“Jụ Akụkọ Ifo Nile”
BIBLE jupụtara n’ahụmahụ na akụkọ dị iche iche banyere ndị mmadụ. Ọ bụghị nanị na ọ na-amasị anyị ịgụ ha kama anyị na-erite uru site na ha. Pọl onyeozi degaara ọgbakọ ndị Kraịst dị na Rom akwụkwọ, sị: “Ka ha hà, bụ́ ihe e dere n’akwụkwọ nsọ n’oge gara aga, e dere ha izi anyị ihe, ka anyị wee were ntachi obi na nkasi obi nke ihe nile e deworo n’akwụkwọ nsọ nwee olileanya.”—Ndị Rom 15:4.
Pọl n’onwe ya keere òkè n’ịkọ ahụmahụ dị iche iche. Bible na-ekwu banyere Pọl na Banabas ná ngwụsị nke njem ije ozi ala ọzọ ha nke mbụ, sị: “Mgbe ha ruru, [n’Antiọk nke Siria] meekwa ka nzukọ Kraịst zukọta, ha wee kọọrọ ha ihe nile, ka ha hà, bụ́ nke Chineke sooro ha mee.” (Ọrụ 14:27) Ihe ịrụ ụka adịghị ya na a gbara ụmụnna ndị ahụ ume n’ụzọ dị ukwuu site n’ahụmahụ ndị a.
Otú ọ dị, ọ bụghị ahụmahụ nile na-ewuli elu. Site n’ike mmụọ nsọ, Pọl dọrọ Timoti aka ná ntị, sị: “Jụ akụkọ ifo nile na-emerụ emerụ nke dịkwaara agadi ndị inyom.” (1 Timoti 4:7) Nyekwa Taịtọs o dere na ndị Kraịst na-eguzosi ike n’ezi ihe ekwesịghị “ịṅa ntị akụkọ ifo dị iche iche nke ndị Juu, na ihe dị iche iche nke mmadụ nyere n’iwu, bụ́ ndị na-echigharị hapụ eziokwu ahụ.”—Taịtọs 1:14.
Gịnị bụ akụkọ ifo ndị a, ma ọ bụ akụkọ ndị e chepụtara echepụta? Okwu abụọ ndị a sitere n’okwu Grik bụ́ myʹthos (“akụkọ ọdịbendị na-emeghị eme”). Akwụkwọ bụ́ The International Standard Bible Encyclopaedia na-ekwu na okwu a na-akọwa “akụkọ ifo (okpukpe) nke na-enweghị njikọ ọ bụla n’ihe bụ eziokwu.”
Ụwa nke ụbọchị Pọl jupụtara n’akụkọ ndị dị otú ahụ. Otu ihe atụ bụ akwụkwọ Tobit nke ndị Juu na-anabataghị dị ka akụkụ Akwụkwọ Nsọ, bụ́ nke e dere ma eleghị anya ihe karịrị narị afọ abụọ tupu oge Pọl. Akụkọ a na-akọ banyere Tobit, onye Juu nwere nsọpụrụ miri emi n’ebe Chineke nọ, bụ́ onye kpuru ìsì mgbe nsị nnụnụ dabara ya n’anya. E mesịa, o zigara nwa ya nwoke bụ Tobias ịnata ụgwọ. Ka ọ na-aga n’ụzọ, ná ntụziaka nke otu mmụọ ozi, Tobias nwetara obi, imeju, na òlùlù nke azụ. Ọzọ o zutere otu nwanyị di ya nwụrụ, ọ bụ ezie na ọ lụwo di ugboro asaa ka nọgide n’amaghị nwoke n’ihi na mmụọ ọjọọ tigburu di ya nke ọ bụla n’abalị agbamakwụkwọ ha. N’ịbụ onye mmụọ ozi ahụ kwanyere, Tobias lụrụ ya ma chụpụ mmụọ ọjọọ ahụ site n’isu obi na imeju azụ ahụ ọkụ. N’iji òlùlù nke azụ ahụ mee ihe, Tobias mesịrị weghachi ịhụ ụzọ nke nna ya.
N’ụzọ doro anya, akụkọ a abụghị eziokwu. N’agbanyeghị otú o siri dị ụtọ ma kwekọọ ná nkwenkwe, ụgha dị na ya. Dị ka ihe atụ, akụkọ ahụ sịrị na Tobit hụrụ nnupụisi nke agbụrụ ndị ugwu na ndọrọ n’agha nke ndị Israel gaa Nineve, ihe ndị mere n’akụkọ ihe mere eme Israel nke 257 afọ dị n’agbata ha. Ma, akụkọ ahụ sịrị na Tobit gbara 112 afọ n’oge ọnwụ ya.—Tobit 1:4, 11; 14:1, The Jerusalem Bible.
Ụdị akụkọ ndị ahụ na-emegide ihe bụ eziokwu “nke okwu na-enye ezi ndụ” nke ndị ohu Chineke kwesịrị ntụkwasị obi na-akpọsa. (2 Timoti 1:13) Ha bụ nchepụta efu, nke na-emegide eziokwu nke akụkọ ihe mere eme, ụdị ihe ndị agadi nwanyị na-amaghị Chineke na-akọ. Ndị a bụ akụkọ ndị Kraịst ga-ajụ.
Ịnwapụta Okwu Eziokwu
Akụkọ ndị yiri ndị ahụ jupụtara ebe nile taa. Pọl dere, sị: “Oge ga-adị mgbe [ndị mmadụ] na-agaghị anagide ozizi ahụ nke na-enye ezi ndụ; kama, . . . ha ga-echigharịkwa ntị ha ka ha ghara ịnụ eziokwu, ma ha ga-ejehie ṅaa ntị akụkọ ifo.” (2 Timoti 4:3, 4) N’akụkụ ụfọdụ nke ụwa, akụkọ dị iche iche banyere ndị mmụọ jupụtara ebe nile na-ewukwa ewu. Ya mere, ndị Kraịst na-eji amamihe “na-anwa okwu” nke akụkọ okpukpe dị iche iche iji mata ma hà kwekọrọ na Bible.—Job 12:11.
N’ụzọ doro anya, ọtụtụ akụkọ ekwekọghị na Bible. N’ọtụtụ akụkụ nke ụwa, dị ka ihe atụ, ịnụ akụkọ ndị na-akwado echiche ahụ nke bụ́ na mkpụrụ obi mmadụ apụghị ịnwụ anwụ abụghị ihe ọhụrụ. Akụkọ ndị a na-akọwa otú mmadụ si nwụọ, wee pụtaghachi dị ka nwa a mụrụ ọhụrụ, dị ka onye mmụọ, dị ka anụmanụ, ma ọ bụ dị ka mmadụ n’ebe dị iche.
Otú ọ dị, Okwu Chineke na-egosi na mkpụrụ obi mmadụ abụghị ihe na-adịghị anwụ anwụ; mkpụrụ obi na-anwụ anwụ. (Ezikiel 18:4) Ọzọkwa, Bible na-ekwu na ndị nwụrụ anwụ adịghị ndụ n’ime ili, apụghị iche echiche, ikwu okwu, ma ọ bụ ime ihe ọ bụla. (Eklisiastis 9:5, 10; Ndị Rom 6:23) Ya mere, ndị e jiworo akụkọ ụgha ndị na-akwado na mkpụrụ obi adịghị anwụ anwụ rafuo bụ, dị ka Pọl kwuru, ndị ‘jehiere’ pụọ n’ebe “ozizi ahụ nke na-enye ndụ” nke Bible dị.
Akụkọ nke Ihe Ndị Karịrị Mmadụ
Akụkọ ndị ọzọ na-abụ maka ihe ndị amoosu na dibịa afa na-eme. Dị ka ihe atụ, n’akụkụ ụfọdụ nke Africa, a na-ekwu na ndị ozi ihe ọjọọ ndị a na-enwe ike dị egwu, nwee ike ịgbanwe onwe ha ma ọ bụ ndị ọzọ ịghọ agwọ, ènwè, na nnụnụ; nwee ike ife n’ikuku iji mee ihe ha chọrọ; nwee ike ịpụta ma ọ bụ pụọ n’anya; nwee ike isi n’ime mgbidi gafee; nweekwa ike ịhụ ihe ndị e liri n’okpuru ala.
Ịba ụba nke ụdị akụkọ ndị ahụ, ya na nkweta zuru ebe nile e nwere na ha, pụrụ inwe mmetụta n’ahụ ụfọdụ ndị nọ n’ọgbakọ ndị Kraịst ikwetakwa na ha bụ eziokwu. Ha pụrụ iche echiche na ọ bụ ezie na mmadụ nkịtị apụghị ime ụdị ihe ndị ahụ, ndị na-anata ike karịrị nke mmadụ site n’aka ihe ndị e kere eke bụ́ mmụọ, ndị mmụọ ọjọọ, pụrụ ime ha. Ihe yiri ka ọ bụ ihe nkwado maka mkpebi nke a bụ 2 Ndị Tesalọnaịka 2:9, 10, nke na-asị: “Ọbịbịa ya dị ka ịrụsi ọrụ ike nke Setan n’ike nile ọ bụla na ihe ịrịba ama dị iche iche na ọrụ ebube dị iche iche nke ụgha, n’aghụghọ nile kwa nke ajọ omume n’ebe ndị na-ala n’iyi nọ; n’ihi na ha anaraghị ịhụnanya nke eziokwu nke ọma, ka e wee zọpụta ha.”
Ọ bụ ezie na dị ka akụkụ akwụkwọ nsọ nke a na-egosi na Setan nwere ike ịrụ ọrụ ebube, ọ na-ekwu na Setan bụkwa onye ‘aghụghọ nile kwa nke ajọ omume n’ebe ndị na-ala n’iyi nọ,’ sitere n’aka ya. Mgbe mgbe, Bible na-egosi Setan dị ka onye isi nduhie onye “na-eduhie ụwa nile mmadụ bi.” (Mkpughe 12:9) Ọ bụ onye ọkà n’ime ka ndị mmadụ kwere n’ihe ndị na-abụghị eziokwu.
N’ihi nke a, ọbụna akaebe na nkwupụta nke ndị tinyeworo aka n’ime mgbaasị na iri amoosu na-abụkarị nke a na-apụghị ijide n’aka. Ụdị ndị ahụ pụrụ iji ezi obi kwere na ha hụrụ, nụ, ma ọ bụ nwee ahụmahụ nke ihe ụfọdụ; ma, n’eziokwu ha enwebeghị. Dị ka ihe atụ, e nwere ụfọdụ ndị na-eche na ha na-eso mmụọ nke ndị nwụrụ anwụ na-akpakọrịta. Ma ha ehiewo ụzọ, a ghọgbuwo ha, ha bụrụ ndị nọ n’agbụ aghụghọ Ekwensu. Bible na-ekwu na ndị nwụrụ anwụ “na-arịda n’ebe ịnọ duu.”—Abụ Ọma 115:17.
Dị ka ndekọ nke aghụghọ Ekwensu gosiri, ịbụ eziokwu nke akụkọ ifo nke ihe ndị karịrị mmadụ kwesịrị ka e nyoo ya nnọọ enyo n’ọnọdụ ọ bụla. Ọtụtụ n’ime ha bụ ihe si ná nchepụta nkwenkwe ụgha dị iche iche pụta, bụ́ nke a na-etinye nnú na ose site n’ịkọghachi ya ugboro ugboro.
Ịgbasa ụdị akụkọ ndị a na-akwalite ọdịmma nke nna ụgha ahụ, Setan Ekwensu. (Jọn 8:44) Ha na-akpali mmasị n’ihe omume dị iche iche nke anwansị ndị bụ́ ihe arụ n’anya Jehova. (Deuterọnọmi 18:10-12) Ha na-ejide ndị mmadụ n’agbụ nke ụjọ na nkwenkwe ụgha. Ọ bụghị ihe ijuanya na Pọl dụrụ ndị Kraịst ọdụ ka ha “gharakwa ịṅa ntị akụkọ ifo dị iche iche.”—1 Timoti 1:3, 4.
Ịjụ Akaebe nke Ndị Mmụọ Ọjọọ
Otú ọ dị, gịnị ma ọ bụrụ na akụkọ ndị ahụ eyie ka ha bụ eziokwu? Mgbe ụfọdụ a na-akọ ahụmahụ nke ndị bụ mmụọ ma ọ bụ ndị ha na ndị mmụọ na-emekọ ihe ịnakwere ọkaaka nke Jehova na ikwu eziokwu nke Ndịàmà ya. Ndị Kraịst hà kwesịrị ịkọghachi ụdị akụkọ ndị ahụ?
Ee e, ha ekwesịghị. Bible na-ekwu na mgbe mmụọ ndị na-adịghị ọcha tiri mkpu na Jisọs bụ Ọkpara Chineke, ọ ‘basikwaara ha mba ike, ka ha ghara ime ka ọ pụta ìhè.’ (Mak 3:12) N’otu aka ahụ, mgbe otu mmụọ ọjọọ nke ịjụ ase kpaliri otu nwa agbọghọ ime ka a mata Pọl na Banabas dị ka “ndị ohu Chineke Onye kasị ihe nile elu” na ndị na-ekwusa “ụzọ nzọpụta,” Pọl chụpụrụ mmụọ ahụ n’ime ya. (Ọrụ 16:16-18) Ma Jisọs, Pọl, ma ọ bụ nke ọ bụla ná ndị so dee Bible ekweghị ka ndị mmụọ ọjọọ gbaa akaebe banyere nzube Chineke ma ọ bụ banyere ndị ọ họpụtara na-ejere ya ozi.
E kwesịkwara ịrịba ama na Jisọs Kraịst adịwo ndụ n’ógbè ndị bụ mmụọ tupu ọ bịa n’ụwa. Ọ matawo Setan n’onwe ya. Ma, Jisọs ejighị akụkọ banyere ọrụ ndị Setan rụrụ mee ndị na-eso ụzọ ya obi ụtọ, o nyeghịkwa ihe ọmụma zuru ezu banyere ihe Ekwensu pụrụ ime na nke ọ na-apụghị ime. Setan na ndị mmụọ ọjọọ ya abụghị ndị enyi Jisọs. Ha bụ ndị a chụpụrụ achụpụ, ndị nnupụisi, ndị kpọrọ ihe dị nsọ asị, na ndị iro nke Chineke.
Bible na-agwa anyị ihe ọ dị mkpa ka anyị mara. Ọ na-akọwa ndị ndị mmụọ ọjọọ bụ, otú ha si eduhie ndị mmadụ, na otú anyị pụrụ isi zere ha. Ọ na-egosi na Jehova na Jisọs nwere ike dị ukwuu karịa ndị mmụọ ọjọọ. Ọ na-emekwa ka anyị mara na ọ bụrụ na anyị ejiri ịnọgidesi ike n’ihe jeere Jehova ozi, ndị mmụọ ọjọọ apụghị imerụ anyị ahụ na-adịgide adịgide.—Jemes 4:7.
Mgbe ahụ, e nwere ezi ihe kpatara ndị Kraịst ji na-ajụ akụkọ ụgha dị iche iche, akụkọ ndị bụ nanị maka ịkwalite ọdịmma nke ndị na-emegide Chineke. Dị nnọọ ka Jisọs “gbaara eziokwu ahụ àmà,” otú a ka ndị na-eso ụzọ ya na-eme taa. (Jọn 18:37) N’ụzọ amamihe ha na-aṅa ntị n’okwu ntụziaka ahụ nke ndụmọdụ Bible bụ́: “Ka ihe bụ eziokwu hà, . . . na-agụkọnụ ihe ndị a.”—Ndị Filipaị 4:8.
[Foto dị na peeji nke 31]
Ezi ndị Kraịst aghaghị izere n’ụzọ siri ike ngosipụta nile nke anwansị