Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 10/07 p. 8
  • Na-agbarịtanụ Ibe Unu Ume

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Na-agbarịtanụ Ibe Unu Ume
  • Ozi Alaeze Anyi—2007
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • ”Pọl Kelere Chineke Ma Nwee Obi Ike”
    Usoro Ihe Omume—Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ—2019
  • Ha Na-agbasi Mbọ Ike Ka Ha Nwee Ike Ijere Anyị Ozi
    Usoro Ihe Omume—Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ—2023
  • Otú Ndị Nlekọta Na-ejegharị Ejegharị Si Eje Ozi Dị Ka Ndị Kwesịrị Ntụkwasị Obi Na-achị Ezinụlọ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1996
  • Ndị Nlekọta A Họpụtara Ka Ha Na-azụ Ìgwè Atụrụ Chineke
    Ndị A Haziri Ime Uche Jehova
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ozi Alaeze Anyi—2007
km 10/07 p. 8

Na-agbarịtanụ Ibe Unu Ume

1. Olee ohere pụrụ iche nleta ndị nlekọta na-ejegharị ejegharị na-eme ka anyị nwee?

1 Pọl onyeozi degaara ọgbakọ dị na Rom akwụkwọ, sị: “N’ihi na ọ na-agụsi m agụụ ike ịhụ unu, ka m wee nyetụ unu onyinye ime mmụọ ka e mee ka unu guzosie ike; ma ọ bụ, kama nke ahụ, ka unu wee gbarịta onwe unu ume, onye nke ọ bụla site n’okwukwe nke ibe ya, ma nke unu ma nke m.” (Rom 1:11, 12) Nleta ndị nlekọta na-ejegharị ejegharị na-eleta anyị taa na-eme ka anyị nweekwa ohere ịgbarịta ibe anyị ume.

2. Olee ihe mere e ji ama ọkwa n’oge na onye nlekọta sekit na-abịa?

2 Ọgbakọ: A na-adịkarị amara ọgbakọ ọkwa na onye nlekọta sekit na-abịa ma ọ fọdụ ihe dị ka ọnwa atọ tupu ya abịa. Nke a na-enye anyị ohere ịhazi ihe omume anyị nke ọma iji nwee ike irite uru zuru ezu ná nleta ya. (Efe. 5:15, 16) Ọ bụrụ na ị na-arụrụ mmadụ ma ọ bụ gọọmentị ọrụ, ikekwe, i nwere ike ịrịọ ka e nye gị ohere ịhapụ ọrụ n’ime izu iji soro gaa ozi ọma. Ụfọdụ na-eme ndokwa ịrụ ọrụ ọsụ ụzọ inyeaka n’ọnwa ahụ ọ ga-abịa. Ọ bụrụ na i meela atụmatụ ime njem n’izu ahụ, ọ́ gaghị adị mma ka i megharịa ya ka i wee nọrọ ya?

3. Olee ihe onye ọ bụla n’ime anyị nwere ike ime iji nweta agbamume ma onye nlekọta sekit bịa?

3 Otu n’ime nzube bụ́ isi onye nlekọta sekit ji abịa ileta ọgbakọ bụ iji gbaa ụmụnna ume, nyekwa ha ọzụzụ n’ozi ubi. Ọ́ gaghị adị mma ka i denye aha gị ka gị na ya ma ọ bụ nwunye ya, ma ọ bụrụ na ọ lụọla nwanyị, rụọ n’ozi? Ọ na-atọ ndị nlekọta sekit ụtọ ka ha na ndị nkwusa dị iche iche na-arụ n’ozi, tinyere ndị na-enwechaghị ahụmahụ ma ọ bụ ndị na-enwechaghị nkà n’izi ozi ọma. Onye ọ bụla nwere ike ịmụta ihe n’otú o si ezi ozi ọma ma tinye aro ndị ọ ga-eji obiọma tụọ n’ọrụ. (1 Kọr. 4:16, 17) Ịkpọ ya ka ọ bịa ka gị na ya rie nri ga-enyekwu unu ohere ịgbarịta ibe unu ume. (Hib. 13:2) Ebe ọ bụ na okwu ya ga-elebara mkpa ọgbakọ unu anya, gee ya ntị nke ọma.

4. Olee otú anyị nwere ike isi gbaa onye nlekọta sekit anyị ume?

4 Onye Nlekọta Sekit: Pọl onyeozi adịghị iche n’ebe ụmụnna ndị o letara nọ n’ihi na o nwere ihe ndị mara okwukwe ya aka, nyeekwa ya nsogbu n’obi. Agbamume dị ya mkpa. O nwekwara obi ekele mgbe o nwetara ya. (2 Kọr. 11:26-28) Mgbe ọgbakọ dị na Rom nụrụ na Pọl, onye bụ́zi onye mkpọrọ, na-abịa, ụfọdụ n’ime ha gara n’Ahịa Apịọs izute ya—bụ́ ebe dị kilomita iri asaa na anọ site na Rom! “Ozugbo Pọl hụkwara ha, o kelere Chineke ma nwee obi ike.” (Ọrụ 28:15) Gị onwe gị nwekwara ike ịgba onye nlekọta sekit unu ume. Nye ya “nsọpụrụ okpukpu abụọ” site n’iji ịnụ ọkụ n’obi kwado nleta ya. (1 Tim. 5:17) Jiri obi gị nile gwa ya na i nwere obi ekele maka mbọ ọ na-agba n’ihi gị, gosikwa ya n’omume. Obi ga-adị ya na nwunye ya ụtọ mgbe ha na-ahụ okwukwe gị, ịhụnanya gị, na ntachi obi gị.—2 Tesa. 1:3, 4.

5. Gịnị mere agbamume ji dị anyị nile mkpa taa?

5 ‘N’oge ndị a pụrụ iche nke siri ike obibi,’ olee onye n’ime anyị nke agbamume na-adịghị mkpa? (2 Tim. 3:1) Kpebie ugbu a iso n’ihe nile a ga-eme n’izu pụrụ iche onye nlekọta sekit ga-eleta ọgbakọ unu. Anyị nile—ma ndị nlekọta na-ejegharị ejegharị ma ndị nkwusa ọgbakọ—nwechara ike iji ọṅụ na-agbarịta ibe anyị ume. Anyị ga-esi otú a ‘na-akasirịta ibe anyị obi ma na-ewulirịta ibe anyị elu.’—1 Tesa. 5:11.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya