Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • wt isi 8 p. 70-78
  • ‘Ịgba Mgba Megide Ìgwè Ndị Mmụọ Ọjọọ’

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • ‘Ịgba Mgba Megide Ìgwè Ndị Mmụọ Ọjọọ’
  • Fee Onye Nanị Ya Bụ Ezi Chineke ahụ Ofufe
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ndị Na-achị Ụwa n’Ebe Ndị Dị n’Eluigwe
  • Atụmatụ Aghụghọ Dị Iche Iche nke Ajọ Onye Ahụ
  • Ndị A Kwadebere Ịbụ Ndị Mmeri
  • Ndị Mmụọ Ọjọọ—Olee Otú Anyị Pụrụ Isi Guzogide Ha?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2007
  • Na-eguzogide Ekwensu na Atụmatụ Aghụghọ Ya
    “Nọrọnụ n’Ịhụnanya Chineke”
  • Ndị Ọchịchị n’Ógbè Ndị Bụ Mmụọ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1995
  • “Nọgidenụ Na-enweta Ike N’ime Onyenwe Anyị”
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2004
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Fee Onye Nanị Ya Bụ Ezi Chineke ahụ Ofufe
wt isi 8 p. 70-78

Isi nke Asatọ

‘Ịgba Mgba Megide Ìgwè Ndị Mmụọ Ọjọọ’

1. Gịnị mere anyị ji nwee mmasị pụrụ iche n’ịmata banyere ọrụ ndị mmụọ ọjọọ?

ỌTỤTỤ ndị na-achị ọchị n’echiche ahụ bụ́ na e nwere ndị mmụọ ọjọọ. Ma ọ bụghị ihe ọchị. Ma ndị mmadụ hà kwere ma ha ekweghị, ndị mmụọ ọjọọ dị, ha na-agbalịkwa ịrụgide onye ọ bụla. A gụpụghị ndị na-efe Jehova ofufe. N’ezie, ọ bụ ha bụ ndị bụ́ isi ha lekwasịrị anya. Pọl onyeozi na-eme ka anyị mara eziokwu ahụ, na-ekwu, sị: “Anyị nwere mgba, ọ bụghị megide ọbara na anụ ahụ́, kama megide ọchịchị [ndị a na-adịghị ahụ anya], megide ikike, megide ndị na-achị ụwa nke ọchịchịrị a, megide ìgwè ndị mmụọ ọjọọ n’ebe ndị dị n’eluigwe.” (Ndị Efesọs 6:12) N’oge anyị, nrụgide nke ìgwè ndị mmụọ ọjọọ na-eweta eruwo n’ọ̀tụ̀tụ̀ ya kasị elu n’ihi na a chụpụwo Setan n’eluigwe, oké iwe jikwa ya, ebe ọ maara na oge o nwere dị mkpụmkpụ.—Mkpughe 12:12.

2. Olee otú ọ ga-esi kwe anyị omume imeri na mgba anyị na-agba megide ndị mmụọ karịrị mmadụ ike?

2 Ọ̀ ga-ekwe omume imeri na mgba a a na-agba megide ndị mmụọ karịrị mmadụ ike? Ee, ma ọ bụ nanị site n’ịdabere kpam kpam n’ebe Jehova nọ. Anyị aghaghị ịdị na-ege ya ntị ma na-erube isi n’Okwu ya. Site n’ime otú ahụ, anyị pụrụ izere ihe ka ukwuu ná mbibi nke anụ ahụ́, nke omume, na nke uche nke ndị Setan na-achịkwa na-enwe.—Jems 4:7.

Ndị Na-achị Ụwa n’Ebe Ndị Dị n’Eluigwe

3. Ole ndị ka Setan na-emegide n’ụzọ kpụ ọkụ n’ọnụ, n’ụzọ dịkwa aṅaa?

3 Jehova na-akọwara anyị n’ụzọ doro anya ihe bụ́ ọnọdụ ụwa dị ka o si na-ahụ ya site n’ebe dịziri adịzi ọ nọ n’eluigwe. O mere ka Jọn onyeozi hụ otu ọhụụ nke a nọ na ya gosi Setan dị ka “dragọn ukwu nke na-acha uhie uhie.” Ọ dị njikere iripịa, ma o kwe mee, Alaeze Mezaịa nke Chineke ozugbo a mụpụtara ya n’eluigwe na 1914. Ebe ọ na-emelighị ya, Setan wetaara ndị na-anọchite anya Alaeze ahụ n’elu ala mmegide kpụ ọkụ n’ọnụ. (Mkpughe 12:3, 4, 13, 17) Olee otú Setan ga-esi buo agha a? Ọ bụ site n’aka ndị nnọchiteanya ya bụ́ mmadụ.

4. Ònye nyere ọchịchị ụmụ mmadụ ikike ha nwere, oleekwa otú anyị si mara?

4 E gosiziri Jọn otu anụ ọhịa nke nwere isi asaa na mpi iri, bụ́ anụ ọhịa nke nwere ikike “n’ebe ebo na ndị na asụsụ na mba ọ bụla dị.” Anụ ọhịa ahụ na-anọchite anya usoro ọchịchị dum nke ụwa. A gwara Jọn na “dragọn ahụ [Setan bụ́ Ekwensu] nyekwara anụ ọhịa ahụ ike ya na ocheeze ya na ikike dị ukwuu.” (Mkpughe 13:1, 2, 7) Ee, ọ bụ Setan nyere ọchịchị ụmụ mmadụ ikike ha nwere. Ya mere, dị ka Pọl onyeozi dere, “ndị na-achị ụwa” n’ezie bụ “ìgwè ndị mmụọ ọjọọ n’ebe ndị dị n’eluigwe,” bụ́ ndị na-eduzi ọchịchị ụmụ mmadụ. Ọ dị ndị nile chọrọ ife Jehova ofufe mkpa ịghọta ihe nke ahụ pụtara n’ụzọ zuru ezu.—Luk 4:5, 6.

5. Na gịnị ka a na-achịkọta ndị ọchịchị ụwa ugbu a?

5 Ọ bụ ezie na ọtụtụ ndị ọchịchị na-ekwu na ha ji okpukpe kpọrọ ihe, ọ dịghị nke ọ bụla n’ime mba ndị ahụ nke na-edo onwe ya n’okpuru ịchịisi Jehova ma ọ bụ n’okpuru ịchịisi Eze ya ọ họpụtara, bụ́ Jizọs Kraịst. Ha nile na-agbasi mbọ ike ijigidesi ọchịchị ha ike. Taa, dị ka ihe e dekọrọ ná Mkpughe na-egosi, “okwu sitere ná mkpali nke ndị mmụọ ọjọọ” na-achịkọta ndị ọchịchị ụwa gaa “n’agha nke oké ụbọchị nke Chineke Onye Pụrụ Ime Ihe Nile” n’Amagedọn.—Mkpughe 16:13, 14, 16; 19:17-19.

6. N’ihi gịnị ka o ji dị mkpa ịkpachara anya iji zere ịbụ onye a ghọgburu ịkwado usoro ihe Setan?

6 Kwa ụbọchị, esemokwu ndọrọ ndọrọ ọchịchị, nke ọha mmadụ, nke akụ̀ na ụba, na nke okpukpe, bụ́ ndị na-etisasị ezinụlọ ụmụ mmadụ, na-enwe mmetụta ná ndụ ndị mmadụ. N’esemokwu ndị a, ndị mmadụ na-akwadokarị—n’okwu ọnụ ma ọ bụ n’omume—mba ha, agbụrụ ha, asụsụ ha, ma ọ bụ ndị ha na ha nọ n’otu ọkwá. Ọbụna mgbe ndị mmadụ na-esoghị kpọmkwem n’otu esemokwu, ha na-adụnyekarịrị otu akụkụ úkwù. Ma n’agbanyeghị onye, ihe ma ọ bụ òtù ha dụnyeere úkwù, ònye n’ezie ka ha na-akwado? Bible na-ekwu hoo haa, sị: “Ụwa dum dị n’ike aka nke ajọ onye ahụ.” (1 Jọn 5:19) Oleezi otú mmadụ ga-esi ezere ịbụ onye e duhiekọtara ya na ihe a kpọrọ mmadụ ndị ọzọ? Ọ bụ nanị site n’ịkwado Alaeze Chineke n’ụzọ zuru ezu na site n’ịnọgide na-anọpụ iche kpam kpam n’esemokwu ụwa.—Jọn 17:15, 16.

Atụmatụ Aghụghọ Dị Iche Iche nke Ajọ Onye Ahụ

7. Olee otú aghụghọ Setan si pụta ìhè n’ụzọ o si jiri okpukpe ụgha mee ihe?

7 N’akụkọ ihe mere eme nile, Setan ejiwo okwu ọnụ na mkpagbu nkịtị mee ka ndị mmadụ si n’ezi ofufe pụọ. O jiwokwa ụzọ ndị dị aghụghọ karị mee ihe—omume na atụmatụ aghụghọ. O jiriwo ụzọ aghụghọ mee ka ọnụ ọgụgụ dị ukwuu nke ihe a kpọrọ mmadụ nọrọ n’ìsì site n’okpukpe ụgha, mee ka ha na-eche na ha na-ejere Chineke ozi. Ebe ha na-enweghị ezi ihe ọmụma banyere Chineke nakwa ịhụnanya maka eziokwu, ihe omume okpukpe ndị metụtara ike karịrị ike mmadụ nakwa ndị nke na-akpali mmetụta uche pụrụ ịdọrọ mmasị ha, ma ọ bụ ha pụrụ inwe mmasị n’ọrụ ndị dị ike. (2 Ndị Tesalonaịka 2:9, 10) Ma a na-adọ anyị aka ná ntị na ọbụna n’etiti ndị sobu na-efe ezi ofufe, ‘ụfọdụ ga-adapụ, na-aṅa ntị n’okwu nduhie ndị sitere ná mkpali nke mmụọ na ozizi ndị mmụọ ọjọọ.’ (1 Timoti 4:1) Olee otú nke ahụ ga-esi kwe omume?

8. Olee otú Setan pụrụ isi raba anyị n’okpukpe ụgha ọ bụrụgodị na anyị na-efe Jehova ofufe?

8 N’ụzọ aghụghọ, Ekwensu na-eji adịghị ike anyị eme ihe. Ànyị ka na-atụ egwu mmadụ? Ọ bụrụ otú ahụ, nrụgide nke sitere n’aka ndị ikwu ma ọ bụ ndị agbata obi anyị pụrụ ime ka anyị kere òkè n’ihe omume ndị malitere n’okpukpe ụgha. Ànyị dị mpako? Ọ bụrụ otú ahụ, anyị pụrụ iwe iwe mgbe e nyere anyị ndụmọdụ ma ọ bụ mgbe ndị ọzọ na-anakwereghị echiche anyị wepụtara. (Ilu 15:10; 29:25; 1 Timoti 6:3, 4) Kama ịgbanwe ụzọ anyị si ele ihe anya ka o kwekọọ n’ihe nlereanya Kraịst, anyị pụrụ ichigharịkwuru ndị ‘na-eme ka ntị na-akọ anyị ọkọ’ site n’ikwu na nanị ịgụ Bible na ime ihe ọma ezuola. (2 Timoti 4:3) Setan achọghị ịma ma ànyị sonyeere òtù okpukpe ọzọ n’ezie ma ànyị nọgidesiri ike na-ekpe ụdị okpukpe nke anyị, ọ bụrụhaala na anyị adịghị efe Jehova n’ụzọ Chineke tụziri site n’Okwu ya na nzukọ ya.

9. Olee ụzọ Setan si eji mmekọahụ emezu nzube ya n’ụzọ aghụghọ?

9 Setan na-ejikwa aghụghọ arabanye ndị mmadụ n’imeju ọchịchọ ndị kwesịrị ekwesị n’ụzọ ndị na-adịghị mma. O mewo nke a n’ihe banyere inwe mmekọahụ. N’ịjụ ụkpụrụ omume ọma nke Bible, ọtụtụ ndị n’ụwa na-ewere mmadụ abụọ na-abụghị di na nwunye inwe mmekọahụ dị ka ihe na-adịghị njọ nke na-enye obi ụtọ ma ọ bụkwanụ ụzọ isi gosipụta na ha etoruola ogo mmadụ. Gịnịkwanụ banyere ndị nwere di ma ọ bụ nwunye? Ọtụtụ na-akwa iko. Ọbụna mgbe di ha ma ọ bụ nwunye ha na-ekwesị ntụkwasị obi nye ha, ọtụtụ ndị na-achọ ịgba alụkwaghịm ma ọ bụ nkewa ka ha wee nwee ike iso onye ọzọ biri. Ebumnobi nke ụzọ aghụghọ Setan ji na-eme ihe bụ ime ka ndị mmadụ na-ebi ndụ nke ịchọ nanị ihe ụtọ ugbu a, na-akpali ha ileghara mmetụta ndị na-adịte aka ọ ga-enwe anya, bụ́ mmetụta ọ ga-enwe ọ bụghị nanị n’ahụ́ ha na n’ahụ́ ndị ọzọ, kama karịsịa, ná mmekọrịta ha na Jehova na Ọkpara ya.—1 Ndị Kọrint 6:9, 10; Ndị Galeshia 6:7, 8.

10. Olee ụzọ Setan na-esi anwa imerụ echiche anyị banyere omume rụrụ arụ na ime ihe ike?

10 Ọchịchọ ọzọ e bu pụta ụwa bụ inwe ntụrụndụ. Mgbe ọ bụ ụdị nke kwesịrị ekwesị, ọ pụrụ ime ka e nwee ume ọhụrụ n’anụ ahụ́, n’uche, na ná mmetụta uche. Ma olee otú anyị si emeghachi omume mgbe Setan ji aghụghọ jiri oge ntụrụndụ na-agbalị iwezụga echiche anyị n’ebe echiche Chineke nọ? Dị ka ihe atụ, anyị maara na Jehova kpọrọ mmekọahụ rụrụ arụ na ime ihe ike asị. Mgbe a na-egosi ha n’ihe nkiri sịnịma, n’ihe omume telivishọn, ma ọ bụ mgbe ndị na-eme ihe nkiri na-egosi ihe ndị ahụ n’ebe a na-eme ihe nkiri, ànyị na-anọrọ nnọọ na-ekiri ha? Burukwa n’uche na Setan ga-ahụ na ihe ndị dị otú ahụ rụwanyere arụ ka oge itinye ya n’abis na-eru nso, ebe “ndị ajọ mmadụ na ndị nduhie ga-anọgide na-ajọwanye njọ, na-eduhie ma bụrụ ndị a na-eduhie.” (2 Timoti 3:13; Mkpughe 20:1-3) Ya mere, ọ dị anyị mkpa ịnọrọ na nche mgbe nile megide atụmatụ nile nke Setan.—Jenesis 6:13; Abụ Ọma 11:5; Ndị Rom 1:24-32.

11. N’ụzọ dịgasị aṅaa ka a pụrụ isi mata ọbụna onye maara ihe bụ́ eziokwu banyere mgbaasị n’ọnyà ma ọ bụrụ na ọ mụghị anya?

11 Anyị makwaara na ndị na-etinye aka n’ụdị mgbaasị ọ bụla—ịjụ ndị mmụọ ase, ịta amoosu, ma ọ bụ ịnwa iso ndị nwụrụ anwụ kwurịta okwu—bụ ihe arụ n’anya Jehova. (Deuterọnọmi 18:10-12) N’iburu nke ahụ n’uche, anyị agaghị eche echiche ịgakwuru ndị na-ajụ ndị mmụọ ihe, n’ezie anyị agaghịkwa ekwe ka ha nọrọ n’ụlọ anyị na-eme ihe ndị mmụọ ọjọọ ha. Ma ànyị ga-ege ha ntị ma ọ bụrụ na ha apụta n’ihu telivishọn anyị ma ọ bụ n’Intanet? Ọ bụ ezie na anyị agaghị agakwuru dibịa afa maka inweta ọgwụgwọ, ànyị pụrụ ikenye eriri n’ogwe aka nke nwa ọhụrụ anyị, na-eche na ọ pụrụ ichebe nwa ahụ n’ụzọ ụfọdụ ka ihe ọjọọ ghara ime ya? Ebe anyị maara na Bible kagburu ịkọ ndị ọzọ ọgwụ, ànyị ga-ekwe ka onye na-eji ọgwụ ejide mmadụ chịkwaa uche anyị?—Ndị Galeshia 5:19-21.

12. (a) Olee otú e si eji egwú eme ka anyị na-eche echiche banyere ihe ndị anyị maara na ha dị njọ? (b) Olee otú uwe mmadụ, otú o si akpa isi, na otú o si ekwu okwu pụrụ isi gosi na ọ na-enwe mmasị n’ebe ndị Jehova kpọrọ ụzọ ha si adị ndụ asị nọ? (ch) Gịnị ka a chọrọ n’aka anyị ma ọ bụrụ na anyị ga-ezere ịbụ ndị e ji atụmatụ aghụghọ Setan nweta?

12 Bible na-ekwu na e kwesịghịdị (n’ebumnobi na-adịghị ọcha) ihota ịkwa iko na ụdị adịghị ọcha ọ bụla ehota n’etiti anyị. (Ndị Efesọs 5:3-5) Gịnịkwanụ ma ọ bụrụ na okwu ndị dị otú ahụ dị n’egwú nwere ụda olu dị ụtọ, ụda na-adọrọ adọrọ, ma ọ bụ ụda na-asụ asụ? Ànyị ga-amalite ịgụghachiwa okwu ndị na-eto inwe mmekọahụ n’alụghị di ma ọ bụ nwunye, iji ọgwụ eme ihe iji kporie ndụ, na omume mmehie ndị ọzọ? Ka ànyị na-achọ ịdị ka ha site n’iṅomi ejiji ha, otú ha si akpa isi, ma ọ bụ ụzọ ha si ekwu okwu, n’agbanyeghị na anyị maara na anyị ekwesịghị iṅomi ụzọ ndụ nke ndị na-emikpu onwe ha n’ihe ndị dị otú ahụ? Lee ka ụzọ ndị Setan na-eji arabanye ndị mmadụ n’ime ihe kwekọrọ n’ụzọ gbagọrọ agbagọ o si eche echiche si dị aghụghọ! (2 Ndị Kọrint 4:3, 4) Iji zere ịbụ onye o ji atụmatụ aghụghọ ya nweta, anyị aghaghị izere isoro ụwa na-aga. Ọ dị anyị mkpa iburu n’uche ndị bụ́ “ndị na-achị ụwa nke ọchịchịrị a,” ma na-agbasi mgba ike ka ha ghara inwe ike n’ebe anyị nọ.—1 Pita 5:8.

Ndị A Kwadebere Ịbụ Ndị Mmeri

13. Olee otú ọ ga-esi kwe onye ọ bụla n’ime anyị omume imeri ụwa nke Setan na-achị n’agbanyeghị ezughị okè anyị?

13 Tupu ya anwụọ, Jizọs gwara ndịozi ya, sị: “Nweenụ obi ike! Emeriwo m ụwa.” (Jọn 16:33) Ha onwe ha pụkwara ịbụ ndị mmeri. Ihe dị ka afọ 60 ka e mesịrị, Jọn onyeozi dere, sị: “Ònye bụ onye ahụ meriworo ụwa ma ọ bụghị onye ahụ nke nwere okwukwe na Jizọs bụ Ọkpara Chineke?” (1 Jọn 5:5) Anyị na-egosipụta okwukwe dị otú ahụ site n’irube isi n’ihe Jizọs nyere n’iwu na n’ịdabere n’Okwu Chineke, ọbụna dị ka Jizọs mere. Gịnị ọzọ ka a chọrọ? Ka anyị soro ọgbakọ ọ bụ Isi ya na-akpachi anya. Mgbe anyị mere mmehie, anyị aghaghị ichegharị site n’obi anyị ma chọọ mgbaghara Chineke na-adabere n’àjà Jizọs. N’ụzọ dị otú a, n’agbanyeghị ezughị okè na ihie ụzọ anyị, anyị onwe anyị kwa pụrụ ịbụ ndị mmeri.—Abụ Ọma 130:3, 4.

14. Gụọ Ndị Efesọs 6:13-17, ma jiri ajụjụ na akụkụ Akwụkwọ Nsọ ndị dị na paragraf a mee ihe dị ka ebe ndabere maka ịtụle uru ndị a na-enweta n’ihe agha ime mmụọ nke ọ bụla.

14 Iji nwee ihe ịga nke ọma, ọ dị anyị mkpa iyikwasị “ekike agha zuru ezu nke sitere na Chineke,” n’elegharaghị nke ọ bụla n’ime ya anya. Biko sapeta n’ime Bible gị, Ndị Efesọs 6:13-17, ma gụọ otú o si kọwaa ihe agha ahụ. Mgbe ahụ site n’ịza ajụjụ ndị dị n’okpuru, chee echiche otú nchebe nke ihe agha nke ọ bụla na-enye pụrụ isi baara gị uru.

‘Ike eziokwu gburugburu n’úkwù’

Ọ bụ ezie na anyị pụrụ ịma eziokwu ahụ, olee otú ịmụchi ihe anya, ịtụgharị uche n’eziokwu nke Bible, na ịga nzukọ si echebe anyị? (1 Ndị Kọrint 10:12, 13; 2 Ndị Kọrint 13:5; Ndị Filipaị 4:8, 9)

“Ihe mgbochi obi bụ́ ezi omume”

Ụkpụrụ ezi omume ònye ka nke a bụ? (Mkpughe 15:3)

Nye ihe atụ nke otú agbasoghị ụzọ ezi omume Jehova si ekpughe mmadụ nye mmerụ ahụ́ ime mmụọ. (Deuterọnọmi 7:3, 4; 1 Samuel 15:22, 23)

“Na-eyirikwa akpụkpọ ụkwụ bụ́ ngwá ọrụ nke ozi ọma nke udo n’ụkwụ”

Olee otú iji ụkwụ anyị na-eme ihe mgbe nile n’iji ya na-aga agwa ndị mmadụ banyere ndokwa Chineke maka udo si bụrụ ihe nchebe nye anyị? (Abụ Ọma 73:2, 3; Ndị Rom 10:15; 1 Timoti 5:13)

“Ọta ukwu bụ́ okwukwe”

Ọ bụrụ na anyị nwere okwukwe siri ike, olee otú anyị ga-esi emeghachi omume ná mgbalị ndị e zubere iji mee ka anyị nwee obi abụọ ma ọ bụ tụọ ụjọ? (2 Ndị Eze 6:15-17; 2 Timoti 1:12)

“Okpu ígwè bụ́ nzọpụta”

Olee otú olileanya nke nzọpụta si enyere mmadụ aka izere ịbụ onye oké nchegbu maka ihe onwunwe matara n’ọnyà? (1 Timoti 6:7-10, 19)

“Mma agha nke mmụọ nsọ”

Na gịnị ka anyị kwesịrị ịdị na-adabere mgbe nile mgbe anyị na-alụso mwakpo a na-awakpo ọnọdụ ime mmụọ anyị ma ọ bụ nke ndị ọzọ ọgụ? (Abụ Ọma 119:98; Ilu 3:5, 6; Matiu 4:3, 4)

Gịnị ọzọ dị oké mkpa iji nwee ihe ịga nke ọma n’ibu agha ime mmụọ? Ugboro ole ka a ga-eji ya na-eme ihe? N’ihi ònye? (Ndị Efesọs 6:18, 19)

15. Olee otú anyị pụrụ isi mee mwakpo n’agha ime mmụọ ahụ?

15 Dị ka ndị agha Kraịst, anyị so n’usuu ndị agha buru ibu, ndị na-alụ agha ime mmụọ. Ọ bụrụ na anyị amụrụ anya ma jiri ihe agha zuru ezu nke sitere n’aka Chineke na-eme ihe nke ọma, anyị agaghị emerụ ahụ́ ma ọ bụ nwụọ n’agha a. Kama nke ahụ, anyị ga-abụ ndị na-ewusi ndị anyị na ha na-ejekọrọ Chineke ozi ike. Anyị ga-adị njikere, nweekwa ịnụ ọkụ n’obi ime mwakpo, na-agbasa ozi ọma banyere Alaeze Mezaịa Chineke, bụ́ ọchịchị eluigwe ahụ nke Setan na-emegide n’ụzọ kpụ ọkụ n’ọnụ.

Ntụleghachi n’Ụdị Nkwurịta Okwu

• N’ihi gịnị ka ndị na-efe Jehova ofufe ji anọpụ iche kpam kpam n’esemokwu ụwa?

• Gịnị bụ ụfọdụ n’ime atụmatụ aghụghọ ndị Setan na-eji eme ihe iji laa Ndị Kraịst n’iyi n’ụzọ ime mmụọ?

• Olee otú ihe agha ime mmụọ nke Chineke na-enye si echebe anyị n’agha ime mmụọ anyị?

[Foto ndị dị na peeji nke 76]

A na-achịkọta mba dị iche iche gaa n’Amagedọn

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya