Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 6/01 p. 1
  • Nọgide ‘Na-eme Ihe Ọma’

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Nọgide ‘Na-eme Ihe Ọma’
  • Ozi Alaeze Anyi—2001
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Adala Mbà n’Ime Ihe Dị Mma
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2005
  • Na-anọ Nzukọ Jehova Nso
    Ndị A Haziri Ime Uche Jehova
  • Soro Chineke Onye Obi Ụtọ Na-enwe Ọṅụ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2001
  • Ịna-enwe Ọṅụ n’Oge Ọnwụnwa
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2021
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ozi Alaeze Anyi—2001
km 6/01 p. 1

Nọgide ‘Na-eme Ihe Ọma’

1 I mere ihe ọma mgbe ị ghọrọ ohu Jehova Chineke. Otú ọ dị, ugbu a, ihe ịma aka dị n’oge ndị a dị oké egwu bụ ịnọgide ‘na-eme ihe ọma.’ (Gal. 6:9) Ọ bụ ezie na nke a na-achọ ezi mgbalị, ị pụrụ ime ya. N’ụzọ dị aṅaa?

2 Zụlite Echiche Uche nke Jisọs: Dị ka Jisọs, ị pụrụ idi ule dị iche iche ma ọ bụrụ na i lekwasị anya n’olileanya Alaeze ahụ. (Hib. 12:2, 3) Nwee obi ike na Jehova hụrụ gị n’anya na ọ chọkwara ka ihe gaara gị nke ọma. (2 Pita 3:9) Tụkwasị ya obi gị nile, na-enwe obi ike na ọ ga-enyere gị aka. (1 Kọr. 10:13) Nọgidesie ike n’ekpere, na-arịọ Jehova ka o nyere gị aka ịtachi obi. (Rom 12:12) Na-aṅụrị ọnụ ná nkwenye ahụ bụ́ na ntachi obi gị ga-eduga n’ịbụ onye a nwapụtara n’anya Chineke. (Rom 5:3-5) Ikwesị ntụkwasị obi gị n’ịzụlite ‘otu ụzọ iche echiche ahụ nke Kraịst Jisọs nwere’ ga-eme ka i nwee afọ ojuju meekwa ka obi Jehova ṅụrịa.—Rom 15:5, NW; Ilu 27:11.

3 Nọgide Na-eme Ihe Ọma: Jiri ndokwa ndị Jehova meere ndị ya iji nyere ha aka ịnọgide na-eme ihe ọma mee ihe n’ụzọ zuru ezu. Nọgide na-enwe usoro onwe onye dị mma nke ịgụ Okwu Chineke na ịmụ mbipụta ndị dabeere na Bible, ndị òtù ohu ahụ kwesịrị ka a tụkwasị ya obi, nke nwekwara uche na-ebipụta. Na-akwadebe, na-aga, na-ekerekwa òkè mgbe nile ná nzukọ nile nke ọgbakọ. Soro ụmụnna gị ndị nwoke na ndị nwanyị n’ụzọ ime mmụọ na-akpachi anya, tupu nakwa mgbe nzukọ ndị Kraịst gbasasịrị. Setịpụ ihe mgbaru ọsọ ndị ezi uche dị na ha maka ozi gị iji na-ekere òkè dị mma n’ozi ubi nakwa iji meziwanye nkà gị nke ikwusara ndị ọzọ ozi ọma ahụ.

4 Nke a bụ otú ị pụrụ isi nọgide na-eme ihe ọma ma na-enweta ọṅụ dị ukwuu n’otu mgbe ahụ. Banyere nke a, otu nwanna nwoke n’Itali kwuru sị: “Mgbe o ruru n’uhuruchi, m wee lọta site n’ozi Jehova n’ụbọchị ahụ, ike na-agwụ m n’eziokwu. Ma obi na-adị m ụtọ, m na-ekelekwa Jehova ekele n’ihi inye m ọṅụ nke ọ na-adịghị onye pụrụ ịnapụ m.” N’ihi ya, nọgide na-eme ihe ọma, gị onwe gị kwa ga-enweta ọṅụ dị ukwuu.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya