Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • lmd ihe ọmụmụ 8
  • Na-enwe Ndidi

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Na-enwe Ndidi
  • Hụ Ndị Mmadụ n’Anya, Mee Ka Ha Bụrụ Ndị Na-eso Ụzọ Jizọs
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ihe Jizọs Mere
  • Gịnị Ka Anyị Na-amụta n’Aka Jizọs?
  • Na-eme Ka Jizọs
  • Na-enwe Ndidi
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2023
  • Otú Anyị Ga-esi Na-emekwu Nke Ọma n’Ozi Ọma—Jiri Vidio Na-akụzi Ihe
    Usoro Ihe Omume—Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ (2016)
  • Rite Uru n’Àjà Jizọs Ji Ndụ Ya Chụọ
    Isiokwu Ndị Ọzọ
  • Kwuo Ihe Ga-amasị Ndị Ọzọ
    Hụ Ndị Mmadụ n’Anya, Mee Ka Ha Bụrụ Ndị Na-eso Ụzọ Jizọs
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Hụ Ndị Mmadụ n’Anya, Mee Ka Ha Bụrụ Ndị Na-eso Ụzọ Jizọs
lmd ihe ọmụmụ 8

N’OGE ỌZỌ

Ebe Jizọs bịakwutere nwanne ya Jems n’ebe ọ na-akwa nkà. O juru Jems anya ịhụ Jizọs.

Jọn 7:3-5; 1 Kọr. 15:3, 4, 7

IHE ỌMỤMỤ NKE 8

Na-enwe Ndidi

Amaokwu Baịbụl ga-enyere gị aka: “Ịhụnanya na-enwe ndidi.”​—1 Kọr. 13:4.

Ihe Jizọs Mere

Ebe Jizọs bịakwutere nwanne ya Jems n’ebe ọ na-akwa nkà. O juru Jems anya ịhụ Jizọs.

VIDIO: Jizọs Nweere Nwanne Ya Ndidi ma Nyere Ya Aka

1. Lee VIDIO, ma ọ bụ gị agụọ Jọn 7:3-5 na 1 Ndị Kọrịnt 15:3, 4, 7. Zazie ajụjụ ndị a:

  1. Olee ihe ụmụnne Jizọs mere mgbe mbụ o ziri ha ozi ọma?

  2. Olee ihe gosiri na ike agwụghị Jizọs inyere nwanne ya Jems aka?

Gịnị Ka Anyị Na-amụta n’Aka Jizọs?

2. Anyị kwesịrị ịna-enwe ndidi n’ihi na ọ na-ewe ụfọdụ ndị oge ịnabata ozi ọma karịa ndị ọzọ.

Na-eme Ka Jizọs

3. Si n’ụzọ ọzọ gwa ya maka ọmụmụ Baịbụl. Ọ bụrụ na mmadụ ekwetaghị ozugbo ka ị mụwara ya Baịbụl, amanyekwala ya. Mgbe ọ bụla dabara adaba, jiri vidio ma ọ bụ isiokwu ndị ọzọ nyere ya aka ịghọta otú anyị na ndị mmadụ si amụ Baịbụl nakwa uru ọ ga-abara ya.

4. Ejikwala ya atụnyere ndị ọzọ. Onye nke ọ bụla dị iche. O siere onye ezinụlọ gị ma ọ bụ onye ị na-agara nletaghachi ike ikweta ka ị mụwara ya Baịbụl ma ọ bụkwanụ ikweta otu ihe Baịbụl na-akụzi, chọpụta ihe nwere ike ịkpata ya. È nwere ihe ndị chọọchị ha na-akụzi ọ na-anaghị eji egwu egwu? Ndị ezinụlọ ya na ndị agbata obi ya, hà na-enye ya nsogbu? Nye ya oge ka o chebara ihe ndị i kwuru echiche nakwa ka ọ hụ otú ihe Baịbụl kwuru si baa uru.

5. Kpee ekpere maka onye ahụ nwere mmasị. Rịọ Jehova ka o nyere gị aka ka ị ghara ịda mbà nakwa ka ị dịrị akọ. Rịọkwa ya ka o nyere gị aka ịchọpụta mgbe i kwesịrị ịkwụsị ịkpọtụrụ onye na-enweghị mmasị.​—1 Kọr. 9:26.

I NWEKWARA IKE ỊGỤ

Mak 4:26-28; 1 Kọr. 3:5-9; 2 Pita 3:9

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya