Ndị Na-eto Eto Na-ajụ Sị . . .
Olee Otú M Pụrụ Isi Mee Eziokwu ahụ nke M?
“A zụlitere m dị ka otu n’ime Ndịàmà Jehova, ana m echekwa mgbe nile na ọ bụrụ na a zụlitere gị otú ahụ, na ị maara Jehova n’ezie. Lee ka m si hie ụzọ!”—Antoinette.
“GỊNỊ bụ eziokwu?” Pọntiọs Paịlet, bụ́ nwoke nke nyefere Jisọs ka e gbuo ya, jụrụ ajụjụ ahụ a ma nke ọma. (Jọn 18:38) Otú ọ dị, ihe àmà na-egosi na Paịlet zubere iji ajụjụ nleda anya ya mechie—ọ bụghị imeghe—ezi nkwurịta okwu ọ bụla. O nweghị mmasị n’ezie ‘n’eziokwu.’ Ma gịnị banyere gị? Ì nwere mmasị n’eziokwu?
Ndị ọkà ihe ọmụma atụgharịwo uche banyere ihe eziokwu bụ ruo ọtụtụ narị afọ, na-enwe ntakịrị ihe, n’ụzọ mmechu ihu, si ná mgbalị ha pụta. Otú ọ dị, ị pụrụ ịchọta azịza nye ajụjụ Paịlet. Jisọs Kraịst kụziri na Okwu Chineke bụ eziokwu. O kwukwara okwu banyere onwe ya dị ka “eziokwu.” Jọn onyeozi dekwara, sị: ‘Eziokwu sitere n’aka Jisọs bịa.’ (Jọn 1:17; 14:6; 17:17) Ya mere, a na-akpọkwa ozizi nile nke ndị Kraịst, bụ́ nke mesịrị ghọọ akụkụ nke Bible, “eziokwu ahụ” ma ọ bụ “eziokwu nke ozi ọma.” (Taịtọs 1:14; Ndị Galetia 2:14; 2 Jọn 1, 2) Ozizi ndị a nke ndị Kraịst gụnyere ihe ndị dị ka aha aka Chineke, nguzobe nke Alaeze Chineke, mbilite n’ọnwụ, na ihe mgbapụta Jisọs.—Abụ Ọma 83:18; Matiu 6:9, 10; 20:28; Jọn 5:28, 29.
Ndị nne na nna bụ́ ndị Kraịst akụziworo ọtụtụ puku ndị na-eto eto eziokwu Bible. Ma nke a ọ̀ pụtara na ndị dị otú ahụ “na-ejegharị n’eziokwu ahụ”? (3 Jọn 3, 4) Ọ bụchaghị otú ahụ. Dị ka ihe atụ, a zụlitere Jennifer dị afọ 20 dị ka otu n’ime Ndịàmà Jehova. Ọ na-echeta, sị: “Mama m kpọọrọ m gaa mgbakọ Ndịàmà ma tụọ aro na m kwesịrị ịdị na-eche echiche ịbụ onye e mere baptism. Ma ekwuru m n’obi m, ‘Ọ dịghị mgbe m chọrọ ịbụ Onyeàmà. Achọrọ m nanị ikpori ndụ!’”
Ndị ntorobịa ụfọdụ kwenyere n’ihe a kụziwooro ha, ma ha azụlitebeghị nghọta miri emi banyere ihe Bible na-akụzi n’ezie. Olee ihe ize ndụ dị na ya? Jisọs dọrọ aka ná ntị na ndị ụfọdụ “enweghị mkpọrọgwụ n’ime onwe ha.” Ndị dị otú ahụ pụrụ “[ịnọ] nwa oge; e mesịa, mgbe mkpagbu ma ọ bụ nsogbu pụtara n’ihi okwu ahụ, ngwa ngwa ha maa n’ọnyà.” (Mak 4:17) Ndị ọzọ pụrụ ịkọwa nkwenkwe ha dabeere na Bible ruo n’ókè ụfọdụ, ma ha amatabeghị Chineke n’onwe ha. “Echeghị m na mụ na Jehova nwere mmekọrịta n’ezie mgbe m dị obere . . . Ọ dị m ka ọ dabeere karịsịa ná mmekọrịta ya na ndị mụrụ m,” ka otu nwa agbọghọ aha ya bụ Aneesa na-ekwu.
Olee ebe ị kwụ na nke a? Jehova ọ̀ bụ nanị Chineke nke ndị mụrụ gị? Ka ị̀ pụrụ ikwu, dị ka onye ọbụ abụ ahụ so dee Bible, sị: “Ọ bụ Gị ka m tụkwasịworo obi, Jehova: asịwo m, Chineke m ka Ị bụ”? (Abụ Ọma 31:14) Ọ pụrụ ịchọ obi ike iji nakwere ihe ndị bụ eziokwu. Otu nwa okorobịa aha ya bụ Alexander na-ekwu, sị: “Nye m, iji obi eziokwu mee nnyocha onwe onye bụ nzọụkwụ mbụ.” Mgbe i metụchara nnyocha obi, ị pụrụ ịbịa ghọta na ị nwapụtabeghị eziokwu ahụ (ozizi nile nke ndị Kraịst) n’onwe gị n’ezie. Ọ pụrụ ịbụ na i nweghị nkweta siri ike, n’ihi ya ndụ gị nwere ike yie ihe na-enweghị nzube, na-enweghị ezi nduzi.
Ná nzukọ ndị Kraịst ha, Ndịàmà Jehova na-abụkarị otu abụ isiokwu ya bụ́ “Mee Eziokwu ahụ nke Gị.”a Ndụmọdụ ahụ pụrụ ikwesị ekwesị nye gị. Ma olee otú ị pụrụ isi mee otú ahụ? Olee ebe ị ga-amalite?
Nwapụtara Ya Onwe Gị
Ná Ndị Rom 12:2, anyị na-ahụ ndụmọdụ nke Pọl onyeozi: “Nwapụta ihe bụ ihe Chineke na-achọ, bụ́ ezi ihe nke dịkwa Ya ezi ụtọ nke zukwara okè.” Olee nnọọ otú ị pụrụ isi mee nke ahụ? Site n’inweta “mmazu nke eziokwu ahụ.” (Taịtọs 1:1) Ndị bi n’obodo Beria n’oge ochie ekwereghị ihe ha nụrụ n’ajụghị ajụjụ. N’ụzọ megidere nke ahụ, ha ‘ji nlezianya nyochaa ihe nile e deworo n’akwụkwọ nsọ kwa ụbọchị, ma ihe ndị a ha na-amụta ha dị otú a.’—Ọrụ 17:11.
Otu onye Kraịst na-eto eto aha ya bụ Erin hụrụ mkpa ọ dị ime otu ihe ahụ n’onwe ya. Ọ na-echeta, sị: “Emere m nnyocha. Ajụrụ m onwe m sị, ‘Olee otú m si mara na nke a bụ ezi okpukpe ahụ? Olee otú m si mara na e nwere Chineke aha ya bụ Jehova?’” Gịnị ma ị malite usoro ọmụmụ ihe onwe onye nke gị? Ị pụrụ iji akwụkwọ ahụ dabeere na Bible bụ́ Ihe Ọmụma nke Na-eduba ná Ndụ Ebighị Ebi wee malite.b Jiri nlezianya gụọ ya. Gụọ akụkụ Akwụkwọ Nsọ nile e zoro aka na ha ma rịba ama otú ha si kwekọọ n’ihe a na-ekwu. Ọ pụrụ iju gị anya ịhụ otú echiche gị banyere eziokwu ahụ ga-esi dị iche mgbe ị ghọrọ “onye ọrụ nke ihere na-apụghị ime ya, onye na-ekwuzi okwu nke eziokwu ahụ”!—2 Timoti 2:15.
Pita onyeozi kwuru na ihe ụfọdụ dị na Bible “dị ike ịghọta,” ị ga-ahụkwa na nke a bụ eziokwu. (2 Pita 3:16) Ma mmụọ Chineke pụrụ inyere gị aka ịghọta ọbụna isiokwu ndị siri ike. (1 Ndị Kọrint 2:11, 12) Kpee ekpere maka enyemaka Chineke mgbe ọ na-esiri gị ike ịghọta otu ihe. (Abụ Ọma 119:10, 11, 27) Gbalịa imekwu nnyocha ná mbipụta ndị nke Watch Tower Society. Ọ bụrụ na i jighị n’aka otú ị ga-esi mee nke ahụ, rịọ maka enyemaka. Ndị mụrụ gị ma ọ bụ ikekwe ụfọdụ ndị ọzọ tozuru okè nọ n’ọgbakọ ndị Kraịst pụrụ inyere gị aka.
Cheta, ị naghị amụ ihe iji gosi ndị ọzọ ihe ọmụma gị. Otu onye ntorobịa aha ya bụ Collin na-akọwa, sị: “Ị na-amata àgwà nile nke Jehova.” Wepụta oge iji tụgharịa uche n’ihe ị na-agụ ka o wee bamie n’ime obi gị.—Abụ Ọma 1:2, 3.
Isoro ọgbakọ na-akpakọrịta ná nzukọ ndị Kraịst pụkwara inyere gị aka. E kwuwerị, dị ka Pọl onyeozi dere, ọgbakọ bụ “ide na ntọala nke eziokwu.” (1 Timoti 3:15) Ndị ntorobịa ụfọdụ na-eme mkpesa na nzukọ ndị Kraịst na-agwụ ike. “Ma ọ bụrụ na ị dịghị akwadebe maka nzukọ,” ka Collin na-eto eto na-echetara ha, “mgbe ahụ ị gaghị erite uru dị ukwuu na ha.” Ya mere buru ụzọ kwadebe ihe a ga-amụ tupu oge eruo. Nzukọ na-atọ ụtọ karị mgbe ị bụ onye na-ekere òkè—ọ bụghị nanị onye na-ekiri ihe na-emenụ.
Ì Ji Ọrụ n’Aka Gabiga Ókè nke na I Nweghị Ohere Ịmụ Ihe?
N’eziokwu, n’ihi ọrụ ụlọ akwụkwọ na ọrụ ụlọ gị nile, inweta oge iji mụọ ihe pụrụ ịbụ ihe ịma aka. Otu onye na-eto eto aha ya bụ Susan, na-ede, sị: “Ruo ọtụtụ afọ agbasoro m ịma na ọ dị m mkpa ikwadebe maka nzukọ na inwe ọmụmụ ihe onwe onye mgba, n’agbanyeghị nke ahụ ọ dịghịkwa mgbe m nwere ike ime ya.”
Susan mụtara ‘ịzụchapụta oge’ site ná nchụso ndị na-adịchaghị mkpa. (Ndị Efesọs 5:15, 16) Nke mbụ, o depụtara ihe nile ọ dị ya mkpa ịmụ. Mgbe ahụ, o dokwara oge ịmụ ha. Ma o tinyekwara oge ụfọdụ maka ntụrụndụ n’usoro ihe omume ya. Ọ na-adụ ọdụ, sị: “Agụnyela oge nile na-enweghị ihe e dokwara maka ha. Oge ntụrụndụ dị anyị nile mkpa.” Inwe usoro ihe omume yiri ka ọ ga-enyekwara gị aka.
Kerịta Ihe Ị Na-amụta
Iji ihe ị na-amụta eme ihe na-enye aka karịsịa n’ime ya ihe maara gị ahụ. Nwalee ịkụziri onye ọzọ ihe. Onye ọbụ abụ ahụ kwuru, sị: “Ọnụ m ga-ekwu okwu amamihe nile; ntụgharị uche nke obi m ga-abụkwa nghọta nile.”—Abụ Ọma 49:3.
Ọ bụrụ na ihere ozi ọma ahụ adịghị eme gị, ị gaghị ala azụ isoro ụmụ akwụkwọ ibe gị na ndị ọzọ ị pụrụ izute kerịta ya. (Ndị Rom 1:16) Site n’iji ohere ndị dị otú ahụ na-agwa ndị ọzọ eziokwu ahụ, ị ga na-eji ihe ị na-amụta eme ihe; n’ụzọ dị otú a ị ga-emekwa ka eziokwu ahụ bamie n’uche na n’obi gị.
Lezie Anya Banyere Mkpakọrịta Gị
Ndị Kraịst ụfọdụ na narị afọ mbụ nwere ọganihu ime mmụọ dị mma. Ma n’oge na-adịghị anya Pọl onyeozi aghaghị idegara ha akwụkwọ, na-ajụ, sị: “Ònye gbochiri unu, ka unu ghara ikwenyere eziokwu ahụ?” (Ndị Galetia 5:7) Ihe yiri nke ahụ mere otu onye ntorobịa aha ya bụ Alex. Ọ na-ekwupụta na “isoro òtù ọjọọ na-egbu oge” mebiri mgbalị ya ịmụ Okwu Chineke. Maka ọganihu ime mmụọ gị, ọ pụkwara ịdị gị mkpa ime mgbanwe ụfọdụ n’akụkụ a.
N’aka nke ọzọ, mkpakọrịta ndị dị mma pụrụ n’ezie inyere gị aka inwe ọganihu. Ilu 27:17 na-ekwu, sị: “Ígwè na-amụcha ígwè; otú a ka mmadụ na-amụcha ihu enyi ya.” Chọta ezi ndị nlereanya—ndị na-eji eziokwu ahụ eme ihe ná ndụ ha. Ị pụrụ ịchọta ha kpọmkwem n’ezinụlọ gị. Jennifer na-eto eto na-echeta, sị: “Nna m ochie bụ onye nlereanya m kasị mma. Ọ na-ejikarị hour atọ akwadebe maka ọmụmụ Bible ọgbakọ anyị na Sunday. Ọ na-agụ akụkụ akwụkwọ nsọ nile dị n’ihe ọmụmụ ahụ ná nsụgharị Bible dị iche iche ma lee okwu dị iche iche n’akwụkwọ ọkọwa okwu ya. Ọ bụ ọkachamara n’eziokwu ndị a na-amachaghị sitere na Bible. Ị pụrụ ịjụ ya ihe ọ bụla, ọ ga-achọtakwa azịza ya.”
Mgbe i mere eziokwu ahụ nke gị kpọmkwem, ị ga-enweta ihe onwunwe dị oké ọnụ ahịa—ihe ị na-agaghị ahapụ n’ihi ihe ọ bụla. Ya mere, ya adịla mgbe ị ga-ele eziokwu ahụ anya dị ka nanị “okpukpe nne na nna m.” Nkweta gị kwesịrị ịbụ nke onye ọbụ abụ ahụ, bụ́ onye kwuru, sị: “N’ihi na nna m na nne m ahapụwo m, ma Jehova ga-ekubata m.” (Abụ Ọma 27:10) Site n’ịmata n’ezie ihe Bible na-ezi, ikwere ya, isoro ndị ọzọ na-ekerịta nkwenkwe gị na, karịsịa, ibi ndụ n’ụzọ kwekọrọ na nkwenkwe ndị a, ị ga-egosipụta na i mewo eziokwu ahụ nke gị.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a Site n’akwụkwọ abụ bụ́ Sing Praises to Jehovah, nke Watchtower Bible and Tract Society of New York, Inc., bipụtara.
b Nke Watchtower Bible and Tract Society of New York, Inc., bipụtara.
[Foto dị na peeji nke 15]
Nwapụtara onwe gị eziokwu ahụ site n’ime nnyocha nke gị na inwe ọmụmụ ihe onwe onye