Gbaghara Site n’Obi Gị
“Otú a ka Nna m nke eluigwe ga-emekwa unu, ọ bụrụ na unu agbagharaghị, onye ọ bụla mmehie nwanne ya, site n’obi unu.”—MATIU 18:35.
1, 2. (a) Olee otú otu onye mmehie a ma ama si gosipụta ekele ya maka Jisọs? (b) Isi ihe dị aṅaa ka Jisọs kwuru ná nzaghachi?
O YIKARỊRỊ ka ọ bụ nwanyị akwụna, ọ bụghị onye ị ga-atụ anya ịhụ n’ụlọ onye okpukpe. Ọ bụrụ na o juru ụfọdụ ndị anya ịhụ ya n’ebe ahụ, ihe o mere na-eju anya karị. O jekwuuru nwoke nke nwere omume ọma kasịnụ wee gosipụta ekele ya maka ọrụ ya, jiri anya mmiri ya saa ụkwụ ya ma jiri agịrị isi ya hichaa ha.
2 Nwoke ahụ, bụ́ Jisọs, asọghị nwanyị a, bụ́ onye “mmehie” oyi. Ma Saịmọn bụ́ onye Farisii, bụ́ onye a nọ n’ụlọ ya, nwere nchegbu na nwanyị ahụ bụ onye mmehie. Jisọs zaghachiri site n’ịkọ banyere ndị ikom abụọ ji mmadụ ụgwọ. Otu onye ji oké ụgwọ—ihe dị ka ụgwọ afọ abụọ nke onye ọrụ. Onye nke ọzọ ji ụgwọ otu ụzọ n’ụzọ iri nke ihe onye nke mbụ ahụ ji—ihe na-erughị ụgwọ ọnwa atọ. Mgbe ọ na-adịghị onye n’ime ha pụrụ ịkwụghachi ya, onye ahụ binyere ha ego “weere amara gbaghara ha abụọ.” N’ụzọ doro anya, onye nke a gbaghaara ụgwọ ka ukwuu nwere ihe ka ukwuu mere ọ ga-eji meghachi omume n’ịhụnanya. Mgbe Jisọs jikọtasịrị omume obiọma nke nwanyị a na akụkọ ahụ, ọ gbakwụnyere ụkpụrụ a: “Onye a gbaghaara ihe nta, onye ahụ na-ahụ n’anya nke nta.” Mgbe ahụ, ọ gwara nwanyị ahụ, sị: “A gbagharaworo gị mmehie nile gị.”—Luk 7:36-48.
3. Gịnị ka ọ dị anyị mkpa ịtụle banyere onwe anyị?
3 Jụọ onwe gị, sị, ‘A sị na abụ m nwanyị ahụ ma ọ bụ a sị na m nọ n’ọnọdụ yiri nke ahụ wee bụrụ onye e meere ebere, m ga-ejizi obi ọjọọ hapụ ịgbaghara ndị ọzọ?’ Ị pụrụ ịza, sị, ‘Ọ dịghị ma ọlị!’ Ma, ì kwere n’ezie na i nwere ọchịchọ ịgbaghara? Nke ahụ ọ̀ bụ àgwà gị bụ́ isi? Ì mewo nke ahụ mgbe mgbe n’egbughị oge, ndị ọzọ hà ga-akọwakwa gị dị ka onye na-agbaghara? Ka anyị lee ihe mere onye ọ bụla n’ime anyị ji kwesị iji obi eziokwu chebara onwe anyị echiche banyere nke a.
Mgbaghara Dị Mkpa —A Gbaghakwaara Anyị
4. Eziokwu dị aṅaa banyere onwe anyị ka anyị kwesịrị ikweta?
4 I zughị okè, dị ka ị maara nnọọ nke ọma. Ọbụna ọ bụrụ na a jụọ gị, ị ga-ekweta, ikekwe na-echeta okwu ndị dị na 1 Jọn 1:8: “Ọ bụrụ na anyị asị na anyị enweghị mmehie, anyị na-eduhie onwe anyị, eziokwu ahụ adịghịkwa n’ime anyị.” (Ndị Rom 3:23; 5:12) Ụfọdụ ndị pụrụ igosipụtawo mmehie ha site n’ime ajọ mmehie ndị na-awụ akpata oyi n’ahụ. Ma ọ bụrụgodị na ị maghị ma i mere ihe dị otú ahụ, n’ezie e nwere ọtụtụ mgbe na ụzọ ndị ị na-erughị ụkpụrụ Chineke—i mehiere. Ọ́ bụghị ya?
5. Ọ̀ bụ maka gịnị ka anyị kwesịrị iji nwee ekele n’ebe Chineke nọ?
5 N’ihi ya, ọnọdụ gị pụrụ ikwekọ ná nkọwa Pọl onyeozi nyere: “Mgbe unu nọ n’ọnwụ site ná ndahie nile unu na ebighị úgwù nke anụ ahụ unu, ọbụna unu ka [Chineke] mere ka unu so Ya [Jisọs] dịkọọ ndụ, mgbe O weresịịrị amara gbaghara anyị ndahie anyị nile.” (Ndị Kọlọsi 2:13; Ndị Efesọs 2:1-3) Rịba nkebi ahịrịokwu ahụ bụ́ “gbaghara anyị ndahie anyị nile” ama. (Ọ bụ anyị dere okwu ahụ n’ụdị dị iche.) Nke ahụ metụtara ihe dị ukwuu. Onye ọ bụla n’ime anyị nwere ezi ihe mere ọ ga-eji rịọ dị ka Devid rịọrọ: “N’ihi aha Gị, Jehova, gbaghara ajọ omume m, n’ihi na o hiri nne.” (Ọ bụ anyị dere okwu ụfọdụ n’ụdị dị iche.)—Abụ Ọma 25:11.
6. Gịnị ka anyị pụrụ ijide n’aka n’ihe banyere Jehova na mgbaghara?
6 Olee otú gị onwe gị—ma ọ bụ onye ọ bụla n’ime anyị—pụrụ isi nweta mgbaghara? Otu ihe bụ́ isi bụ na Jehova Chineke nwere ọchịchọ ịgbaghara. Nke ahụ bụ njimara ya. (Ọpụpụ 34:6, 7; Abụ Ọma 86:5) N’ụzọ kwere nghọta, Chineke na-atụ anyị anya n’aka ichigharịkwuru ya n’ekpere ma rịọ ka ọ gbaghara anyị. (2 Ihe E Mere 6:21; Abụ Ọma 103:3, 10, 14) O mewokwa ndokwa maka ihe ndabere kwesịrị ekwesị iji gosi mgbaghara dị otú ahụ—àjà mgbapụta Jisọs.—Ndị Rom 3:24; 1 Pita 1:18, 19; 1 Jọn 4:9, 14.
7. N’ụzọ dị aṅaa ka i kwesịrị ịchọ iṅomi Jehova?
7 I kwesịrị ịhụ ụkpụrụ nke otú i kwesịrị isi na-emeso ndị ọzọ site n’ọchịchọ Chineke nwere ịgbaghara. Pọl lekwasịrị anya na nke a, na-ede, sị: “Nwerịtanụ obiọma n’ahụ ibe unu, nweenụ obi ọmịiko, werekwanụ amara gbaghara onwe unu, dị ka Chineke werekwaara amara gbaghara unu n’ime Kraịst.” (Ndị Efesọs 4:32) Obi abụọ adịghị ya na isi ihe Pọl na-ekwu metụtara anyị ịmụta ihe site n’ihe nlereanya Chineke, n’ihi na amaokwu na-esochi gara n’ihu ikwu, sị: “Ya mere bụrụnụ ndị na-eṅomi Chineke, dị ka ụmụ a hụrụ n’anya.” (Ndị Efesọs 5:1) Ị̀ na-ahụ njikọ ha nwere? Jehova Chineke gbaghaara gị, n’ihi ya—ka Pọl ji nkwuwa okwu na-ekwu—ọ dị gị mkpa iṅomi Ya ma na-enwe ‘obi ọmịiko, werekwa amara na-agbaghara’ ndị ọzọ. Ma jụọ onwe gị, sị, ‘Àna m eme nke ahụ? Ọ bụrụ na ọ bụghị omume m bu pụta ụwa, àna m arụ ọrụ n’akụkụ ahụ, na-agbalịsi ike n’ezie iṅomi Chineke n’ịbụ onye na-agbaghara?’
Ọ Dị Anyị Mkpa Ịrụ Ọrụ n’Ịdị Na-agbaghara
8. Ànyị kwesịrị ịghọta gịnị banyere ndị mejupụtara ọgbakọ anyị?
8 Ọ ga-adị mma iche na n’ọgbakọ ndị Kraịst, e nwere oge ole na ole anyị na-aghaghị ime omume Chineke ahụ bụ́ ịgbaghara mmehie. Ma ihe na-emenụ dị iche. N’eziokwu, ụmụnna anyị ndị nwoke na ndị nwanyị bụ́ ndị Kraịst na-agbalịsi ike ịgbaso ụkpụrụ ịhụnanya nke Jisọs. (Jọn 13:35; 15:12, 13; Ndị Galetia 6:2) Ha arụwo ọrụ ogologo oge, ha ka na-arụkwa ọrụ, iji gbahapụ ụzọ iche echiche, ikwu okwu, na ime omume ndị e ji mara ajọ ụwa a. N’ezie ha chọrọ igosipụta mmadụ ọhụrụ ahụ. (Ndị Kọlọsi 3:9, 10) Ma, anyị apụghị ileghara eziokwu ahụ bụ́ na ọ bụ mmadụ ndị na-ezughị okè mejupụtara ọgbakọ zuru ụwa ọnụ, na ọgbakọ dị n’ógbè ọ bụla. N’ozuzu, ha dị mma karịa ka ha dịbu, ma ha ka bụ ndị na-ezughị okè.
9, 10. Gịnị mere na o kwesịghị iju anyị anya ma ọ bụrụ na esemokwu ebilite n’etiti ụmụnna?
9 N’ime Bible, Chineke ji nlezianya na-agwa anyị na anyị pụrụ ịtụ anya ezughị okè n’ọgbakọ, n’etiti ụmụnna anyị ndị nwoke na ndị nwanyị. Dị ka ihe atụ, tụlee okwu Pọl e dekọrọ ná Ndị Kọlọsi 3:13: “Na-anagiderịtanụ ibe unu, werekwanụ amara gbaghara onwe unu, a sị na onye ọ bụla nwere ihe ịta onye ọ bụla ụta; ọbụna dị ka Onyenwe anyị weere amara gbaghara unu, unu onwe unu meekwa otú a.”
10 N’ụzọ dị ịrịba ama, Bible na-echetara anyị n’ebe a njikọ dị n’etiti mgbaghara Chineke na-agbaghara anyị na ibu ọrụ na mkpa anyị nwere ịdị na-agbaghara ndị ọzọ. N’ihi gịnị ka nke a ji bụrụ ihe ịma aka? Ọ bụ n’ihi na Pọl kwetara na mmadụ pụrụ inwe “ihe ịta onye ọ bụla ụta.” Ọ ghọtara na ihe ndị dị otú ahụ ga-adị. Ha aghaghị ịdịworị na narị afọ mbụ, ọbụna n’etiti ndị Kraịst bụ́ “ndị dị nsọ,” bụ́ ndị nwere ‘olileanya nke e debewooro ha n’eluigwe.’ (Ndị Kọlọsi 1:2, 5) Ya mere ànyị pụrụ iche na ọ ga-adị iche taa bụ́ mgbe mmụọ nsọ na-adịghị agbara ihe ka ọtụtụ n’ezi ndị Kraịst àmà na ha bụ “ndị Chineke họpụtara, ndị dị nsọ ndị a hụwokwara n’anya”? (Ndị Kọlọsi 3:12) N’ihi ya, anyị ekwesịghị ikwubi na ọ dị ihe dị njọ n’ụzọ gbapụrụ iche ma ọ bụrụ na n’ọgbakọ anyị e nwere ihe ịta mmadụ ụta—mwute n’ihi mmejọ e mere n’ezie ma ọ bụ nke e chere na e mere.
11. Gịnị ka Jemes onye na-eso ụzọ mere ka anyị buru n’uche?
11 Okwu Jemes bụ́ onye otu nne ji ya na Jisọs na-egosikwa na anyị aghaghị ịtụ anya na ma ọ dịghị ihe ọzọ, site n’oge ruo n’oge, anyị pụrụ inweta ọnọdụ ndị ga-achọ ka anyị gbaghara ụmụnna anyị. “Ònye bụ onye amamihe nke na-aghọtakwa ihe n’etiti unu? ya site n’ibi obi ọma ya gosi ọrụ ya nile n’ime ịdị nwayọọ nke amamihe. Ma ọ bụrụ na unu nwere ekworo dị ilu na ịkpa iche iche n’obi unu, unu anyala isi, unu ekwukwala okwu ụgha megide eziokwu.” (Jemes 3:13, 14) “Ekworo dị ilu na ịkpa iche iche” n’obi nke ezi ndị Kraịst? Ee, n’ụzọ doro anya okwu Jemes na-enye echiche na ihe dị otú ahụ emewo n’ọgbakọ nke narị afọ mbụ nakwa na ọ ga-emekwa n’oge a.
12. Nsogbu dị aṅaa bilitere n’ọgbakọ Filipaị oge ochie?
12 Ihe atụ mere eme n’ezie metụtara ndị Kraịst abụọ e tere mmanụ bụ́ ndị nwere aha ọma nke iso Pọl ụkwụ na ụkwụ na-arụsi ọrụ ike. Ị pụrụ icheta mgbe ị gụrụ banyere Yuodia na Sintiki, bụ́ ndị òtù nke ọgbakọ Filipaị. Ọ bụ ezie na ọ dịghị ekwu okwu ahụ n’ụzọ zuru ezu, Ndị Filipaị 4:2, 3 na-egosi na esemokwu dị n’etiti ha. Ihe kpalitere ya ọ̀ bụ okwu a na-echeghị eche, nke na-egosighị obiọma, nlelị e chere na e lelịrị onye ikwu, ma ọ bụ ihe àmà ụfọdụ nke ekworo asọmpi kpatara? Ihe ọ sọrọ ya bụrụ, ọ bịara sie ike nke na Pọl nọ n’ebe dị anya bụ́ Rom nụ ya. Ụmụnna nwanyị ime mmụọ abụọ ahụ pụrụ ịnọwo n’egheghị ibe ha ọnụ, na-eduga na ha izere ibe ha ná nzukọ ma ọ bụ na-ekwu okwu na-adịghị mma banyere onye nke ọzọ n’ihu ndị enyị ha.
13. Gịnị ka o yikarịrị ka o nyeere Yuodia na Sintiki aka, na-enye anyị ihe mmụta dị aṅaa?
13 Ọ̀ dị nke ọ bụla n’ime ihe ndị ahụ dara ka ihe ị hụtụworo, dị ka ihe dapụtara n’etiti ụfọdụ ndị nọ n’ọgbakọ gị ma ọ bụ ihe i so na ya? Nsogbu dị ka nke ahụ pụrụ ọbụna ịdị ugbu a ruo n’ọ̀tụ̀tụ̀ dị nta. Gịnị ka anyị pụrụ ime? Na nke oge ochie ahụ, Pọl gbara ụmụnna nwanyị abụọ ahụ raara onwe ha nye ume “ka ha tụkwasị uche n’otu ihe ahụ n’ime Onyenwe anyị.” Ha pụrụ ikwetawo ikwurịta okwu ahụ, idozi ya, ikwupụta ọchịchọ ha nwere ịgbaghara, nakwa n’ezie iṅomi àgwà mgbaghara nke Jehova. Ọ dịghị ihe mere a ga-eji chee ihe ọzọ n’abụghị na Yuodia na Sintiki nwere ihe ịga nke ọma, anyị onwe anyị kwa pụrụ inwe ihe ịga nke ọma. A pụrụ igosipụta àgwà mgbaghara dị otú ahụ taa n’ụzọ na-aga nke ọma.
Mee Udo—Gbaghara
14. N’ihi gịnị ka o ji ekwekarị omume ma na-akasị nnọọ mma ikwe ka esemokwu anyị na mmadụ nwere gafere?
14 Gịnị n’ezie ka ọ na-ewe iji gbaghara mgbe gị na onye Kraịst ọzọ nwere nsogbu? N’ikwu eziokwu, e nweghị otu ụzọ dị mfe isi mee ya, ma Bible na-enye ihe atụ ndị na-enye aka na ndụmọdụ dị irè. Aro bụ́ isi—ọ bụ ezie na ọ dịghị mfe ịnabata ma ọ bụ itinye ya n’ọrụ—bụ nnọọ ichefu okwu ahụ, ịhapụ ya ka ọ gafee. Mgbe esemokwu dapụtara, dị ka o mere n’etiti Yuodia na Sintiki, onye nke ọ bụla na-echekarị na onye nke ọzọ mehiere ihe ma ọ bụ na ụta dịịrị ya n’ụzọ bụ́ isi. Ya mere n’ọnọdụ dị otú ahụ, ị pụrụ iche n’ụzọ ziri ezi na ụta dịịrị onye Kraịst nke ọzọ n’ụzọ bụ́ isi ma ọ bụ na ọ bụ ya kasị mejọọ. Ka o sina dị, ị̀ pụrụ nnọọ imechi okwu ahụ site n’ịgbaghara? Cheta na ọ bụrụ na ụta dịịrị onye Kraịst nke ọzọ n’ụzọ bụ́ isi ma ọ bụ kpam kpam, bụ́ nke na-eyikarịghị ka ọ ga-adị otú ahụ, ị nọ n’ọnọdụ bụ́ isi ikwe ka okwu ahụ gafere dị ka nke a gbaghawooro na nke birilanụ.
15, 16. (a) Olee otú Maịka si kọwaa Jehova? (b) Gịnị ka Chineke ‘ịgabiga njehie’ pụtara?
15 Ka anyị ghara ichefu na Chineke bụ onye nlereanya anyị n’ịgbaghara mmehie. (Ndị Efesọs 4:32–5:1) N’ihe banyere usoro O ji ekwe ka njehie gafere, onye amụma bụ́ Maịka dere, sị: “Ònye bụ Chineke dị ka Gị, Nke na-ebupụ ajọ omume, na-agabigakwa njehie nke dịịrị ndị ala nketa Ya fọdụrụ? O jigideghị iwe Ya ruo mgbe ebighị ebi, n’ihi na onye ebere na-atọ ụtọ ka Ọ bụ.”—Maịka 7:18.
16 Site n’ịkọwa Jehova dị ka onye ‘na-agabiga njehie,’ Bible adịghị ekwu na o nweghị ike icheta mmehie ahụ, na-enwe ikike ncheta na-ezughị ezu. Tụlee ihe banyere Samson na Devid, bụ́ ndị mechara ajọ mmehie. Chineke chetara mmehie ndị ahụ mgbe ogologo oge gasịworo; ọbụna anyị maara banyere mmehie ha ụfọdụ n’ihi na Jehova mere ka e detuo ha n’ime Bible. Ma, Chineke anyị nke na-agbaghara mmehie meere mmadụ abụọ ahụ ebere, na-edebe ha n’ihu anyị dị ka ndị nlereanya nke okwukwe a ga-eṅomi.—Ndị Hibru 11:32; 12:1.
17. (a) Ụzọ ime ihe dị aṅaa pụrụ inyere anyị aka ịgabiga njehie, ma ọ bụ mmejọ, nke ndị ọzọ? (b) Ọ bụrụ na anyị agbalịa ime nke ahụ, olee otú ọ ga-esi bụrụ na anyị na-eṅomi Jehova? (Lee nkọwa ala ala peji.)
17 Ee, Jehova ‘gabigara’a njehie, ọbụna dị ka Devid rịọrọ ya ugboro ugboro ka o mee. (2 Samuel 12:13; 24:10) Ànyị pụrụ iṅomi Chineke na nke a, na-enwe ọchịchọ ịgabiga nlelị ma ọ bụ mmejọ nke ndị ohu ibe anyị mere dị ka ndị na-ezughị okè? Were ya na ị nọ n’ụgbọelu jet nke ji oké ọsọ na-agbada n’ụzọ ụgbọelu si efeli. Ka ị na-elepụta anya, ị hụ onye ị maara ka ọ nọ nso n’ụzọ ahụ ụgbọelu si efeli na-egosipụta omume ịka anya ụmụaka nke ịrapụta ire. Ị maara na iwe na-ewe ya nakwa na ọ pụrụ ịbụ gị ka o bu n’obi na-eme ya. Ma ọ bụ o nwere ike o bughị gị n’obi ma ọlị. Otú ọ dị, ka ụgbọelu ahụ na-agbagharị n’ụzọ ahụ ụgbọelu na-esi efeli iji felie, i felie n’ebe dị nnọọ elu site n’ebe nwanyị ahụ nọ, bụ́ onye o yiziri ka o pere nnọọ ezigbo mpe. N’ime otu awa, ị nọ ọtụtụ narị kilomita site n’ebe ahụ, ị gafewokwa omume ya na-akpasu iwe kemgbe. N’ụzọ yiri nke ahụ, ọtụtụ mgbe, ọ ga-enyere anyị aka ịgbaghara ma ọ bụrụ na anyị agbalịa ịdị ka Jehova ma jiri amamihe gabiga mmejọ ahụ. (Ilu 19:11) Nlelị ahụ ọ́ gaghị eyi ihe na-adịghị ihe ọ pụtara afọ iri n’ihu ma ọ bụ narị afọ abụọ n’ime Narị Afọ Iri ahụ? Gịnị ma i leghara ya nnọọ anya?
18. Ọ bụrụ na o yie ka anyị enweghị ike ichefu mmejọ e mejọrọ anyị, ndụmọdụ dị aṅaa ka anyị pụrụ itinye n’ọrụ?
18 Otú ọ dị, n’oge ole na ole, ị pụrụ ikpewo ekpere banyere okwu ahụ ma gbalịa ịgbaghara, ma i chee na i nweghị ike ya. Gịnị ka ị ga-emezi? Jisọs gbara ume ijekwuru onye ahụ ma gbalịa idozi esemokwu ahụ nanị unu abụọ iji nweta udo. “Ya mere ọ bụrụ na ị na-eche onyinye gị n’ihu Chineke n’ebe ịchụàjà, i wee cheta n’ebe ahụ na nwanne gị nwere ihe megide gị, hapụ onyinye gị n’ebe ahụ n’ihu ebe ịchụàjà, lawa, buru ụzọ mee ka gị na nwanne gị dị n’udo, mgbe ahụ bịakwa chee onyinye gị.”—Matiu 5:23, 24.
19. Omume dị aṅaa ka anyị kwesịrị inwe, omume dịkwa aṅaa ka anyị kwesịrị izere ka anyị na-achọ ka anyị na nwanna anyị mee udo?
19 N’ụzọ dị ịrịba ama, Jisọs asịghị ka ị gakwuru nwanne gị iji mee ka o kweta na i meziri emezi nakwa na ya onwe ya emezighị emezi. Ikekwe, o mezighị emezi. O yikarịrị ka e nwere ebe unu abụọ na-emezighị emezi. Otú o sina dị, ihe mgbaru ọsọ ekwesịghị ịbụ ime ka onye nke ọzọ nakwere ụta, iwetu onwe ya ala, dị ka a pụrụ isi kwuo ya. Ọ bụrụ otú ahụ ka i si welite nkwurịta okwu ahụ, ọ ga-afọ nke nta ka ọdịda bụrụ ihe e ji n’aka. Ihe mgbaru ọsọ ekwesịchaghịkwa ịbụ ịtụleghachi mmejọ ahụ e mere n’ezie ma ọ bụ nke e chere na e mere n’ozuzu ya. Mgbe nkwurịta okwu dị jụụ nke e ji mmụọ nke ịhụnanya ndị Kraịst nwee kpughere nghọtahie dị ilu ná mmalite nke nsogbu ahụ, unu abụọ pụrụ ịgbalị idozi okwu ahụ. Ma ọbụna ọ bụrụ na nkwurịta okwu ahụ edugaghị ná nkwekọrịta zuru ezu, nke ahụ ọ̀ na-adị mkpa mgbe nile? Ọ́ gaghị aka mma ma ọ bụrụ na ma ọ dịghị ihe ọzọ gị onwe gị ekweta na unu abụọ ji ezi obi achọ ijere Chineke anyị nke na-agbaghara mmehie ozi? Mgbe unu chere eziokwu ahụ ihu, ọ ga-aka adịrị onye nke ọ bụla mfe iji obi ya sị, “O wutere m na anyị nwere esemokwu a n’ihi ezughị okè anyị. Biko, ka anyị gabiga ya.”
20. Gịnị ka anyị pụrụ ịmụta site n’ihe nlereanya nke ndị ozi?
20 Cheta na ndị ozi nwere nsogbu ha, dị ka mgbe ụfọdụ n’ime ha nọ na-achọ ùgwù ka ukwuu. (Mak 10:35-39; Luk 9:46; 22:24-26) Nke ahụ wetara esemokwu, ikekwe mwute, ma ọ bụ ọbụna oké mmejọ. Ma ha gabigara esemokwu ndị dị otú ahụ ma nọgide na-arụkọ ọrụ. Otu onye n’ime ha mesịrị dee, sị: “Onye ahụ nke na-achọ ịhụ ndụ n’anya, na ịhụ ezi ụbọchị, ya mee ka ire ya ghara ikwu ihe ọjọọ, meekwa ka egbugbere ọnụ ya ghara ikwu okwu aghụghọ: ya sikwa n’ihe ọjọọ wezụga onwe ya, mee ezi ihe; ya chọọ udo, gbasookwa ya.”—1 Pita 3:10, 11.
21. Olee ndụmọdụ miri emi Jisọs nyere banyere mgbaghara?
21 Anyị kwuru na mbụ banyere otu akụkụ nke otu usoro njikọ: Chineke gbaghaara anyị ọtụtụ mmehie ndị anyị mere n’oge gara aga, ya mere anyị kwesịrị iṅomi ya ma gbaghara ụmụnna anyị. (Abụ Ọma 103:12; Aịsaịa 43:25) Ma e nwere akụkụ ọzọ n’usoro njikọ a. Mgbe Jisọs nyesịrị ekpere nlereanya ahụ, ọ sịrị: “Ọ bụrụ na unu agbaghara mmadụ ndahie nile ha, Nna unu ga-agbagharakwa unu.” Ihe karịrị otu afọ mgbe e mesịrị, o kwughachiri ihe ahụ bụ́ isi, na-akụziri ndị na-eso ụzọ ya ikpe ekpere sị: “Gbagharakwa anyị mmehie nile anyị; n’ihi na anyị onwe anyị na-agbagharakwa onye ọ bụla nke ji anyị ụgwọ.” (Matiu 6:12, 14; Luk 11:4) E mesịa, nanị ụbọchị ole na ole tupu ọnwụ ya, Jisọs gbakwụnyere, sị: “Mgbe ọ bụla unu guzoro na-ekpe ekpere, gbagharanụ, ma ọ bụrụ na unu nwere ihe ọ bụla megide onye ọ bụla; ka Nna unu Nke bi n’eluigwe wee gbagharakwa unu ndahie nile unu.”—Mak 11:25.
22, 23. Olee otú ọchịchọ anyị ịgbaghara pụrụ isi metụta ọdịnihu anyị?
22 Ee, atụmanya anyị ịnọgide na-enweta mgbaghara Chineke dabeere n’ụzọ bụ́ isi n’anyị ịdị njikere ịgbaghara ụmụnna anyị. Mgbe nsogbu bilitere n’etiti gị na onye Kraịst, jụọ onwe gị, sị, ‘Inweta mgbaghara Chineke ọ́ dịghị mkpa karịa igosi nwanna nwoke ma ọ bụ nwanyị na o mezighị emezi ná nlelị ụfọdụ na-adịghị ihe ha pụtara, obere mmejọ ụfọdụ, ma ọ bụ ngosipụta ụfọdụ nke ezughị okè mmadụ?’ Ị maara azịza ya.
23 Otú ọ dị, gịnị ma ọ bụrụ na okwu ahụ dị njọ karịa obere mmejọ e mejọrọ gị ma ọ bụ nsogbu e nyere gị? Oleekwa mgbe ndụmọdụ Jisọs nke e dekọrọ na Matiu 18:15-18 na-abata? Ka anyị tụlee ihe ndị a n’isiokwu na-esonụ.
[Ihe e dere n’ala ala peeji]
a Otu onye ọkà mmụta sịrị na okwu ihe atụ Hibru ahụ e ji mee ihe na Maịka 7:18 bụ nke “e si n’omume onye njem nke na-agafe n’ahụghị ihe nke ọ na-achọghị ichebara echiche, weta. Ihe ọ na-enye echiche ya abụghị, na Chineke adịghị ahụ mmehie, ma ọ bụ na ọ na-ewere ya dị ka ihe na-adịghị ihe ọ pụtara, kama na ọ dịghị arịba ya ama n’ọnọdụ ụfọdụ n’echiche nke inye ahụhụ; na ọ dịghị enye ahụhụ, kama ọ na-agbaghara.”—Ndị Ikpe 3:26; 1 Samuel 16:8.
Ị̀ Na-echeta?
◻ Olee otú Jehova si enye anyị ụkpụrụ anyị ga-agbaso n’ihe banyere mgbaghara?
◻ Gịnị ka anyị na-aghaghị icheta banyere ndị nọ n’ọgbakọ anyị?
◻ Ọtụtụ mgbe, gịnị ka anyị kwesịrị inwe ike ime banyere nlelị ma ọ bụ mmejọ?
◻ Ọ bụrụ na ọ dị mkpa, gịnị ka anyị pụrụ ime iji soro nwanna anyị mee udo?
[Foto dị na peeji nke 15]
Mgbe gị na onye Kraịst nwere esemokwu, gbalịa ikwe ka ọ gabiga; ka oge na-aga, okwu ahụ ga-eji nwayọọ nwayọọ ghọọ ihe na-adịghị ihe ọ pụtara