọtawo na ikike gọọmenti bụ nke a kpaara ókè nakwa na ndị mmadụ na gọọmenti n’ebe ọ bụla bụ ndị iwu okike ji.
3, 4. Okwu ndị dị aṅaa na-adọrọ mmasị ka e kwuworo banyere iwu okike, iwu e kpughere ekpughe, na iwu mmadụ?
3 Pọl onyeozi zoro aka n’iwu okike a mgbe o dere banyere ndị ụwa, sị: “Ihe a pụrụ ịmata banyere Chineke na-apụta ìhè n’ime ha; n’ihi na Chineke mere ka ọ pụtara ha ìhè. N’ihi na ihe Ya anya na-ahụghị site n’okike ụwa ka a na-ahụ nke ọma, ebe a na-aghọta ha site n’ihe nile e kere eke, bụ́ ike ebighị ebi Ya na ụdị Chineke Ya; ka ha ghara inwe ngọpụ.” Ọ bụrụ na ha ga-azaghachi na ya, iwu okike ọbụna ga-akpali akọ na uche nke ndị a na-ekweghị ekwe. N’ihi ya, Pọl gara n’ihu kwuo, sị: “Mgbe ọ bụla ndị mba ọzọ ndị na-enweghị iwu na-eme ihe nile dị n’iwu site ka e si mụọ ha, ndị ahụ, ọ bụ ezie na ha enweghị iwu, ma ha onwe ha bụ iwu e nyere onwe ha; n’ihi na ha na-egosi ọrụ iwu na e dewo ya n’obi ha, akọ na uche ha na-esokwa ya na-agba àmà.”—Ndị Rom 1:19, 20; 2:14, 15.
4 Na narị afọ nke 18, ọkàiwu England a ma ama bụ́ William Blackstone dere, sị: “Iwu nke okike [iwu okike], n’ịbụ nke ya na ihe a kpọrọ mmadụ bụ ebiri [bụ ọgbọ], bụrụkwa nke Chineke n’onwe ya tụziri, n’ezie kachasị ndị ọzọ jiri mmadụ. O ji ụwa nile, n’ime mba nile, na n’oge nile: ọ dịghị iwu ọ bụla nke mmadụ dị irè, ma ọ bụrụ na o megidere nke a.” Blackstone gara n’ihu ikwu banyere “iwu e kpughere ekpughe,” dị ka ọ dị na Bible, o kwukwara, sị: “N’elu ntọala abụọ a, iwu nke okike na iwu nke mkpughe, ka iwu nile nke mmadụ dabeere; ya bụ na, e kwesịghị ime [ikwe] ka iwu ọ bụla nke mmadụ megide ndị a.” Nke a kwekọrọ n’ihe Jisọs kwuru banyere Chineke na Siza, dị ka e dekọrọ ya na Mak 12:7. N’ụzọ doro anya, e nwere ebe ndị Chineke kpaara ihe Siza pụrụ ịchọ n’aka onye Kraịst ókè. Sanhedrin kpafuru banye n’ebe dị otú ahụ mgbe ha nyere ndị ozi ahụ iwu ịkwụsị ikwusa banyere Jisọs. N’ihi ya, ndị ozi ahụ n’ụzọ ziri ezi zaghachiri, sị: “Anyị aghaghị ikwenyere Chineke karịa mmadụ.”—Ọrụ 5:28, 29.
“Ihe nke Chineke”
5, 6. (a) N’ihi ọmụmụ nke Alaeze Chineke na 1914, gịnị ka ndị Kraịst kwesịrị iburu n’uche? (b) Olee otú onye Kraịst na-esi enye ihe àmà na ya bụ onye ozi?
5 Karịsịa kemgbe 1914, mgbe Jehova Chineke, bụ́ Onye Pụrụ Ime Ihe Nile, malitere ịchị dị ka eze site n’Alaeze Mesaịa nke Kraịst, ka ndị Kraịst na-aghaghị ijide n’aka ịghara inye Siza ihe nke Chineke. (Mkpughe 11:15, 17) Dị ka ọ na-adịtụbeghị mbụ, iwu Chineke na-achọ ndị Kraịst n’aka ugbu a ịbụ ndị “na-esiteghị n’ụwa.” (Jọn 17:16) Ịbụ ndị raara onwe ha nye Chineke, Onye Na-enye Ndụ ha, ha aghaghị igosipụta n’ụzọ doro anya na ha adịkwaraghị onwe ha ọzọ. (Abụ Ọma 100:2, 3) Dị ka Pọl dere, “anyị bụ ndị nke Onyenwe anyị.” (Ndị Rom 14:8) Ọzọ, mgbe e mere onye Kraịst baptism, a họpụtawo ya dị ka onye ozi Chineke, nke na o nwere ike ikwu dị ka Pọl, sị: “Chineke . . . mekwara anyị ka anyị ruo ịbụ ndị na-eje ozi.”—2 Ndị Kọrint 3:5, 6.
6 Pọl onyeozi dekwara, sị: “Ana m enye ije ozi m otuto.” (Ndị Rom 11:13) N’ezie anyị kwesịrị imekwa otú ahụ. Ma anyị ọ na-ekere òkè n’ozi ahụ oge nile ma ọ bụ n’oge ụfọdụ, anyị na-ebu n’uche na Jehova n’onwe ya kenyere anyị ozi anyị. (2 Ndị Kọrint 2:17) Ebe ọ bụ na ụfọdụ pụrụ ịma nguzo anyị aka, onye Kraịst ọ bụla raara onwe ya nye, nke e mekwara baptism aghaghị ịdị njikere inye ihe àmà doro anya ma zie ezie na ya bụ n’ezie onye ozi nke ozi ọma ahụ. (1 Pita 3:15) Àgwà ya kwesịkwara inye ihe àmà nke ozi ya. Dị ka onye ozi Chineke, onye Kraịst kwesịrị ịkwado ma na-eme omume dị ọcha, kwadoo ịdị n’otu ezinụlọ, na-akwụwa aka ya ọtọ, ma na-akwanyere iwu na ịdị n’usoro ùgwù. (Ndị Rom 12:17, 18; 1 Ndị Tesalọnaịka 5:15) Mmekọrịta onye Kraịst na Chineke na ozi Chineke kenyere ya bụ ihe ndị kasị mkpa ná ndụ ya. Ọ gaghị ewezụga nke a n’ụsọ ma Siza nye iwu ya. N’ụzọ doro anya, a ga-agụnye ha n’ime “ihe nke Chineke.”
“Ihe nke Siza”
7. Gịnị bụ aha Ndịàmà Jehova meere onwe ha n’ihe banyere ịtụ ụtụ isi?
7 Ndịàmà Jehova maara na ha ji ụgwọ ‘ido onwe ha n’okpuru ndị na-achị isi n’elu ha,’ ndị ọchịchị gọọmenti. (Ndị Rom 13:1) N’ihi ya, mgbe Siza, Ọchịchị, chọrọ ihe iwu kwadoro, akọ na uche ha nke e ji Bible zụọ na-ekwe ha imezu ihe ndị a a chọrọ. Dị ka ihe atụ, ezi ndị Kraịst so ná ndị kasị bụrụ ezi ihe nlereanya n’ịkwụ ụtụ isi n’elu ụwa. Na Germany akwụkwọ akụkọ bụ́ Münchner Merkur kwuru banyere Ndịàmà Jehova, sị: “Ha bụ ndị kasị akwụwa aka ha ọtọ na ndị kasị akwụ ụtụ isi ha ngwa ngwa na Federal Republic nke a.” N’Itali akwụkwọ akụkọ bụ́ La Stampa kwuru, sị: “Ha [Ndịàmà Jehova] bụ ụmụ amaala kasị anọgidesi ike n’ihe nke onye ọ bụla pụrụ inwe mmasị inwe: ha adịghị agba ọsọ ụtụ isi ma ọ bụ chọọ izere iwu ndị na-adịghị ha mma n’ahụ maka abamuru nke onwe ha.” Ndị ohu Jehova na-eme nke a ‘n’ihi akọ na uche ha.’—Ndị Rom 13:5, 6.
8. Ihe anyị ji Siza ụgwọ ya ò jedebere n’ụtụ isi ego?
8 “Ihe nke Siza” hà jedebere n’ịkwụ ụtụ isi? Ee e. Pọl depụtara ihe ndị ọzọ, dị ka ịtụ egwu na inye nsọpụrụ. N’akwụkwọ ya bụ́ Critical and Exegetical Hand-Book to the Gospel of Matthew, onye Germany bụ́ onye ọkà mmụta bụ́ Heinrich Meyer dere, sị: “N’ikwu [ihe nke Siza] . . . anyị agaghị aghọta nanị ụtụ isi obodo, kama ihe nile ruuru Siza n’ihi ọchịchị ya iwu kwadoro.” Ọkọ akụkọ ihe mere eme bụ́ E. W. Barnes, n’akwụkwọ ya bụ́ The Rise of Christianity, kwuru na onye Kraịst ga-akwụ ụtụ isi ma ọ bụrụ na o ji ụgwọ ha ma “nakwerekwa ibu ọrụ Ọchịchị ndị ọzọ, ma ọ bụrụhaala na a chọghị ka o nye Siza ihe ndị bụ nke Chineke.”
9, 10. Obi abụọ dị aṅaa ka onye Kraịst pụrụ inwe banyere inyeghachi Siza ihe ya, ma eziokwu ndị dị aṅaa ka e kwesịrị iburu n’uche?
9 Ihe ndị dị aṅaa ka Ọchịchị pụrụ ịchọ n’agafereghị banye n’ihe ndị bụ n’ụzọ ziri ezi nke Chineke? Ụfọdụ ndị echeela na ha pụrụ inye Siza ego n’ụzọ iwu kwadoro n’ụdị ụtụ isi n’enyeghị ihe ọ bụla ọzọ. N’ezie ọ gaghị adị ha mma n’obi inye Siza ihe ọ bụla nke ga-ewere oge nke a pụrụ itinye n’ọrụ ọchịchị Chineke. Ka o sina dị, ọ bụ eziokwu na anyị kwesịrị ‘ịhụ Onyenwe anyị, bụ́ Chineke anyị, n’anya, site n’obi, mkpụrụ obi, uche, na ike anyị dum,’ Jehova na-atụ anyị anya itinye oge n’ihe ndị ọzọ na-abụghị ozi anyị dị nsọ. (Mak 12:30; Ndị Filipaị 3:3) Dị ka ihe atụ, e nyere onye Kraịst lụrụ di ma ọ bụ nwunye ndụmọdụ ka o tinye oge n’ime ihe na-atọ onye ọ lụrụ ụtọ. Ọrụ ndị dị otú ahụ adịghị njọ, ma Pọl onyeozi na-ekwu na ha bụ “ihe ụwa” ọ bụghị “ihe nke Onyenwe anyị.”—1 Ndị Kọrint 7:32-34; tụlee 1 Timoti 5:8.
10 Ọzọ, Kraịst nyere ndị na-eso ụzọ ya ikike ‘inyeghachi’ ụtụ isi, nke a gụnyere n’ezie iji oge a raara nye Jehova eme ihe—ebe ọ bụ na a raara ndụ anyị nile nye n’ụzọ dị otú a. Ọ bụrụ na nkezi ụtụ isi n’otu mba bụ 33 pasent nke ego mmadụ na-akpata (ọ dị elu karị n’ụfọdụ mba), nke a pụtara na kwa afọ onye ọrụ nkịtị na-akwụbanye n’Akpa Ego Ọchịchị ihe ruru ihe ọ na-akpata n’ọnwa anọ. N’ikwu ya n’ụzọ ọzọ, ná ngwụsị nke ngụkọta oge a ga-ewe ya n’ọrụ, onye ọrụ nkịtị ga-etinyeworị ihe dị ka afọ 15 na-akpata ego ụtụ isi nke “Siza” chọrọ. Tụleekwa okwu banyere ịga akwụkwọ. N’ihe ka n’ọtụtụ mba iwu na-achọ ka ndị nne na nna mee ka ụmụ ha gaa akwụkwọ ruo afọ ụfọdụ ma ọ dịkarịa ala. Ọnụ ọgụgụ afọ nke ịga akwụkwọ na-adị iche site ná mba gaa ná mba. N’ebe ka ọtụtụ ọ bụ nnọọ ruo ogologo oge. N’eziokwu, ụdị agụmakwụkwọ ahụ na-abakarị uru, ma ọ bụ Siza na-ekpebi akụkụ nke ndụ nwatakịrị a na-aghaghị iji eme ihe n’ụzọ dị otú a, ndị nne na nna bụ́ ndị Kraịst ga-ekwenyekwa ná mkpebi Siza.
Ije Ozi Agha ná Mmanye
11, 12. (a) Gịnị ka Siza na-achọ n’ọtụtụ ala? (b) Olee otú ndị Kraịst oge mbụ si lee ije ozi agha anya?
11 Ihe ọzọ Siza na-achọ n’ụfọdụ mba bụ ịmanye mmadụ ije ozi agha. Na narị afọ nke 20, ihe ka n’ọtụtụ mba emewo ndokwa nke a n’oge agha, ndị ụfọdụ na-emekwa ya n’oge udo. Na France a kpọrọ ibu ọrụ a ụtụ isi ọbara ruo ọtụtụ afọ, nke pụtara na nwa okorobịa ọ bụla aghaghị ịdị njikere ịtọgbọ ndụ ya maka Ọchịchị. Nke a ọ̀ bụ ihe ndị raara onwe ha nye Jehova pụrụ iji akọ na uche ha mee? Olee otú ndị Kraịst nke narị afọ mbụ si lee okwu a anya?
12 Ọ bụ ezie na ndị Kraịst oge mbụ gbalisiri ike ịbụ ezi ụmụ amaala, okwukwe ha gbochiri ha igbu ndị ọzọ ma ọ bụ ịchụ ndụ nke onwe ha n’àjà maka Ọchịchị. Akwụkwọ The Encyclopedia of Religion na-ekwu, sị: “Ndị nna chọọchị oge mbụ, tinyere Tertullian na Origen, kwusiri ike na e gbochiri ndị Kraịst igbu mmadụ, ụkpụrụ nke gbochiri ha ikere òkè n’òtù ndị agha nke Rom.” N’akwụkwọ ya bụ́ The Early Church and the World, Prọfesọ C. J. Cadoux na-ede, sị: “Ọ dịkarịa ala ruo n’ọchịchị Marcus Aurelius [161-180 O.A.], ọ dịghị onye Kraịst ga-aghọ onye soja ma e mesịa ya baptism.”
13. N’ihi gịnị ka ihe ka ọtụtụ ná Krisendọm ji ghara ịdị na-ele ije ozi agha anya dị ka ndị Kraịst oge mbụ lere ya?
13 N’ihi gịnị ka ndị òtù chọọchị nke Krisendọm ji ghara ịdị na-ele ihe anya n’ụzọ dị otú a taa? N’ihi oké mgbanwe nke weere ọnọdụ na narị afọ nke anọ. Akwụkwọ Katọlik bụ́ A History of the Christian Councils na-akọwa, sị: “Ọtụtụ ndị Kraịst, . . . bụ́ ndị nọ n’okpuru ndị ọchịchị alaeze ukwu na-ekpere arụsị, nwere nsogbu akọ na uche metụtara okpukpe n’ihe banyere ije ozi agha, ma n’ụzọ ziri ezi jụ nnọọ ibuli ngwá agha, ma ọ bụ gbafuo. Nzukọ Ndị Isi Chọọchị [nke Arles, nke e nwere na 314 O.A.], n’ịtụle mgbanwe ndị Constantine webatara, setịpụrụ ibu ọrụ nke na ndị Kraịst aghaghị ije ozi n’agha, . . . n’ihi na Chọọchị nọ n’udo (in pace) n’okpuru onye ọchịchị na-egosi ndị Kraịst obi ọma.” N’ihi nhapụ a a hapụrụ ozizi Jisọs, site n’oge ahụ ruo ugbu a, ndị ụkọchukwu nke Krisendọm agbawo ìgwè atụrụ ha ume ije ozi n’òtù ndị agha nke mba nile, ọ bụ ezie na ụfọdụ ndị ewerewo nguzo ha dị ka ndị jụrụ n’ihi akọ na uche ha.
14, 15. (a) N’ihe ndabere ndị dị aṅaa ka ndị Kraịst n’ebe ụfọdụ na-achọ ka a gụpụ ha n’ije ozi agha? (b) Ebe a na-adịghị agụpụ mmadụ, ụkpụrụ Akwụkwọ Nsọ ndị dị aṅaa ga-enyere onye Kraịst aka ime mkpebi ziri ezi n’okwu ije ozi agha?
14 Iwu ò ji ndị Kraịst taa ịgbaso ihe ka n’ọnụ ọgụgụ mmadụ n’okwu a? Ee e. Ọ bụrụ na onye Kraịst raara onwe ya nye, e mere baptism bi ná mba a na-agụpụ ndị ozi okpukpe n’ije ozi agha, ọ pụrụ iji ndokwa a mee ihe, n’ihi na n’ezie ọ bụ onye ozi. (2 Timoti 4:5) Ọtụtụ mba, tinyere United States na Australia, enyewo ngụpụ dị otú ahụ ọbụna n’oge agha. N’oge udo kwa, n’ọtụtụ ala ndị nọgidere na-eme ozi agha mmanye, a na-agụpụ Ndịàmà Jehova, dị ka ndị ozi okpukpe. Otú a, ha pụrụ ịga n’ihu na-enyere ndị mmadụ aka site n’ozi ihu ọha ha.
15 Otú ọ dị, gịnị ma ọ bụrụ na onye Kraịst ahụ bi n’ala ebe a na-adịghị agụpụ ndị ozi okpukpe? Mgbe ahụ ọ ga-eme mkpebi onwe ya na-agbaso akọ na uche ya e ji Bible zụọ. (Ndị Galetia 6:5) Ka ọ na-eburu ịbụisi Siza n’uche, ọ ga-eji nlezianya chebara ihe o ji Jehova ụgwọ ya echiche. (Abụ Ọma 36:9; 116:12-14; Ọrụ 17:28) Onye Kraịst ahụ ga-echeta na akara nke ezi onye Kraịst bụ ịhụnanya maka ndị kwere ekwe ibe ya nile, ọbụna ndị bi n’ala ndị ọzọ ma ọ bụ ndị agbụrụ ọzọ. (Jọn 13:34, 35; 1 Pita 2:17) Ọzọkwa, ọ gaghị echezọ ụkpụrụ Akwụkwọ Nsọ ndị dị n’akụkụ akwụkwọ nsọ ndị dị ka Aịsaịa 2:2-4; Matiu 26:52; Ndị Rom 12:18; 14:19; 2 Ndị Kọrint 10:4; na Ndị Hibru 12:14.
Ije Ozi Ndị Nkịtị
16. N’ala ụfọdụ, ije ozi dị aṅaa na-emetụtaghị agha ka Siza na-achọ n’aka ndị ahụ na-adịghị anakwere ije ozi agha?
16 Otú ọ dị, e nwere ala ndị ebe Ọchịchị, ọ bụ ezie na ọ dịghị agụpụ ndị ozi okpukpe, ka o sina dị na-anakwere na ụfọdụ ndị mmadụ pụrụ ịjụ ije ozi agha. Ọtụtụ n’ime ala ndị a na-eme ndokwa ka a ghara ịmanye ụdị ndị ahụ ji akọ na uche ha na-eme ihe ịbanye n’ije ozi agha. N’ebe ụfọdụ a na-ewere ije ozi ndị nkịtị a chọrọ, dị ka ọrụ bara uru n’obodo, dị ka ije ozi mba na-emetụtaghị agha. Onye Kraịst raara onwe ya nye ọ̀ pụrụ ije ozi dị otú ahụ? N’ebe a kwa, onye Kraịst raara onwe ya nye, nke e mere baptism ga-eme mkpebi nke onwe ya na-adabere n’akọ na uche ya e ji Bible zụọ.
17. È nwere ihe atụ nke Bible maka ije ozi ndị nkịtị na-emetụtaghị agha?
17 O yiri ka e nwere ozi mmanye n’oge Bible. Otu akwụkwọ akụkọ ihe mere eme na-ekwu, sị: “Tinyere ụtụ isi na ụgwọ a chọrọ ka onye ọ bụla bi na Judia kwụọ, e nwekwara corvée [ọrụ a na-adịghị akwụ ụgwọ nke ndị na-achị achị n’ọha chọrọ ka a rụọ]. Nke a bụ ihe omume oge ochie n’Ebe Ọwụwa Anyanwụ Ụwa, ịbụisi nke ndị eze Gris na ndị Rom nọgidere na-enwe. . . . Agba Ọhụrụ kwa na-ehota ihe atụ dị iche iche nke corvée na Judia, na-egosi otú ọ gbasaruru ebe nile. N’ikwekọ n’omenala a, ndị soja manyere Saịmọn nke Saịrini iburu obe [osisi ịta ahụhụ] Jisọs (Matiu 5:41; 27:32; Mak 15:21; Luk 23:26).”
18. N’ụdị ije ozi ógbè dị aṅaa nke na-emetụtaghị agha, na-emetụtaghị okpukpe ka Ndịàmà Jehova na-eso eje ọtụtụ ugboro?
18 N’otu aka ahụ, Ọchịchị ma ọ bụ ndị isi ógbè na-achọ ka ụmụ amaala nke ụfọdụ mba taa keere òkè n’ụdị dị iche iche nke ije ozi ógbè. Mgbe ụfọdụ nke a bụ maka ịrụ otu ọrụ, dị ka igwu olulu mmiri ma ọ bụ ịrụ ụzọ; mgbe ụfọdụ a na-eme ya mgbe mgbe, dị ka ikere òkè kwa izu n’ime ka okporo ụzọ, ụlọ akwụkwọ, ma ọ bụ ụlọ ọgwụ dị ọcha. Ebe ụdị ọrụ ndị nkịtị ahụ bụ maka ọdịmma nke ógbè, bụrụkwa nke na-ejikọghị okpukpe ụgha ma ọ bụ ghara ịbụ n’ụzọ ụfọdụ ndị ọzọ ihe akọ na uche nke Ndịàmà Jehova jụrụ, ha na-akwadokarị ya. (1 Pita 2:13-15) N’ihe ka n’ọtụtụ mgbe, nke a arụpụtawo ịgba àmà magburu onwe ya ma mgbe ụfọdụ mechie ọnụ nke ndị na-ebo Ndịàmà ebubo ụgha nke ịbụ ndị na-emegide gọọmenti.—Tụlee Matiu 10:18.
19. Olee otú onye Kraịst ga-esi eche okwu ahụ ihu ma ọ bụrụ na Siza agwa ya ka o jee ozi mba na-emetụtaghị agha ruo oge ụfọdụ?
19 Otú ọ dị, gịnị ma ọ bụrụ na Ọchịchị achọọ ka onye Kraịst jee ozi ndị nkịtị nke bụ akụkụ nke ije ozi mba n’okpuru ọchịchị ndị nkịtị ruo oge ụfọdụ? N’ebe a kwa, ndị Kraịst aghaghị ime mkpebi nke onwe ha dabere n’akọ na uche nwere ihe ọmụma. “Anyị nile ga-eguzo n’ihu oche ikpe Chineke.” (Ndị Rom 14:10) Ndị Kraịst na-eche ihe Siza chọrọ ihu kwesịrị iji ekpere tụlee okwu ahụ ma tụgharịa uche na ya.a Ọ pụkwara ịbụ ihe amamihe dị na ya isoro ndị Kraịst tozuru okè n’ime ọgbakọ tụlee okwu ahụ. Mgbe e mesịrị nke a, a ghaghị ime mkpebi onwe onye.—Ilu 2:1-5; Ndị Filipaị 4:5.
20. Ajụjụ na ụkpụrụ Akwụkwọ Nsọ ndị dị aṅaa na-enyere onye Kraịst aka ịtụgharị uche n’okwu banyere ijere mba ozi ndị nkịtị nke na-emetụtaghị agha?
20 Mgbe ha na-eme ụdị nnyocha ahụ, ndị Kraịst ga-atụle ọtụtụ ụkpụrụ Bible. Pọl sịrị na anyị aghaghị ịdị ‘na-ekwenyere ndị isi, ndị nwere ike, bụrụkwa ndị e doziworo ịrụ ezi ọrụ nile ọ bụla . . . nwee obi ọma, na-egosi ịdị nwayọọ nile n’ebe mmadụ nile nọ.’ (Taịtọs 3:1, 2) N’otu oge ahụ, ndị Kraịst ga-eme nke ọma inyocha ọrụ ndị nkịtị ahụ a chọrọ ịrụ. Ọ bụrụ na ha anakwere ya, hà ga-enwe ike ịnọgide ná nnọpụiche ndị Kraịst? (Maịka 4:3, 5; Jọn 17:16) Ọ̀ ga-eme ha ka ha tinye aka n’okpukpe ụgha? (Mkpughe 18:4, 20, 21) Ịrụ ya ọ̀ ga-egbochi ma ọ bụ kpaara ha ókè n’ụzọ ezi uche na-adịghị na ya imezu ibu ọrụ ndị Kraịst ha? (Matiu 24:14; Ndị Hibru 10:24, 25) N’aka nke ọzọ, hà ga-enwe ike ịnọgide na-enwe ọganihu ime mmụọ, ikekwe ọbụna na-ekere òkè n’ozi oge nile mgbe ha na-eje ozi ahụ a chọrọ?—Ndị Hibru 6:11, 12.
21. N’agbanyeghị mkpebi ya, olee otú ọgbakọ kwesịrị isi ewere nwanna na-ahụ banyere okwu ijere mba ozi ndị nkịtị nke na-emetụtaghị agha?
21 Gịnị ma ọ bụrụ na azịza sitere n’obi eziokwu nke onye Kraịst ahụ nye ajụjụ ndị dị otú ahụ eduje ya n’ikwubi na ije ozi ndị nkịtị nke mba bụ “ezi ọrụ” nke ọ pụrụ ịrụ n’irubere ndị na-achị achị isi? Nke ahụ bụ mkpebi ya n’ihu Jehova. Ndị okenye a họpụtara ahọpụta na ndị ọzọ kwesịrị ịkwanyere akọ na uche nke nwanna ahụ ùgwù n’ụzọ zuru ezu ma gaa n’ihu na-ewere ya dị ka onye Kraịst nwere ezi nguzo. Otú ọ dị, ọ bụrụ na onye Kraịst echee na ọ pụghị ije ozi ndị nkịtị ahụ, e kwesịkwara ịkwanyere nguzo ya ùgwù. Ya onwe ya kwa ka nwere ezi nguzo, o kwesịkwara inweta nkwado ịhụnanya.—1 Ndị Kọrint 10:29; 2 Ndị Kọrint 1:24; 1 Pita 3:16.
22. N’agbanyeghị ọnọdụ na-eche anyị ihu, gịnị ka anyị ga-aga n’ihu na-eme?
22 Dị ka ndị Kraịst anyị agaghị akwụsị ‘ịsọpụrụ onye anyị ji ụgwọ nsọpụrụ.’ (Ndị Rom 13:7) Anyị ga-akwanyere ezi ịdị n’usoro ùgwù ma na-achọ ịbụ ụmụ amaala na-adị n’udo, na-edebe iwu. (Abụ Ọma 34:14) Anyị pụrụ ọbụna ikpe ekpere “n’ihi ndị eze na ndị nile nọ n’ọnọdụ dị elu” mgbe a chọrọ ka ndị ikom a mee mkpebi ga-emetụta ndụ na ọrụ ndị Kraịst anyị. N’ihi anyị inyeghachi Siza ihe nke Siza, anyị na-enwe olileanya na ‘anyị ga-ebi obi udo na nke dị nwayọọ n’ime nsọpụrụ Chineke nile na ikwesị nsọpụrụ nile.’ (1 Timoti 2:1, 2) Nke ka nke, anyị ga-aga n’ihu na-ekwusa ozi ọma nke Alaeze ahụ dị ka nanị olileanya dịịrị ihe a kpọrọ mmadụ, na-eji akọ na uche na-enyeghachi Chineke ihe nke Chineke.
[Ihe e dere n’ala ala peeji]
a Lee Ụlọ Nche (Bekee) nke May 15, 1964, peji nke 308, paragraf nke 21.
Ị̀ Pụrụ Ịkọwa?
◻ N’ime ka mmekọrịta ya na Siza na Jehova nwee ezi nhazi, gịnị bụ nchegbu mbụ nke onye Kraịst?
◻ Gịnị ka anyị ji Jehova ụgwọ ya nke anyị na-apụtụghị inye Siza ma ọlị?
◻ Gịnị bụ ihe ụfọdụ anyị na-enyeghachi Siza n’ụzọ ziri ezi?
◻ Olee akụkụ akwụkwọ nsọ ndị na-enyere anyị aka ime mkpebi ziri ezi n’okwu metụtara ije ozi agha mmanye?
◻ Gịnị bụ ụfọdụ ihe anyị ga-eburu n’uche ma ọ bụrụ na a kpọọ anyị òkù maka ijere mba ozi ndị nkịtị nke na-emetụtaghị agha?
◻ Banyere Jehova na Siza, gịnị ka anyị ga-anọgide na-eme?
[Foto dị na peeji nke 16, 17]
Ndị ozi ahụ gwara Sanhedrin, sị: “Anyị aghaghị ikwenyere Chineke karịa mmadụ”