Na-aṅụrịnụ Ọṅụ n’Ime Jehova!
“Na-aṅụrịnụ ọṅụ n’Onyenwe anyị mgbe nile: m ga-asị ọzọ, Na-aṅụrịnụ ọṅụ.”—NDỊ FILIPAỊ 4:4.
1. N’ihi gịnị ka anyị pụrụ iji na-eche ihe Pọl bu n’uche mgbe o kwuru na ndị Kraịst kwesịrị ịdị na-aṅụrị ọṅụ mgbe nile?
N’OGE ndị a, ihe ndị mere a ga-eji na-aṅụrị ọṅụ pụrụ iyi ihe dị ụkọ nke ukwuu. Ndị mmadụ e ji ájá kpụọ, ọbụna ezi ndị Kraịst, na-ezute ọnọdụ ndị na-akpata iru újú—enweghị ọrụ, ọrịa, ọnwụ nke ndị a hụrụ n’anya, nsogbu nke ọdịdị mmadụ, ma ọ bụ mmegide site n’aka ndị òtù ezinụlọ na-ekweghị ekwe ma ọ bụ ndị bụbu enyi. Ya mere olee otú anyị ga-esi ghọta ndụmọdụ Pọl, “Na-aṅụrịnụ ọṅụ . . . mgbe nile”? N’ihi ọnọdụ ndị na-adịghị mma ma sie ike, ndị anyị nile na-aghaghị ịgbaso mgba, nke a ọ̀ pụrụ ọbụna ikwe omume? Ntụle nke ihe ndị gbara okwu ndị a gburugburu ga-enye aka ime ka okwu a doo anya.
Na-aṅụrịnụ Ọṅụ—N’ihi Gịnị, n’Ụzọ Dịkwa Aṅaa?
2, 3. Gịnị bụ ịdị mkpa nke ọṅụ, dị ka ọnọdụ Jisọs na ụmụ Israel oge ochie mere ihe atụ ya?
2 “Na-aṅụrịnụ ọṅụ n’Onyenwe anyị mgbe nile: m ga-asị ọzọ, Na-aṅụrịnụ ọṅụ.” Nke a pụrụ ichetara anyị okwu ndị a gwara ụmụ Israel ihe dị ka 24 narị afọ gara aga: “Ọṅụ Jehova bụ ike unu,” ma ọ bụ dị ka nsụgharị Moffatt si tinye ya: “Ịṅụrị ọṅụ n’Onye Ebighị Ebi bụ ume unu.” (Nehemaịa 8:10) Ọṅụ na-enye ume, ọ dịkwa ka ebe e wusiri ike nke mmadụ pụrụ ịgbaba maka nkasi obi na nchebe. Ọṅụ bụ ihe nyeere ọbụna nwoke ahụ zuru okè bụ́ Jisọs aka ịtachi obi. “Onye n’ihi ọṅụ e debere n’ihu Ya na-atachi obi [n’osisi ịta ahụhụ ya, NW], na-elelị ihere anya, O wee nọdụ n’aka nri nke ocheeze Chineke.” (Ndị Hibru 12:2) N’ụzọ doro anya, ịbụ onye nwere ike ịṅụrị ọṅụ n’ihu ihe isi ike dị iche iche dị oké mkpa maka nzọpụta.
3 Tupu ha abanye n’Ala Nkwa ahụ, e nyewo ụmụ Israel iwu, sị: “Ị ga-aṅụrịkwa ọṅụ n’ezi ihe nile nke Jehova, bụ́ Chineke gị, nyeworo gị, nyekwa ụlọ gị, gị onwe gị, na onye Livaị, na ọbịa nke nọ n’etiti gị.” Ihe ndị ga-esi n’ịghara iji ọṅụ na-ejere Jehova ozi apụta ga-esi ike. “Ọbụbụ ọnụ nile ndị a ga-abịakwasị gị, chụọkwa gị, wee ruo gị ahụ, ruo mgbe a ga-ekpochapụ gị . . . n’ihi na i feghị Jehova, bụ́ Chineke gị, ofufe n’ọṅụ, na n’obi ụtọ, n’ihi ịba ụba nke ihe nile.”—Deuterọnọmi 26:11; 28:45-47.
4. N’ihi gịnị ka anyị pụrụ iji ghara ịdị na-aṅụrị ọṅụ?
4 Ya mere, ọ dị mkpa na ihe fọdụrụ ahụ e tere mmanụ nke taa na “atụrụ ọzọ” na-esonyere ha na-aṅụrị ọṅụ! (Jọn 10:16) Pọl, site n’inyeghachi ndụmọdụ ya, “m ga-asị ọzọ,” mesiri ike mkpa nke ịṅụrị ọṅụ n’elu ihe ọma nile nke Jehova mewooro anyị. Ànyị na-eme otú ahụ? Ka ànyị na-emikpu onwe anyị n’ihe ndị a na-eme mgbe mgbe ná ndụ a na-adị kwa ụbọchị nke na mgbe ụfọdụ anyị na-echefu ọtụtụ ihe mere anyị ga-eji aṅụrị ọṅụ? Nsogbu ọ̀ na-arị ibe ya elu nke na ha na-ekpuchi ọhụhụ anyị na-ahụ Alaeze ahụ na ngọzi ya nile? Ànyị na-enyere ihe ndị ọzọ ohere—inupụrụ iwu Chineke isi, ileghara ụkpụrụ Chineke anya, ma ọ bụ ilefuru ọrụ ndị Kraịst dị iche iche anya—ka ha napụ anyị ọṅụ anyị?
5. N’ihi gịnị ka ọ na-eji esiri onye na-enweghị ezi uche ike ịṅụrị ọṅụ?
5 “Meenụ ka mmadụ nile mara [“ezi uche,” “NW”] unu. Onyenwe anyị nọ nso.” (Ndị Filipaị 4:5) Onye na-enweghị ezi uche enweghị ezi nguzo. Ọ pụrụ ịhapụ ilekọta ahụ ike ya nke ọma, na-ebokwasị ahụ ya nrụgide ma ọ bụ nchekasị n’ụzọ na-adịghị mkpa. Eleghị anya ọ mụtabeghị ịnakwere ịkpa ókè ya dị iche iche ma bie ndụ kwesịrị ha. Ọ pụrụ isetịpụ ihe mgbaru ọsọ ya ka ọ dị oké elu ma mgbe ahụ gbalịa irute ha n’agbanyeghị ihe ọ ga-efu. Ma ọ bụ ọ pụrụ iji ịkpa ókè ya dị iche iche eme ihe dị ka ihe ngọpụ maka ịkwusịtụ ma ọ bụ imelata aka. N’ihi anọghị n’ezi nguzo na ịbụ onye na-enweghị ezi uche, ọ na-esiri ya ike ịṅụrị ọṅụ.
6. (a) Gịnị ka ndị Kraịst ibe anyị kwesịrị ịhụ n’ime anyị, nanị òle mgbe kwa ka nke a ga-adị otú ahụ? (b) Olee otú okwu Pọl ná 2 Ndị Kọrint 1:24 na Ndị Rom 14:4 si na-enyere anyị aka inwe ezi uche?
6 Ọbụna ọ bụrụ na ndị mmegide elee anyị anya dị ka ndị na-anụbiga ọkụ ókè, ndị Kraịst ibe anyị kwesịrị mgbe nile inwe ike ịhụ ezi uche anyị. Ha ga-emekwa otú ahụ ma ọ bụrụ na anyị anọrọ n’ezi nguzo, gharakwa ịtụ anya izu okè n’aka anyị onwe anyị ma ọ bụ n’aka ndị ọzọ. Nke ka nke, anyị aghaghị ịhapụ ibokwasị ndị ọzọ ibu arọ ndị gafere ihe Okwu Chineke chọrọ. Pọl onyeozi kwuru, sị: “Ọ bụghị na anyị bụ ndị nwe okwukwe unu, kama anyị bụ ndị soro unu na-arụta ọṅụ unu.” (2 Ndị Kọrint 1:24) Dị ka onye bụbu onye Farisii, Pọl maara nke ọma na ụkpụrụ iwu ndị siri ike nke ndị nọ n’ike ọchịchị mere ma na-amanye ndị mmadụ ka ha gbasoo na-egbu ọṅụ, ebe aro ndị na-enye aka ndị ndị ọrụ ibe anyị na-atụ na-amụba ya. Eziokwu ahụ nke bụ na “Onyenwe anyị nọ nso” kwesịrị ichetara onye nwere ezi uche na anyị abụghị ndị ‘na-ekpe onye na-ejere onye ọzọ ozi ikpe. Ọ bụ n’ebe onyenwe ya onwe ya nọ ka ọ na-eguzo ma ọ bụ na-ada.’—Ndị Rom 14:4.
7, 8. N’ihi gịnị ka ndị Kraịst na-aghaghị iji tụọ anya inweta nsogbu dị iche iche, ma olee ụzọ ọ ga-esi kwe ha omume ịnọgide na-aṅụrị ọṅụ?
7 “Unu echegbula onwe unu n’ihe ọ bụla; kama n’ihe nile ọ bụla site n’ekpere na arịrịọ, ya na ekele, meenụ ka Chineke mara ihe nile unu na-arịọ.” (Ndị Filipaị 4:6) Anyị na-enwe ahụmahụ nke “oge dị oké egwu” nke Pọl dere banyere ya taa. (2 Timoti 3:1-5) Ya mere ndị Kraịst aghaghị ịtụ anya iche nsogbu dị iche iche ihu. Okwu Pọl bụ́ “na-aṅụrịnụ ọṅụ . . . mgbe nile” agụpụghị na e nwere ike onye Kraịst na-eguzosi ike n’ihe pụrụ inweta ihe otiti nke enweghị olileanya ma ọ bụ nkụda obi site n’oge ruo n’oge. N’ọnọdụ Pọl, o kwetara n’izi ezi, sị: “A na-akpagbu anyị n’akụkụ nile, ma a dịghị akpagbubiga anyị ókè; anyị nwere obi abụọ, ma anyị adịghị enwebiga obi abụọ ókè; a na-esogbu anyị, ma a dịghị ahapụ nanị anyị; a na-atụda anyị n’ala, ma a dịghị ala anyị n’iyi.” (2 Ndị Kọrint 4:8, 9) Otú ọ dị, ọṅụ onye Kraịst na-emelata ma mesịa merie oge nchegbu na iru újú na-adị nwa oge. Ọ na-enye ume dị mkpa iji nọgide na-aga n’ihu, n’echefughị mgbe ọ bụla ọtụtụ ihe mere a ga-eji na-aṅụrị ọṅụ.
8 Mgbe nsogbu dị iche iche bilitere, ihe ọ masịrị ha bụrụ, onye Kraịst nwere ọṅụ na-eji obi umeala rịọ maka enyemaka Jehova site n’ekpere. Ọ naghị adaba n’oké nchegbu. Mgbe o mesịrị ihe ezi uche dị na ya ọ pụrụ ime n’onwe ya iji gwọta nsogbu ahụ, ọ na-ahapụ ihe ọ ga-apụta n’aka Jehova n’ikwekọ n’ịkpọ òkù ahụ bụ́: “Tụkwasị Jehova ihe O nyeworo gị dị ka ibu, Ya onwe ya ga-anagịdekwa gị.” Mgbe a na-eme nke ahụ, onye Kraịst ahụ na-anọgide na-ekele Jehova maka ịdị mma Ya nile.—Abụ Ọma 55:22; leekwa Matiu 6:25-34.
9. Olee otú ihe ọmụma nke eziokwu ahụ na-esi enye udo nke uche, mmetụta ọma dịkwa aṅaa ka nke a na-enwe n’ahụ onye Kraịst?
9 “Udo nke Chineke, nke kachasị uche nile, ga-echekwa obi unu na echiche uche unu nche n’ime Kraịst Jisọs.” (Ndị Filipaị 4:7) Ihe ọmụma nke eziokwu Bible na-ewepụsị ụgha n’uche onye Kraịst ma na-enyere ya aka ịzụlite ụzọ iche echiche ziri ezi. (2 Timoti 1:13) Otú a, a na-enyere ya aka izere àgwà ọjọọ ma ọ bụ nke amamihe na-adịghị na ya nke pụrụ imebi mmekọrịta udo ọ na-enwe n’ebe ndị ọzọ nọ. Kama ịbụ onye ikpe na-ezighị ezi na ajọ omume ga-eme ka ọ daa mbà, ọ na-atụkwasị obi ya na Jehova ịgwọta nsogbu nke ihe a kpọrọ mmadụ site n’Alaeze ahụ. Ụdị udo nke uche ahụ na-echebe obi ya, na-eme ebumnobi ya ka ọ dị ọcha, ma na-eduzi echiche ya n’ụzọ nke ezi omume. Ebumnobi dị ọcha na ezi echiche, n’otú aka ahụ, na-enye ọtụtụ ihe mere a ga-eji na-aṅụrị ọṅụ, n’agbanyeghị nsogbu na nrụgide dị iche iche nke ụwa ọgba aghara wetara.
10. A pụrụ inwe ezi ọṅụ site nanị n’ikwu ma ọ bụ n’iche banyere gịnị?
10 “Nke fọdụrụ, ụmụnna m, ka ihe bụ eziokwu hà, ka ha hà, bụ́ ihe kwesịrị nsọpụrụ, ka ha hà, bụ́ ihe ziri ezi, ka ha hà, bụ́ ihe dị ọcha, ka ha hà, bụ́ ihe kwesịrị ịhụnanya, ka ha hà, bụ́ ihe e kwuru nke ọma; ọ bụrụ na ịdị mma ọ bụla dị, ọ bụrụkwa na otuto ọ bụla dị, na-agụkọnụ ihe ndị a.” (Ndị Filipaị 4:8) Onye Kraịst adịghị enwe mmasị n’ikwu ma ọ bụ iche echiche banyere ihe ndị dị njọ. Nke a na-ewepụ ọtụtụ n’ime ihe ntụrụndụ nke ụwa na-enye. Ọ dịghị onye pụrụ ịnọgide na-enwe ọṅụ ndị Kraịst ma ọ bụrụ na o mejuo uche na obi ya n’ụgha, okwu na-abaghị n’ihe, na ihe ndị bụ ajọ omume, omume rụrụ arụ, ihe na-adịghị mma, ihe a na-akpọ asị, na ihe arụ. N’ikwu ya hoo haa, ọ dịghị onye pụrụ inweta ezi ọṅụ site n’iji ihe ruru unyi mejupụta uche na obi ya. N’ụwa Setan nke rụrụ arụ, lee ka o si bụrụ ihe na-ewuli elu ịmata na ndị Kraịst nwere ọtụtụ ihe ndị dị mma iche n’echiche na ikwurịta!
Ọtụtụ Ihe Mere A Ga-eji Na-aṅụrị Ọṅụ
11. (a) Gịnị ka a na-ekwesịghị iwere n’ihe dị nta, n’ihi gịnịkwa? (b) Mmetụta dị aṅaa ka ịbịa mgbakọ mba nile nwere n’ahụ otu onye bịaranụ na nwunye ya?
11 Mgbe a na-ekwu banyere ihe ndị mere a ga-eji na-aṅụrị ọnụ, ka anyị ghara ichefu òtù ụmụnna zuru ụwa ọnụ anyị nwere. (1 Pita 2:17) Ka ìgwè dị iche iche nke mba na agbụrụ bụ́ ndị dị n’ụwa na-egosipụta oké ịkpọasị maka ibe ha, ndị nke Chineke na-abịaketa ibe ha nso karị n’ịhụnanya. Ịdị n’otu ha na-apụta ìhè karịsịa ná mgbakọ mba nile dị iche iche. Banyere nke e mere na 1993 na Kiev, Ukraine, otu onye bịara ya site na United States dere, sị: “Anya mmiri ọṅụ, anya na-egbukepụ egbukepụ, mmakụ yiri nke ndị òtù ezinụlọ nọgidere na-adị, na ekele nke ìgwè ndị na-efegharị nche anwụ na hankachiifu ndị mara mma na-ekele ndị nọ n’ofè nke ọzọ nke ebe a na-agba bọl na-ekwupụta ịdị n’otu ọchịchị Chineke n’ụzọ doro anya. Obi anyị na-ejupụta ná nganga n’ihe Jehova rụzuworo n’òtù ụmụnna zuru ụwa ọnụ ahụ n’ụzọ ọrụ ebube. Nke a emetụwo mụ na nwunye m n’ahụ n’ụzọ dị omimi, ọ gbakwụnyewokwa ihe ọhụrụ n’okwukwe anyị.”
12. Olee otú Aịsaịa 60:22 si na-emezu n’ihu anya anyị?
12 Lee ka o si bụrụ ihe na-ewusi okwukwe ike nye ndị Kraịst taa ịhụ amụma Bible ka ha na-emezu n’ihu anya ha! Tụlee, dị ka ihe atụ, okwu nke Aịsaịa 60:22: “Onye nta n’etiti ha ga-aghọ [otu puku], onye dịkarịsịrị nta ga-aghọkwa mba nwere ume: Mụ onwe m, Jehova, ga-eme ka ọ bịa ọsọ ọsọ na mgbe ya.” Mgbe a mụrụ Alaeze ahụ na 1914, nanị 5,100—onye nta—na-eme nkwusa n’ụzọ pụtara ìhè. Ma n’ime afọ ise gara aga, ịba ụba nke òtù ụmụnna zuru ụwa ọnụ anọwo na-eto n’ọ̀tụ̀tụ̀ nkezi nke 5,628 Ndịàmà e mere baptism ọhụrụ kwa izu! Na 1993, e ruru ọ̀tụ̀tụ̀ kasị elu nke 4,709,889 ndị ozi na-arụsi ọrụ ike. Cheedị echiche! Nke a pụtara na “onye nta” nke 1914 nọ nso n’ịghọ “otu puku” n’ụzọ nkịtị!
13 (a) Olee ihe nọworo na-eme kemgbe 1914? (b) Olee otú Ndịàmà Jehova si na-etinye ụkpụrụ dị n’okwu Pọl ná 2 Ndị Kọrint 9:7 n’ọrụ?
13 Kemgbe 1914 Eze Mesaịa ahụ apụwo inwe ike n’ahụ mmadụ n’etiti ndị iro ya. Ndị mmadụ ji obi ha na-eso ya, bụ́ ndị na-atụnye oge, ume, na ego iji gaa n’ihu na-arụ ọrụ nkwusa zuru ụwa ọnụ ahụ nakwa ọrụ owuwu ihe nke mba nile na-akwado ọchịchị ya. (Abụ Ọma 110:2, 3) Ndịàmà Jehova na-aṅụrị ọṅụ na a na-enye onyinye ego iji hụ na a rụzuru ọrụ ndị a nile, ọ bụ ezie na a dịghị akpọtụkarị ego aha ná nzukọ ha dị iche iche.a (Tụlee 1 Ihe Emere 29:9.) Ọ dịghị mkpa ịkwanye ezi ndị Kraịst akwanye inye onyinye; ha na-ele ya anya dị ka ihe ùgwù iji kwadoo Eze ha ruo n’ókè ọnọdụ ha dị iche iche nyere ohere ya, onye ọ bụla “dị ka o buru ụzọ họpụta n’obi ya; ọ bụghị site ná mwute, ma ọ bụ site ná mkpa.”—2 Ndị Kọrint 9:7.
14. Ọnọdụ dị aṅaa n’etiti ndị Chineke pụtaworo ìhè kemgbe 1919, na-enye ha ihe dị aṅaa kpatara ha ga-eji na-aṅụrị ọṅụ?
14 Mweghachi e buru amụma ya nke ezi ofufe n’etiti ndị Chineke akpatawo okike nke paradaịs ime mmụọ. Kemgbe 1919 ọ gbasawo ókèala ya n’ụzọ na-aga n’ihu. (Abụ Ọma 14:7; Aịsaịa 52:9, 10) Gịnị ka ọ na-arụpụta? Ezi ndị Kraịst na-enweta “obi ụtọ na ọṅụ.” (Aịsaịa 51:11) Ezi mkpụrụ ọ na-arụpụta bụ ihe àmà nke ihe mmụọ nsọ Chineke nwere ike ịrụzu site n’aka ụmụ mmadụ na-ezughị okè. Ịja mma na nsọpụrụ nile na-agara Jehova, ma olee ihe ùgwù ka ukwuu a pụrụ inwe karịa ịghọ ndị ha na Chineke na-arụkọ ọrụ? (1 Ndị Kọrint 3:9) Jehova nwere ike zuru ezu ime ka nkume, ma ọ bụrụ na ọ dị mkpa, kwupụta ozi nke eziokwu ahụ. N’agbanyeghị nke ahụ, ọ họrọwo ịghara ụzọ a ma, kama nke ahụ, ịkpali ndị e kere eke ndị e ji ájá kpụọ nwere mmasị imezu uche ya.—Luk 19:40.
15. (a) Olee ihe ndị na-eme n’oge a ndị anyị ji mmasị na-ele? (b) Ihe omume dị aṅaa ka anyị ji ịṅụrị ọṅụ na-elepụ anya maka ya?
15 N’ijupụta n’egwu, ndị ohu Jehova na-ekiri ugbu a ihe ndị na-eme n’ụwa ka ndị a na-ekwekọ n’amụma Bible ndị pụrụ iche. Mba ndị dị iche iche na-agbalịsi ike—kama n’efu—inweta udo na-adịgide adịgide. Ihe ndị na-emenụ na-amanye ha ịkpọtụrụ òtù United Nations ime ihe n’akụkụ ebe e nwere nsogbu n’ụwa. (Mkpughe 13:15-17) Ka ọ dị ugbu a, ndị Chineke adịwọrị mbụ nọrọ na-elepụ anya n’ihu n’atụmanya dị ukwuu nke otu n’ime ihe kasị enye ọṅụ ga-eme mgbe ọ bụla, nke na-abịakwu nso kwa ụbọchị. “Ka anyị ṅụrịa ọṅụ, ka obi na-atọkwa anyị ụtọ nke ukwuu, ka anyị werekwa otuto nile nye Ya: n’ihi na ọlụlụ nwunye nke Nwa atụrụ ahụ abịawo, nwunye Ya edoziwokwa onwe ya.”—Mkpughe 19:7.
Ime Nkwusa—Ibu Arọ ka ọ bụ Ihe Ọṅụ?
16. Mee ihe atụ otú ịghara itinye ihe ọ na-amụta n’ọrụ pụrụ isi napụ onye Kraịst ọṅụ ya.
16 “Ihe unu matara, nke unu natakwara, nke unu nụkwara, nke unu hụkwara n’ahụ m, na-emenụ ihe ndị a: Chineke nke udo ga-anọnyerekwa unu.” (Ndị Filipaị 4:9) Site n’itinye ihe ha mụtara n’ọrụ, ndị Kraịst pụrụ ịtụ anya ịnata ngọzi Chineke. Otu n’ime ihe ndị kasị mkpa ha mụtaworo bụ ịdị mkpa nke ikwusara ndị ọzọ ozi ọma ahụ. N’ezie, ònye pụrụ ịnụ ụtọ udo nke uche ma ọ bụ nwee ọṅụ ma ọ bụrụ na o jichie ihe ọmụma n’ebe ndị nwere obi eziokwu nọ, bụ́ ndị ndụ ha dabeere n’ịnụ ya?—Ezikiel 3:17-21; 1 Ndị Kọrint 9:16; 1 Timoti 4:16.
17. N’ihi gịnị ka ọrụ nkwusa anyị kwesịrị iji bụrụ isi iyi nke ọṅụ mgbe nile?
17 Lee ihe ọṅụ ọ bụ ịchọta ndị yiri atụrụ ndị nwere mmasị ịmụta banyere Jehova! N’ezie, ndị ji ezi ebumnobi na-eje ozi ga-ahụta ije ozi Alaeze dị ka isi iyi nke ọṅụ mgbe nile. Nke a bụ n’ihi na isi ihe mere e ji abụ Onyeàmà Jehova bụ iji too aha Ya na ibuli ọnọdụ Ya dị ka Ọkaaka Onye Ọchịchị elu. (1 Ihe Emere 16:31) Onye ahụ ghọtara eziokwu a ga-aṅụrị ọṅụ ọbụna mgbe ndị mmadụ na-ajụ ozi ọma o wetara n’ụzọ amamihe na-adịghị na ya. Ọ maara na ikwusara ndị na-ekweghị ekwe ozi ọma ga-akwụsị otu ụbọchị; ito aha Jehova ga-aga n’ihu ruo mgbe ebighị ebi.
18. Gịnị na-akpali onye Kraịst ime uche Jehova?
18 Ezi okpukpe na-akpali ndị na-ekpe ya ime ihe ndị Jehova chọrọ ha n’aka, ọ bụghị n’ihi na ha aghaghị ime ya, kama n’ihi na ha chọrọ ime ya. (Abụ Ọma 40:8; Jọn 4:34) Ọ na-esiri ọtụtụ ndị mmadụ ike ịghọta nke a. Otu nwanyị gwara otu Onyeàmà bịara na nke ya otu mgbe, sị: “Lee anya ka m gwa gị, i kwesịrị ka a jaa gị mma. N’ezie ọ dịghị ma ọlị mgbe m ga-aga site n’ụlọ ruo n’ụlọ na-ekwusa banyere okpukpe m dị ka ị na-eme.” N’ihu ọchị Onyeàmà ahụ zaghachiri: “Apụrụ m ịghọta mmetụta gị. Tupu mụ aghọọ otu n’ime Ndịàmà Jehova, ị pụghị ime m ka m gakwuru ndị ọzọ iji kwuo banyere okpukpe. Ma ugbu a m na-achọ ime otú ahụ.” Nwanyị ahụ chere echiche nwa oge wee kwubie, sị: “O doro anya na okpukpe gị nwere ihe ọ na-enye nke okpukpe m na-adịghị enye. Eleghị anya ekwesịrị m ime nchọpụta.”
19. N’ihi gịnị ka ugbu a ji bụrụ oge ịṅụrị ọṅụ karịa mgbe ọ bụla ọzọ?
19 Isiokwu dịịrị afọ 1994, nke e gosipụtara n’ụzọ pụtara ìhè n’Ụlọ Nzukọ Alaeze anyị, na-echetara anyị mgbe nile: “Tụkwasị Jehova obi gị nile.” (Ilu 3:5) À pụrụ inwe ihe ka ukwuu mere a ga-eji na-anụrị ọṅụ karịa inwe ike ịtụkwasị Jehova obi anyị, ebe anyị e wusiri ike onye anyị na-agbaba n’ime ya? Abụ Ọma 64:10 na-akọwa, sị: “Onye ezi omume ga-aṅụrị na Jehova, gbabakwa n’ime Ya.” Ugbu a abụghị oge nke eguzosighị ike ma ọ bụ ịchịli aka elu. Ọnwa ọ bụla gaferenụ na-adọtakwu anyị nso gaa ná mmezu nke ihe gụworo ndị ohu Jehova agụụ ịhụ kemgbe ụbọchị Ebel. Ugbu a bụ oge ịtụkwasị Jehova obi anyị nile, na-amata na ọ dịbeghị mgbe ọ bụla ọzọ anyị nweworo ọtụtụ ihe ndị mere a ga-eji na-aṅụrị ọṅụ!
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a Ná mgbakọ dị iche iche nakwa otu ugboro n’ọnwa n’ọgbakọ, a na-agụpụta okwu dị mkpirikpi na-egosi ego olè onyinye afọ ofufo a natara dị nakwa ego ndị e mefuru. Site n’oge ruo n’oge a na-ezipụ akwụkwọ ozi na-akọwa otú e si na-eji onyinye ndị ahụ na-eme ihe. A na-esi otú a chetara onye ọ bụla banyere ọnọdụ ego nke ọrụ zuru ụwa ọnụ nke Ndịàmà Jehova.
Olee Otú Ị Ga-esi Zaa?
◻ Dị ka Nehemaịa 8:10 si kwuo, n’ihi gịnị ka anyị kwesịrị iji na-aṅụrị ọṅụ?
◻ Olee otú Deuterọnọmi 26:11 na 28:45-47 si egosi ịdị mkpa nke ịṅụrị ọṅụ?
◻ Olee ụzọ Ndị Filipaị 4:4-9 pụrụ isi nyere anyị aka ịṅụrị ọṅụ?
◻ Ihe dị aṅaa ka isiokwu dịịrị afọ 1994 nyere anyị iji ṅụrịa ọṅụ?
[Foto dị na peeji nke 16]
Ndịàmà bụ́ ndị Russia na Germany na-aṅụrị ọṅụ ịbụ akụkụ nke òtù ụmụnna mba nile
[Foto dị na peeji nke 17]
Isoro ndị ọzọ kerịta eziokwu ahụ bụ ihe na-akpata ịṅụrị ọṅụ