Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w93 3/1 p. 13-18
  • “Na-ejegharịnụ Dị Ka Ụmụ Nke Ìhè”

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • “Na-ejegharịnụ Dị Ka Ụmụ Nke Ìhè”
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1993
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Mụta Banyere Kraịst
  • “Tụpụ Mmadụ Ochie”
  • “Mmụọ nke Uche” Dị Ọhụrụ
  • “Yikwasịkwa Mmadụ Ọhụrụ”
  • “Na-ejegharịnụ dị ka Ụmụ nke Ìhè”
  • Yikwasị Mmadụ Ọhụrụ Ahụ
    Ozi Alaeze Anyi—1999
  • “Okwu Chineke Dị Ndụ, Na-arụsikwa Ọrụ Ike”
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
  • “Yikwasị Ihe Agha nke Ìhè”
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1991
  • Eyipụla “Àgwà Ọhụrụ” Mgbe I Mechara Baptizim
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2022
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1993
w93 3/1 p. 13-18

“Na-ejegharịnụ Dị Ka Ụmụ Nke Ìhè”

“Ka unu yikwasịkwa mmadụ ọhụrụ unu, nke e kere dị ka Chineke chọrọ n’ime ezi omume na ịdị ọcha nke eziokwu ahụ.”​—⁠NDỊ EFESỌS 4:24.

1. Gịnị ka e ji gọzie ndị na-efe Jehova? N’ihi gịnị?

JEHOVA CHINEKE bụ “Nna nke ìhè,” “ọ dịghịkwa ọchịchịrị ọ bụla dị n’ime ya.” (Jemes 1:17; 1 Jọn 1:5) Ọkpara ya, bụ́ Jisọs Kraịst, kwuru banyere onwe ya, sị: “Mụ onwe m bụ ìhè nke ụwa: onye na-eso m agaghị ejegharị n’ọchịchịrị, kama ọ ga-enwe ìhè nke ndụ.” (Jọn 8:12) Ya mere, ndị na-efe Jehova ezi ofufe, bụ́ ndị na-eso ụzọ Ọkpara ya, bụ ndị a gọziri site ná nghọta​—⁠nke uche, omume, na ime mmụọ⁠—​ha bụkwa “ndị na-enye ìhè n’ụwa.”​—⁠Ndị Filipaị 2:15.

2. Ọdịiche dị aṅaa nke dị n’etiti ndị Chineke na ndị ụwa ka e buru n’amụma?

2 N’oge dị anya gara aga, e nyere Aịsaịa onye amụma ike mmụọ nsọ ibu amụma banyere ọdịiche nke a: “Lee, ọchịchịrị na-ekpuchi ụwa, oké ọchịchịrị na-ekpuchikwa ndị nile dị iche iche: ma n’ahụ gị ka Jehova ga-awa dị ka anyanwụ, ebube ya ka a ga-ahụkwa n’ahụ gị.” N’ezie, a na-akọwa ihe nile a kpọrọ mmadụ nke kewapụrụ onwe ya n’ebe Chineke nọ dị ka ndị nọ n’okpuru ike na mmetụta nke “ndị onwe ụwa nke ọchịchịrị a.”​—⁠Aịsaịa 60:2; Ndị Efesọs 6:12.

3. N’ihi ihe ndị dị aṅaa ka anyị ji nwee mmasị dị omimi ná ndụmọdụ Pọl nke bịara n’ezi oge?

3 Pọl onyeozi na-enwe nchegbu dị ukwuu ka ndị Kraịst ibe ya nọgide na-ewezụga onwe ha pụọ n’ọchịchịrị dị otú ahụ. Ọ gbara ume ka ha “ghara ijegharị ọzọ dị ka ndị mba ọzọ na-ejegharịkwa” kama ka ha ‘na-ejegharị dị ka ụmụ nke ìhè.’ (Ndị Efesọs 4:17; 5:8) Ọ kọwakwara ụzọ ha pụrụ isi nwee ihe ịga nke ọma n’ime nke a. Taa, ọchịchịrị nke na-ekpuchi mba dị iche iche ejiwo nji karị. Ụwa abamiwo n’ime apịtị nke ndakpọ omume na ihe ime mmụọ. Ndị na-efe Jehova nwere agha na-esiwanye ike ha ga-alụ. Ya mere, anyị na-enwe mmasị dị omimi n’ihe Pọl nwere ikwu.

Mụta Banyere Kraịst

4. Gịnị ka Pọl bu n’uche mgbe ọ sịrị: “Unu amụtaghị Kraịst anyị otú a”?

4 Mgbe ọ kọwasịrị nchụso ihe efu na adịghị ọcha nile nke ụwa, Pọl onyeozi dọọrọ uche ya laghachi azụ n’ebe ndị Kraịst ibe ya n’Efesọs nọ. (Biko gụọ Ndị Efesọs 4:​20, 21.) Pọl etinyewo ihe dị ka afọ atọ n’ime nkwusa na izi ihe n’obodo ahụ, ọ ghaghịkwa ịbụ na ya onwe ya maara ọtụtụ ndị nọ n’ọgbakọ ahụ. (Ọrụ 20:​31-⁠35) Otú a, mgbe ọ sịrị, “Unu onwe unu amụtaghị Kraịst anyị otú a,” ọ na-ekwupụta ihe ọmụma onwe ya na ndị Efesọs bụ́ ndị Kraịst abụghị ndị e ziri ụdị eziokwu nke na-enye ohere ime ihe ọ bụla, nke e weturu ịdị ike ya ala, bụ́ nke na-anabata ụdị ajọ omume nile nke ọ kọwaworo n’amaokwu nke 17 ruo 19. Ọ maara na e ziwo ha ihe nke ọma na n’ụzọ ziri ezi banyere ezi ụzọ ịdị ndụ nke ndị Kraịst dị ka Jisọs Kraịst mere ihe atụ ya. N’ihi nke ahụ, ha adịghị ejegharịkwa ọzọ n’ọchịchịrị dị ka ndị mba jegharịrị, kama ha bụ ụmụ nke ìhè.

5. Gịnị bụ ọdịiche dị n’etiti ịnọ n’eziokwu ahụ na inwe eziokwu ahụ n’ime anyị?

5 Mgbe ahụ, lee ka o si dị mkpa ‘ịmụta Kraịst anyị’ n’ụzọ kwesịrị ekwesị! È nwere ụzọ ndị na-ezighị ezi a pụrụ isi mụta Kraịst ahụ? Ee, n’ezie. Na mbụ, ná Ndị Efesọs 4:14, Pọl adọwo ụmụnna ahụ aka ná ntị, sị: “Ka anyị wee ghara ịbụ ụmụ ọhụrụ ọzọ, ndi ifufe nile ọ bụla nke ozizi na-efegharị na-ebugharịkwa, n’ime ịtụ ntụ nke mmadụ, n’ime aghụghọ, nke ha ji ezupụta nduhie.” Ọ pụtara ìhè na e nwere ụfọdụ ndị mụtara banyere Kraịst ma ha ka na-ejegharị n’ụzọ nke ụwa, ọbụna na-agbalịkwa ịrụgide ndị ọzọ ka ha mee otú ahụ. Nke a ọ̀ ga-egosi anyị ihe ize ndụ nke nanị ịnọ n’eziokwu, dị ka ụfọdụ si eji okwu ahụ eme ihe, ma e jiri ya tụnyere inwe eziokwu ahụ n’ime anyị? N’oge Pọl, ndị ahụ nwere nanị nghọta elu elu bụ ndị ndị ọzọ megharịrị anya n’ụzọ dị mfe nakwa n’ụzọ dị ngwa, otú ahụ ka ọ dịkwa n’oge a. Iji gbochie nke a, Pọl gara n’ihu ikwu na ọ dị ndị Efesọs mkpa ịbụ ndị ‘nụrụ Kraịst na ndị e ziri ihe n’ime Jisọs.’​—⁠Ndị Efesọs 4:21.

6. Olee ụzọ anyị pụrụ isi mụta, nụ, ma bụrụ ndị Kraịst ziri ihe n’oge a?

6 Okwu ndị ahụ bụ ‘ịmụta ihe,’ ‘ịnụ ihe,’ na ‘ịbụ onye e ziri ihe,’ bụ́ ndị Pọl ji mee ihe, pụtachara usoro nke ihe ọmụmụ na ntụziaka, dị ka ọ dị n’ụlọ akwụkwọ. N’ezie, anyị apụghị ịnụ ihe, ịmụta ihe, ma ọ bụ ịbụ ndị Jisọs n’onwe ya ziri ihe kpọmkwem n’oge a. Ma ọ na-eduzi ọrụ nkụzi Bible zuru ụwa ọnụ site n’aka ‘ohu ya kwesịrị ntụkwasị obi, nke nwekwara uche.’ (Matiu 24:45-⁠47; 28:19, 20) Anyị pụrụ ‘ịmụta Kraịst anyị’ nke ọma na n’ụzọ ziri ezi ma ọ bụrụ na anyị anọgide na-eri nri ime mmụọ na-abịa n’oge ya nke òtù ohu ahụ na-ewepụta, na-eji ịdị uchu na-amụ ya ma ọ̀ bụ n’onwe anyị ma ọ bụ n’ọgbakọ, na-atụgharị uche na ya, ma na-etinye ihe ndị anyị na-amụta n’omume. Ka anyị jide n’aka na anyị na-ejizu ndokwa ndị ahụ nile eme ihe ka anyị wee nwee ike ikwu n’ezie na anyị ‘anụwo ya bụrụkwa ndị e ziri ihe n’ime ya.’

7. Ịdị mkpa dị aṅaa ka a pụrụ ịhụ n’okwu Pọl bụ́, “eziokwu dị n’ime Jisọs”?

7 Ọ bụ ihe na-adọrọ mmasị na ná Ndị Efesọs 4:21, mgbe o mesịrị ka usoro ịmụ ihe ahụ pụta ìhè, Pọl kwukwara, sị: “Dị ka eziokwu dị n’ime Jisọs.” Ụfọdụ ndị na-akọwa ihe dị na Bible na-adọrọ uche gaa n’eziokwu ahụ bụ na Pọl ejikebeghị aha ahụ bụ́ Jisọs nanị ya mee ihe n’ihe odide ya nile. N’ezie, nke a bụ nanị otu ugbo e ji ya mee ihe otú ahụ n’akwụkwọ ahụ e degaara ndị Efesọs. È nwere ihe ọ bụla pụrụ iche nke a pụtara? Ma eleghị anya Pọl na-akpọtụ uche gaa n’ihe atụ ahụ Jisọs setịpụrụ dị ka mmadụ. Cheta na ọ dị mgbe Jisọs kwuru banyere onwe ya, sị: “Mụ onwe m bụ ụzọ, na eziokwu, na ndụ.” (Jọn 14:6; Ndị Kọlọsi 2:3) Jisọs sịrị: “Mụ onwe m bụ . . . eziokwu” n’ihi na ọ bụghị nanị na o kwupụtara ma kụzie ya kama o ji ya dịa ndụ ma gosipụta ya n’omume. Ee, ezi Iso Ụzọ Kraịst abụghị nanị echiche kama ụzọ ndụ. ‘Ịmụta Kraịst anyị’ gụnyere ịmụta iṅomi ya n’iji eziokwu ahụ na-adị ndụ. Ị̀ na-eme ka ndụ gị yie ihe nlereanya nke Jisọs? Ị̀ na-agbaso nzọụkwụ ya n’ụzọ chiri anya kwa ụbọchị? Nanị site n’ime otú ahụ ka anyị pụrụ ịnọ na-ejegharị dị ka ụmụ nke ìhè.

“Tụpụ Mmadụ Ochie”

8. Ihe atụ dị aṅaa ka Pọl ji mee ihe ná Ndị Efesọs 4:​22, 24, n’ihi gịnịkwa ka o ji kwesị ekwesị?

8 Iji gosi ụzọ anyị pụrụ isi nwee ihe ịga nke ọma ‘n’ịmụta Kraịst anyị’ na ijegharị dị ka ụmụ nke ìhè, Pọl gara n’ihu ikwu, ná Ndị Efesọs 4:​22-⁠24, na e nwere nzọụkwụ atọ dị iche iche anyị na-aghaghị ịgbaso. Nke mbụ n’ime ndị a bụ: “Ka unu tụpụ mmadụ ochie unu, nke na-emebi emebi n’ụzọ agụụ nke aghụghọ, dị ka ibi obi unu na mbụ si dị.” (Ndị Efesọs 4:22) Okwu ndị ahụ bụ “tụpụ” (“wezụga,” Kingdom Interlinear) na “yikwasị” (amaokwu nke 24) na-akpali n’uche mmadụ onyinyo nke iyipụ na iyinye uwe. Nke a bụ okwu nkọwa ihe atụ nke Pọl ji mee ihe ọtụtụ mgbe, ọ bụkwa nke dị irè. (Ndị Rom 13:​12, 14; Ndị Efesọs 6:​11-⁠17; Ndị Kọlọsi 3:8-⁠12; 1 Ndị Tesalọnaịka 5:8) Mgbe uwe anyị ruru unyi ma ọ bụ mechuo, dị ka n’oge a na-eri nri, anyị na-agbanwe ya n’ohere mbụ ọ bụla anyị nwere. Ọ̀ bụ na anyị ekwesịghị inwe nchegbu dịkwa otú ahụ banyere iru unyi ọ bụla nke ọnọdụ ime mmụọ anyị?

9. N’ụzọ dị aṅaa ka mmadụ si atụpụ mmadụ ochie ahụ?

9 Mgbe ahụ, olee ụzọ mmadụ si atụpụ mmadụ ochie ahụ? Ngwaa ahụ bụ́ “tụpụ” n’asụsụ mbụ bụ ihe a na-akpọ okwu na-adịghị akọwazu ihe. Ọ na-egosi ihe omume e mere nanị otu mgbe ma ọ bụ nke e mere n’ụzọ na-enweghị mmegharị. Nke a na-agwa anyị na “mmadụ ochie” ahụ (“onye ochie,” Kingdom Interlinear), ya na ‘ibi obi anyị na mbụ,’ aghaghị ịbụ ndị a tụpụrụ site n’omume pụtara ìhè na nke e kpebiri nke ọma, n’ụzọ ruru ala nakwa n’ụzọ zuru ezu. Ọ bụghị ihe anyị pụrụ inwe ihe ịga nke ọma na ya ije tụlewe ma ọ bụ ọbụna gbuwe oge na ya. N’ihi gịnị?

10. N’ihi gịnị ka mmadụ na-aghaghị iji mee mkpebi siri ike ịtụpụ mmadụ ochie ahụ?

10 Okwu ahụ bụ́ “na-emebi emebi” na-egosi na “onye ochie” ahụ bụ ụzọ omume rụrụ arụ nke na-aga n’ihu n’ihu ma na-adịgide adịgide, nke na-akawanye njọ. N’eziokwu, n’ihi ịjụ ìhè ime mmụọ, ihe nile a kpọrọ mmadụ anọwo na-abami n’ụzọ ọjọọ. Nke a bụ ihe si “n’ụzọ agụụ nke aghụghọ” pụta, ka Pọl kwuru. Ọchịchọ anụ ahụ dị aghụghọ n’ihi na ha pụrụ iyi ihe na-adịghị emerụ ahụ, ma ha na-eweta mbibi n’ikpeazụ. (Ndị Hibru 3:13) Ọ bụrụ na a hapụ ha, ha ga-arụpụta mmerụ na ọnwụ. (Ndị Rom 6:21; 8:13) Ọ bụ nke ahụ mere a na-aghaghị iji tụpụ mmadụ ochie ahụ, nke e yipụrụ n’ụzọ e kpebisiri ike nakwa n’ụzọ zuru ezu, dị ka e si eyipụ uwe meworo ochie, nke ruru unyi.

“Mmụọ nke Uche” Dị Ọhụrụ

11. Olee ebe mgbanwe ime mmụọ na-aghaghị ịmalite?

11 Onye si n’ime apịtị ụrọ pụta abụghị nanị na o kwesịrị iyipụ uwe ya ndị ruru unyi kamakwa ịsacha onwe ya nke ọma tupu o yinye ihe dị ọhụrụ ma dị ọcha. Nke ahụ bụ kpọmkwem ihe Pọl depụtara dị ka nzọụkwụ nke abụọ gaa n’inwe ìhè ime mmụọ: “Ka e meekwa ka unu dị ọhụrụ [n’ike nke na-akpali, NW] uche unu.” (Ndị Efesọs 4:23) Dị ka ọ rụtụrụ aka na mbụ, n’amaokwu nke 17 na nke 18, ndị mba ọzọ na-ejegharị “n’ihe efu nke uche ha,” nọrọkwa ‘n’ọchịchịrị n’echiche uche ha.’ N’ụzọ ezi uche dị na ya, uche, bụ́ ebe bụ isi nke iche echiche na nghọta, bụ ebe mgbanwe ahụ na-aghaghị ịmalite. Olee ụzọ a pụrụ isi mee nke a? Pọl kọwara na ọ bụ site n’ime ka ikike ahụ nke na-akpali uche anyị dị ọhụrụ. Gịnị ka ikike ahụ bụ?

12. Gịnị bụ ikike ahụ nke na-akpali uche?

12 Ikike ahụ nke na-akpali uche anyị, nke Pọl kpọtụrụ uche na ya, ọ̀ bụ mmụọ nsọ? Ee e. Ahịrị okwu ahụ bụ́ ‘ike nke na-akpali uche unu’ na-agụ n’ụzọ nkịtị “mmụọ nke uche unu.” Ọ dịghị ebe ọ bụla na Bible ebe e kwuru okwu banyere mmụọ nsọ Chineke dị ka nke dị n’ime mmadụ ma ọ bụ nke dị n’akụkụ ahụ mmadụ. Okwu ahụ bụ́ “mmụọ” pụtara n’ụzọ bụ isi “ume,” ma a na-ejikwa ya eme ihe n’ime Bible “iji kọwaa ikike nke na-akpali mmadụ igosipụta àgwà, ọnọdụ uche, ma ọ bụ mmetụta uche ụfọdụ ma ọ bụ iwere omume ma ọ bụ ịgbaso ụzọ ụfọdụ.” (Insight on the Scriptures, Mpịakọta nke 2, peji nke 1026) Ya mere “mmụọ nke uche” bụ ikike ahụ nke na-akwali ma ọ bụ na-akpali uche anyị, nke bụ nzube na ebumnuche nke mmetụta uche anyị.

13. N’ihi gịnị ka a na-aghaghị iji mee ka mkpali uche anyị dị ọhụrụ?

13 Ọchịchọ ebumpụta ụwa na mkpali nke uche na-ezughị okè bụ n’ebe ihe ndị na-agụ anya agụụ, ihe anụ ahụ, na n’ihe onwunwe dị. (Eklisiastis 7:20; 1 Ndị Kọrint 2:14; Ndị Kọlọsi 1:21; 2:18) Ọbụna ma à sị na mmadụ atụpụ mmadụ ochie ahụ na ajọ omume ya nile, ọ bụrụ na a gbanweghị ọnọdụ uche nke na-emehie emehie, n’ikpeazụ ọ ga-arụgide ya ịlaghachi n’ihe ọ gbahapụrụ. Dị ka ihe atụ, nke a ọ́ bụghị ahụmahụ nke ọtụtụ ndị gbalịworo ịkwụsị ise siga, ịṅụbiga mmanya ókè, ma ọ bụ ajọ omume ndị ọzọ? Ọ bụrụ na ha na-emeghị mgbalị ọ bụla ịbụ ndị e mere ka ikike nke na-akpali uche ha dị ọhụrụ, ndaghachi na-afọ ntakịrị ka ọ bụrụ nke a na-apụghị izere. Ezi mgbanwe ọ bụla aghaghị ịgụnye mgbanwe zuru ezu nke uche.​—⁠Ndị Rom 12:2.

14. Olee ụzọ a pụrụ isi mee ka ikike ahụ na-akpali uche dị ọhụrụ?

14 Mgbe ahụ, olee ụzọ mmadụ si eme ka ikike ahụ dị ọhụrụ ka o wee kpalie uche mmadụ iche echiche banyere ihe ziri ezi? Ngwaa ahụ bụ́ ‘ime ka a dị ọhụrụ’ n’ihe odide Grik ahụ dị n’okwu na-egosi ihe na-eme ugbu a, na-akọwa ihe omume na-aga n’ihu n’ihu. Ya mere ọ bụ site n’ịnọgide na-amụ eziokwu nke Okwu Chineke na site n’ịtụgharị uche n’ihe ọ pụtara ka a pụrụ ime ka ikike mkpali ahụ dị ọhụrụ. Ndị ọkà mmụta sayensị na-agwa anyị na n’ime ụbụrụ anyị, ihe ọmụma dị n’ụdị ozi zoro ezo nke na-agbaso ụkpụrụ ike eletrik ma ọ bụ mmiri ọgwụ, na-agagharị site n’otu usoro akwara na-ebu ozi gaa n’usoro akwara ọzọ na-ebu ozi, na-agafe ọtụtụ njikọ a kpọrọ synapses (ụyọkọ nzirịta ozi). “A na-emepụta ụdị ụfọdụ nke ike ncheta n’akwara ụyọkọ nzirịta ozi mgbe ozi ahụ zoro ezo na-agafe, na-ahapụ akara e ji amata ya,” ka akwụkwọ ahụ bụ́ The Brain kwuru. Mgbe otu ozi ahụ na-agafeta ọzọ, mkpụrụ ndụ akwara na-amata ya wee zaghachi ngwa ngwa karị. Ka oge na-aga, nke a na-emepụta usoro ọhụrụ nke iche echiche n’ime onye ahụ. Ka anyị nọgidere na-ewebanye ihe ọmụma ime mmụọ dị mma, a na-ewulite usoro ọhụrụ nke iche echiche, a na-emekwa ka ikike ahụ na-akpali uche anyị dị ọhụrụ.​—⁠Ndị Filipaị 4:8.

“Yikwasịkwa Mmadụ Ọhụrụ”

15. N’echiche dị aṅaa ka mmadụ ọhụrụ ahụ ji bụrụ nke ọhụrụ?

15 N’ikpeazụ, Pọl sịrị: “Ka unu yikwasịkwa mmadụ ọhụrụ unu, nke e kere dị ka Chineke chọrọ n’ime ezi omume na ịdị ọcha nke eziokwu ahụ.” (Ndị Efesọs 4:24) Ee, onye Kraịst na-eyikwasị mmadụ ọhụrụ. “Ọhụrụ” n’ebe a na-ezo aka, ọ bụghị n’oge, kama n’ọdịdị. Ya bụ, ọ dịghị ọhụrụ n’echiche nke ihe kasị gbaa ọhụrụ. Ọ bụ mmadụ ọhụrụ kpam kpam, “nke e kere dị ka Chineke chọrọ.” Ná Ndị Kọlọsi 3:10, Pọl ji otu ụdị asụsụ ahụ mee ihe wee sị na “a na-eme ya ka ọ dị ọhụrụ ruo ná mmazu dị ka onyinyo nke Onye kere ya si dị.” Olee ụzọ mmadụ ọhụrụ nke a si ewere ọnọdụ?

16. N’ihi gịnị ka a pụrụ iji kwuo na mmadụ ọhụrụ ahụ bụ “nke e kere dị ka Chineke chọrọ”?

16 Jehova Chineke kere mmadụ abụọ mbụ ahụ, bụ́ Adam na Iv, n’onyinyo na oyiyi Ya. E nyere ha onyinye nke ọdịdị omume na nke ime mmụọ nke mere ka ha dịrị iche ma karịa anụmanụ ndị e kere eke. (Jenesis 1:​26, 27) Ọ bụ ezie na nnupụisi ha nubanyere ihe nile a kpọrọ mmadụ ná mmehie na ezughị okè, anyị, dị ka ụmụ Adam, ka nwere ikike nke igosipụta ezi ọdịdị omume na nke ime mmụọ. Uche Chineke bụ na ndị ahụ na-egosipụta okwukwe n’àjà mgbapụta ahụ kwesịrị iwezụga mmadụ ochie ahụ ma nweta ‘inwe onwe dị ebube nke ụmụ Chineke.’​—⁠Ndị Rom 6:6; 8:19-⁠21; Ndị Galetia 5:​1, 24.

17. N’ihi gịnị ka ezi omume na ịnọgidesi ike n’ihe ji bụrụ ihe ndị pụrụ iche e ji amata mmadụ ọhụrụ ahụ?

17 Ezi omume na ịnọgidesi ike n’ihe bụ àgwà abụọ nke Pọl kwupụtara dị ka ihe e ji amata mmadụ ọhụrụ ahụ. Nke a gara n’ihu imesi ike na a na-eme mmadụ ọhụrụ ahụ ka ọ dị ọhụrụ n’ụzọ kwekọrọ n’onyinyo nke Onye ahụ kere ya. Abụ Ọma 145:17 na-agwa anyị, sị: “Onye ezi omume ka Jehova bụ n’ụzọ ya nile, ọ dịkwa ebere n’ọrụ ya nile.” Mkpughe 16:5 na-ekwukwa banyere Jehova, sị: “Onye ezi omume ka ị bụ, gị Onye na-adị adị, onye dịkwarịị, Onye dị ọcha n’obi.” N’eziokwu, ezi omume na ịnọgidesi ike n’ihe bụ àgwà ndị dị mkpa ma ọ bụrụ na anyị na-eme ihe kwekọrọ n’ịbụ ndị e kere n’onyinyo Chineke, na-egosipụta ebube ya. Ka anyị dị ka Zekaraịa, bụ́ nna nke Jọn Onye Na-eme Baptism, onye a kpaliri site ná mmụọ nsọ inye Chineke otuto maka ikwere ka ndị Ya “na-ekpere ya n’atụghị egwu, n’obi ọcha na ezi omume n’ihu ya.”​—⁠Luk 1:​74, 75.

“Na-ejegharịnụ dị ka Ụmụ nke Ìhè”

18. Olee ụzọ Pọl siworo nyere anyị aka ịhụ ụzọ nke ụwa dị ka ha dị n’ezie?

18 Ebe anyị tụleworo n’ụzọ zuru ezu okwu Pọl ná Ndị Efesọs 4:​17-⁠24, anyị nwere ọtụtụ ihe anyị ga-eche echiche banyere ha. N’amaokwu nke 17 ruo 19, Pọl na-enyere anyị aka ịhụ ụzọ nke ụwa dị ka ha dị n’ezie. N’ịbụ ndị jụrụ ihe ọmụma Chineke ma kpọọ obi ha nkụ n’ebe ọ nọ, ndị ka nọ n’ụwa ekewapụwo onwe ha n’ebe ezi isi iyi nke ndụ nọ. Dị ka ihe si na ya pụta, n’ihi enweghị ezi nzube na nduzi, mgbalị ha nile na-aghọ ihe nzuzu na ihe efu. Ha na-abami n’ime n’ime nke ndakpọ omume na nke ime mmụọ. Lee aha ọnọdụ dị imere ebere nke ahụ bụ! Lee ihe dị ike ọ bụ nye anyị iji kpebisie ike ịnọgide na-ejegharị dị ka ụmụ nke ìhè!

19. Agbamume ikpeazụ dị aṅaa ka anyị nwere site n’aka Pọl iji nọgide na-ejegharị dị ka ụmụ nke ìhè?

19 Mgbe ahụ, n’amaokwu nke 20 na nke 21, Pọl na-emesi ike mkpa ọ dị ịmụta eziokwu ahụ nke ọma ka anyị wee ghara ịbụ nanị ndị na-enwe mkpakọrịta n’ebe eziokwu ahụ dị kama ndị ji ya adị ndụ dị ka Jisọs mere. N’ikpeazụ, n’amaokwu nke 22 ruo 24, ọ na-agba ume iyipụ mmadụ ochie ahụ ma yikwasị nke ọhụrụ​—⁠n’ụzọ e kpebisiri ike. Ka ọ dị ugbu a, anyị aghaghị ịnọgide na-eme ka ọnọdụ uche anyị na-aga n’akụkụ ihe ime mmụọ, nke dị mma. Karịsịa, anyị aghaghị ilegara Jehova anya maka enyemaka ka anyị nọgidere na-ejegharị dị ka ụmụ nke ìhè. “N’ihi na ọ bụ Chineke, onye sịrị, Ìhè ga-esi n’ime ọchịchịrị nwupụta, bụ́ onye nwubara n’ime obi anyị, iweta inye ìhè nke ọmụma nke ebube nke Chineke n’ihu nke Jisọs Kraịst.”​—⁠2 Ndị Kọrint 4:6.

Ị̀ Na-echeta?

◻ Olee ụzọ anyị pụrụ isi ‘mụta Kraịst anyị’ n’oge a?

◻ N’ihi gịnị ka a na-aghaghị iji tụpụ mmadụ ochie ahụ n’ụzọ e kpebisiri ike?

◻ Gịnị bụ ikike ahụ nke na-akpali uche, oleekwa ụzọ e si eme ka ọ dị ọhụrụ?

◻ Àgwà ndị dị aṅaa na-aka mmadụ ọhụrụ ahụ akara?

[Foto dị na peeji nke 15]

Jisọs sịrị: “Mụ onwe m bụ ụzọ, na eziokwu, na ndụ”

[Foto dị na peeji nke 16]

‘Yipụchasịa mmadụ ochie ahụ ya na omume ya nile’​—⁠ọnụma, iwe, obi ọjọọ, okwu nkwulu, okwu rere ure, na okwu ụgha.—⁠Ndị Kọlọsi 3:​8, 9

[Foto dị na peeji nke 17]

“Yikwasịkwa mmadụ ọhụrụ . . . nke e kere di ka Chineke chọrọ n’ime ezi omume na ịdị ọcha nke eziokwu ahụ.”​—⁠Ndị Efesọs 4:24

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya