Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w93 3/1 p. 20-23
  • Chineke Na-eme Ka Ọ Na-eto—Ị̀ Na-eme Òkè nke Gị?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Chineke Na-eme Ka Ọ Na-eto—Ị̀ Na-eme Òkè nke Gị?
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1993
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Chineke Na-eme Ka Ọ Na-eto
  • “Onye Na-akụ Abụghị Ihe Ọ Bụla”
  • Ndị Ha na Chineke Na-arụkọ Ọrụ
  • Na-eme Òkè Gị
  • “Ewepụkwala Aka Gị”
  • Apọlọs—Onye Ọkà Okwu Na-ekwusa Eziokwu Ndị Kraịst
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1996
  • Inyere Ndị Mmadụ Aka Ịbịaru Jehova Nso
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1999
  • Ọ Bụ “Chineke Na-eme Ka O Too”!
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2008
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1993
w93 3/1 p. 20-23

Chineke Na-eme Ka Ọ Na-eto—Ị̀ Na-eme Òkè nke Gị?

CHEEDỊ echiche banyere ọnọdụ ahụ. Ị nọ n’ogige mara mma, nke jupụtara n’úkwù osisi ndị toro ogologo, ihe ọkụkụ ndị mara mma, na ọtụtụ okooko osisi tụrụ àgwà mara mma. Ubi ahịhịa ndị na-acha akwụkwọ ndụ akwụkwọ ndụ gbadara n’akụkụ mmiri iyi nke e doziri nke ọma, bụ́ nke na-agbapụta mmiri doro edo. Ọ dịghị ihe mebiri ogige ahụ. N’ịbụ onye a kpaliri, ị jụrụ banyere onye mere ọmarịcha ebe a. Ná nzaghachi, onye na-akụ ubi ahụ ji umeala kwuo na Chineke na-eme ka ihe nile na-eto.

Dị ka a pụrụ ịtụ anya ya, ị maara nke ahụ. I chetakwara okwu onye ahụ na-akụ ubi mgbe ị laruru ụlọ wee hụ azụ ụlọ gị nke dị nkịkara, bụ́ ebe ọ na-adịghị ihe ọ bụla dị mma n’anya na-eto, ihe mkpofu na-amụba, mmiri ozuzo na-adọjukwa n’oghere ndị na-adịghị mma ile anya e nwere n’ala. Ọ gụsiri gị agụụ ike inwe ubi yiri nke ahụ ị ka letasịrị. Ya mere, n’ikwenyesi ike n’okwu onye ahụ na-akụ ubi, i gburu ikpere n’ala wee jiri ịnụ ọkụ n’obi kpegara Chineke ekpere ka o mee ka okooko osisi ndị mara mma too na gburugburu ụlọ gị. Gịnị mere? N’ezie, ọ dịghị.

Gịnị banyere uto ime mmụọ? Ọ pụrụ ịgụsi gị ike ịhụ ka ihe na-eto n’ụzọ ime mmụọ, n’ihe ndị dị ka ndị ọhụrụ na-eso ụzọ ịzaghachi n’eziokwu nke Okwu Chineke ma ọ bụ n’ọganihu ime mmụọ nke onwe gị. Ị pụkwara iji ịnụ ọkụ n’obi kpegara Jehova ekpere ka o mee ka e nwee uto dị otú ahụ, na-enwe nkwenye siri ike na o nwere ike ime otú ahụ. Ma ihe na-agụsi gị ike, ekpere ịnụ ọkụ n’obi, na inwe obi ike gị n’ike Chineke hà ga-eme ka e nwee uto ahụ n’onwe ha?

Chineke Na-eme Ka Ọ Na-eto

Ma eleghị anya ị na-eche na òkè ị na-ekere n’ịkpata uto ime mmụọ dị ntakịrị, ọbụna nke na-enweghị ebe o ruru. Ọ̀ bụ na Pọl onyeozi atụghị aro nke a ná 1 Ndị Kọrint 3:​5-⁠7? O dere, sị: “Gịnịkwa bụ Apọlọs? Gịnị bụkwa Pọl? Ndị na-eje ozi, ndị unu si n’aka ha kwere; dị ka Onyenwe anyị nyekwara ha abụọ n’otu n’otu. Mụ onwe m kuru osisi, Apọlọs kwọsara ya mmiri; ma ọ bụ Chineke na-eme ka ọ ­na⁠-aba ụba. Ya mere onye na-akụ abụghị ­ihe ọ bụla, onye na-akwọsa mmiri abụghịkwa ihe ọ bụla; kama Chineke, onye na-eme ka ọ na-aba ụba, bụ ihe nile.”

N’ụzọ ziri ezi Pọl kwetara na mgbe ihe toro, otuto nile na-agara Chineke. Onye na-akụ ubi pụrụ idozi ala ya, kụọ mkpụrụ ya, ma jiri nlezianya na-elekọta ihe ọkụkụ ahụ, ­ma n’ikpeazụ ọ bụ n’ihi ike okike ihe dị ebube nke Chineke ka ihe ji eto. (Jenesis 1:​11, 12, 29) Otú ọ dị, gịnị ka Pọl bu n’uche mgbe ọ sịrị “onye na-akụ abụghị ihe ọ bụla, onye na-akwọsa mmiri abụghịkwa ihe ọ bụla”? (“Ọ bụghị ndị ọrụ ubi ahụ ọrụ ha bụ ịkụ akụ na ịgba mmiri bụ ndị dị mkpa,” The New English Bible.) Ọ̀ na-elelị ịdị mkpa nke òkè onye ozi ọ bụla na-ekere n’ime ndị na-eso ụzọ ọhụrụ, na-atụ aro na n’ikpeazụ, ọ dịghị oké ihe ọ bụla o mere n’ụzọ anyị si eje ozi anyị?

“Onye Na-akụ Abụghị Ihe Ọ Bụla”

Buru n’uche na n’akụkụ nke a nke akwụkwọ ozi ya, Pọl adịghị atụle ije ozi ndị Kraịst kama ihe nzuzu dị n’ịgbaso ụmụ mmadụ kama ịgbaso Jisọs Kraịst. Ụfọdụ ndị nọ na Kọrint na-enye ndị ohu Jehova a ma ama, dị ka Pọl na Apọlọs, otuto na-ekwesịghị ekwesị. Ndị ọzọ na-akwalite ịrọ òtù ma na-ebuli mmadụ ndị chere na ha ka ụmụnna ha ndị Kraịst.​—⁠1 Ndị Kọrint 4:6-⁠8; 2 Ndị Kọrint 11:​4, 5, 13.

Inye ndị mmadụ otuto n’ụzọ dị otú a adịghị mma. Ọ bụ iche echiche n’anụ ahụ, ọ na-akpatakwa ikwo ekworo na ibu iro. (1 Ndị Kọrint 3:​3, 4) Pọl gosiri ihe ndị na-esi n’iche echiche dị otú ahụ na-apụta. Ọ sịrị: “Esemokwu dị n’etiti unu. Ihe m na-ekwu bụ nke a, na unu nile n’otu n’otu na-asị, Mụ onwe m bụ nke Pọl; mụ onwe m bụkwa nke Apọlọs; mụ onwe m bụkwa nke Sifas; mụ onwe m bụkwa nke Kraịst.”​—⁠1 Ndị Kọrint 1:​11, 12.

Ya mere, mgbe o dere, sị, “onye na-akụ akụ na onye na-akwọsa mmiri abụghị ihe ọ bụla” (Phillips), onyeozi ahụ na-emegide echiche anụ ahụ dị otú ahụ, na-emesi ike mkpa ọ ­dị ilegara Jisọs Kraịst anya dị ka Onyendú na ịmata na otuto nile maka uto a na-enwe n’ọgbakọ na-agara Chineke. Ndị ozi ahụ na ndị okenye ndị ọzọ bụ nanị ndị ohu nke ọgbakọ. Ọ dịghị onye e kwesịrị ibuli elu, ha onwe ha ekwesịghịkwa ịchọ otuto ma ọ bụ ịbụ ndị a ma ama. (1 Ndị Kọrint 3:​18-⁠23) Ya mere onye ahụ na-akụ akụ na onye ahụ na-akwọsa mmiri abụghị ihe ọ bụla, ka Pọl kwuru, “ma e jiri ya tụnyere onye na-eme ka mkpụrụ ahụ dị ndụ.”​—⁠1 Ndị Kọrint 3:7, Phillips.

Ndị Ha na Chineke Na-arụkọ Ọrụ

Ya mere, n’ikwu nke a, Pọl onyeozi adịghị elelị ịdị mkpa nke òkè anyị na-ekere n’ịkụ mkpụrụ na ịkwọsa ya mmiri. O bughị n’uche ka anyị malite iche, sị, “Chineke ga-eme ka ihe too n’oge o ji chọọ,” mgbe ahụkwa nọdụrụ onwe anyị na-eche ya ka o mee ya. Ọ maara na ihe anyị na-eme nakwa ụzọ anyị si eme ya nwere mmetụta n’ụzọ ihe si eto.

Nke ahụ mere Pọl ji nọgide na-agba ndị Kraịst ume ka ha na-arụsi ọrụ ike n’ije ozi ha ma meziwanye nkà ha dị ka ndị na-ezi ihe. Chee echiche banyere ndụmọdụ ahụ o nyere nwa okoro ahụ bụ́ Timoti. “Rịba onwe gị na ozizi gị ama. Na-anọgide n’ihe ndị a; n’ihi na n’ime nke a ị ga-azọpụta onwe gị zọpụtakwa ndị na-anụ olu gi.” (1 Timoti 4:16) “Ana m agwasi gị ike . . . ; kwusa okwu ya; tụkwasị uche n’ọrụ gị . . . , n’ogologo ntachi obi nile na [nkà izi ihe, NW]. . . . Jezuo ozi gị.” (2 Timoti 4:​1, 2, 5) A garaghị enwe uru ọ bara Timoti ịrụsi ọrụ ike imeziwanye nkà ya ma ọ bụrụ na ọkụkụ ihe ya na ịkwọsa ya mmiri agaghị enwe mmetụta ọ bụla n’ime ka ihe na-eto.

Dị ka Pọl na Apọlọs, gị onwe gị pụrụ inwe ihe ùgwù ahụ dị oké ọnụ ahịa nke ije ozi dị ka otu n’ime ndị ha na Chineke na-arụkọ ọrụ. (1 Ndị Kọrint 3:9; 2 Ndị Kọrint 4:1; 1 Timoti 1:12) Ebe ọ dị otú ahụ, ọrụ gị dị mkpa. Onye ahụ na-akụ ubi adịghị atụ anya ka Chineke si n’ụzọ ọrụ ebube mee ka ubi mara mma pụta n’enweghị mgbalị ọ bụla n’akụkụ nke onye ahụ na-akụ ubi. Nke ahụ ò kwesịrị ịdị iche n’uto ime mmụọ? Ọ dịghị ma ọlị. Dị ka onye ọrụ ubi ahụ nke ji ndidi “na-eche mkpụrụ dị oké ọnụ ahịa nke ala,” anyị aghaghị ibu ụzọ dọgbuo onwe anyị n’ọrụ n’ịkụ mkpụrụ na ịkwọsa ya mmiri, nọgide mgbe nile na-echere ka Chineke na-eme ka ọ na-eto.​—⁠Jemes 1:22; 2:26; 5:7.

Na-eme Òkè Gị

Ebe, dị ka Pọl onyeozi kwuru, “ha abụọ n’otu n’otu ga-anata ụgwọ ọrụ nke aka ha, onye ọ bụla dị ka ndọgbu ọ na-adọgbu onwe ya n’ọrụ si dị,” anyị kwesịrị ịjụ onwe anyị banyere ụzọ anyị si na-adọgbu onwe anyị.​—⁠1 Ndị Kọrint 3:8.

Onye ọkà n’ọrụ ịkụ ubi bụ́ Geoffrey Smith kwuru, sị: “Ọ dịghị iru eru ọ bụla pụrụ iche nke dị mkpa iji ghọọ onye na-akụ ubi, ọ bụ nanị inwe mmasị n’ihe ọkụkụ.” (Shrubs & Small Trees) N’otu aka ahụ, ọ dịghị iru eru ọ bụla pụrụ iche e bu pụta ụwa dị mkpa nye anyị iji bụrụ ndị ha na Chineke na-arụkọ ọrụ, nanị inwe ezi mmasị n’ebe ndị mmadụ nọ na ịdị njikere ịbụ ndị Chineke ji eme ihe.​—⁠2 Ndị Kọrint 2:16, 17; 3:4-⁠6; Ndị Filipaị 2:13.

Tụlee ụfọdụ n’ime ezi ndụmọdụ ndị maara ka e si akụ ubi nke ọma na-enye. Dị ka otu onye ọkà si kwuo, ọ bụrụ na onye na-amalite ọhụrụ n’ọrụ ịkụ ubi dị njikere ige ndị ahụ nwere ahụmahụ karịa ya ntị, “onye ahụ na-amụ amụ pụrụ ịghọ onye ọkà ngwa ngwa.” Ọzọ, ka otu onye ọkà ahụ kwuru, “onye ọkà ahụ na-anọgide na-achọ ihe ọhụrụ ọ ga-amụta.” (The Encyclopedia of Gardening) Ị̀ na-eji ọchịchọ obi gị na-anakwere enyemaka na ọzụzụ nke Jehova na-ewepụta ka i wee nwee ike ịkụ mkpụrụ na ịkwọsa ya mmiri n’ụzọ dị irè? Ọ bụrụ na ị na-eme otú ahụ, ma ị̀ bụ onye ọhụrụ n’ọrụ ahụ ma ọ bụ na i nwewo ahụmahụ na ya, ị pụrụ ịzụlitekwu nkà dị ka onye ya na Chineke na-arụkọ ọrụ wee si otú ahụ ghọọ ‘onye ruru eru izi mmadụ ibe ya ihe.’​—⁠2 Timoti 2:2.

Ọ bụrụ na ọ dị njikere ịṅa ntị na ịmụta ihe, ka Geoffrey Smith kwuru, “onye ahụ na-amalite ọhụrụ ga-ezere ihe ize ndụ zoro ezo ndị kasị njọ.” Ọ bụrụ na anyị aṅaa ntị ná ntụziaka nke Jehova na-enye site n’Okwu ya na nzukọ ya, anyị ga-eme ihe n’ụzọ nke ya. Mgbe ahụ anyị ga-ezere, dị ka ihe atụ, ihe ize ndụ ndị zoro ezo ndị dị ka isoro ndị ahụ chọrọ nanị ise okwu ma ọ bụ ịbụ okwu ụbụ na-arụ ụka nzuzu.​—⁠Ilu 17:14; Ndị Kọlọsi 4:6; 2 Timoti 2:​23-⁠26.

Ezi ndụmọdụ ọzọ banyere ịkụ ubi bụ iji nlezianya chee echiche tupu a gbaga ije gwurie ala. “Tupu e gbuo ọgụ n’ala,” ka The Encyclopedia of Gardening kwuru, “wepụta oge jiri nwayọọ tụlee [olileanya ndị i nwere].” Ị̀ na-adaba n’ọnyà nke ịmaba n’ozi ndị Kraịst n’ebughị ụzọ jiri nlezianya na ekpere chee echiche banyere ihe ị chọrọ ịrụzu na ụzọ kasị mma isi mee ya? Mara ihe bụ nzube gị tupu ị malite. Dị ka ihe atụ, chee echiche banyere ụdị ndị ị pụrụ izute na nsogbu ndị ị pụrụ iche ihu, dịkwa njikere ileba ha anya. Nke a ga-enye gị ohere ka i wee “rite ọtụtụ mmadụ n’uru karị [ka ị na-aghọ] ihe nile n’ebe mmadụ nile nọ.”​—⁠1 Ndị Kọrint 9:​19-⁠23.

“Ewepụkwala Aka Gị”

Ọ bụrụ na anyị nwere ekele maka ihe ùgwù nke ijere Chineke ozi dị ka ndị ya na ya na-arụkọ ọrụ, anyị agaghị ebelata aka n’òkè ­anyị nwere n’ọrụ nnwekọ ahụ. “Ghaa mkpụrụ gị n’ụtụtụ, ewepụkwala aka gị n’anyasị: n’ihi na ị dịghị ama nke ga-agazi agazi, ma ọ bụ nke a ma ọ bụ nke ọzọ, ma ọ bụ na ha abụọ ga-adị mma otu aka ahụ.” (Eklisiastis 11:6) Ihe ikpeazụ ga-esi na ya pụta dị n’aka Jehova, ma anyị ga-enweta ihe ubi nanị ma ọ bụrụ na anyị ejiri ịdị uchu kụọ mkpụrụ.​—⁠Eklisiastis 11:4.

Ọ dịghị ubi ọ bụla e mere ka ọ maa mma site n’igwu ala na ịghasa mkpụrụ nanị iji ­wee mezuo iwu. N’otu aka ahụ, a chọrọ ihe dị ukwuu n’ozi ndị Kraịst karịa ikere òkè dị nta ná nkesa nke akwụkwọ Bible. Dị ka ndị ha ­na Chineke na-arụkọ ọrụ, ọ dị mkpa anyị ­ịdị uchu na ime ihe n’ụzọ ruru ala iji kpọsaa ozi ọma banyere Alaeze Chineke, na-achọta ndị ahụ obi ha ziri ezi. (Ọrụ 13:48) Cheta ụkpụrụ ahụ dị n’okwu Pọl onyeozi kwuru ná 2 Ndị Kọrint 9:6: “Onye weere aka ntagide na-agha mkpụrụ ga-ewerekwa aka ntagide na-ewe ­ihe ubi; onye weerekwa ngọzi na-agha mkpụrụ ga-ewerekwa ngọzi na-ewe ihe ubi.”

Dị ka ndị nile maara akụ ubi, anyị na-agbalị ịkụ ihe n’ala dị mma. Otú ọ dị, mgbe ọ bụla a kụrụ ihe ọbụna n’ala kasị dị mma, ọ bụghị ebe ahụ ka okwu gwụrụ. Geoffrey Smith kwuru, sị: “Nke a apụtaghị na a kụhaala ihe n’ala, ọ dịghị ihe ọzọ a chọrọ n’aka onye ahụ kụrụ ihe e wezụga ịzụta oche ndabere na ugegbe anya.” Ee e, ka ihe ndị ahụ wee too, a chọrọ mgbalị n’ịkwọsa ihe ọkụkụ ahụ mmiri na ichebe ya.​—⁠Tụlee Ilu 6:​10, 11.

N’ezie, ije ozi ndị Kraịst pụrụ iwe ogologo oge nke ịrụsi ọrụ ike mgbe o yiri ka ọ dịghị ihe ọ bụla na-emenụ. Ma na mberede, nakwa n’ụzọ a na-atụghị anya ya, ọtụtụ ihe ịtụnanya pụrụ isi na ya pụta. Geoffrey Smith kwuru, sị: “Ịkụ ubi gụnyere ogologo oge nke jupụtara n’ịdọgbu onwe onye n’ọrụ nke na-ewe oge ụfọdụ nke oké ịma mma nke na a na-echezọ ọrụ nile nke igwu ihe, ifo ahịhịa, ­na ịnọ n’oké nchekasị.” Gị onwe gị pụkwara ­inwe oge oké afọ ojuju mgbe obi nke na-anabata ihe nakweere ozi nke eziokwu​—⁠ma ọ bụrụhaala na ị dị njikere ịmalite igwu ala, ịkụ ihe, ifo ahịhịa, na ịkwọsa mmiri.​—⁠Tụlee Ilu 20:4.

Pọl na Apọlọs maara na ọrụ ha nke ikwusa banyere Alaeze na ime ndị na-eso ụzọ emeghị ka ha bụrụ ndị a ma ama n’ụzọ pụrụ iche n’ọgbakọ ndị Kraịst. Ha ghọtara na ọ bụ Chineke na-eme ka ihe na-eto. Ma, ha kụrụ mkpụrụ, ha kwọsakwara ya mmiri​—⁠n’ịdị uchu. Ka anyị na-agbaso ihe nlereanya ha ma na-ewepụtara Chineke onwe anyị dị ka “ndị na-eje ozi, ndị [ndị ọzọ] si n’aka ha kwere.”​—⁠1 Ndị Kọrint 3:​5, 6.

[Foto dị na peeji nke 23]

Chineke na-eme ka ihe nile na-eto​—⁠ma onye na-akụ ubi na-emekwa òkè nke ya

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya