Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • ws isi 8 p. 65-72
  • Ikere Òkè “n’Ọṅụ” nke “Onyeisi Udo” Ahụ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ikere Òkè “n’Ọṅụ” nke “Onyeisi Udo” Ahụ
  • Inọ ná Ntụkwasị Obi Zuru Ụwa Ọnụ n’Okpuru “Onyeisi Udo” Ahụ
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ndị Oje Ozi nke “Onyeisi Udo” Ahụ
  • Ịpịazi Ego n’Ihi Ego Kraịst E Ji Mee Ihe
    Inọ ná Ntụkwasị Obi Zuru Ụwa Ọnụ n’Okpuru “Onyeisi Udo” Ahụ
  • Oké Ìgwè Mmadụ nke Ndị Na-efe Ezi Ofufe—Olee Ebe Ha Si Bịa?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1995
  • Mụta Ihe n’Ilu Jizọs Tụrụ Banyere Talent
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2015
  • Ọrụ Ndị Mụbara Amụba N’oge Ọnụnọ Kraịst
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1993
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Inọ ná Ntụkwasị Obi Zuru Ụwa Ọnụ n’Okpuru “Onyeisi Udo” Ahụ
ws isi 8 p. 65-72

Isi 8

Ikere Òkè “n’Ọṅụ” nke “Onyeisi Udo” Ahụ

1. (a) N’ihi gịnị ka otu mmadụ ji mee njem gaa ala ọzọ? (b) Gịnị ka ilu Jisọs pụtara, ọ bụ ezie na e kwughị ya otú ahụ kpọmkwem?

N’ILU Jisọs nke talent ndị ahụ, mmadụ ahụ nwere talent ọlaọcha asatọ ahụ ejeghị ala ọzọ nanị maka ikpori ndụ dị ka à ga-asị na o jere ilegharị anya. O nwere ezi ihe dị mkpa mere o ji mee njem gaa ala ọzọ; o nwere ọchịchọ nke inweta ihe dị oké ọnụ ahịa. Dị ka ilu ahụ gosiri, o jere ala ọzọ iji nweta otu ‘ọṅụ,’ tinyere “ọtụtụ ihe.” (Matiu 25:21) Otú a ọ ghaghị ije ebe dị anya, na-achọ oge dị ogologo, iji hụ onye ahụ pụrụ inye ya ọṅụ ahụ kpọmkwem.

2. (a) N’ọnọdụ Jisọs, gịnị ka ime njem gaa ala ọzọ nke nwoke ahụ bara ọgaranya sere onyinyo ya, ọ̀ bụkwa onye ka o jekwuuru? (b) Gịnị ka Onyenwenụ ahụ ji lọghachi?

2 Ebe mmadụ ahụ bara ọgaranya nke dị n’ilu ahụ na-ese onyinyo Jisọs Kraịst, mmadụ ahụ ime njem dị anya gaa ala ọzọ na-ese onyinyo Jisọs ijekwuru otu Isi Iyi nke ọṅụ ahụ pụrụ iche nke o bu n’uche. Mgbe ahụ, ònye ka o jekwuuru? Ndị Hibru 12:2 (NW) na-agwa anyị, sị: “Anyị na-elekwasị anya n’ebe Onye Isi na Onye Mmezu nke okwukwe anyị nọ, bụ́ Jisọs. N’ihi ọṅụ e debere ya n’ihu, ọ tachiri obi n’elu osisi ịta ahụhụ, na-elelị ihere, ọ nọdụwokwa ala n’aka nri nke ocheeze Chineke.” Ee, n’ezie, Jehova Chineke bụ Isi Iyi nke ọṅụ ahụ. Ọ bụ ya ka Jisọs jekwuuru, na-ahapụ ndị na-eso ụzọ ya kwesịrị ntụkwasị obi n’elu ala ebe a bụ́ ndị o nyeworo “talent” ya. Onyenwenụ ahụ jiri “ọtụtụ ihe” lọta, bụ́ ndị ọ na-enwebughị mgbe o nyere ndị ohu ya atọ talent ọlaọcha asatọ ahụ. Ilu bu nke a ụzọ nke Jisọs tụrụ, ilu banyere “pound [iri atọ]” kwuru kpọmkwem na ihe o ji lọta bụ “alaeze.”​—⁠Luk 19:​12-⁠15.

3. Ọ̀ bụ n’ụdị oge dị aṅaa ka Zekaraịa 9:9 malitere imezu na narị afọ nke mbụ O.A.?

3 N’ịbụ onye e mere ọhụrụ ka ọ nọkwasị n’ocheeze, onye eze nwere ihe mere ọ ga-eji nwee ọṅụ, otú a ka ọ dịkwa ndị na-eguzosi ike n’ihe nọ n’okpuru ya. Anyị na-echeta ihe merenụ mgbe Ọkpara Chineke nọkwasịrị n’elu ịnyịnya ibu wee baa na Jerusalem iji mezuo amụma Zekaraịa 9:9. Banyere mmezu nke amụma ahụ, e dere, sị: “Ndị karịrị n’ìgwè mmadụ ahụ wee tụsaa uwe ha n’ụzọ; ndị ọzọ gbubitara alaka n’osisi, tụsaakwa ha n’ụzọ. Ìgwè mmadụ nile ndị na-aga n’ihu ya, ndị na-esokwa, na-eti mkpu, sị, Hosanna dịrị Nwa Devid: Onye a gọziri agọzi ka Onye ahụ bụ nke na-abịa n’aha Onyenwe anyị; Hosanna n’ebe kachasị ihe nile elu. Mgbe ọ batara na Jerusalem, obodo ahụ nile wee maa jijiji, sị, Ònye bụ nwoke a?”​—⁠Matiu 21:​4-⁠10; leekwa Luk 19:​36-⁠38.

4. Mgbe e chisịrị ya Eze, n’ihi gịnị ka Jisọs Kraịst ji nwee ihe mgbakwasị ụkwụ pụrụ iche maka ịkpọbata “ndị ohu” ya kwesịrị ntụkwasị obi n’ọnọdụ na-enye ọṅụ?

4 Mgbe ahụ, ọ bụrụ na ọ bụ oge ịṅụrị ọṅụ mgbe ihe o mere bụ nanị iche onwe ya n’ihu ndị bi na Jerusalem dị ka onye e jiri mmụọ Jehova tee mmanụ maka ịbụ eze, ruo ókè hà aṅaa ka ọ dị otú a karị mgbe e mere ka ọ nọkwasị n’ocheeze n’ezie dị ka Eze n’ọgwụgwụ nke Oge Ndị Jentaịl na 1914? Ọ bụ oge oké ọṅụ kasị ukwuu nye ya. N’ezie, mgbe ahụ ka ọ banyere n’ọṅụ nke ọ na-enwetụbeghị ahụmahụ ya mgbe ọ bụla. N’ime mpịazi, ọ pụrụ n’ihi ya ịgwa ndị na-eso ụzọ ya bụ́ ndị o kpebiworo n’ikpe na ha bụ ndị ‘ziri ezi, kwesịkwa ka a tụkwasị ha obi,’ sị: “I kwesịrị ka a tụkwasị gị obi n’ụmụ ihe ole na ole, m ga-eme gị onyeisi ọtụtụ ihe: baa n’ọṅụ nke onyenwe gị.” (Matiu 25:21) E nwere ugbu a ọṅụ dị ọhụrụ nke ndị “ohu” ya ọ nwapụtara pụrụ ikere òkè n’ime ya. Lee ụdị ụgwọ ọrụ nke a bụ!

5. (a) Pọl onyeozi bụ ‘onye ụkọ’ maka Kraịst n’oge dị aṅaa nke ihe omume? (b) Ma taa ihe fọdụrụ ahụ e tere mmanụ bụ “ndị ụkọ” maka Kraịst mgbe ihe dị aṅaa mesịrị?

5 Na 1919 ndị na-eso ụzọ e tere mmanụ nke Eze ahụ na-achị achị, bụ́ Jisọs Kraịst, banyere n’ọnọdụ a nwapụtara anwapụta, n’akụkụ nke ha kwa, ịbanye na ya bụụrụ ha ihe ọṅụ dị ukwuu. Narị afọ 19 tupu nke a Pọl onyeozi degaara ndị kwere ekwe ibe ya akwụkwọ iji gwa ha maka ọnọdụ ha e buliri elu, sị: “Ya mere anyị bụ ndị ụkọ n’ọnọdụ Kraịst.” (2 Ndị Kọrint 5:20) E dere nke ahụ mgbe Jisọs ka bụ nanị onye nketa e ji n’aka, nke nwere olileanya ịnata “alaeze eluigwe.” (Matiu 25:1) Ya mere, ọ dị mkpa mgbe ahụ ka ọ nọdụ ala n’aka nri Chineke na ichere n’ebe ahụ ruo ụbọchị a ga-echi ya echichi. Ma ugbu a, kemgbe 1919, ihe fọdụrụ ahụ a nwapụtara anwapụta abụwo “ndị ụkọ” e zipụtara site n’aka Onye nke na-achị achị n’ezie dị ka Eze. (Ndị Hibru 10:​12, 13) E mere ka Ndị Mmụta Bible nke Mba Nile mara banyere eziokwu nke a ná mgbakọ e nwere na Cedar Point, Ohio, na 1922.

6. Mgbalị ndị ahụ nataworo “talent” mere mgbe agha gasịrị bụ nke e chere ihu n’ebe ọrụ dị aṅaa dị?

6 Na 1919 ha abụwo ndị e nyere ihe ya na “talent” ndị ahụ nke Eze ahụ na-achị achị bụ Jisọs Kraịst hà nhata. Nke a emewo ka ihe ha ga-azara ọnụ ya n’ihu Eze ahụ na-achị achị bukwuo ibu. Site ná mmalite, mgbalị ndị ha mere mgbe agha gasịrị bụ gaa n’ọrụ “owuwe ihe ubi” ahụ, nchịkọta nke òtù “ọka” ahụ. (Matiu 13:​24-⁠30) Ebe ọ bụ na dị ka Jisọs kwuru, owuwe ihe ubi ahụ bụ “ọgwụgwụ oge a,” afọ 1919 mgbe agha gasịrị bụ mgbe oge ya ruru maka ịmalite owuwe ihe ubi nke a nke “ụmụ alaeze” ahụ yiri ọka, bụ́ ihe fọdụrụ ahụ e tere mmanụ kwesịrị ntụkwasị obi.​—⁠Matiu 13:​37-⁠39.

7. (a) N’ụdị oge dị aṅaa ka ndị ahụ na-ewe ihe ubi na Onyenwe ha banyere? (b) N’ọnọdụ dị aṅaa ka Jehova webataworo ndị ahụ na-ewe ihe ubi, okwu amụma dị aṅaa ka ha nakweere?

7 Oge iwe ihe ubi bụ oge aṅụrị nye ndị na-ewe ihe ubi, ka Onyenwe owuwe ihe ubi ahụ na-eso ha aṅụrị ọṅụ n’oge ahụ. (Abụ Ọma 126:6) E mewo ka oge owuwe ihe ubi a maa mma n’ụzọ dị ukwuu site n’ihe àmà na-arị elu na Alaeze Chineke site n’aka Jisọs Kraịst abụrụwo nke e guzobere n’eluigwe na 1914 nakwa na Jehova emewo ka ndị ya raara onwe ha nye bụ́ ndị nọ n’elu ala bụrụ ndị a gụrụ dị ka ndị ezi omume n’ihu ya ọzọ. Dị ka otu òtù, ha na-anakwere okwu ndị dị n’Aịsaịa 61:10: “Obi ga-atọ m ụtọ nke ukwuu n’ime Jehova, mkpụrụ obi m ga-etegharị egwú ọṅụ n’ime Chineke m; n’ihi na ọ chịrịwo uwe nzọpụta yikwasị m, o werewo uwe mwụda ezi omume kpuchie m.”

Ịchịkọta “Oké Ìgwè Mmadụ” nke Ndị Ga-ekere Òkè “n’Ọṅụ” Ahụ

8. Ọṅụ dị aṅaa nke ihe fọdụrụ ahụ na-atụghị anya ya gaje ịbụ nke ha n’ọgwụgwụ nke nchịkọta nke ndị nketa Alaeze ahụ?

8 Ihe fọdụrụ ahụ e tere mmanụ bụ́ ndị banyere “n’ọṅụ” nke Onyenwe ha amataghị na n’oge ọgwụgwụ nke nchịkọta nke ndị ikpeazụ so ná ndị nketa nke Alaeze eluigwe, a ga-enwe ọṅụ ọzọ, ihe a na-atụghị anya ya. Nke a gaje ịbụ nchịkọbata nke òtù elu ala bụ́ ndị ga-ebi na Paradaịs elu ala n’okpuru Ọchịchị Narị Afọ Iri nke Jisọs Kraịst. Olee ndị ma ọ́ bụghị ndị sitere n’òtù elu ala nke a, bụ ndị kwesịrị ekwesị ka a kpọọ ịnara mkpughepụ mbụ nke ihe ọmụma metụtara ha?

9. Olee ndị karịsịa ka a kpọrọ òkù ịbịa mgbakọ Washington, D.C., na 1935, ọ̀ bụkwa ihe ọmụma dị aṅaa bịara n’oge ya ka e kpugheere ha n’ebe ahụ?

9 Otú a ka o si bụrụ na ná nzaghachi nke ịkpọ òkù ahụ e depụtara n’Ụlọ Nche,a ọtụtụ narị ndị na-achọ ka ha na Jehova nwee mmekọrịta, tinyere ndị ya a kpọkwasịrị aha ya, gara mgbakọ ukwu ahụ ọha mmadụ bịara nke Ndịàmà Jehova na Washington, D.C., May 30 ruo June 2, 1935. Ná mgbakọ ukwu ahụ a kpaliri ha ruo n’ala ala obi ha ịmụta na “oké ígwè mmadụ” ahụ a hụrụ n’ọhụụ ná Mkpughe 7:​9-⁠17 gaje ịbụ òtù nke elu ala.

10, 11. Nye ònye n’eluigwe ka nke a kwesịrị ịbụrụ oge ọṅụ pụrụ iche?

10 Lee ihe oké ọṅụ inwe mgbakọ ukwu ahụ na Washington, D.C., na-aghaghị ịbụworo Chineke Onye Kasị Ihe Nile Elu, bụ́ Jehova! Lee ihe oké ọṅụ ọ na-aghaghịkwa ịbụworo Ọkpara ya dị ka Onye Ọzụzụ Atụrụ Ọma nke ga-amalite ugbu a ịchịkọta “atụrụ ọzọ” ndị a banye ‘n’otu ìgwè atụrụ’ ahụ!​—⁠Jọn 10:16.

11 Mgbe e du ha ma na-azụ ha, n’ikwu ya n’ụzọ ihe atụ, ndị òtù nke ihe fọdụrụ ahụ na “oké ìgwè mmadụ” ahụ na-aba ụba nke “atụrụ ọzọ” ahụ na-agwakọta n’udo na n’ịhụnanya. Obi nke “otu onye ọzụzụ atụrụ” ha aghaghị ijupụta n’ọṅụ ugbu a n’ihi inwe “ìgwè atụrụ” dị otú a buru ibu n’oge dị nso “ọgwụgwụ oge a.”

Ndị Oje Ozi nke “Onyeisi Udo” Ahụ

12, 13. (a) Olee ndị ka a kpọworo òkù isoro ihe fọdụrụ ahụ e tere mmanụ kere òkè n’ọṅụ nke Onyenwenụ ahụ lọtaranụ, nke a ọ̀ bụkwa n’ihi gịnị? (b) “Oké ìgwè mmadụ” nke “atụrụ ọzọ” ahụ na-eje ozi maka ọdịmma nke “Onyeisi Udo” ahụ n’ọkwá dị aṅaa?

12 Ndị ahụ yiri atụrụ bụ́ ndị mejupụtara “oké ìgwè mmadụ” ahụ nwere ugbu a òkè buru ibu n’ọṅụ nke Onyenwenụ ahụ, bụ́ Jisọs Kraịst. N’ụzọ dị ukwuu, nke a bụ n’ihi na ha na-ekere òkè dị ukwuu n’ịkpọbata ndị ahụ dị mkpa maka imezu “oké ìgwè mmadụ” ahụ, nke a na-enyeghị ọnụ ọgụgụ ha ná Mkpughe 7:9.

13 Ọrụ nchịkọta ahụ nke “atụrụ ọzọ” ahụ na-ekere òkè n’ime ya agbasazuwo ụwa nile, gabiga n’ụzọ dị ukwuu ikike nke ọnụ ọgụgụ na-atalata atalata nke ihe fọdụrụ ahụ e tere mmanụ ịnagide. N’ụzọ kwekọrọ ná nke a, ọ bụwo ihe ịdị mkpa ya na-arị elu maka ọnụ ọgụgụ ahụ na-aba ụba nke “atụrụ ọzọ” ahụ ikere òkè ka ukwuu ịkpọbatakwa ọtụtụ ndị ọzọ nke “atụrụ ọzọ” ahụ nwere olileanya nke elu ala. Otú a “atụrụ ọzọ” ahụ na-eje ozi dị ka ndị oje ozi kwesịrị ntụkwasị obi nke “Onyeisi Udo” ahụ. Ilu 25:13 na-ekwukwa, sị: “Dị ka oyi snow n’ụbọchị owuwe ihe ubi, otú a ka ụkọ [“onye oje ozi,” NW] nke kwesịrị ntụkwasị obi dịịrị ndị na-eziga ya; ọ bụkwa mkpụrụ obi ndị nwe ya ka ọ na-ewelata.”

14. (a) Gịnị ka atụrụ ihe atụ nke ilu Jisọs na Matiu 25:​31-⁠46 ketara? (b) Olee otú e siworo kwadebere ha Alaeze ahụ “site ná ntọala nke ụwa”?

14 N’ilu nke ụmụ atụrụ na ụmụ ewu, ọ bụ atụrụ ihe atụ ahụ ka Eze ahụ bụ Jisọs Kraịst na-agwa, sị: “Bịanụ, ndị a gọziri agọzi nke Nna m, ketanụ alaeze e doziwooro unu site ná ntọala nke ụwa.” (Matiu 25:​31-⁠46) Ha na-eketa ógbè elu ala nke Alaeze nke eluigwe ga-achị isi n’elu ya n’oge Ọchịchị Narị Afọ Iri nke Kraịst. Kemgbe oge Ebel ahụ kwesịrị ntụkwasị obi, Jehova anọwo na-akwadebe ógbè nke a maka ụwa nke ihe a kpọrọ mmadụ a pụrụ ịgbapụta agbapụta.​—⁠Luk 11:​50, 51.

15, 16. (a) “Ịma mma” dị aṅaa nke eze, dị ka Solomọn kwuru, ka Onyenwenụ ahụ nwere taa, n’agbanyeghị na ọ na-achị isi n’etiti ndị iro ya? (b) N’ụdị dị aṅaa ka Eze ahụ na-achị achị nwere “ịma mma” nke a taa? (ch) Gịnị ka ndị ahụ na-emejupụta “ịma mma” nke a meworo?

15 Eze amamihe nke Israel oge ochie bụ́ Eze Solomọn dere, sị: “N’ụba nke ndị ọ bụla ka ịma mma eze dị.” (Ilu 14:28) Eze Onyenwenụ ahụ nke taa, bụ́ Kraịst Jisọs, bụ́ onye ọchịchị dị elu nke ukwuu karịa Eze Solomọn nke elu ala, nwere ụdị “ịma mma” dị otú ahụ nke ‘ịba ụba nke mmadụ.’ Nke a bụ eziokwu ọbụna ugbu a tupu mmalite nke ịchịisi ya nke otu puku afọ, ee, mgbe ọ na-achị n’etiti ndị iro ya elu ala ya, nke Setan bụ Ekwensu bụ eze ha a na-adịghị ahụ anya nke ike ya karịrị nke mmadụ.​—⁠Matiu 4:​8, 9; Luk 4:​5, 6.

16 “Ịma mma” nke taa nke kwesịịrị onye ọchịchị ukwu nke nwere ọkwá eze ka a na-ahụ ugbu a n’ọnụ ọgụgụ na-arị elu nke “atụrụ ọzọ” ya bụ́ ndị mejupụtara “oké ìgwè mmadụ” ahụ. N’obi ụtọ ha na-etikọ mkpu ọṅụ, sị: “Nzọpụta dịịrị Chineke anyị, onye na-anọkwasị n’ocheeze ahụ, dịkwara Nwa Atụrụ ahụ.” (Mkpughe 7:​9, 10) Ha enweworị nzọpụta site n’usoro ihe nke a mbibi na-eche ihu, nke Setan bụ Ekwensu bụ “chi” ya. (2 Ndị Kọrint 4:4) N’ikwu ya n’ụzọ ihe atụ, ha ‘asaworị uwe mwụda ha, . . . n’ime ọbara Nwa Atụrụ ahụ,’ meekwa ka ha dị ọcha iji bụrụ ndị na-enweghị ntụpọ n’ihu Jehova Chineke, bụ́ Onyeikpe ahụ.​—⁠Mkpughe 7:14.

17. (a) Nzọpụta dị aṅaa ka “oké ìgwè mmadụ” ahụ ka na-enwe olileanya ya? (b) Ihe ùgwù dị aṅaa ka ha ga-enwe n’oge Ọchịchị Narị Afọ Iri nke “Onyeisi Udo” ahụ?

17 Otú ọ dị ha nwere olileanya nzọpụta nke Chineke ga-eweta bụ́ nke ha ga-enwe ná mmeri ikpeazụ nke Jehova ga-enwe ‘n’agha nke oké ụbọchị ahụ nke Chineke, Onye Pụrụ Ime Ihe Nile’ na Ha–Magedọn. Mmeri ya dị ebube n’ebe ahụ ga⁠-⁠arụpụta mwepụ a ga-ewepụ ọkaaka eluigwe na ala ya n’ụta, ha ga-abụkwa ndị nọ n’elu ala ji anya ha hụ ihe merenụ n’ihi ịbụ ndị e chebere ndụ gabiga ọgwụgwụ dị egwu nke ụwa ọjọọ nke a. (Mkpughe 16:14; 2 Pita 3:12) Lee ihe ùgwù dị oké ọnụ ahịa nke a bụ! Lee ọṅụ dị ukwuu nke “Onyeisi Udo” ahụ na “oké ìgwè mmadụ” ahụ na-alanarị alanarị nke “atụrụ ọzọ” ya na-eguzosi ike n’ihe ga-ekerịta mgbe ahụ!

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

a Peji nke 2 nke mbipụta Ụlọ Nche (Bekee) nke April 1 na 15, May 1 na 15, 1935.

[Foto dị na peeji nke 71]

Ọṅụ aghaghị ijupụta obi nke Onye Ọzụzụ Atụrụ Ọma ahụ ugbu a n’ihi inwe ọtụtụ “atụrụ ọzọ”

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya