Gịnị Ma Ọ Bụrụ na Ndị Mụrụ M Emegide Ọlụlụ Di Ma Ọ Bụ Nwunye M?
Lakesha na enyi ya nwoke na-eche echiche ịlụ di na nwunye, ma nne ya akwadoghị ya. “M ga-agba afọ 19 n’afọ a,” ka Lakesha na-ekwu, “ma mama m siri ọnwụ ka anyị chere ruo mgbe m dị afọ 21.”
Ọ BỤRỤ na ị na-achọ ịlụ di ma ọ bụ nwunye, ọ bụ nanị ihe kwesịrị ekwesị ịchọ ka ndị mụrụ gị soro gị nwee obi ụtọ. Ọ pụrụ igbu gị mgbu n’ezie mgbe ndị mụrụ gị na-akwadoghị nhọrọ i mere banyere onye ị ga-alụ. Gịnị ka i kwesịrị ime? Ọ̀ bụ ileghara ọchịchọ ha anya, ma gaa n’ihu n’atụmatụ ịlụ di ma ọ bụ nwunye gị?a
Nke a pụrụ ịdị na-adọrọ adọrọ ma ọ bụrụ na i toruola ogo mmadụ ma nwee ike n’ụzọ iwu kwadoro ịlụ di ma ọ bụ nwunye n’enweghị nkwado ndị mụrụ gị. Ka o sina dị, Bible akpaghị ókè afọ ndụ mmadụ ga-eru n’inye ndị mụrụ mmadụ nsọpụrụ na nkwanye ùgwù. (Ilu 1:8) Ọ bụrụkwa na i leghara mmetụta ha anya, ị pụrụ imebi mmekọrịta gị na ha n’ụzọ na-adịgide adịgide. Ọzọkwa, o kwekwara omume—ikekwe ọ pụdịrị ịbụ—na ndị mụrụ gị nwere ezi ihe mere ha ji na-emegide ọlụlụ di ma ọ bụ nwunye gị.
N’afọ Ndụ Dị Aṅaa Ka A Bụ Nwata Karị?
Dị ka ihe atụ, ndị mụrụ gị hà na-agwa gị na ị bụ nnọọ nwata ịlụ di ma ọ bụ nwunye? Bible esetịpụghị afọ ndụ mmadụ ga-eru maka alụmdi na nwunye. Ma ọ tụrụ aro na tupu a lụọ di ma ọ bụ nwunye, mmadụ kwesịrị “ịgafe ntoju ntorobịa”—afọ ndị na-esochi oge ịgba ajị mgbe ọchịchọ mmekọahụ nọ n’ọ̀tụ̀tụ̀ ha kasị elu. (1 Ndị Kọrint 7:36, NW) N’ihi gịnị? N’ihi na ndị na-eto eto dị otú ahụ nọ nnọọ n’oge mmalite nke ịzụlite ntozu okè nke mmetụta uche, njide onwe onye, na àgwà ime mmụọ ndị dị mkpa iji nagide ndụ alụmdi na nwunye.—Tụlee 1 Ndị Kọrint 13:11; Ndị Galetia 5:22, 23.
Mgbe Dale dị afọ 20 kpebiri ịlụ nwanyị, mmegide nke ndị mụrụ ya gbagwojuru ya anya. “Ha kwuru na m bụ nnọọ nwata, gharakwa inwe ahụmahụ,” ka ọ na-ekwu. “Echere m na anyị dị njikere, nweekwa ike ịmụta ihe mgbe anyị lụsịrị, ma ndị mụrụ m chọrọ ijide n’aka na ihe m na-eme abụghị nanị n’ihi mmetụta uche. Ha jụrụ ọtụtụ ajụjụ. M̀ dị njikere ime ihe banyere mkpebi ndị a na-eme kwa ụbọchị, ego, ịbụ ezie nke inye ezinụlọ ihe na-akpa ha n’ụzọ anụ ahụ, mmetụta uche, na ime mmụọ? M̀ dị njikere ịghọ nna? Àmụtawo m otú e si ekwurịta okwu n’ezie? Àghọtara m mkpa nke onye a ga-alụ n’ezie? Ha chere na m kwesịrị ịmata onwe m nke ọma karị dị ka onye toworo eto tupu m malite ilekọta onye ọzọ toworo eto.
“Ọ bụ ezie na anyị achọghị ichere, anyị yigharịrị ọlụlụ di na nwunye anyị iji nye onwe anyị oge itozu okè. Mgbe anyị mesịrị lụọ, anyị ji ntọala ka mma banye ná mmekọrịta ahụ, na-enwekwu ihe inye ibe anyị.”
Mgbe O Metụtara Ndịrịta Iche Okpukpe
Mgbe Terri zụlitere mmetụta ịhụnanya maka otu nwoke nke na-anọghị n’okpukpe ọ họọrọ, o sooro ya na-eyi oge na nzuzo. Mgbe ha kwupụtasịrị atụmatụ ha ịlụ di na nwunye, ọ gbakasịrị Terri ahụ ịchọpụta na nne ya megidere ọlụlụ di na nwunye ahụ. “Achọghị m ka mama m nwee mmetụta dị otú a banyere m,” ka Terri kwara arịrị kwuo. “Achọrọ m ka anyị ka nwee mmekọrịta nne na nwa.”
Ma ònye n’ezie na-egbochi mmekọrịta ahụ? Nne Terri ò nwere obi ọjọọ ma ọ bụ ghara inwe ezi uche? Ee e, ọ bụ nanị na ọ na-ejigidesi ndụmọdụ Bible nye ndị Kraịst ịlụ “nanị n’ime Onyenwe anyị” ike. (1 Ndị Kọrint 7:39) N’eziokwu, Bible na-enye iwu, sị: “Unu na ndị na-ekweghị ekwe ekekọtala onwe unu.” (2 Ndị Kọrint 6:14, 15) N’ihi gịnị ka o ji dị otú a?
Otu ihe bụ na nkwekọ okpukpe bụ ihe dị oké mkpa n’alụmdi na nwunye obi ụtọ na nke na-aga nke ọma. Ndị ọkachamara na-ekwu na nrụgide na ndọlị a na-ahụkarị n’alụmdi na nwunye nke ndị na-anọghị n’otu okpukpe na-edubakarị n’ịgba alụkwaghịm. Otú ọ dị, nke ka mkpa bụ ohere nke ịbụ onye a rụgidere imebi nkwenkwe okpukpe mmadụ—ma ọ bụ ịgbahapụ ha kpam kpam. Ọ bụrụgodị na onye òtù ọlụlụ na-ekweghị ekwe emegideghị ofufe gị, ị ghaghịkwa ịnakwere obi mgbu nke ịbụ onye na-enweghị ike isoro ya kerịta nkweta gị ndị kasị dị omimi. Nke a ọ̀ na-ada ka ihe na-eweta ọṅụ zuru okè nke alụmdi na nwunye?
Ya mere Terri nwere mkpebi siri ike ime. “Ahụrụ m Jehova Chineke n’anya,” ka Terri kwuru, “ma achọghị m ka enyi m nwoke hapụ m.” Ị pụghị nnọọ inweta ha abụọ. Ị pụghị imebi ụkpụrụ Chineke ma ka nwee ihu ọma na ngọzi ya.
Otú ọ dị, ikekwe ndị mụrụ gị na-emegide gị ịlụ otu onye Kraịst ibe gị. Ọ̀ pụrụ ikwe mee inwe nkekọta na-ahaghị nhata n’ebe onye kwere ekwe nọ? Ee, ma ọ bụrụ na onye ahụ enweghị ihe mgbaru ọsọ ime mmụọ ma ọ bụ nsọpụrụ Chineke ndị i nwere. Ọ bụrụ na ọ dị otú ahụ ma ọ bụ ọ bụrụ na ụmụnna nọ n’ọgbakọ ya ‘agbaraghị onye ahụ ezi àmà,’ ndị mụrụ gị pụrụ inwe nchegbu n’ụzọ ziri ezi banyere gị ịlụ onye ahụ.—Ọrụ 16:2.
Gịnị Banyere Ndịrịta Iche Agbụrụ Ma Ọ Bụ Ọdịbendị?
Nne na nna Lynn jụrụ n’ihi ihe dị iche: Ọ chọrọ ịlụ nwoke sitere n’agbụrụ ọzọ. Gịnị ka Bible na-ezi n’ọnọdụ a? Ọ na-agwa anyị na “Chineke abụghị onye na-ele mmadụ anya n’ihu” nakwa na ‘o sitere n’otu onye kee mba nile n’otu n’otu nke mmadụ.’ (Ọrụ 10:34, 35; 17:26) Ụmụ mmadụ sitere n’otu ebe, ọnụ ahịa ha hakwa nhata n’anya Chineke.
Ya bụrụgodị otú ahụ, ọ bụ ezie na di na nwunye nile na-enwe “mkpagbu n’anụ ahụ ha,” di na nwunye ndị sitere n’agbụrụ dị iche iche pụrụ inwetakwu ihe ịma aka. (1 Ndị Kọrint 7:28) N’ihi gịnị? N’ihi na ọtụtụ ndị n’ime ụwa taa nke ịkpọasị jupụtara adịghị anakwere echiche Chineke banyere agbụrụ. Ọ bụ ezie na alụmdi na nwunye nke ndị sitere n’agbụrụ dị iche iche aghọwo ihe a na-ahụ n’ụfọdụ ala Ebe Ọdịda Anyanwụ n’ụzọ na-arị elu, a ka nwekwara ebe di na nwunye ndị na-esiteghị n’otu agbụrụ na-ezute ajọ mbunobi siri ike. Ya mere ndị mụrụ gị pụrụ ịtụ egwu na ị dịghị njikere ịnagide nrụgide ndị dị otú ahụ.
“Ndị mụrụ m chere na ọ ga-esiri anyị oké ike,” ka Lynn na-ekweta. N’ụzọ amamihe dị na ya, Lynn kwanyeere mmetụta ha ùgwù, gharakwa iji ọsọ gbaba n’alụmdi na nwunye. Ka ndị mụrụ ya hụrụ ntozu okè Lynn ma mata nwoke ahụ ọ hụrụ n’anya nke ọma karị, ha ji nwayọọ nwayọọ malite nnọọ inwe obi ike na ọ pụrụ ịnagide nrụgide nke alụmdi na nwunye a. Lynn na-asị: “Ozugbo ha nwere mmetụta na anyị pụrụ inwekọ obi ụtọ ọnụ n’ezie, ha sokwaara anyị nwee obi ụtọ.”
Otú ọ dị, mgbe ụfọdụ ihe na-ese okwu abụghị agbụrụ kama ọdịbendị. Ndị mụrụ gị pụrụ inwe nchegbu na, ka oge na-aga, ọ ga-esiri gị ike inweta obi ụtọ isoro onye ụzọ ndụ, atụmanya, na nri, egwú, na ntụrụndụ na-amasị ya dị nnọọ iche na nke gị biri. N’ọnọdụ ọ bụla, ịlụ onye sitere n’agbụrụ dị iche ma ọ bụ ọdịbendị dị iche pụrụ ịkpata ihe ịma aka dị ukwuu. Ị̀ dị njikere n’ezie iche ha ihu?
Mgbe Mmegide nke Ndị Mụrụ Ụmụ Yiri Ihe Ezi Uche Na-adịghị na Ya
Ma gịnị ma ọ bụrụ na i chee na ezi uche adịghị ná mmegide ndị mụrụ gị ma ọlị? Otu nwa agbọghọ aha ya bụ Faith na-ekwu banyere nne ya, sị: “A gbawo mama m alụkwaghịm ọtụtụ mgbe. O kwuru na ọ dịghị mgbe ị pụrụ ịmata onye ị lụrụ n’ezie ruo mgbe oge gabigara. O kwenyere na mụ agaghị enwe obi ụtọ n’alụmdi na nwunye.” Ọtụtụ mgbe, ndị mụrụ ụmụ nweworo alụmdi na nwunye na-agaghị nke ọma n’onwe ha adịghị enwe ike ile alụmdi na nwunye nwa ha anya n’ụzọ ziri ezi. N’ọnọdụ ụfọdụ, ndị mụrụ ụmụ na-enwe ebumnobi a na-enyo enyo maka imegide alụmdi na nwunye nwa ha, dị ka ọchịchọ ịnọgide na-achịkwa ndụ nke nwa ahụ.
Ọ bụrụ na ndị mụrụ gị achọghị ịṅa ntị ná nkọwa ezi uche dị na ya, gịnị ka ị pụrụ ime? N’etiti Ndịàmà Jehova, a pụrụ ịkpọ ndị okenye ọgbakọ maka enyemaka n’idozi nsogbu ezinụlọ. N’eleghị mmadụ anya n’ihu, ha pụrụ inyere ndị òtù ezinụlọ aka ikwurịta okwu n’ụzọ dị jụụ, dị n’udo, na nke na-arụpụta ihe.—Jemes 3:18.
Ịchọ Udo
N’ezie, ọtụtụ ihe ndị ọzọ pụrụ ịkpalite mmegide nke ndị mụrụ gị n’ọlụlụ di ma ọ bụ nwunye gị, dị ka nchegbu ego ma ọ bụ ụdị mmadụ nke onye ị na-achọ ịlụ. N’ọgbọ nke ọrịa AIDS na ọrịa ndị ọzọ a na-ebute site ná mmekọahụ, ndị mụrụ gị pụrụ inwe nchegbu ziri ezi maka ahụ ike gị ma ọ bụrụ na onye ị na-achọ ịlụ biri ndụ nke inwe mmekọahụ aghara aghara tupu ọ ghọọ onye Kraịst.b
Ọ bụrụhaala na i bi n’ụlọ ndị mụrụ gị, iwu ji gị ịnakwere ịbụisi ha n’ebe ị nọ. (Ndị Kọlọsi 3:20) Ma ọ bụrụgodị na i biiri onwe gị, toruokwa ime mkpebi nke onwe gị, adịla ngwa ileghara nchegbu ha anya. Dị njikere ịṅa ntị. (Ilu 23:22) Jiri nlezianya tụlee ihe ndị pụrụ isi n’ịlụ di ma ọ bụ nwunye pụta.—Tụlee Luk 14:28.
Mgbe i mesịrị otú ahụ, ị pụrụ ikpebizi na ị ka chọrọ ịlụ di ma ọ bụ nwunye. Dị ka o kwesịrị, ị ghaghị iburu ibu ọrụ nile n’ihi mkpebi dị otú ahụ. (Ndị Galetia 6:5) Ọ bụrụ na i mewo mgbalị nile ịtụle echiche ndị mụrụ gị, ikekwe a ga-akpali ha ịkwado mkpebi gị, ọ bụ ezie na o sighị ha n’obi. Ma ọ bụrụ na ha anọgide na-ekwupụta mmegide ha, gbalịa ka ị ghara iwe oké iwe ma ọ bụ iburu ha iwe n’obi. Cheta: Ndị mụrụ gị hụrụ gị n’anya, na-enwekwa nchegbu banyere obi ụtọ gị n’ọdịnihu. Nọgide na-agbalị isoro ha mee udo. Ka ị na-eme ka alụmdi na nwunye gị na-aga nke ọma, ikekwe àgwà ha ga-aka mma.
N’aka nke ọzọ, ọ bụrụ na ị tụlee ihe nile ndị mụrụ gị nwere ikwu n’ezie ma nyochasie onwe gị na onye i nwere oké mmasị ịlụ ike, ya ejula gị anya ma ọ bụrụ na i ruo ná nkwubi okwu ahụ na-atụ n’anya bụ́ na e kwuwerị ndị mụrụ gị pụrụ izi ezi.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a Ihe ọmụma dị n’isiokwu a bụ maka ndị ntorobịa nọ n’ala ebe ọ bụ omenala mmadụ ịhọrọ di ma ọ bụ nwunye nke ya.
b Lee isiokwu bụ́ “Inyere Ndị Bu Ọrịa AIDS Aka,” dị ná mbipụta Teta! nke June 8, 1994.
[Foto dị na peeji nke 31]
Ndị mụrụ gị pụrụ iche na ị bụ nnọọ nwata ịlụ di ma ọ bụ nwunye