Alụghị Di Ma Ọ Bụ Nwunye n’Oge Ihe Isi Ike Ọnọdụ Akụ̀ na Ụba
“ACHỌBURU m ịlụ nwanyị mgbe m dị 25 afọ,” ka Chuks, onye bi n’Ọdịda Anyanwụ Africa, kwuru. “Ọ dị nwa agbọghọ m bu n’uche, o nwekwara mmasị n’ebe m nọ. Ihe bụ nsogbu bụ ego. Nna m na nwanne m nwoke nke tọrọ m enweghị ọrụ, ụmụnne m ndị m tọrọ na-ejekwa akwụkwọ. Onye ọ bụla na-ele m anya ịkwado ezinụlọ anyị. Mgbe ahụ, iji mee ka ọnọdụ ka njọ, nne na nna m dara ọrịa, nke ahụ pụtakwara ịchọtakwu ego iji kwụọ ụgwọ maka ọgwụ.”
Chuks, bụ́ Onyeàmà Jehova, achọghị ịbanye n’alụmdi na nwunye n’enweghị ike ilekọta nwunye. O bu okwu Pọl ndị a na-achọta na 1 Timoti 5:8 n’uche: “Ma ọ bụrụ na onye ọ bụla ebughị ụzọ cheere ndị nke aka ya ihe na-akpa ha, ma nke kachasị ndị ezinụlọ nke aka ya, ọ gọnarịwo okwukwe anyị, jọkarịakwa onye na-ekweghị ekwe ná njọ.”
“Arụsiri m ọrụ ike,” ka Chuks gara n’ihu ikwu, “ma ego adịghị ezu ma ọlị. N’ihi ya, ọ dị mkpa iyigharị atụmatụ alụmdi na nwunye anyị ugboro ugboro. N’ikpeazụ anatara m akwụkwọ ozi sitere n’aka nwa agbọghọ ahụ na-ekwu na onye ọzọ abịakwutewo nna ya na-achọ ka ọ lụọ ya. Nna ya kwenyere. Ụbọchị ole na ole ka akwụkwọ ozi ya bịasịrị, e buru mmanya ajụjụ ya.”
Dị ka Chuks, ọtụtụ ndị ikom bụ́ ndị Kraịst ahụwo ka atụmatụ ịlụ nwanyị ha dakpọrọ ma ọ bụ bụrụ nke e yigharịrị n’ihi ajọ ọnọdụ akụ̀ na ụba. N’ọtụtụ ala e nwere oké ịrị elu nke ọnụ ahịa. Dị ka ihe atụ, n’otu mba dị n’etiti Africa, ọnụ ahịa ji 8,319 pasent rịa elu ọjị n’otu afọ! Ná mba ụfọdụ ọrụ siri ike nchọta. Ọtụtụ mgbekwa, ụgwọ ọrụ na-adị nta nke ukwuu nke na ọ na-esiri nwoke ike ilekọta onwe ya, ma ya fọdụzie ilekọta nwunye na ụmụ. Otu nwa okorobịa na Nigeria kwara arịrị na ọrụ oge nile e nyere ya n’otu ụlọ ọrụ na-emepụta ihe na-akwụ nanị $17 kwa ọnwa—ihe na-erughị ego bọs iji gaa ma si n’ebe ọrụ ahụ lata kwa ọnwa!
Ọtụtụ ụmụ nwanyị bụ́ ndị Kraịst bụ́ ndị na-alụbeghị di na-ahụkwa na ihe isi ike ọnọdụ akụ̀ na ụba na-etisasị atụmatụ alụmdi ha. Ọtụtụ mgbe ha aghaghị ịrụ ọrụ iji kwado ndị òtù ezinụlọ. Ụfọdụ ndị ikom na-alụbeghị nwunye, mgbe ha hụrụ ọnọdụ ahụ, na-agbụrụ onwe ha, na-amata na ọ ga-adị onye na-alụ nwunye n’ọnọdụ ndị dị otú ahụ mkpa ịrụta ego ga-ezu iji lekọta ọ bụghị nanị nwunye kamakwa ezinụlọ nwunye ahụ. Ayo, bụ́ onye gara mahadum, na-agbalịsi ike ilekọta onwe ya, nne ya, na ụmụnne ya ndị ọ tọrọ. “Achọrọ m ịlụ di,” ka ọ kwara arịrị kwuo, “ma mgbe ndị ọzọ bịara hụ ọtụtụ ndị m na-azụ, ha na-agbapụ ọsọ.”
N’agbanyeghị ihe isi ike ego, ọtụtụ ndị Kraịst na-alụbeghị di ma ọ bụ nwunye na-ahụ ka ndị ikwu na ndị ọzọ na-arụgide ha ịlụ na ịmụ ụmụ. Mgbe ụfọdụ nrụgide a na-abụ n’ụdị ịkwa emo. N’akụkụ ụfọdụ nke Africa, dị ka ihe atụ, ọ bụ omenala mgbe a na-ekele onye toruworo ogo mmadụ ịjụ maka ọdịmma di ma ọ bụ nwunye ya na ụmụ ya. Mgbe ụfọdụ, a na-eji ekele ndị dị otú ahụ akwa ndị na-alụbeghị di ma ọ bụ nwunye emo. John, onye na-achọ ịgafe afọ ndị nke 40 ya, na-asị: “Mgbe ndị mmadụ mara m njakịrị ma kwuo sị, ‘Kedụ maka nwunye gị?,’ m na-aza, ‘Ọ na-abịa.’ Ihe bụ eziokwu bụ, olee otú m pụrụ isi lụta nwunye ma ọ bụrụ na m pụghị ilekọta ya?”
Nye John na ọtụtụ ndị ọzọ dị ka ya, a chịkọtara ọnọdụ ahụ ọnụ n’otu ilu ndị Yoruba bụ́: “Ịlụ nwanyị ngwa ngwa abụghị ihe e ji etu ọnụ; ịkpata ihe oriri bụ ebe nsogbu dị.”
Jiri Ọnọdụ Gị Mee Ihe I Nwere Ike Ya
Lee ka o si dị mfe ịda mbà n’obi mgbe ihe na-ekweghị nnweta na-agụsi anyị ike. Ilu 13:12 na-asị: “Nchere a na-echere ogologo mgbe dị anya na-eme ka obi na-arịa ọrịa.” Ma eleghị anya nke a bụ otú ọ dị gị ma ọ bụrụ na ọ na-agụsi gị ike ịlụ di ma ọ bụ nwunye ma i nweghị ego ime otú ahụ. Nke a pụrụ ịbụ eziokwu karịsịa ma ọ bụrụ na i so ná ndị Pọl onyeozi kọwara dị ka ndị ‘na-ere ọkụ n’agụụ ahụ.’—1 Ndị Kọrint 7:9.
Ịnagide ya nwere ike ọ gaghị adị mfe, ma e nwere ihe ndị ị pụrụ ime iji die ya na ọbụna chọta ọṅụ n’ọnọdụ gị. Jisọs Kraịst, nwoke na-alụghị nwunye, setịpụrụ ụkpụrụ Bible dị irè nke pụrụ inyere gị aka imeri ndakpọ olileanya na-esite ná nchere a na-echere ogologo oge. Ọ sịrị: “Ọ dị ngọzi inye ihe karịa ịnara ihe.”—Ọrụ 20:35.
Ị pụrụ itinye nke a n’ọrụ site n’imere ezinụlọ gị na ndị ọzọ nọ n’ọgbakọ ihe ọma. Ma eleghị anya ị pụkwara ịmụba ọrụ gị n’ozi ndị Kraịst. Ọ bụrụ na i jide ọrụ n’aka n’ụzọ zuru ezu n’inye ihe n’ụzọ achọghị ọdịmma onwe onye nanị, ị pụrụ ịchọpụta na ị na-aghọ ‘onye na-eguzosi ike n’obi ya, nke nwere ike ime ihe ọ na-achọ.’—1 Ndị Kọrint 7:37.
Nwoke ọzọ na-alụghị nwunye, Pọl onyeozi, dere okwu ndụmọdụ a na-enye aka: “Lezienụ anya nke ọma otú unu na-ejegharị, ọ dịghị ka ndị na-amaghị ihe, kama dị ka ndị maara ihe; na-azụchapụrụ onwe unu oge a nile, n’ihi na ụbọchị ndị a jọrọ njọ.” (Ndị Efesọs 5:15, 16) Ọtụtụ ndị Kraịst na-alụbeghị di ma ọ bụ nwunye achọtawo ‘izu ike nye mkpụrụ obi ha’ site n’iji oge ha na-agakwu Jehova nso site n’ekpere, ọmụmụ Okwu Chineke, na nkere òkè ná nzukọ ndị Kraịst. (Matiu 11:28-30) Ọ bụrụ na i mee nke a, ị ga-enwe ike ịnagide nke ọma karị ọnọdụ akụ̀ na ụba siri ike. Ọ ga-enyekwara gị aka igosipụta ọbụna ọnọdụ ime mmụọ ka elu, na-eme gị di ma ọ bụ nwunye ka mma ma ọ bụrụ na i mesịa lụọ.
Echezọla mgbe ọ bụla na Jehova na-eche banyere ndị nile na-ejere ya ozi. Ọ maara nsogbu na ihe isi ike nile ị na-enwe. Nna anyị na-ahụ n’anya nke eluigwe makwaara ihe ga-akasị baara gị uru ruo ogologo oge, ma n’ime mmụọ ma ná mmetụta uche. Ọ bụrụ na i jiri ndidi tinye ụkpụrụ dị iche iche nke Okwu ya n’ọrụ ná ndụ gị kwa ụbọchị, ị pụrụ ijide n’aka na ọ ga-eweta ahụ efe n’oge ya ma gboo mkpa na ọchịchọ gị nile n’ụzọ ga-ewetara gị uru na-adịru ebighị ebi. Bible na-emesi anyị obi ike, sị: “Ọ [Jehova] gaghị egbochi ezi ihe n’ebe ndị na-ejegharị n’izu okè nọ.”—Abụ Ọma 84:11.
Lekwasị Anya n’Akụkụ Ndị Dị Mma
Burukwa n’uche na e nwere uru dị iche iche nke alụghị di ma ọ bụ nwunye. Pọl onyeozi dere, sị: “Onye na-enyefekwa amaghị nwoke ma ọ bụ nwanyị ya n’ọlụlụ na-eme nke ọma, ma onye na-enyefeghị ya n’ọlụlụ ga-eme nke ọma karị.”—1 Ndị Kọrint 7:38, NW.
N’ihi gịnị ka alụghị di ma ọ bụ nwunye ji bụrụ ime ‘nke ọma karịa’ ịlụ? Pọl kọwara: “Onye na-enweghị nwunye na-echegbu onwe ya n’ihe nke Onyenwe anyị, otú ọ ga-eme ihe ga-atọ Onyenwe anyị ụtọ: ma onye nwere nwunye na-echegbu onwe ya n’ihe ụwa, otú ọ ga-eme ihe ga-atọ nwunye ya ụtọ. A kpawokwa ókè n’etiti nwunye na nwa agbọghọ na-amaghị nwoke. Nwanyị nke na-enweghị di na-echegbu onwe ya n’ihe nke Onyenwe anyị, ka o wee dị nsọ n’ahụ ya na mmụọ ya kwa: ma nwanyị nke nwere di na-echegbu onwe ya n’ihe nke ụwa, otú ọ ga-eme ihe ga-atọ di ya ụtọ.”—1 Ndị Kọrint 7:32-34.
N’ikwu ya n’ụzọ ọzọ, ndị Kraịst lụrụ di ma ọ bụ nwunye na-enwe nchegbu n’ụzọ ziri ezi banyere mkpa, mmasị, na ihe ndị na-adịghị amasị ndị ha lụrụ. Ma ndị Kraịst na-alụghị di ma ọ bụ nwunye pụrụ ilekwasị anya n’itinye uche karị n’ozi Jehova. N’iji ha tụnyere ndị lụrụ, ndị Kraịst na-alụghị nọ n’ọnọdụ ka mma ‘ịnọ n’ihu Onyenwe anyị ghara inwe uche mgbasasị.’—1 Ndị Kọrint 7:35.
Pọl adịghị ekwu na ndị Kraịst na-alụghị di ma ọ bụ nwunye enweghị ihe ndọpụ uche ọ bụla. Ọ bụrụ na nsogbu ọnọdụ akụ̀ na ụba na-ebo gị ibu arọ, ị pụrụ iche na e nwere ọtụtụ ihe na-eyi egwu ịdọpụ uche gị n’ozi gị. Ka o sina dị, nnwere onwe onye ijere Chineke ozi na-ehikarịrị onye na-alụghị di ma ọ bụ nwunye nne karịa maka onye lụrụ.
Ọ bụ ezie na ọ kwadoro ọnọdụ alụghị di ma ọ bụ nwunye dị ka ụzọ nke ka mma, Pọl onyeozi ekwughị na ọ dị njọ ịlụ. O dere, sị: “Ma a sịkwa na ọ bụ ezie na ị lụrụ nwunye, i mehieghị.” Ma, ọ dọrọ aka ná ntị, sị: “Ndị [lụrụ] ga-enwe mkpagbu n’anụ ahụ ha.”—1 Ndị Kọrint 7:28.
Gịnị ka o bu n’uche na nke ahụ? Alụmdi na nwunye na-eweta nchekasị ụfọdụ. N’oge ihe isi ike ọnọdụ akụ̀ na ụba, mkpagbu dị otú ahụ pụrụ ịgụnye nchegbu nna banyere inye nwunye ya na ụmụ ya ihe na-akpa ha. Ọrịa pụkwara iwetara ezinụlọ ibu arọ ndị ọzọ nke ego na mmetụta uche.
Ya mere ọ bụ ezie na ọnọdụ gị nwere ike ọ gaghị abụ ihe ị họọrọ, ị pụrụ ịnọ n’ọnọdụ ka mma karịa ka ị ga-anọ ma ọ bụrụ na ị lụrụ di ma ọ bụ nwunye ma nwee ibu ọrụ nke inye ụmụ ihe na-akpa ha. Ihe isi ike ndị ị na-eche ihu ugbu a na-adịru nwa oge; a ga-ekpochapụ ha n’usoro ihe ọhụrụ Chineke—kpochapụkwa ụfọdụ ọbụna n’isi nso karị.—Tụlee Abụ Ọma 145:16.
Ị̀ Pụrụ Ịgbasawanye Ozi Gị?
Ọ bụ ezie na ọ bụghị mmadụ nile pụrụ ime otú ahụ, ụfọdụ enwewo ike ịbanye n’ije ozi oge nile n’agbanyeghị nsogbu ego. Chuks, onye e hotara na mbụ, na-azụ ma na-ere ngwá ọfịs iji na-akwado ezinụlọ ya. N’ihe dị ka n’otu oge ahụ atụmatụ ịlụ nwunye ya dakpọrọ, ọ natara akwụkwọ ozi na-akpọ ya òkù ịrụ ọrụ nwa oge n’ihe owuwu n’alaka ụlọ ọrụ Watch Tower Society dị ná mba ya. N’inwe nchegbu banyere ego, nwanne ya nwoke nke tọrọ ya gbara ya ume ka ọ ghara ịga. Ma, Chuks chere na Jehova enyeworo ya aka ihiwe azụmahịa ngwá ọfịs ya, ya mere na ya kwesịrị itinye ọdịmma Alaeze n’ọnọdụ mbụ ma tụkwasị obi n’ikike Chineke inye ihe dị mkpa. (Matiu 6:25-34) E wezụga nke ahụ, ka o chere, ọ bụ nanị maka ọnwa atọ.
Chuks naara ọkpụkpọ òkù ahụ ma nyefee nwanne ya nwoke azụmahịa ahụ. Afọ isii n’ihu, Chuks ka nọ n’ozi oge nile, bụrụ okenye n’ọgbakọ ndị Kraịst, nweekwa ego ịlụ nwanyị. Ọ̀ na-akwa ụta banyere otú ihe siworo gaa ná ndụ ya? Chuks na-asị: “O wutere m mgbe m na-enweghị ike ịlụ nwunye n’oge m chọburu, ma ihe mesịrị dabara m. Enwewo m ọtụtụ ọṅụ na ihe ùgwù ije ozi bụ́ ndị ọ pụrụ ịbụ na mụ agaraghị enwe ike inwe ha a sị na m lụrụ nwanyị mgbe ahụ ma nwee ezinụlọ.”
Ihe Ntụkwasị Obi Maka Ọdịnihu
N’oge ihe isi ike ọtụtụ na-achọ ịnọ ná ntụkwasị obi alụmdi na nwunye na-enye dị ka ihe nchebe pụọ n’ihe isi ike ego n’ọdịnihu. Mba ụfọdụ, n’ịbụ ndị nọ n’oké ụgwọ, nwere ihe enyemaka dị nta maka ndị agadi, ma ọ bụrụdị na ha nwere ma ọlị. Ya mere ndị nne na nna na-adaberekarị n’ezinụlọ ha, karịsịa n’ụmụ ha, ilekọta ha ná nká. N’ihi ya, a na-arụgidekarị ndị ikom na ndị inyom na-alụbeghị di ma ọ bụ nwunye ịlụ ma nwee ụmụ, ọbụna mgbe ọnọdụ ego ha dị njọ.
Ma alụmdi na nwunye na ịmụ ụmụ adịghị eme ka e jide ịnọ ná ntụkwasị obi n’aka. Ụmụaka ụfọdụ bụ́ ndị ụwa adịghị njikere ilekọta nne na nna meworo agadi, ndị ọzọ enweghị ike imeli ya, ebe ndị ọzọkwa na-anwụ tupu ndị mụrụ ha. Ndị Kraịst na-atụ anya ịnọ ná ntụkwasị obi site n’ebe ọzọ karịsịa, na-eburu n’uche nkwa Chineke bụ́: “M gaghị aha gị aka ma ọlị, M gaghị ahapụkwa gị ma ọlị.”—Ndị Hibru 13:5.
A gbahapụbeghị ndị hapụworo ịlụ di ma ọ bụ nwunye ruo n’ọdịnihu iji jeere Jehova ozi oge nile. Christiana enweghị di, ọ dịkwa 32 afọ. O jewo ozi dị ka ọsụ ụzọ oge nile na Nigeria ruo afọ itoolu gara aga. Ọ na-asị: “M na-atụkwasị Jehova obi m, bụ́ onye na-ekwe anyị nkwa na ya agaghị agbahapụ ndị ohu ya mgbe ọ bụla. Nkwa ya bụ nchekwube m. Jehova na-elekọta m ma n’ụzọ ime mmụọ ma n’ụzọ ihe onwunwe. Ọ ghọwo Nna na-emesapụ aka. Dị ka ihe atụ, akwagara m n’ebe mkpa maka Ndịàmà dị ukwuu iji sụọ ụzọ. Ọ bụ ezie na ihe ndị dị mkpa ná ndụ dị ole na ole, amụtawo m iji ókè ihe m nwere eme ihe. Mgbe e nyere m àkwà n’ụlọ ọgwụ n’ihi ọrịa ịba typhoid, ụmụnna nọ n’ọgbakọ mbụ m gbataara m ọsọ enyemaka.
“Ozi oge nile na-eju m afọ nke ukwuu. M na-ele ya anya dị ka oké ihe ùgwù iso Onye Okike nke eluigwe na ala na ọtụtụ ụmụnna nwoke na nwanyị gburugburu ụwa na-arụkọ ọrụ. M na-ahụ ọtụtụ ndị na-eto eto ndị nọ n’obi nkoropụ ma ghara inwe olileanya n’ihi ihe ndị na-eme gburugburu ha. Nye m, ndụ m nwere nzube; m ji nchekwube na-elega anya n’ọdịnihu. Amaara m na ịnọ Jehova nso bụ ihe ngwọta kasị mma nye nsogbu ndị anyị na-eche ihu taa.”
Ọ bụrụ na ọ na-agụ gị agụụ ịlụ di ma ọ bụ nwunye ma i nweghị ike n’ihi ihe isi ike ọnọdụ akụ̀ na ụba, obi sie gị ike! Ọ bụghị nanị gị. E nwere ọtụtụ ndị na-edi ule ndị yiri ya site n’enyemaka Jehova. Jiri ọnọdụ gị mee ihe kasị mma ị pụrụ ime site n’itinye onwe gị n’imere ndị ọzọ ihe ọma na iwelite ọnọdụ ime mmụọ gị. Bịaruo Chineke nso; ọ ga-enyere gị aka n’ihi na ihe banyere gị na-emetụ ya n’obi.—1 Pita 5:7.