Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ
Gịnị ka Pọl onyeozi bu n’uche mgbe ọ sịrị na ya “na-echezọ ihe nile dị n’azụ, na-esetịpụkwa aka n’ebe ihe nile dị n’ihu dị”? (Ndị Filipaị 3:13) Mmadụ ọ̀ pụrụ ịkpachara anya chezọọ ihe?
Ee e, n’ihe ka n’ọtụtụ ọnọdụ anyị apụghị ịkpachara anya wepụ ihe ncheta site n’uche anyị. Ihe bụ eziokwu bụ, anyị na-echezọ ọtụtụ ihe ndị anyị ga-achọ icheta ma na-echeta ọtụtụ ihe ndị anyị ga-echezọ n’oge na-adịghị anya. Mgbe ahụ, gịnị ka Pọl bu n’uche mgbe o deturu okwu ndị ahụ dị ná Ndị Filipaị 3:13? Okwu ndị gbara ya gburugburu na-enyere anyị aka ịghọta.
Ná Ndị Filipaị isi nke 3, Pọl kọwara ‘ihe ndị kpatara ntụkwasị obi ya n’anụ ahụ.’ Ọ na-ekwu banyere nzụlite ya magburu onwe ya dị ka onye Juu na ịnụ ọkụ n’obi ya maka Iwu ahụ—ihe ndị pụrụ inyeworị ya ọtụtụ abamuru ná mba Israel. (Ndị Filipaị 3:4-6; Ọrụ 22:3-5) Ma, ọ gbakụtara abamuru ndị dị otú ahụ azụ, na-agụ ha dị ka mfu, dị ka a purụ isi kwuo ya. N’ihi gịnị? N’ihi na ọ chọtara ihe ka mma—“ọkịka nke ọmụma Kraịst Jisọs.”—Ndị Filipaị 3:7, 8.
Ihe mgbaru ọsọ bụ isi nke Pọl bụ inweta, ọ bụghị ọkwá n’ụwa nke a, kama “isi ná ndị nwụrụ anwụ bilite.” (Ndị Filipaị 3:11, 12) Otú a, ọ na-ede, sị: “Na-echezọ ihe nile dị n’azụ, na-esetịpụkwa aka n’ebe ihe nile dị n’ihu dị, ana m agbakwuru oké ịgba ọsọ ka m wee nata ihe a na-agbata n’ọsọ nke ọkpụkpọ dị elu nke Chineke n’ime Kraịst Jisọs.” (Ndị Filipaị 3:13, 14) Mgbe Pọl sịrị na ya “na-echezọ ihe nile dị n’azụ,” ọ pụtaghị na o hichapụwo “ihe nile dị n’azụ” n’ụzọ ụfọdụ site n’uche ya. O doro anya na ọ ka chetara ha, ebe ọ ka depụtasịrị ha. E wezụga nke ahụ, n’okwu Grik mbụ, ọ na-eji ụdị nke ngwaa na-egosi ihe omume na-aga n’ihu mee ihe, ọ bụghị nke e mesịworo. Ọ na-asị “na-echezọ,” ọ bụghị “chezọwororị.”
Okwu Grik a sụgharịrị “chezọọ” (e·pi·lan·thaʹno·mai) nwere ụdị ihe dị iche iche ha pụtara, nke otu n’ime ya bụ “echegbughị banyere,” ma ọ bụ “nlelị.” Dị ka akwụkwọ bụ́ Exegetical Dictionary of the New Testament (nke Horst Balz na Gerhard Schneider dere) si kwuo, nke a bụ ihe “na-echezọ” pụtara ná Ndị Filipaị 3:13. Pọl adịghị eche mgbe nile banyere ihe ndị ọ hapụworo. Ọ mụtawo ile ihe anya dị ka ihe na-abụghị oké ihe. Ha dị ka ‘ihe mkpofu’ ma e jiri ha tụnyere olileanya eluigwe.—Ndị Filipaị 3:8.
Olee otú a pụrụ isi tinye okwu Pọl n’ọrụ taa? Onye Kraịst pụrụ, dị ka Pọl, ịchụworị àjà dị iche iche iji jeere Chineke ozi. Ọ pụrụ ịhapụworị ọrụ na-enye nnukwu ego n’ihi ozi oge nile. Ma ọ bụ ọ pụrụ isi n’ezinụlọ nwere ego pụta nke kewapụworo ya n’ụzọ ihe onwunwe n’ihi na ha achọghị eziokwu ahụ. Àjà ndị dị otú ahụ bụ ihe a na-aja mma, ma ha abụghị ihe a ga na-eche maka ha mgbe nile. Onye Kraịst “na-echezọ,” na-akwụsị ichegbu banyere, “ihe nile dị n’azụ” n’ihi ọdịnihu dị ebube nke na-echere ya.—Luk 9:62.
A pụrụ ma eleghị anya itinye ụkpụrụ dị n’ihe okwu Pọl pụtara n’ọrụ n’ụzọ ọzọ. Gịnị banyere onye Kraịst nke tinyere aka n’àgwà na-ezighị ezi tupu ọ mụta banyere Chineke? (Ndị Kọlọsi 3:5-7) Ma ọ bụ ka e were ya na o mere mmehie dị oké njọ mgbe ọ ghọsịrị onye Kraịst, ọgbakọ wee dọọkwa ya aka ná ntị. (2 Ndị Kọrint 7:8-13; Jemes 5:15-20) Ọ bụrụ n’eziokwu na o chegharịrị ma gbanwee ụzọ ya, a ‘sachawo’ ya. (1 Ndị Kọrint 6:9-11) Ihe merenụ agafewo. O nwere ike ọ gaghị echefu ma ọlị ihe o mere n’ụzọ nkịtị—n’ezie, ọ ga-abụ ihe amamihe dị na ya ịmụta ihe site n’ahụmahụ ahụ ka o wee ghara imeghachi mmehie ahụ. Ma, ọ “na-echezọ” n’echiche nke adịghị na-akatọ onwe ya mgbe nile. (Tụlee Aịsaịa 65:17.) Ebe a gbagharaworo ya ná ndabere nke àjà Jisọs, ọ na-agbalị iwezụga ihe gaworo aga.
Ná Ndị Filipaị 3:13, 14, Pọl na-akọwa onwe ya dị ka onye na-agba ọsọ, “na-esetịpụkwa aka” iru ihe mgbaru ọsọ ahụ. Onye na-agba ọsọ na-ele anya n’ihu, ọ bụghị n’azụ. N’otu aka ahụ, onye Kraịst kwesịrị ilega anya ná ngọzi ndị dị n’ihu, ọ bụghị n’ihe ndị a hapụrụ n’azụ. Pọl na-ekwukwa, sị: “Ọ bụrụkwa na unu tụkwasị uche n’ihe ọ bụla n’ụzọ dị iche, ọbụna nke a ka Chineke ga-ekpughere unu.” (Ndị Filipaị 3:15) Ya mere, kpegaara Chineke ekpere inyere gị aka ịzụlite ụdị iche echiche a. Jiri echiche Chineke nke a na-ahụ n’ime Bible mejupụta uche gị. (Ndị Filipaị 4:6-9) Tụgharịa uche n’ịhụnanya Jehova maka gị na ná ngọzi ndị ị na-enweta n’ihi ya. (1 Jọn 4:9, 10, 17-19) Mgbe ahụ, Jehova ga-enyere gị aka site ná mmụọ nsọ ya ka ị ghara ichegbu onwe gị banyere ihe ndị ị hapụrụ n’azụ. Kama nke ahụ, dị ka Pọl, ị ga-elega anya n’ọdịnihu dị ebube nke dị n’ihu.—Ndị Filipaị 3:17.