Nnwere Onwe nke Chineke Nyere Na-eweta Ọṅụ
“Ọṅụ Jehova bụ ike unu.”—NEHEMAỊA 8:10.
1. Gịnị bụ ọṅụ, gịnịkwa mere ndị ahụ raraworo onwe ha nye Chineke pụrụ iji nweta ya?
JEHOVA na-eji ọṅụ emejupụta obi nke ndị ya. Ọnọdụ nke a nke oké obi ụtọ ma ọ bụ ọṅụ bụ nke nnweta ma ọ bụ olileanya nke ezi ihe na-arụpụta. Ndị mmadụ raara onwe ha nye Chineke pụrụ inweta ụdị mmetụta ahụ n’ihi na ọṅụ bụ mkpụrụ nke mmụọ nsọ ma ọ bụ ike ọrụ ya. (Ndị Galetia 5:22, 23) Ya mere ọbụna ọ bụrụ na ihe ọnwụnwa dị njọ adakwasị anyị, anyị pụrụ inwe ọṅụ dị ka ndị ohu Jehova, ndị mmụọ ya na-edu.
2. N’ihi gịnị ka ndị Juu ji ṅụrịa ọṅụ n’oge pụrụ iche n’ụbọchị Ezra?
2 N’otu oge pụrụ iche na narị afọ nke ise T.O.A., ndị Juu weere nnwere onwe ha nke Chineke nyere mee ihe iji nwee Ememe Ụlọ Ntụ na-eweta ọṅụ na Jerusalem. Mgbe Ezra na ndị Livaị ndị ọzọ gụsịrị ma kọwaara ha Iwu Chineke, “ndị ahụ nile wee jee iri ihe, na ịṅụ ihe ọṅụṅụ, na iziga òkè, na ime ka oké ọṅụ dị, n’ihi na ha ghọtara okwu nile nke e mere ka ha mara.”—Nehemaịa 8:5-12.
Ọṅụ Jehova Bụ Ike Anyị
3. N’ọnọdụ dịgasị aṅaa ka “ọnụ nke Jehova” pụrụ ịbụ ike anyị?
3 N’oge ememe ahụ, ndị Juu matara eziokwu nke okwu ndị ahụ bụ́: “Ọṅụ Jehova bụ ike unu.” (Nehemaịa 8:10) Ọṅụ a bụkwa ike anyị ma ọ bụrụ na anyị na-eguzosi ike maka nnwere onwe nke Chineke nyere dị ka Ndịàmà nke Jehova raraworo onwe ha nye, e mekwara baptism. Ole na ole n’ime anyị enwewo ahụmahụ nke ịbụ ndị mmụọ nsọ tere mmanụ na ndị akpọbatara n’ime ezinụlọ Chineke dị ka ndị ga-eso Kraịst ketakọọ ihe n’eluigwe. (Ndị Rom 8:15-23) Ihe ka n’ọnụ ọgụgụ n’ime anyị taa nwere olileanya nke ndụ n’ime Paradaịs elu ala. (Luk 23:43) Lee ihe ọṅụ nke a ga-abụrụ anyị!
4. N’ihi gịnị ka ndị Kraịst ga-eji na-atachi obi n’ahụhụ na ná mkpagbu?
4 Ọ bụ ezie na anyị nwere olileanya dị ebube, ọ dịghị mfe ịtachi obi n’ịta ahụhụ na mkpagbu. Otú ọ dị, anyị pụrụ ime nke a n’ihi na Chineke na-enye anyị mmụọ nsọ ya. Site na ya anyị na-enwe ọṅụ na nkwenye na ọ dịghị ihe ọ bụla pụrụ ịnapụ anyị olilanya anyị ma ọ bụ ịhụnanya Chineke. Ọzọkwa, anyị pụrụ ijide n’aka na Jehova ga-abụ ike anyị ma ọ bụrụhaala na anyị ji obi anyị nile, mkpụrụ obi anyị, ike, na uche anyị hụ ya n’anya.—Luk 10:27.
5. Olee ebe anyị pụrụ inweta ihe ndị ga-eme anyị ga-eji ṅụrịa ọrụ?
5 Ndị Jehova na-enweta ngọzi dị ukwuu ma nwee ọtụtụ ihe ga-eme ka ha nwee ọṅụ. A kpọtụrụ aha ọtụtụ ihe na-akpata ọṅụ n’akwụkwọ ozi Pọl degaara ndị Galetia. E gosipụtara ndị ọzọ n’ebe ọzọ n’Akwụkwọ nsọ. Ọ ga-akpali mmụọ anyị ịtụle ngọzi ndị dị otú ahụ na-eweta ọṅụ.
Were Nwere Onwe nke Chineke Nyere Dị Ka Ihe Dị Oké Ọnụ Ahịa
6. N’ihi gịnị ka Pọl ji kpọkuo ndị Kraịst nọ na Galetia ka ha guzosie ike?
6 Dị ka ndị Kraịst, anyị nwere ngọzi na-eweta ọṅụ nke inwe ezi nguzo n’ihu Chineke. Ebe Kraịst mere ka ndị na-eso ụzọ ya nwere onwe ha pụọ n’Iwu Mosis, a gbara ndị Galetia ume ka ha guzosie ike ma bụrụ ndị a na-ejighi “yoke nke ohu” tụhịa. Gịnị banyere anyị? Ọ bụrụ na anyị gbalịrị ịbụ ndị a gụrụ dị ka ndị ezi omume site n’idebe Iwu ahụ, a ga-ekewapụ anyị n’ebe Kraịst nọ. Otú ọ dị, n’ịbụ ndị mmụọ Chineke na-enyere aka, anyị na-eche ezi omume ahụ a na-ele anya ya, nke na-apụta site n’okwukwe na-arụ ọrụ site n’ịhụnanya, na-abụghị site n’ibi ugwu nke anụ ahụ ma ọ bụ ọrụ Iwu ndị ọzọ.—Ndị Galetia 5:1-6.
7. Olee otú anyị pụrụ isi lee ijere Jehova ozi dị nsọ anya?
7 Ọ bụ ngọzi iji nnwere onwe nke Chineke nyere anyị mee ihe iji ‘were ọṅụ fee Jehova ofufe.’ (Abụ Ọma 100:2) N’ezie, ọ bụ ihe ùgwù a na-apụghị ịgụkọ agụkọ ijere “Onyenwe anyị Chineke, Onye Pụrụ Ime Ihe Nile” ozi dị nsọ, onye bụ n’ezie “Eze nke mba nile”! (Mkpughe 15:3) Ọ bụrụ na mmetụta ịdị ala adakwasị gị, ọ pụrụ inye aka ịghọta na Chineke adọtawo gị n’ebe ọ nọ site na Jisọs Kraịst ma nye gị òkè ‘n’ọrụ dị nsọ nke ozi ọma Chineke.’ (Ndị Rom 15:16; Jọn 6:44; 14:6) Lee ọtụtụ ihe mere anyị ga-eji nwee ọṅụ na obi ekele nye Chineke!
8. Banyere Babịlọn Ukwu ahụ, ihe dị aṅaa na-akpata ọṅụ ka ndị Chineke nwere?
8 Ihe ọzọ na-eweta ọṅụ bụ nnwere onwe nke Chineke nyere anyị pụọ na Babilọn Ukwu ahụ, alaeze ụwa nke Okpukpe ụgha. (Mkpughe 18:2, 4, 5) Ọ bụ ezie na nwanyị okpukpe nke a na-akwa iko n’ụzọ ihe atụ “na-anọkwasị n’ọtụtụ mmiri,” nke pụtara “ndị dị iche iche, na ìgwè mmadụ, na mba dị iche iche, na asụsụ dị iche iche,” ọ dịghị anọkwasị ma ọ bụ na-enwe mmetụta ma na-achịkwa ndị ohu Jehova n’ụzọ okpukpe. (Mkpughe 17:1, 15) Anyị na-aṅụrị ọṅụ n’ìhè dị ebube nke Chineke, ebe ndị na-akwado Babilọn Ukwu ahụ nọ n’ọchịchịrị ime mmụọ. (1 Pita 2:9) Ee, ọ pụrụ ịbụ ihe siri ike ịghọta ụfọdụ “ihe nile dị omimi nke Chineke.” (1 Ndị Kọrint 2:10) Ma ekpere maka amamihe na enyemaka nke mmụọ nsọ na-enyere anyị aka ịghọta eziokwu Akwụkwọ nsọ nke na-eme ka ndị nwere ya nwere onwe ha n’ụzọ ime mmụọ.—Jọn 8:31, 32; Jemes 1:5-8.
9. Ọ bụrụ na anyị ga-enweta ngọzị nke nnwere onwe na-adịgide adịgide pụọ ná njehie okpukpe, gịnị ka anyị na-aghaghị ime?
9 Anyị na-enweta ngọzi nke nnwere onwe nke dịgịdeworonụ pụọ ná njehie okpukpe, ma iji chebe nnwere onwe ahụ, anyị kwesịrị ịjụ ndapụ n’ezi ofufe. Ndị Galetia anọwo na-agba ọsọ ndị Kraịst n’ụzọ dị mma, ma ụfọdụ ndị na-egbochi ha irubere eziokwu ahụ isi. Nrụgide ọjọọ ahụ arụgidere ha esiteghị na Chineke, ọ bụkwa ihe e kwesịrị iguzogide. Dị ka ihe iko achịcha dị nta na-eko ógbè ụtụ ọka a gwọrọ agwọ dum, ndị ozizi ụgha ma ọ bụ inwe mmasị ná ndị dapụrụ n’ezi ofufe pụrụ ịmerụ ndị nile dị n’ọgbakọ. Ọ bụ ihe gụrụ Pọl agụụ ka ndị na-akpọsa ibi úgwù na-achọ ibibi okwukwe nke ndị Galetia ghara ịbụ nanị ndị e biri úgwú kama ka ha meekwa onwe ha ndị ọnozi. Okwu siri ike n’ezie! Ma anyị aghaghị inwe ụdị nguzosi ike ahụ n’ịjụ ndapụ n’ezi ofufe ma ọ bụrụ na anyị ga-anọgide na-enwe nnwere onwe anyị nke Chineke nyere pụọ ná njehie nke okpukpe.—Ndị Galetia 5:7-12.
Werenụ ịhụnanya Bụrịta Ohu Ibe Unu
10. Gịnị bụ ibu ọrụ anyị dị ka akụkụ nke òtù ụmụnna ndị Kraịst?
10 Nnwere onwe nke Chineke nyere akpọbawo anyị n’ime òtù ụmụnna na-ahụ n’anya, ma anyị aghaghị ime okè anyị iji gosi ịhụnanya. Ndị Galetia agaghị eji nnwere onwe ha eme ihe dị ka ‘ihe anụ ahụ ha ga-eji mee ihe’ ma ọ bụ ihe ngọpụ maka ọchịchọ nke ọdịmma nanị onwe onye nke na-adịghị egosi ịhụnanya. Ha bụ ndị ịhụnanya ga-akpali ịbụrịta ohu ibe ha. (Levitikọs 19:18; Jọn 13:35) Anyị onwe anyịkwa aghaghị izere ikwu okwu azụ na ịkpọ asị nke pụrụ ịpụtara anyị ikpochapụrịta onwe anyị. Otú ọ dị, nke a agaghị eme ma ọ bụrụ na anyị egosi ịhụnanya ụmụnna.—Ndị Galetia 5:13-15.
11. Olee otú anyị pụrụ isi bụrụ ihe ngọzị nye ndị ọzọ, oleekwa otú ha pụrụ isi gọzie anyị?
11 Site n’iji nnwere onwe anyị nke Chineke nyere eme ihe ná nkwekọ nke nduzi nke mmụọ Chineke, anyị ga-egosi ịhụnanya ma bụrụ ngọzi nye ndị ọzọ. O kwesịrị ịbụ omume anyị inye mmụọ nsọ ohere ịchịkwa ma duzie anyị. Mgbe ahụ anyị agaghị abụ ndị zubesiri ike isite n’ụzọ ịhụnanya na-adịghị na ya na-emezu agụụ nke na-agụ anụ ahụ anyị na-emehie emehie bụ nke ‘agụụ na-agụ megide mmụọ nsọ.’ Ọ bụrụ na mmụọ Chineke na-edu anyị, anyị ga-eme ihe n’ụzọ ịhụnanya ma ọ bụghị n’ihi na iwu chọrọ nrube isi ma na-enye ndị na-eme ajọ ihe ntaramahụhụ. Dị ka ihe atụ, ịhụnanya—ọ bụghị nanị na ọ bụ iwu—ga-egbochi anyị ikwutọ ndị ọzọ. (Levitikọs 19:16) Ịhụnanya ga-akpali anyị ikwu okwu na ime omume n’obi ọma. N’ihi na anyị na-egosipụta mkpụrụ mmụọ ahụ bụ́ ịhụnanya, ndị ọzọ ga-agọzi anyị, ma ọ bụ kwuo ihe dị mma banyere anyị. (Ilu 10:6) Ọzọkwa, isoro anyị na-enwe mkpakọrịta ga-abụ ngọzị nye ha.—Ndị Galetia 5:16-18.
Mkpụrụ Na-emegide Ibe Ha
12. Olee ụfọdụ ngọzị a pụrụ inweta site n’izere “ọrụ nile nke anụ ahụ”?
12 Ọtụtụ ngọzị e jikọrọ ha na nnwere onwe Chineke nyere anyị na-apụta site n’izere “ọrụ nile nke anụ ahụ” nke bụ́ ime mmehie. Dị ka ndị Chineke, anyị nile na-ezere ọtụtụ ihe mgbu n’ihi na anyị adịghị etinye aka n’ịkwa iko, adịghị ọcha, na agụụ ịkwa iko. Site n’izere ikpere arụsị anyị na-enwe ọṅụ nke na-apụta site n’ime ihe na-atọ Jehova ụtọ n’ụzọ dị otú ahụ. (1 Jọn 5:21) Ebe ọ bụ na anyị adịghị eme mgbasị, anyị bụ ndị nweere onwe anyị pụọ n’ịnọ n’okpuru nke ndị mmụọ ọjọọ. Adịghị emebi òtù ụmụnna ndị Kraịst anyị site n’ibu iro, esemokwu, ekworo, ọnụma, ịkpa iche iche, nkewa, irọ òtù na ịkpọ asị. Anyị adịghị atụfukwa ọṅụ anyị n’ịṅụbiga mmanya oké na oriri oké mkpọtụ. Pọl dọrọ aka ná nti na ndị ahụ na-arụ ọrụ nile nke anụ ahụ agaghị eketa Alaeze Chineke. Otú ọ dị, n’ihi na anyị na-aṅa okwu ndị a nti, anyị pụrụ ịrapara n’olileanya Alaeze nke na-eweta ọṅụ.—Ndị Galetia 5:19-21.
13. Mkpụrụ dị aṅaa ka mmụọ nsọ Jehova na-amịpụta?
13 Nnwere onwe nke Chineke nyere na-ewetara anyị ọṅụ n’ihi na ndị Kraịst na-egosipụta mkpụrụ nke mmụọ Jehova. Site n’okwu Pọl gwara ndị Galetia, ọ dị mfe ịhụ na ọrụ nile nke anụ ahụ na-eme mmehie dị ka ogwu n’ụzọ dị iche n’ezi mkpụrụ mmụọ ahụ nke ịhụnanya, ọṅụ, udo, ogologo ntachi obi, obiọma, ịdị mma, okwukwe, ịdị nwayọọ, na ijide onwe onye nke a kụnyere n’obi ndị Chineke. N’ime mkpebi siri ike ibi ndụ nke megidere ọchịchọ nile nke anụ ahụ na-emehie emehie, ọ bụ ọchịchọ anyị ịbụ ndị mmụọ Chineke na-edu ma na-ebikwa ndụ site na ya. Mmụọ ahụ na-eme ka anyị dị umeala n’obi ma bụrụ ndị udo, ọ bụghị ndị na-achọ “otuto efu, na-achọrịta ibe anyị okwu, na-akpọrịta ibe anyị asị.” Ọ bụghị ihe iju anya na ọ bụ ihe ọṅụ iso ndị na-egosipụta mkpụrụ nke mmụọ ahụ na-akpakọrịta!—Ndị Galetia 5:22-26.
Ihe Ndị Ọzọ Na-akpata Ọṅụ
14. Ụdị ihe agha dị aṅaa dị anyị mkpa n’ọgụ anyị megide ndị agha mmụọ nke ajọ ihe?
14 Ihe ọzọ e jikọtara ya na nnwere onwe ime mmụọ anyị nke Chineke nyere bụ ngọzị nke nchebe site n’ebe Setan na ndị mmụọ ọjọọ nọ. Iji nwee ihe ịga nke ọma ná mgba anyị na-agbaso ndị agha mmụọ nke ajọ ihe, anyị aghaghị iyikwasị “ihe agha nile nke Chineke.” Ọ dị anyị mkpa inwe ihe nkechi ukwu nke eziokwu na ihe agha na-egbochi obi nke bụ ezi omume. Aghaghị iji ozi ọma nke udo yikwasị ụkwụ anyị. Ihe ọzọ dịkwa anyị mkpa bụ ọta ukwu nke okwukwe, nke a ga-eji emenyụ akụ ụta nile na-enwu ọkụ nke ajọọ onye ahụ. Anyị aghaghị iyiri okpu agha nke nzọpụta ma bulie “mma agha nke mmụọ nsọ,” bụ́ Okwu Chineke. Ka anyị nọrọkwa “na-ekpe ekpere n’oge nile n’ime mmụọ nsọ.” (Ndị Efesọs 6:11-18) Ọ bụrụ na anyị eyikwasị ihe agha ime mmụọ ma jụ ife ndị mmụọ ọjọọ, anyị pụrụ ịbụ ndị na-adịghị atụ egwu ma nweekwa ọṅụ.—Tụlee Ọrụ 19:18-20.
15. Ngọzị ndị dị aṅaa na-eweta ọṅụ ka anyị ga-enweta site n’ime omume kwekọrọ n’Okwu Chineke?
15 Ọṅụ bụ nke anyị n’ihi na omume anyị kwekọrọ n’Okwu Chineke, anyị nwekwaara onwe anyị pụọ n’obi ịma ikpe na-esogbu ndị na-eme ihe ọjọọ. Anyị ‘na-arụgharịkwa ahụ anyị ụka inwe akọ na uche na-adịghị asụ ngọngọ n’ebe Chineke na mmadụ nọ mgbe ọ bụla.’ (Ọrụ 24:16) Ya mere, ọ dịghị anyị mkpa ịtụ egwu mkwụghachị ụgwọ Chineke nke ga-adakwasị ndị na-elezi anya eme mmehie, na-enweghị nchegharị mgbe oge ya ruru. (Matiu 12:22-32; Ndị Hibru 10:26-31) Site n’igbaso ndụmọdụ nke Ilu 3:21-26, anyị ga-aghọta mmezu nke okwu ndị ahụ: “Chebe nzube ihe na ìzùzù; ha ga-abụkwara mkpụrụ obi gi ndụ, bụkwaara olu gị amara. Mgbe ahụ ka ị ga na-eje ije n’ụzọ gị ná ntụkwasi obi, ị gaghị akpọbikwa ụkwụ gị, ọ bụrụ na idinaa ala, ị gaghị atụ oké egwu: ee, ị ga-edina ala, ụra gị ga-atọkwa ụtọ. Atụla egwu site n’oké egwu mberede, ma ọ bụ site n’ikuku siri ike nke ndị na-emebi iwu, mgbe ọ na-abịa: n’ihi na Jehova ga-abụ ntụkwasị obi gị, ọ ga-edebekwa ụkwụ gị ka a ghara ijide ya.”
16. Olee otú ekpere si bụrụ ihe na-akpata ọṅụ, òkè dịkwa aṅaa ka mmụọ Jehova na-ekere na nke a?
16 Ihe ọzọ na-eweta ọṅụ bụ nnwere onwe anyị nke Chineke nyere ịbịakwute Jehova n’ekpere ná nchekwube ịbụ ndị a nụrụ olu ha. Ee, a na-aza ekpere anyị n’ihi na anyị na-eji nsọpụrụ ‘na-atụ egwu Jehova.’ (Ilu 1:7) Ọzọkwa, a na-enyere anyị aka idebe onwe anyị n’ịhụnanya Chineke site “n’ikpekwa ekpere n’ime mmụọ nsọ.” (Jud 20, 21) Anyị na-eme nke a site n’igosipụta ọnọdụ obi nke Jehova na-anabata na site n’ikpe ekpere n’okpuru nchịkwa nke mmụọ ahụ maka ihe ndị kwekọrọ n’ọchịchọ na Okwu ya, bú nke na-ezi anyị otú e si ekpe ekpere na ihe anyị ga-arịọ ya n’ekpere. (1 Jọn 5:13-15) Ọ bụrụ na anyị bụ ndị nọ n’ọnwụnwa dị ilu ma bụrụ ndị na-amaghị ihe anyị ga-ekpe ekpere banyere ya, ‘mmụọ nsọ ga-enyekwara adịghị ike anyị aka: n’ihi na anyị amataghị ihe anyị ga-ekpe n’ekpere dị ka anyị na-aghaghị ikpe.’ Chineke na-aza ụdị ekpere ndị dị otú ahụ. (Ndị Rom 8:26, 27) Ka anyị kpee ekpere maka mmụọ nsọ ma nye ya ohere ịrụpụta n’ime anyị mkpụrụ ya ndị ahụ a chọrọ kpọmkwem iji zute ụfọdụ ọnwụnwa. (Luk 11:13) Anyị ga-amụbawanyekwa ọṅụ anyị ma ọ bụrụ na anyị na-eji ikpe ekpere na ịdị uchu na-amụ Okwu Chineke e ji ike mmụọ nsọ dee na akwụkwọ ndị Kraịst a kwadebere n’okpuru nduzi nke mmụọ ahụ.
Ndị E Ji Enyemaka Na-adị Mgbe Nile Gọzie
17. Olee otú ahụmahụ nke Mosis na nke okwu nke Devid si egosi na Jehova nọnyeere ndị Ya?
17 Site n’iji nnwere onwe anyị nke Chineke nyere eme ihe n’ụzọ ziri ezi, anyị na-enwe ọṅụ nke ịmara na Chineke nọnyeere anyị. Mgbe ọnọdụ ọjọọ mere ka Mosis hapụ Ijipt, site n’okwukwe “ọ nọgidesịrị ike, dị ka ọ na-ahụ Onye ahụ nke a na-apụghị ịhụ ya anya.” (Ndị Hibru 11:27) Mosis ejeghị ije nanị ya; ọ mara na Jehova nọnyere ya. N’otu aka ahụ, ụmụ ndikom Kora bụrụ abụ, sị: “Chineke bụrụ anyị ebe mgbaba na ike, o mewo ka a chọta ya n’inye aka nke ukwuu ná mkpagbu nile. N’ihi nke a anyị agaghị atụ egwu mgbe ụwa na-agbanwe, ma ọ bụ mgbe a na-ewezuga ugwu nile n’ọnọdụ ha gaa n’etiti oké osimiri; mgbe mmiri ya na-agba aghara na-asụkwa ụfụfụ, mgbe ugwu nile na-eme mkpatụ site ná mbili elu ya.” (Abụ Ọma 46:1-3) Ọ bụrụ na i nwere ụdị okwukwe ahụ n’ebe Chineke nọ, ọ gaghị ahapụ gị ma ọlị. Devid kwuru, sị: “N’ihi na nna m na nne m ahapụwo m, ma Jehova ga-ekubata m.” (Abụ Ọma 27:10) Lee ihe ọṅụ ọ bụ ịmara na Chineke na-echebara ndị ohu ya echiche nke ukwu!—1 Pita 5:6, 7.
18. N’ihi gịnị ka ndị ahụ nwere ọṅụ Jehova ji nwee nnwere onwe nke Chineke nyere pụọ ná nchegbu dị ukwuu?
18 N’ịbụ ndị nwere ọṅụ nke Jehova, anyị nwere nnwere onwe nke Chineke nyere pụọ na nchegbu dị ukwuu. “Unu echegbula onwe unu n’ihe ọ bula,” ka Pọl kwuru, “kama n’ihe nile ọ bula site n’ekpere na arịrịọ, ya na ekele, meenụ ka Chineke mara ihe nile unu na-arịọ. Udo nke Chineke, nke kachasị uche nile, ga-echekwa obi unu na echiche uche unu nche n’ime Kraịst Jisọs.” (Ndị Filipaị 4:6, 7) Udo nke Chineke bụ ịda jụụ na-enweghị atụ ọbụna n’ọnọdụ ọnwụnwa dị oké njọ. N’inwe ya obi anyị na-anọgide na-adị jụụ—ihe dị mma nye anyị n’ime mmụọ, ná mmetụta uche, na n’anụ ahụ. (Ilu 14:30) Ọ na-enyekwara anyị aka ịnọgide n’ezi echiche, n’ihi na anyị mara na o nweghị ihe Chineke nyere ohere ka o mee pụrụ inye anyị mmerụ ahụ na-adịgide adịgide. (Matiu 10:28) Udo nke a na-apụta site ná mmekọrịta chiri anya anyị nwere n’ebe Chineke nọ site na Kraịst bụ nke anyị n’ihi na anyị raara onwe anyị nye Jehova ma doo onwe anyị n’okpuru nduzi nke mmụọ ya, bụ́ nke na-arụpụta mkpụrụ ndị ahụ ndị dị ka ọṅụ na udo.
19. Ịtụkwasị obi anyị na gịnị ga-enyere anyị aka inwe ọṅụ?
19 Ịtụkwasị obi anyị ná nnwere onwe anyị nke Chineke nyere na olileanya nke Alaeze ga-enyere anyị aka inwe ọṅụ. Dị ka ihe atụ, mgbe ụfọdụ anyị pụrụ ime ihe dị nta banyere enweghị ahụ ike, ma anyị pụrụ ikpe ekpere maka amamihe na obi ike iji nagide ya, anyị pụkwara ịchọta nkasị obi n’iche echiche banyere ahụ ike ime mmụọ anyị na-eri uru ya ugbu a na ọgwụgwọ ọrịa nke anụ ahụ nke ga-ewere ọnọdụ n’okpuru ọchịchị Alaeze. (Abụ Ọma 41:1-3; Aịsaịa 33:24) Ọ bụ ezie na anyị pụrụ ịdị na-atachi obi n’ụkọ nke ihe e ji ebi ndụ taa, a gaghị enwe ụkọ nke ihe ndị e ji ebi ndụ na Paradaịs elu ala dị nnọọ nso ugbu a. (Abụ Ọma 72:14, 16; Aịsaịa 65:21-23) Ee, Nna anyị nke eluigwe ga-akwado anyị ugbu a ma n’ụzọ kasị mma mee ka ọṅụ anyị bụrụ nke zuru ezu.—Abụ Ọma 145:14-21.
Jiri Nnwere Onwe Chineke Nyere Gị Kpọrọ Ihe
20. Dị ka Abụ Ọma 100:1-5 si kwuo, olee otú anyị kwesịrị isi chee onwe anyị n’ihu Jehova?
20 Dị ka ndị Jehova, o doro anya na anyị kwesịrị ijiri nnwere onwe nke Chineke nyere nke wetawooro anyị ọṅụ na ọtụtụ ngọzị kpọrọ ihe. Ka a sikwa ihe mere Abụ Ọma 100:1-5 ji kpọkuo anyị ịbụ ndị ‘were iti mkpu ọṅụ’ bịa n’ihu Chineke. Jehova nwe anyị ma na-elezi anyị anya dị ka Onye Ọzụzụ atụrụ na-ahụ n’anya. Ee, “anyị bụ ndị ya, na ìgwè atụrụ nke ọzụzụ anụ ya.” Ịbụ Onye Okike ya na àgwà ya ndị dị elu na-akpali anyị iwere otuto na ekele banye n’ogige nile nke ebe ịchụàjà ya. A na-akpali anyị ‘ịgọzị aha ya,’ ikwu ezi ihe banyere Jehova Chineke. Ọzọkwa, anyị pụrụ mgbe nile ịdabere n’obi ebere ịhụnanya ya, ma ọ bụ nchebara echiche ịhụnanya maka anyị. “Ruo ọgbọ nile” Jehova kwesịrị ntụkwasị obi, ọ dịghị esepụ aka n’ịgosi ndị na-eme uche ya ịhụnanya.
21. Ihe ịgba ume dị aṅaa ka e nyere ná mbipụta mbụ nke magazin nke a, gịnịkwa ka anyị kwesịrị ime banyere nnwere onwe nke Chineke nyere?
21 Dị ka ụmụ mmadụ na-ezughị oké, anyị apụghị ugbu a ịlanarị ọnwụnwa nile. Otú ọ dị, site n’enyemaka Chineke, anyị pụrụ ịbụ Ndịàmà nke Jehova nwere obi ike, nweekwa ọṅụ. Ihe kwesịrị ka arịba ya ama banyere nke a bụ okwu ndị a dị ná mbipụta mbụ nke akwụkwọ a (July 1879): “Nwee obi ike . . . nwanna m nwoke ma ọ bụ nwanna nwanyị onye Kraịst, onye ji nzọụkwụ na-adịghị ike na-achọ ịgba ọsọ n’ụzọ ahụ dị warara. Echegbula onwe gị banyere ụzọ ahụ na-adịghị larịị; e mere ya ka ọ dị nsọ site n’ụkwụ ahụ a gọziri agọzi nke Onyenwenụ ahụ. Lee ogwu ọ bụla anya dị ka okooko osisi; oké nkume ọ bụla pịrị ọnụ dị ka nkume e ji atụ ụzọ, na-eme ka ị ruo n’ihe mgbaru ọzọ gị ngwa ngwa. . . . Legide anya gị n’ihe ahụ a na-agbata n’ọsọ.” Ọtụtụ nde ndị na-efe Jehova ugbu a na-elegide anya ha n’ihe ahụ a na-agbata n’ọsọ ma nwee ọtụtụ ihe mere ha ga-eji nwee obi ike na ọṅụ. N’isonyere ha, guzosie ike ná nnwere onwe nke Chineke nyere. Ekwela ka nzube ya funarị gị, ka ọṅụ Jehova nọgidekwa na-abụ ike gị.
Ị Ga-esi Aṅaa Zaa?
◻ Olee otú “ọṅụ Jehova” pụrụ isi bụrụ ike anyị?
◻ Banyere okpukpe, ngọzị ndị dị aṅaa ka nnwere onwe nke Chineke nyere wetawooro ndị Jehova?
◻ N’ihi gịnị ka anyị ga-eji were ịhụnanya bụrịta ohu ibe anyị?
◻ Ụfọdụ ngọzị ndị dị aṅaa ka a na-enweta site ná nnwere onwe nke Chineke nyere?
◻ Olee otú ndị Chineke pụrụ isi nọgịde na-enwe ọṅụ?
[Foto dị na peeji nke 23]
“Lee ogwu anya dị ka okooko osisi; oké nkume ọ bụla pịrị ọnụ dị ka nkume e ji atụ ụzọ, na-eme ka i ruo n’ihe mgbaru ọsọ gị ngwa ngwa”