Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w96 8/15 p. 27-30
  • Epafrọdaịtọs Onye Ozi Ndị Filipaị

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Epafrọdaịtọs Onye Ozi Ndị Filipaị
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1996
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • “Onye Na-efe Ofufe Igbo Mkpa M”
  • ‘O Kwere Ịtụfu Ndụ Ya’
  • Ịda Mbà n’Obi Ya
  • “Na-asọpụrụkwanụ Ndị Dị Otú A”
  • Na-eme Ka Ọgbakọ Sie Ike
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2010
  • Nkasi Obi Maka Ndị Dara Mbà n’Obi
    Nkasi Obi Maka Ndị Dara Mbà n’Obi
  • Ndị Kraịst Dị Ibe Ha Mkpa
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2002
  • Ụzọ A Ga-esi Nyere Ndị Dara Mba n’Obi Aka Inwetaghachị Ọṅụ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1996
w96 8/15 p. 27-30

Epafrọdaịtọs Onye Ozi Ndị Filipaị

“WERENỤ ọṅụ nile nara ya nke ọma n’ime Onyenwe anyị; na-asọpụrụkwanụ ndị dị otú a,” ka Pọl degaara ndị Filipaị. Ihe ịrụ ụka adịghị ya na anyị ga-enwe obi ụtọ ma onye nlekọta bụ́ onye Kraịst kwuo okwu ịja mma dị otú ahụ banyere anyị. (Ndị Filipaị 2:29) Ma ònye ka Pọl na-ekwu banyere ya? Gịnịkwa ka onye ahụ meworo iji kwesị inweta ụdị ịja mma ọma ahụ?

Azịza nye ajụjụ mbụ bụ Epafrọdaịtọs. Iji zaa nke abụọ, ka anyị tụlee ọnọdụ ndị kpaliri Pọl ide okwu ndị a.

N’ihe dị ka 58 O.A., ndị Filipaị nụrụ na òtù na-eme ihe ike dị obi ọjọọ nọ na Jerusalem adọkpụpụwo Pọl n’ụlọ nsọ ma tie ya ihe, na ndị ọchịchị ejidewo ya, mgbe a tụsịkwara ya mkpọrọ n’enwetaghị mkpebi ọ bụla, a kpọfewo ya na Rom n’agbụ. (Ọrụ 21:27-33; 24:27; 27:1) N’ịbụ ndị chegburu onwe ha banyere ọdịmma ya, ọ ghaghị ịbụ na ha jụrụ onwe ha ihe ha pụrụ imere ya. Ha dara ogbenye n’ụzọ ihe onwunwe ma nọrọ ebe dị anya site n’ebe Pọl nọ, ya mere a kpaara aka ha pụrụ inye ókè. Ma, echiche ịhụnanya nke kpaliri ndị Filipaị ịkwado ozi ya n’oge gara aga ka na-akpalikwa ha; ọbụna karịa otú ahụ, ebe ọ bụ na ọ nọ n’ọnọdụ dị njọ.—2 Ndị Kọrint 8:1-4; Ndị Filipaị 4:16.

Ọ ghaghị ịbụ na ndị Filipaị atụlewo ma otu n’ime ha ọ̀ pụrụ iji onyinye gaa leta Pọl ma nyere ya aka ma ọ bụrụ na ihe ọ bụla dị ya mkpa. Ma ọ bụ njem dị ogologo ma na-agwụ ike, inyere ya aka pụrụ ịdịkwa ize ndụ! Joachim Gnilka na-ekwu, sị: “Ọ chọrọ obi ike iji gaa leta onye mkpọrọ, karịsịa, onye o yiri ka ‘mpụ’ o mere edochaghị anya.” Onye na-ede akwụkwọ bụ́ Brian Rapske na-asị: “E nwekwara ihe ize ndụ nke iso onye mkpọrọ ahụ ma ọ bụ echiche ya nwee nnọọ mmekọrịta chiri oké anya ma ọ bụ na-emere ya ebere. . . . Okwu ma ọ bụ omume a na-amaghị ụma mee pụrụ iduje n’ọnwụ nke ọ bụghị nanị onye mkpọrọ ahụ kamakwa onye inyeaka ahụ.” Ònye ka ndị Filipaị pụrụ iziga?

Anyị pụrụ nnọọ iche n’echiche na ụdị njem a pụrụ ịkpasuwo nchegbu na obi abụọ, ma Epafrọdaịtọs (ka a ghara ịghọtahie ya na Epafras nke Kọlọsi) dị njikere ijezu ozi ahụ tara akpụ. Ọ bụrụ na e lee ya anya site n’aha ya, bụ́ nke gụnyere aha Aphrodite, ọ pụrụ ịbụ onye Jentaịl a tọghatara n’Iso Ụzọ Kraịst—nwa nke nne na nna raara onwe ha nye chi nwanyị Gris ahụ nke ịhụnanya na ọmụmụ. Mgbe Pọl degaara ndị Filipaị akwụkwọ iji kelee ha maka mmesapụ aka ha, ọ pụrụ n’ụzọ ziri ezi ịkọwa Epafrọdaịtọs dị ka “onye ozi unu na onye na-efe ofufe igbo mkpa m.”—Ndị Filipaị 2:25.

Site n’ihe Bible na-ekwu banyere Epafrọdaịtọs, anyị nwere ike ịghọta na n’agbanyeghị ịdị njikere kwesịrị ịja mma ọ dị iji onwe ya mee ihe n’ozi a maka Pọl na ọgbakọ nke ya, Epafrọdaịtọs nwere ụdị nsogbu ndị anyị pụrụ inwe. Ka anyị tụlee ihe nlereanya ya.

“Onye Na-efe Ofufe Igbo Mkpa M”

Anyị amaghị ihe nile banyere ya, kama anyị pụrụ iche n’echiche na Epafrọdaịtọs rutere Rom na-enwe ike ọgwụgwụ site na njem ya. Ikekwe o sooro ụzọ Via Egnatia, bụ́ okporo ụzọ ndị Rom nke gafere Masedonia. Ọ pụrụ ịgafeworị Adriatic gaa ‘n’ikiri ụkwụ’ nke àgwàetiti Itali ma mgbe ahụ si n’Appian Way gaa Rom. Ọ bụ njem na-agwụ ike (1,200 kilomita ụga ma ọ bụ ụla) nke yiri ka o were ihe karịrị otu ọnwa.—Lee igbe dị na peji nke 29.

Olee mmụọ nke Epafrọdaịtọs ji malite njem ya? E zijewo ya ije ozi ‘ife ofufe,’ ma ọ bụ lei·tour·giʹa, nye Pọl. (Ndị Filipaị 2:30) Okwu Grik a zoro aka na mbụ n’ọrụ a na-arụrụ Ọchịchị nke nwa amaala wepụtara onwe ya ịrụ. Ka oge na-aga, ọ bịara pụta ụdị ije ozi nke Ọchịchị chọrọ n’ụzọ mmanye n’aka ndị amaala ruru eru ịrụ ya. N’ojiji e ji okwu a mee ihe n’Akwụkwọ Nsọ Grik, otu onye ọkà mmụta na-asị: “Onye Kraịst ahụ bụ nwoke na-arụrụ Chineke na mmadụ ọrụ, na mbụ, n’ihi na ọ chọrọ, na-eji obi ya nile, nke abụọ, n’ihi na a manyere ya ime otú ahụ, n’ihi na ịhụnanya Kraịst na-amanye ya.” Ee, lee ọmarịcha mmụọ nke Epafrọdaịtọs gosiri!

‘O Kwere Ịtụfu Ndụ Ya’

N’iji okwu a gbazitere n’asụsụ ịgba chaa chaa, Pọl na-asị na Epafrọdaịtọs ‘ekwerewo [pa·ra·bo·leu·saʹme·nos] ịtụfu ndụ ya,’ ma ọ bụ n’ụzọ nkịtị, jiri ndụ ya “gbaa chaa chaa” maka ozi nke Kraịst. (Ndị Filipaị 2:30) Ọ dịghị anyị mkpa iche na Epafrọdaịtọs mere ihe nzuzu ọ bụla; kama nke ahụ, mmezu nke ije ozi ya dị nsọ gụnyere ihe ize ndụ ụfọdụ. Ọ̀ nwara ma eleghị anya ije ozi inyeaka ahụ n’oge ihu igwe na-adịchaghị mma n’afọ? Ọ̀ nọgidere ná mgbalị ijezu ya mgbe ọ dara ọrịa n’otu ebe n’ụzọ? Otú o sina dị, Epafrọdaịtọs bụ onye “ahụ ya na-adịghị ike n’ezie, ọ nọkwa nso ọnwụ.” Ikekwe o zubere iso Pọl nọrọ iji jeere ya ozi, ya mere o doro anya na onyeozi ahụ chọrọ ịkọwa ihe mere o ji lọta n’oge tupu mgbe a tụrụ anya ya.—Ndị Filipaị 2:27.

Ka o sina dị, Epafrọdaịtọs bụ onye nwere obi ike nke dị njikere ikpughe onwe ya n’ụzọ achọghị ọdịmma onwe onye nanị iji wetara ndị nọ ná mkpa ihe enyemaka.

Anyị pụrụ ịjụ onwe anyị, sị, ‘Ruo ókè hà aṅaa ka m na-adọgburu onwe m iji nyere ụmụnna ime mmụọ m aka bụ́ ndị nọ n’ọnọdụ ndị siri ike?’ Ụdị mmụọ ahụ nke ịdị njikere bụ nke ndị Kraịst na-aghaghị ime. Jisọs kwuru, sị: “Iwu ọhụrụ ka M na-enye unu, ka unu hụrịta ibe unu n’anya; dị ka M hụrụ unu n’anya, ka unu onwe unu hụrịtakwa ibe unu n’anya.” (Jọn 13:34, ọ bụ anyị dere okwu ụfọdụ n’ụdị dị iche.) Epafrọdaịtọs jezuru ozi ya “ruo n’ókè fọrọ nke nta ka ọ nwụọ.” Mgbe ahụ, Epafrọdaịtọs bụ ihe ilereanya nke onye nwere “uche” ahụ nke Pọl gbara ndị Filipaị ume inwe. (Ndị Filipaị 2:5, 8, 30, Kingdom Interlinear) Ànyị ga-adị nkwadebe ịgaru ókè ahụ?

Ma, Epafrọdaịtọs dara mbà n’obi. N’ihi gịnị?

Ịda Mbà n’Obi Ya

Tinye onwe gị n’ọnọdụ Epafrọdaịtọs. Pọl kọrọ, sị: “Agụụ unu nile na-agụsi ya ike, obi lọkwara ya mmiri, n’ihi na unu nụrụ na ahụ ya adịghị ike.” (Ndị Filipaị 2:26) Epafrọdaịtọs maara na ụmụnna nọ n’ọgbakọ ya maara na ahụ adịghị ya ike nakwa na o nwebeghị ike inyere Pọl aka n’ụzọ ha lere anya na ọ ga-eme. N’ezie, ọ pụrụ iyi ka Epafrọdaịtọs emewo ka Pọl nwee nchegbu karị. Ọ̀ dị mkpa na dibịa bụ́ Luk, onye òtù Pọl, leghaara okwu ndị ọzọ anya iji lekọta Epafrọdaịtọs?—Ndị Filipaị 2:27, 28; Ndị Kọlọsi 4:14.

Ikekwe dị ka ihe si na ya pụta, Epafrọdaịtọs dara mbà n’obi. Eleghị anya o chere na ụmụnna nọ n’ọgbakọ ya na-ele ya anya dị ka onye na-erughị eru. Ọ pụrụ ịbụ na ọ na-enwe obi ọmụma ikpe ma nwee “agụụ” ịhụ ha iji mesie ha obi ike banyere ikwesị ntụkwasị obi ya. Pọl jiri okwu Grik siri nnọọ ike bụ́ a·de·mo·neʹo, “ịda mbà n’obi,” kọwaa ọnọdụ Epafrọdaịtọs. Dị ka ọkà mmụta bụ́ J. B. Lightfoot si kwuo, okwu a pụrụ igosi “ọnọdụ dị mgbagwoju anya, ahụ na-erughị ala, na nke ndọpụtụ uche, nke isi mgbaka, ma ọ bụ nsogbu uche, dị ka iru újú, ihere, ma ọ bụ ndakpọ olileanya, na ihe ndị ọzọ, na-akpata.” Nanị ojiji ọzọ e ji okwu a mee ihe n’Akwụkwọ Nsọ Grik metụtara oké ihe mgbu nke Jisọs nwere n’ogige Getsamene.—Matiu 26:37.

Pọl kpebiri na ihe kasị mma ga-abụ izigachiri ndị Filipaị Epafrọdaịtọs na-enye ya akwụkwọ ozi nke na-akọwa nlọghachi a na-atụghị anya ya nke onye ozi ha. N’ịsị, “Ana m agụ ya ihe dị mkpa izigara unu Epafrọdaịtọs,” Pọl na-eme ka a mara na ọ bụ ya mere ka ọ lọghachi, si otú a na-ewepụ echiche ọ bụla a pụrụ inwe na Epafrọdaịtọs adawo. (Ndị Filipaị 2:25) N’ụzọ megidere nke ahụ, Epafrọdaịtọs bịaruru ọnwụ nso iji jezuo ozi ya! Pọl ji ikpo ọkụ tụọ aro ka ha ‘were ọṅụ nile nara ya nke ọma n’ime Onyenwe anyị; na-asọpụrụkwa ndị dị otú a: n’ihi na ọ bụ n’ihi ọrụ Kraịst ka ọ bịaruru ọnwụ nso, na-ekwere ịtụfu ndụ ya, ka o wee mezuo ihe fọdụrụ unu ime n’ife ofufe unu n’ebe m nọ.’—Ndị Filipaị 2:29, 30.

“Na-asọpụrụkwanụ Ndị Dị Otú A”

A ga-ewere ndị ikom na ndị inyom nwere ụdị uche nke Epafrọdaịtọs n’ezie dị ka ndị dị oké ọnụ ahịa. Ha na-achụ onwe ha n’àjà iji jee ozi. Cheedị banyere ndị ahụ nyefeworo onwe ha ije ozi n’ebe dị anya site n’ebe a mụrụ ha dị ka ndị ozi ala ọzọ, ndị nlekọta na-ejegharị ejegharị, ma ọ bụ n’otu n’ime alaka ụlọ ọrụ nke Watch Tower Society. Ọ bụrụ na afọ ndụ ma ọ bụ ndakpọ ahụ ike egbochie ụfọdụ ugbu a ime ihe ha meburu mbụ, e kwesịrị ịkwanyere ha ùgwù ma were ha kpọrọ ihe n’ihi ọtụtụ afọ ha nke ije ozi n’ikwesị ntụkwasị obi.

Ka o sina dị, ọrịa na-agwụ ike pụrụ ịbụ isi iyi nke ịda mbà n’obi ma ọ bụ obi ọmụma ikpe. Mmadụ ga-achọ imekwu ihe. Lee ka o si akụda obi! Ndị ọ bụla chọtara onwe ha n’ụdị ọnọdụ ahụ pụrụ ịmụta ihe site n’aka Epafrọdaịtọs. E kwuwerị, ọ̀ bụ ya kpataara onwe ya ọrịa? Ọ dịghị ma ọlị! (Jenesis 3:17-19; Ndị Rom 5:12) Epafrọdaịtọs chọrọ ijere Chineke na ụmụnna ya ozi, ma ọrịa kpaara ya ókè.

Pọl abaghịrị Epafrọdaịtọs mba n’ihi ọrịa ya kama ọ gwara ndị Filipaị ka ha nọdebe ya nso. N’otu aka ahụ, anyị kwesịrị ịkasi ụmụnna anyị obi mgbe ha nwere nkụda obi. Dị ka ọ na-adịkarị, anyị pụrụ ito ha maka ihe ilereanya ikwesị ntụkwasị obi ha nke ije ozi. Na Pọl ji Epafrọdaịtọs kpọrọ ihe, na-ekwu nnọọ ihe dị mma banyere ya, aghaghị ịgụgụ ya, na-ebelata ịda mbà n’obi ya. Anyị onwe anyị kwa pụrụ ijide n’aka na ‘Chineke abụghị onye ajọ omume ichezọ ọrụ anyị na ịhụnanya ahụ anyị gosiri n’ebe aha Ya dị, ebe anyị jeere ndị nsọ ozi, na-ejekwara ha ozi.’—Ndị Hibru 6:10.

[Igbe dị na peeji nke 29]

Nsogbu Nile nke Njem Ahụ

N’oge a njem isi n’otu obodo ukwu dị mkpa nke Europe gaa n’ọzọ, nke yiri nke ahụ Epafrọdaịtọs gara, nwere ike ọ gaghị ewe oké mgbalị. A pụrụ ịgazu njem ahụ ná ntụsara ahụ n’ime ụgbọ elu jet n’otu hour ma ọ bụ abụọ. Ọ bụ nnọọ ọnọdụ dị iche ime ụdị njem ahụ na narị afọ mbụ. Laa azụ n’oge ahụ, isite n’otu ebe gaa n’ebe ọzọ na-enye nsogbu n’ahụ. Onye ji ụkwụ na-eme njem pụrụ ịgazu ihe nọ n’agbata kilomita 30 na 35 otu ụbọchị, ka ọ na-ekpughe onwe ya nye ihu igwe na ihe ize ndụ dị iche iche, gụnyere “ndị na-apụnara mmadụ ihe.”—2 Ndị Kọrint 11:26.

Gịnị banyere ebe ịnọ ọnọdụ abalị na inweta ihe oriri?

Ọkọ akụkọ ihe mere eme bụ́ Michelangelo Cagiano de Azevedo rụtụrụ aka na n’okporo ụzọ ndị Rom, “e nwere mansiones, bụ́ họtel ndị nwezuru ihe a chọrọ, ndị nwere ụlọ ahịa, ụlọ anụ, na ebe obibi maka ndị ọrụ ha; n’agbata mansiones abụọ na-esochi onwe ha, e nwere ọtụtụ mutationes, ma ọ bụ ebe a ga-akwụsịtụ, ebe mmadụ pụrụ ịgbanwe ịnyịnya ma ọ bụ ụgbọ ala ma chọta nri.” Ụlọ oriri ndị a nwere aha ọjọọ ebe ndị na-abịakarị ebe ahụ bụ ndị nọ n’ọkwá dị ala karịsịa. E wezụga izu ndị njem ohi, ndị nwe ụlọ ọbịa ndị ahụ na-ejikarị ego ha nwetara n’aka ndị akwụna emeju ihe ha na-akpata. Onye Latin na-ede uri nkatọ àgwà ọjọọ bụ́ Juvenal kwuru na ndị ọ bụla chọtara onwe ha ịbụ ndị a manyere ịnọ n’ụlọ oriri dị otú ahụ pụrụ ịchọtaworị onwe ha “idina n’akụkụ onye nwere obi ọjọọ, n’etiti ndị na-anya ụgbọ mmiri, ndị ohi, na ndị ohu gbalagara agbalaga, n’akụkụ ndị na-akwụgbu mmadụ na ndị na-arụ igbe ozu . . . Otu iko ka onye ọ bụla na-eji; o nweghị onye na-enwe àkwà nke ya, ma ọ bụ table dị iche na nke ndị ọzọ.” Ndị ọzọ na-ede ihe n’oge ochie katọrọ mmiri ọjọọ na ọnụ ụlọ ya, bụ́ ndị ndị mmadụ na-ejubiga ókè na ha, ndị ruru unyi, na-eme okpomọkụ, ma jupụta n’akpịrị.

[Map/Foto dị na peeji nke 27]

(Ị chọọ ịhụ ebe e sere map a, gaa n’akwụkwọ a nke e biri ebi)

Rom

[Foto]

Onye na-eme njem n’oge ndị Rom

[Ebe E Sigasị Nweta Foto]

Map: Mountain High Maps® Ike mbipụtaghachi © 1995 Digital Wisdom, Inc.; Onye njem: Da originale del Museo della Civiltà Romana, Roma

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya