Bụrụnụ Ndị E Nwoghara N’uche Na Ndị E Mere Ka Ha Hụ Ìhè N’obi
“Ya mere nke a ka m na-ekwu, kwusiekwa ike n’ime Onyenwe anyị, ka unu ghara ijegharị ọzọ dị ka ndị mba ọzọ na-ejegharịkwa.”—NDỊ EFESỌS 4:17.
1. Gịnị ka uche na obi anyị na-emere anyị?
UCHE na obi bụ abụọ n’ime akụkụ ahụ ndị kasị dị ebube nke ụmụ mmadụ nwere. Ọ bụ ezie na ha na-arụ ọtụtụ ọrụ, nke onye ọ bụla dịkwa iche. Ọdịdị mmadụ, okwu ọnụ, omume, mmetụta uche na ụkpụrụ omume anyị bụcha ndị a na-emetụta n’ụzọ dị omimi site n’ụzọ uche na obi anyị si arụ ọrụ.
2, 3. (a) Olee ụzọ Bible na-esi eji okwu ndị bụ “obi” na “uche” na-eme ihe? (b) N’ihi gịnị ka anyị na-aghaghị iji na-eche echiche banyere obi na uche?
2 N’ime Bible, “obi” na-ezokarị aka ná mkpali, mmetụta uche, na mmetụta ndị dị n’ime, “uche” na-ezokwa aka n’ọgụgụ isi na ike iche echiche. Ma, ha adịghị emegiderịta onwe ha. Dị ka ihe atụ, Mosis gbara ụmụ Israel ume, sị: “Chetakwara obi gị [ntụaka ala ala peji (NW), “ị ghaghị ichetara uche gị”], na Jehova, ya onwe ya bụ Chineke.” (Deuterọnọmi 4:39) Nye ndị odeakwụkwọ ahụ na-eme atụmatụ megide ya, Jisọs sịrị: “Gịnị mere unu na-eche ajọ ihe n’obi unu?”—Matiu 9:4; Mak 2:6, 7.
3 Nke a na-egosi na e jikọtara uche na obi n’ụzọ chiri anya. Ha na-arụkọ ọrụ n’etiti onwe ha, mgbe ụfọdụ na-enye ibe ha ike ịrụ ọrụ dị ka òtù dị n’otu, ma ọtụtụ mgbe na-ebuso ibe ha agha n’ọgụ maka nke ka ibe ya. (Matiu 22:37; tụlee Ndị Rom 7:23.) N’ihi nke a, iji nweta amara Jehova, ọ bụghị nanị na anyị aghaghị ijide n’aka ihe bụ ọnọdụ nke uche na obi anyị kama anyị aghaghịkwa inye ha ọzụzụ ịrụkọ ọrụ n’ịdị n’otu n’etiti onwe ha, inwe nkwekọ n’otu ihe. Anyị aghaghị ịbụ ndị e nwoghara n’uche na ndị e mere ka ha hụ ìhè n’obi.—Abụ Ọma 119:34; Ilu 3:1.
‘Ụzọ Ndị Mba Ọzọ Na-ejegharị’
4. Olee ụzọ Setan siworo metụta uche na obi ndị mmadụ, gịnị si na ya pụta?
4 Setan bụ onye ọkà nke aghụghọ na ntigharị anya. Ọ maara na iji nweta ndị mmadụ, ọ ghaghị ilekwasị anya n’uche na n’obi ha. Kpọmkwem site ná mmalite nke akụkọ ihe mere eme mmadụ, ọ nọwo na-eji ụzọ akọ dị iche iche na-eme ihe iji nweta ihe ọ chọrọ. Dị ka ihe si na nke ahụ pụta, “ụwa dum na-atọgbọkwa n’aka ajọ onye ahụ.” (1 Jọn 5:19) N’ezie, Setan enwewo nnọọ ihe ịga nke ọma n’imetụta obi na uche nke ndị bi n’ụwa nke na Bible na-akọwa ha dị ka “ọgbọ gbagọrọ agbagọ nke na-enwekwa anya uhie.” (Ndị Filipaị 2:15) Pọl onyeozi kọwara nke ọma ihe bụ ọnọdụ obi na uche nke ọgbọ ahụ gbagọrọ agbagọ nke nwere anya uhie, okwu ya bụkwa ihe ịdọ aka ná ntị nye anyị nile n’oge a. Dị ka ihe atụ, biko gụọ Ndị Efesọs 4:17-19, jirikwa ya tụlee okwu Pọl ná Ndị Rom 1:21-24.
5. N’ihi gịni ka Pọl ji degara ndị Efesọs ndụmọdụ dị ike?
5 Anyị pụrụ ịghọta ihe mere Pọl ji degara ndị Kraịst nọ n’Efesọs okwu dị ike otú ahụ mgbe anyị chetara na a maara obodo ahụ nke ọma maka omume ya rụrụ arụ na ofufe arụsị ndị ọgọ mmụọ. Ọ bụ ezie na ndị Grik nwere ndị na-eche oké echiche na ndị ọkà ihe ọmụma ha a ma ama, o yiri ka agụmakwụkwọ ndị Grik ò nyere ọtụtụ n’ime ndị ahụ ikike dị ukwuu karị maka ihe ọjọọ, ọdịnala ha mekwara nnọọ ka ha bụrụ ndị a zụrụ azụ n’ajọ ihe ha. Pọl nwere nchegbu dị omimi banyere ndị Kraịst ibe ya bi na gburugburu ebe dị otú ahụ. Ọ maara na ọtụtụ n’ime ha bụbu ndị mba ọzọ, na ha ‘ejegharịwokwa n’ụzọ oge nke ụwa nke a.’ Ma ugbu a ha anakwerewo eziokwu ahụ. E nwoghawo uche, e mewokwa ka ha hụ ìhè n’obi. Karịsịa ihe nile, Pọl chọrọ ka ha “jegharịa dị ka o kwesịrị ọkpụkpọ nke a kpọrọ” ha.—Ndị Efesọs 2:2; 4:1.
6. N’ihi gịnị ka anyị kwesịrị iji nwee mmasị n’okwu Pọl?
6 Ọnọdụ ahụ yiri nke dị n’oge a. Anyị na-ebikwa n’ime ụwa nke nwere ụkpụrụ omume gbagọrọ agbagọ, ndakpọ omume, na ihe omume okpukpe ụgha. Ọtụtụ n’ime anyị ebiwo ndụ na mbụ n’ụzọ kwekọrọ n’usoro ihe nke ụwa nke a. Ndị ọzọ n’etiti anyị esowo ndị ụwa kpachie anya kwa ụbọchị. Ụfọdụ n’ime anyị na-ebi n’ezinụlọ ebe mmụọ nke ụwa jupụtara. Ya mere, ọ bụ ihe dị mkpa na anyị ghọtara ihe okwu Pọl pụtara ma rite uru site na ndụmọdụ ya.
Uche nke Bụ Ihe Efu na nke Gbara Ọchịchịrị
7. Gịnị ka Pọl bu n’uche site n’okwu ahụ bụ́ ‘ihe efu nke uche ha’?
7 Iji nye nkwado siri ike maka ume ọ gbara ka ndị Kraịst “ghara ijegharị ọzọ dị ka ndị mba ọzọ,” Pọl bu ụzọ hota ‘ihe efu nke uche ha.’ (Ndị Efesọs 4:17) Gịnị ka nke ahụ pụtara? Okwu ahụ a sụgharịrị ‘ihe efu,’ dị ka The Anchor Bible si kwuo, “pụtara ịtọgbọ chakoo, ịnọ nkịtị, ihe na-enweghị isi, ihe nzuzu, enweghị nzube, na nkụda mmụọ.” Otú a, Pọl na-arụtụ aka na oké aha na ịdị ebube nke ụwa ndị Grik na Rom pụrụ iyiworị ihe na-akpali akpali ma ịchụso ha bụ n’ezie ihe nkịtị, ihe nzuzu, na ihe na-enweghị nzube. Ndị tụkwasịrị obi ha n’inwe oké aha na ịdị ebube ga-emesị ghara inweta ihe ọ bụla ma ọ bụghị nkụda mmụọ na nkụda aka. Otu ụkpụrụ ahụ bụ eziokwu banyere ụwa nke oge a.
8. N’ụzọ ndị dị aṅaa ka ihe omume nile nke ụwa si bụrụ ihe efu?
8 Ụwa nwere ndị nwere ọgụgụ isi na ndị nwere oké aha bụ́ ndị ụmụ mmadụ na-ele anya n’aka ha inweta azịza nye ajụjụ ndị ahụ dị omimi dị ka mmalite na nzube nke ndụ nakwa ihe bụ ọdịnihu nke ihe a kpọrọ mmadụ. Ma nghọta na nduzi dị aṅaa ka ha nwere inye? Ozizi ekweghị na Chineke, amaghị Chineke, evolushọn nakwa ọtụtụ echiche na ozizi ndị ọzọ dị mgbagwoju anya ma na-emegiderịta onwe ha bụ́ ndị na-adịghị enye nghọta ọ bụla dịkwa ka ememe okpukpe na nkwenkwe efu nke oge gara aga. Ọtụtụ ihe nchụso ụwa yikwara ka hà na-enye ọ̀tụ̀tụ̀ ụfọdụ nke afọ ojuju na obi ụtọ. Ndị mmadụ na-ekwu okwu banyere ihe ịga nke ọma na ịrụpụta ihe ná nkà mmụta sayensị, aka ọrụ, egwú, egwuregwu, ndọrọ ndọrọ ọchịchị, na ihe ndị ọzọ. Ha na-enwe obi ụtọ n’ebube ha nke na-adị nwa oge. Otú o sina dị, usoro akụkọ ihe mere eme na akwụkwọ ihe ndekọ ihe omume ụmụ mmadụ jupụtara ná ndị dike e chezọworo echezọ. Ihe ndị a nile abụghị ihe ọ bụla e wezụga ịtọgbọ chakoo, ịnọ nkịtị, ihe na-enweghị isi, ihe nzuzu, enweghị nzube, na nkụda mmụọ.
9. Ihe nchụso efu ndị dị aṅaa ka ọtụtụ ndị na-echigharịkwuru?
9 N’ịmata ihe efu nke mgbalị ndị dị otú ahụ, ọtụtụ na-echigharịkwuru nchụso ihe onwunwe—na-akpakọta ego ma na-enweta ihe ndị a pụrụ iji ego zụta—na-emekwa ihe nchụso ndị a ihe mgbaru ọsọ ha ná ndụ. Ha kwetara na obi ụtọ na-abịa site n’akụ na ụba, ihe onwunwe na ịchọ ihe ụtọ. Ọ bụghị nanị na ha na-atụkwasị uche ha na ya, kama ha dị njikere iji ihe nile chụọ àjà—ahụ ike, ezinụlọ, ọbụna akọ na uche. Gịnị na-esi na ya apụta? Kama ịbụ ndị nwere obi ụtọ, ha ‘ewerewo ọtụtụ ihe mgbu dụpuo onwe ha.’ (1 Timoti 6:10) Ọ bụghị ihe ijuanya na Pọl gbara ndị Kraịst ibe ya ume ka ha kwụsị ijegharị dị ka ndị mba ọzọ na-eme n’ihe efu nke usoro iche echiche dị otú ahụ.
10. Olee ụzọ ndị ụwa si nọrọ ‘n’ọchịchịrị nke uche’?
10 Iji gosi na ọ dịghị ihe ọ bụla dị mma ụwa nwere nke a ga-enwere ekworo ma ọ bụ ṅomie, Pọl gara n’ihu ikwu na “e mewo ka ha gbaa ọchịchịrị n’echiche uche ha.” (Ndị Efesọs 4:18) N’ezie, ụwa nwere ndị nwere ọgụgụ isi na ndị maara ihe n’ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ n’ihe omume ọ bụla. Ma, Pọl kwuru na ha nọ n’ọchịchịrị n’echiche uche ha. N’ihi gịnị? Okwu ya abụghị banyere nkà nke echiche uche ha ma ọ bụ ikike ha. Okwu ahụ bụ “uche” pụkwara izo aka n’ebe bụ isi nke nghọta mmadụ, ọnọdụ nke nghọta, mmadụ ime. Ha nọ n’ọchịchịrị n’ihi na ha enweghị ìhè na-eduzi ha ma ọ bụ echiche nke ntụziaka ná mbọ nile ha na-agba. A pụrụ ịhụ nke a site n’echiche ha na-edochaghị anya nke ezi ihe na ihe ọjọọ. Ndị mmadụ pụrụ iche na echiche e nwere n’oge a nke ịghara ikpe mmadụ ikpe, na mmadụ ime ihe sọrọ ya bụ inwe nghọta, ma ọ bụ n’ezie echiche uche gbara ọchịchịrị, dị ka Pọl si kwuo. N’ụzọ ime mmụọ, ha na-awagharị n’ime ọchịchịrị kpam kpam.—Job 12:25; 17:12; Aịsaịa 5:20; 59:6-10; 60:2; tụlee Ndị Efesọs 1:17, 18.
11. Gịnị bụ ihe na-akpata ọchịchịrị nke uche n’ụwa?
11 N’ihi gịnị ka ndị mmadụ pụrụ iji nwee ọgụgụ isi, ọbụna nwee amamihe, n’ọtụtụ ihe ma ka bụrụ ndị nọ n’ọchịchịrị ime mmụọ? Ná 2 Ndị Kọrint 4:4, Pọl nyere anyị azịza ya: “Ndị chi nke oge a mere ka anya nke uche nke ndị na-ekweghị ekwe kpuo ìsì n’etiti ha, ka inye ìhè nke ozi ọma nke ebube Kraịst, onye bụ onyinyo Chineke, wee ghara ịwakwasị ha.” Lee ngọzi dị oké ọnụ ahịa ọ bụ na ndị ahụ nakwewooro ozi ọma ahụ dị ebube aghọwo ndị e nwoghara n’uche na ndị e mere ka hụ ìhè n’obi!
Obi nke Na-amaghị Ihe ma Maa Etili
12. N’ụzọ dị aṅaa ka ụwa si “bụrụ ndị ala ọzọ n’ebe ndụ nke Chineke dị”?
12 Iji nyekwuoro anyị aka ịhụ ihe mere anyị na-aghaghị iji bụrụ ndị e nwoghara n’uche na ndị e mere ka ha hụ ìhè n’obi, Pọl dọọrọ uche anyị gaa n’eziokwu ahụ bụ na ụzọ nke ụwa bụ nke “e mekwara ka ha bụrụ ndị ala ọzọ n’ebe ndụ nke Chineke dị.” (Ndị Efesọs 4:18) Ọ bụghị na ndị mmadụ ekweghịkwa na Chineke ma ọ bụ na ha aghọwo kpam kpam ndị na-adịghị asọpụrụ Chineke. Otu onye na-ede akụkụ pụrụ iche n’akwụkwọ akụkọ kọwara ya n’ụzọ dị otú a: “Kama ịkpọ asọpụrụghị Chineke, ka anyị chepụta okwu ọhụrụ: ịsọpụrụ Chineke nke nta. Ndị na-asọpụrụ Chineke nke nta na-achọ otuto maka ikwere na Chi ahụ, ọ bụ ezie na n’otu oge ahụ ha na-edebe Ya n’ime igbe, na-emeghepụrụ Ya ụzọ nanị n’ụtụtụ Sunday, ha adịghịkwa ekwe ka e webata Ya n’echiche ndọrọ ndọrọ ọchịchị ha nke ụwa ma ọ bụ ná ndụ onwe ha n’ụbọchị ndị ọzọ na-abụghị Sunday. [Ha] kwere na Chineke ruo n’ókè ụfọdụ ma ha adịghị eche na O nwere ọtụtụ ihe ikwu banyere ọha mmadụ n’oge a.” Pọl kọwara ya otú n’akwụkwọ ozi o degaara ndị Rom: “Ọ bụ ezie na ha maara Chineke, ma ha enyeghị ya otuto dị ka Chineke, ha ekeleghịkwa ya.” (Ndị Rom 1:21) Kwa ụbọchị anyị na-ahụ ndị na-ebiri onwe ha ndụ n’echeghị echiche ọ bụla banyere Chineke. N’ezie, ha adịghị enye ya otuto ma ekele.
13. Gịnị bụ “ndụ nke Chineke”?
13 Okwu ahụ bụ́ “ndụ nke Chineke” bụ nke dị mkpa. Ọ gara n’ihu igosi ụzọ ọchịchịrị uche na nke ime mmụọ si na-agbagwoju ụmụ mmadụ anya n’echiche nke ụkpụrụ omume. Okwu Grik ahụ a sụgharịrị “ndụ” n’ebe a abụghị biʹos (bụ́ ebe e si nweta okwu ndị dị ka “ihe ndị dị ndụ,” “akụkọ ndụ”), bụ́ nke pụtara ụzọ ịdị ndụ, ma ọ bụ ụzọ ndụ. Kama nke ahụ, ọ bụ zo·eʹ (bụ́ ebe e si nweta okwu ndị dị ka “ogige anụmanụ,” “ihe ọmụmụ nke ndụ anụmanụ”). Ọ pụtara “ndụ dị ka ụkpụrụ, ndụ n’echiche zuru ezu, ndụ dị ka Chineke si nwee ya. . . . Site ná ndụ nke a mmadụ aghọwo onye ala ọzọ n’ihi ihe si ná Mmehie pụta,” dị ka akwụkwọ Vine’s Expository Dictionary of Old and New Testament Words si kwuo ya. Otú a, Pọl na-agwa anyị na ọ bụghị nanị na ọchịchịrị uche na nke ime mmụọ edugawo ndị ụwa gaa n’omume rụrụ arụ n’anụ ahụ kamakwa o kewapụwo ha site n’olileanya nke ndụ ebighị ebi nke Chineke na-enye. (Ndị Galetia 6:8) N’ihi gịnị ka o ji dị otú ahụ? Pọl gara n’ihu ịgwa anyị ihe ndị kpatara ya.
14. Gịnị bụ otu ihe mere ụwa ji bụrụ ndị ala ọzọ n’ebe ndụ nke Chineke dị?
14 Na nke mbụ, ọ sịrị na ọ bụ “n’ihi amaghị ihe dị n’ime ha.” (Ndị Efesọs 4:18) Ahịrị okwu ahụ bụ́ “dị n’ime ha” na-emesi ike na amaghị ihe ahụ abụghị n’ihi enweghị ohere kama ọ bụ n’ihi ilezi anya jụ ihe ọmụma nke Chineke. Nsụgharị ọzọ nke ahịrị okwu a bụ: “ọjụjụ ha jụrụ n’ime onwe ha ịmara Chineke” (The Anchor Bible); “n’enweghị ihe ọmụma n’ihi na ha emechiwo obi ha n’ebe ọ dị” (Jerusalem Bible). N’ihi na ha na-ajụ, ma ọ bụ mara ụma hapụ, ezi ihe ọmụma Chineke, ha enweghị ihe mgbakwasị ụkwụ ọ bụla maka inweta ụdị ndụ ahụ nke Jehova na-enye ndị nwere okwukwe n’Ọkpara ya, bụ́ onye sịrị: “Nke a bụ ndụ ebighị ebi ahụ, ka ha mara gị, nke nanị gị bụ ezi Chineke, marakwa onye i zitere, bụ́ Jisọs Kraịst.”—Jọn 17:3; 1 Timoti 6:19.
15. Gịnị so na-akpata ụwa nke a ịbụ ndị ala ọzọ n’ebe ndụ nke Chineke dị?
15 Ihe ọzọ mere na ụwa n’ozuzu ya bụ ndị ala ọzọ n’ebe ndụ nke Chineke dị, dị ka Pọl si kwuo, bụ ‘ịma etili nke obi ha.’ (Ndị Efesọs 4:18) ‘Ịma etili’ n’ebe a pụtara n’ụzọ bụ isi ịkpọ nkụ, dị ka à ga-asị na o jupụtara n’ihe gbasiri agbasi. Anyị nile maara otú ihe na-esi agbasi. Akpụkpọ ahụ pụrụ ịdị nro ma na-enwe mmetụta na mbụ, ma ọ bụrụ na a nọgide jiri ya na-arụ ọrụ ike ma ọ bụ na-eme ihe ike, ọ na-akpọ nkụ ma na-esi ike, na-aghọ nke gbasiri agbasi. Ọ dịghịkwa enwe mmetụta nke ihe ụfụ. N’otu aka ahụ, a dịghị amụnye obi kpọrọ nkụ ma ọ bụ nke gbasiri agbasi n’ime mmadụ nke na ha adịghị enwe mmetụta n’ebe Chineke nọ ozugbo a mụrụ ha. Ma n’ihi ibi n’ime ụwa na ịbụ ndị e kpughere nye mmụọ ya, ọ dịghị ewe oge obi ịghọ nke gbasiri agbasi ma ọ bụ nke kpọrọ nkụ ma ọ bụrụ na e chebeghị ya. Nke ahụ mere Pọl ji dọọ aka ná ntị, sị: “Lezienụ anya . . . ka obi onye ọ bụla n’etiti unu ghara ịma etili site n’aghụghọ nke mmehie.” (Ndị Hibru 3:7-13; Abụ Ọma 95:8-10) Ya mere, lee ka o si dị ngwa na anyị nọgidere na-abụ ndị e nwoghara n’uche na ndị e mere ka ha hụ ìhè n’obi!
‘Mmehie Ha Adịghị Ewute Ha’
16. Gịnị si n’ụwa ịnọ n’ọchịchịrị na ịbụ ndị ala ọzọ n’ebe ndụ nke Chineke dị pụta?
16 A chịkọtara ihe si n’ọchịchịrị na nkewapụ dị otú ahụ pụta site n’okwu Pọl gara n’ihu ikwu: “Ebe mmehie ha na-adịghị ewute ha ọzọ, ha raara onwe ha nye n’aka agụụ ịkwa iko, ịrụpụta adịghị ọcha nile n’ime anyaukwu.” (Ndị Efesọs 4:19) Okwu ahụ bụ́ “ebe mmehie ha na-adịghị ewute ha ọzọ” pụtara n’ụzọ nkịtị “ebe ha kwụsịworo inwe ihe mgbu,” bụ́ ihe mgbu nke omume. Otú ahụ ka obi gbasiri agbasi na-esi adị. Mgbe ọ bụla ọ kwụsịrị inwe ihe mgbu nke akọ na uche na echiche nke ime mpịazi n’ihu Chineke, a dịghị enwekwa ihe mgbochi ọ bụla. Otú a, Pọl sịrị na “ha raara onwe ha nye” n’aka agụụ ịkwa iko na adịghị ọcha. Ọ bụ nzọụkwụ nke e leziri anya, mara ụma mee. “Agụụ ịkwa iko,” dị ka e si jiri ya mee ihe na Bible, na-apụta àgwà enweghị ihere, nke ilelị iwu na ịchịisi. N’otu aka ahụ, “adịghị ọcha nile” gụnyere ọ bụghị nanị mmekọahụ ndị rụrụ arụ kamakwa ihe arụ nile e meworo n’aha okpukpe, dị ka ihe omume na ememe nile nke ike ịmụ nwa e mere n’ụlọ nsọ nke chi Artemis dị n’Efesọs, bụ́ nke ndị na-agụ akwụkwọ Pọl maara nke ọma.—Ọrụ 19:27, 35.
17. N’ihi gịnị ka Pọl ji kwuo na ụmụ mmadụ ndị mmehie ha na-adịghị ewute na-eji “anyaukwu” eme mmehie?
17 Dị ka à ga-asị na itinye aka n’ụzọ a na-akpaghịrị ókè n’agụụ ịkwa iko na adịghị ọcha nile adịchaghị njọ, Pọl kwukwara na ndị dị otú ahụ nwere “anyaukwu.” Mgbe ndị ka nwere ọ̀tụ̀tụ̀ ụfọdụ nke inwe mwute mere mmehie, ma ọ dịghị ihe ọzọ ha pụrụ ịkwa arịrị ma gbalịsie ike ka ha ghara ime ya ọzọ. Ma ndị ahụ “mmehie ha na-adịghị ewute” na-eji “anyaukwu” eme mmehie (“ka na-achọkwa ọzọ ha ga-eme,” The Anchor Bible). Otu onye na-ekwu okwu na redio kọwara ya otú a n’otu oge, sị: “Ọ bụrụ na ụra tọọ gị ụtọ n’abalị taa, o ruo n’abalị echi, ị ga-ekwo ya ekwo.” Ha na-eji obi ha nile ebi ndụ rụrụ arụ ruo mgbe ha bamiri n’omume rụrụ arụ—ọ dịghịkwa emetụ ha n’ahụ. Lee aha ngosipụta ziri ezi ọ bụ nke “ihe ndị mba ọzọ na-ezube”!—1 Pita 4:3, 4.
18. Ná nchịkọta, ụdị onyinyo dị aṅaa ka Pọl sere banyere ọnọdụ uche na nke ime mmụọ nke ụwa?
18 Nanị n’amaokwu atọ, Ndị Efesọs 4:17-19, Pọl si otú a kpughee ihe bụ n’ezie ọnọdụ omume na nke ime mmụọ nke ụwa. Ọ rụtụrụ aka na echiche na ozizi nile nke ndị ụwa na-eche oké echiche na-akwalite nakwa nchụso a nọgidere na-achụso akụ na ụba na ihe ụtọ bụ kpam kpam ihe efu. O mere ka o doo anya na n’ihi ọchịchịrị uche na nke ime mmụọ, ụwa nọ n’apịtị nke omume, na-adakpọ mgbe ọ bụla karị. N’ikpeazụ n’ihi amaghị ihe nke ha wetaara onwe ha na uche ịma etili, ụwa aghọwo ndị ala ọzọ kpam kpam pụọ ná ndụ bụ nke Chineke. N’ezie, anyị nwere ezi ihe ndị mere na anyị agaghị anọgide na-ejegharị dị ka ndị mba ọzọ na-ejegharị!
19. Ajụjụ ndị dị aṅaa dị mkpa ka ọ fọdụrụ ka a tụlee?
19 Ebe ọ bụ ọchịchịrị n’uche na obi kpatara ụwa ji bụrụ ndị ala ọzọ n’ebe Jehova Chineke nọ, olee ụzọ anyị pụrụ isi wezụga ọchịchịrị nile n’uche na obi anyị? Ee, gịnị ka anyị kwesịrị ime ka anyị wee nwee ike ịnọgide na-ejegharị dị ka ụmụ nke ìhè ma nọgide na-enwe amara Chineke? A ga-atụle nke a n’isiokwu na-esonụ.
Ị̀ Pụrụ Ịkọwa?
◻ Gịnị kpaliri ndụmọdụ ahụ dị ike Pọl nyere ná Ndị Efesọs 4:17-19?
◻ N’ihi gịnị ka ụzọ nke ụwa ji bụrụ ihe efu na nke nọ n’ọchịchịrị?
◻ Gịnị ka okwu ahụ bụ́ “ndị ala ọzọ n’ebe ndụ nke Chineke dị” pụtara?
◻ Gịnị na-esi n’uche ịgba ọchịchịrị na obi ịma etili apụta?
[Foto ndị dị na peeji nke 9]
A maara Efesọs nke ọma maka ndakpọ omume na ofufe arụsị ya
1. Onye Rom na-alụ ọgụ nkiri n’Efesọs
2. Ebe mkpọmkpọ nke ụlọ nsọ chi Artemis
3. Ebe ihe nkiri dị n’Efesọs
4. Chi Artemis nke Efesọs, chi nwanyị nke ọmụmụ
[Foto dị na peeji nke 10]
Nghọta dị aṅaa ka ndị ụwa nwere oké aha nwere inye?
Nero
[Ebe E Si Nweta Foto]
Musei Capitolini, Roma