Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w99 5/15 p. 15-20
  • Nọgide Na-eje Ije N’ụzọ Jehova

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Nọgide Na-eje Ije N’ụzọ Jehova
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1999
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Mkpa Maka Ntụkwasị Obi na Iguzosi Ike n’Ihe
  • Enyemaka E Nwere n’Ije Ije n’Ụzọ Chineke
  • Mkpebi
  • “Chineke Dịịrị Anyị”
  • Ị̀ Ga-eso Chineke Jee Ije?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2005
  • Isoro Chineke Na-ejegharị—Nzọụkwụ Ndị Mbụ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1998
  • Na-eje Ije N’okwukwe, Ọ Bụghị n’Ihe Anya Na-ahụ!
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2005
  • Nọgide Soro Chineke Na-ejegharị
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1998
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1999
w99 5/15 p. 15-20

Nọgide Na-eje Ije N’ụzọ Jehova

“Na-ele anya Jehova, na-edebekwa ụzọ Ya, Ọ ga-ebulikwa gị inweta ala.”—ABỤ ỌMA 37:34.

1, 2. Gịnị ka ije ije n’ụzọ Jehova gụnyere nye Eze Devid, gịnịkwa ka ọ chọrọ anyị n’aka taa?

“MEE m ka m mara ụzọ nke m ga-eje ije n’ime ya; n’ihi na Gị ka m buliworo mkpụrụ obi m nye.” (Abụ Ọma 143:8) Ndị Kraịst taa na-eji obi dum ekwughachi okwu ndị ahụ Eze Devid kwuru. Ha ji ezi obi achọ ime ihe na-atọ Jehova ụtọ na ije ije n’ụzọ ya. Gịnị ka nke a gụnyere? Nye Devid, ọ pụtara idebe iwu Chineke. Ọ gụnyere ịtụkwasị Jehova obi karịa iso ndị mba ọzọ nwee nkekọ. Ee, ọ pụtakwara iji iguzosi ike n’ihe na-ejere Jehova ozi, ọ bụghị chi dị iche iche nke ndị agbata obi ha. Nye ndị Kraịst, ije ije n’ụzọ Jehova gụnyere ihe karịrị nke ahụ.

2 Otu ihe bụ na ije ije n’ụzọ Jehova taa pụtara inwe okwukwe n’àjà mgbapụta Jisọs Kraịst, ikweta na ọ bụ “ụzọ, na eziokwu, na ndụ.” (Jọn 3:16; 14:6; Ndị Hibru 5:9) Ọ pụtakwara imezu “iwu Kraịst,” nke gụnyere igosirịta ibe anyị ịhụnanya, karịsịa ụmụnna Jisọs e tere mmanụ. (Ndị Galetia 6:2; Matiu 25:34-40) Ndị na-eje ije n’ụzọ Jehova hụrụ ụkpụrụ na iwu ya n’anya. (Abụ Ọma 119:97; Ilu 4:5, 6) Ha na-eji ihe ùgwù ha dị oké ọnụ ahịa nke ikere òkè n’ozi ndị Kraịst kpọrọ ihe. (Ndị Kọlọsi 4:17; 2 Timoti 4:5) Ha na-ekpechi ekpere anya. (Ndị Rom 12:12) Ha ‘na-elezikwa anya nke ọma n’otú ha si na-ejegharị, ọ dịghị ka ndị na-amaghị ihe, kama dị ka ndị maara ihe.’ (Ndị Efesọs 5:15) N’ezie ha adịghị achụ akụ̀ ime mmụọ n’àjà iji nweta uru ihe onwunwe ndị na-adịru nwa oge ma ọ bụ ihe ụtọ rụrụ arụ nke anụ ahụ. (Matiu 6:19, 20; 1 Jọn 2:15-17) Ọzọkwa, iguzosi ike n’ihe nye Jehova na ịtụkwasị ya obi dị mkpa. (2 Ndị Kọrint 1:9; 10:5; Ndị Efesọs 4:24) N’ihi gịnị? N’ihi na ọnọdụ anyị yiri nnọọ nke Israel oge ochie.

Mkpa Maka Ntụkwasị Obi na Iguzosi Ike n’Ihe

3. N’ihi gịnị ka iguzosi ike n’ihe, okwukwe, na ntụkwasị obi ga-eji nye aka ime ka anyị nọgide n’ụzọ Jehova?

3 Israel bụ mba dị nta nke ndị agbata obi na-enweghị omume enyi bụ́ ndị tinyere aka n’ememe rụrụ arụ n’ife chi arụsị dị iche iche ofufe gbara gburugburu. (1 Ihe E Mere 16:26) Nanị Israel jeere otu ezi Chineke ahụ, a na-adịghịkwa ahụ anya, bụ́ Jehova, ozi, ọ chọkwara ka ha nọgide na-enwe ụkpụrụ omume ndị dị elu. (Deuterọnọmi 6:4) N’otu aka ahụ taa, nanị nde mmadụ ole na ole na-efe Jehova, ha bikwa n’ụwa nke ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ijeri mmadụ isii mejupụtara bụ́ ndị ụkpụrụ na echiche okpukpe ha dị nnọọ iche ná nke ha. Ọ bụrụ na anyị so n’ime nde ole na ole ahụ, anyị aghaghị ịnọrọ na nche megide ịbụ ndị e metụtara n’ụzọ na-ezighị ezi. N’ụzọ dị aṅaa? Iguzosi ike n’ihe nye Jehova Chineke, inwe okwukwe n’ebe ọ nọ, na ntụkwasị obi siri ike na ọ ga-emezu nkwa ya nile ga-enye aka. (Ndị Hibru 11:6) Nke a ga-egbochi anyị ịtụkwasị obi n’ihe ndị ụwa nwere olileanya na ha.—Ilu 20:22; 1 Timoti 6:17.

4. N’ihi gịnị ka ndị mba ọzọ ji “gbaa ọchịchịrị n’echiche uche ha”?

4 Pọl onyeozi gosiri otú ndị Kraịst na-aghaghị isi dị iche site n’ụwa, mgbe o dere, sị: “Ya mere nke a ka m na-ekwu, kwusiekwa ike n’ime Onyenwe anyị, ka unu ghara ijegharị ọzọ dị ka ndị mba ọzọ na-ejegharịkwa, n’ihe efu nke uche ha, n’ihi na e mewo ka ha gbaa ọchịchịrị n’echiche uche ha, e meekwa ka ha bụrụ ndị ala ọzọ n’ebe ndụ nke Chineke dị n’ihi amaghị ihe dị n’ime ha, n’ihi na a na-eme ka obi ha mee etili.” (Ndị Efesọs 4:17, 18) Jisọs bụ “ezi Ìhè ahụ.” (Jọn 1:9) Onye ọ bụla nke jụrụ ya ma ọ bụ onye na-azọrọ na o kwere na ya ma ghara irubere “iwu Kraịst” isi gbara ‘ọchịchịrị n’echiche uche ya.’ N’ịbụ ndị na-ejetụghị ije n’ụzọ Jehova, e mewo “ka ha bụrụ ndị ala ọzọ n’ebe ndụ nke Chineke dị.” Otú ọ bụla ha pụrụ iche na ha maruru ihe n’ụzọ ụwa, “amaghị ihe dị n’ime ha” n’ihe banyere nanị ihe ọmụma na-eduba ná ndụ, bụ́ nke Jehova Chineke na Jisọs Kraịst.—Jọn 17:3; 1 Ndị Kọrint 3:19.

5. Ọ bụ ezie na ìhè nke eziokwu na-enwu n’ụwa, gịnị mere ọtụtụ obi ji bụrụ ndị na-adịghị anụ ihe?

5 Ma, ìhè nke eziokwu na-enwu n’ụwa! (Abụ Ọma 43:3; Ndị Filipaị 2:15) “Amamihe na-eti mkpu n’èzí.” (Ilu 1:20) N’afọ gara aga Ndịàmà Jehova ji ihe karịrị otu ijeri awa na-agwa ndị agbata obi ha banyere Jehova Chineke na Jisọs Kraịst. Ọtụtụ narị puku mmadụ zaghachiri. Ma, ò kwesịrị iju anyị anya na ọtụtụ ndị ọzọ azaghachighị? Ee e. Pọl kwuru banyere ‘obi ha ime etili.’ Ụfọdụ nwere obi na-adịghị anụ ihe n’ihi ịchọ ọdịmma onwe onye nanị ma ọ bụ ịhụ ego n’anya. Ndị ọzọ bụ ndị okpukpe ụgha ma ọ bụ echiche nke enweghị mmasị n’okpukpe bụ́ nke juru ebe nile taa nwere mmetụta n’ebe ha nọ. Ahụmahụ ndị tara akpụ ná ndụ edugawo ọtụtụ ndị ịgbakụta Chineke azụ. Ndị ọzọ na-ajụ idebe ụkpụrụ omume ndị dị elu nke Jehova. (Jọn 3:20) Obi nke onye na-eje ije n’ụzọ Jehova ọ̀ pụrụ ịghọ nke mere etili n’ihe ndị dị otú ahụ?

6, 7. Ọ bụ ezie na ha bụ ndị na-efe Jehova Chineke ofufe, n’oge ndị dị aṅaa ka ụmụ Israel dapụrụ, n’ihi gịnịkwa?

6 Nke a mere Israel oge ochie, dị ka Pọl gosiri. O dere, sị: “Ihe ndị a ghọrọ ihe atụ nye anyị, ka anyị wee ghara ịbụ ndị agụụ ihe ọjọọ na-agụ, dị ka agụụ ihe ọjọọ gụkwara ndị ahụ. Unu aghọkwala ndị na-ekpere arụsị, dị ka ụfọdụ n’etiti ha ghọrọ; dị ka e deworo ya n’akwụkwọ nsọ, sị, Ndị Israel nọdụrụ ala iri ihe na ịṅụ ihe, ha wee bilie igwu egwú. Ka anyị gharakwa ịkwa iko, dị ka ụfọdụ n’etiti ha kwara, wee daa nwụọ n’otu ụbọchị, [puku mmadụ iri abụọ na atọ].”—1 Ndị Kọrint 10:6-8.

7 Pọl bu ụzọ zoo aka n’oge Israel fere nwa ehi ọlaedo ofufe n’ala ala Ugwu Saịnaị. (Ọpụpụ 32:5, 6) Nke a bụ nnupụisi kpọmkwem megide otu iwu Chineke nke ha kwetaworo na ha ga-erubere isi nanị izu ole na ole tupu mgbe ahụ. (Ọpụpụ 20:4-6; 24:3) Pọl zoziri aka n’oge Israel sooro ndị inyom Moab kpọọ isiala nye Beal. (Ọnụ Ọgụgụ 25:1-9) E ji omume imeju ọchịchọ onwe onye n’ụzọ gabigara ókè, “igwu egwú,”a mara ofufe nwa ehi. Ofufe Beal na ajọ mmekọahụ rụrụ arụ na-agakọ. (Mkpughe 2:14) Gịnị mere ụmụ Israel ji mee mmehie ndị a? N’ihi na ha kwere ka ‘agụụ ihe ọjọọ gụọ’ obi ha—ma ọ̀ bụ ikpere arụsị ahụ ma ọ bụ omume rụrụ arụ ndị ya na ha so.

8. Gịnị ka anyị pụrụ ịmụta site n’ahụmahụ Israel?

8 Pọl gosiri na anyị kwesịrị ịmụta ihe site n’ihe omume ndị a. Mụta gịnị? Onye Kraịst agaghịdị eche echiche ịkpọ isiala nye nwa ehi ọlaedo ma ọ bụ chi ndị Moab oge ochie. Ma gịnị banyere omume rụrụ arụ ma ọ bụ imeju ọchịchọ onwe onye a na-achịkwaghị achịkwa? Ndị a juru ebe nile taa, ọ bụrụkwa na anyị ekwe ka obi anyị nwee ọchịchọ maka ha, ha ga-ekewapụ anyị n’ebe Jehova nọ. Ihe ọ ga-arụpụta ga-abụ otu ihe ahụ anyị ikpere arụsị gaara arụpụta—nkewapụ pụọ n’ebe Chineke nọ. (Tụlee Ndị Kọlọsi 3:5; Ndị Filipaị 3:19.) N’ezie, Pọl mechiri ntụle ọ na-atụle ihe omume ndị ahụ site n’ịgba ndị kwere ekwe ibe ya ume, sị: “Gbanarịnụ ikpere arụsị.”—1 Ndị Kọrint 10:14.

Enyemaka E Nwere n’Ije Ije n’Ụzọ Chineke

9. (a) Enyemaka dị aṅaa ka anyị na-enweta iji mee ka anyị wee nọgide na-eje ije n’ụzọ Jehova? (b) Olee otu ụzọ anyị si anụ ‘okwu n’azụ anyị’?

9 Ọ bụrụ na anyị kpebisiri ike ịnọgide na-eje ije n’ụzọ Jehova, anyị anọghị n’enweghị enyemaka. Aịsaịa buru n’amụma, sị: “Ntị gị abụọ ga-anụkwa okwu n’azụ gị, sị, Nke a bụ ụzọ, jeenụ ije n’ime ya; mgbe unu na-eche ihu n’aka nri, na mgbe unu na-eche ihu n’aka ekpe.” (Aịsaịa 30:21) Olee otú ‘ntị anyị abụọ’ si anụ ‘okwu ahụ n’azụ anyị’? Ọ dịghị onye ọ bụla taa na-anụ olu okwu nkịtị nke Chineke ma ọ bụ na-anata ozi site n’aka ya kpọmkwem. “Okwu” ahụ a na-anụ na-esi n’otu ụzọ abịara anyị nile. Nke mbụ, ọ na-abịa site n’Akwụkwọ Nsọ e dere n’ike mmụọ nsọ, bụ́ Bible, nke bu echiche Chineke na ihe ndekọ banyere mmekọrịta ya na ụmụ mmadụ. Ebe ọ bụ na anyị na-enweta mkpọsa ihe ọmụma ndị sitere n’aka ndị ‘e mere ka ha bụrụ ndị ala ọzọ n’ebe ndụ nke Chineke dị,’ iji nwee ezi ahụ ike ime mmụọ, ọ dị anyị mkpa ịgụ Bible na ịtụgharị uche na ya mgbe nile. Nke a ga-enyere anyị aka izere ‘ihe efu’ nakwa ịbụ ndị ‘zuru okè, ndị e meworo ka ha zuo okè ịrụ ezi ọrụ nile ọ bụla.’ (Ọrụ 14:14, 15; 2 Timoti 3:16, 17) Ọ ga-eme ka anyị sikwuo ike, wusie anyị ike, nyekwara anyị aka ‘ime ka ije anyị gaa nke ọma.’ (Joshua 1:7, 8) N’ihi ya, Okwu Jehova na-agba ume, sị: “Ugbu a, ụmụ m, geenụ m ntị: n’ihi na ndị ihe na-agara nke ọma ka ndị na-edebe ụzọ m nile bụ. Nụrụnụ ịdọ aka ná ntị, wee mara ihe, unu ezekwala ya ndụ.”—Ilu 8:32, 33.

10. Olee ụzọ nke abụọ anyị si anụ ‘okwu n’azụ anyị’?

10 ‘Okwu anyị na-anụ n’azụ anyị’ na-abịakwa site n’aka “ohu ahụ kwesịrị ka a tụkwasị ya obi, nke nwekwara uche,” bụ́ onye na-enye ‘nri n’oge ya.’ (Matiu 24:45-47) Otu ụzọ e si enye nri a bụ site n’akwụkwọ e biri ebi ndị dabeere na Bible, n’afọ ndị na-adịbeghịkwa anya, nri a abawo ụba. Dị ka ihe atụ, site na magazin Ụlọ Nche, e mewo ka nghọta anyị nwere banyere amụma ka mma. Na magazin a, a gbawo anyị ume ịnọgidesi ike n’ọrụ nkwusa na ime ndị na-eso ụzọ n’agbanyeghị enweghị mmasị na-arịwanye elu, e nyeworo anyị aka izere ọnyà dị iche iche, a gbawokwa anyị ume ịzụlite ezi àgwà ndị Kraịst. Lee ka anyị si eji nri dị otú ahụ e nyere n’oge ya akpọrọ ihe!

11. Kọwaa ụzọ nke atọ anyị pụrụ isi nụ ‘okwu n’azụ anyị.’

11 Ohu ahụ kwesịrị ka a tụkwasị ya obi, nke nwekwara uche na-enyekwa nri site ná nzukọ ndị anyị na-enwe mgbe mgbe. Ndị a gụnyere nzukọ ọgbakọ, mgbakọ sekit ndị a na-enwe ugbo abụọ n’afọ, na mgbakọ ndị ka ukwuu a na-enwe otu ugbo n’afọ. Olee ezi onye Kraịst nke na-adịghị eji mgbakọta ndị dị otú ahụ akpọrọ ihe? Ha bụ ihe inyeaka dị mkpa iji kwado anyị n’ije ije n’ụzọ Jehova. Ebe ọ bụ na ọtụtụ ndị aghaghị itinye oge dị ukwuu n’ọrụ ma ọ bụ n’ụlọ akwụkwọ n’etiti ndị na-ekweghị n’ihe ha kweere, mkpakọrịta ndị Kraịst na-enwe mgbe dum na-azọpụta ndụ n’ụzọ nkịtị. Nzukọ na-enye anyị ohere dị mma ‘ịkpasu ịhụnanya na ọrụ ọma dị iche iche n’ahụ ibe anyị.’ (Ndị Hibru 10:24) Anyị hụrụ ụmụnna anyị n’anya, ọ na-amasịkwa anyị iso ha na-akpakọrịta.—Abụ Ọma 133:1.

12. Mkpebisi ike dị aṅaa ka Ndịàmà Jehova nwere, oleekwa otú ha si kwupụta ya na nso nso a?

12 N’ịbụ ndị nri ime mmụọ dị otú ahụ mere ka ha sie ike, ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ nde mmadụ isii na-eje ije n’ụzọ Jehova taa, ọtụtụ nde ndị ọzọ na-amụkwa Bible iji mụta otú ha ga-esi mee otú ahụ. Hà na-enwe nkụda mmụọ ma ọ bụ nkụda aka n’ihi na ha dị ole na ole n’ọnụ ọgụgụ ma e were ha tụnyere ọtụtụ ijeri mmadụ ndị bi n’ụwa? Ọ dịghị ma ọlị! Ha kpebisiri ike ịnọgide na-ege ntị ‘n’okwu ahụ ha na-anụ n’azụ ha,’ jiri iguzosi ike n’ihe na-eme uche Jehova. Dị ka ngosipụta ihu ọha nke mkpebi a, ná Mgbakọ Distrikti na nke Mba Nile “Ụzọ Ndụ nke Chineke” nke 1998/99, ndị bịaranụ nakweere otu mkpebi nke na-egosi nguzo si ha n’obi. Ihe na-esonụ bụ ndepụta nke mkpebi ahụ.

Mkpebi

13, 14. Echiche dị aṅaa ezi uche dị na ya ka Ndịàmà Jehova nwere banyere ọnọdụ ụwa?

13 “Anyị, dị ka Ndịàmà Jehova gbakọtara ná Mgbakọ ‘Ụzọ Ndụ nke Chineke,’ ji obi anyị dum kweta na ụzọ Chineke bụ ụzọ ndụ kasị mma. Otú ọ dị, anyị ghọtara na ihe ka n’ọnụ ọgụgụ nke ihe a kpọrọ mmadụ taa echeghị otú a. Ọha mmadụ anwalewo ọtụtụ nchepụta, nkà ihe ọmụma, na echiche okpukpe banyere ihe ndị mejupụtara ụzọ ndụ kasị mma. Iji ezi obi leruo anya n’akụkọ ihe mere eme nke mmadụ na ọnọdụ ụwa taa na-akwado ịbụ eziokwu nke okwu Chineke e dekọrọ na Jeremaịa 10:23: ‘Ọ bụghị onye ọ bụla nke na-eje ije nwe ime ka nzọụkwụ ya guzosie ike.’

14 “Kwa ụbọchị anyị na-ahụkwu ihe àmà na-akwado ịbụ eziokwu nke okwu ndị ahụ. N’akụkụ ka ukwuu, ọha mmadụ na-eleghara ụzọ ndụ nke Chineke anya. Ndị mmadụ na-achụso ihe yiri ihe ziri ezi n’anya ha. Ihe ndị ọ na-arụpụta anọwo na-abụ ọdachi—ndakpọ nke ndụ ezinụlọ, nke na-ahapụ ụmụaka n’enweghị nduzi; oké nchụso nke ihe onwunwe, nke na-ejedebe n’ịtọgbọrọ chakoo na obi nkoropụ; ime mpụ na ime ihe ike na-enweghị isi, nke na-ata isi imerime ndị mmadụ; esemokwu na agha agbụrụ, nke na-ebibi ndụ ndị mmadụ n’ụzọ dị njọ; omume rụrụ arụ nke juru ebe nile, nke na-akwalite ntiwapụ nke ọrịa ndị a na-ebute site ná mmekọahụ. Ndị a bụ nanị ole na ole n’ime ọtụtụ nsogbu ndị na-agbagwoju anya ndị na-egbochi nchụso obi ụtọ, udo, na ịnọ ná ntụkwasị obi.

15, 16. Banyere ụzọ ndụ nke Chineke, mkpebisi ike dị aṅaa ka e kwupụtara ná mkpebi ahụ?

15 “N’ihi ọnọdụ dị mwute nke ihe a kpọrọ mmadụ na ịdị nso nke ‘agha nke oké ụbọchị ahụ nke Chineke, Onye pụrụ ime ihe nile,’ a kpọrọ Amagedọn (Mkpughe 16:14, 16), anyị dị ka Ndịàmà Jehova na-ekpebi na:

16 “Nke Mbụ: Anyị na-ele onwe anyị anya dị ka ndị dịịrị Jehova Chineke, ebe anyị rarawooro onwe anyị n’otu n’otu nye ya kpam kpam, anyị ga-anọgidekwa na-enwe okwukwe siri ike ná ndokwa Jehova nke ihe mgbapụta ahụ site n’aka Ọkpara ya, bụ́ Jisọs Kraịst. Anyị kpebisiri ike ije ije n’ụzọ ndụ nke Chineke, na-eje ozi dị ka Ndịàmà ya, na-edokwa onwe anyị n’okpuru ọbụbụeze ya dị ka ọ na-apụta ìhè site n’ịchịisi nke Jisọs Kraịst.

17, 18. Nguzo dị aṅaa ka Ndịàmà Jehova ga-anọgide na-enwe banyere ụkpụrụ omume na òtù ụmụnna ndị Kraịst?

17 “Nke Abụọ: Anyị ga-anọgide na-arapara n’ụkpụrụ omume na nke ime mmụọ ndị dị elu nke Bible. Anyị ekpebisiwo ike izere ijegharị dị ka mba dị iche iche na-ejegharị n’ihe efu nke uche ha. (Ndị Efesọs 4:17-19) Ọ bụ mkpebi anyị ịnọgide na-adị ọcha n’ihu Jehova, n’enweghịkwa ntụpọ site n’ụwa a.—Jemes 1:27.

18 “Nke Atọ: Anyị ga-ejigidesi ọnọdụ anyị dabeere n’Akwụkwọ Nsọ dị ka òtù ụmụnna ndị Kraịst zuru ụwa ọnụ ike. Anyị ga-ejigide nnọpụiche ndị Kraịst n’etiti mba nile, ịghara ikwe ka a rabanye anyị n’ịkpọasị ma ọ bụ ná nkewa nke mba, ma ọ bụ agbụrụ.

19, 20. (a) Gịnị ka ndị Kraịst mụrụ ụmụ ga-eme? (b) Olee otú ezi ndị Kraịst nile ga-esi na-eme ka a mata ha dị ka ndị na-eso ụzọ Kraịst?

19 “Nke Anọ: Anyị bụ́ ndị mụrụ ụmụ ga-akụnye ụzọ Chineke n’ime ụmụ anyị. Anyị ga-esetịpụ ihe nlereanya n’ibi obi ndị Kraịst, bụ́ nke na-agụnye ịgụ Bible mgbe nile, inwe ọmụmụ ihe ezinụlọ, na iji obi dum na-ekere òkè n’ọgbakọ ndị Kraịst na n’ozi ubi.

20 “Nke Ise: Anyị nile ga-agbalị ịzụlite àgwà Chineke nke Onye Okike anyị setịpụrụ ihe nlereanya ya, anyị ga-agbalịsikwa ike iṅomi àgwà na ụzọ ya, dị ka Jisọs mere. (Ndị Efesọs 5:1) Anyị ekpebiela ikwe ka ihe omume anyị nile bụrụ n’ịhụnanya, si otú a na-eme ka a mata anyị dị ka ndị na-eso ụzọ Kraịst.—Jọn 13:35.

21-23. Gịnị ka Ndịàmà Jehova ga-anọgide na-eme, na gịnịkwa ka ha kwenyesiri ike?

21 “Nke Isii: Anyị ga-anọgide na-ekwusa ozi ọma nke Alaeze Chineke n’esepụghị aka, na-eme ndị na-eso ụzọ, anyị ga-ezikwa ha ihe n’ụzọ ndụ nke Chineke ma gbaa ha ume ka ha natakwuo ọzụzụ ná nzukọ ọgbakọ.—Matiu 24:14; 28:19, 20; Ndị Hibru 10:24, 25.

22 “Nke Asaa: Dị ka ndị mmadụ n’otu n’otu na dị ka nzukọ okpukpe, anyị ga-anọgide na-edebe uche Chineke n’ọnọdụ mbụ ná ndụ anyị. N’iji Okwu ya, bụ́ Bible, eme ihe dị ka ihe nduzi anyị, anyị agaghị echigharị gaa n’aka nri ma ọ bụ n’aka ekpe, si otú a na-akwado na ụzọ ndụ nke Chineke dị mma nke ukwuu karịa ụzọ nke ụwa. Anyị kpebisiri ike ịgbaso ụzọ ndụ nke Chineke—n’ụzọ siri ike na n’ụzọ iguzosi ike n’ihe, ugbu a na ruo mgbe ebighị ebi!

23 “Anyị na-eme mkpebi a n’ihi na anyị nwere obi ike zuru ezu ná nkwa ịhụnanya Jehova nke bụ́ na onye na-eme uche Chineke na-anọru ebighị ebi. Anyị na-eme mkpebi a n’ihi na anyị kwenyesiri ike na ibi ndụ n’ụzọ kwekọrọ n’ụkpụrụ, ndụmọdụ, na ịdọ aka ná ntị Akwụkwọ Nsọ na-eme ka e bie ndụ kasị mma taa ma na-atọ ezi ntọala maka ọdịnihu, ka anyị wee nwee ike ijide ndụ ahụ nke bụ ndụ n’ezie. (1 Timoti 6:19; 2 Timoti 4:7b, 8) Karịsịa, anyị na-eme mkpebi a n’ihi na anyị ji obi, mkpụrụ obi, uche, na ume anyị dum hụ Jehova Chineke n’anya!

24, 25. Gịnị bụ nzaghachi nye mkpebi ahụ e mere, gịnịkwa bụ mkpebisi ike nke ndị na-eje ije n’ụzọ Jehova?

24 “Mmadụ dum nọ n’ebe a ná mgbakọ a bụ́ ndị nabatara nnakwere nke a nakweere mkpebi a, biko sịnụ EE!”

25 Ọtụtụ narị ọgbọ egwuregwu na ámá egwuregwu gburugburu ụwa mere mkpọtụ ka ndị nile bịaranụ zara “EE!” dara oké ụda. Ndịàmà Jehova enweghị obi abụọ ọ bụla na ha ga-anọgide na-eje ije n’ụzọ Jehova. Ha nwere ntụkwasị obi zuru ezu n’ebe Jehova nọ, nweekwa okwukwe na ọ ga-emezu nkwa ya nile. Ha na-eguzosi ike n’ihe nye ya, n’agbanyeghị ihe ọ bụla na-eme. Ha kpebisikwara ike ime uche ya.

“Chineke Dịịrị Anyị”

26. Gịnị bụ ọnọdụ na-enye obi ụtọ nke ndị na-eje ije n’ụzọ Jehova?

26 Ndịàmà Jehova na-echeta agbamume ọbụ abụ ahụ: “Na-ele anya Jehova, na-edebekwa ụzọ Ya, Ọ ga-ebulikwa gị inweta ala.” (Abụ Ọma 37:34) Ha adịghị echefu okwu agbamume Pọl: “Ọ bụrụ na Chineke dịịrị anyị, ònye na-emegide anyị? Onye ahụ Nke na-azọdoghị Ọkpara nke aka Ya, kama Ọ raara Ya nye n’ihi anyị nile, Ọ̀ ga-esi aṅaa ghara inyekwa anyị ihe nile n’amara ebe O weresịịrị Onye ahụ nye anyị?” (Ndị Rom 8:31, 32) Ee, ọ bụrụ na anyị anọgide na-eje ije n’ụzọ Jehova, ọ ga-enye anyị “ihe nile ka ha bụrụ ihe ga-atọ anyị ụtọ.” (1 Timoti 6:17) Olee ebe pụrụ ịdị mma karịa ebe anyị nọ—ije ije n’ụzọ Jehova, anyị na ụmụnna anyị ndị nwoke na ndị nwanyị. Ebe Jehova nọnyeere anyị, ka anyị kpebisie ike ịnọgide n’ebe ahụ nakwa ịtachi obi ruo ọgwụgwụ, na-enwe obi ike zuru ezu na n’oge ọ kara aka, anyị ga-ahụ ka o mezuru nkwa ya nile ruo na nke ikpeazụ.—Taịtọs 1:2.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

a N’izo aka n’okwu Grik a sụgharịrị n’ebe a ịbụ “igwu egwú,” otu onye ọkọwa okwu na-ekwu na ọ na-ezo aka n’egwú ndị a gbara n’ememe ndị na-ekpere arụsị, ọ na-agbakwụnyekwa, sị: “A haziri ọtụtụ n’ime egwú ndị a, dị ka a maara nke ọma, iji kpalie mmetụta ndị kasị rụọ arụ.”

Ị̀ Na-echeta?

◻ Gịnị ka a chọrọ n’aka onye Kraịst iji jee ije n’ụzọ Jehova?

◻ N’ihi gịnị ka o ji dị anyị mkpa ịtụkwasị Jehova obi na iguzosi ike n’ihe nye ya?

◻ Enyemaka dị aṅaa ka anyị na-enweta ka anyị na-eje ije n’ụzọ Jehova?

◻ Kwuo isi ihe ụfọdụ dị ná mkpebi ahụ a nakweere ná Mgbakọ “Ụzọ Ndụ nke Chineke.”

[Foto ndị dị na peeji nke 18]

A nakweere otu mkpebi dị mkpa ná Mgbakọ Distrikti na Mgbakọ Mba Nile “Ụzọ Ndụ nke Chineke”

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya