-
Ụzọ Isi Zụọ Akọ na Uche GịỤlọ Nche—1997 | Ọgọst 1
-
-
Dị ka ihe atụ, gbalịa ịtụgharị uche n’okwu Pọl onyeozi dị ná 2 Ndị Kọrint 7:1: “Ya mere ndị m hụrụ n’anya, ebe anyị nwere nkwa ndị a, ka anyị sachapụ n’onwe anyị mmerụ nile nke ahụ na nke mmụọ, na-emezu ịdị nsọ n’egwu Chineke.” Ghọta okwu ndị a. Jụọ onwe gị, ‘Gịnị nnọọ bụ “nkwa ndị a” nke Pọl zoro aka na ha?’ Site n’ịgụ ihe ndị gbara ya gburugburu, ị ga-ahụ na amaokwu ndị bu ya ụzọ na-asị: “Sinụ n’etiti ha pụta, guzokwanụ iche, ka Onyenwe anyị kwuru, Unu emetụkwala ihe na-adịghị ọcha aka; Mụ onwe m ga-akpọbatakwa unu, bụrụkwa unu Nna, unu onwe unu ga-abụkwara m ụmụ ndị ikom na ụmụ ndị inyom, ka Onyenwe anyị kwuru, Nke pụrụ ime ihe nile.”—2 Ndị Kọrint 6:17, 18.
Iwu Pọl nyere ‘ịsachapụ n’onwe anyị mmerụ nile’ na-enwekwu ike ugbu a! Dị ka ihe mkpali dị ike iji mee nke ahụ, Chineke na-ekwe nkwa ‘ịkpọbata anyị,’ ya bụ, ido anyị n’okpuru nlekọta nchebe ya. ‘M̀ ga-esoro ya nwee mmekọrịta chiri anya—dị ka nke nwa nwoke ma ọ bụ nwa nwanyị na-enwe n’ebe nna ya nọ?’ ka ị pụrụ ịjụ onwe gị. Ọ̀ bụ na echiche nke ịbụ onye Chineke na-ahụ n’anya, nke nwere amamihe ‘kpọbatara’ ma ọ bụ hụrụ n’anya adịghị adọrọ mmasị nke ukwuu? Ọ bụrụ na o yiri ka ị ghọtaghị echiche ahụ, lee otú ndị bụ́ nna na-ahụ n’anya si egosipụta ịhụnanya na mmetụta ịhụnanya n’ebe ụmụ ha nọ. Ugbu a cheedị echiche banyere ụdị nkekọ dị otú ahụ ịdị n’etiti gị na Jehova! Ka ị na-atụgharịkwu uche na ya, otú ahụ ka ọchịchọ maka ụdị mmekọrịta ahụ na-etowanye.
Ma rịba ama: Ịbịa Chineke nso n’ụzọ chiri anya ga-ekwe omume nanị ma ọ bụrụ na i ‘metụghị ihe na-adịghị ọcha aka.’ Jụọ onwe gị: ‘Ọ̀ bụ na ụtaba iri m ahụ esoghị “n’ihe na-adịghị ọcha” ndị Chineke katọrọ? Iji ya eme ihe ọ̀ ga-abụ “mmerụ nile nke ahụ,” na-ekpughe m nye ụdị nile nke ihe ize ndụ ahụ ike? Ebe Jehova bụ Chineke dị ọcha, ma ọ bụ “dị nsọ,” ọ̀ ga-akwado mụ ịma ụma na-emerụ onwe m n’ụzọ dị otú a?’ (1 Pita 1:15, 16) Rịba ama na Pọl dọkwara aka ná ntị megide ‘imerụ mmụọ mmadụ,’ ma ọ bụ echiche uche. Jụọ onwe gị: ‘Ihe iri ahụ a ọ̀ na-achị echiche m? M̀ ga-eme ihe ọ bụla iji mezuo ọchịchọ m, ikekwe na-etinye ahụ ike m, ezinụlọ m, ma ọ bụ ọbụna nguzo m n’ebe Chineke nọ n’ihe ize ndụ? Ruo ókè ha aṅaa ka m kweworo ka mụ ịbụ onye ụtaba riri ahụ mebie ndụ m?’ Iche ajụjụ ndị a na-enye nsogbu n’obi ihu pụrụ nnọọ inye gị obi ike ịkwụsị ya!
-
-
Ọ Chọtara “Pearl Dị Oké Ọnụ Ahịa”Ụlọ Nche—1997 | Ọgọst 1
-
-
Tupu ha amụta eziokwu ahụ, ezinụlọ Lin akụwo osisi akị betel 1,300 n’ala ha. Ọ bụ ezie na ọ ga-ewe afọ ise ka osisi ndị ahụ wee malite iweta uru, ozugbo ha malitere ịmịpụta mkpụrụ n’ụba, ezinụlọ Lin pụrụ ịtụ anya ịkpata $77,000 kwa afọ. Ka oge owuwe ihe ubi nke mbụ bịaruru nso, ezinụlọ Lin aghaghị ime mkpebi dị mkpa. Ha amụtawo site n’ọmụmụ Bible ha na ndị Kraịst aghaghị ịsachapụ onwe ha “mmerụ nile nke ahụ na nke mmụọ” site n’izere iji, ma ọ bụ ịkwalite, àgwà ndị dị otú ahụ na-adịghị ọcha dị ka ise ụtaba, ịṅụ ọgwụ ọjọọ, na ịta akị osisi betel eme ihe. (2 Ndị Kọrint 7:1) Gịnị ka ha ga-eme?
Ná nrụgide site n’akọ na uche nwere nsogbu, Maazị Lin kpebiri ịkwụsị ọmụmụ ihe ya. Ka ọ dị mgbe ahụ, Oriakụ Lin rere akị osisi betel site n’ụfọdụ osisi ochie ha ma rite uru karịrị $3,000. Nke a bụ nnọọ ndetụ ire nke ihe ga-abịanụ n’oge na-adịghị anya ma ọ bụrụ na ha ahapụ osisi ha. Otú ọ dị, akọ na uche Maazị Lin nọgidere na-eti ya ihe.
Ya na okwu ahụ gbagidere mgba ruo otu ụbọchị ọ rịọrọ Ndịàmà ógbè ahụ ka ha gbutuoro ya osisi akị betel ya. Ndịàmà ahụ kọwara na ọ bụ mkpebi ọ ga-emere onwe ya; n’ihi ya, ọ ghaghị ‘iburu ibu nke aka ya’ ma gbutuo osisi ndị ahụ n’onwe ya. (Ndị Galetia 6:4, 5) Ha gbara ya ume icheta nkwa ahụ dị ná 1 Ndị Kọrint 10:13, nke na-asị: “Ọ dịghị ọnwụnwa ọ bụla nwaworo unu ma ọ bụghị nke mmadụ na-anagide: ma Chineke kwesịrị ntụkwasị obi, Onye na-agaghị ekwe ka a nwaa unu karịa nke unu pụrụ ịnagide; kama n’oge ọnwụnwa ahụ Ọ ga-emekwa ụzọ mgbapụ, ka unu wee nwee ike ịnagide ya.” Ndịàmà ahụ sokwaara ya tụgharịa uche, na-asị: “Ọ bụrụ na anyị egbutuoro gị osisi gị, ị pụrụ ịkwa ụta maka ya ma taa anyị ụta maka mfu ya.” Nwa oge nta mgbe e mesịrị, ụda ígwè e ji egbutu osisi kpọtere Oriakụ Lin n’ụra. Di ya na ụmụ ya na-egbutu osisi akị betel ndị ahụ!
Maazị Lin chọpụtara na Jehova na-emezu nkwa Ya. O nwetara ọrụ nke nyere ya akọ na uche dị ọcha, na-eme ka o nwee ike ịbụ onye na-enye Jehova otuto. E mere ya baptism n’otu mgbakọ sekit nke Ndịàmà Jehova n’April 1996.
-