Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g97 6/8 p. 22-24
  • N’ihi Gịnị Ka Ị Ga-eji Chịkwaa Iwe Gị?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • N’ihi Gịnị Ka Ị Ga-eji Chịkwaa Iwe Gị?
  • Teta!—1997
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Mgbe Ụmụ Mmadụ Na-ezughị Okè Were Iwe
  • Ndị Kraịst Ga-aza Ajụjụ
  • Gịnị Ka Baịbụl Kwuru Gbasara Iwe?
    Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara
  • Ekwela Ka Iwe Mee Ka Ị Sụọ Ngọngọ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1999
  • “Nghọta Mmadụ Nwere Na-eme Ka Ọ Ghara Iwe Iwe Ọsọ Ọsọ”
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2014
Teta!—1997
g97 6/8 p. 22-24

Echiche nke Bible

N’ihi Gịnị Ka Ị Ga-eji Chịkwaa Iwe Gị?

Ọ BỤ mmalite na-egosi na ihe dị njọ ga-eme. “Ugbu a m bụ onye isi n’ụlọ a, ị gaghị emechu m ihu site n’ịdị na-eme ihe n’azụ oge,” ka John ji olu ike gwa nwanyị ọhụrụ ya, bụ́ Ginger.a Ruo ihe karịrị minit 45, o ji olu ike gwa ya okwu ma chọọ n’otu mgbe ahụ ka ọ ghara isi n’oche ya bilie. Okwu ọjọọ ghọrọ ihe a na-ekwukarị n’alụmdi na nwunye ha. N’ụzọ dị mwute, akparamàgwà iwe John rịrị elu. Ọ ga-emechi ụzọ n’ike, tie aka na table kichin, nyaakwa ụgbọala ara ara ka ọ na-esu aka n’ihe e ji anyagharị ụgbọala, si otú ahụ na-etinye ndụ ndị ọzọ n’ihe ize ndụ.

N’ụzọ dị mwute, dị ka obi abụọ na-adịghị ya na ị maara nke ọma, a na-emeghachikarị nnọọ ụdị omume nile ndị ahụ. Iwe nwoke a ò ziri ezi, ka ọ̀ na-ewe iwe ọkụ? Iwe nile hà dịcha njọ? Olee mgbe a na-ewere iwe dị ka nke a na-achịkwaghị achịkwa? Olee mgbe ọ̀ gabigara ókè?

Iwe a chịkwara achịkwa pụrụ izi ezi. Dị ka ihe atụ, iwe Chineke dịrị ọkụ megide obodo Sọdọm na Gọmọra oge ochie rụrụ arụ. (Jenesis 19:24) N’ihi gịnị? N’ihi na ndị bi n’obodo ndị ahụ tinyere aka n’omume ime ihe ike na mmekọahụ rụrụ arụ, dị ka a maara ya nke ọma n’ógbè ahụ nile. Dị ka ihe atụ, mgbe ndị ozi bụ́ ndị mmụọ ozi letara onye ezi omume bụ́ Lọt, ìgwè ụmụ okorobịa na-eme ihe ike tinyere ndị agadi nwara ịgbakọ aka dinaa ndị ọbịa Lọt n’ike. Jehova Chineke were iwe ziri ezi maka ajọ omume ha rụrụ arụ.—Jenesis 18:20; 19:4, 5, 9.

Dị ka Nna ya, nwoke ahụ zuru okè bụ́ Jisọs Kraịst nwere oge o were iwe. Ụlọ nsọ dị na Jerusalem kwesịrịrịị ịbụ ebe nzukọ maka ofufe nye ndị Chineke họpụtara. O kwesịrị ịbụ “ụlọ ekpere,” ebe ndị mmadụ pụrụ iwetara Chineke àjà na onyinye ha na ebe a pụrụ inye ha ntụziaka n’ụzọ ya ma gbaghara ha mmehie ha. N’ụlọ nsọ ahụ ha pụrụ, dị ka a pụrụ ikwu ya, isoro Jehova kparịta. Kama nke ahụ, ndị ndú okpukpe n’ụbọchị Jisọs tụgharịrị ụlọ ukwu ahụ ịbụ “ụlọ ahịa” na “ọgba ndị na-apụnara mmadụ ihe.” (Matiu 21:12, 13; Jọn 2:14-17) Ha ritere uru nke onwe ha site n’ire ụmụ anụmanụ a gaje iji chụọ àjà. N’eziokwu, ha nọ na-erigbu ìgwè atụrụ ahụ. Ya mere, Ọkpara Chineke ziri ezi n’ụzọ zuru okè mgbe ọ chụpụrụ ndị ahụ na-apụnara mmadụ ihe n’ụlọ Nna ya. A ghọtara iwe Jisọs nke ọma!

Mgbe Ụmụ Mmadụ Na-ezughị Okè Were Iwe

Ụmụ mmadụ na-ezughị okè pụkwara n’oge ụfọdụ iwe iwe n’ụzọ kwesịrị ekwesị. Tụlee ihe mere Mosis. A ka napụtasịrị mba Israel n’ụzọ ọrụ ebube site n’Ijipt. Jehova egosipụtawo ike ya n’ụzọ doro anya n’elu chi ụgha nke Ijipt site n’iti ndị Ijipt ihe otiti iri. Mgbe ahụ o mepeere ndị Israel ụzọ ịgbapụ site n’ikewa Osimiri Uhie. Ka nke ahụ gasịrị, e dujere ha n’okpuru Ugwu Saịnaị, bụ́ ebe a haziri ha ịbụ otu mba. N’ịrụ ọrụ dị ka onye ogbugbo, Mosis rịgooro n’ugwu ahụ ịnata iwu Chineke. Tinyere iwu ndị ọzọ nile, Jehova nyere Mosis Iwu Iri, nke “mkpịsị aka Chineke” dere n’elu mbadamba nkume ndị Chineke wapụtara n’onwe ya site n’ugwu ahụ. Otú ọ dị, mgbe Mosis rịdatara, gịnị ka ọ hụrụ? Ndị ahụ atụgharịwo na-efe ihe oyiyi nke nwa ehi ọlaedo! Lee otú ha si chefuo ngwa ngwa! Nanị izu ole na ole gabigaworo. N’ụzọ kwesịrị ekwesị, “iwe Mosis wee dị ọkụ.” Ọ kụpịara mbadamba nkume ndị ahụ, wee bibie ihe oyiyi nwa ehi ahụ.—Ọpụpụ 31:18; 32:16, 19, 20.

N’oge ọzọ mgbe e mesịrị, Mosis were iwe ọkụ mgbe ndị ahụ mere mkpesa banyere ụkọ mmiri. N’iwe, ịdị umeala n’obi, ma ọ bụ ịdị nwayọọ ya na-ede ude funahụrụ ya ruo nwa mgbe. Nke a dujere n’oké ihie ụzọ. Kama ibuli Jehova elu dị ka Onye Nlekọta Israel, Mosis jiri iwe gwa ndị ahụ okwu ma dọrọ uche gaa n’ebe nwanne ya bụ́ Erọn na ya onwe ya nọ. Ya mere, Chineke hụrụ na o kwesịrị ekwesị inye Mosis ahụhụ. A gaghị ekwe ka ọ baa n’ala nkwa ahụ. Mgbe ihe a mere na Meriba gasịrị, e kwughị ọzọ maka Mosis iwe iwe ọkụ. O doro anya na ọ mụtara ihe.—Ọnụ Ọgụgụ 20:1-12; Deuterọnọmi 34:4; Abụ Ọma 106:32, 33.

Ya mere, e nwere ihe dị iche n’etiti Chineke na mmadụ. Jehova pụrụ ime ka ‘iwe ya nọọ ọdụ,’ a kọwakwara ya n’ụzọ kwesịrị ekwesị dị ka onye “na-adịghị ewe iwe ọsọ ọsọ” n’ihi na ịhụnanya, ọ bụghị iwe, bụ àgwà ya bụ isi. Iwe ya na-abụ nke ezi omume mgbe nile, nke ziri ezi mgbe nile, nke a chịkwara achịkwa mgbe nile. (Ọpụpụ 34:6; Aịsaịa 48:9; 1 Jọn 4:8) O kwere nwoke ahụ zuru okè bụ́ Jisọs Kraịst omume ịchịkwa ngosipụta nke iwe ya mgbe nile; a kọwara ya dị ka “Onye nwayọọ.” (Matiu 11:29) N’aka nke ọzọ, ụmụ mmadụ na-ezughị okè, ọbụna ndị ikom okwukwe dị ka Mosis, enwewo ihe isi ike ịchịkwa iwe ha.

Ọzọkwa, ụmụ mmadụ n’ozuzu ha na-ada ada n’ichebara ihe ndị na-esi na ya apụta echiche kwesịrị ekwesị. A pụrụ inwe ụgwọ mmadụ ga-akwụ maka achịkwaghị iwe ya. Dị ka ihe atụ, gịnị bụ ihe ndị pụtara ìhè ga-esi na ya apụta ma ọ bụrụ na di ewesoo nwunye ya iwe ọkụ ruo n’ókè na o ji ọkpọ ya tipuo oghere n’ahụ ájá? E mebiri ihe onwunwe. Ọ pụrụ imerụ ahụ n’aka. Ma karịa nke ahụ, gịnị bụ mmetụta iwe ọkụ ya ga-enwe n’ịhụnanya na nkwanye ùgwù nwunye ya nwere n’ebe ọ nọ? A pụrụ idozi ahụ ájá n’ụbọchị ole na ole, aka ya pụkwara ịla n’izu ole na ole; ma ogologo oge hà aṅaa ka ọ̀ ga-ewe ya inwetaghachi ntụkwasị obi na nkwanye ùgwù nwunye ya?

N’ezie, Bible jupụtara n’ihe atụ nke ndị ikom na-achịkwaghị iwe ha ma taa ahụhụ ihe ndị si na ha pụta. Tụlee nanị ole na ole. A chụpụrụ Ken mgbe o gbusịrị nwanne ya nwoke bụ́ Ebel. A bụrụ Simeọn na Livaị ọnụ site n’aka nna ha maka igbu ndị ikom Shekem. Jehova tiri Ụzaịa ekpenta mgbe Ụzaịa wesosịrị ndị nchụàjà nọ na-agbalị ịgbazi ya olu iwe. Mgbe ‘iwe Jona dị ọkụ,’ Jehova baara ya mba. Ha nile zara ajụjụ maka iwe ha.—Jenesis 4:5, 8-16; 34:25-30; 49:5-7; 2 Ihe Emere 26:19; Jona 4:1-11.

Ndị Kraịst Ga-aza Ajụjụ

N’ụzọ yiri nke ahụ, ndị Kraịst taa aghaghị ịza ajụjụ maka omume ha nye ma Chineke ma, ruo n’ókè ụfọdụ, ndị kwere ekwe ibe ha. A pụrụ ịhụ nke a ngwa ngwa site n’ụzọ Bible si jiri okwu Grik ndị na-egosi iwe iwe mee ihe. Otu n’ime okwu abụọ a kasị jiri mee ihe bụ or·geʹ. A na-asụgharịkarị ya ịbụ “iwe,” o nwetụkwara echiche nke ịmara ụma na ọbụna ịkpachara anya, ọtụtụ mgbe iji bọọ ọ́bọ̀. Ya mere, Pọl gbara ndị Kraịst nọ na Rom ume, sị: “Ndị m hụrụ n’anya, unu abọlara onwe unu ọ́bọ̀, kama chaaranụ iwe [or·geʹ] ahụ ụzọ: n’ihi na e dewo ya n’akwụkwọ nsọ, sị, Mụ nwe ọ́bọ̀; Mụ onwe m ga-enyeghachi, ka Onyenwe anyị kwuru.” Kama ibuwere ụmụnna ha ihe ọjọọ n’obi, a gbara ha ume ‘iwere ezi ihe merie ihe ọjọọ.’—Ndị Rom 12:19, 21.

Okwu nke ọzọ e ji mee ihe ugboro ugboro bụ thy·mosʹ. Ebe okwu ahụ si pụta “na-egosi ná mmalite echiche nke ime mkpatụ dị njọ nke ikuku, mmiri, ala, anụmanụ ma ọ bụ mmadụ.” Ya mere, a kọwara okwu ahụ n’ụzọ dị iche iche dị ka “oké ntiwapụ nke mmetụta ibu iro,” “ntiwapụ nke iwe,” ma ọ bụ “iwe obi ụfụ, ndị na-emebi ịdị jụụ nke uche, na-akpatakwa ọgba aghara na nchegbu nke ebe obibi na nke obodo.” Dị ka mgbọwa ugwu nke pụrụ itiwa n’enyeghị ịdọ aka ná ntị ma gbọpụta ntụ, okwute, na ụrọ ndị dị ọkụ, bụ́ ndị pụrụ imerụ ahụ, ịkwarụ, na igbu egbu, otú ahụ ka nwoke ma ọ bụ nwanyị na-apụghị ịchịkwa iwe ya dị. E jiri ụdị ụbara nke thy·mosʹ mee ihe ná Ndị Galetia 5:20, ebe Pọl depụtakọrọ “ọnụma” na “ọrụ nile nke anụ ahụ” ndị ọzọ ọnụ (amaokwu nke 19), ndị dị ka ịkwa iko, agụ ịkwa iko, na ịṅụbiga mmanya ókè. N’ezie, akparamàgwà John—nke a kọwara ná mmalite—na-egosipụta “ọnụma” nke ọma.

Ya mere, olee otú ọgbakọ ndị Kraịst kwesịrị isi lee ndị nọ n’ime ya anya bụ́ ndị na-ekere òkè n’omume ime ihe ike e meghachiri ugboro ugboro megide onye ọzọ ma ọ bụ ihe onwunwe ya? Iwe a na-achịkwaghị achịkwa na-emebi ihe, ọ na-edujekwa ngwa ngwa n’ime ihe ike. Mgbe ahụ e nwere ezi ihe Jisọs jiri kwuo, sị: “Mụ onwe m sị unu, na onye ọ bụla nke na-ewe iwe megide nwanne ya ga-enye onwe ya n’aka ikpe.” (Matiu 5:21, 22) E nyere ndị bụ di ndụmọdụ, sị: “Hụnụ nwunye unu n’anya, unu enwekwala obi ilu n’ebe ha nọ.” Onye “na-ewe iwe ọsọ ọsọ” erughị eru dị ka onye nlekọta n’ọgbakọ. Ya mere, e kwesịghị ile ndị na-apụghị ịchịkwa iwe ha anya dị ka ihe nlereanya nye ọgbakọ. (Ndị Kọlọsi 3:19; Taịtọs 1:7; 1 Timoti 2:8) N’eziokwu, mgbe a tụlesịrị omume, usoro akparmàgwà, na ọ̀tụ̀tụ̀ nke ihe e mebiworo ná ndụ ndị ọzọ, a pụrụ ịchụpụ onye na-adaba n’ọnụma a na-achịkwaghị achịkwa n’ọgbakọ—ihe dị njọ si na ya pụta n’ezie.

John, onye e kwuru okwu ya ná mmalite, ò mesịrị chịkwaa mmetụta uche ya? Ọ̀ dị mgbe o nwere ike ịkwụsị mmikpu ya dị ngwa, nọ na-akawanye njọ o mikpuru n’ọdachi? Ọ dị mwute ikwu na ịba mba rịrị elu ruo n’ịkwa na inu aka. Ịtụ aka n’ihu dujere n’ịdụ mkpịsị aka nkịtị, nke na-afụ ụfụ, na-echifịa echifịa. John jiri nlezianya mee ihe izere ichifịa akụkụ ndị a na-ahụ ngwa ngwa ma gbalịa izo àgwà ya. Ma, n’ikpeazụ, ọ gafeziri n’ịgba ụkwụ, iti ihe, ịdọ ná ntutu, na ihe ndị ka njọ. Ginger ekewapụwo ugbu a n’ebe John nọ.

Nke a ekwesịghị ime. Ọtụtụ ndị nọ n’ọnọdụ yiri nke ahụ enwewo ike ịbịanyụ iwe ha. Ya mere, lee otú o si dị mkpa iṅomi ihe nlereanya zuru okè nke Jisọs Kraịst. Ọ dịghị mgbe ikpe nke ọbụna otu ntiwapụ nke ọnụma a na-achịkwaghị achịkwa mara ya. Iwe ya bụ mgbe nile nke ezi omume; ọ dịghị mgbe o were iwe ọkụ. N’ụzọ amamihe, Pọl nyere anyị nile ndụmọdụ, sị: “Unu emehiela mgbe unu na-ewe iwe: ekwela anyanwụ daa ná mkpasu iwe unu.” (Ndị Efesọs 4:26) N’iji obi umeala ghọta na anyị nwere adịghị ike dị ka mmadụ nakwa na anyị ga-aghọrọ ihe anyị kụrụ, anyị nwere ezi ihe mere anyị ga-eji chịkwaa iwe.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

a A gbanwewo aha ndị ahụ.

[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 22]

Sọl Anwaa Igbu Devid/The Doré Bible Illustrations/Dover Publications, Inc.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya